Luk 24:49-53; Matiu 28:16-20; Mak 16:15-20

Lesson 252 - Senior

Memory Verse
“Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere: n’aham ka ha gāchupu ndi mọ-ọjọ; ha gēkwu okwu n’asusu ọhu di iche iche; ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha añua ihe ọ bula nēbute ọnwu ọ gagh emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi nriaria aka, agēme kwa ka aru ha di ike” (Mak 16:17, 18).
Cross References

I Nzukọ ahụ Akaraákà

1. Ndị náesoụzọ Ya jere Galili dịka Jisọs nyere n’iwu, Matiu 28:7, 10, 16; 26:32; Mak 16:7

2. Onyenzọpụta ahụ nke si n’ọnwụ bilie gosiri onwe Ya, ndị náesoụzọ Ya wee kpọọ isiala nye Ya, Matiu 28:17

3. Jisọs kwupụtara sị “Ewerewo ike nile di n’elu-igwe na n’elu uwa nyem,” Matiu 28:18; Ndi Efesọs 1:19-22; Ndi Kọlọsi 2:9, 10

II Ijéozi ahụ

1. Enyere ndị náesoụzọ Ya iwu ijéozi ukwu ahụ nke ime mba niile ka ha bụrụ ndị náesoụzọ Ya, Matiu 28:19; Mak 16:15; Luk 24:48

2. Ndị ahụ nke emeworo ka ha kwere ga-ekwupụta okwukwe ha nye ụwa site na ọwụwụ nke mmiri, Matiu 28:19; Mak 16:16; Ndi Rom 6:3-6

3. Atọnimeotù ahụ nke Ụdị-Chineke ka egosipụtara n’ụkpụrụ ọwụwụ nke mmiri, Matiu 28:19

4. Iheiribaàmà na ọlụebube dị icheiche gaeso mkwusa na ikwere n’Okwu ahụ; ma ịjụ Onyenwe anyị Jisọs ga-eweta ahụhụ ebighịebi, Mak 16:16-18; Jọn 3:16-18

III Mmụọ Nsọ ahụ nke Na-enye Ike

1. Inye ike nke ijéozi ukwu ahụ dabeere n’ike nke sitere na Chineke iji mee ka ihe niile gaa nkeọma, Luk 24:49; Ọlu Ndịozi 1:8

2. Mmụọ Nsọ na-eme ka echèta òzízí niile nke Jisọs; aghaghị ikuziri ndị niile nke ụwa ihe ndịa, Jọn 14:26; Matiu 28:19, 20

3. Jisọs rịgooro n’Eluigwe wee nọdụ n’akanri nke Chineke, ndị náeso Ya wee pụọ ijéozi ukwu ahụ nke enyere ha n’aka, Mak 16:19, 20; Luk 24:50-53; Ọlu Ndi-ozi 1:9-14

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Jisọs Kraist Onyenwe anyị bụ “Onye akaworo ibu Ọkpara Chineke n’ike, dika Mọ nke idi nsọ si di, site ná mbilite n’ọnwu nke ndi nwuru anwu” (Ndi Rom 1:3, 4).

Ọñụ nke ndị náesoụzọ Kraist enweghị nsọtụ dịka ekpughere eziokwu ahụ nke mbiliten’ọnwụ nke Onyenzọpụta ha na Onyeòzízí ha n’obi ha na n’uche ha. Onyenwe ha bụ Onye ike niile dị n’aka Ya dị ndụ ná-ejègharị kwa n’etiti ha ọzọ. Obi ndị náesoụzọ Ya jupụtara ná mgbagwojuanya na ịhụn’anya n’ịhụ Jisọs na mberede ka Ọ na eguzo n’etiti ha mgbe ha mechibidoro onwe ha ụzọ ná nzukọ nzuzo ahụ ka onye ọ bụla ghara ịbata. Ma Jisọs abụghị onye ana-achọghị ka ọ bata n’etiti ha. Ọ na-abịakute ndị ahụ náachọ iru Ya náachọ kwa ngọzi Ya.

Ịnara Ndụmọdụ

Tutu akpọgide Ya n’obe, Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya ọtụtụ ugbò na Alaeze Ya abụghị nke ụwa nke a, na ọ gaghị adị kwa anya mgbe Ọ ga-alaghachikuru Nna Ya nke bi n’Eluigwe. Ọ gbalịrị ịkọwara ndị náesoụzọ Ya àtụmààtụ banyere Alaeze Ya na nke oge Oziọma, ma obi ndịkom ndịa aghọtaghị àtụmààtụ niile nke Chineke ọ bụ ezie na ha ji ikwesị ntụkwasịobi náeso Onyenwe ha. Ma otú ọ dị, oge nrigo n’Eluigwe Ya na-abịaru nso, ya mere Ọ gwara ndị náeso Ya okwu ikpeazụ na ọgbụgbandụ Ya n’eluụwa. Jisọs gwara ha ka ha buru Ya ụzọ gaa Galili; n’ebe ahụ, bụ obodo ahụ nke esiteworo na ya nweta ọtụtụ nime ndị náesoụzọ Ya, O nyere ha ike ijéozi ukwu ahụ ma doo kwa n’usoro ihe bụ ijéozi nke ndị ahụ náesoụzọ Ya ndị akaworo aka ịbụ ndịdike nke ga-eguzoro Okwukwe ahụ na ndịdike n’agha nke Oziọma nke Jisọs Kraist.

Ọlụ ahụ nke Jisọs nyere ndị náesoụzọ Ya iwu ịlụ dị ukwuu; n’ezie, ọ dị ukwu rii nne na apụghị ịlụ ya ma ọ bụghị site n’ọlụ na inyeaka nke Onyenkasịobi ahu, bụ Onye nke Atọ nime Atọnimeotù ahụ, Onye Jisọs kweworo mkwà izite site n’Eluigwe. Ekwesịrị inweta ihe niile kwesịrị ka eburu ụzọ nweta, Jisọs gwakwara ndị ná-esoụzọ Ya ka ha nọdụ n’obodo Jerusalem, rue mgbe “agēwere ike nke si n’elu yikwasi” ha. Ngwangwa ha nwetara ike nke Mmụọ Nsọ ahụ, ndị náesoụzọ Ya ga-abụ ndị ejikeere ịpụ gaa jezue ozi ha nke fọdụrụ.

Ọ dị mkpà nke ukwuu na ndị náesoụzọ Ya na Chineke gana-akparịta ụkà mgbe niile. Mmụọ Nsọ bụ Onye ana-esite n’aka Ya nwee mmekọ ahụ, Ọ na-alụ kwa otù ụdị ọlụ a, na ndị ọzọ dị icheiche rue taa. “Ma mgbe ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēduba unu n’ezi-okwu nile: n’ihi na Ọ gagh-ekwu n’Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia. Onye ahu gēto Mu onwem: n’ihi na Ọ gēwere n’ihe nkem, kọ-kwa-ra unu Ya” (Jọn 16:13, 14); Amaokwu ndịa niile naegosi mkpà ọ dị inwe Onye nkasịobi ahụ dị Nsọ nime obi ịbụ Onyendú na Onye ntuziaka. Aghaghị iso Ya ma ọ bụrụ na anaele anya inwe mmeri ọ bụla dị ka Onye nke Kraist.

Onyenzọpụta Nwere Ike

Jisọs jiri okwu dị óké mkpà nke dị kwa ike malite mkparịta ụka nke Ya na ndị náesoụzọ Ya na Galili, “Ewerewo ike nile di n’elu-igwe na elu uwa nyem” (Matiu 28:18). Okwu a metutara nnọọ ihe niile -- ike niile ana-ahụ nime Chineke, Jisọs onwe-Ya nwere ha. Obi nke nwere okwukwe adịghị enwe nsogbu n’ikwere nke a, n’ihi na ezi onyeKraist ọ bụla maara na Jisọs Kraist bụ Ọkpara Chineke bụrụ kwa Onye Ya na Nna ra n’ike na ịchịisi. Ọ bụghị náánị na Jisọs nwere ike ahụ, kama O nyere ndị náesoụzọ Ya otù ike ahụ n’ọtụtụ iji jee ozi nke Alaeze ahụ, O nyekwara ndị niile bụ “ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi” ike ijéozi nke Alaeze ahụ n’ọgbọ a. Jisọs abụghị Onye ná-ele mmadụ anya n’iru. Ọ na-akpọ nwoke ọ bụla, nwanyị, na nwatakịrị iso Ya jee ijè; Ọ na-anabata ha mgbe ha ji obi ha niile zaa òkù ahụ; Ọ na-enye kwa amara, ebube na ike inyere ha aka ka ha bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasịobi.

Òlee otú ndị náesoụzọ Ya gaesi were ike a nke sitere na Chineke nke enyere ha jee ozi? Hà ga-abụ ndị ná-eji aka ike ná-achị nzukọ nke Kraist na mba niile nke dị n’okpuru ha? Ọ bụghị otú a maọlị. Ha ga-abụ ndị ga ná-eje n’ụwa niile ná-ekwusa Oziọma ná-ezi kwa ihe. Òzízí agaezi bụ òzízí ndị náesoụzọ Kraist mụtara site n’ebe Ọ nọ, ọzọ, òzízí ahụ ga-eme ka mmadụ nwere onwe ya site n’ịbụ orù nke mmehie. Agwaghị ndị náesoụzọ Ya ka ha zisaa eziokwu ahụ nye náánị ndị maara akwụkwọ ma rapụ ndị ná-amaghị akwụkwọ; ha agaghị aga náánị mba ndị mepereanya ma chefue mba ndị ná-amaghị Chineke; enyeghị ha ike ịga obodo dị icheiche ndị dịrị ha mfé ịbà wee rapụ obodo ndị dị n’imeime ma dị kwa anya bụ ndị ọ dịrị ha ike ijekuru. Enyere ha iwu ka ha kwusaara ihe niile ekère èkè Oziọma -- ebe ọ bụla enwere ike ịhụ ha, ná-agbanyeghị ihe ọ bụla ọ ga-efu ha ma ọ bụ ike, ego, maọbụ ihe ọ bụla ha nwere.

Ijéozi ahụ nke OnyeKraist

Ijéozi a ọ dịrị náánị ndịozi iri na otù ahụ, ka ọ dịrị onye ọ bụla nke ná-akpọ onwe ya onye nke Kraist? N’ezie ọ dịrị onye ọ bụla nke ná-akpọ onwe ya onye nke Kraist. Nna anyị na Onyenzọpụta anyị matara otú ike mmadụ ra. Ha adịghị atụ anya ihe mmadụ apụghị ime. Adịghị atụ anya na mmadụ iri na otù ndịa ga-ekwusa Oziọma nye onye ọ bụla n’akụkụ niile nke ụwa; ma mgbe ekwusara Oziọma ahụ n’ikwesị ntụkwasịobi aga-eweta ndịozi ọhụụ ndị ga-aga n’iru n’ijéozi ahụ, Alaeze ahụ ga na-agbasa rue ọgwụgwụ mgbe aga-emezu ihe niile nke ezubere.

Jisọs kwere mkwà sị, “Ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.” Akaghị ndịozi a ákàrà ịdịndụ n’eluụwa rue mgbe ebighịebi. Jisọs ewepụwo kwa ahụhụ nke mmehie ná ndụ ha; ma ikpé ọmụma nke ọnwụ ana-ahụ anya, nke dịrị mmadụ niile, ka dị kwa irè. Gịnị kwa ka Jisọs bu n’obi mgbe O kwuru okwu a, ma ọ bụghị na inye ike nke ijéọzi Ukwu ahụ dịrị ndị Kraist nke ọgbọ niile? Ijéozi ahụ dịkwara ụmụ Chineke taa dịka ọ dịịrị ndịozi iri na otù ahụ ngwangwa Jisọs rapụsịrị ha.

“Chineke enyeghị ndịmmụọozi ike

Ikwusa Ozi ọñụ ahụ

Kama ndị azọpụtara site n’ílì

Ka O nyere ike ịkọ ya.

N’ọgbọ dum ọ bụ otù ihe ahụ,

Òtù ndị kwesịrịntụkwasịobi

Kwusara akụkọ otuto nke ihun’anya Jisọs,

Kọrọ akụkọ àtụmààtụ nke mgbapụta.”

Oziọma dị Ike

Oziọma nke Alaeze Eluigwe bụ Oziọma dị ike. Jisọs bụ Onyendú na Onyemmezù nke okwukwe; okwukwe na-adabere náánị n’Ọkpara Chineke ga-alụpụta ọtụtụ ihe dị ukwuu nke dị kwa ịtụn’anya. Jisọs mere ka o doo ndị náesoụzọ Ya anya na ọtụtụ ọlụebube dị ike gaeso ha ná mkwusa nke Eziokwu ahụ. Site n’aha Jisọs ka aga-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ ná ndụ ụmụmmadụ; ma ọ bụrụ na ndị náesoụzọ Ya achịlite agwọ ná-amaghịama, maọbụ ñụọ ihe na-ebute ọnwụ ná amaghịama, ọ gaghị emerụ ha arụ maọlị. Tụkwasị kwa na nke a, ha ga-ekwu okwu n’asụsụ ọhụụ dị icheiche, ha ga ebikwasị ndị nrịanrịa aka “ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādigh ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie” (Jemes 5:15). Otù ụdị ike nke ịlụọlụ ebube nke egosipụtara n’Ọkpara Chineke ka aga-egosipụta kwa n’ebe ezi ndị náesoụzọ Ya nọ.

Jisọs Kraist dị otù aka ahụ nyahụrụ na taa, ma rue kwa mgbe niile ebighịebi; Okwu Ya bụ kwa otù ihe ahụ, ọ gana-adị kwa rue mgbe ebighịebi. Ụfọdụ mmadụ ga-achọ ka anyị kwere na iheiribaàmà dị icheiche nke Oziọma Jisọs Kraist kwụsịrị mgbe emere ka Nzukọ mbụ ahụ guzosieike na ihe iribaàmà ahụ niile na ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ ka enyere iji mee ka mmalite nke Oziọma gaa nkeọma ma ugbu a ha abụrụwo ihe gara aga. Ọ dịghị ihe ewepụrụ n’eziokwu ahụ, n’ihi na ezi okwukwe nke dị ndụ nime Chineke ga-alụpụta otù ihe ahụ ná ndụ anyị dịka ọ lụpụtara ná mmalite nke Nzukọ ahụ. Oziọma nke Mmiriòzùzò Ikpeazụ ahụ n’ụbọchị taa anwapụtawo kwa otù ụdị ọlụebube ahụ nke sooro mkwusa nke Oziọma ahụ mgbe ụbọchị Pentikọst gasịrị, na ọtụtụ ihe iribaàmà ndị ọzọ. Chineke na-alụrụ ụmụmmadụ ọlụ dịka ha si kwenye ka Ọ na-alụrụ ha; n’ihi nke a ewedatala ike nke Chineke maọbụ nke Ọkpara Ya ala.

Ọwụwụmmiri nke Mmiri

Ijéozi Ukwu ahụ jikọtara ụkpụrụ nke ọwụwụmmiri nke mmiri ahụ bụ nke agaeme ndị niile chègharịrị n’ezie site n’ụzọ ọjọọ niile ha bata nime Nzukọ Kraist. Ụkpụrụ a naegosipụta ọnwụ na òlìlì nke Jisọs na mbiliten’ọnwụ nke mmeri Ya. (Lee Ndị Rom 6:3-6). Ọ bụ ọlụ pụtara ìhè nke náegosi ọlụ nke amara Chineke lụworo nime ndụ mmadụ. A na-alụ ya nye náánị ndị ahụ agbanweworo obi ha. Òlìlì na-egosi na anwụwo, ma mmadụ ahụ nke ná-anwụbèghị n’ebe mmehie dị, apụghị ìlìkọ ya na Kraist nime ọwụwụmmiri nke mmiri.

Ihe Baịbụl kwuru banyere ọwụwụmmiri bụ ịbịanye mmadụ nime mmiri. E sitere n’otù mkpụrụ okwu nke pụtara ịbịanye maọbụ imikpu nweta okwu ahụ bụ ọwụwụmmiri. Jọn Onye ọwụmmiri ga awụworị ndị mmadụ mmiri site n’ịbịanye ha nime mmiri, n’ihi na o jere n’ókè ala Jeriko ebe ọ hụrụ mmiri riri nne (Jọn 3:23). Jọn wụrụ Jisọs mmiri, anyị gụtakwara na, “Jisus, mgbe emesiri Ya baptizim, ngwa ngwa, mgbe O siri na miri rigota” (Matiu 3:16). Ọ ghaghị ịbànyewo nime mmiri ahụ tutu Ya esi nime ya pụta.

Ịbịànye nime mmiri ga-abụwokwarị ụzọ Ndịozi siworo wụọ kwa mmiri. Mgbe Filip wụrụ onozi ahụ mmiri bụ onye emeworo ka o chègharịa site ná mgbasa Oziọma ya, “ha abua we rida na miri, ma Filip ma onozi ahu; o we me ya baptism” (Ọlu Ndi-ozi 8:38). Ọ bụ ná ebeọgụgụ ndịa emetụrụ aka site n’Akwụkwọnsọ ezubeghị ịbụ ihe mkwagide na ịbịanye nime mmiri bụ ụkpụrụ kasị mma ka esoro náawụ mmiri?

Atọnimeotù dị Nsọ

Eziokwu ahụ nke Atọnimeotù nke dị nime Isi Chineke ka emere ka o nwupụta dịka ìhè site n’ụkpụrụ nke ịwụ mmiri nime mmiri. E nyere ndị náesoụzọ Ya iwu ịwụ mmiri “ba n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ” -- Ụzọ Ebube atọ ahụ nke dị n’Isi Chineke, ma náánị otù ọwụwụmmiri!

Mgbe awụrụ Jisọs mmiri, Ebube Atọ ahụ nke Isi Chineke nọ ya. Jisọs Kraist, bụ Ọkpara ahụ, rubeere ụkpụrụ ahụ isi, Nna nke bi n’Eluigwe wee gbaara Eziokwu ahụ àmà n’ikwu sị “Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe Ya dim ezi nma” (Matiu 3:17); Mmụọ Nsọ ahụ kwa, bụ Mmụọ nke Chineke, fedatara dịka nduru, ma bekwasị Jisọs (Matiu 3:16). Ọwụwụmmiri ahụ nke Jisọs bụ ihenlereanya nye ọwụwụmmiri nke OnyeKraist ọ bụla; ọ bụ ezie na onye ahụ azọpụtaworo nke ná erubere ụkpụrụ a dị ebube isi apụghị iji anya nke anụarụ ya hụ ihe ngosi nke na-agba ama maọbụ were ntị anụarụ ya nụ okwu ọ bụla ma, otú ọ dị, Isi Chineke na-agbara eziokwu nke nrubeisi ya àmà nye ụkpụrụ ahụ. “Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāgba àmà, n’ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu” (ma-ọbụ) “Ha di atọ nāgba àmà n’Elu-igwe, Nna ahu, Okwu ahu, na Mọ Nsọ ahu: ma Atọ ndia bu otù (I Jọn 5:7). OnyeKraist ọ bụla aghaghị irubere ụkpụrụ nke ịwụ mmiri nime mmiri isi ngwangwa ahụ o nwere ohere ime ya n’ihi na ịnọgide n’ilefuru iwu ọ bụla nke Chineke nyere anya gaeweta nkewapụ ebighịebi site n’ebe Chineke nọ.

E nyere Ike Ukwu nke Ijéozi ka e wee gbasaa Oziọma nke Jisọs Kraist n’ebe niile ụwa sọtụrụ. Ọ bụghị mmadụ niile ka akpọrọ isite n’otù ụzọ gbasaa Oziọma ahụ; ma mgbe onye ọ bụla ji obi ya niile náejere Chineke ozi; ụzọ nke ọ gaesi gbasaa Oziọma ahụ ga-apụta ìhè. Mgbe amatara uche na ụzọ nke Chineke, mgbe ahụ ọ na-abụ ọñụ n’obi onyeKraist ahụ isoro ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ebe ahụ arọpụtara ka ndị náesoụzọ Jisọs zute Ya mgbe O bilitesịrị n’ọnwụ?
  2. Òlee ndị ka e nyere ndị náesoụzọ Ya iwu ka ha gbasaara Oziọma?
  3. Ọ bụ n’ike ha ka ha gaeje ozi a? Gịnị mere eji nye ndị náesoụzọ Ya iwu ka ha chere nwa oge na Jerusalem?
  4. Gịnị bụ iheịrịbaàmà ndị ahụ nke náeso mkwusa Okwu ahụ?
  5. Gịnị ka ụkpụrụ nke ọwụwụmmiri pụtara? Ọ bụ ndị ole ka ekwesịrị ịwụ ya?
  6. Ọ bụ náánị ndị náesoụzọ Ya irinaotù ahụ bụ ndịKraist natara Ike Ukwu nke Ijéozi ahụ?
  7. Jisọs, Ò kwere ndị náesoụzọ Ya mkwà ịnọnyere ha rue olè mgbe?
  8. Gịnị mere mgbe Jisọs gọzisịrị ndị náesoụzọ Ya?