Luk 1:1-38; Matiu 1:18-25

Lesson 260 - Senior

Memory Verse
“Nwa-nwoke ahu gābu onye uku, agākpọ kwa Ya Ọkpara nke Onye kachasi ihe nile elu: Onye-nwe-ayi Chineke gēnye kwa Ya oche-eze-nna-Ya Devid” (Luk 1:32).
Cross References

I Ọkwà ahụ Mmụọozi Maara Nye Zekaraias

1. Okwu mmbido nke Luk gosipụtara ịbụ eziokwu nke ihe o dere, Luk 1:1-4; 2 Timọti 3:16

2. Eziomume na ịnụọkụn’obi nke Zekaraias na Elizabet mere ka ha bụrụ ndị kwesịrị ka Chineke jiri ha jee ozi, Luk 1:5-7; I Timọti 6:11-16; Taitọs 1:5-9

3. Mmụọozi ahụ pụtara n’Ebe Nsọ ahụ ka Zekaraias na-esure ihe nsureọkụ na-esi isi ụtọ, Luk 1:8-11; Ọpupu 30:1-9; Nkpughe 8;3; Abù Ọma 141:2

4. Mmụọozi ahụ kasiri Zekaraias obi wee zi kwa ya ozi sitere na Chineke, Luk 1:12-17; Daniel 8:16; 9:21-23; 10:10-12

5. Ịrụụka niile nke Zekaraias ka azara site ná nkọwa nke mmụọozi ahụ kọwara onwe ya, na kwa iheiribaàmà iji gosi ịbụ eziokwu nke ozi nke Chineke, Luk 1:18-20

6. Okwu Chineke ka emezuru, Luk 1:21-25

II Ịma Ọkwà nke Mmụọozi Ahụ Nye Meri

1. Arọpụtara Gebriel iwetakwara Meri ozi nke Chineke, Luk 1:26, 27

2. Mmụọozi ahụ kelere Meri ma zie kwa ya ozi ahụ, Luk 1:28-33

3. Ajụjụ niile nke Meri abụghị nke ịrụụka kama nke ịmara ihe ga-abụ ókénaọlụ ya n’ihe ahụ nke gaje ime, Luk 1:34

4. Gebriel kọwara ọlụ nke Mmụọ Nsọ, gbaa okwukwe Meri ume ma kwuwakwaa okwu banyere inwe ike niile nke Chineke, Luk 1:35-37; Job 42:2; Abù Ọma 115:3; Matiu 19:26

5. Meri jiiri obi ya dum kwenye ka Chineke weere ya jee ozi otú a, Luk 1:38; Abù Ọma 110:3; Aisaia 1:19; 2 Ndi Kọrint 8:3

III Mpụtaìhè nke Mmụọozi ahụ nye Josef

1. Ọ gbagwojuru Josef anya n’ihi na o chere na Meri ekwesịghị ntụkwasịobi, Matiu 1:18, 19; Deuteronomi 22:22-27

2. Josef bụ onye eziomume ma Chineke zigara otù mmụọozi ịgwa ya banyere ọbịbịa nke Kraist, Matiu 1:20-23

3. Josef rubeere okwu Chineke isi, Matiu 1:24, 25.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ndị Mmụọozi na Ndị Isimmụọozi

Dịka anyị na-amalite iheọmụmụ banyere akụkọ nke Kristmas mgbe ochie nke na-adị kwa ọhụụ mgbe dum, ka anyị tụgharịa uche n’okwu olenaole dị mkpà nke metutara ya.

Ọ dịwo ogologo ihe ra ka narị arọ anọ (400) ké mgbe mmụọozi ziri ozi maọbụ eburu amụma ikpeazụ ahụ nye Israel. Ogologo oge agafesịworị ké mgbe Chineke sitere n’ụzọ dị ebube otú a mee ka Ya onwe-ya pụtaìhè n’ihi mba ahụ nke Ọ rọpụtara. Ihe ndepụta ikpeazụ edepụtara maka mpụtaìhè nke mmụọozi ahụ bụ Gebriel, onyeisi mmụọozi ahụ, onye bịakutere Daniel Onyeamụma ahụ ná-eweta ozi sitere na Chineke banyere ndọta n’agha ahụ. Gebriel akpọworị aha onyeisimmụọozi ọzọ nke bụ Maikael n’oge ahụ. Agwaghị anyị ndị-isimmụọozi ole ha dị, kama Gebriel gbara àmà na ya sitere n’iru Chineke; ma n’Akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl ekwuru na ha dị mmụọozi asaa ndị na-eguzo n’iru Chineke (Nkpughe 8:2). Anyị amaghị ma asaa ndịa bụ ndịisimmụọozi, maọbụ na Gebriel maọbụ Maikael so na asaa ndịa. Ma anyị matara na ndị mmụọozi abụọ ndịa si n’Eluigwe bụ ndịozi pụrụ iche si n’ebe Chineke nọ ndị ná-ejere Chineke ozi n’ụzọ dị iche n’ịlụpụta ọlụ dị icheiche dịkasịrị mkpà.

Akpọrọ Maikael otù nime ndịisi (Daniel 10:13), akọwakwara na ọ na-eguzo n’akụkụ ụmụ ndị nke Daniel, ndị anyị matara na ha bụ ndị Ju (Daniel 10:21; 12:1). Maikael bụ mmụọozi pụrụ iche onye nwere ozi banyere ndị nke Chineke arọpụtara. Ekwuru banyere ya n’Akwụkwọnsọ dịka onye ná-alụ ọlụ siri ike dị icheiche, ọbụná rue n’ịgbaso ekwensu mgbá n’onwe-ya (Jud 9; Nkpughe 12:7).

Ma enyere Gebriel ohere kachasị ukwuu nke onyeozi ọ bụla sitere n’Eluigwe pụrụ inwe. Anyị na-amụ ihe banyere mpụtaìhè niile ndịa pụrụ iche nime iheọmụmụ a. Náánị oge ọzọ edepụtara na Baịbụl, na Gebriel na-apụta ìhè bụ oge ndọtan’agha ahụ mgbe ọ bịakutere Daniel wee weta ozi dị icheiche sitere n’ebe Chineke nọ banyere ụbọchị ikpeazụ na ihe ndị ga-ewere ọnọdụ tupu, na n’oge nke Nkpughe nke Kraist. Anyị pụrụ ịhụ, n’oge ahụ, na ijé ozi niile nke Gebriel metụtara Jisọs Kraist, Eze nke Ebube ahụ, dịka Onyenzọpụta nke mmadụ.

Nleta nke Gebriel nye Zakaraias

Ọ bụ ihe dị mma ịhụ otú o si daba n’ụzọ zuruòkè n’Àtụmààtụ dị Nsọ ahụ bụ ihe niile edere banyere mpụtaìhè niile nke mmụọozi ahụ. Gebriel bú ụzọ pụtaìhè nye otù nime ndịnchụàjà -- Zakaraias -- onye ná-ejéozi n’Ụlọukwuu Chineke dị na Jerusalem, obodo nke Chineke. Otù onyenchụàjà na-eguzo n’etiti Chineke na ndị mmadụ; dịka àtụmààtụ Chineke si dị, mkpughe niile ahụ aghaghị isite n’otù onye n’etiti ndị ahụ. Mata kwa na Gebriel apụtaghị ìhè nye Zakaraias n’obodo nke aka ya kama ọ bịaruru ebe ahụ nke kwesịrị ka ọ bịa mgbe ọ na-eweta ụdị ozi ahụ. Ọ bịara n’Ụlọukwuu Chineke wee zute onye ná-anọchite anya ndị ahụ n’ebe ahụ. Ọ bụ n’Ụlọukwuu Chineke ka anyị na-anụ Okwu Chineke karịsịa. Ọ bụ site na gburugburu ebe Nsọ Ya, ewepụtara iche maka ifè Chineke òfùfè, ka Chineke na-eme ka ndị Ya mata uche Ya mgbe ọ bụla. Chineke na-eme ihe niile nkeọma. O zipụrụ ozi a dịkarịrị mkpà site n’aka onyeozi kwesịrị, n’oge kwesịrị, jee n’ebe kwesịrị, ka onye kwesịrị wee nata ya.

Mata kwa na ọ bụ n’oge ekpere ka anatara ozi nke Chineke ahụ. N’ebe a kwa, bụ óké ihemmụta nye anyị niile. Anyị adịghị anụ Olu ahụ mgbe akọnauche na obi anyị bụ ihe ana-ewere nchègbu nke ndụ a bogbue, ma ọ bụghị na Olu ahụ na-ekwu okwu ịdọ anyị akanántị banyere omume ọjọọ anyị dị icheiche. Anyị na-achọpụta, site ná mnwapụta na site n’eziokwu nke edere na Baịbụl, na Chineke na-abịaru anyị nso. Mgbe mkparịtaụka anyị na Chineke na-akwụgo rue ocheeze nke Eluigwe, oge ahụ, na náánị oge ahụ, ka anyị ga-enwe olileanya ịnata site n’Eluigwe ozi nke bụ uche Chineke nye anyị.

Zakaraias na nwunye ya bụ Elizabet bụ ndị Mmụọ Nsọ nwere ike ikwu eziihe banyere ha. “Ha abua bu ndi ezi omume n’iru Chineke, nāga n’ihe nile Onye-nwe-ayi nyere n’iwu na n’ihe nile Ọ guru n’ihe ziri ezi nādigh ita uta.” Lee ụdị okwu ekwuru banyere mmadụ abụọ n’etiti ụmụmmadụ!

Eziomume n’iru Chineke! Ọtụtụ ka eleworo anya na ha bụ ndị eziomume n’iru mmadụ, dịka ọtụtụ nke mmadụ si dị. Ma mmadụ abụọ ndịa bụ ndi eziomume n’iru Chineke, “n’eje ijè n’ihe nile Onye-nwe-ayi nyere n’iwu na n’ihe nile Ọ guru n’ihe ziri ezi nādigh ita uta.” Ọtụtụ esonyewo n’ememe na ụdị nke ikpere Chineke, na-ejezu n’ụzọ nile nke ihe edere n’iwu, ma ha kana-enwekwarị mmehie dị icheiche nke zoro-ezo nime obi na akọ-na-uche ha nke ná-apụtaghị ìhè. Ma mmadụ abụọ ndịa arọpụtara enweghị ịta ụta ná ijé ijè niile. Ha enweghị ịta ụta ọ bụghị náánị n’iru mmadụ kama ha enweghị ịta ụta n’iru Chineke!

Ka ndị ahụ na-asị na ndị ji obi ha niile chọsie Chineke ike n’Agba Ochie natara eziomume Chineke n’ụdị dị ala, nwaa n’ike onwe ha, ihe ndịorù Chineke abụọ ndịa mere n’iji rue eziomume na nsọpụrụ Chineke! Azọpụtara Zakaraias na Elizabet site ná mmehie ha; ma doo kwa ha nsọ!

Ọ bụ ndị náasọpụrụ Chineke ka Chineke na-ezigara ozi Ya. Aga-enweworị ọtụtụ ndị eziomume nke Chineke n’oge a ndị na-eche kwa ọbịbịa nke Mesaia ahụ. Ma mmadụ abụọ ndịa bụ ndị Chineke rọpụtara iji mezue Àtụmààtụ Ya. Zakaraias bụ onye ná-aña ntị nkeọma, ọ bụ ezie na ijuanya nke ozi ahụ dị ukwuu na-etinye mgbagwojuanya nime obi ya. Mgbagwojuanya niile nke dị n’obi Zakaraias abụghị ụdị maọbụ nke ná-egbochi aka Chineke site n’ime ihe ahụ Ọ na-ezube. Ọ dị nime obi ndị nsọ abụọ ndịa nke Chineke, tụkwasị n’eziomume na ịtụ egwù Chineke nke anyị kwuworo ihe banyere ya, ọtụtụ nke okwukwe zuruòkè nime Chineke na n’Okwu Ya nke mere ka Okwu ahụ nwee ike, ná-alụsi kwa ọlụ ike nime ha.

Dịka omen’ala si dị, onye eze ọ bụla nwere onye ná-aga n’iru ya, idozi ụzọ tupu ọ bịarue. Chineke rọọrọ idozi ụzọ ahụ tupu ọbịbịa nke Ọkpara Ya site n’izite otù onyensọ izi ndị Ya arọpụtara Oziọma nke alaeze Chineke. Anyị ahụwo na ihe dị ka narị arọ anọ (400) agafesiwo site na mgbe onyeamụma ikpeazụ welisiri olu ya ikwusa ozi nke Chineke; ma, ọ dị kwa mkpà ịmata, na onyeamụma ahụ bụ onye nyere anyị ihe onyinyo pụtara ìhè nkeọma banyere ọbịbịa nke onyeamụma ọzọ ahụ -- onye ahụ na-aga n’iru Jisọs Kraist. (Gụọ Malakai 4:4-6; Luk 1:16, 17; na Matiu 11:7-15).

Òlee otú aga-esiworị kọwaa nkeọma ọbịbịa nke onye a nke ná-aga n’iru? Ọ bụ site ná mkwupụta nke mmụọozi. Ònye ka apụrụ itinye ozi a dị mkpà n’aka ya bụ nke si n’Ocheeze Chineke? Onyeisimmụọozi bụ Gebriel, onye ná-eguzo n’iru Chineke. E nyefere n’aka ya ọlụ na ijéozi nke iwere ozi a na ozi ndị ọzọ banyere Kraist ahụ nke dị Ebube. Anyị ahụwo ntozu nke ndị ahụ ọ bịakutere -- ndị ahụ atụkwasịrị obi ndị arọpụtara ịnara na imezu akụkụ a nke nzube Chineke nye mmadụ nke daraàdà. Anyị ahụwo kwa site n’Akwụkwọnsọ ụzọ dị ebube eji mee ka ọchịchọ ahụ mezue, n’ewepụghị ihe ọ bụla, n’ụbọchị niile nke ndụ onye ahụ na-aga n’iru.

Njèm Nleta nke Gebriel nye Meri

Otù onyeisi mmụọozi ahụ pụtara ìhè ọzọ iweta ozi ahụ dịkasịrị mkpà nye otù nwanyị dị nsọ, onye edoro nsọ nke dị kwa obi umeala, onye Galili. Ọ bụ kwa nwaagbọghọ ná-amaghịnwoke onye ekwenyere na otù nwoke ana-akpọ Josef ga-alụ. Ozi ahụ nke sitere n’ebe Chineke nọ gwara ya na ọ bụ onye emekarịịrị amara na Chineke nọnyekwaara ya. Ọ jụrụ otú ihe ndịa agwara ya ga-eji mezue -- ọ bụghị n’obi-abụọ, kama náánị ka o wee mara uche Chineke n’ebe ya onwe-ya nọ na ihe o kwesịrị ime iji mezue uche Chineke ahụ. Agwakwara ya na Mmụọ Nsọ ga-eme ihe ahụ ana-apụghị ime ka ọ bụrụ ihe apụrụ ime, na ọ ga-eme kwa ka emezue uche nke Chineke.

N’ebe a kwa ka otù ihemmụta dịrịị anyị. Anyị matara na Chineke na-enye ike iji mezue ihe O nyere n’iwu. Mgbe Chineke na-atụzi aka, Ọ na-akwà ụzọ. Ọ bụghị ihe dịrị anyị ịjụ ajụjụ megide uche Ya maọbụ inweobiabụọ megide nrọpụta Ya nye anyị mgbe anyị na-erubeisi nye ọchịchọ Ya n’ebe anyị nọ. Anyị nwere ike ịjụ, dịka Meri mere, usoro maọbụ oge, maọbụ ebe ahụ Chineke na-arọpụta. Ma anyị agaghị enwe obiabụọ maọbụ gbaa agụgọ. Ọ bụrụ na anyị erubeisi, ngọzi dịrị anyị. Ọ bụrụ na anyị enupuisi, nsogbu dị.

Njèm Nleta nke Mmụọozi ahụ nye Josef

Josef otù aka ahụ chọrọ ka edoo ya anya nkeọma. Chineke adịghị arapụ otù nime ndị nke Ya ná-enyeghi Ya nkasịobi ahụ maọbụ owuweanya ahụ nke ọ na-achọ. Ọ na-anọ nso mgbe dum inye aka, ịgba-ume na ịtụzi aka n’ụzọ ahụ mgbe anyị ná-enweghi ike ịma ụzọ nke anyị ga-eso.

Anyị amaghị aha mmụọozi ahụ nke bịakutere Josef. Ọ dịghị mkpà na anyị ga-ama ya, maọbụghị otú a Mmụọ Nsọ gara agwaworị anyị. Ihe dị mkpà ka anyị mara bụ na Chineke zigara ozi ahụ nke dị Josef mkpà, Ọ ga-emekwara anyị otú ahụ mgbe ihe siri ike na-abịakute anyị, anyị ewee chọọ ndụmọdụ na enyemaka. Chineke pụrụ ime nke a n’ụzọ ọ bụla Ọ chọrọ, ma n’oge nke Oziọma a O mewo ka Okwu Ya bụrụ ụzọ kachasị ukwuu iji mee ka anyị mara uche Ya na iwu Ya nye anyị. Na Baịbụl Nsọ ahụ anyị na-achọta kwa agbamume na mkpali nke mmụọ nke dị anyị mkpà maka imezu iwu ndị ahụ niile. Lee otú Chineke anyị si bụrụ Onye amara na Onye ebere!

Mmụọozi ahụ tụrụ aka nye nwoke onye eziomume ahụ bụ Josef, n’Okwu Chineke iji mesie ozi ahụ ike bụ nke ọ natara site n’aka Chineke. N’okwu niile nke ndịamụma banyere Jisọs ka achọpụtara n’ụzọ doro anya eziokwu niile nke ná-agbagwoju Josef anya. N’ebe a kwa, anyị nwere ihemmụta. “Ayi diri iwu, di-kwa-ra ihe-àmà,” kwesịrị ịbụ ihe anyị kweere n’oge niile. Ọ bụrụ na anyị anata ihe anyị chere na ọ bụ ozi maọbụ iwu site na Chineke, anyị aghaghị ijé n’Okwu Chineke ịhụ ma ozi ahụ maọbụ iwu ahụ na Okwu Chineke dakọtara nkeọma. Ọ bụ náánị n’ụzọ dị otú a ka anyị ga-amara nkeọma na anyị na-anụ olu Chineke, n’ihi na Chineke apụghị imegide Okwu Ya.

Ọbịbịa nke Ọkpara Chineke ahụ

Otú a anyị nwere nchịkọta nke mpụtaìhè niile nke ndị mmụọozi ahụ tupu ọmụmụ nke Kraist, esikwa nime ha wepụta ihe ụfọdụ nke apụrụ itinye n’ọlụ. Nke a bụ oge dị mkpà n’akụkọ nke ndị Israel. Ọ bụ kwa oge dị mkpà n’akụkọ nke ụwa niile. Ọkpara Chineke ga-aghọ kwa Nwa Devid. Aga-amụ Ya ka O wee hụa ahụhụ ma nwụọ kwa n’ihi anyị, ka e wee gbapụta anyị site ná mmehie niile nke anyị. Ọbịbịa Ya abụghị ihe mberede maọbụ ihe ná-eme kwa-ụbọchi nime akụkọ nke ụwa nke a. Ọ bụrịị ihe kachasị mkpà nke meworo, n’ihi na ewezuga ọmụmụ Ya agaghị enweworị ọnwụ nke ịrara onwe ya nye dịka àjà. E wezuga ọnwụ Ya mbiliten’ọnwụ agaghị adị. E wezuga mbiliten’ọnwụ Ya okwukwe anyị gara-abụ ihe-efu ma anyị gararị anọgide ná mmehie niile nke anyị.

Ma ekele dịrị Chineke n’ihi ọmụmụ nke Kraist, nke mere ka ha dị irè bụ ọnwụ na mbiliten’ọnwụ Ya iji gụọ anyị ná ndị eziomume! Ekele dịkwara Chineke na O nyewo anyị àmà zuruòkè banyere eziokwu nke ihe ndịa niile, ebe ekwuworo ihe banyere ha site ná ndị amụma site ná mkpali nke Mmụọ Nsọ, na ebe emere ka ha dị irè site n’ijé ozi nke ụmụnwoke na ụmụnwanyị ndị edoro nsọ dịka Zakaraias, Elizabet, na Meri. Ekele dịrị Chineke na O kwupụtara ma mee kwa ka o guzosie ike bụ ememe ukwuu ndịa site ná mpụtaìhè niile n’ụzọ dị ebube nke ndịisi mmụọozi kachasị n’Eluigwe, nke mpụtaìhè niile ha bụ eziokwu nke emere ka ọ bụrụ ezi akụkọ ụwa nke guzosiri ike. Ekele dịrị Chineke na O mezuru amụma ndịa -- nke ndị mmụọozi na nke ndịamụma -- rue na òzùzùòkè ya niile, n’ụzọ dị otú a ná-agbá àmà nye eziokwu niile na izuòkè niile nke àtụmààtụ Ya nye anyị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ nzube nke Oziọma Luk, dịka onye dere ya kwuru n’isi mmalite nke amaokwu ya niile?
  2. Gịnị ka ị pụrụ icheta na Akwụkwọnsọ kwuru banyere ntozu nke imemmụọ nke Zakaraias na Elizabet?
  3. Òlee ebe ka Zakaraias nọ mgbe mmụọozi ahụ bịakutere ya?
  4. Gụkọọ oge niile mgbe agwara anyị na Gebriel pụtaraìhè nye ndị nwoke na ndị nwanyị.
  5. Gịnị bụ ozi ahụ nke mmụọozi ahụ ziri Zakaraias? Òlee kwa otú o si nara ya?
  6. Gịnị bụ ozi Gebriel ziri Meri?
  7. Gịnị bụ ozi ahụ nke Josef natara?
  8. Kọwaa ụfọdụ ihe itinye n’ọlụ ị nataworo site n’iheọmụmụ a.
  9. Meri, o nwere obiabụọ n’okwu nke mmụọozi ahụ?
  10. Gụọ Luk 1:27 na okwu ndị ọzọ yiri nke a apụrụ ịchọta nime Akwụkwọnsọ.