Lesson 250 - Senior
Memory Verse
“N’ihi na i huwom, ì kwerewo? ngọzi nādiri ndi akāhugh, ma ha kwere” (Jọn 20:29).Cross References
I Ngosị dị icheiche nke Kraist mgbe O bilisịrị n’Ọnwụ n’Ụbọchị Ista
1. Jisọs gosịrị Meri Magdalini onwe Ya n’ílì ahụ, Mak 16:9-11; Jọn 20:11-18
2. Jisọs gosịrị ndịnyom ọzọ onwe Ya mgbe ha si n’ílì ahụ ná alata, Matiu 28:9, 10
3. Jisọs gosịrị Saimon Pita onwe Ya, Luk 24:34; I Ndi Kọrint 15:5
4. Jisọs gosịrị ndị náesoụzọ Ya abụọ onwe Ya mgbe ha naejé Emeus, Mak 16:12, 13; Luk 24:15-31
5. Jisọs gosịrị Ndịozi ahụ na ndịọzọ onwe Ya mgbe Tọmas ná anọghị ya, Mak 16:14-18; Luk 24:36-48; Jọn 20:19-23
II Ngosị dị icheiche nke Kraist Mgbe O bilisịrị n’Ọnwụ Mgbe Ista Gasịrị
1. N’izùukọ nke náeso Ista Jisọs gosịrị Ndịozi ahụ onwe Ya mgbe Tọmas nọ ya, Jọn 20:26-29
2. Jisọs gosịrị ndị náesoụzọ Ya mmadụ asaa onwe Ya mgbe ha naegbu azụ n’Osimmiri Taibirias, Jọn 21:1-25
3. Jisọs gosịrị Ndịozi onwe Ya n’otù ugwu dị na Galili, Matiu 28:16-20
4. Jisọs gosịrị ụmụnna karịrị narị mmadụ ise onwe Ya, I Ndi Kọrint 15:6
5. Jisọs gosịrị Jemes onwe Ya, I Ndi Kọrint 15:7
6. Jisọs rịgooro n’Eluigwe n’iru Ndịozi ahụ na Betani, Mak 16:19; Luk 24:50; Ọlu Ndi-ozi 1:2-9; I Ndi Kọrint 15:7
7. Jisọs gosịrị Pọl onwe Ya, I Ndi Kọrint 15:8
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEAkụkọ nke Mbiliten’ọnwụ ahụ
Ala mara jijiji. Otù mmụọozi nọdụrụ ala n’elu otù nkume nke ọ kpọrepụrụ site n’ílì ahụ. Ozi ahụ banyere Kraist nke na-adị kwa ndụ nke mmụọozi ahụ ziri ndịnyom ahụ dị ka akụkọ efu n’ebe ndị náesoụzọ Ya nọ. Ha chere na ọ pụghị ịdị otú a. Pita rulatara ala wee bànye nime ílì ahụ ghereoghe. N’ebe ahụ ka ákwà ọcha ahụ tọgbọrọ, ma arụ Ya apụwo. Ihe ahụ, nke meworo juru ya anya.
Meri hụrụ Jisọs, ma Ndịozi ahụ ekweghị n’ezie na ọ bụ Ya. Ndịnyom ọzọ hụkwara Jisọs -- ma akụkọ ha dị ịtụn’anya. Onyenwe anyị gosịrị Pita onwe Ya okwu ahụ ka ha niile naekwu, “N’ezi okwu Onye-nwe-ayi esiwo n’ọnwu bilie, were kwa Onwe-Ya gosi Saimon.” Ma ajụjụ fọdụkwara n’obi ọtụtụ nime ha. Ebe ndị náesoụzọ Ya gbakọrọ ka mmadụ abụọ ndị náesoụzọ Ya ndị si Emeus batara, n’oge ahụ weta kwa akụkọ na Jisọs soro ha n’ijè ha, na emekwara ka ha mara Ya mgbe ha na-anyawa achịcha. Ọbụná rue mgbe ahụ ụfọdụ ka nọ kwa n’obi-abụọ.
Mbata nke Jisọs
Ná mberede egwù jidere ndị náesoụzọ Ya ụjọ tụkwara ha niile, n’ihi na n’etiti ha ka ihe dị ka mmụọ guzoro -- ma ọ bụ Jisọs! Ọbụná site n’okwu nke iji mee ka ha kwenye o sikwaara Ya ike ime ka ha kwere na ọ bụ Ya n’ezie. “Le akam na ukwum,” ka O kwuru. Ma n’aka Ya na ụkwụ Ya ka àpà dị ebe akụrụ Ya-rị ntú. Ọ bụ Jisọs, Onyenwe ha na Enyi ha -- Jisọs, Onye ha na Ya sokọworo ma kwurita kwa okwu!
Ọ bụghị Mmụọ, kama Onye ahụ Eyikwasịworo Ebube
“Mọ enwegh anu-aru na ọkpukpu,” ka Jisọs kọwara mgbe Ọ na-eme ka o doo ndị náesoụzọ Ya anya na ọ bụ Ya onwe Ya -- n’anụarụ. Igosi ha na Ya dị ndụ n’anụarụ mgbe O bilisịrị n’ọnwụ, Ọ rịọrọ ka enye Ya nri, O rikwara ya n’iru ha. Jisọs makwaara òzìzì dị icheiche ga-apụta ịgọnarị mbilite Ya site ná ndị nwụrụanwụ; ya mere Ọ rapụụrụ ha “ọtutu uzọ nādigh igọ agọ” (Ọlu Ndi-ozi 1:3). Ọ bụghị náánị anụarụ na ọkpụkpụ ka O nwere -- kama O nwekwara apa sitere ná ntú, na apa nke ube ahụ, dịka ihe-ngosi nke mere ka o doo anya na ọ bụ arụ Ya ka O ji bilite n’ọnwụ.
Arụ ahụ nke Jisọs jiri bilite dị iche n’arụ nke mmadụ nke mere na O nwere ike ịbànye nime ụlọ ọbụná “mgbe emechiri uzọ nile” (Jọn 20:26). O wee “funari n’anya ha” (Luk 24:31). Ma Ọ bụghị Mmụọ; O nwere anụarụ -- arụ bilitere n’ọnwụ, nke eyikwasịrị ebube. NdịKraist niile nke ná-emeriemeri gaje inwe otù ụdị mgbanwe a ná Mwepụ na nzuzo nke Nzukọ Kraist: “Agēnwo ayi nile, n’oge dikarisiri nta, n’otù ntabi-anya, mgbe agāfu opi ikpe-azu: n’ihi na agāfu opi, agēme kwa ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie nāpugh ire uré, agēnwo kwa ayi onwe-ayi” (I Ndi Kọrint 15:51, 52). Jisọs “gēme aru nke ọnọdu anyị di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi” (Ndi Filipai 3:21). Anyị ga-enwe arụ ebube nke gaadị kwa ka arụ nke anyị nwere ugbu a. Nke pụtara na anyị ga-amata kwa onwe anyị, ma ezughịòkè niile nke anụarụ nke bụ akàrà nke ọbụbụọnụ ahụ ga-agabiga, anyị ga-adị kwa ndụ na-anwụghị ọzọ.
Mmeghepụ nke Nghọta Ha
“Mgbe ahu ka O meghere uche-ha, ka ha we ghọta ihe edeworo n’akwukwọ nsọ” (Luk 24:45). Ọ bụghị ihe mgbagwojuanya na Jisọs rụtụrụ ebe ọgụgụ ndịa mara mma aka dịka “Ya onwe-ya bu onye amapúworo site na njehie nile nke ayị, onye azọpiaworo site n’ajọ omume niile nke ayị: ahuhụ-nmehie nke udo-ayi di n’aru-ya; ọ bu kwa ubiri utari-ya ka ejiri me ka aru ayi di ike” (Aisaia 53:5). N’ụzọ dị otú a ìhè mụkwasịrị ha, ha wee mata na Ọ bụ Jisọs.
Ịdịmkpà nke Mbiliten’ọnwụ ahụ
Mgbe ndị ụfọdụ na-eguzogide ịbụ Chineke nke Kraist, ndị ọzọ na-agọnarị kwa ihe ịrịbaàmà nke mbiliten’ọnwụ Ya, ezi okpukpé nke ndịKraist naeguzo n’eziokwu ahụ na Jisọs bụ Chineke na O si kwa n’ílì bilie. Ọ bụrụ na anyị agọnarị mbiliten’ọnwụ ahụ anyị na-agọnarị okwukwe anyị ná etufu kwa olileanya anyị ịbà n’Eluigwe. “Ọ buru na emegh ka Kraist si n’ọnwu bilie, ya mere ihe ayi nēkwusa bu ihe-efu, okwukwe-unu bu kwa ihe-efu … ọ buru na emegh ka Kraist si n’ọnwu bilie, okwukwe-unu bu ihe-efu, unu nānọ ná nmehie nile unu ugbu a. Ya mere ndi dakwara ura ọnwu nime Kraist lara n’iyi” (I Ndi Kọrint 15:14, 17, 18). Ọ bụghị ihe ijuanya na Jisọs chọrọ ka ndị náesoụzọ Ya mara nkeọma na ọ bụ Ya na ọ bụghị mmụọ efu. Nzọpụta na olileanya nke ndụ ebighịebi anyị na-adabere n’eziokwu ahụ na emere ka O jiri arụ Ya bilite site ná ndị nwụrụ anwụ.
O siriike ime ka Ekwenye
Ná-agbanyeghị na o ruru ihe ra ka ugbò ise pụtara ìhè nke Kraist gosịrị ndị náesoụzọ Ya onwe Ya n’ụbọchị O siri n’ọnwụ bilite, Tọmas ka nwekwara obi abụọ, onye bụ otù onye nime “madu iri na otù ahu.” Tọmas anọghị n’abalị ahụ mgbe Jisọs gosiri Onwe-ya nye Ndịozi fọdụrụ: “Ọ buru na ahughm n’aka Ya apa ntú, … m’gagh-ekwe ma-ọli” (Jọn 20:25), ka Tọmas onye ọrụụka ahụ kwuru.
Onyenwe anyị maara na obi ịjụoyi, na nke mpịazi (nnyocha), na nke óké iheọmụma nke Tọmas bụ ihe ana-apụghị ime ka o kwere site n’ịnụ náánị n’akụkọ. Ọbụná otú a, Onyenwe anyị achọghị ka Tọmas nọgide n’ịbụ onye ọrụụka. Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị -- nke bụ, ụbọchị mbụ nke izù ụbọchị asaa nke soni -- Jisọs gosịrị ndị náesoụzọ Ya onwe Ya, ma mgbe Ọ matasịrị ọgbakọ ahụ, Ọ sị Tọmas: “Setipu nkpisi-aka gi n’ebe a, le akam abua; setipu kwa aka gi, tiye nime akukum: aghọkwa-la onye nēkwegh, kama ghọ onye nēkwere” (Jọn 20:27). Nke ahụ ezuworo ọbụná Tọmas onye ahụ ná-adịghị ekweekwe, onye tiri mkpu sị, “Onye-nwem na Chinekem.” Ọbụná Tọmas onye o siri ike ime ka o kwenye matara na ọ bụ Jisọs.
Ikuume nke Chineke
“Ya mere Jisus sịrị ọzọ, Udo diri unu: dika Nnam ziteworom, otú a ka Mu onwem nēziga kwa unu. Mgbe O kwusiri nka, O kusa ha ume, si ha, naranu Mọ Nsọ” (Jọn 20:21, 22). Ikuume dị otú a nke sitere n’Ọkpara Chineke aghaghị inwe ihe ọ naegosị. Ọbụná ná mmalite nke òkìkè, Chineke kunyere umendụ n’oghere-imi nke mmadụ, mmadụ wee ghọọ mkpụrụobi dị ndụ. (Lee Jenesis 2:7). Mgbe Jisọs kusara ndị náesoụzọ Ya bụ ndị ahụ Ọ rọpụtara ume wee sị, “Naranu Mọ Nsọ”, ọ bụ ihe pụrụ ime na Ọ na-eziga Mmụọ Nsọ ịgbáàmà nye odudonsọ ha. Anyị matara na ejiworị Ọbara Jisọs doo ha nsọ tutu Ụbọchị Pentikọst, n’ihi na ha niile nọkọrọ n’otù ebe n’otù obi na n’otù olu. Odudonsọ bụ ihe wetara ịdịn’otù ahụ: “Were eziokwu do ha nsọ: … ka ha we buru otù, dika Ayi-onwe-ayi bu otù” (Jọn 17:17, 22).
Mgbaghara nke Mmehie dị Icheiche
“Ndi nile ọ bula unu nāgbaghara nmehie-ha, agbagharawo ha nye ha; ndi nile ọ bula unu nējide nmehie ha, ejidewo” (Jọn 20:23). Ike a nke enyere Ndịozi ahụ dịka ndị eji tọọ ntọala nke Nzukọ Kraist nyere ha ike inwe mmekọ ha na ndị sitere n’okwukwe dahie ma mesịa chègharịa, maọbụ iwezuga ndị dahiere ma jụ ichègharị. Ndụmọdụ a yiri nke ahụ ahụrụ na Matiu 18:15-17 bụ ebe akọwara sị na ọ bụrụ na nwanna ajụ ịnabata okwu nke Nzukọ na aga-ewere ya dịka “onye mba-ọzọ na onye-ọna-utu.” Pọl degaara ndi Tesalọnaika akwụkwọ: “Ma ayi nēnye unu iwu, umu-nna ayi, n’aha nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka unu nēze nwa-nna ọ bula nādigh agazi ije, ọ digh-eje kwa dika ozizi ahu enyere n’aka-ha idebe nke ha natara n’aka-ayi” (2 Ndi Tesalọnaika 3:6). Ike ahụ nke Nzukọ Kraist nwere iji gbaghara onye òtù ha bụ kwa otù ike ahụ nke nwanna ọ bụla nwere iji gbaghara onye ọ bụla mehiere megide ya, “ọ buru na nwa-nna-gi emehie, bara ya mbá; ọ buru kwa na o chègharia, gbaghara ya” (Luk 17:3). Nke a apụtaghị na Nzukọ Kraist maọbụ Pope, maọbụ ụkọChukwu, maọbụ mmadụ ọ bụla pụrụ ịgbaghara mmehie emere megide Chineke. Mmehie emehiere megide nwanna bụ kwa mmehie megide Chineke. Onye ọ bụla nke mehiere aghaghị idozi okwu ahụ ọ bụghị náánị n’ebe nwanna ahụ nọ kama ọ gaechègharịkute kwa Chineke, n’ihi na ọ bụ náánị Chineke pụrụ ịgbaghara mmehie.
Ọkpara Chineke
“Ya mere ọtutu iheiribaàmà ọzọ ka Jisus mere n’iru ndi nēso uzọ-Ya, nke anēdegh n’akwukwọ a: ma edewo ihe ndia n’akwukwọ, ka unu we kwere na Jisus bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke; ka unu we nwe kwa ndu n’aha-Ya n’ihi na unu kwere” (Jọn 20:30, 31). Jọn enyewo ihengosị doro anya na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Ma ọtụtụ nde mmadụ ndị kwere ekwe ndị chọtaworo ndụ site n’Aha Ya, malite n’ọtụtụ arọ gara aga, bụ kwa ndịàmà nke ike nke mbiliten’ọnwụ Ya.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Òlee ụbọchị nime izu ka Jisọs siri n’ọnwụ bilie?
- Ụbọchị òlee gasịrị mgbe O bilitesịrị n’ọnwụ tutu O were onwe Ya gosị Ndịozi Ya?
- Kpọọ iheàmà dị icheiche nke Jisọs nyere iji gosị na arụ Ya si n’ọnwụ bilie.
- Gụkọọ mpụtaìhè dị icheiche nke Kraist n’Ụbọchị Ista.
- Chọpụtasịa amụma dị icheiche eburu banyere ọnwụ na mbiliten’ọnwụ nke Kraist.
- Òlee ụbọchị n’izu ka Jisọs gosịrị Ndịozi Ya onwe Ya nke ugbò abụọ?
- Ònye bụ onye ahụ ná-anọghị ya mgbe O gosịrị ha onwe Ya nke mbụ?
- Gịnị mere o ji dị mkpà na anyị gaenwe iheámà nke mbiliten’ọnwụ nke arụ Jisọs?
- Kọwaa otú i nwere ike ịkọwa banyere arụ ebube ahụ.
- Òlee otú arụ ebube si dị iche n’ebe mmụọ dị?