I Ndi Eze 3:5-15; 4:21-34

Lesson 255 - Senior

Memory Verse
“Tukwasi JEHOVA obi, me kwa ezi ihe; biri n’ala, nāzu kwa onwe-gi n’ikwesi-ntukwasi-obi” (Abù Ọma 37:3).
Cross References

I Mkwà nke Chineke na Ekpere nke Solomon

1. Chineke kwere Solomon mkwà nke ná-enweghị ọgwụgwụ, I Ndi Eze 3:5; 2 Ihe Emere 1:7

2. Mkwà niile nke Chineke n’ebe ndị kwere ekwe nọ n’ụbọchị taa enwèghị kwa ọgwụgwụ, Jọn 15:7; Matiu 7:7, 8; Mak 11:24

3. Solomon gosịrị obi umeala, dịka ọtụtụ ndịkom ọzọ dị ike nke Chineke, I Ndi Eze 3:6-8; Jeremaia 1:6; Ọpupu 4:10; Jenesis 18:27; 32:10; Ndi Ikpe 6:15; 2 Samuel 7:18

4. Solomon rịọrọ amamihe iji chịa Israel, I Ndi Eze 3:9, 10; Job 28:28; Jemes 1:5-7; I Ndi Kọrint 1:23, 24; Ndi Kọlọsi 2:2, 3

5. Chineke na-azaghachi Solomon, I Ndi Eze 3:11-15; Matiu 6:33

II Ịbaụba na Ebube nke Alaeze Solomon

1. Emezuru mkwà niile nke ekwere Abraham banyere ihe nke ụwa a, I Ndi Eze 4:21, 24, 25; Jenesis 22:17; 15:18

2. Chineke nyere Solomon ihe niile n’uju, I Ndi Eze 4:22, 23, 26-28; Luk 6:38

3. Chineke nyere Solomon amamihe, I Ndi Eze 4:29-34; Matiu 12:42

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Otù Nwaokorọbịa Azọpụtara

“Ma Solomon huru JEHOVA n’anya.” Nke a bụ ihe mbụ na nke kachasị n’iwu nke Jisọs nyere “I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n’anya” (Matiu 22:37). Ịhụn’anya a nke dị omimi nke ná-adị nime obi mmadụ na-abịa site náánị n’ọmụmụ ọhụụ. Anyị amataghị mgbe Solomon nwere ọmụmụ ọhụụ, ma ọ dị mfé ikwu na o dere site n’ihe nke ọ nwapụtaworo mgbe ọ sịrị, “Cheta kwa Onye keworo gi n’ubọchi nile i di n’okorọbia” (Eklisiastis 12:1). Nke a bụ iheàmà nke ná-egosi na ọ dị mgbe azọpụtara Solomon ná ndụ ya, n’ihi na iheòdídé ya niile na Okwu Chineke dakọtara. “N’ihi na ọ digh amuma ọ bula nke eji ọchichọ madụ bu mgbe ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwu okwu, mgbe Mọ Nsọ nēme ka ha kwue” (2 Pita 1:21).

Solomon ka bụ nnọọ okorọbịa mgbe ọ malitere ọchịchị, okwu nke ya onwe-ya bụ, “Mu onwem bu nwatakiri” (I Ndi Eze 3:7). Devid kpọrọ ya “nwata di kwa nrò.” Ụfọdụ na-eche na ọ gbara ihe dị ka iri arọ abụọ. Arọ ole ọ bụla ọ dị, ịhụn’anya Solomon nwere n’ebe Onyenwe anyị nọ mere ka ọ kpọkọta ndịisi niile nke nnụ abụọ na ọgụ iri, na ndịikpé, na onyeisi ọ bụla nke Israel ka ha soro ya jerue Gibeon. N’ebe ahụ, n’elu ebe ịchụàjà ọla nke guzoro n’iru Ụlọikwu nzute nke Chineke, bụ nke Moses mere, Solomon wee suree otù puku àjà nsureọkụ nye Jehova (Lee 2 Ihe Emere 1:3-6). Chee échìchè banyere nke a -- otù puku àjà nsureọkụ! Ọ na-egosi obi ekele nke Solomon. Onyinye afọofufo nke a tọrọ Jehova ụtọ. N’abalị ahụ Jehova mere ka Solomon hụ Ya anya ná nrọ, Ọ sị, “Riọ ihe M’gēnye gi” (I Ndi Eze 3:5).

Mkwà dị icheiche nke Chineke

Onye n’etiti anyị ka obi na atọbeghị òké ụtọ otù oge ná ndụ ya inwe ntụkwasịobi n’ụdị mkwà dị otú a na enweghị atụ. Lee Solomon, náánị nwaokorọbịa ma ọ nọkwasịwo dịka eze n’ocheeze, Chineke wee kwee kwa ya mkwà dị otú a ná enweghị atụ, “Riọ ihe M’gēnye gi.” Tụgharịa uche banyere ezi onyinye niile nke Onyeòkìkè pụrụ ime ihe niile na-enye. Ọ dịghị ihe siri ike n’ebe Chineke nọ. Gịnị ga-abụ arịrịọ nke gị?

Eleghịanya ị na-eche na ọ bụ náánị Solomon bụ onye kwesịrị n’ebe Chineke nọ ịnata ụdị óké mkwà dị otú a n’aka Ya. Ma ka anyị tụgharịa uche banyere mkwà dị icheiche dịịrị ndị niile kwere ekwe n’ụbọchị taa. “Riọnu, agēnye kwa unu, chọnu, unu gāchọta kwa, kuanu, agēmeghe kwara unu: n’ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere” (Matiu 7:7, 8). Ọ ga-abụ na mkwà ndịa dịịrị náánị mmadụ olenaole? Ọ bụghị otù Chineke a ka anyị niile na-efè? Ọ bụrụ na arịrịọ nke anyị ga-abụ maka amamihe, dịka nke Solomon, anyị ga-anata ya, n’ihi na anyị nwere ntụkwasịobi na “Ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n’aka Chineke, Onye nēnye madu nile n’afọ ofufo, nātagh kwa uta; agēwere kwa ya nye ya” (Jemes 1:5). Jemes wee tụkwasị iwu a sị: “Ma ya riọ n’okwukwe, ghara inwe obi-abua: n’ihi na onye nwere obi-abua yiri ebili miri nke óké osimiri mgbe ifufe nēfegharị ya, anātuli kwa ya elu. N’ihi na ka madu ahu ghara ichè na ọ gānata ihe ọ bula n’aka Onye-nwe-ayi” (Jemes 1:6, 7).

Mkwà Dị Icheiche N’okpuru Iwu

Ijè ahụ nke Solomon jere rue Gibeon ná mmalite nke ọchịchị ya bụ maka iche onweya na iji obi ya chụọ àjà n’ọlụ nke Chineke. Àjà niile nke ọ chụrụ bụ óké ihe ngosi nke imemmụọ. Ha nọchiri anya ijiobichụọàjà dị omimi na inye Onyenwe anyị otuto. “Ya mere, ka ayi site n’aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahu bu, nkpuru egbugbere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya” ( Ndi Hibru 13:15). Anyị gaaghọtacha nkeọma ihe àjà ndịa pụtara site n’ekpere nke Devid “Ka edozie ekperem dika ihe-nsure-ọku nēsi isi utọ n’iru Gi: ka nchili ọbu-akam buru onyinye-inata iru-ọma nke anyasi” (Abu Ọma 141:2). Chineke naachọ ijiobichụọàjà nke ndị nọ n’okpuru amara a dịka Ọ chọwororị nke ndị nọ n’okpuru Iwu.

Ịchụàjà dị icheiche n’Okpuru Amara

“Ya mere, umu-nnam, ejim obi ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n’iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di” (Ndi Rom 12:1). Ọ dịghị ihe ọ bụla nke bụ ihe ná ezighịezi n’ihe niile nke Chineke naachọ n’aka anyị. Ha niile dị n’ike aka anyị ime ha; mgbe ọ bụla anyị ghọtara nke a, ọ na-enyere anyị aka n’ijiobichụaàjà anyị. Mgbe ụfọdụ nne na nna na-achọ ihe náezighịezi maka ụmụ ha, ma Chineke adịghị achọ ihe ọ bụla ná-ezighiezi n’aka ụmụ Ya. Ihe niile Ọ na-achọ bụ ihe ziriezi, ọ dị kwa n’ike aka anyị inye ha n’ihi na ọ bụ Ya nyere anyị ihe niile. Ọtụtụ mmadụ adịghị eche échìchè ịgọnarị onwe ha ihe ọ bụla. Ma ọtụtụ mgbe ihe ndị ahụ nke dị ntà n’anya anyị nke anyị nwere ike ịgọnarị onweanyị, nwere ike bụrụ ụzọ dị ukwuu ịbịaru Chineke nso n’ụzọ dị omimi. Mgbe ụfọdụ ụmụmmadụ na-achọ ka onye ọzọ ná-eburu ha obe ha, ma Jisọs sịrị, “Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n’azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam” (Matiu 16:24).

Inyeekele na Obiumeala

“Site n’ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ” (Ndi Filipai 4:6). Ọ bụ mgbe Solomon suresịrị puku àjànsureọkụ ka Jehova mere ka ọ hụ Ya anya, wee gwa ya ka o mee ka Ọ mara arịrịọ ya. “Mu onwem bu nwatakiri,” ka Solomon zara, “Amaghm ipu apu na ibata” (I Ndi Eze 3:7). Ụdị obi umeala dị otú a bụ akara nke nwoke bụ dimkpà. Okwu nke ya onwe-ya bụ, “N’iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga” (Ilu 15:33). “Uzọ idi-elu bu idi-ala” bụ ụzọ ọzọ agaesi kwue na “Onye ọ bula nke gēweli onwe-ya elu, agēweda ya” (Matiu 23:12). Arịrịọ obi umeala nke Solomon maka obi na-aghọta ihe tọrọ Jehova ụtọ, O nyekwara ya obi nke ná-aghọta ihe.

Àkụ dị icheiche nke Zoroezo

Ụfọdụ mmadụ gana-eche na Solomon biliri nnọọ ná nrọ ya wee ghọọ onye amamihe nke kachasị ukwu n’eluụwa. Ná-enweghị obiabụọ nke a abụghị otú o si mee dịka na o jiri igbeàkụ nke ihe ná-adịghị nime ya rarụ ụra, wee were kwa ya teta mgbe o jupụtara n’ihe. Chineke na-agwa anyị okwu site n’iheodide nke Solomon, na ọ bụ ihe dị mkpà ka anyị jisie ike chọọ amamihe. “Ọ buru na ọ bu nmuta ka i nākpọku, ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi, ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha, ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo mgbe ahụ ka i gāghọta egwù Jehova, ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta” (Ilu 2:3-5). Chineke na enye mmadụ ike, ma ịbaụba nke amamihe anyị na ọgan’iru nke talent anyị na-esite n’ịlụsi ọlụ ike nke anyị onweanyị. Chineke na-enye anyị ihe site n’otú anyị si debe onwe anyị n’usoro nke mkwà Ya. Mgbe anyị na-eji ike ahụ nke O nyere anyị ná alụ ọlụ, mgbe ahụ ka Ọ ga-eme ka ọ na-abaụba; Ọ na-ele kwa anya ka anyị tinye ha n’ọlụ. Dịka ihe ịmaatụ, mgbe ụmụ Israel batara nime Ala Kenean, Chineke ezipụghị iheotiti n’iru ndị Israel iji ya gbuchapụ ndị ahụ nke ná-efè arụsị tutu ndị Israel abata n’ala ahụ. O mere ka ndị Israel ná apụapụ ịlụ agha dịrị ha. Ọ na-enye kwa ha mmeri n’agha niile ha na-ebu. Ọ bụrụ na ha alụghị agha ha agaghị enwe mmeri.

Ihe Mbụ Niile

Ekpere nke Solomon na Okwu nke Jisọs dakọtara nnọọ: “Buru uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile” (Matiu 6:33). Ọ bụghị àkụnaụba ka ọ chọrọ, ọ bụghị nsọpụrụ ka ọ chọrọ; ọ bụghị ka o merie n’agha ka ọ chọrọ; ọ bụghị kwa ike ka ọ chọrọ. Nke a na-eme ka anyị mụta ihe nime ndụ nke ekpere anyị, usoro ekpere nke ná-atọ Chineke ụtọ na nke ná-adịghị atọ Ya mgbe ọ bụla anyị na-arịọ Ya ihe. Mgbe ọ bụla anyị na-ekpe ekpere, Chineke na-achọ ka anyị were ihe mbụ debe n’ọnọdụ mbụ. Chineke nyere Solomon ọtụtụ ihe nke ọ na-arịọghị, Ọ ga-emekwara anyị otù aka ahụ ma ọ bụrụ na anyị ga-ebu ụzọ chọọ Alaeze Chineke.

Ókèala Niile nke Israel

“Solomon we nāchi ala-eze nile site n’Osimiri nke Yufretis rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt” (I Ndi Eze 4:21). O wee bụrụ na mkwà ahụ nke Chineke kwere Abraham mezuru n’ụbọchị nke Solomon: “Nkpuru-gi ka M’nyeworo ala nka, site n’Osimiri Ijipt rue osimiri uku ahu, bú Yufretis” (Jenesis 15:18).

Onye ka Solomon Ukwuu

“Chineke nye-kwa-ra Solomon amam-ihe na nghọta riri nne nke ukuu, na obi sara mbara dika ájá nke di n’usọ oké osimiri” (I Ndi Eze 4:29). “Ha we si na ndi nile bia inu amam-ihe Solomon, si n’eze nile nke ụwa” (I Ndi Eze 4:34). Ha nụrụ okwu nke Solomon, ma anyị nwere Okwu nke Onye ka Solomon ukwuu -- Onyenwe anyị, Jisọs Kraist.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ebe Ụlọikwụụ nzute na ebeịchụàjà ọla dị mgbe Solomon malitere ọchịchị ya?
  2. Òlee ebe Igbe Ọgbụgbandụ dị n’oge a?
  3. Nye iheàmà i nwere ike inye maka nzọpụta nke Solomon.
  4. Gịnị mere n’ụbọchị ahụ tutu Jehova e mee ka Solomon hụ Ya anya?
  5. Depụta ụfọdụ mkwà dị ukwuu nke Chineke kwere ndị nke Ya n’ụbọchị taa.
  6. Gịnị bụ ndụmọdụ ụfọdụ Solomon nyere banyere ụzọ esi enweta amamihe?
  7. N’ụzọ dị añaa ka arịrịọ nke Solomon si yie ibu ụzọ chọọ Alaeze Chineke?
  8. Ị pụrụ ịchọpụta otù mkwà nke ekwere Solomon na aga-emezuru ya ma ọ bụrụ na o rube isi (I Ndi Eze 3) nke ana-emezughi?
  9. Òlee mkwà ekwere Abraham nke mezuru n’oge ọchịchị Solomon?
  10. Kpọọ aha ụzọ ụfọdụ eji mee ka amamihe Solomon pụta ìhè.