Ọlu Ndi-ozi 1:1-26

Lesson 253 - Senior

Memory Verse
“Jisus nka, Onye anapuru n’ebe unu nọ rigo n’elu-igwe, nābia n’otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n’elu-igwe” (Ọlu Ndi-ozi 1:11).
Cross References

I Iwu Ikpeazụ dị icheiche nke Jisọs Nyere Ndị náesoụzọ Ya

1. Oziọma nke Luk na-akọ ihe banyere òzízí dị icheiche na ọlụ niile nke Jisọs lụrụ tutu Ọ rịgoo n’Eluigwe, Ọlu Ndịozi 1:1, 2; Luk 1:3; Mak 16:19

2. Jisọs chere onwe-Ya n’iru ndị náesoụzọ Ya ná ndụ ogologo iri ụbọchị anọ, ná-agwa ha ihe banyere Alaeze Chineke, Ọlu Ndị-ozi 1:3; Mak 16:14; Luk 24:36; Jọn 20:19

3. O nyere ndị náesoụzọ Ya iwu ka ha chere mkwà nke Nna Ya, Ọlu Ndi-ozi 1:4, 5; Jọn 14:16

4. Ndị nàesoụzọ Ya jụrụ Ya ihe banyere Alaeze Israel, Ọlụ Ndi-ozi 1:6; Matiu 24:3

5. Agwara ndị náesoụzọ Ya na ihe ahụ ha chọrọ ịma dịịrị náánị Nna Ya, Ọlu Ndi-ozi 1:7; I Ndi Tesalọnaika 5:1; Mak 13:32

6. Agaenye ike, ndị náesoụzọ Ya ga-abụ kwa ndịàmà nke Kraist, Ọlu Ndi-ozi 1:8; 2:1-4; Luk 24:48; Jọn 15:26, 27

II Nrigo n’Eluigwe nke Jisọs

1. Eweliri Jisọs rigoo n’Eluigwe, Ọlu Ndi-ozi 1:9

2. Ndị mmụọozi abụọ kwere mkwà banyere nlaghachị nke Kraist, Ọlu Ndi-ozi 1:10, 11; Daniel 7:13; Matiu 24:30; Mak 13:26; Luk 21:27; Jọn 14:3; I Ndi Tesalọnaika 1:10; 4:16

III Ịrọpụta Otù Onyeozi

1. Mgbe ndị náesoụzọ Ya si n’Ugwu Olivet lata ha nọgidesịrị ike n’ekpere na arịrịọ, Ọlu Ndi-ozi 1:12-14

2. Arọpụtara Mataias ka o were ọnọdụ Judas, Ọlu Ndi-ozi 1:15-26; Abù Ọma 69:25; 109:8

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Luk, n’Oziọma ya, kọọrọ anyị n’òzùzùokè, akụkọ banyere ọlụebube dị icheiche na òzízí niile nke Jisọs site n’ọmụmụ Ya rue ná nrịgo n’eluigwe nke Jisọs na ọlụ nke Ndịozi ahụ lụrụ.

Ogologo iri ụbọchị anọ mgbe mbiliten’ọnwụ Ya gasịrị, Jisọs na ndị náesoụzọ Ya ezuteworị, Ya na ha ekwurịtawo kwa okwu, ha na Ya erikọwo kwa nri. O gosiri onwe Ya na Ya dị ndụ ọzọ mgbe ọnwụ arụụfụ Ya n’elu obe na òlìlì Ya gasịrị. Site n’ihe niile O mere na okwu Ya niile mgbe mbiliten’ọnwụ Ya gasịrị, Jisọs wepụrụ obi abụọ niile nke ndị náesoụzọ Ya nwere banyere ịdị ndụ Ya dịka Onyenwe ha na Onyenzọpụta ha nke si n’ọnwụ bilie, onye dị kwa ndụ nke eyikwasịworo ebube.

Mbiliten’ọnwụ site ná ndị nwụrụ anwụ bụ isiokwu nke kachasị mkpà n’Oziọma. Ọ bụ ihe odide nke ana apụghị ihichapụ ka Kraist dere n’obi ndị náesoụzọ Ya site n’ime ka ahụ Ya anya ọtụtụ ùgbò, nke mere na ewepụrụ obiabụọ niile nime obi ha na n’uche ha. Eziokwu niile ahụ pụtara ìhè n’iru ha. Anya ha ahụwo kwa Ya. Ha hụkwara àpàntu niile ahụ n’aka Ya abụọ, na n’ụkwụ Ya na àpà nke ube ahụ n’akụkụ Ya. Há na Ya ekwurịtawo kwa okwu. Ha hụrụ na ọ bụ otù Jisọs ahụ Onye zụworo ìgwè mmadụ ná nri. Onye meworo ka ndị nwụrụanwụ si n’ọnwụ bilie, mee kwa ka ndị ekpenta dị ọcha, ma meghee kwa anya ndị kpuruìsì. Ùgbù a Ọ dị ndụ ọzọ rue mgbe ebighịebi, otù Jisọs ahụ Onye náalụ ọlụebube.

Ajụjụ banyere Alaeze ahụ

Mgbe mbiliten’ọnwụ ahụ gasịrị, ndị náesoụzọ Ya dị ka ha ghọtara eziokwu nke dị n’Oziọma ahụ ngwangwa karịa. Échìchè banyere alaeze nke ụwa ka dị kwa n’obi ha: nke bụ idoghachị ndị Israel n’ọnọdụ nke ịbụ mba nweere onwe ha, na otú ọ gaesi dịrị ha mfé inwetaghachị ọnọdụ nke ịchịisi n’alaeze ahụ.

Ndị náesoụzọ Ya ji anyaike jụọ ajụjụ ahụ sị, “Ọ bu n’oge a ka i nēnyeghachi Israel ala-eze?” Ma Jisọs zara sị, “Ọ bugh ihe diri unu ima oge ma-ọbu ubọchi, nke Nnam debere n’ike nke aka-Ya.” Ọ na atụrụ ha aka n’ebe ezi Alaeze ahụ dị, ná-echigharị uche ha site n’ihe nke ụwa gaa n’ihe nke eluigwe, site n’alaeze dị icheiche nke ụwa a gaa n’Alaeze nke Eluigwe.

Njikere Ọzọ Agaenweta banyere Ijéozi

Iwu ikpeazụ nke Onyenwe anyị nyere ndị náesoụzọ Ya bụ ka ha nọgide na Jerusalem wee chere kwa mkwà nke Nna bụ nke gaje ịbịakwasị ha. Jisọs kọwaara ha na Ya gaje ịla, na Onyenkasịobi ahụ ga-abịa. Ọ gwara ha na agaeji Mmụọ Nsọ na ọkụ wụọ ha mmiri mgbe ọtụtụ ụbọchị ná-agaghị agabiga site n’ugbu a. Ọ na-arapụ ha, ma ha ga enwe Onyenkasịobi ọzọ -- Onye ga anọnyere ha rue mgbe ebighịebi. Ọ bụrụ na ọ dị mkpà na ndị náesoụzọ Ya ga echère n’ụbọchị ahụ dị óké mkpà, tutu ewere ike ahụ bụ mkwà nke Nna wụkwasị ha, ọ bụ ihe doro anya na anyị gaechere ma chọọ kwa otù ike ahụ nime ndụ anyị.

Ụfọdụ na arụụka na mwụsa nke Mmụọ Nsọ ahụ dịịrị náánị Nzukọ mbụ ahụ. Ma Akwụkwọnsọ na agwa anyị sị “Unu ka nkwa nka diri, na umuunu, na ndị nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chineke-ayi gākpọtara Onwe-Ya.” Mgbe Pita naekwu okwu Chineke n’Ụbọchị Pentikọst, o metụrụ aka n’okwu Joel kwuru na Onyenwe anyị ekwuworị na Ya ga-awụsa Mmụọ Ya n’arụ anụarụ niile bụ mmadụ (Joel 2:28). Ị natawo Onyenkasịobi ahụ site na mgbe i kweere?

Ndịàmà nke Kraist

“Unu ga anata ike, mgbe Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàm nime Jerusalem, na nime Judia, na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu.” Jisọs jere ozi Ya karịsịa n’ebe ndị Ju nọ, ka ewee mezue nzube Chineke n’ebe ha nọ. Ma ndị Ju, dịka otù mba, anaraghị Ya maọbụ ozi Ya. O nyere ndị ahụ naara Ya ike ijéozi ka ha wee gaa n’ụwa niile ka onye ọ bụla -- ma onye Ju ma onye Mbaọzọ -- wee nụ Akụkọ obiụtọ ahụ.

Mgbe ezipụrụ iri mmadụ asaa ahụ, Jisọs sịrị na ha agaghị abà n’ụzọ nke ndị Mbaọzọ, maọbụ kwa ịbànye n’obodo nke ndị Sameria. Emere nke a ka ndị Israel wee nwee ohere ịnabata Oziọma, ka ha wee nweta kwa ọnọdụ ahụ nke Chineke kpọworo ha inwe. Ma ùgbù a ndị náesoụzọ Ya hụrụ na ijéozi ha adịwo ukwuu karịa. Ùgbù a ha ga-aga n’ụwa niile ikwusara ihe niile ekère ekè Oziọma ahụ.

Ndị náesoụzọ Ya gara n’ụwa niile amaara n’oge ahụ. Ha kwesịrị ntụkwasịobi n’ọlụ ha. Akụkọ akọrọ na mgbe gara aga naagwa anyị na ọtụtụ nime ha bụ ndị egburu n’ihi okwukwe ha n’obodo dị nnọọ anya site na Jerusalem. Lee ụdị ihe ịgbaàmà nke a bụ nye anyị n’ihi ịnụọkụn’obi na mkpebì nke ndịa nwere iji mezue iwu nke Jisọs n’òzùzùokè ya! Òlee otú mmụọ nke onye mkwusa njègharị i nwere ra?

Nrịgo ahụ

Mgbe Jisọs nyesịrị ndị náesoụzọ Ya iwu ma kwee kwa ha mkwà nke Nna Ya nke ga-abịakwasị ha, O wee chilie aka Ya elu gọzie ha. Agwaghị anyị okwu niile nke ngọzi ikpeazụ ahụ, kama ọ ghaghị ịbụworị ihe dị nsọ nye ha. Nke a ga-abụ Amen ikpeazụ nye ihe niile nke Ọ kụziworo na nke O kwuworo. Ka Ọ na-agọzi ha, ụkwụ Ya abụọ malitere ibili site n’ala, O wee malite irigo n’Eluigwe; ndị náesoụzọ Ya wee hụ Ya nke ikpeazụ ná ndụ ha n’ụwa a.

Ndị náesoụzọ Ya hụrụ Jisọs ka Ọ na-ala. Ha legidere Ya anya rue mgbe igweojii naara Ya, o wee pụọ n’anya ha, Jisọs efunarịghị ha n’etiti ha dịka Ọ naemeri mgbe ọ bụla O gosichara ha onwe Ya n’oge ahụ O bilisịrị n’ọnwụ. N’oge a, Ọ na-ala n’eluigwe, ọ bụghị ifunárị nwa oge ntà ka O wee gosi kwa ha onwe Ya na mgbe dị n’iru. Ọ dị mkpà dịka iheàmà nye ọgbọ ndị náesochịta na ha hụrụ Ya ka Ọ na-ala. Ọlụ Jisọs nwere ịlụ n’onwe Ya n’oge a agwụwo. Ọ na-arapụ ndị náesoụzọ Ya ka ha gaa n’iru n’ịlụ ọlụ ahụ. Ha legidere Ya anya rue mgbe anya ha ná-apụghị kwa ịhụ Ya ọzọ -- mgbe ahụ ha wee mata na Onyenwe ha alawo.

Ma ngwangwa nke a gasịrị ihe ọzọ pụrụ iche nke dị kwa ebube mere. Ndị mmụọozi abụọ wee guzo ha nso, wee ná-asị, “Jisus nka onye anapuru n’ebe unu nọ rigo n’elu-igwe, nābia n’otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n’elu-igwe.” Jisọs nke a! (ma-ọbụ otù Jisọs a!) Onye ha na Ya kparịtaworo ụkà, rikọọ nri, ñụkọọ kwa iheọñụñụ, gaje ịbịa ọzọ n’ụwa!

Ụkwụ ahụ dị nsọ nke Onyenzọpụta anyị azọkwasịwo n’elu Ugwu Olivet ahụ nke ikpeazụ tutu rue mgbe ụbọchị ahụ dị ebube gaabịa, nke Zekaraia Onye amụma gwara anyị, mgbe ụkwụ ahụ dị ebube ga azọkwasị kwa n’Ugwu ahụ nke nwere ihe nchèta dị nsọ, Ọ ga agbawa kwa abụọ, nkera ya ga-apụzuga n’akụkụ Ugwu, nkera ya ọzọ n’akụkụ Ndịda (Gụọ Zekaraia 14:3-11).

“Si n’Ugwu Olive Onyenzọt’ayị la n’igwe

Ba n’igweoji d’ebube la n’igwe,

Ma otù m’ozi kwur’okwu nkasịobi;

Ọ gabịa n’otú ahụ m’emesịa.”

Olileanya dị ebube! Olileanya dị ngọzi! Nke a bụ olileanya nke na-enwu ọcha nime obi onye ọ bụla bụ ezi onyeKraist n’ụbọchị taa, ọ bụ kwa isi nkasịobi nime obi nke onyeKraist (I Ndi Tesalọnaika 4:18).

Ihe dị icheiche anaahụghị Mgbe ọ bụla

Lee ụdị ihe dị icheiche ana-ahụbeghị mgbe ọ bụla na ihe dị ịtụn’anya nke ndị náesoụzọ OnyeNazaret ahụ dị umeala n’obi hụworo n’ụbọchị ndịa gara-aga! Ha ahụwo Onyenzọpụta ha ka akpọgburu Ya n’elu obe. Aka ha abụọ atọgbọwo kwa arụ Ya n’ílì. N’ụbọchị nke atọ ha amawo kwa jijiji ịhụ na ílì ahụ tọgbọrọ n’efu. Ọzọ, egwù tụkwara ha mgbe Ọ batara n’etiti ha na mberede ka emechisịrị ụzọ niile. Otù mgbe Jisọs guzoro n’ótú isi ụtụtụ, mgbe ha dọgbusịrị onwe ha n’ọlụ ogologo abalị ahụ niile ma ha egbutaghị azụ ọ bụla, O wee ná akpọ ka ha wụnye ihe ha ji égbù azụ n’akụkụ akanri nke ụgbọ ahụ na ha ga-egbu kwa azụ.

Ugbu a ahụwo kwa ihe ọzọ nke dị ịtụn’anya. Jisọs na ndị náesoụzọ Ya anọworị n’Ugwu Olivet. Ha na Ya akparịtawo ụka banyekwara Mmụọ Nsọ ahụ Onye gaje ịbịa inye ha ike ma duba kwa ha n’eziokwu niile. Na mberede O weliri aka elu wee gọzie ha, emesịa Ọ rịgoro n’Eluigwe. Ha elegidewo Ya anya ka Ọ na-arịgo rue mgbe igweojii naara Ya pụọ n’anya ha, ha anụwo kwa ozi nke ndị mụọozi abụọ ahụ ndị ha hụrụ guzoro nso ha. Ebe olileanya dị otú a gbara ha ume, ha laghachịrị na Jerusalem ichere ike ahụ ekwere ná mkwà.

Ịrọpụta Onye Gaanọchị Judas

Ndị náeso ụzọ Ya laghachịrị n’ụlọ elu ahụ nke dị na Jerusalem. Ọ ga-abụworị n’otù ebe ahụ ka ha nọdụrụ rie Nrị-anyasị Ikpeazụ ahụ na ebe Jisọs sakwara ụkwụ ha mgbe ná-adịbeghị anya. Ndịozi irinaotù ahụ, na Meri nne Jisọs, na ụmụnne Ya, na ndị ọzọ -- ihe ra ka otù naarị mmadụ na iriabụọ ndị hụrụ Jisọs n’anya ma so kwa Ya -- nọkọrọ n’ebe ahụ. Nime ụbọchị iri ahụ mgbe Jisọs lasịrị ha nọgidesịrị ike n’ekpere na ịrịọ arịrịọ.

O meturu Pita n’obi ka arọpụta otù onye iwere ọnọdụ Judas, onye dahiere site n’ajọomume. Pita weere ike ya site n’okwu dị icheiche nke ndị amụma kwuru banyere Judas. Ime dịka mmazu ha si dị n’oge ahụ, ndịozi ahụ kpọpụtara mmadụ abụọ, Basabas na Mataias; mgbe ha kpesịrị ekpere ka Onyenwe anyị due ha ná nrọpụta ha ka ewee mezue uche Ya, ha fere nzà. Nzà ahụ wee ma Mataias.

Ọnọdụ ahụ enyere Judas tọgbọrọ n’efu ma ndịozi ahụ dịka mmadụ, chere na ọ dị mkpà ka onye ọzọ were ọnọdụ ahụ. Judas bụrị onye naeji ákpàego nke ndị ahụ, ọ dị mkpà na onye ọzọ gaewere ọnọdụ ahụ nke Judas rapụrụ, ka ewee gboo mkpà nke ndị ahụ n’ihe ana-ahụ anya. Ma anyị ga-ahụ nnọọ ihe bụ uche Chineke dịka emezuru ya ná nrọpụta ahụ dị nsọ nke arọpụtara Pọl iwere ọnọdụ ahụ nke ịbụ onye ozi. Na Pọl bụ onyeozi nke mezuru ha iri na abụọ bụ ihe ana-apụghị inwe obiabụọ maọbụ ịrụụka na ya n’ihi na Mmụọ Nsọ enyewo anyị okwu dị icheiche n’akụkụ dị icheiche n’Akwụkwọozi iji kwagide nke a.

Lee otú ọ gaesi dị ebube ma ọ bụrụ na ndị obodo anyị gaekpe ekpere dịka mmadụ iri na otù a kpere, wee rịọ Chineke ka O were aka Ya rọpụta onye ga-abụ onyeisi obodo, na ndị ga-abụ ndịisi nke ọnọdụ ọchịchị dị icheiche! Ọ dịghị ike ọ bụla ejikọtara ọnụ n’ụwa nke pụrụ ịkwada ọchịchị anyị, n’ihi na anyị ga na-agbaso uche Chineke. Ma anyị onwe anyị, n’otù n’otù, kwesịrị ịmara na anyị aghaghị ikpeekpere dabere kwa n’Onyenwe anyị maka nduzi n’ihe ntà ọ bụla nke anyị naeme kwa ụbọchị nime ndụ anyị. Ọ bụrụ na anyị emee nke a Ya onwe Ya ga eme kwa ka okporo ụzọ anyị niile zieezi, n’ihi na “site n’aka JEHOVA ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike” (Abù Ọma 37:23).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ebe Jisọs na ndị náesoụzọ Ya zukọrọ n’ihe ikpeazụ a nke mere?
  2. Gịnị bụ isiokwu nke mkparịta ụka ha n’oge a?
  3. Gịnị bụ ajụjụ nke ndị náesoụzọ Ya jụrụ? gịnị bụ kwa ọzịzá Ya?
  4. Kọwaa ihe banyere ngọzi ikpeazụ nke Jisọs na nrịgo n’Eluigwe Ya.
  5. Mụọ okwu ndị mmụọozi ahụ n’isi.
  6. Òlee ebe aga ekwusa Oziọma ahụ mgbe nrịgo n’Eluigwe ahụ gasịrị?
  7. Ònye ka arọpụtara n’oge a iwere ọnọdụ Judas dịka onyeozi? Ginị bụ nrọpụta nke Chineke mgbe emesịrị banyere ọnọdụ ahụ tọgbọrọ n’efu?