I Ndi Eze 10:1-29

Lesson 259 - Senior

Memory Verse
“Ihe anya nāhugh, nke nti nānugh kwa, nke nābagh kwa n’obi madu, ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n’anya” (I Ndi Kọrint 2:9).
Cross References

I Udé nke Solomon

1. Ezenwanyị Sheba ahụ nụrụ udé Solomon banyere aha Onyenwe anyị n’ala dị anya, I Ndi Eze 10:1; Joshua 6:27; I Ndi Eze 4:29-34; Aisaia 66:18, 19; Matiu 4:23-25; 9:26, 31

II Njèm nke Ezenwanyị Sheba ahụ

1. Ezenwanyị ahụ ji ajụjụ siriike bịakute Solomon iji nwaa ya, I Ndi Eze 10:1; Ilu 1:5, 6; Matiu 22:46; Luk 14:6

2. Ezenwanyị Sheba ahụ gwara Solomon ihe niile nke dị ya n’obi, I Ndi Eze 10:2; Luk 2:19; Ọlu Ndi-ozi 8:30, 31; 16:30

3. Solomon zara ajụjụ niile nke Ezenwanyị ahụ jụrụ, I Ndi Eze 10:3; Aisaia 11:2; Matiu 13:54; Ndi Rom 11:33; Jọn 2:25; Jeremaia 32:17-19

III Ebube nke Solomon

1. Ebube nke alaeze Solomon mere ka Ezenwanyị ahụ jupụta ná nsọpụrụ na egwù, I Ndi Eze 10:4, 5; Daniel 8:17; 10:8; Nkpughe 1:17; 19:10

2. Ezenwanyị Sheba ahụ gbara àmà na ya anụwo akụkọ bụ eziokwu banyere Chineke Solomon, wee nye kwa Ya otuto, I Ndi Eze 10:6-9; Jọn 4:29; 9:38; 20:25

IV Onyinye Eze

1. Ezenwanyị Sheba ahụ nyere Solomon onyinye ụfọdụ dị óké ọnụahịa, I Ndi Eze 10:2, 10-12; Abù Ọma 72:10, 15; Matiu 2:1, 2, 11

2. Solomon nyere Ezenwanyị ahụ ihe niile obi ya na-achọ, I Ndi Eze 10:13; Abù Ọma 144:10; 149:4; Matiu 15:28; Jọn 14:14; Ndi Efesos 3:20

3. Akụ dị ukwuu, amamihe, iheọmụmá, nsọpụrụ na ebube nke Solomon bụ ihe-atụ nke ebube Onyenwe anyị na Alaeze Ya, I Ndi Eze 10:14-29; Daniel 7:13, 14; Luk 1:32, 33; Abù Ọma 145:13; Nkpughe 21:1, 2, 22-26.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Òkù nke Chineke

Akwụkwọnsọ na-ekwu banyere Fero nke Ijipt na ọ bụ site n’àtụmààtụ Chineke ka o ji bụrụ Fero ahụ. “Ọ bu n’ihi otù ihe a ka M’mere ka I bilie, ka M’we gosi ikem nime gi, ka ewe kwusa kwa aham n’uwa nile” (Ndi Rom 9:17; Ọpupu 9:16).

Chineke buliri Solomon n’ọnọdụ dị elu nke-ukwuu ka e wee mara aha Onyenwe anyị n’ụwa niile. Anyị maara na nke a bụ eziokwu, n’ihi na ebe-ọgụgụ anyị na-ekwu na Ezenwanyị Sheba ahụ nke na-ebi n’ala dị anya nke-ukwuu, nụrụ maka udé Solomon, banyere aha Onyenwe anyị. Ọ bụghị náánị maka udé Solomon ka ọ nụrụ, kama udé nke Chineke ọ na-efè. Nke a bụrị ụzọ Chineke ji akpali ndị mmadụ nke oge ahụ iji mata na Chineke dị, na ọ dịghị kwa onye ọ bụla ọzọ dị ka Ya! (Lee Aisaia 46:9).

Solomon, onye ka bụ nwaokoro mgbe ọ rịgooro ocheeze nke Israel, arịọwo Chineke nkeọma banyere nghọta ka o wee nwee ike ịchị Israel n’eziomume. Arịrịọ a dị Chineke ezimma nke-ukwuu nke mere na O nyeghị Solomon náánị amamihe nke ọ dịghị mgbe ọ bụla mmadụ nwere ya -- ma ewezuga Jisọs Kraist -- kama Ọ tụkwasịịrị ya akụ na ụba dị ukwuu (Gụọ I Ndi Eze 3:5-13). Chineke gọziri Solomon n’ụzọ pụrụ iche, Onyenwe anyị ji kwa nke a mee ka Ya onwe-ya dị elu n’ụzọ dị ukwuu. N’ụzọ dị otú a, Ezenwanyị ahụ nụrụ maka Onyenwe anyị wee bịa ịhụ Solomon ka o wee nwaa ya site n’ọtụtụ ajụjụ siri ike.

Lee óké mmasị anyị kwesịrị inwe n’ebe ịdịmma nke Chineke dị nye ihe niile O kère èkè dịka anyị ná-eche banyere mgbalị niile ahụ dị ukwuu nke Chineke na-agbalị iji kpọọ otù onyemmehie bịarue nchègharị! Ebuliri otù mba elu nke-ukwuu, otù nwoke ka enyere amamihe, àkụ na nsọpụrụ anụbeghị nke dị ka ya, ihe ndịa bụ ka Onyenwe anyị wee dọrọ mmadụ niile nye onwe-Ya.

Ka anyị na-agụ maka nghọta mbụ nke Ezenwanyị Sheba ahụ nwere n’ebe Onyenwe anyị nọ, amụma Aisaia buru na-abata n’échìchè: “Ndi nējeghari n’ọchichiri huru ìhè uku: ndi bi n’ala onyinyo-ọnwu, ìhè amukwasiwo ha” (Aisaia 9:2).

Ọtụtụ Ajụjụ siriike

Ọ bụghị ijé efu ka Ezenwanyị ahụ gara mgbe ọ bịakutere Solomon. Ọ bịara ịnwapụta akụkọ ahụ ọ nụwororị. Njèm nke a aghaghị ịbụ nke jupụtara n’iheisiike, jupụta kwa n’ọtụtụ iheizendụ. Ọ bụ ijé dị ogologo; na nwanyị a nke bụ onye na-achị obodo nke aka ya ga-agbalị ịga njèm dị otú a bụ ihe dị ukwuu karịa ọchịchọ nke anụarụ ọ bụla ịga kiri ihe maọbụ mkwànyeùgwù nke ndị ọchịchị.

Ikwu na Ezenwanyị ahụ bịara ịhụ Solomon n’ihi ihe ọ bụla ọzọ na-abụghị ịchọta ọzịzá nke ọtụtụ ajụjụ dị mkpà banyere mkpụrụobi ya na ihe banyere ọdịmma ebighịebi ga-abụ iwedata ịdịelu nke omume nwanyị a na mkpụrụobi ya. Ọ bụ onye na-achọ Eziokwu, ọ dịghị njèm ọ bụla ọ gụrụ n’ihe dị óké ogologo, maọbụ iheisiike ọ bụla n’ihe dịkarịrị ike igbochi ya site n’inweta ọzịzá niile nye ọtụtụ ajụjụ ahụ ná-abịa n’échìchè ya mgbe dum nke ọ dị ka ọ dịghị ọzịzá ọ bụla ha nwere.

Chineke na-achọ ọtụtụ ndị mmadụ n’ụwa n’ụbọchị taa ndị nwere akpịrịịkpọ nkụ dị otú ahụ ịchọ ọzịzá ziriezi n’ebe nsogbu niile nke ndụ ha dị! Ụmụmmadụ na-achụso akụ nke ụwa ná-agabiga site n’ọchịchọ ná-enweghị ọgwụgwụ na óké inyebiga onwe ókè. Ọ na-adị ka o nweghị ọgwụgwụ bụ ọtụtụ mkpụrụobi ụmụmmadụ ndị ná-aba n’ọnụọgụgụ inweta okpueze nke ụwa na nsọpụrụ ya niile. Ọtụtụ mkpụrụobi mmehie mebiworo ejuwo nime ụwa bụ ndị dabaworo n’ọnwụ ebighịebi ka ha na-achụso àkụnaụba efu niile nke ndụ bụ nke ná-ala n’iyi mgbe ana-eji ha eme ihe.

Mkpụrụobi olenaole n’ezie bụ ndị ná-achọ Isiiyi nke Ndụ ahụ -- bụ Jisọs Kraist -- ná-achọ kwa Eziokwu n’ihi Eziokwu. Ndị ahụ na-eji obi eziokwu achọsi ike ịnata ọzịzá banyere nsogbu niile dị na mkpụrụobi ha agaghị arapụ ịchọta Onye ahụ nke pụrụ inye ha ọzịzá zuruòkè.

Onye ka Solomon

Ezenwanyị Sheba ahụ ejeghị ogologo ijè ya n’efu. Ebe ọgụgụ ahụ na-asị “Solomon we gosi ya okwu-ya nile: ọ digh okwu ọ bula ezonariri eze nke ọ nēgosigh ya” (I Ndi Eze 10:3). Chineke arapụghị ya ka ọ laa ná-enweghị ụgwọọlụ n’ihi mgbalị niile ya. O nyere Solomon ọzịzá nke ajụjụ ọ bụla. Chineke anaghị adọrọ mmadụ nye onwe-Ya wee jụ ịña ntị n’ajụjụ niile ha. (Gụọ Jọn 6:37).

Mgbe Jisọs na-ama ndị-Juu ikpé n’ihi ekweghị ekwe ha n’ebe Ọ nọ, O toro Ezenwanyị ahụ nkeọma, wee bulie ya elu dịka ihe-àtụ nye ndịọzọ. Jisọs bụ onyinyo Chineke pụtara ìhè; Ọ bụ ìhè nke mmadụ; Ọ ka kwa Solomon ukwuu. Ma Israel jụrụ Ya! Ọ gwara ha sị “Agēme ka Eze-nwayị nke Ndida so ọgbọ a bilie n’ikpe ahu, ọ gāma kwa ya ikpé: n’ihi na o siri n’ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomon; ma le, Onye ka Solomon nọ n’ebe a” (Matiu 12:42).

Ezenwanyị Sheba ahụ ji ohere ahụ nke ịhụ isiiyi nke amamihe edoziri nye ya mee ihe, ọ bụ ezie na o si n’ebe dị anya bịa ịnụ amamihe ahụ. N’ihi nke a, ọ ga-ebili n’ikpe megide ndị ahụ nwere eziokwu ebighịebi nke Oziọma Jisọs Kraist n’ebe aka ha pụrụ iru, ma ha egeghịntị. Ahụhụ ga-adịrị ụwa mgbe ikpé ahụ ga-eru! Gịnị bụ ngọpụ aga-anara banyere mmehie ebe ọlụ alụworo banyere mgbaghara mmehie bụ ihe ana-achọghị na nke ana-enweghịkwa mmasị ya? Mgbe Ezenwanyị ahụ ga na-agba àmà banyere óké ijé ahụ o jere ịnụ amamihe Solomon, òlee ngọpụ ga-anapụta ụmụ mmadụ ndị na-agbalịghị maọlị ịmụta n’ọnụ Kraist? Jisọs Kraist bụ Eziokwu emere ka Ọ ghọọ mmadụ, anyị nwere ike ịbịakute Ya wee jụta Ya ụzọ nke ndụ na eziokwu. Nime Kraist ka ezoro àkụ niile nke amamihe na iheọmụmá (Ndi Kọlọsi 2:3). (Lee kwa Jọn 14:6).

Anyị ga-eme nkeọma ma ọ bụrụ na anyị amụta ịjụta Jisọs ezi ọzịzá nke ajụjụ ebighịebi niile. Mgbe ahụ ka anyị pụrụ isoro Ezenwanyị Sheba ahụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ ịgbá àmà na azara ajụjụ niile ahụ.

Akụkọ nke bụ Eziokwu

“O we si eze, Ezi-okwu ka okwu ahu bu nke m’nuru n’alam bayere okwu-gi nile, baye-kwa-ra amam-ihe-gi. Ma ekweghm okwu ahu, rue mgbe m’biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera-ya: I tukwasiwo amam-ihe na idi-nma n’akukọ m’nuru.”

Ọ dị onye pụrụ ịkọwa agụụ na olileanya ahụ nke mmadụ na-eji abịakute Chineke mgbe ọ na-arịọ mgbaghara n’ihi mmehie dị ná ndụ ya? Lee ka Chineke si eji olileanya dị ntà nke dị nime mmadụ adọrọ ndị mmadụ ọtụtụ mgbe jerue iheọmụmá nke amara nzọpụta Ya! O nwere ike ịbụ na Ezenwanyị Sheba ahụ enweworị ọtụtụ mgbagwojuanya n’obi ya banyere otú ijé ya ga-esi gaa nkeọma. Ma otú ọ dị, ọ gara n’olileanya, ná-agbanyeghị obiabụọ niile nke na-enubata n’échìchè ya, na Solomon ga-enwe ike ịgwa ya ọzịzá nke ihenzuzo niile nke obi ya. Mgbe ọ natara ihe ahụ nke ọ bịaworo ịhụ na ịnụ, ọ pụghị igbochi onwe ya site n’ikwupụta, “Egosighm nkera-ya.”

Ụdị ịgbáàmà ahụ, “Egosighm nkera-ya”, ka ha kwuworo ọtụtụ ugbò bụ ndị ahụ nụworo Ozi nke nzọpụta, wee bịa nwapụta ike nke amara mgbapụta nime ndụ ha onwe ha. Ihe mmadụ na-anwapụta mgbe agbaghara ya mmehie niile ya karịrị ihe apụrụ ịkọwa.

Ịdịukwuu nke Alaeze ahụ

“Eze-nwayi Sheba we hu amam-ihe nile nke Solomon, na ulo nke o wuru, na ihe-oriri nke table-ya, na nnọdu nke ndi-orù-ya, na nguzo nke ndi nējere ya ozi, na uwe-ha, na ndi-obu-ihe-ọñuñu-ya, na àjà-nsure-ọku-ya nke ọ nēsure n’ulo JEHOVA; mọ adigh kwa nime ya ọzọ” Eze-nwayị ahụ abụghị onye mbụ ma-ọbụ onye ikpeazụ ọ na-emetu n’obi bụ ụdị ejiji na omume niile nke ụmụ Chineke, na mmụọ nke òfùfè na itò Chineke bụ nke na-akwagide ihe niile nke NdịKraist nwere na nke ha na-eme kwa. Ndị nke Chineke bụ akwụkwọozi dị ndụ, nke mmadụ niile maara ná-agụ kwa; ihe ọ bụla ha na-eme, na kwa okwu niile ha na-ekwu, bụ ịgbáàmà nye ndị ahụ na-anọghị n’Alaeze Chineke.

Ebube na ịma-mma nke ụlọ Solomon bụ nke ọ dịghị ọzọ aga-eji tụnyere ya n’oge ya, na-enweghị kwa obiabụọ ọ bụ nke pụrụ iche n’ụzọ ọ bụla. Anyị kweere na Ezenwanyị ahụ hụrụ ihe karịrị ihe anya anụarụ pụrụ ịhụ. Ịmamma nke ọlụnkà, ihe-ngosi, ememe, uwe oyiyi eze, uwe dị ókéọnụ nke ndị na-ejéozi, na ịmamma nke ihe niile abụghị ihe gosipụtara ezi ịdịukwuu nke ebube ahụ. Ebube na nsọpụrụ na-apụta site nime mmadụ -- ebube na nsọpụrụ Chineke dị kwa n’ụlọ Solomon ahụ. Enwewo ndịeze ukwuu ọzọ ndị nwere ụlọ maramma ndị ra ka nke Solomon n’ebube nke ụwa nke a ma eleghịanya; ma ụlọ Solomon nwere ebube na nsọpụrụ nke ụwa ọzọ. Ebube nke Chineke dịkwasị n’ụlọ ya niile, ịmamma nke Chineke Onyeòkìkè mere ka iru ya mụkwasị onye ọ bụla, na n’òfùfè onye ọ bụla na-efè.

Ọ bụ ebube nke Chineke ka Ezenwanyị Sheba ahụ hụrụ, ọ bụ kwa nnọnye nke Chineke Pụrụimeiheniile ka o nwere mmetụta ya, nke mere ka mmụọ ya rulata ná nsọpụrụ nye Chineke ahụ. Anyị maara na ọ bụrụwo nnwapụta nke nwa Chineke ọ bụla onye kpeworo ekpere dị ike nke okwukwe, na o nwewo mmetụta n’onwe ya ịnọ n’iru Chineke, o biliwo kwa n’óké ọñụ na njupụta nke nsọpụrụ na egwù nke ebube Chineke ahụ nke ọnụ ná-apụghị ịkọ. Mgbe mmadụ nwere mmetụta na ya na-eguzo náánị ya n’iru Chineke nime Mmụọ Nsọ, ọ na-anwapụta óké ọñụ nke ọ na-apụghị ịkọ. Site n’ụzọ nke ekpere ọ na-aba nime “ala di anya” ya na Eze nke ndịeze niile na-akparịta kwa ụka, mkpà ya niile sikarịrị ike ka ana-egbò kwa.

Eze Solomon nyekwara Ezenwanyị ahụ ihe niile ná-agụ obi ya agụụ, tụkwasị kwa nke a o nyere ya ihe sitere n’ụlọ àkụ nke eze ya. Ná-enweghị obiabụọ nsogbu niile nke njèm ya ịlaghachi ụlọ ka emere ka ha dị mfe site n’ọtụtụ ncheta ọma niile, obi nke jupụtara n’udo, na iheọmụmá ahụ ọ gara n’ebe dị anya inweta.

Otú ahụ ka ọ na-adị kwa nye onye mmehie ọ bụla nke ná-abịakute Chineke maka ebere na mgbaghara mmehie. Ọ na-achọta agụụ nke obi ya, ná-anata kwa tinyere ya òkè ụfọdụ nke si n’ụlọ àkụ nke Eze ahụ. Ọ na-alaghachi n’ụlọ ya n’obi nke nwere udo, na mnwapụta nke mgbaghara mmehie.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú Ezenwanyị Sheba ahụ si nụ banyere Chineke nke Solomon?
  2. N’ihi gịnị ka Ezenwayị ahụ ji chọọ ịga hụ Solomon?
  3. Ị na-eche na óké mgbalị dị mkpà nye ya iji jerue n’ụlọ Solomon?
  4. N’ihi gịnị ka Jisọs ji too Ezenwanyị Sheba ahụ?
  5. Òlee otú Solomon si bụrụ ihe-àtụ nke Onyenwe anyị?
  6. Òlee otú anyị si mara na Ezenwanyị ahụ natara ọzịzá nke ọtụtụ ajụjụ ya?
  7. Gịnị mere Ezenwanyị ahụ ji nwee afọojuju dị ukwuu banyere alaeze Solomon?
  8. Òlee otú onyeKraist si amata ihe ọ bụla banyere alaeze nke Onyenwe anyị?