I Ndi Eze 5:1-18; 6:1-38

Lesson 257 - Senior

Memory Verse
“Werenu ekele ba n’ọnu-uzọ-ama-Ya nile, werenu otuto ba n’ogige-Ya nile: Kelenu Ya, gọzi-kwa-nu aha-Ya” (Abù Ọma 100:4).
Cross References

I Àtụmààtụ maka Iwuụlọ

1. Hairam, bụ eze Taia, zigaara Solomon oziekele, Solomon wee rịọ ya ka o wetara ya ihe agaeji wue Ụlọ Chineke, I Ndi Eze 5:1, 2, 6

2. Agha niile Israel buru gbochiri Devid iwu Ụlọ ahụ, ma udo gbara Solomon gburugburu, I Ndi Eze 5:3-5

3. Hairam ñụrịrị ọñụ nke ukwuu n’ihi ụgwọ Solomon jikeere ịkwụ ya, o wee kwere ibute ihe niile agaeji wue Ụlọ ahụ, I Ndi Eze 5:7-10

4. Etinyere àtụmààtụ niile n’ọlụ e wee bubata ihe niile aga-eji wue Ụlọ ahụ nime Jerusalem, I Ndi Eze 5:11-18

II Owuwu nke Ụlọ ahụ

1. Amalitere iwu Ụlọ ahụ n’arọ nke anọ nke Solomon bụ eze, I Ndi Eze 6:1

2. Ụlọukwuu ahụ n’onwe ya ji okpukpu abụọ karịa ụlọikwụụ nzute, I Ndi Eze 5:2-6

3. Awara nkume ahụ nkeọma tutu ebubata ha nime obodo ahụ, I Ndi Eze 6:7

4. Etinyere ọtụtụ ihe n’Ụlọukwuu ahụ, enwere ọtụtụ ụlọ ntà dị icheiche n’akụkụ ya niile, I Ndi Eze 6:8-10

III Ụlọukwuu nke Mkwà

1. Onyenwe anyị mere ka mkwà O kwere Solomon dị ọhụụ ma ọ bụrụ na Solomon gaedebe ihe niile O nyere n’iwu, I Ndi Eze 6:11-13

2. Agụkọghị ihe ọ gaefu maọbụ n’ego maọbụ n’oge, I Ndi Eze 6:14-36

3. Ewuzuru Ụlọukwuu ahụ nime arọ asaa na ọnwa isii, I Ndi Eze 6:37, 38

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ọchịchọ nke Kwesịrịekwesị

Iche uche banyere ihe nke Chineke na Eluigwe naeweta óké ihe ebube nime ndụ anyị. Otù ụbọchị eze Israel nke hụkarịsịrị Chineke n’anya nọdụrụ ala n’ụlọ ya eji osisi cedar wue na-atụgharị uche banyere ihe dị óké ọnụahịa nke eji wue ụlọ ya na ịdịala nke ákwà nkwụba ahụ ebe Igbe Chineke naebi. Ákwà mkwụba a n’ihe niile dị nime ya nọchitere anya ebe ndị Israel naefè Chineke ha òfùfè.

Uche Devid gwara ya, na Chineke nke Israel, bụ Onye lụụrụ ndị Ya óké ọlụ ebube kwesịrị inwe Ụlọ dị mma ebe aga-akpọ Aha Ya. Emere ka Netan onyeamụma mata àtụmààtụ ahụ, o wee dị mma n’anya onyeamụma ahụ, o chekwara na Chineke ga-akwagide àtụmààtụ ahụ. Otú ọ dị, n’abalị ahụ Chineke ziri Netan ozi dị iche ka o zie eze. Devid na ndị agha ya buru ọtụtụ agha, wụsị kwa ọtụtụ ọbara n’ụbọchị niile ọ bụ eze; n’ihi nke a ọ pụghị iwuru Chineke ụlọ. Chineke mere ka Devid mara na Ya onwe Ya arịọghị arịrịọ ka ewuere Ya ụlọ, ma O kwuru ihe ọma banyere Devid n’ihi ọchịchọ a nke ziriezi, O wee kwe Devid mkwà na nwa ya onye ga-anọchi n’ocheeze ya gaewu ụlọ ahụ nke Devid cheworo banyere ya.

Mkwà Emezuru

Mgbe ọ bụla edebezuru ọgbụgbandụ Chineke, ọ bụ ihe amaara nkeọma na Chineke aghaghị idebezu akụkụ nke Ya. Ọ bụ ezie na àtụmààtụ nke iwuru Chineke ụlọ dị óké ọnụahịa dị n’obi Devid, ọ rapụrụ ọchịchọ ya ka ewee mee uche Chineke. Ma otú ọ dị, Devid agbaghị nkịtị wee ná-ele anya ụbọchị ọnwụ ya. Náánị ihe kachasị mma na ihe dị óké ọnụahịa ka agaeji wue ụlọ ahụ nke achọrọ iwu, Devid dọgburu onwe ya n’ọlụ n’ụbọchị ndụ ya fọdụrụ ịchịkọta ihe ndịa nime Jerusalem. “Ewerewom ikem nile doziere ulo Chinekem ọla-edo iji me ihe ọla-edo, na ọla-ọcha iji me ihe ọla-ọcha, na ọlà iji me ihe ọlà, na igwè iji me ihe igwè, na osisi iji me ihe osisi, na nkume onyx na nkume nhiọgide, na nkume ichọ-nma, na nkume nile di oké ọnu-ahia, na nkume marble n’uba” (I Ihe Emere 29:2). Tụkwasị kwa nke a, Devid jègharịrị n’egwù Chineke nke ukwuu nke mere na Mmụọ Nsọ nyere ya iheatụ nke Ụlọ Chineke (I Ihe Emere 28:11, 12). N’ụzọ dị otú a, nchịkọta nke ihe niile ahụ Devid wetara dị ukwuu dịka iwu ụlọ ahụ Solomon wuru. Mgbe emere Solomon eze Israel, ọ matara na obodo ya nọ n’udo n’akụkụ niile, o wee hụ na akwadobewo ọtụtụ ihe gaeme ka o wee gaa n’iru iwu Ụlọukwuu ahụ atụworo àtụmààtụ ya. Emezuru mkwà Chineke kwere Devid.

Enwere Ọnọdụ nye Onye ọ bụla

Chineke nwere ọtụtụ ọnọdụ n’ọkpụkpọ niile Ọ na-akpọ ndị bi n’ụwa, ọnọdụ dịrị ndị niile chọrọ ifè Ya òfùfè. Ụfọdụ ọnọdụ agaghị ámámma n’anya dịka ndị ọzọ, kama òfùfè éfèrè site n’ikwesị ntụkwasịobi aghaghị iweta ụgwọọlụ. Ihe ahụ gbochiri Devid iwu Ụlọukwuu ahụ -- agha niile o buru -- bụ kwa ihe mere ka ọ dịrị Solomon mfé iwu ụlọ ahụ mgbe e mere ya eze Israel. Ewezuga ọtụtụ ihe aga eji jee ozi ahụ nke achịkọtawooro ya, o kwuru sị “JEHOVA, bú Chinekem, emewo ka m’zuru ike gburugburu; ọ digh kwa ihe ọjọ daputara ayi” (I Ndi Eze 5:4).

Chineke bụ Chineke udo, ma ọtụtụ oge mkpagbu na óké ọnwụnwa bụ oge iwu óké ụlọ Chineke nke imemmụọ. Ndịozi na ndị náesoụzọ Kraist hụrụ ọtụtụ ahụhụ mgbe Jisọs rapụrụ ha wee lakuru Nna, ma site n’okwukwe ha nke siri ike na mmụọ nke ná-enweghị ụjọ emewo ka ụwa nwee ihenketa nke gbara ndịKraist ume ịga n’iru iwu Nzukọ ahụ rue taa. Nime arọ olenaole, ndịijè nke Oziọma nke Mmiriòzùzò Ikpeazụ agabigawo ọtụtụ ebili mmiri, ụkọ, iheike na mkwutọ ka anyị wee rita urù nke Oziọma Jisọs Kraist dịka anyị maara ya taa. Ndị nlekọta anyị na ndịisi anyị edebeworo anyị óké àkụ nke anyị gaeji wue Ụlọukwuu Chineke nke imemmụọ. Emere ka Ụlọukwuu Solomon bụrụ iheatụ nke Ụlọukwuu dị n’Eluigwe ma kama ọ bụ onyinyo nke óké ihe ná-abịa.

Ibu-agha nke okwukwe ga-aga n’iru n’ụzọ onye nke Kraist rue Mwelikọ nke ndịnsọ, rue mgbe Onyenwe anyị ga-amalite Alaeze Ya na ọchịchị udo n’eluụwa. Mgbe ahụ, ibuagha nke imemmụọ ga-akwụsị, ihe iwu Nzukọ ahụ ga-abụ ihe edoziri nkeọma e wee chịkọta ha n’Eluigwe. Ụlọukwuu nke imemmụọ ahụ ga-abụ ihe alụzuru nkeọma n’udo na izuike nke ga-adị rue Ọchịchị nke Puku Arọ ahụ na-aga kwa n’iru rue ọgbọ niile ana-apụghị ịgụta ọnụ nke ebighịebi.

Nye Aha Chineke

Solomon bụ otù onye nime ndị nwekarịsịrị amamihe biworo n’eluụwa, ọ matara na Ụlọukwuu ahụ, ná agbanyeghị ebube ya, agaghị ewere karịa náánị akụkụ dịkarịsịrị ntà nke Mmụọ Chineke ukwuu ahụ Onye bi n’Eluigwe, Onye dị kwa ike. “Le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agagh anagide Gi; ulo a nke m’wuworo, ọ gēsi kwa aña rue inagide Gi?” (I Ndi Eze 8:27). Óké ihe karịsịrị ebube nke mmadụ pụrụ ime apụghị itinye etinye maọbụ iwepụ ewepụ n’ebube Chineke. Ọ na-adịgide ná-abụ njupụta nke ebube na ike, ná-agbanyeghi ihe mmadụ pụrụ ime maọbụ ihe ọ na-apụghị ime. Otú ọ dị, mmadụ pụrụ iwetara Aha Chineke otuto maọbụ ihere n’etiti mmadụ. Ihe dịkarịsịrị n’obi Devid na Solomon bụ ka amara aha Chineke n’ụwa niile site n’ịmamma nke Ụlọ ahụ. Ha chọrọ ka náánị nsọpụrụ na otuto agaenye Chineke pụta ìhè site n’ọlụ ahụ ha lụrụ.

Eziokwu a kwesịrị ka ọ gbaa mkpọrọgwụ n’obi ndị niile na akpọku Aha Kraist. Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịtụkwasị ihe n’ebube nke Kraist, náagbanyeghị ndụ eziomume maọbụ nke ịsọpụrụ Chineke nke onye ahụ naebi; ma apụrụ ịtụkwasị ihe ná nsọpụrụ na otuto aga enye Aha Ya n’etiti mmadụ site n’ibindụ ziriezi na nke náenweghị ntụpọ. N’ụzọ ọzọ, nwoke ahụ nke náekwu na ya bụ nke Kraist ma ọ dịghị ami mkpụrụ nke ndụ onyeKraist naewetara Aha Kraist ihe ihere. Okwu ahụ naekwu sị “N’ihi na ayi-onwe-ayi bu ulo nsọ nke Chineke di ndu” (2 Ndi Kọrint 6:16). Ọ bụrụ na ndụ onyeKraist bụ ihe atọrọ ntọala ya nkeọma, ndị niile ga-abịakute ya gaekwu dịka ndị Ju n’ụbọchị Ndịozi kwuru; “Ha we mata ha, na ha na Jisus anọwori” (Ọlu Ndi-ozi 4:13). Ịgbáàmà kachasị banyere ike nke Jisọs Kraist bụ ibindụ nke mmehie ná-adịghị nime ya n’etiti mmadụ, ma mkwulu karịsịrị apụrụ ikwulu Aha Kraist bụ ndụ nke onye náekwupụta aha Kraist ma ná ebi ndụ mmehie. Lezieanya ịtọ ntọala ndụ gị dịka onyeKraist n’elu okwu Chineke, ma ọ bụghị otú a ụlọ ahụ ga-abụ ihe edebewooro ọdịda.

Eze nke Taia

Solomon lezirianya ime ka ọ bụrụ náánị ihe karịsịrị mma ka eji wuee Ụlọukwuu ahụ; ọzọ kwa ọ chọtara ndị nwere amamihe karịsịa ịbụ ndị gaeje ozi ahụ. Mgbe Hairam eze Taia zigara ndịorù ya ikele Solomon n’ihi na emewo ya eze Israel, Solomon zigaara ya ozi ná arịọ ya ka ndị Zaidon zitere ya osisi iwu Ụlọ ahụ. Hairam pụrụ ịbụ onye nataworo okwukwe nke Chineke Israel, “n’ihi na onye ahu nāhu Devid n’anya.” Ọzọ, mgbe Hairam nụrụ okwu niile nke Solomon ọ ñụrịrị ọñụ nkeukwuu, o wee sị, “Onye agọziri agọzi ka JEHOVA bu ta, onye nyeworo Devid nwa mara ihe ibu onye-isi ndi ukuu a.” Ndị ná enweghị nzọpụta adịghị eme ngwà inye Chineke otuto n’ihi ihe ọ bụla. Solomon na Hairam wee kwekọrịta ịlụ ọlụ ahụ, ihe niile wee gaa nkeọma. Ndịorù nke Solomon wee soro ndị Zaidon jee ozi n’óké ọhịa Lebanon; ha wee gbutue osisi cedar na nke fir achọrọ iji jee ozi ahụ wee bupụta ha n’óké ọhịa ahụ. Ebudatara osisi ahụ niile n’óké osimmiri, mgbe ahụ eburue ha n’ọnụ mmiri niile nke Palestine site n’isé ha n’elu mmiri, ibugota ha na Jerusalem ebe anaewu Ụlọukwu ahụ.

Anụghị ụdà Otùtù ọ bụla

Ihe ọzọ pụrụ iche n’ụlọ ahụ ewuru nke akpọkwasịrị Aha Chineke bụ na anụghị ụda otùtù maọbụ anyụike maọbụ ihe ọlụ ọ bụla eji igwè mee. Osisi ọ bụla na nkume ọ bụla ka awazuru nkeọma ịbànye nkeọma n’ebe ọ bụla achọrọ itinye ha, dịka àtụmààtụ ụlọ ahụ si dị, tutu ebubata ha n’obodo ukwuu ahụ. Apụrụ ịhụ ọtụtụ nkume arapụrụ n’elu ugwu niile nke Israel bụ ndị ana apụghị ịwa nkeọma dịka achọrọ ha.

“Ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si chọ, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist” (I Pita 2:5). Ewerewo Nzukọ Kraist tụnyere ụlọ ewuruewu, nke Kraist bụ Isi Nkume nke nkuku ụlọ, ndị òtù Nzukọ ahụ kwa dịka ọtụtụ nkume nke edoziriedozi nke ewukwasịrị n’elu Kraist. Onyeọka ukwuu nke eluigwe ahụ ji àtụmààtụ nke ọgbọ niile, ndị ahụ niile nke ná-achọ itoru iji ha wukwasị n’ụlọ nke Ya aghaghị ịbụ ndị ga-agabiga ọwụwa na mkpụzigharị ka ha wee bụrụ ihe edoziri ịbànye n’ọnọdụ ha. Ọtụtụ ndị mmehie ndị obi ha siri ike dịka nkume adakwasịwo Nkume ahụ bụ Kraist Jisọs ewee tiwaa obi nkume ha, Onyeozizí ahụ wee kpụzie ha ịbụ ihe edoziri iji wue ụlọ Chineke ahụ. Ọ bụghị ihe dịrị mmadụ ịmata otú o kwesịrị ka ọ dị, ọtụtụ mgbe idozi onye ahụ na-abụ ihe náeweta óké ụfụ na mgbu; ma rapụrụ nnọọ mkpebi amamihe nke Chineke nlụpụta ikpeazụ ahụ. Ọ dịghị ehie ụzọ maọbụ mee ndahie.

Ọlụ ahụ Alụsịrị

Ekwughị ọtụtụ ihe banyere ụlọ ntà niile na ogige niile; ma ọtụtụ Ụlọukwuu ahụ dịka edere ya n’Akwụkwọ Ezikiel dị ka ihe edere n’akwụkwọ I Ndị Eze; Ụmụ akwụkwọ nke akwụkwọnsọ na Josephus bụ onye ná-akọ akụkọ ụwa naeche na Ezikiel onyeamụma agwawo anyị ihe bụ ezi ọtụtụ nke Ụlọukwuu Solomon wuru ebe ọ bụ onyeamụma na onye hụrụ Ụlọukwuu Solomon. Ụlọukwuu ahụ ewuru n’elu Ugwu Moraia dị narị cubit isii, maọbụ ihe dị ka narị “feet” iteghete, gburugburu ya, mgbidi dị cubit iteghete maọbụ ihe dị ka “feet” iri na anọ n’ịdị elu ya gbara Ụlọukwuu ahụ gburugburu. Nime ya ka enwere ogige nke ndị Mbaọzọ dị cubit iri ise maọbụ “feet” iri asaa na ise n’obosara. Nke ọzọ bụ ogige ndị Israel dị narị cubit, maọbụ narị “feet” na iri ise n’obosara nke óké mgbidi gbara ya gburugburu. Nime ogige a ka enwere ọtụtụ ụlọ ntà dị ebube ebe ndị nchụàjà naezu ike, bụkwara ebe ndị nchụàjà na-anọ mgbe óké ifufe maọbụ mmiriozuzo na-enye nsogbu. Nime mgbidi ahụ ka enwere ogige ndị nchụàjà ya na ebe ịchụàjà nke ọla na Ụlọukwuu ahụ n’onwe ya. Ụlọ ahụ chere iru n’ọwụwa anyanwụ. Ọnụahịa ọlaedo na ihe niile dị óké ọnụahịa eji wue Ụlọ ahụ na ihe ịchọmma niile etinyere n’Ụlọ ahụ nọ n’etiti puku nde Naira abụọ (N2,000,000,000) na puku nde Naira ise (N5,000,000,000).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Hairam bụ eze Taia ji zigara Solomon ndịorù ya?
  2. Òlee ozi Solomon zighachiri Hairam site ná ndịorù Hairam?
  3. Ọ bụ gịnị mere ekweghị ka Devid wue Ụlọukwuu aga akpọkwasị Aha Chineke?
  4. Ọ bụ gịnị ka Devid mere ná-agbanyeghị na ekweghị ka o wue ụlọ ahụ?
  5. Òlee akụkụ ndị Zaidon jiri tinye aka ha n’iwú Ụlọukwuu ahụ?
  6. Òlee ụzọ eji kwụọ ha ụgwọọlụ ha?
  7. Òlee ebe na ụzọ eji kwadobe nkume niile na osisi niile eji wue ụlọ ahụ?
  8. Àkụkụ ụlọ ole dị nime Ụlọukwuu ahụ?
  9. Oge ra añaa ka Solomon na ndịorù ya ji wuchaa Ụlọukwuu ahụ?