Abù Ọma 37:1-40

Lesson 261 - Senior

Memory Verse
Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi: n’ihi na ọdị-n’iru dịrị onye-udo” (Abù Ọma 37:37).
Cross References

I Ihe dị iche nime Ọdịdị niile Nke Ndị náasọpụrụ Chineke na nke Ndị náadịghị asọpụrụ Chineke

1. Onye eziomume ekwesịghị inwe mwuta banyere ọgan’iru nke ndị ajọomume, Abù Ọma 37:1, 2, 7-10, 20, 27, 28, 35, 36, 38; Ilu 23:17

2. Ana-adụ ndị eziomume ọdụ ka ha kpọre ụzọ ha rue Jehova arụ, Abù Ọma 37:3, 4, 5, 23, 24, 27, 34; I Samuel 2:9; Aisaia 58:14

3. Ndị dị umeala n’obi ga-eketa ụwa, Abù Ọma 37:11, 18, 22, 29, 34

4. Jehova ga-achị ndị ajọomume ọchị n’ihi na Ọ na-ahụ na ikpé na-abịa, Abù Ọma 37:17, 32, 33; 2:4; Job 38:15

5. Ndị eziomume nwere ike nwee ihe dị ntà, ma afọ ga-eju ha n’ụbọchị ụnwụ, Abù Ọma 37:16, 19, 21, 25, 26; Job 5:20; Ilu 15:16; Deuteronomi 15:8

6. Nzọụkwụ niile nke ndị eziomume agaghị agbụchapụ, Abù Ọma 37:30, 31; Deuteronomi 6:6

7. Onyeajọomume na-awasa onwe-ya o wee gabiga ma apụghị ịchọta ya, Abù Ọma 37:35, 36; Job 5:3

8. Ikpeazụ nke onye zuruókè na nwoke nke ziriezi bụ otù, Abù Ọma 37:37-40; I Ihe Emere 5:20; Aisaia 32:17.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Nke a bụ nnọọ Abù Ọma pụrụiche. Ọ bụ Abù Ọma nke ikwesị ntụkwasịobi. Ọ na-adụ ndị eziomume ọdụ inwe okwukwe na ntụkwasịobi n’ebe Chineke nọ. Ọ bụ ezigbo ịgbaume nye ka ha ra bụ ndị eziomume ma ọ bụ kwa ịdọakanántị siri ike nye ndị ajọomume. Ọ bụrụwo ebe nkasiobi si abịara igwè mmadụ ndị anaapụghị ịgụta ọnụ ndị jesoworo Chineke na ndị kpebiworo obi ha n’ezie ibu ahụhụ nke Obe ahụ. Ọ bara urù n’ụzọ pụrụ iche n’ihi na ọ na-atụle ọnọdụ nke ndị náasọpụrụ Chineke n’oge dị ugbu a na nke ndị ná-emebiiwu, dịka ọ na-atụle kwa ụgwọọlụ ebighịebi ha maọbụ ikpé.

N’oge dị ugbu a nke anyị na-ebi nime ya, ọ dị mfé ọbụná ndị eziomume inwe nchégbu na ịtụ egwù ma ha rapụrụ onwe ha ilegide ọnọdụ dị icheiche nke oge a anya site na náánị nghọta nke mmadụ. Anyị kwesịrị ilegide ọnọdụ ndị a anya site n’anya okwukwe na inwe ntụkwasịobi zuruókè n’ebe Chineke nọ na n’ike Ya zuruókè na nchebe Ya. Ọ bụrụ na anyị onwe-anyị e nwee mmasị n’ezie na Jehova anyị ga-ewere ihe ọ bụla O ziteere anyị site n’aka Ya. Ọ bụrụ na ọ bụ nsogbu, anyị pụrụ ikele kwa Ya n’ihi nke ahụ, ná-aghọta na ọ bụ maka ọdịmma nke anyị, ma nyefee onwe-anyị n’ezi nyocha ịhụta ma ọ dị ụzọ anyị siworo n’uche Ya pụọ.

Nchébe Anyị site na Chineke

Izuike nime Onyenwe anyị bụ ibi n’ebe nzuzo nke Onye Kachasị ihe niile elu (Abù Ọma 91:1, 2). Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Niile nime Ụlọukwuu Chineke ka eji igweojii nke ebube Chineke kpuchie; ma onye ọ bụla nke bara na gburugburu ebe nsọ ahụ ndị ahụ na-enwe nchebe nke Chineke. Náánị onyeisi nchụàjà ka ana-arapụ ịbà nime Ebe Nsọ ahụ Kachasị Ebe Nsọ niile n’ụbọchị ndị ahụ, ma n’ọgbọ a nke Ndị Kraist ndị niile kwereekwe pụrụ ịba nime ebe ahụ kachasị ịdị nsọ site n’Ọbara Jisọs. N’ihi nke a, anyị nwere ezi nchebe mgbe efesara Ọbara ahụ nime obi anyị dum asawo kwa anyị site n’Ọbara ahụ pụa ná mmehie dum. Ndị esiworo n’ụzọ dị otú a kpuchie site n’Ọbara ahụ nwere óké nnapụta ahụ zuruókè.

Ụbọchị Ikpeazụ ndịa

Abù Ọma a dabara nkeọma n’onyinyo nke ụbọchị ikpeazụ ndịa. Ebe a ka akọwara ihe banyere ndị ajọomume dịka ha na-ezube imegide ndi eziomume wee na-azọda ụmụ ogbenye na ndị nọ ná mkpà, wee ná-emegide ndị okwu okwu ziriezi ọnụ. Ebe a bụ ezi onyinyo nke ike ọjọọ dị icheiche nke ná-alụ ọlụ n’ụwa taa -- mmụọ nke onye ná-emegide Kraist dị nime ndị náadịghị asọpụrụ Chineke. Ma oge ha dị mkpụmkpụ. Onyenwe anyị ga-achị ha ọchị, n’ihi na Ọ na-ahụ na ụbọchị ikpé ha na-abịa. Chineke ekwuwo: “Ahuhu gādiri uwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakuruwo unu, nēnwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere naní nwa oge” (Nkpughe 12:12). Ma n’Okwu Ya Chineke ekwuwo kwa: “Ma ọ fọduru nwa mgbe, onye nēmebi iwu agagh-adi kwa: i gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gagh anọ.”

Ebe ọgụgụ niile a nke Akwụkwọnsọ na-egosị anyị na onyeiro ahụ nke mkpụrụobi mmadụ ga-achọ ịnapụ ndi eziomume ọnọdụ. Ọ bụ ya bụ ebumn’obi nke mmụọ ahụ nke ekweghị na Chineke nke ná-emegide ike nke onyeKraist nke ná-anwa kwa ka ya chịaachịa n’ụbọchị taa. Ha ga-achọ iwepụ onyeKraist ọ bụla n’eluụwa na ihichapụ aha nke Chineke n’obi ụmụmmadụ.

Akụkọ nke ụwa nke a dị n’oge ọjọọ ya ugbu a. Ọ bụrụ na arapụrụ mmadụ nime ntụpụta niile nke uche ya mmadụ niile ga-alapụworị n’iyi n’oge ná-adịghị anya. Ike niile nke ihe ọjọọ ga-ewere ọnọdụ dum ma ha nwee ike. Ma ọ dị ike mgbochi dị n’ụwa. Ọ bụ Mmụọ nke Chineke Onye na-alụ ọlụ n’onwe-Ya na kwa site na Nwanyị ahụ Ana-alụ Ohụụ nke Kraist. Ekele dịrị Chineke n’ihi ndị zuruòkè olenaole ndị ná-emegide ike niile na ịchịisi niile nke ihe ọjọọ! Aga-edebe ha site n’Ike dị ike karịa onyeiro nke mkpụrụobi nke ụmụmmadụ. “JEHOVA nāhu ezi ikpe n’anya, Ọ dịgh-arapu kwa ndi-ebere-Ya; rue mgbe ebigh-ebi ka anēdebe ha: Ma agēbipu nkpuru nke ndi nēmebi iwu.”

Nganga na Mpako nke Ndị ná-emebiiwu

N’oge nke anyị, anyị ahụwo ka ndị ná-emebi iwu rigoro n’ọnọdụ wee gbasaa onwe-ha ná mpako na nganga, ná-ekwu okwu ná-akwagide kwa ihe ọjọọ dị icheiche na ajọomume niile. Anyị ahụwo kwa ka ebipụrụ ha dịka ahịhịa, ma hụ kwa ka ha chanwụrụ dị ka akwụkwọ ndụ. Ha ezubewo imegide ndị ziriezi wee taa kwa ikekereeze megide ndị eziomume, ma mmaagha nke ha onwe-ha abawo nime obi ha. Ụfọdụ nime ha anwụwo site n’aka ha onwe-ha, ná nupụisi na ikwesioluike, ná-asụnye mkpụrụobi ha n’ebighịebi iché Chineke nke eziomume na Onye pụrụ ime ihe niile iru.

Nime nganga na mpako ya, eji Nebukadneza tụnyere otù osisi nke ịdịelu ya ruru Eluigwe nke apụrụ ịhụanya site ná nsọtụ niile nke ụwa. Adọrọ ya akanántị nime nrọ, banyere ikpé Chineke nke gaje ịbịa, mgbe ọ nụrụ ka otù onyenche si n’Eluigwe tie mkpu: “Gbutuenu osisi ahu, gbukapusia alaka-ya nile, rurupu akwukwọ-ya nile, kpasa nkpuru ya” (Daniel 4:14). Onye nke Chineke ahụ bụ Daniel, dụrụ Nebukadneza ọdụ: “Were kwa ezi omume tijipu nmehie-gi nile, were kwa imere ndi ewedara n’ala amara tijipu ajọ omume-gi nile” (Daniel 4:27). Ma o geghị ndụmọdụ ahụ ntị. N’otù mgbe ahụ Nebukadneza nọ ná-afụli onwe-ya elu n’ịdịelu nke ịbụeze na ike ya, otù olu si n’Eluigwe daa, “ala-eze apuwo n’aka-gi.” Nganga nke Babilon wee chanwụọ “dika ahihia ndu ahu.”

Belshaza matara ihe banyere ikpé nke Chineke megide nnaochie ya, bụ Nebukadneza, ma ya onwe-ya rapụrụ ịnara ịdọakanántị. N’otù abalị mgbe Belshaza nọ ná-añụrị ọñụ nime mmehie, otù aka dere ihe n’elumgbidi nke ụlọ oririnaọñụñụ ahụ, “Chineke agutawo ala-eze-gi ọnu, me ka mgbe ya ruzue.” “N’abali ahu ka egburu Belshaza, bụ eze Kaldea” (Daniel 5:26, 30). Nke a bụ ihe ịmaatụ ọzọ nke eziokwu nke Okwu Chineke megide ndị ajọomume: “Agēgbutu ha n’oge nādigh anya.”

Ikpé

“Aghagh ime ka ayi nile puta ìhè n’iru oche-ikpé Kraist; ka ayi n’otù n’otù we naghachi ihe esitere n’aru me, dika ihe onye ọ bula mere si di, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādigh nma” (2 Ndi Kọrint 5:10). Onye ajọomume nwere ike baa ụba náánị nwaoge n’eluụwa nke a, ma òlee maka ụbọchị ahụ nke ọ na-aghaghị iguzo n’iru Onyeikpé ahụ nke ná-anọkwasị n’Ocheeze? Gịnị ka ọ ga-abụ mgbe Onyeikpé nke eziomume ahụ ga-eleba anya nime obi nke mmadụ wee hụ mmehie? Apụrụ izobe ọtụtụ mmehie ugbu a; ma òlee ezi ihe nke a pụrụ iweta n’ụbọchị ahụ “ndi nēmebi iwu gālaghachi n’ala mọ” (Abù Ọma 9:17). “emela ka iwe-gi di ọku n’ihi ndi nēme ihe ọjọ”; n’ihi na ikpé ha na-abịa ma “anwuru ọku nke nmekpa-aru-ha nārigo rue mgbe nile ebigh-ebi; ha adigh ezu kwa ike ehihie na abali” (Nkpughe 14:11). Ọtụtụ mmadụ n’ụbọchị taa ndị na-eleda ebere nke Chineke anya ga-ebili n’otù ụbọchị n’ọdịn’iru ná mgbágwojuanya ịhụta na amawo ha ikpe ịnọ ebighịebi “nime ọdọ ahụ nke ji ọkụ na brimstone nēre; nke bụ ọnwụ nke-abua ahu” (Nkpughe 21:8). Lee ka o si dị egwù bụ ụgwọọlụ nke ịnọgide nime mmehie ná-eweta ebe Chineke na-enye ndị ahụ bụ ndị ná-aga ijè n’ụzọ Ya niile mgbaghara na ndụ ebighịebi!

Uche nke Chineke

Ana-agwasi anyị ike ichere Onyenwe anyị na ịnọgide n’ụzọ Ya. Ụfọdụ mmadụ na-echere Onyenwe anyị ma na-ejé kwa n’ụzọ nke aka ha. Akwụkwọnsọ na-enye anyị iwu ịnọgide n’ụzọ nke Chineke mgbe dum na ibi kwa ná mmụọ nke nrubeisi.

Otù nwa akwụkwọ onye Hibru gwara anyị na ichere, n’ezigbo asụsụ ndị Hibru bụ iseti ahịrị kwụrụọtọ site n’otù ebe rue n’ebe nke ọzọ. Ọ kọwaziri iheịmaàtụ nke okwu ya site n’ikwu na ebe mbụ bụ nime obi mmadụ; ahịrị nke guzoro ọtọ bụ ọchịchọ nke mmadụ ma ebe mkwụsị bụ Chineke. Anyị maara nkeọma na otù ahịrị sitere n’obi nke ná-atụ kwa Chineke aka, na ezimmasị sitere n’alaala obi ime uche niile nke Chineke nye Ya, ga-edebe onyensọ ahụ ka otù nime nzọụkwụ ya niile ghara ịgbụchapụ.

Ịdịnwayọ n’obi, otù Ụdị nke Onye ná-asọpụrụ Chineke

N’Okwu Chineke ahụ n’elu Ugwu, Jisọs na-agwa anyị na ndị dị nwayọ n’obi ga-eketa ụwa. Ọtụtụ ugbò nime Abù Ọma nke a ka agwara anyị otù ihe ahụ. Mmụọ nke ịdịnwayọ n’obi abụghị mmụọ nke ụwa. Ịdịnwayọ n’obi na-emegide usoro na omume dị icheiche nke ndị ná-adịghị asọpụrụ Chineke n’ụwa nke a na-agbaso. Ọ na-emegide mmụọ nke ekwensu. Ịdịnwayọ n’obi sitere na Chineke, ike na ume na mmetuta dị ukwuu dị kwa nime ya.

Moses bụ nwoke dị umeala n’obi nke ukwuu ma ọ bụ kwa onyendú nke dị ike ma ná-emeri kwa emeri, onye Israel niile ná-asọpụrụ. Devid nwere ezi mmụọ nke obi dị umeala ma ọ bụ kwa eze ukwuu nke Israel na onyendú, onye ọtụtụ puku mmadụ na-ele anya ná-asọpụrụ kwa. Elaija nwere obi dị umeala nke ná-adịghị anatara onwe-ya otù ohere iji rita ụwa n’urù maọbụ ime ka ya bụrụ onye amaara aha ya; ma o nwere ike site na Mmụọ nke Chineke, ịkpọrọ otù mba zuruòkè nye Chineke n’otù oge wee mee kwa òtù ndịagha na mmadụ ndị ná-abụghị ndịagha ịrapụ àtụmààtụ ha niile banyere imekpà ndị nke Chineke arụ. “Ndi di ume-ala n’obi gēnweta ala; iba-uba nke udo gātọ kwa utọ.”

Akọwakwara ihe ndị ọzọ dị mkpà. Anyị ga-ewezuga onwe-anyị n’ihe ọjọọ wee mee kwa ezi ihe. Ọ bụghị náánị na anyị ga-arapụ ihe ọjọọ, kama anyị ga ná-elezianya inyere mkpụrụobi ọzọ aka ịchọta ụzọ nke eziomume ahụ. Nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ime ezi ihe. Náánị ịzụ ndị ogbenye nri maọbụ inyere ndị nọ ná mkpá aka, ná-arapụ ha mgbe dum nime enweghị inyeaka nke ihe nke imemmụọ abụghị ime ihe ahụ nke ziriezi. Eziomume na-apụta site n’ezi obi.

Nlekọta n’oge Ụnwụ

Nnwapụta nke Devid etinyewo okwukwe n’obi ya na Chineke ga-elekọta ndịnsọ Ya niile n’oge óké ụnwụ. Devid emewo agadị mgbe o dere Abụ Ọma a. N’oge okorọbịa ya niile ọ gafewo ọtụtụ mkpagbu na mkpà dị icheiche. O jégharịwo n’elu ugwu nke jupụtara n’ihe egwù ya na ụmụ anụmanụ dị icheiche na ewu ọhịa dị icheiche, ma eleghịanya ọ dịwo ọtụtụ ugbò ọ nọ n’ụkọ nri. Ma dịka Devid leghachiri anya n’azụ n’ụbọchị ndị ahụ niile, ọ pụrụ ikwu, “Ihe ntà onye ezi-omume nwere di nma kari ihe bara ụba nke ọtutu ndi nēmebi iwu.”

Ngafe nke ụdị iheisiike ndịa na mmalite nke ndụ ya mere ka Devid bụrụ ezi onyeagha nke eziomume na kwa ọchịagha nye Israel. O kwenyere na ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla atụkwasị Chineke obi wee mee ezi ihe Onyenwe anyị ga-arọpụtara ya. Okwukwe na ntụkwasịobi ya siriike na ọ pụrụ inwe mkwuwaokwu dị otú a: “Nwata ka mbuworo aghọwokwam okenye; Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya, Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri.” Nke a bụ ụkpụrụ na mkwà ebighịebi. Chineke n’oge dum -- na n’ụzọ niile -- na-arọpụtara ndị nke Ya dịka Ọ na-ahụ na ọ kachasị mma nye ha.

Iwu Dị icheiche maka Ibiobi

Devid malitere Abù Ọma a site n’inye iwu mgbochi: “Emela ka iwe-gi di ọku n’ihi ndi nēme ihe ọjọ.” Ọgan’iru nke ndị ná-emebiiwu na-adị nwaoge ma aga-ebipụ ha n’oge ná-adịghị anya. Ọ kọwara: “Ọ fọduru nwa mgbe, onye nēmebi iwu agagh-adị kwa: I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gagh-anọ.”

Ana-enye anyị iwu dị icheiche nke ndụ na ntụziaka iji gbochie nchekasị nke ná-eweta mmekpaarụ na ibuarọ nke ná-ezighezi. Ana-agwa anyị ka anyị “tukwasi JEHOVA obi”, nke pụtara na anyị agaghị adabere n’inyeaka nke mmadụ. O dekwara: “ka ihe JEHOVA tọkwa gi utọ:” Nke a pụtara na ụzọ niile nke Chineke ga-adị anyị mma. Ọzọ, adụrụ anyị ọdụ, “kpọre uzọ-gi rue JEHOVA aru.” Otú a ka esi kọwaa ya nkeọma na anyị aghaghị ikwe ka Onyenwe anyị lụpụta uche na ụzọ Ya ná ndụ anyị. N’ikpeazụ, anyị ga-abụ ndị, “Nọ du n’iru JEHOVA” were kwa ntachịobi chere Ya. Àtụmààtụ nke Chineke enweghị mgbagha! Uche nke Chineke zuruòkè! Oge nke Chineke ka mma!

Ọ dị ihe dị iche pụtara ìhè nke dị n’etiti ihenketa nke otuto nke onye eziomume na ikpeazụ jọgburu onwe-ya nke onye náemebiiwu. Nwoke ahụ dị mma, onye zuruòkè, onye eziomume ga-enwe Onyenwe anyị dịka ike ya n’oge nsogbu; ma ndị náemebiiwu ka aga-ebibi, n’ikpeazụ kwa aga-ebipụ ndị náemebiiwu.

“Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi: N’ihi na ọdi-n’iru diri onye-udo.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ụdị mmadụ abụọ ana-atụle n’Abụ Ọma a?
  2. Òlee ihe mere na anyị agaghị eme ka iwe anyị dị ọkụ n’ihi ndị ná-eme ihe ọjọọ?
  3. Kọwaa ikpeazụ nke ndị eziomume.
  4. Kọwaa ikpeazụ nke ndị náemebiiwu.
  5. Gịnị ka ekwuru banyere ndị dị umeala n’obi?
  6. Ọ bụ n’ọnọdụ dị añaa ka ekwere anyị mkwà ịzụ anyị nrị?
  7. Gịnị ka Devid kwuru na ya ahụbeghị?