Lesson 251 - Senior
Memory Verse
“N’ihi na akpọrọ unu ime nka: n’ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n’ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile” (I Pita 2:21).Cross References
I Mpụtaìhè nke Atọ Jisọs nye Ndịozi
1. Pita na mmadụ isii ọzọ gara igbuazụ n’osimmiri Taibirias ma ha egbuteghị ihe ọ bụla, Jọn 21:1-3
2. Jisọs mere ka ahụ Ya anya n’ụsọ óké osimmiri, Jọn 21:4, 5
3. Mgbe ha rubere isi n’iwu Ya, ndị náesoụzọ Ya gbutere ọtụtụ azụ n’ụzọ dị ebube, Jọn 21:6-11; Luk 5:4-11
4. “Bianu, rie nri-ututu,” Jọn 21:12-14; Luk 1:53; Abù Ọma 34:10
II Ule nke Elere Pita
1. “Ì hurum n’anya kari ndia?” Jọn 21:15-17; Luk 14:26, 27, 33; 19:28-34; Ndi Filipai 3:8
2. Eburu amụma banyere ogbugbu Pita n’ihi okwukwe Ya, Jọn 21:18, 19; I Pita 2:21
3. Abaara Pita mbá n’ihi ajụjụ ya, “Ònye a gini gēme ya?” Jọn 21:20-23
4. Jọn na-akwagidesị ike na àmà ya niile banyere Jisọs bụ eziokwu, Jọn 21:24, 25; Luk 1:2; 24:48; Ọlu Ndi-ozi 1:21, 22; 2 Pita 1:16
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHENke Mbụ nime Ogbugbu Azụ Abụọ Egburu n’ụzọ dị Ebube
Ọ bụ ná mmalite ijé ozi nke Jisọs, ihe ra ka arọ atọ na ọkara ka ihe a nke edepụtara n’iheọmụmụ anyị taa mere. Ìgwè mmadụ ndị akpaliri mmụọ ha na-agbagharị gburugburu ụsọ mmiri ahụ. Otù ụgbọ eji egbu azụ na-aga nwayọ ná-enupụ n’akụkụ mmiri ahụ. O wee guzo. Otù olu sitere n’ụgbọ mere ka óké ụzụ ahụ dajụa, ọra mmadụ niile ndị nọdụrụ n’ọnụmmiri ahụ wee na-ege ntị ka Onye nzọpụta ahụ náezi ha Okwu nke Chineke. Ná mmechi nke òzízí Ya, Jisọs wee tụgharịa n’ebe Saimọn Pita nọ bụ onye nwe ụgbọ ahụ sị, “Nupu n’ogbu-miri, wunyenu ihe unu ji egbu azù ka unu gbue azù.” “Nna-ayi, ayi dọgburu onwe-ayi n’ọlu ogologo abali a dum, ma ayi egbutagh ihe ọ bula”, ka onyeọkụ ahụ zaghachiri, “ma n’okwu-Gi m’gāwunye ihe eji egbu azù” (Luk 5:4, 5). Mgbe Pita rubereisi n’iwu Onyenwe anyị, o nwetara óké mmetuta nke ọ na-enwebeghị na mbụ n’ọlụ ya dịka onye na-akụazụ. Mgbe ụgbụ azụ ya na-adọka n’ihi ọtụtụ azụ, o wee feere Jemes na Jọn aka ka ha nyere ya aka dọpụta ụgbụ ahụ. Ha kpojuru ụgbọ abụọ ndịa rue mgbe ha malitere imikpu -- ma ná-agbanyeghị nke a, azụ fọdụkwara. Ná-agbaghịagụgọ Pita n’ezie anwapụtaworị ọtụtụ ihe iju anya dị icheiche n’ọlụ ịkụ azụ n’oge gara aga, ma ọ dịghị nke eji tụnyere nke a.
Ọkpụkpọ Akpọrọ Pita
Iheịrịbaàmà nke a tinyere n’obi Pita óké ntụkwasịobi n’ebe Nnaukwu ahụ nọ, ma jikere kwa Pita maka ọkpụkpọòkù ahụ, “bianu som n’azu, M’gēme unu ndi-ọku nākuta madu” (Matiu 4:19). Pita wee soro Ya. Ọ bụ óké ihe n’ebe Pita na ndịozi ọzọ ahụ nọ ịrapụ ihe niile wee soro Jisọs. Chee échìchè banyere ndịa náakụ azụ, ndị ma eleghịanya ha amaghị ụzọ ọzọ ha pụrụ isi nweta iheoriri ma ọ bụghị náánị site n’ịkụazụ. Ịrapụ ụgbọ ndị ahụ na ihe niile eji egbu azụ; ịrapụ ebe niile ahụ ha maara nkeọma, ọdọmmiri mara mma nke náenye ha obiụtọ nke bụ kwa ebe inweta ihe ilekọta ndụ ha; ịrapụ ụlọ na ézìnaụlọ ha -- abụghị ihe ntà. Ndịkom ndịa zọpụrụ ụkwụ ịbà ná ndụ nke okwukwe. Ma ọkpụkpọòkù ahụ, “Bianu som n’azu”, abụghị ọkpụkpọ sitere n’ụwa; o sitere n’ebe Ọkpara Chineke nọ. Ọ dịghị mkwà ihe nke ụwa so ya, ma ọ bụghị, “M’gēme unu ndi-ọku nākuta madu.” Ndịọkụazụ ahụ wee soro Ya. Otù mgbanwe dị óké ebube n’ịkọwa wee were ọnọdụ nime obi ndịkom ndịa. Jisọs sịrị na mgbanwe a yiri ifufe ahụ nke “nēfe ebe ọ nāchọ, i nānu kwa olu-ya, ma i matagh ebe o si bia, na ebe ọ nāga: otú a ka onye ọ bula amuworo site na Mọ Nsọ di” (Jọn 3:8). Taa otù ụdị ọmụmụ ọhụụ ahụ ka anaenye kwa ndị niile ga-échègharị wee rapụ mmehie niile ha ma soro Onyenzọpụta ahụ.
Ijè nke Okwukwe
Pita natara ihe mnwapụta dị ukwuu ma mụta kwa ọtụtụ ihe site n’aka Nnaukwu ahụ nime arọ atọ n’ọkara niile ahụ o soro Jisọs. N’otù oge, ezipụrụ ya onwe ya na ndịozi ọzọ, abụọ abụọ, izisa Oziọma. Adụrụ ha ọdụ ka ha ghara iwere uweime abụọ maọbụ ego n’iheòkíkè ha, ka ha wee mụta ịdịndụ site n’okwukwe. Mgbe emesịrị Jisọs jụrụ ha ajụjụ banyere njèm ahụ sị: “Mgbe M’zipuru unu nējigh akpa-ego, na akpa-ije, na akpukpọ-ukwu, ọ di ihe kọrọ unu?” (Luk 22:35). “Ọ digh ihe kọrọ ayi” ka ha zara. Nke a mere tupu akpọgide Ya n’elu obe. Ọnwụ nke Onyenzọpụta ahụ mere ka olileanya nke ndịnáesoụzọ Ya gbaa ọchịchịrị ma o metutara Pita karịsịa. Ha wee dị ka ụmụntakịrị akwalitere n’ike baa n’ịbụ okenye. Ha ejikereghị ka Onyenwe ha rapụ ha. Ọ bụ eziokwu na mbiliten’ọnwụ ahụ weghachirị ọñụ na olileanya ha n’ọtụtụ, ma ọ dị ka ha nọ kwa ná mgbagwojuanya. Jisọs emeworị ka ha hụ Ya anya ugbò abụọ mgbe ha nọkọrọ otù ebe, ma mgbe Ọ rapụrụ ha, ha amataghị ihe ha ga-eme n’etiti onwe-ha. Ha ejègharịworị n’okwukwe ma n’owuweanya na Onyenwe ha nọ ha nso mgbe niile.
Otù Njèm Igbuazụ
Mgbe ha nọ ná amaghị ihe ha ga-eme, Pita sịrị, “anamaga igbu azù.” Mmadụ isii ndị ọzọ zara sị “Ayi onwe-ayi gēso kwa gi je” (Jọn 21:3). N’ebe Pita na ndị òtù ya nọ, nke a pụtara ịlaghachi azụ n’ọlụ aka ochie ha. Ná agbaghịagụgọ, ịlaghachi kwa azụ n’ọlụ aka ochie ha nyere ha mmetuta ntakịrị banyere nchekwa nke ihe nke ndụ a. Ogologo abalị niile ha na-awụnye ụgbụ-azụ ha na-adọpụta kwa ya site n’oge rue n’oge. Ma ha egbuteghị azụ ọ bụla. Mgbe Chinaabọ, ha wee chee iru ịlaghachi n’ótú. N’ótú ahụ, otù Ụdị nke mmadụ guzoro náánị ya dịka onyinyo n’elu ájá ahụ. Olu Ya wee daa ụda gafee mmiri sị, “Umu-ntakiri, unu ji ihe-oriri ọ bula?” “É-è.” “Wunyenu ihe unu ji egbu azù n’akuku aka-nri nke ugbọ, unu gāhu kwa.” Site n’ịgbaume dị otú a na olileanya nke onyeọkụazụ na-enwe na ịwụnye kwa náánị otù ugbò, ha rubere isi. Ha gbalịsịrị ike ịdọpụta ihe ha ji egbu azụ, ma ha enweghị ike ịdọpụta ya n’ihi ọtụtụ azụ nke jupụtara na ya.
“Ọ bu Onye-nwe-ayi” ka Jọn gwara Pita. N’échèrèghị ka ọ hụ otú aga-esi wepụta azụ ndị ahụ n’ótú, Pita tụbara onwe-ya nime mmiri wee ná-ejekuru Jisọs. Ná agbaghịagụgọ mmụọ Pita laghachiri azụ n’oge ahụ ọ nụrụ ọkpụkpọòkù nke Nnaukwu ahụ, “Bianu som n’azù, M’gēme unu ndi-ọku nākuta madụ.” Ndịozi niile ahụ nọ ná nsogbu nke ichefu ọkpụkpọòkù ahụ Jisọs kpọrọ ha wee laghachi azụ n’ọlụ mbụ ha.
Ọtụtụ n’ụbọchị taa arapụwo okwukwe na ndabere ha nwere na Jisọs wee laghachi kwa ná ndụ ochie ha -- ná-adọgbu onwe-ha n’ọlụ ehihie na abalị -- ma na-enwetaghị ihe ọ bụla. Mgbe ụgbụ-azụ niile ha na-atọgbọrọ n’efu, agụụ na-egbu kwa mkpụrụobi ha, ha nọrị ná-enwe olileanya na nwụnye ọzọ ga-aba urù. Lata, gị onye daghachiworo azụ, n’ebe ahụ obi gị hụrụ n’anya ikpé ekpere. Onye nzọpụta na-echere ime ka ọkpụkpọòkù ahụ dị ọhụụ “Bianu som n’azụ.” Nụrụ olu Ya ka Ọ naasị obi ahụ ná-échègharị, “Agbagharawo gi nmehie gi nile … la n’udo.”
Tebụl nke Onyenwe anyị
Ndị náesoụzọ Ya wee hụ na azụ esiworoesi dị n’elu icheku ọkụ ahụ. Ọ dịghị kwa Onyenwe óké osimmiri mkpà ịdabere ná ndịọkụazụ ahụ inye Ya azụ. Ekère ihe niile site n’aka Ya, n’ihi Ya ka ekèkwara ha, O wee ná-akpọ mmadụ dum, sị: “Bianu rie nri-ututu.” Ewerewo ezi ihe niile dozie tebụl Ya. Ụzọ Ya niile dị elu karị ụzọ niile anyị. Échìchè ya niile dị elu karị échìchè niile anyị. Ị pụrụ ịtụkwasị Ya obi, Pita?
Otù Nrọrọ
Jisọs sịrị, “Saimon, nwa Jọn, ì hurum n’anya kari ndia?” (Jọn 21:15). N’otú ahụ, ka azụ dị otù narị iri ise na atọ mara mma tọgbọrọ n’akụkụ ha ka ụgbụ ha wụsara; emekwara ka ụgbọ ha ji egbu azụ nọrọ ha nso, ihe ndị ahụ na enye ọñụ n’obi onye ọ bụla na-akụ azụ, nke bụ kwa otù akụkụ dị ukwuu nke ihe nchekwa ndụ nke ndịkom ndịa. “Ị hurum n’anya kari ndia?” Pita wee lee azụ ndị ahụ na Onyenwe ya anya, zaa sị: “E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyim.” Mmụọ nke Chineke wee nyochaa obi Pita nnyocha dị omimi mgbe Jisọs jụrụ ya ajụjụ nke ugbò abụọ, sị “Saimon, nwa Jọn, ì hurum n’anya?” Ma eleghịanya site n’ijiobichụaàjà, na mkpebi na ya agaghị emejọ kwa Onyenwe anyị ọzọ, Pita wee zaa sị: “E, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara na I bu eyim.” Akámgbá ọzọ échère ya n’iru bụ “Nāzu aturum.”
Ihe banyere ìgwè atụrụ Ya na-emetu Jisọs n’obi. O jiwo Okwu Chineke zụọ ha n’oge ijéozi Ya, ma ugbu a ịlụ ọlụ ahụ dị n’ubu nke ndị ahụ Ọ kpọrọ ka ha ná-alụọlụ Ya ná-aga n’iru. Òkù nke óké ọlụ naeso ọkpụkpọòkù nke Chineke. N’ebe Pita nọ ọ pụtara ikwusa Oziọma. Nye mmadụ ọ bụla ọ bụ òkù ijéozi dịka ike ya ra. Nye ụfọdụ ndị ọ bụ inyechasị oge ha niile kpamkpam n’ijéozi nke Oziọma; nye ndị ọzọ ọ bụ ibi ndụ onyeKraist n’ụlọ ọlụ ha na ime ihe ọ bụla ha pụrụ ime nye Onyenwe anyị ụbọchị dum.
Ajụjụ ahụ wee bịa nke ugbò atọ site n’ọnụ Onyenwe anyị, “Saimon, nwa Jọn, àbum eyi gi?” Ọkụ nnyocha nke Mmụọ Nsọ wee bamie nime obi Pita rue mgbe enyochapụtasịrị échìchè na ìzù niile nke obi ya. Ebe o wutara Pita ma eleghịanya na Onyenwe anyị agaghị atụkwasị kwa ya obi ọzọ n’ihi na ọ gọnarịwo Ya rị ugbò atọ site n’alaala obi ya, Pita wee kwue okwu ndịa, “Onye-nwe-ayi Gi onwe-Gi matara ihe niile; Gi onwe Gi mara na I bu eyim.”
Ọnụahịa ahụ dị Elu
Mgbe mkwupụta a gasịrị, Jisọs kpugheere Pita “aha ọnwu ọ gēji nye Chineke otuto.” N’ụbọchị ikpeazụ ndụ ya aga-akpọ Pita ka o nye ndụ ya n’ihi okwukwe ahụ nke o kwupụtara. Ọ pụrụ ikwu sị “N’ihi na akpọrọ unu ime nka: n’ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n’ihi unu, n’ārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu Ya nile” (I Pita 2:21), ma soro kwa ihe ilereanya ahụ rue ọgwụgwụ.
“Onye a gini gēme ya?” Ajụjụ a nke si n’ọnụ Pita pụta site na mkpali nke obi ya banyere Jọn mere ka Onyenwe anyị kuziere Pita iheọmụmụ ọ na-aghaghị ịmata: “Ọ bu gini n’ebe i nọ? gi onwe-gi som.” Maka ndị ahụ niile ga-achọ inwe ndụ ebighịebi ka nke a bụụrụ ha ihemmụta: ná-agbanyeghị ihe onye ọ bụla ọzọ nwere ike ime, ị pụrụ ịgbaru ọsọ ahụ, ị ghaghị ịgba ọsọ ahụ rue n’ọgwụgwụ!
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Gịnị bụ ihe ndị ahụ gbara ọkpụkpọòkù nke mbụ Pita gburugburu iso Jisọs?
- Òlee otú ijéghachi igbu azụ nke ugbò abụọ si bụrụ ndapụ site n’òkù ahụ akpọrọ ya?
- Azụ òle ka ndị náesoụzọ Ya gburu n’abalị ahụ tupu ha ahụ Jisọs? Òle ka ha gburu mgbe ha hụsịrị Jisọs?
- Mmadụ òle nime ndị náesoụzọ Ya nọ mgbe Jisọs mere ka ha hụ Ya anya n’oge a?
- Òlee ndị bụ ụmụ Zebedi?
- Gịnị bụ ọlụ aka ha tupu Kraist akpọọ ha?
- Gịnị ka i chere Jisọs naatụ aka mgbe Ọ sịrị Pita, “Ì hurum n’anya kari ndia?”
- Gịnị ka Jisọs kwuru banyere ọdịn’iru Pita?
- Gịnị ka ajụjụ ahụ Jisọs jụrụ pụtara “Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mgbe M’gābia, ọ bu gini n’ebe i nọ?”
- Òlee otú agaeji ọnụọgụgụ ọlụ niile Jisọs lụrụ nke edere n’akwụkwọ tụnyere ọnụọgụgụ ndị ahụ áná-edeghị n’akwụkwọ?