Lesson 256 - Senior
Memory Verse
“Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi bi n’ulo Gi bu: ha gānọ nēto Gi” (Abù Ọma 84:4).Cross References
I Ndụmọdụ banyere Otuto
1. Ụwa niile, mmadụ niile na ihe niile ná-eku ume ka ana-adụ ọdụ ka ha too Onyenwe anyị, Abù Ọma 100:1; 150:6; 68:32; Ndi Rom 15:10, 11
2. Onye ahụ dere Abù Ọma nyere iwu ka e were ọñụ feè Chineke òfùfè, Abù Ọma 100:2; Ọlu Ndi-ozi 2:46; Ndi Filipai 4:4; 2 Ihe Emere 29:30; Aisaia 30:29; 35:10
3. Ka ndị nke Chineke were ịbụ abụ bịa n’iru Ya, Abù Ọma 100:2; 126:2; I Ihe Emere 6:32; Aisaia 44:23; Ndi Efesọs 5:19; Ndi Kọlọsi 3:16
4. Aga-etò Chineke site n’abụ na arịa unè dị icheiche, Abụ Ọma 150: 3-5; 2 Ihe Emere 20:28; I Ihe Emere 13:8; Ọpupu 15:20; Nkpughe 5:8; 14:2; 15:2
5. Anyị nwere ohere ifè Chineke òfùfè na itò Ya n’ụlọukwuu Ya, Abù Ọma 100:4; 150:1; Ndi Hibru 10:23-25; Deuteronomi 12:5; 16:16; Maika 4:2; Luk 4:16
6. Mkwupụta nke ezi ihe niile Chineke na-enye ndị Ya bụ ụzọ kwesịrị iji nye Chineke otuto, Abù Ọma 100:3, 5; 150:2; 145:1-21; Nkpughe 5:9-14; 15:3, 4
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEOtuto dịrị Onyenwe anyị
Ọ bụ eziokwu amaara nkeọma n’etiti ndịKraist na otuto na abụ na-ejikọ ọnụ n’òfùfè nke Chineke. NdịKraist n’ebe niile kwenyere na otuto Chineke bụ ịbụ abụ ná-egosi mmụọ nke ezi òfùfè. Òfùfè dị otú a na-amịpụta udo na ọñụ mgbe ana-eme ya nime mmụọ na eziokwu. Inye Jehova bụ Onye kéré Eluigwe na ụwa na ihe niile dị nime ha otuto kwesịrị ịdị mfé dịka ume nke OnyeKraist na-eku. O kwesịrị ịná-eto Onyemgbapụta ya dị ukwuu mgbe niile bụ onye zọpụtaworo ya site n’óké mbibi dị icheiche na ụgwọọlụ niile nke mmehie. Otuto ya, ọ bụrụ na o sitere n’obi, ga-apụta n’elu ná-enweghị nkewa dịka mmiri nke sitere n’otù ólùlùmmiri egwupuru n’ike na-enupụta.
Obi ahụ nke ga-efè Chineke òfùfè ma ọ pụghị inye Chineke otuto n’ọñụ na n’obi ụtọ n’otù mgbe ahụ amaghị ọñụ nke nzọpụta. Agwara anyị sị “Unu gēji kwa obi-utọ seputa miri n’isi-iyi nile nke nzọputa” (Aisaia 12:3). Ndị naesoụzọ Jisọs mere ka ọ pụta ìhè na ịñụ mmiri sitere n’isiiyi niile nke nzọpụta na-eweta óké ọñụ. Mgbe Jisọs batara na Jerusalem n’oge mbata nke mmeri Ya, “Ọra ndi nile nēso uzọ-Ya malitere iñuri ọñù na iwere oké olu to Chineke n’ihi ọlu nile di ike nke ha huru” (Luk 19:37). Mgbe ụfọdụ n’etiti ndị Farisii chọrọ ka Jisọs baara ha mbá n’ihi otuto nke a, Ọ sịrị “Ọ buru na ndia ekpuchi ọnu-ha, nkume gēti nkpu” (Luk 19:40).
Otuto nke Ọñụ
Chineke adịghị anara otuto nke ana-amánye mmadụ amánye kama ọ bụ nke eji ọñụ nye Ya. “Werenu ọñù fè JEHOVA òfùfè” bụ ndụmọdụ sitere n’ebeọgụgụ anyị, nke a bụ kwa ihe na-adị Chineke ezi ụtọ na kwa ọlụ nke eji ọñụ lụọ. Chineke achọghị ndị ji iru mgbarụ na ndị ná-enweghi ọñụ n’òfùfè Ya. Ndị ga-efe Chineke òfùfè aghaghị ijiobi ha niile fee Ya òfùfè, ndị agụụ nke obi ha ga-abụ ime ihe Chineke na-achọ ọ bụghị ihe ha onwe ha na-achọ. (Gụọ I Ndi Tesalọnaika 4:1; 2 Timọti 2:4). Jisọs nyere onwe Ya n’ijéozi nke Nna Ya, n’ihi na O kwuru banyere onwe Ya sị, “Mu onwem nēme ihe nātọ Ya ụtọ mgbe nile” (Jọn 8:29). Devid sịrị “Añuririm ọñù mgbe ha nāsim, ka ayi je n’ulo JEHOVA” (Abù Ọma 122:1). Ifè Jehova òfùfè abụghị ọlụ dị ike n’ebe Devid nọ, maọbụ onye ọ bụla nke ná-efè Chineke òfùfè nime mmụọ na eziokwu.
Otuto nke Kwesịrị
Nime Akwụkwọ Nkpughe anyị na-agụ ihe banyere óké ìgwè ndị nọ gburugburu Ocheeze nke Chineke ná-ekwu na Jisọs kwesịrị ịnara otuto: “Ọ kwesiri, bú Nwa-aturu ahu Nke egbuworo egbu, inata ike nile, na àkù, na amam-ihe, na ume, na nsọpuru, na otuto, na ngọzi” (Nkpughe 5:12). Ọ bụghị náánị na Chineke kwesịrị ịnara otuto niile site n’aka ihe niile ekèrè èkè dị ndụ, kama n’ụzọ pụrụ iche, O kwesịrị karị dịka ire pụrụ ikwu. Obi onyemmehie adịghị enye Onye kèrè ya otuto n’ihi na obi ahụ nke mmehie kpuchiri na-achọ náánị otuto na mbulielu nke onwe ya. Nime ịdịiche site n’ọchịchọ anụarụ dị otú a, ọ bụghị náánị na onye nke Kraist na-achọ itó Onyenwe ya kama ebe ọ matara na O kwesịrị otuto niile eji ịnụọkụn’obi nye Ya, ọ na-achọsi ike ịkọrọ ụwa niile banyere mkwesị Ya ahụ nke dị ukwuu.
Ifèòfùfè site n’Abụ na Ùnè
Apụrụ ikwu ọtụtụ ihe banyere òfùfè Chineke site n’abụ na ùnè -- karịa ka iheọmụmụ a pụrụ ịkụzi. Akwụkwọnsọ mere ka ọ pụta ìhè nkeọma na Chineke chọrọ ka ndị Ya fèe Ya òfùfè site n’abụ na ùnè. Ebeọgụgụ anyị kwuru sị “Werenu iti-nkpu ọñù bia n’iru Ya” (Abù Ọma 100:2), na “Werenu ọfufu opi-ike to Ya: Chirinu une na ubọ-akwara to Ya. Werenu egwú otiti na ite-egwú to Ya: chirinu ubọ eji akwara kwe na ọjà to Ya: chirinu àjà nke nādasi uda ike to Ya” (Abù Ọma 150:3-5). Nke a bụ ihe mgbagide ụkwụ nke ụmụ Chineke iji abụ na arịa-ùnè fèe Chineke òfùfè. N’ihi ndị ná-asị na n’ihi otù ihe maọbụ nke ọzọ na o kwesịghị ka eji abụ maọbụ arịa ùnè n’òfùfè Chineke, apụrụ ikwu na ọ dịghị ebe ọ bụla nime Akwụkwọnsọ gbochiri ya. N’ụzọ ọzọ, Akwụkwọnsọ kwagidere ka efèe Chineke òfùfè n’ụzọ dị otú a. Ọ dịghị akụkụ ọ bụla nke Okwu Chineke maọbụ n’Agba Ọhụụ maọbụ n’Agba Ochie ebe egbochiri iji ụzọ dị otú a fee Chineke òfùfè. Chineke adịghị asị ka otù ọgbọ fèe Ya òfùfè site n’iji abụ na ihe itiegwú emesịa o wee gbochie ọgbọ ọzọ ifè Ya òfùfè n’ụzọ dị otú a. Ọ dị otù aka ahụ nyahụrụ na taa, e, ru kwa mgbe niile ebighịebi, Ọ dịghị agbanweagbanwe. (Gụọ Malakai 3:6).
Ogige niile nke Otuto
Okwu Chineke na-adọ anyị akanántị megide “irapu nzukọ nke onwe-ayi” (Ndi Hibru 10:25). Njikọ ọnụ nke òfùfè n’ebe ndị nsọ nọ dị óké mkpà. Ọ dị mkpà n’ihi na Chineke kwere mkwà sị na ebe mmadụ abụọ maọbụ ọtụtụ bụ ndị nke Ya zukọworo n’aha Ya na n’ebe ahụ ka Ya ga-anọ. (Gụọ Matiu 18:20). Chineke na-arịdata wee gọzie ndị Ya; anaewuli ha elu, anaeme ka ha dị ike nime amara Chineke; ana-azọpụta ndị mmehie, ana-eme ka arụ dị ndị ọrịa ike, ana-agbasa Oziọma nke Onyenwe anyị.
Akwụkwọnsọ mesiri Ya ike na Chineke chọrọ ka ndị nke Ya feè Ya òfùfè n’Ụlọukwuu Chineke na mgbe na mgbe; ịbịa n’ọgbakọ ahụ na mgbe na mgbe dị mkpà nke ukwuu (Gụọ Abù Ọma 65:4; 84:1-4, 10; 118:19, 26; Aisaia 2:3). Enyeghị ndị Kraist ohere ịrapụ ifè Chineke òfùfè n’Ụlọukwuu Ya; ezi ndịKraist agaghị achọ inwe ihengọpụ ịrapụ ịbịa òfùfè. Ma n’ụbọchị ndịa, ọ dị ndị ná-eche na ha pụrụ inweta ngọzi nke Chineke site n’ile televishịọn na ige ntị na redio dịka ha ga-enwe ya ma ha jee Ụlọukwuu Chineke. Nke a bụ échìchè ná-abaghị urù, bụrụ kwa nke meworo ka ha taa arụ nime mmụọ n’ihi ịrapụ ifè Chineke mgbe niile.
Ezi òfùfè nrò nke edoro dịka Okwu Chineke si dị na redio ewetaworo ọtụtụ ndị ọrịa na ndị nọ ná mkpà bụ ndị ná-apụghị ijéru n’ụlọnsọ Chineke ijé feé òfùfè ngọzi. Chineke agọziwo ha n’ihi na ha apụghị ime ihe ọ bụla. Chineke adịghị awụkwasị ngọzi Ya niile n’arụ ndị arụ dị ike, bụ ndị ná-arapụ òfùfè nke Chineke n’ihi na ha na-échè na ha pụrụ ifè Chineke òfùfè n’ụlọ ha dịka ha pụrụ ifè Ya n’Ụlọukwuu Ya. Ịchọ ige Oziọma na redio maọbụ na televishịọn bụ náánị ihe mkpuchi nke ga-enyere ha aka ige ntị n’ihe ọzọ dị icheiche na ime dịka ha si chọọ n’Ụbọchị Onyenwe anyị karị ido ya nsọ nye Onyenwe anyị.
Ụbọchị Onyenwe anyị maka Òfùfè
Ihe Chineke na-achọ n’ebe anyị nọ banyere idebe Ụbọchị Onyenwe anyị -- Sọnde -- adịghị mfé n’ụzọ nke imemmụọ karị nke iwu niile Onyenwe anyị nyere banyere Ụbọchịizuike nke Agba Ochie. “Ọ buru na i me ka ukwu-gi si n’Ubọchị izu ike chighari, i we ghara ime ihe nātọ gi utọ n’ubọchị nsọm; ọ buru kwa na i kpọ ubọchi-izu-ike ihe-utọ, i kpọ kwa ihe nsọ nke JEHOVA ihe-nsọpuru; i we sọpuru ya, ghara ime ihe bu uzọ-gi nile, ghara ichọputa ihe nātọ gi utọ ma-ọbu ikwu okwu nke aka-gi: mgbe ahu ihe JEHOVA gātọ gi utọ; M’gēme kwa ka i nọkwasi ebe nile di elu nke uwa nka dika inyinya; M’gēme kwa ka i rie ihe-nketa nke Jekob, bú nna-gi: n’ihi na ọnu JEHOVA ekwuwo” (Aisaia 58:13, 14).
Ihe kasị mkpà bụ na òfùfè nke Chineke n’eluụwa na-egosi ná mkpirikpi òfùfè nke óké ọgbakọ ahụ aga-achịkọta gburugburu ocheeze Chineke. Dịka anyị na-amụ ifé Chineke òfùfè, itó Ya ná-abụ na ọgbụgbaàmà n’eluụwa a, otú ahụ ka anyị ga-apụ kwa itó Ya n’óké ụbọchị ikpeazụ ahụ nke mgbapụta na inye otuto. Enyere anyị iwu ka anyị bata ná nzukọ nke ndị eziomume wee too Chineke n’ihi ebere Ya, ka anyị kwụghachị mkwà niile anyị kwere Chineke n’iru ndị Ya.
Nime Abụ Ọma iriabụọ na abụọ anyị na-agụ “Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi: n’etiti nkpọkọta-Gi ka m’gēto Gi, ndi nātu egwu JEHOVA, tonu Ya; unu nile, bú nkpuru nke Jekob sọpurunu Ya. … N’ebe i nọ ka otutom si bia nime nkpọkọta Gi bara uba: m’gākwughachi nkwam nile n’iru ndi nātu egwu Ya” (Abù Ọma 22:22-25). Akụkụ Akwụkwọnsọ a naekwu ihe banyere Jisọs, naekwu na Ọ ga enye Chineke Nna otuto n’etiti mkpọkọta ahụ ana-apụghị ịgụta ọnụ nke ndị Chineke agbapụtara.
Ịdịmkpà nke Otuto
Akwụkwọozi edegaara Ndị Hibru metụrụ aka n’ihe edere n’Abụ Ọma nke iriabụọ n’abụọ mgbe ọ sịrị, “Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi, n’etiti nzukọ-Gi ka m’gābu abù nye Gi” (Ndi Hibru 2:12). Ọzọ n’ebe a ka ana-emetụ aka ịdị-mkpà nke otuto niile nke ana-enye Chineke nime nzukọ, n’ihi na Jisọs, bụ Onyeisi Nchụàjà anyị bụ ihenlereanya anyị ga-eto Chineke n’iru ụmụ-nne Ya n’etiti Nzukọ.
Jisọs aka-enyeghị Nna Ya otuto n’iru óké mkpọkọta nke ndị nsọ ahụ, n’ihi na aka-achịkọtaghị ọnụọgụgụ ukwu ahụ niile. Na Ọ ga-eme nke a pụtara ìhè n’okwu ahụ O kwuru nke sitere n’Akwụkwọnsọ. Eziokwu ọzọ bụ na Chineke chọrọ ka anyị were otuto bata n’Ụlọukwu Ya ọbụná nime ụwa nke a, ijikere anyị n’ihi óké ụbọchị mgbapụta ahụ. Dịka Jisọs debeere anyị ihenlereanya dịka Onyeisiọchịagha nke nzọpụta anyị iwebata ọtụtụ mkpụrụobi n’otuto (Ndi Hibru 2:10), dịka mkpụrụ mbụ nke mbiliten’ọnwụ (I Ndi Kọrint 15:20, 23), otú ahụ Ọ ga-abụrụ anyị iheilereanya nime ebighịebi ịbụ Onye mbụ na Onye mmalite nke inye Chineke Nna otuto. (Gụọ I Ndi Kọrint 15:25-28).
Ndị ahụ nke ná-apụghị inye Chineke otuto n’ebe a apụghị kwa ime ya n’ebe ahụ. Ka onye ọ bụla rapụ ịtụ ụjọ iru mmadụ maọbụ ime ihere iguzo n’iru ndịnsọ nke Chineke ikwupụta aha nke Kraist. Anyị ga-eme ngwa ịkwụghachị mkwà niile anyị n’iru Chineke n’Ụlọukwu Ya n’ụwa nke a, mgbe ahụ anyị ga-apụ ime ya n’Eluigwe n’óké ụbọchị nke Chineke.
Anyị ga-emeri ike nke ọchịchịrị site n’okwu àmà anyị na site n’Ọbara Nwaatụrụ ahụ (Nkpughe 12:11). Anyị ga-ekwu okwu àmà ahụ n’Ụlọukwuu Chineke. Nke a bụ ihe Chineke nyere n’iwu.
Ịsọpụrụ Chineke
Chineke azọpụtawo ndị Ya ka ha wee sọpụrụ Ya site n’ebighịebi rue ebighịebi. Anyị na-agụ sị “Nke eme-kwa-ra ayi ka ayi buru ihe-nketa nime Ya, ebe eburu uzọ ka ayi àkà dika Onye ahu zubere, Onye nālusi ihe nile ike dika izù nke ọchichọ-Ya si di; ka ayi we buru ihe agēji to ebube-Ya, ayi ndi leworo anya Kraist na mbu” (Ndi Efesọs 1:11, 12). Site n’Akwụkwọ Nkpughe anyị na-ahụ ya ná mkpirimkpi, n’ihi na ekwuru n’ebe ahụ sị “Ihe nile ọ bula ekere-èkè nke di n’elu-igwe, na n’elu uwa, na n’okpuru uwa, na n’elu oké osimiri, ha na ihe nile di ha nime, ka ha nāsi, ọ bu Onye ahu nke nānọkwasi n’oche-eze ahu, Ya na Nwa-aturu ahu, ka ngọzi nile diri rue mgbe nile ebigh-ebi” (Nkpughe 5:13). “Mgbe ihe ndia gasiri m’we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpugh iguta ọnu, ndi si ná mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n’iru oche-eze ahu na n’iru Nwa-aturu ahu, egbokwasịworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n’aka-ha; ha we were oké olu tie mkpu, si, Nzọputa diri Chineke-ayi, Onye nānọkwasi n’oche-eze ahu, di-kwa-ra Nwa-aturu” (Nkpughe 7:9, 10).
Onye dere Abù Ọma dụrụọdụ sị “Kelenu Ya, gọzi-kwa-nu aha-Ya.” Abụ Ọma nke ikpe-azụ nke Akwụkwọ Abụ Ọma mechiri site n’okwu ahụ “Ka ihe ọ bula nke nēku ume to Ja. Tonu Ja.”
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Gịnị ga-eme ka anyị too Chineke?
- Òlee ebe kwesịrị ka anyị nọdụ too Chineke?
- Gịnị ga-eme ka anyị ghara ịrapụ ijé n’Ụlọukwuu Chineke ifè Ya òfùfè?
- Òlee ndị ga-efè Chineke òfùfè n’Eluigwe?
- Òlee ụzọ anyị si mara na Jisọs ga-eto Chineke Nna?
- Ọ bụ n’ihi gịnị ka anyị ga-eji fee Chineke òfùfè n’Ụlọ Ya karịa n’ụlọ anyị?