Matiu 26:1-5, 14-16; Luk 22:3-6; Jọn 12:4-6; 17:12

Lesson 249 - Senior

Memory Verse
“Ahuhu gādiri uwa site n’ihe di iche iche nēme ka madu ma n’ọnyà; n’ihi na ọ di nkpà ka ihe ahu nēme ka madu ma n’ọnyà gābia; ma ahuhu gādiri madu ahu onye ihe ahu nēme ka madu ma n’ọnyà nēsite n’aka-ya bia” (Matiu 18:7).
Cross References

I Nwoke ahụ bụ Judas Iskariọt

1. Arọpụtara ya tee kwa ya mmanụ dịka otù onye nime ndị náesoụzọ Ya irinaabụọ ahụ na kwa dịka Onyeozi, Matiu 10:1-5; 26:14; Mak 3:13-19; Luk 6:13-16; Ọlu Ndi-ozi 1:17, 25

2. Ọ rapụrụ ịnọgide n’ụzọ eziomume, wee ghọọ onye anyaukwu, na onyeori, na onye nwekwara mkpali nke anụarụ ma eleghịanya, banyere alaeze nke Kraist nke ana-eche na ọ gaabụ ihe gaadị n’eluụwa, Jọn 12:4-6

II Ịrara nye na Ọtụtụ ihe ọzọ Bú ụzọ Mee

1. Ndịamụma Agba Ochie kwuru banyere omume Judas, Abù Ọma 109:8 tụlee Ọlu Ndi-ozi 1:16, 17; Zekaraia 11:12, 13

2. Jisọs kwuru ya dịka amụma banyere omume Judas, na-akpọ ya ekwensu na nwa nke ịlain’iyi, Jọn 6:70, 71; 13:18-30; 17:12

3. Otú ọ dị, Judas mere ya site n’ọchịchọ nke onwe ya, Matiu 26:3, 6; Zekaraia 11:12, 13

4. Judas rọọrọ ọchịchọ ya ma mgbe ahụ Setan wee baa nime ya, Luk 22:3 tụlee Jọn 13:2, 27

5. Dịka nwa nke ịlan’iyi -- ná-abụkwaghị nwa Chineke ọzọ -- ọ dịrị ya mfé iji nsutuọnụ rara Ọkpara Chineke nye, Mak 14:43-45; Luk 22:47, 48; Jọn 18:2-5

III Ọgwụgwụ Dị Ilu nke Judas

1. Dịka nke a bụ mbụ ọ na amata ihe omume ahụ o mere pụtara, Judas jupụtara ná mwuta ma o nweghị nchègharị n’ebe Chineke nọ, Matiu 27:3-5; Zekaraia 11:12, 13; Abù Ọma 94:20-23

2. O wee kwụgbue onwe ya, Matiu 27:5; Ọlu Ndi-ozi 1:18, 19

3. Ego ahụ nke ọ naraworo nke o weghachikwara ka eji zụta otù ubi ọkpụite, Matiu 27:6-10; Zekaraia 11:13

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Otù Iheatụ nke Omume Náeweta Ihere N’iru Ọra

Nime iheatụ niile nke akụkọ omume náeweta ihere n’iru ọra na omume nke nnupuisi megide ọchịchị nke edeworo n’akwụkwọ akụkọ dị iche iche banyere Akwụkwọnsọ na akụkọ ụwa, ọ dịghị nke ọ bụla pụrụ ịdị njọ karịa nke Judas Iskariọt. Aha ya gaadịgide otú a rue ebighịebi, n’ihi na o chepụtara ma lụọ kwa ọlụ ịrara nye náenweghị obiebere nke ana-ahụbeghị ụdị ya n’ụwa. O nyere aka wee mee ka ọ dịrị ndịiro nke eziomume mfé ijide Ọkpara Chineke site ná nsutuọnụ aghụghọ na nke iruabụọ bụ nke amaara ugbu a ka “nsutuọnụ nke Judas.” Ọbụná ndị náekweghị ekwe na-eji ịkwáemo na nleda naekwu banyere omume nke a o mere. Ma ihe mere nke a dị njọ karịsịa bụ na nwoke a bụ otù nime ndịnáesoụzọ arọpụtara na mbụ na Onyeozi nke Ọkpara Chineke!

Agwaghị anyị n’Akwụkwọnsọ banyere oge maọbụ ebe ọ bụla Judas Iskariọt nọ kpee ekpere nke onye ihe naewuta wee nata mgbaghara mmehie niile nke nwoke, nwanyị maọbụ nwatakịrị ọ bụla ná-aghaghị ịnata ma ọ bụrụ na ha gaabà n’Eluigwe. Ma anyị nwere ihe gaeme ka anyị kwere na ọ bụ onye nataworo nzọpụta n’ihi na Chineke adịghị ezipụ ndị náekweghị ekwe ikwusa akụkọ nke nzọpụta Ya.

Judas bụ otù onye nime ndị ahụ arọpụtara, ma zipụ kwa ha abụọ abụọ ikwusa Oziọma nke Alaeze (Mak 6:7). Ọ bụ kwa otù nime ndị ahụ Kraist nyere iwu ịga kwusaa Oziọma bụ ndị O nyekwara ike ijezu ozi ahụ. Ndịozi ndịa, ka enyekwara ike “igwọ ndi nriaria, menu ndi ekpenta ka ha di ọcha, menu ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie, chupunu ndi mọ ọjọ”; Kraist mere ka ha mata na aga agba ha ume mgbe ha na-alụọlụ Ya. Judas bụ otù onye nime ndị ahụ Jisọs zipụrụ dịka “aturu n’etiti agu.”

Judas bụ otù onye nime ndị Jisọs kwuru sị na Mmụọ nke Nna ahụ ga-ekwu okwu nime ha. Ọ bụ kwa otù nime ndị ahụ Kraist sịrị na mmadụ niile ga-akpọ ha asị n’ihi Ya onwe Ya, na ọ ga-abụ ihe dịrị ya ịnagide mkpagbu n’ihi Kraist. Ọ bụ kwa otù nime ndịKraist kwuru okwu banyere ha mgbe Ọ sịrị, na ha, dịka ndị ozi na ndị orù, agaghị aka Ya ukwuu bụ Nna ha ukwu na Onyenwe ha.

Judas bụ otù nime ndị ahụ Kraist mere ka ha dị iche site n’ebe ndị náejere alaeze Beelzebub ozi nọ. Ọ bụ otù onye nime ndị ahụ rọọrọ ibu obe ha soro Jisọs. Ọ bụ kwa otù onye n’ọnụọgụgụ ndị ahụ latara wee bịakute Jisọs kọọrọ Ya “ihe nile, ka ihe ha mere ra, ka ihe ha ziri ra kwa,” emesịa ha soro Ya jee ebe ha nọ náánị ha ka ha zuru ike ka ha jesịrị ozi Ya (Gụọ Matiu 10:1-42 na Mak 6:7-13, 30-32).

Ọ dị onye ọ bụla pụrụ ikwu sị n’ezie na nwoke dị otú a bụrị onye mmehie oge niile ndịa Jisọs jiri ya lụọọlụ eziomume? Ọ dị onye pụrụ ikwu na Chineke, Onye mazuru ọgwụgwụ site ná mmalite, ledara iwu Ya pụtara ìhè anya nke kwuru na ọ dịghị onye ọ bụla bụ onye ọhụụ, onye mmehie, maọbụ onye ná-adịghị nsọ nke agaeji jeeozi Ya, wee were Judas ana-amụghị ọhụụ n’ọkpụkpọ dị elu na nke nlekọta bụ nke o nwere òkè nime ya ná mmalite ijéozi nke Kraist? Ò nwere onye pụrụ ikwu na onye ahụ bụ onye akpọrọ, tee ya mmanụ ịbụ onye náesoụzọ Jisọs, onye arọpụtakwara dịka onyeozi, onye ketaworo òkè n’ijéozi nke ndị náesoụzọ Ya -- bụ akụkụ ozi ahụ guzooro onwe ya dị kwa mkpà nke mere ka ndịozi irinaotù ahụ nwee mmetuta na ekwesịghị itufu oge ọ bụla n’ịrọpụta onye gaanọchi ya -- na ọ dịbeghị mgbe o nwetara mgbaghara mmehie niile ya maọbụ nwee mmetụta nke ndụ imemmụọ ọhụụ bụ nke anaenye mgbe emesịrị ka mmadụ bụrụ onye ekere ọhụụ nime Kraist Jisọs?

Ọ bụ eziokwu na Jisọs kwuru ihe banyere Judas otù mgbe, dịka ekwensu na kwa dịka nwa nke ịlan’iyi na mgbe ọzọ. Ọ bụ ezie na ndị amụma Agba Ochie kọwara ihe banyere omumeọjọọ na mkpebì ọjọọ ya. Ndị amụma Agba Ochie ndịa dekwara ihe banyere ahụhụ niile nke Kraist. Ha kwuru ihe banyere ọnwụ na mbiliten’ọnwụ nke Kraist. Ha kwukwara banyere ụgwọ ahụ Ọ kwụrụ n’ihi anyị. Ma agwara anyị na Kraist nwere ike nke ịtọgbọ ndụ Ya na ịnara kwa ya ọzọ. O nwekwara ike ịkpọ ụsụụ ndị mmụọozi ka ha megide ma kwada kwa ndịagha ahụ nke akpọtara imegide Ya, O nwekwara ike ịrịdata site n’obe ahụ n’onwe Ya ma jụ ịnwụ ọnwụ n’ihi mmehie nke ụmụmmadụ.

Ma Jisọs jiri obi Ya niile gaa n’obe ahụ. O kpebikwara wee nwụọ, ọ bụ ezie na ọ dị mkpà ka Ọ rịọ ike ịnagide ihemgbu nke oge awaà ahụ dị ilu. O mezuru amụma nke ndị mgbe ochie nke Chineke buru. Amụma ndịa niile abụghị iwu nke agaasị na amanyere Jisọs irubere ha isi; ha bụ akụkọ mere eme nke edere nye ọdịn’iru site ná mkpáli nke Mmụọ Nsọ Onye maara uche nke Chineke, Onye Ya na Chineke ra kwa, O nwekwara amamihe nke na-enweghị nsọtụ marakwarị ihe banyere Chineke site na mbụ.

Judas kwa, mezuru amụma eburu. Akpọrọ ya “nwa nke ila-n’iyi” n’ihi na ọ rọọrọ ụzọ nke dubara ya n’ọnọdụ nke kwesịrị aha ahụ. Akpọghị ya nwa nke ịlan’iyi n’ihi na akawo ya rị akara nke mere na o nwekwaghị nrọrọ ọzọ. Akpọrọ ya “ekwensu” n’ihi na ọ rọọrọ ụzọ nke náeduba n’ọchịchịrị na nke ná ekewapụ mmadụ n’ebe Chineke na Eluigwe nọ. Ọ kpachaara anya rọrọ ụgwọọlụ nke ajọ omume kama mkwụghachị ụgwọọlụ niile nke Chineke. Ma mgbe ọ hụrụ ụgwọọlụ niile ahụ n’òzùzùòkè nke ana aghaghị ịkwụ ya, o mere omume dịka onye ụjọ nke ọ bụ, wee daa sụ isi n’ala baa n’ịta ahụhụ ebighịebi n’ọkụ alammụọ nke ọ na-adịghị mgbapụ dịrị ya. Agaghị edeworị amụma banyere Judas dịka o si metụta ya ma ọ bụrụ na ọ rọorọ ụzọ ahụ nke ka mma kama ụzọ ahụ nke náeduba n’ahụhụ ebighịebi.

Ka ndị niile bụ ndị náeche na ha nwere ebemgbabá siriike n’òzízí nke ana akpọ nchebe ebighịebi nke ndị kwere ekwe, lezie anya n’ihe mere ná ndụ nke nwoke a onye Chineke kpọrọ, tee mmanụ, nye kwa ike, nye kwa iwu maka ijéozi ahụ ma zipụ kwa ya ịlụọlụ n’ihi Alaeze ahụ. Ka ndị niile náeche na ekpuchịrị ha n’okpuru Ọbara ahụ, nke ha sịrị na awụsịrị ya n’ihi mmehie ha mere n’oge gara aga, nke ha naeme ugbu a na kwa nke ha gaje ime n’ọdịn’iru, mata na Ọbara ahụ agaghị alụ ọlụ ọ bụla ma ọ bụghị ma awụsịrị ya n’obi ahụ, ma apụrụ ịwụsa ya n’obi ahụ náánị mgbe enwere nchègharị, ma ana-achọ mgbaghara mmehie site n’okwukwe na iji obi eziokwu gbakụta mmehie azụ. Ka ndị niile bụ ndị na-asị na agaedo ha nsọ n’ọnwụ gụghachị okwu niile ahụ nke Pita Onyeozi kwuru, onye sịrị Judas na “aguru ya-ri n’etiti ayi, o we keta òkè-ya n’ijé ozi a,” bụ nke o sitere “ná-njehie dapu.” Pita kwukwara ihe banyere ogbugbu Judas gburu onwe ya na ihe ịmaatụ e jiri ya maa site n’aka onye dere Abù Ọma, nke enyere iji chetara anyị ọbụbụọnụ nke dịrị ọbụná iheonwunwe ya n’eluụwa.

Àpụrụ ịzọpụta mmadụ ọ bụla onye jụrụ ụzọ nke amara ma ná nnupuisi n’iwu nke Chineke site n’ịrara na n’inyefe n’aka ndị ajọ mmadụ Onye ahụ bụ Onye enyere anyị iwu ka anyị hụ Ya n’anya site n’obi anyị niile, échìchè, mkpụrụobi na mmụọ? Àpụrụ ịzọpụta mmadụ ahụ bụ onye nke zọkwasịworo “Ọbara nke Onye ikpe na-amaghị” ụkwụ site n’ụzọ dị otú a kewapụ olileanya ya n’Ọbara ahụ nke na-asacha mmehie ya niile? Àpụrụ ịzọpụta mmadụ ahụ, onye, site n’ime mmehie nke igbu mmadụ, wee dubaa mkpụrụobi ya ebe ịnọ n’ahụhụ ebighịebi ma site kwa otú a tụfue ohere ikpeazụ nke o nwere iji nwee nchègharị? Ọzịzá nye ajụjụ niile ndịa bụ nnọọ É-è! Onye naagụ chee échìchè nkeọma n’ihe niile ndịa!

Nzọụkwụ niile nke Ọdịda Judas

E nwere ike ịjụ ajụjụ sị: “Ọ bụ urù gịnị ka ọ baara anyị bụ ịmụ ihe banyere ndụ nwoke a onye Chineke jụworo?” N’ihi otù ihe, anyị pụrụ ịhụ nzọụkwụ niile bụ nke dubara ya n’ọgwụgwụ ahụ dị ilu, ma anyị aghaghị iche nche ka anyị wee ghara ịga n’otù ụzọ ahụ.

Mmehie, n’ọgwụgwụ ya, na-abụkarị ihe jọgburu onwe ya. Ọbụná ná ndụ a ọ dịghị ihe na-agụ agụụ na-apụta n’ọgwụgwụ ndụ nke ebiri ná mmefu na ịlan’iyi. Arụ-mgbu na ihe-otiti bụ ihe na-ejupụta n’ikpeazụ ndụ nke ndị ka n’ọnụọgụgụ ndị kpachara anya ná enupụisi. Udo nke obi na-efunarị ha. Akọnauche ahụ, ọtụtụ ugbò, adịghị ekwe ka onye nwe ya zuru ike. Ma ịta ahụhụ nke arụ ahụ nke mmehie mebiri na-adịgide mgbe iheụtọ niile nke ụwa na ụbọchị niile nke ndụ ịlan’iyi nke ná-egbu ka mmanya gasịrị.

Ma ná mmalite ndụ nke mmehie, ọnọdụ ọjọọ ndịa ka ana-adịghị ahụta maọlị. Ọtụtụ ugbò mmehie na-anwụde échìchè na mkpụrụobi ndị ntorọbịa. Ma eleghịanya, ná mmalite apụrụ inwe obiụtọ, ọñụ na ọtụtụ nke ihe ná-akpali mmụọ ịbànye n’ụzọ njèm niile ahụ ná-eduba ná njọ. Ma ụdị ịkpáụrị a na-arapụ iheọgbụgbá dị ilu nke ịkwaụta, ma ọtụtụ mgbe ọ na-emebi uche na anụarụ nke onye ahụ ná-emerụbiga onwe ya ókè nke mere na ọ dịghị kwa ihe pụrụ iwepụ kpamkpam ọnyá (maọbụ apà) ma weghachị kwa ya n’ọnọdụ nke emerụghịemerụ maọbụ ụdị nke izuòkè, bụ nke ná-enweghị mmehie o nwere na mbụ.

Ka ọ ghara ịbata n’échìchè, ọbụná otù ugbò, mgbe na apụrụ iji ihe ụtọ nke mmehie ndịa tụnyere óké ụgwọọlụ ahụ nke anyị na anata n’ihi ndụ eziomume ebiri. Ike agwụwo ụfọdụ ibi ndụ dị nsọ mmetụta nke ezi omume ahụ nke dị ná ndụ ndị ahụ nọ ha gburugburu na ịnọgide n’ụzọ ahụ arọpụtara nye ndị kwesịrị ntụkwasịobi, ma ha achọwo ihe dị ọhụụ na nke dị kwa iche. Mmalite niile nke mmehie na-amasị kwa ha ebe ha tụgharịworo obi ha pụọ n’Isiiyi nke obiụtọ na ọñụ zuruòkè.

Sọl, eze mbụ nke Israel, malitere ọdịda nke wetaara ya iji aka ya gbue onweya site n’ikwe ka nganga bata n’obi ya ahụ nke dịịrị umeala na mbụ. Ya onwe ya kwa anataworị mmetuta nke ọkpụkpọ òkù nke Mmụọ Nsọ na ike, enyewo kwa ya obi ọhụụ, o wee bụrụ kwa onye Chineke rọpụtaworo. Ma ndụ Sọl bịaruru n’ọgwụgwụ ya n’eluụwa n’ụzọ dị ilu nke yiri náánị nke Judas. Ụzọ ahụ nke duuru ya rue n’ọjụjụ ikpeazụ nke Chineke jụrụ eze ahụ malitere site n’izobe nganga nime obi ya dịka onye ikpé náamaghị.

Otù aka ahụ, mmalite ọdịda nke Judas bụ ihe ụwa gaakpọ ihe ntà na nke ana-ekwesịghị ileba anya. Ọ malitere inwe anyaukwu. Edebere ya n’ijéozi dị mkpà n’etiti ìgwè ntà ahụ bụ ndị soro Jisọs. Ma agwara anyị na ọ ghọrọ onyeori. Ihe o zuru, maọbụ onye o zuru ihe n’aka ya, agwaghị anyị. Ma ikwu na ọ bụ onyeori bụ ihe emere ka ọ pụta ìhè nkeọma.

Na mgbe ahụ, o weere ya n’ihe dị ntà ijekuru ndịiro nke Kraist ka ha na ya kwekọrịta ma baa n’ọgbụgbandụ. Jisọs dọrọ ya akanántị, ọbụná rue ka ọ pụta ìhè na ọ bụ ya onwe ya gaje ịrara ya nye. Ma Judas échègharịghị maọbụ chigharịa site n’ụzọ ahụ nke dubara ya ime ihe ọjọọ kachasị njọ n’eluụwa.

Ọbụná okwu nke ndị amụma agwawo ya banyere ọgwụgwụ dị ilu nke dị ya n’iru ma ọ bụrụ na o mee ihe ahụ nke ọ na-atụgharị n’uche. Ọ ghaghị inweworị nghọta n’okwu ndị ahụ n’ihi na Pita matara ha, bụ onye Judas maara akwụkwọ karịa ya n’ụzọ niile. Ọ bụghị mgbe anatasịrị Onyenkasịobi ahụ -- Onyendú anyị iduba anyị n’eziokwu niile na ikpughere anyị ihe niile nke Chineke – ka Pita rụtụrụ okwu ahụ eburu n’amụma banyere Judas aka. Ọ bụ ihe ra ka abalị iri fọdụrụ tutu ihe ukwuu ahụ nke mere n’ụbọchị Pentikọst (Abù Ọma 69:25; 94:20-23; 109:8 tụlee Ọlu Ndi-ozi 1:15-26). Ya mere, ọ bụrụ na Judas amaghị, o kwesịrị ịmata. Amara ya ikpé ziriezi. Ka onye náekwere n’òzízí ụgha nke nchèbe ebighịebi rịba amamikpé nke Judas amá nke dị n’iheodide ndịa eburu n’amụma. Ebipụrụ ya site n’ajọomume nke ya onwe ya! Ma ọ bụ ihe ana-apụghị ịgọnarị na ya onwe ya bụ onye eziomume na mbụ!

Mgbe ọ jụsịrị ịdọakanántị ahụ nke adọrọ ya, Judas kwere ka setan tinye mkpebi ahụ nime obi ya ime ihe ahụ o kpebiri ime (Jọn 13:2). Judas, na ndịiro nke Kraist agbasịworị ìzù. O nyewo onwe ya n’aka mnwude n’agha nke setan site n’ịdámbà ya na site kwa n’ịnara ihe dum o kwuru ná nrụrịtaụka nke ya na ndịọjọọ ná-ejere ekwensu ozi.

Nzọụkwụ nke ọzọ bụ mmụọ ọjọọ ịnwụde ya, n’ihi na edewo ya sị “Mgbe enyesịrị ya iberibe-achicha ahu, mgbe ahu Setan batara nime onye ahu.” Mgbe ahụ o wee ghọọ nwa nke ịlan’iyi n’ezie. Ugbu a ọ ghọworo nnọọ setan orù -- onye na-emegide Kraist nke mmalite ọgbọ ahụ -- onye siworo n’okwukwe pụọ kpamkpam na onye jụworo Kraist. Olileanya ahụ nke ná-enwuenwu nime obi ya na mbụ anyụwo. Onye bụwororị ngwaọlụ nye ọlụ Alaeze nke Kraist na mbụ ewerewo obi ya niile ugbu a rara onwe ya nye dịka orù n’alaeze ekwensu. Ebe anyị matara na ọñụ naadị n’Eluigwe n’isi mkpụrụobi ọ bụla anapụtara site n’alaeze nke ọchịchịrị wee kpọbata ya n’Alaeze nke Ìhè, anyị pụrụ ikwu sị na enwere óké ọñụ na obiụtọ n’ala ndị ahụ amara ikpé ọnwụ mgbe setan lụzuworo ajọọlụ ahụ.

Nzọụkwụ ndị ọzọ niile doro anya. Judas mere omume ahụ náamaghị jijiji maọbụ chee uche banyere ihe ọjọọ dị icheiche omume ya gaeweta. O metughị ya n’obi mgbe o suturu Onye ahụ dị ọcha, onye anaemerụghị emerụ ọnụ bụ Kraist nke Ebube, wee site na nke a nye ndịagha nọ náechere iheàmà na nke a bụ onye ha naachọ. Ọ dịghị ịhụn’anya dị ná nsutuọnụ ahụ. Enweghị kwa obiekele n’ihe niile nke Kraist meere ya dị nime ya. Ọ bụ náánị mmụọ nke ịrara ya nye, omume iruabụọ nke onye nnupuisi na mmụọ nke anyaukwu nke pụrụ iré Nkume dị óké ọnụahịa nke Eluigwe n’ihi ego ntà efu. (Judas naara ihe dị ka N3.00 nke ego Nigeria.)

Ọnụahịa ahụ nke Judas rụrụ mgbe ya na ndịiro nke Kraist na-agbarịta ìzù ọjọọ ahụ bụ ihe ana-achọ n’aka onyenwe orù dịka Iwu si dị, mgbe otù nime ezi ndị orù ya nwụrụ n’ihe mberede. Judas abịaruwo ugbu a n’ógó nke ịjụ Chineke na Kraist Ya ebe ọ pụrụ iré Nna ya ukwu n’ihe ná-akarịghị ọnụahịa nke orù!

Judas nwere mwuta, ma ọ bụghị nchègharị. O weghachirị “ọnu-ahia nke ọbara” wee sị na ya ararawo “ọbara onye ikpe nāmagh nye.” Ọ dịghị onye ọzọ tozuru òkè inwe ụdị ọkwá ahụ ma ọ bụghị Kraist. Agaenweworị ndị egburu n’ihi ihe ọjọọ maọbụ mmehie pụtara ìhè nke ha náemeghị, ma enwere ike kwue ihe banyere ndị ahụ sị na awụsịrị ọbara nke ná emeghị ihe ọjọọ. Ma mgbe ọ bụla ekwuru “Emehierem n’irara ọbara onye ikpe nāmagh nye,” ọ dịghị Onye ọzọ anaekwu ihe banyere ya ma ọ bụghị Kraist, n’ihi na náánị Ya bụ Onye ahụ Ikpé Ná-amaghị. Judas kweere na ya emehiewo n’ịrara Ọkpara Chineke dị ndụ nye, ma ihe dị mkpà karịa mmadụ ikwere náánị na ya mehiere ka achọrọ maka inwe nzọpụta.

Ndịori abụọ ahụ n’elu obe bụ ndị ikpé mara, ma náánị otù ka azọpụtara; azọpụtara ya n’ihi na ọ kpọkuru Onyenwe anyị ka O meere ya ebere ma nyere ya aka, ná-ekwere na ya bụ onye ikpé mara. Nzọpụta adịrịghị onye ná-echègharịghị. Judas adịghị mgbe o chègharịkutere Chineke. Ọ nwara idozi ihe ụfọdụ site n’ichègharịkuru ndị isinchụàjà na ndịokenye, ma ọ dịghị mgbe o kpere ekpere ya nye Chineke -- Onye ahụ náánị Ya pụrụ ịgbaghara mmehie niile.

Onye Chineke rapụworo, ndị ya na ha gbara ìzù ime ihe ọjọọ jụrụ ya ma náachị kwa ya ọchị, onye bụ onye náeso ụzọ Jisọs na Onyeozi na mbụ wee bụrụ onye gburu onwe ya. Anyị ahụwo na ọ kawo ahụhụ ya akara ebighịebi site n’ịkwụsị ndụ ya nime mmehie, n’ihi na nime mmehie ahụ ka ọ rapụrụ ụwa nke a iguzo n’iru Chineke ya, ịbụ onye ikpé mara n’ihi mmehie ya niile, ná-enweghị nchègharị na ná-enweghị kwa olileanya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ọlụ akpọrọ Judas ịlụ? gịnị bụ kwa aha enyere ọlụ a?
  2. Gịnị bụ ọlụ ya n’etiti ndịozi irinaabụọ ahụ?
  3. Gịnị bụ omume ndaghachị azụ mbụ site n’eziomume nke ahụrụ ná ndụ Judas?
  4. Òlee otú Judas si mebie iwu ahụ nke na-asị na ndị eziomume agaghị achọ mmekọrịta maọbụ nkekọ ná-ekwesịghịekwesị nke ndị ná-amaghị Chineke?
  5. Òlee ịdọakanántị dị icheiche nke Judas natara bụ nke kwesịrị ịzọpụta ya n’ọnọdụ ikpeazụ ọjọọ ahụ?
  6. Àmanyere Judas amanya ime ihe o meworo site n’amụma ahụ dị nsọ nke ọ na-apụghị igbochi?
  7. Òlee mgbe aga-asị na ọ ghọrọ “nwa nke ilan’iyi” n’òzùzùòkè?
  8. Òlee ụzọ iheọmụmụ a si ná emegide kwa òzízí ụgha nke nchèbe ebighịebi nke onye kwereekwe?
  9. Kọwaa ihe dị iche n’etiti ọlụ niile nke setan lụrụ banyere Judas dịka edere ya na Jọn 13:2 na 27.
  10. Gịnị bụ ihe dị iche n’etiti ịkwaụta na nchègharị? Òlee nke Judas nwere? Àzọpụtara Judas n’ikpeazụ?