2 Ihe Emere 5:1-14; 7:1-3; I Ndi Eze 8:54-61; 9:1-9

Lesson 258 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI : “Ọnụ-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu; ka ebuli kwa unu elu, ọnu-uzọ ebigh-ebi: Eze ebube gābata kwa” (Abù Ọma 24:7).
Cross References

I Iguzobe Igbe Ọgbụgbandụ ahụ

1. Solomon webatara ihe niile Devid bụ nna ya, doro nsọ nye Chineke n’Ụlọukwuu ahụ, 2 Ihe Emere 5:1; I Ihe Emere 29:2-5

2. Akpọkọtara ndịokenye Israel, na ndịisi niile nke ebo niile ka ha wee bugota Igbe Ọgbụgbandụ ahụ, 2 Ihe Emere 5:2, 3; 2 Samuel 6:1-15; I Ndi Eze 8:1-4

3. Igbe ahụ na ịchọmma niile nke Ụlọikwụ ahụ ka ndị Livai na ndịnchụàjà webatara nime Ụlọukwụ ahụ, 2 Ihe Emere 5:4, 5, 7-10; I Ndi Eze 8:6-9

4. Ọtụtụ ìgwè àjànsureọkụ ka Solomon na ndị Israel chụrụ n’oge a, 2 Ihe Emere 5:6; I Ndi Eze 8:5

II Mbata nke Ebube Onyenwe anyị

1. Mgbe edebesịrị Igbe ahụ, ndịọbụabụ weli kwa olu ha itò na ikele Onyenwe anyị, ebube Ya jupụtara Ụlọukwuu ahụ dịka igweojii, 2 Ihe Emere 5:11-14; Ọpupu 40:34, 35; I Ndi Eze 8:10, 11

2. Ná mkpebi ekpere Solomon nke ido Ụlọ ahụ nsọ, ọkụ siri n’eluigwe rịdata wee ripịa àjànsureọkụ na àjà niile ahụ, 2 Ihe Emere 7:1-3; Levitikọs 9:24; I Ndi Eze 18:30-39

III Ekpere Ngọzi nke Solomon

1. Ezilagara ndị ahụ site n’ekpere nke Solomon kpere banyere ikwesi ntụkwasịobi nke Chineke, I Ndi Eze 8:54-56; Abù Ọma 36:5; Abù Akwa 3:22, 23; I Ndi Kọrint 1:9

2. Agbara ndị ahụ ume ka ha debe onwe-ha n’akụkụ Onyenwe anyị, I Ndi Eze 8:47-49, 61; Deuteronomi 29:9-13; Joshua 23:6-8; I Ndi Kọrint 15:58; Ndi Galetia 5:1

3. Ikwesị ntụkwasịobi nke Israel ga-ezipụtaworị ụwa na Onyenwe anyị bụ Chineke, I Ndi Eze 8:60

IV Ọgbugbandụ nke Chineke

1. Anụrụ ekpere solomon, Chineke kwekwara mkwà imezu ekpere ahụ ma ọ bụrụ na eze ahụ ga-edebe ihe niile Chineke nyere n’iwu, I Ndi Eze 9:1-5

2. Onyenwe anyị kwere Solomon mkwà ụlọ ga-adịgide ná mkwụghachi ụgwọ n’ihi ikwesi ntụkwasịobi, I Ndi Eze 9:5

3. Nnupuisi ga-eweta ahụhụ kwesịrịekwesị nye solomon, èzínaulo ya, na Ụmụ Israel, I Ndi Eze 9:6-9

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Maka Udé Aha na Otuto

“Ewe jezue ozi nile nke Solomon jere ulo JEHOVA” (2 Ihe Emere 5:1). Ogologo arọ asaa ka ejiworo lụọọlụ a nke maramma, bụ nke alụrụ nye nsọpụrụ na otuto nke Chineke Israel. Ụlọukwuu ahụ nke guzoro na ndịda nke Ugwu Moraia, bụ ihe anya ọtụtụ ndị bi na Jerusalem hụworo ogologo mgbe tutu ewusịa nkebi ime ya niile. Ọ bụ ihe ezubere ka ọ dịgide rue ọtụtụ ọgbọ niile e wee wue ya “ka ọ di uku kachasi ulo nile, ibu aha na ibu ihe mara nma diri ala nile” (I Ihe Emere 22:5). Nke a bụ ọlụ ịhụn’anya, na nke jikọtara n’otù ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ, ndịkom ka n’ọnụọgụgụ nke Israel ogologo arọ asaa ahụ. Ná-enweghị obiabụọ, nchekwube niile nke ndị ahụ dị elu nke ukwuu, mgbe oge ruru n’ikpeazụ banyere inwe òfùfè nke ido ụlọ ahụ nsọ.

Ebe Ọhụụ nke Idebe Igbe Ọgbụgbandụ Ahụ

Otù nime ihe niile Solomon mere ka o jikeere banyere ịrara Ụlọ ahụ nye Chineke, bụ ibupụta Igbe Ọgbụgbandụ ahụ n’obodo Devid gaa n’ebe ọhụụ nke emere idebe ya dị nime Ụlọukwuu Chineke ahụ. Igbe ahụ bụ ihe-ngosi nke nnọnyere nke iru Chineke n’ebe Ụmụ Israel nọ, ọ bụ kwa ihe mbụ dị Solomon mkpà bụ ka Mmụọ Chineke biri n’Ụlọ ahụ alụrụ nye nsọpụrụ Aha Ya. Nnọnye nke Chineke ga-abụ ezi nrara nke ụlọ ahụ nye Chineke, ọ dịghị kwa ihe dị ntà karịa nke a ga-ezu. Eze Solomon matara n’oge a na ọ bụ ihe dị mkpà ka ọlụ ya niile bụrụ ihe Onyenwe anyị ga-agọzi. Ọ bụ kwa ihe dị mkpà n’ụbọchị taa ka anyị nwee Mmụọ nke Chineke ahụ nime anyị n’ihe ọ bụla anyị na-alụ ma ọ bụrụ na ọ dị ọtụtụ ọ bụla nke ọgan’iru nke onyeKraist gaje inweta.

Ndịokenye Israel, ndịisi niile nke ebo niile, na ndịisi nke ndị bụ nna nke Ụmụ Israel ka akpọkọtara ibugota Igbe ahụ. Akpọrọ ndị Livai iburu ya na arịa nsọ niile nke dị n’Ụlọikwụụ ahụ. Solomon achọghị ka enwee kwa ikpé ahụ ọzọ bụ nke dakwasịrị Uza mgbe Devid chọrọ ibubata Igbe ahụ n’obodo nke Devid. (Lee I Samuel 6:1-10). Ọtụtụ ìgwè àjànsureọkụ ka ndị nwere obi ụtọ chụrụ; Onyenwe anyị náara arịrịọ niile ha; e wee bubata Igbe ahụ n’ebe ọhụụ ana-edebe ya ná “ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n’okpuru nkù cherubim.” Cherubim ukwuu abụọ nke maramma ka alụworo ịbụ ihemkpuchi ya. Cherub ahụ guzoro n’ụkwụ ha ma gbasaa kwa nkù ha, nkù nke ọ bụla dị cubit ise n’ogologo. Ebe Nsọ ahụ kachasị ebe nsọ niile dị cubit iri abụọ (20) n’obosara, n’ihi nke a, nkù nke cherub ọ bụla na-emetu mgbidi nke dị n’ezi, nkù ndị ọzọ kwa na-emetu ibe ha n’etiti ụlọ ahụ. N’okpuru nkù ndịa ka edebere Igbe ahụ.

N’okpuru Nkù Ya

“M’gēzute kwa gi n’ebe ahu, kpayere gi uka site n’elu ebe-mkpuchi-nmehie, site n’etiti Cherubim abua nke di n’elu Igbe ihe-àmà ahu” (Ọpupu 25:22). Ụmụ Israel ka ewezugara kpamkpam pụọ n’Ebe Nsọ ahụ kachasị ebe Nsọ niile, ma náánị onyeisinchụàjà na-abà n’ebe ahụ dị nsọ náánị otù ugbò n’arọ ọ bụla n’Ụbọchị Mkpuchimmehie. Ná nkọwa banyere àtụmààtụ a Baịbụl na-agwa anyị sị “N’ihi na Mọ Nsọ nēgosi nka, na akēmegh ka uzọ ibà n’ebe nsọ ahu puta ìhè, mgbe ulo-ikwu mbu ahu nēguzogide ugbu a” (Ndi Hibru 9:8). Otù iwu ahụ ghọrọ ihe guzosiri ike n’òfùfè nke Ụlọukwuu ahụ.

Ma otú ọ dị, n’otù oge hour ahụ Jisọs nwụrụ, ákwàmgbochi ahụ nke kewara Ebe Nsọ ahụ kachasị ebe Nsọ niile pụọ n’Ebe Nsọ ahụ “we gbawa iberibe abua site n’elu rue ala.” Ụzọ ahụ ịbànye n’iru Chineke ka emere ka ọ pụta ìhè, bụ nke emeghere nye mmadụ niile site n’ọnwụ ịchụàjà nke Jisọs. Iji bịakute Chineke n’òzùzùòkè, n’ezie ụmụmmadụ aghaghị ịbịa site n’ụzọ ahụ Ọ rọpụtaworo -- site ná nzọpụta, nke ebeịchụàjà ọla ahụ nọchiri anya ya n’ebe mpụta nke Ụlọukwuu ahụ; site n’odudonsọ, nke ebeịchụàjà nke ọlaedo nọchiri anya ya na oriọna ahụ na-enwu mgbe niile n’Ebe Nsọ ahụ; na site na ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ, nke bụ Okwu Chineke ahụ na-anọgide na Mmụọ Chineke ahụ na-ebigide n’Ebe Nsọ kachasị ebe Nsọ niile nọchiri anya ya. (Banyere iheọmụmụ nke Ụlọikwụụ ahụ n’ụzọ dị ukwuu nkebi ya niile na ihe ịchọmma ya na ihe ha pụtara n’otù n’otù, lee Akwụkwọ nke isii (6), Iheọmụmụ 70, 72, 73 na 74). Òkù nke Chineke na-ada nye mmadụ niile n’ụwa n’ụbọchị taa ịbịa n’òkpùrù ndò nkù Ya ịmata ezi obiụtọ nke iso Ya nwee mmekọ na-enye.

Ekpere nke Ido Ụlọ Ahụ Nsọ

Ngwangwa ndị nchụàjà ahụ debesiri Igbe ahụ n’ọnọdụ ya na ka ndịọbụ abụ na ndị abụùne malitere ime ka anụ olu ha dịka olu otù onye n’itó Onyenwe anyị, Ụlọukwuu ahụ juputara n’ebube nke Onyenwe anyị, n’ụdị nke igweojii. Nnọnye nsọ Chineke dị nnọọ ukwuu nke na ndịnchụàjà apụghị kwa ijéozi ha. Solomon weere ọnọdụ ya n’elu nke ọlà bụ nke alụrụ n’ihi ememe ahụ. O buru ụzọ guzo; mesịa gbue ikpere n’ala n’iru mkpọkọta niile nke Israel na ọbụaka ya abụọ ọ gbasara n’ebe eluigwe dị. Solomon matara na ụlọ a apụghị ịmalite inwe óké nnọnye niile nke Chineke onye “nēbi ebigh-ebi”; ma ọ bụ agụụ Solomon ka Chineke tụkwasị Aha Ya n’ebe ahụ na kwa ka anya Ya na-asaghe ehihie na abalị n’ebe ụlọ a dị na n’arụ mmadụ niile ndị ná-efe òfùfè n’eziokwu n’ebe ahụ. Eji arịrịọ siri ike nke Solomon mechie ekpere nke ido ụlọ ahụ nsọ.

Ekpere nke Azara

“Ma mgbe Solomon kpebiri ekpere, ọku siri n’Elu-igwe ridata, we ripia àjà-nsure-ọku na àjà nile; ebube Jehova we juputa ulo ahu” (2 Ihe-Emere 7:1). Mgbe ọku Chineke na-adakwasị n’àjà ahụ, ọ dịghị ajụjụ aga-ajụ ma Chineke Ọ zara ekpere ahụ maọbụ na Ọ zaghị. Ụmụ Israel ñụrịrị ọñụ ịhụ mpụtaìhè nke Chineke, n’ihi na “ha we ruru ala, kpuchie iru-ha n’ala n’elu pavement, kpọ isi-ala, we kele JEHOVA” (2 Ihe Emere 7:3).

Ọ ghaghị ịbụ ihe dị ukwuu nye Ụmụ Israel nke oge Solomon ịhụ ka ọkụ siri n’ebe Chineke nọ bịa ripịa àjànsureọkụ na àjà niile, n’ihi na ụdị ọkụ ahụ arịdataworị ná nrara nke Ụlọikwụụ ahụ nye Chineke n’ọzara. Chineke enyeworị iwu sị “Mgbe dum ka agēme ka ọku nēre ere n’elu ebe-ichu-àjà; ọ gagh-anyu anyu” (Levitikọs 6:13). Ndịnchụàjà eleziwo anya idebe ihe Chineke nyere n’iwu, ha ji kwa ọkụ a si n’Eluigwe ná ejéozi nke òfùfè niile ha. Ọkụ niile ọzọ ka akpọrọ ọkụ ala ọzọ.

OnyeKraist ọ bụla nke oge a aghaghị ịbụ ọkụ ná-ere ere nye Chineke n’ụzọ pụtara ìhè. Mgbe mmadụ na-achọ wee nata kwa ọmụmụ ọhụụ, ọ na-eji obi achụàjà -- àjà nke ndụ ya nye Chineke. Mmụọ Nsọ nke Chineke na-agba àmà n’obi mmadụ ahụ na azawo ekpere ya banyere nzọpụta, iré ọkụ nke ịhụn’anya Chineke na-eju obi ya. O kwesịghị ka ezoo iré-ọkụ nke ịhụn’anya ahụ, o kwesịrị ka o nwupụta nkeọma ka mmadụ niile ná-ahụ ya. Jisọs gwara ndị náeso ụzọ Ya sị “unu onwe-unu bu ìhè nke uwa. Apugh izo obodo nke ewuworo n’elu ugwu” (Matiu 5:14). Ọkụ dị nsọ nke Chineke na-anọgide ná-ere n’obi nke OnyeKraist site n’idebe ihe niile Chineke nyere n’iwu, site n’ekpere dị ukwuu, site n’ibi-ndụ na mkparịta ụkà dị nsọ, site n’ijé ijè n’ìhè niile nke uche Chineke ekpughere, na site n’iji obichụaàjà nke ndụ na ịhụn’anya nye Chineke Nna, na Ọkpara Ya Jisọs Kraist mgbe niile.

Ugwu Moraia

Ebe a nke dị na mkpọda nke Ugwu Moraia ebe ewuru Ụlọukwuu ahụ abụrụwo ebe ihe abụọ dị mkpà nke gosipụtara amara na ike nke Chineke mere n’oge gara-aga. Ihe atọ ndị ahụ na-egosi mmasị nke ná-adị n’obi Chineke mgbe niile ikpughe onwe-Ya karịa nye ụmụmmadụ. Abraham bụ onye mbụ akpọrọ ijé Ugwu Moraia mgbe Chineke gwara ya ka o suree nwa ya nwoke dịka àjànsureọkụ. Abraham zara “Lekwam” wee malite njèm ahụ ngwangwa. Okwukwe Abraham nyeghachiri ọzịzá n’ajụjụ ahụ nke Aisak jụrụ: “Chineke gāhuru Onwe-ya nwa-aturu iji chu àjà-nsure-ọku, nwam” (Jenesis 22:8). Ekere Aisak agbụ wee tụkwasị ya n’elu nkụ dị n’elu ebeịchụàjà, ma mmụọozi nke Chineke gbochiri ịchụàjà ahụ. Otù ebulu nke alụghụlụ na-ejide ya na mpi ya weere ọnọdụ Aisak -- iheatụ nke Ọkpara Chineke ahụ Onye bụ ezi Nwaatụrụ ahụ nke Chineke nyere ụwa. Nime oge hour nke ikpeazụ ewezugaghị Ya pụọ n’ebeịchụàjà ahụ maọbụ n’obe. Awụsịrị Ọbara Ya ka ewee gbaghara mmadụ mmehie niile ya.

Njèm nke Abụọ

Ọtụtụ arọ gabigara tutu e jee njèm nke abụọ rue ebe a dị nsọ. Devid kpebiri na mberede, ná-enweghị ndụmọdụ site n’ebe Chineke nọ, ịgụ Ụmụ Israel ọnụ, ma ngwangwa agụsịrị ka ọ ghọtara na ya ejehiewo n’uche Chineke. Chineke nyere Devid ikpé atọ ka ọ rọrọ otù. Devid zaghachiri Onyeamụma wetara okwu nke Onyenwe anyị ahụ sị “Anọm na nkpa nke-uku: biko ka ayi daba n’aka JEHOVA; n’ihi na obi-ebere Ya bara uba; ma ka m’ghara idaba n’aka madu” (2 Samuel 24:14).

Onyenwe anyị wee zite ajọ ọrịa ná-efèèfè n’arụ Israel ụbọchị atọ. Puku ndịkom iri asaa nwụrụ tutu enye mmụọozi mbibi ahụ iwu ka ọ raa aka ya. Devid rịọrọ Onyenwe anyị arịrịọ banyere ndị ya. Onyenwe anyị wee nụrụ wee zite Onyeamụma ahụ izí Devid ozi ka ọ gaa n’ebenzọchaọka nke Arọna n’Ugwu Moraia, wue ebeịchụàjà n’ebe ahụ ma chee kwa onyinye n’iru Chineke. Devid rubere isi ngwangwa ná ntuzi-aka Chineke.

Arọna chọrọ inye Devid ihe niile ọ ga-achọ maka àjànsureọkụ ahụ, ma Devid jụrụ ná-asị, “É-è; kama aghaghm izuru ya n’aka-gi n’ọnu-ahia: m’gagh-esure-kwa-ra JEHOVA, bú Chinekem, àjà-nsure-ọku nke m’nētiyegh ego ọ bula” (2 Samuel 24:24). Devid jiri obi chọọ onyinye ahụ nke kachasị óké ọnụahịa ọ pụrụ ịhụ inye Onyenwe anyị.

Gịnị bụ onyinye ahụ kachasị óké ọnụahịa nke OnyeKraist pụrụ inye Onyenwe anyị n’ụbọchị taa? Ndụ bụ ihe mmadụ nwere kachasị óké ọnụ, n’ihi na “ihe nile nke madu nwere ka ọ gēnye n’ọnọdu ndu-ya” (Job 2:4). “Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n’iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di” (Ndi Rom 12:1). Obi ahụ na ndụ ahụ nke Chineke ga-anara n’ijiobichụaàjà n’ihi ijé ozi bụ nke ahụ agụworo n’onye eziomume site n’okwukwe.

Njèm nke abụọ a ejere n’Ugwu Moraia bụ ụdị nke odudonsọ. Onye ahụ nke na-achọ ọlụ amara nke abụọ ahụ n’ụbọchị taa aghaghị iweta onyinye dịkarịsịrị óké ọnụ -- onwe ya dịka àjà dị ndụ -- n’iji obichụaàjà, wee rapụ ya n’ebeịchụàjà nke Chineke iji ya mee ihe dịka o si dị Ya mma.

Njèm nke Atọ

Njèm nke atọ nke e jere n’Ugwu Moraia ka e mere n’ụbọchị ahụ dị ebube mgbe araara Ụlọukwuu ahụ nye Chineke. Ebe a ka enwere ihe-ngosi banyere Ụbọchị Pentikọst, ọ bụ kwa ihe kwesịrị ịmata ọtụtụ ihe mere ka óké ememe abụọ ndịa yie onwe ha.

Ndịnchụàjà niile ndị sonyere n’ịrara Ụlọukwuu ahụ nye Chineke bụ ndị e doro nsọ. Ndị náesoụzọ Kraist, ndị ná-echere n’Ụlọ Elu ahụ bụ ndị e doro nsọ n’otù aka ahụ. Ndịnchụàjà dị otù narị na iri abụọ gburu opiike n’ịrara Ụlọukwuu ahụ nye Chineke, ọ bụ kwa otù narị na iri abụọ bụ ndị náesoụzọ Kraist nọ n’Ụlọ elu mgbe Mmụọ Nsọ dakwasịrị ha. Ndị une na ndị-ọbụabụ “di ka otù olu n’ito na n’ikele JEHOVA,” Baịbụl na-agwa kwa anyị na “mgbe ubọchi Pentikọst nēzu òkè, ha nile we nọkọ (n’otù olu, n’otù obi), n’otù ebe” (Ọlu Ndi-ozi 2:1). Ebube nke Onyenwe anyị jupụtara Ụlọukwuu Chineke ahụ, ọkụ wee si n’Eluigwe rịdata iripịa àjànsureọkụ na àjà niile. Banyere Pentikọst, anyị na-agụ na “Ná mberede ùzù, dika nke oké ifufe nke nēfesi ike, we site n’elu-igwe, o we juputa ulo ahu dum ebe ha nānọdu ala. Ewe me ka ha hụ iré, dika nke ọku, nēkesa onwe-ha; ọ we nọkwasi ha nile n’otù n’otù. Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n’asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu” (Ọlu Ndi-ozi 2:2-4).

Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ bụ onyinye kachasị onyinye niile Chineke nyere ụmụmmadụ. Ọ dịrị anyị bụ ndị bi n’oge Oziọma a. Mmụọ Nsọ ahụ ga-abata n’obi ahụ edoworo nsọ nke ná-achọ Ya. “Unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra bú ndi Onye-nwe-ayi Chineke-ayi gākpọtara Onwe-ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:39).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Kpọpụta ọtụtụ ụzọ nke apụrụ iji owuwu Ụlọukwuu Chineke ahụ tụnyere njikere nke OnyeKraist maka Eluigwe.
  2. Gịnị bụ otù nime ihe mbụ Solomon mere ka o jikere ido Ụlọukwuu ahụ nsọ?
  3. Òlee ebe bụ ebe ndebe ikpeazụ nke Igbe Ọgbụgbandụ ahụ?
  4. Ònye ka ekwenyere ịbà n’Ebe Nsọ ahụ kachasị ebe Nsọ niile? Ugbò ole n’arọ?
  5. Gịnị ka Ebe Nsọ ahụ kachasị ebe Nsọ niile na-egosipụta?
  6. Òlee ụzọ usoro nke òfùfè si gbanwee n’oge nke amara?
  7. Kpọọ ihe olenaole ná-adịghị ntà karị isii n’ọnụọgụgụ bụ ihe Solomon kpere ekpere maka ha n’ekpere ya nke ido Ụlọukwuu ahụ nsọ.
  8. Gịnị bụ óké ihe mere ná ngwụsị ekpere ya?
  9. Kpọọ njèm atọ ahụ e jere n’Ugwu Moraia.