I Ndi-Eze 1:5-53; 2:1-12

Lesson 254 - Senior

Memory Verse
“Ezi omume nēbuli mba: ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu” (Ilu 14:34).
Cross References

I Ịnara Ọchịchị n’ike nke Adonaija

1. Nzube nke Adonaija maka ịnọkwasị n’ocheeze Devid bụ ihe nke anaemeghị dịka usoro iwu si dị ma bụrụ kwa nnupụisi n’ọchịchị obodo, tụkwasịkwa n’elu nke a, ọ bụ kwa nnupụisi pụtara ìhè megide Chineke, I Ndi Eze 1:5-10; 2 Samuel 3:2-4; Ilu 29:15; 25:27; Obadaia 4; Matiu 23:12

2. Izuzu ọjọọ ya n’oge ọrịa nke Devid, bụ ihe akwụsịrị site n’ọbịbịa nke Netan na Bat-sheba bịakutere Devid, I Ndi Eze 1:11-27

II Solomon, Eze nke Chineke Rọpụtara

1. Ọ bụ ihe were anya na emere ka ndị ọzọ mata na Chineke arọpụtaworị Solomon ịbụeze tutu ọgbáaghara ahụ, I Ndi Eze 1:9-12, 17, 26, 27; I Ihe Emere 22:9, 10; 28:5-7

2. Devid, site n’ịdabere ná mkwà niile na-eguzosịike nke Chineke, kwere Bat-sheba mkwà na nwa ha ga-abụ eze, I Ndi Eze 1:28-31

3. Devid mere Solomon eze dịka usoro iwu si dị mgbe Adonaija na-eguzosibeghị ike n’ọkwá ahụ, I Ndi Eze 1:32-40; I Ihe Emere 23:1

4. Omume a ziriezi nke Devid mere, site n’irubeisi n’okwu Chineke, mere ka ịnara ọchịchị ahụ n’ike wee kwụsị, I Ndi Eze 1:41-49

5. Omume mbụ ahụ ziriezi nke Solomon mere bụ imere Adonaija chègharịrị échègharị ebere, I Ndi-Eze 1:50-53; Ilu 3:3; 11:17; Maika 6:8; Matiu 5:7; Luk 6:36; Jemes 2:13

III Ụbọchị Ikpeazụ niile nke Devid na Iwu O Nyere Solomon

1. Devid nyere Solomon ndụmọdụ ka o debe iwu nke Chineke, nke a gaeme ka mkwà nke Chineke guzosie ike banyere alaeze ahụ, I Ndi Eze 2:1-4; Joshua 1:8; 2 Samuel 7:12-16; I Ihe Emere 22:11-13; Abù Ọma 132:12; 89:29-32

2. Okwu ọzọ nke Devid kwuru bụ banyere ndị ya na ha mekọrọ ihe, I Ndi Eze 2:5-9; 2 Samuel 3:27; 16:5-7; 17:27-29; 20:10

3. Devid nwụrụ, Chineke wee mee ka Solomon nọkwasị n’ocheeze ahụ, I Ndi Eze 2:10-12; I Ihe Emere 29:20-30

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Mmụọ Nsọ naeme ka anyị mata site n’iheòdìdé niile nke Luk na Devid matararị na Chineke ga-eme “ka Kraist nọkwasi n’oche-eze ya,” na Devid kwukwara ihe banyere “nbilite-n’ọnwu nke Kraist ahu, ná arapugh Ya nime Hedis, anu-aru Ya ahugh kwa ire-ure” (Ọlu Ndi-ozi 2:19-31). Anyị matara na nke a bụ eziokwu site n’ọzịzá nke Devid zaghachiri Chineke mgbe emere ọgbụgbàndụ ahụ banyere Alaeze ebighịebi nke Kraist.

Site n’okwu ndịa, anaeme ka anyị mara na okwu banyere ịnọkwasị n’ocheeze Israel bụ ihe dị óké mkpà. Anyị matakwara na njehie ọ bụla ejehiere megide àtụmààtụ ọ bụla nke Chineke bụ nnupu-isi dị ukwuu megide Chineke onwe-Ya.

Mmadụ Iweli onwe-ya elu

Adonaija “weliri onwe-ya elu.” N’ezie nke a bụ omume dị nime ya site na nwata. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọ gbara mbọ ịrapụ omume nke ebumpụtaụwa a maọbụ iguzogide ya. Ọ dịghị kwa mgbe ndị mụrụ ya nyere ya ahụhụ maka nke a mgbe ọ nọ n’okpuru ha. Mmadụ iweli onwe-ya elu bụ mmehie, bụrụ kwa ọchịchọ ana-ahụkarị nime obi ọtụtụ mmadụ, o nwekwara ike iweta nsogbu dị ukwuu nye ndị ahụ ná-achọghị ịkwụsị ya n’onwe-ha maọbụ ikwe ka Mmụọ Chineke sachapụ ya nime ndụ ha.

Akụziiri anyị n’Akwụkwọnsọ ka anyị ná-ebuli Chineke elu. Akụzikwaara anyị ka anyị ná-asọpụrụ Ya, ná-efé Ya òfùfè, ná-ejekwara Ya ozi. Ndị ná-ebuli onwe-ha elu adịghị eme ihe ndịa, kama ndị dị otú a na-eme náánị ọchịchọ nke onwe-ha ná-eche kwa náánị ihe banyere onwe-ha. Ha adịghị eche ihe banyere ụgwọọlụ nke ná-adịru ebighịebi, kama nke a ha jupụtara náánị n’ịchọ ihe nke oge a, na ọchịchọ nke onwe-onye ụbọchị niile. Ma n’ezie ha ga-amata na ikpeazụ nke omume dị otú a agaghị adị ka mmalite ya maọbụ otú ha lere anya, n’ihi na Akwụkwọnsọ na-akụziri anyị na “onye ọ bula nke gēweli onwe-ya elu, agēweda ya” (Matiu 23:12).

Ọ dịghị urù ọ bụla nke Adọnaija ritara site n’ịhụ ọdịda na mmeri nke emeriri Absalom. Kama ọ gbasoro ndụ nnupuisi nke nwanne-ya nwoke. Adonaija guzogidere àtụmààtụ nke Chineke, n’ihi na ọ bụ ihe pụtara ìhè site n’ebe ahụ nke anyị gụrụ na ọtụtụ mmadụ matararị nzube nke Chineke banyere onye ga-anọkwasị n’ocheeze ahụ karịa otú Devid onwe-ya matara.

Ndị niile ná-eguzogide àtụmààtụ Chineke bụ ndị náemebiiwu Ya. Ajọ ọnọdụ a nke dị nime Adonaija bụ ihe ibuli onwe ya elu wetaara ya. Ọ malitere na mbụ site n’ibuli onwe-ya elu n’anya nke onwe-ya; ma mgbe ọ rapụrụ nke a ná-egbochighị ya, o wee dịrị ya mfé ibuli onwe-ya elu n’iru ndị ọzọ, n’ikpeazụ o mee kwa ya n’ebe nna ya nọ -- bụ onye nke Chineke e téré mmanụ.

Adọnaija mara nnọọ mma n’ile ya anya. O gosiri nnọọ n’ụzọ doro anya na o nwere onyinye nke ịchịisi. Ọ ga-abụworị onye Chineke ga-eji lụọọlụ n’alaeze ahụ n’ebe ọ dị ukwuu ma ọ bụrụ na o wedara onwe-ya n’ala n’iru Chineke na mmadụ. Ọ gaghị abụworị onye achụpụrụachụpụ n’ijéozi nye ndị ya na Chineke ya ma ọ bụrụ na o rubeere Chineke isi n’okwu a. Ma Adonaija ejikereghị irubeisi n’uche na n’ọchịchọ nke Chineke dị ọcha ma dị kwa nsọ. Kama ọ rọorọ ibuli onwe ya elu, site kwa n’ime nke a o wee bụrụ onye nupụrụisi megide Chineke na onye nke Chineke rọpụtara. Ọ bụrụ na ọ chọrọrị iweta mkpà ya n’iru Chineke ma chere kwa oge nke Chineke, ọ ga-abụworị onye Chineke tinyere n’ọnọdụ ebe aha ya ga-abụ ngọzi, kama ịbụ nkọcha, n’akụkọ nke Israel.

Ụzọ niile nke Chineke na Ụzọ niile nke Mmadụ

“Uzọ di nke ziri ezi n’iru madu … .” Ọtụtụ mgbe ụzọ dị icheiche nke Chineke rọpụtara na-emegide amamihe nke mmadụ. Chineke na-arọpụta àtụmààtụ nke Ọ chọrọ ná-eme kwa ka àtụmààtụ ahụ guzosie ike dịka uche Ya n’amamihe Ya nke ná-enweghị nsọtụ si dị. Chineke dị ukwuu karịsịa ihe niile. Ọ dịghị Ya mkpà ka mmadụ nye Ya ndụmọdụ, maọbụ lụọọlụ n’ụzọ nke anyị chere na ọ dị mma n’anya anyị, ime ka ọlụ Ya gaa nkeọma. Ọ dị mgbe ụfọdụ ọ na-adị anyị ka Ọ kpachaara anya ná-eme ihe n’ụzọ megidere ụzọ nke mmadụ, ka O wee gosipụta ịdị ukwuu Ya gosi kwa na Ya onwe-Ya dị elu karịsịa ihe niile nke ụwa na ihe niile gbasara mmadụ.

Ná-agbaghị agụgọ, usoro nke ịnọkwasị n’ocheeze n’etiti ndị Mbaọzọ, na-abụkarị site n’onye nke okenye n’etiti ụmụ ndịkom nke èzínaụlọ ahụ ọchịchị dị n’aka ha. Omenala Israel banyere nwa eburu ụzọ mụọ nke èzínaụlọ ọ bụla na òkè nke ruuru ya, ga-egosiworị ọtụtụ mmadụ n’Israel na ọ bụ kwa usoro a ka ha ga-eso n’ihe banyere onye ga-anọkwasị n’ocheeze nke alaeze ahụ. Ma nke a ga-abụworị nchepụta nke mmadụ, ọ dịghị mkpà na Chineke ga-eso ụzọ ahụ maọbụ lụọọlụ dịka àtụmàtụ ahụ si dị.

Ná nrọpụta nke a, Chineke jụrụ nke okenye nime ụmụ ndịkom nke Devid wee rọrọ nke ntà. Chineke hụrụ ihe dị n’obi Adonaija, mara kwa ihe dị n’obi Solomon. Chineke maara onye O nwere ike ịtụkwasịobi. Ọ matakwara omume ọjọọ, adịghị nsọ -- enweghị nzọpụta -- nke ndụ Adonaija onye jupụtara n’omume anụarụ na nfụlielu, Ọ matakwara na ụdị mmadụ Solomon bụ onye udo na onye ga-aña ntị na ndụmọdụ nke Mmụọ Nsọ.

Adonaija mere onwe ya eze n’oge nke ya onwe ya rọpụtara; Chineke tere Solomon mmanụ ịbụ eze, mgbe oge Chineke ruru. Adonaija chọrọ ịnata iruọma nke mmadụ, na iguzobe onwe-ya n’alaeze ahụ site n’ọchịchọ anụarụ na nime oriri na ọñụñụ; emere Solomon eze n’enweghị ụdị mgbalị ọ bụla dị otú a nke sitere n’aka mmadụ kama ọ bụ dịka àtụmààtụ Chineke si dị. Adonaija gbalịrị ịdọkọrọ Israel nye onwe ya site n’ijekwuru ndịisi ha; Devid na Solomon rapụrụ ihe niile n’aka Chineke, ma n’ikpeazụ, chọpụta na “anya Israel nile” dị n’ebe ha nọ na “JEHOVA we me ka Solomon di uku ri nne n’anya Israel nile, O we tinyekwasi ya ebube ala-eze nke anātukwasigh eze Israel ọ bula nke buru ya uzọ” (I Ihe Emere 29:25).

Mkpà ọ dị Iso Ndị kwesịrịekwesị

Adonaija, ka o tinye àtụmààtụ ya n’ọlụ, kpọrọ náánị ndị o chere na ha ga-ekwenyere ya ná nnupụisi ya; Devid jiri ndị náatụ egwù Chineke, ndị dị nwayọ na ndị eziokwu, gbaa onwe-ya gburugburu, ọ bụ ihe anyị kwesịrị ịmata na obi Devid na nke ndịkom ndịa na-asọpụrụ Chineke bụ otù. Ọ bụ kwa ihe pụtara ìhè, na Netan, onye nke Chineke, nwere ohere ijekwuru eze mgbe niile nwee kwa mmasị ná ntụkwasịobi nke eze nwere n’ebe ọ nọ.

Ọ dịghị Bazilai ọ bụla nọ n’etiti ndị soro Adonaija. Ọ dịghị kwa Netan ahụrụ n’ebe ahụ. Ndị so n’ọnụọgụgụ mmadụ iriatọ (30) ahụ bụ “ndikom dị ike” ndị jeworo ozi n’Israel n’ikwesị ntụkwasịobi ihe ra ka otù ọgbọ n’oge ihe siri ike na n’iheegwù dị icheiche, sooro Devid -- ọ bụghị Adonaija.

Ma anyị hụrụ na enwere Joab n’etiti ndị soro Adonaija. Anyị hụrụ na Joab bụ nwoke wụsịworo ọbara agha na mgbe udo. O gbuworị mmadụ n’ihi ndọrọndọrọ ọchịchị na urù nke ihe ụwa. Ọ bụrịị onye ná-adịghị erubeisi ọtụtụ mgbe, onyeisiike, na onye ná-enupụisi n’ebe okwu nke eze ya dị.

Ị ga-ahụ kwa na Abaiata nọnyeere Adonaija. Abaiata bụ onye ikpeazụ sitere n’agbụrụ Ilai, ma o nwere ọtụtụ ohere dị mma ná-agbanyeghị ihe ọjọọ ahụ dị ukwuu nke ọbụbụọnụ ahụ abụrụ ndị niile sitere n’agbụrụ Ilai n’ihi mmehie niile nke Ilai. Abaiata egosiwo ikwesị ntụkwasịobi na nwa mgbe ntà, n’ọchịchị Devid, ma ọ rapụrụ “isozum n’azu” ma n’ikpeazu o wee kwụọ ụgwọ nke mmehie ya niile. Ọ ghọrọ onye anapụrụ ọnọdụ nsọpụrụ ya site n’ịbụ onye emezuru ọbụbụọnụ ahụ nke abụrụ ụlọ Ilai n’isi ya.

Akwụkwọnsọ na-adọ anyị akanántị mgbe niile banyere iheegwù nke dị ná nsokọrịta nke ná-abaghị urù nke anyị na ndị ná-amaghị Chineke. “Unu na ndi nēkwegh ekwe ekekọtala onwe unu” bụ okwu nke Mmụọ Nsọ kwuru site n’ọnụ Pọl Onyeozi (2 Ndi Kọrint 6:14). Jọn onye ahụrụ n’anya dere sị: “Ọ buru na onye ọ bula abiakute unu, ma o wetagh ozízí a, unu akpọbatala ya n’ulo, unu asi-kwa-la ya biri nke ọma” (2 Jọn 10). Pọl Onyeozi sịrị, “Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma.” Akụzikwara otù eziokwu a n’oge Agba Ochie, n’ihi na anyị hụrụ ọtụtụ ihe mere n’ebe ahụ nke na-adụ anyị ọdụ n’otù ụzọ ahụ.

Ọ dịghị ihe-ngọpụ nye emeghị nkeọma kwesịrị ịdị n’okwu a, n’ihi na ọbụná n’iheòdídé nke ná-esiteghị n’Akwụkwọnsọ, mmadụ nwekwara ike ịgwọta ụdị ịdọakanántị ndịa. Ọ bụrị ụkpụrụ nke ná-eguzosi ike site ná mmalite. Otù onye nime ndị óké mmụta nke mgbe ochie sịrị, “Onye ọ bụla na-adị ka òtù ahụ ọ na-eso.” Onye ọzọ dere sị “Gwam onye gị na ya na-eso, m’ga-agwa gị onye ị bụ.”

Irubeisi Ọsọsọ nke Devid

Mgbe egosirị Devid ihe egwù nke dị n’ịtụfu oge maka ikwupụta nzube Chineke banyere onye ga-anọkwasị n’ocheeze nke alaeze ahụ, Devid mere ọsọsọ ime nke a. Ná agbaghịagụgọ, o nyere iwu dịka ndụmọdụ ahụ si dị bụ nke Netan onye nke Chineke nyere ya. É tere Solomon mmanụ ịbụ eze dịka uche Chineke si dị. Ọ bụ Chineke mewororị nrọpụta ahụ, kwupụta àtụmààtụ ahụ, gosi kwa ya site n’onye nke Chineke na oge ahụ eruwo. Devid mere ya n’oge o kwesịrị -- oge nke Chineke -- mgbe ahụ o wee weda onwe ya n’okpuru eze ọhụụ ahụ, kpọkwasị kwa ngọzi dị ukwuu n’isi nwaokorọbịa ahụ.

Site ná ngọzi ahụ Devid gọziri Solomon, ịdọakanántị dị nime ya, ná ndụmọdụ banyere nrubeisi, na ịnọgidesiike n’iwu nke Chineke. N’iru ndịisi niile nke Israel, Devid nyere ndụmọdụ dị icheiche banyere owuwu nke Ụlọukwu Chineke, usoro nke òfùfènrò na ọlụ nke Chineke, na ime ka ọlụ dị icheiche nke ọchịchị gọvment gaa nkeọma. O mekwara ka eze ọhụụ ahụ mara ndị niile guzogidere ọchịchị ya na nzube ya n’oge ọchịchị eze nke garaaga.

Ndị niile nke soro n’oriri na ọñụñụ ahụ nke Adonaija mere jiri ọsọsọ na egwù rapụ ememe ha wee gaa n’ụzọ nke aka ha. Ha nọ n’ọmụmaikpé n’ihi na ha kwenyere n’ihe ahụ nke ngọzi Chineke ná-adịghị n’elu ya. Rịbaama ihe dị iche n’usoro Adonaija jiri mee onwe ya eze na nke Devid. Ndị niile nke soro Devid na Solomon fèrè Chineke dị ndụ, n’ihi na ha sọpụụrụ Chineke wee so kwa ụzọ Ya. Ha chụrụ àjà dị icheiche; ha nyekwara Chineke otuto; ha wee were “ọñù uku rie ihe ñụ kwa ihe-ọñuñu n’iru JEHOVA ubọchi ahu.” Ụzọ nke ụmụmmadụ na-eweta egwù na ọdịda. Ụzọ nke Chineke na-eweta okwukwe na mmeri.

Ụgwọọlụ nke Mmehie

N’ịgụ akụkọ nke ná-esota, anyị ga-ahụ omume nke Solomon mesoro ndị ahụ nke guzogidere nna ya na ndị nwara ịkwatu àtụmààtụ nke Chineke. Anyị pụrụ ịhụ mmalite nke amamihe ahụ nke mesịrị bụrụ ihe eji mara eze ukwu a nke ndị Israel na ihe mekwara ka ọ bụrụ onye pụrụ iche.

Egbughị Abaiata, bụ onyenchụàjà, n’ihi na ọ bụrị onye kwesịrị ntụkwasịobi n’oge Devid gbapụrụ n’ihi ndụ ya. Ma anapụrụ ya ọnọdụ ya wee zilaga ya n’ụlọ ya n’ihere n’ihe na ọ nọgidesighị ike n’ezi mmụọ nke o nwere na mbụ rue n’ikpeazụ nke ndụ ya.

Adonaija dara n’iru ebeịchụàjà wee jide mpi ebeịchụàjà ahụ, nime iruuju nke akọnauche ya na nime nghọta ya banyere ahụhụ nke ikpe ziriezi nke aga-enye ya. Ọ bụrụ na ọ chọrọ ichègharị, ọ gaghị ejeworị ijide mpi nke ebeịchụàjà ahụ. Ọ bụghị n’ihi nke a ka eji debe mpi ahụ. Ọ dịghị nchègharị ọ bụla dị n’obi Adonaija, ọ dịghị kwa ihe gosiri nchègharị n’omume ya niile. Omume ya bụ nnọọ nke aghụghọ -- ụzọ mmadụ chèpụtara iji gbanwee ụzọ nke Chineke -- ka o wee nweta nchèbe ná ndụ nke ánáahụ anya na ịnata ebere ma eleghị anya. Omume o mere n’ikpeazụ na-egosi na ọ ka-nwere ọchịchọ na nzube nke ịnọkwasị n’ocheeze ahụ ọ bụ ezie na emeworị ka uche Chineke pụta ìhè ma bụrụ kwa ihe etinyere n’ọlụ. Ọ ka-nwekwara ọchịchọ nke ịga n’ụzọ nke aka ya kama ịga n’ụzọ nke Chineke. Ya mere, ọ bụ nnọọ onye nnupụisi megide Chineke.

Shimai bụ ihe-atụ nke ndị ahụ ndị ná-echègharị n’ihi otù ihe nke ha bu n’obi, nke bụ ịgbanarị ahụhụ ajọomume nke gaje ịbịakwasị ha ngwangwa. Ndị dị otú a adịghị ezube ịnọgide n’iwu nke enyere ha, kama ná-eme ihe dịka o si dị ha mma ngwangwa ha chọrọ isite na ya gaa n’ụzọ nke aka ha kama ịga n’ụzọ nke Chineke.

Ọ dịghị mkpà na aga-ejide Shimai n’azụ obodo ịbụ onye kwesịrị ịnata ahụhụ ahụ nke ziriezi inye ya n’ihi imebi iwu ahụ nke enyere banyere ya. Ọ dara iwu nke nnupụisi ma hụ kwa ahụhụ n’ihi omume ahụ.

Joab, n’otù aka ahụ, chọrọ ebe nsọ n’ụzọ megidere iwu n’Ụlọukwu Chineke. O kwesịghị ịnọ n’ebe nsọ ahụ, ebe ọ bụ na o chègharịbeghị n’ihi ọbara nke ndị ná-emeghị ihe ọjọọ nke dị n’ọbụaka ya abụọ. O wetaghị ihe ịchụàjà ọ bụla maka mmehie ya. Ọ kwaghị kwa ụta ọ bụla n’ihi mmehie ya niile, o rughị újú, o chègharịghị kwa. Ọ chọrọ náánị ndụ nke anaahụ anya chọọ kwa iji ihe nke Chineke nweta ọchịchọ nke onwe ya. Ọ jụrụ ụzọ nke amara wee nọgide n’ụzọ nke aka ya n’isiike. Ya mere egburu ya n’ebe ịchụ àjà nke Chineke. N’ebe ahụ nke ọtụtụ mmadụ na-amalite inwe ndụ nke imemmụọ alụpụtaghị ụdị ọlụ a n’obi ya. Ọ ghọọrọ Joab ebe ịnwụ ọnwụ nke ana-ahụ anya nke kakwara ọnwụ nke imemmụọ ya ákàrà rue mgbe ebighịebi.

Ọ dị ọtụtụ mmadụ ndị ná-eche na náánị ịbịa n’ụlọ nzukọ ga-egbochi ọnụma na ikpé nke Chineke n’isi ha. Ọ dị ọtụtụ mmadụ ndị ná-eche na ikpé Chineke agaghị abịakwasị ha ma-ọbụrụ na ana-ahụ ha n’ebe ụfọdụ edoro nsọ. Ma okpukpé ha abụghị ụdị okpukpé ahụ nke ga-enye ha nchèbe na inwereonwe mgbe iheotiti nke sitere n’aka Chineke ga-abịa. Ha ga-ahụ na iwe nke Chineke ga-eweta ahụhụ n’ebe ọ bụla na n’ihe niile nke ná-adịghị dịka àtụmààtụ Chineke si dị, na nke ana-ejighi Ọbara ahụ dị nsọ kpuchie.

Ezi nchègharị bụ nke ahụ sitere n’obi etiwaraetiwa na nke egwepịaraegwepịa. Nchèbe adịghị ma ọ bụghị nke ahụ sitere n’Ọbara nke Ọgbụgbandụ Ebighịebi ahụ -- Ọbara ahụ nke Devid hụrụ site n’anya nke amụma, site na mgbe ebighịebi garaaga, dịka Eze ukwu nke ga-anọkwasị n’ocheeze ebighịebi nke Israel -- ocheeze ahụ nke ọ hụrụ nwa ya nwoke ka ọ nọkwasịrị na ya n’ụbọchị ahụ arọpụtara puku arọ atọ garaaga.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ihe mgbakwasịụkwụ nke Adonaija nwere iji ná-eche na ya onwe ya ga-abụ eze ọzọ nke Israel?
  2. Usoro ahụ nke o ji chọọ ịnara nsọpụrụ ahụ ò ziriezi?
  3. Òlee otú Devid si nụ akụkọ ahụ banyere ịnara ọchịchị n’ike?
  4. Gịnị mere Devid ji chọsie ike ka Solomon bụrụ eze?
  5. Gụọ Ọlu Ndi-ozi 2:29-31 na 2 Samuel 7:11-13, 16, 19. Òlee otú Devid madebere n’ihe banyere Kraist na ọbịbịa Ya?
  6. Gịnị bụ ọchịchọ anụarụ dị nime Adonaija nke wetara ọdịda ya?
  7. Ndị ọzọ hà matara ihe banyere uche Chineke maka nrọpụta eze ọzọ nke ndị Israel?
  8. Kọwaa ihe banyere mmekọrịta nke dị n’etiti Devid na Netan onyeamụma.
  9. Gịnị bụ omume nke Solomon mesoro Adonaija?
  10. Gịnị bụ ihe yiri ibe ya na I Ndi Eze 1:52 na Ezikiel 18:4, 20? Kọwaa otú eziokwu a siri pụta ìhè nime ndụ nke ụfọdụ ndịa anyị mụrụ ihe banyere ha n’iheọgụgụ anyị.