Matiu 26:1-5, 14-16; Luk 22:3-6; Jọn 12:4-6; 17:12

Lesson 249 - Junior

Memory Verse
“Ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n’aka-ya rara Nwa nke madu nye” (Mak 14:21).
Notes

Onyeozi

Otù onye nime ndị arọpụtara ka ha bụrụ ndị náesoụzọ Jisọs bụ nwoke ana-akpọ aha-ya Judas Iskariot. Anyị amaghị ihe ọ bụla banyere ndụ-ya tupu ọ bụrụ onye naesoụzọ Jisọs. Aha nna Judas bụ Saimọn (Jọn 6:71). Mgbe Jisọs kpọrọ ụmụ mmadụ iso Ya, Ọ jụghị ajụjụ ma ndị mụrụ ha ha bụ ndị ná-asọpụrụ Chineke maọbụ na enyere ha ọzụzụ banyere ifè Chineke òfùfè.

N’oge a, òkù nke Oziọma bụ otù ihe ahụ, ọ na-erutekwara onye ọ bụla. Ọ dịghị mkpà na aga-enwe èzínaụlọ na-ekpe ekpere maọbụ nke maara ihe edere na Baịbụl tupu anata ọkpụkpọòkù nke Chineke. Onyenwe anyị na-akpọ ndị ahụ na-amaghị ihe ọ bụla banyere Baịbụl na ekpere na ndị amụrụ n’èzínaụlọ NdịKraist n’otù aka ahụ. “Onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n’efu” (Nkpughe 22:17). “Le, anameguzo n’ọnu-uzọ, nāku kwa aka: ọ buru na onye ọ bula anu olum, meghe kwa uzọ, M’gābakute ya” (Nkpughe 3:20).

Edepụtaghị ụzọ Judas si nata ọkpụkpọòkù nke Kraist nime Baịbụl. Ọ dịghị ihe ọ bụla aga-eji kwenye na ihe dị iche dị n’ọkpụkpọòkù akpọrọ Judas na nke akpọrọ ndị ọzọ naesoụzọ Jisọs. Judas bụ otù nime mmadụ irinaabụọ arọpụtara ka ha bụrụ Ndịozi. Jisọs kpọpụtara ha ichè site n’ebe ndị ọzọ naesoụzọ Ya nọ “ha we jekuru Ya” (Mak 3:13). Judas zara òkù ahụ akpọrọ, ewee doo ya na mmadụ irinaotù ndị ọzọ nsọ ịnọnyere Jisọs na ịpụ wee kwusaa Oziọma.

Jisọs gwara ndị naesoụzọ Ya sị: “Madu nile gākpọ kwa unu asì n’ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa” (Matiu 10:22). Judas nụrụ mgbe Jisọs na-agwa ndị naesoụzọ Ya ihe Ọ chọrọ n’aka ha: “Onye ọ bula nke nēbugh obe nke aka ya, sokwam n’azu, ọ pugh ibu onye nēso uzọm” (Luk 14:27). Judas nọ n’ọnụọgụgụ Ndịozi ahụ jere kwusaa “ka madu chègharia.” Judas bụ otù nime Ndịozi irinaabụọ ahụ onye “nāchupu ọtutu mọ-ọjọ, were kwa manụ olive tee ọtutu ndi-nriaria, we me ka aru di ha ike” (Mak 6:12, 13).

Onye ahụ náejide akpà

Oge ụfọdụ dị mgbe Jisọs zipụrụ ndị na-esoụzọ Ya ka ha zụta iheoriri, dịka oge ahụ Jisọs na-agwa nwanyị ahụ okwu n’akụkụ òlùlùmmiri dị na Sameria (Jọn 4:8). Judas ka enyefere akpaego Ndịozi ahụ n’aka ijide (Jọn 13:29). Ọnọdụ ya bụ nke anyị na-akpọ onye nlekọta ego. Ọ bụ ọlụ Judas ijide akpaego, ọ bụ kwa ya náejide ego Ndịozi nwere.

Judas anụworị ịdọakanántị niile nke Jisọs dọrọ ha. Mgbe Ndịozi irinaabụọ ahụ gwara Jisọs ka Ọ kọwaara ha ilu nke ọghamkpụrụ abụọ, agwara ha na “nchegbu nke oge a na aghughọ nke àkù nākpagbu okwu ahu” wee mee ka mmadụ ghara ịmị mkpụrụ (Matiu 13:22). Jisọs gwara ha banyere ọgaranya ahụ na-enweghị uche onye achọrọ mkpụrụobi ya n’aka-ya tupu o nwee oge izuike, irí iheoriri, ịñụ iheọñụñụ na ime ka obi tọọ ya ụtọ. Jisọs sịrị “Otú a ka ọ dị, bú onye nākpadoro onwe-ya àkù, ma ọ bugh ọgaranya n’ebe Chineke nọ” (Luk 12:21).

Judas elezighị anya banyere ịdọakanántị niile ọ nụworo. O wee bụrụ onye hụrụ náánị onwe-ya n’anya, wee ghara ikwenye mgbe Meri weere mmanụotite ezi nard ọtụtụ ya ruru otù pound tee Jisọs. Judas sirị: “N’ihi gini ka anēregh manu-otite a ọgụ shilling iri na ise, were ya nye ndi-ogbeye?” (Jọn 12:4, 5). Jisọs zara sị: “Rapunu ya; gini mere unu nēsogbu ya? ọ luru ọlu ọma n’arum. N’ihi na unu nwere ndi-ogbeye n’etiti unu mgbe nile, mgbe ọ bula unu chọrọ unu puru ime kwa ha ihe ọma: Ma unu enwegh Mu onwem mgbe nile. Ọ mere ihe ọ nwere ike ime” (Mak 14:6-8).

Site n’obi nwere anyaukwu, Judas jiri aghụghọ na iruabụọ wee kwue okwu. Ọ tụgharịrị uche na mmanụ ahụ bụ ihe alara n’iyì n’ebe Jisọs nọ, na ọ garaaká mma ọ bụrụ na erere ya, maọbụghị n’ihi ọdịmma nke ndịogbenye. Ihe banyere ndịogbenye emetụghị Judas n’obi. O nweghị ọmiko n’ebe ha nọ. Ọ ghọwo onye anyaukwu na onyeụgha (Jọn 12:6).

Iré Kraist

Ndịisi nchụàjà ejekurughị Judas ime ka o soro na nzube ha. Ọ bụ ekwensu mere ka Judas tụa àtụmàtụ megide Jisọs mee kwa ka o jekuru ndịisi nchụàjà (Luk 22:3, 4). Ọ rọpụtaghị onwe-ya ijé gbaa àmà megide Jisọs, ọ bụ ezie na ha chọrọ ihe-àmà megide Kraist. Judas mere ihe karịrị nke ahụ njọ -- o resịrị ha Jisọs.

Ịhụ Ego n’anya

Judas anọghị na mkpà. Ọ bụghị ụkọ ego mere Judas na ndịisi nchụàjà ji rụọ ọnụahịa. Ọ ghaghị ịbụ na ịhụ ego n’anya mere o ji rara Kraist nye. Judas nyere onwe-ya ịrara Kraist nye n’aka ha. Ná arụghịụka, Judas nwere olileanya ịnata ego. Baịbụl na-agwa anyị na “Ihu ego n’anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile” (I Timọti 6:10).

Judas sịrị: “Gini ka unu nāchọ inyem, mu onwem nārara kwa Ya nye n’aka-unu?” Ha wee kwekọrịta na ọnụahịa Ya ga-abụ iri ọlaọcha atọ, otù ọnụahịa ahụ nke Iwu kwuru na aga-akwụ n’isi orù ọ bụla (Ọpupu 21:32).

Judas chọrọ ego ahụ -- ihe ná-erughị puku naira abụọ -- karịa ka ọ chọrọ Kraist. Oge ụfọdụ taa ụmụmmadụ n’ekwere ka ego were ọnọdụ mbụ ná ndụ ha karịa iji obi ha dum hụ Kraist n’anya. Amatawo mmadụ dịka ndị ná-eji ihe na-erughị puku naira abụọ agbanwere Kraist, n’ihi na ha nyere setan ohere ịbata n’obi ha.

Ọ bụrụ na azọpụtabeghị gị, gịnị na-eguzo n’etiti gị na Kraist? Gịnị na-ewere ọnọdụ mbụ n’obi-gị karịa Kraist? Ọ bụ n’ihi gịnị ka ị na-ere mkpụrụobi gị? “Urù gini ka ọ bara madu, irita elu-uwa dum n’urù, ewe napu ya ndu-ya?” (Mak 8:36).

Egwù Ụmụmmadụ

Ndịisi nchụàjà, ndị odeakwụkwọ, na ndịokenye nke ndị Ju zukọrọ n’obí nke onyeisi nchụàjà ka ha wee gbaa ìzù otú ha ga-esi jide Jisọs. Nzube ha megide Jisọs jọrọ njọ jupụta kwa n’aghụghọ. Ha tụrụ àtụmààtụ n’aghụghọ ka ha wee gbue Ya. N’ihi egwù ụmụmmadụ, ha anwaghị ijide Ya mgbe Ọ na-ezi ihe n’etiti ụmụmmadụ, ha amataghị kwa ebe ha ga-achọta náánị Jisọs. Ha kwuru na ha agaghị-ejide Jisọs n’ụbọchị ememe Oriri ngabiga, ọ bụghị n’ihi na ha na-akwanyere ụbọchị ahụ ùgwù maọbụ na ha na-asọpụrụ Chineke. Ihe dị ha mkpà bụ ịdị n’udo nke onwe-ha, ka ụzụ wee ghara ịpụta n’etiti ndị ahụ. Ha chọrọ ime ihe ga-atọ ndị ahụ ụtọ, ha enweghị kwa mmasị ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.

Judas jekwuuru mmadụ ndịa nwere obi ọjọọ na àtụmàtụ igbu mmadụ. Ọ gwara ha otú o nwere ike isí rara Kraist nye. Judas jọrọ njọ ọbụná karịa otú ha chere. Ha échèghị na otù nime ndị naesoụzọ Jisọs ga-enyere ha aka. Obi tọrọ ha ụtọ ka ha na Judas rụa ọnụahịa mgbe o kwere ha nkwà ịrara Jisọs nye n’aka-ha “mgbe ìgwè madu nānọgh.”

Onye ahụ nke Jisọs rọpụtara ịbụ onye ná-esoụzọ-Ya kwere iso n’àtụmààtụ ime ka Jisọs nwụọ. Onye ahụ nke bụ-rị onye ná-esoụzọ-Ya, wee ghọọ onye na-arara Ya nye n’aka ihe ọjọọ. Judas gbalịrị izo aghụghọ ya n’ebe Kraist nọ. O kweghị ka ọjụjụ ọ jụrụ Kraist pụta ìhè na mbụ. O kwughị na ya abụghị kwa Onyeozi ọzọ, ma Judas nọgidere ná mmekọrịta ya na Ndiozi. Ya na ha nọ mgbe ha na Jisọs na-eri Oriri ngabiga. Judas na Ndiozi niile ọzọ gbakọrọ idebe oriri nke okpukpé ahụ, ma obi ya jupụtara n’ihe ọjọọ n’otù oge ahụ. O mere onwe-ya dịka enyi na onye ná-esoụzọ Jisọs. Ọ maara ebe Jisọs na-akpọrọ Ndịozi Ya jee ọtụtụ mgbe ikpe ekpere. Ọ tụrụ àtụmàtụ ime ka ìgwè mmadụ sitere n’aka ndịisi nchụàjà bịa mara Jisọs site n’iji nsutuọnụ kelee Jisọs. Judas gwara ha iheịrịbaàmà sị: “Onye ọ bula m’gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya” (Mak 14:44).

Ohere Iji Mehie

Oge a niile, ọ na-achọ ohere ịrara Jisọs nye n’aka ndị ahụ chọrọ ndụ Ya. Judas cheere “oghere ọ gēsi rara Ya nye.” Setan eduruwo Judas rue ebe dị anya site n’ebe Chineke nọ nke mere na ọ tụgharịghị uche ihe ime mmehie ga-apụtara ya. Lee ihe óké egwù nke a bụ nye Judas, maọbụ onye ọ bụla ọzọ, ịchọ ohere ime ihe ọjọọ! Judas tụrụ àtụmààtụ, chọọ, chepụta kwa ime mmehie. Otù nime ndị-amụma kwuru sị: “Ahuhu diri ndi nēcheputa ajọ ihe” (Maika 2:1).

Jisọs matara na Judas naachọ ịrara Ya nye. N’oge ememe Oriringabiga, Jisọs sịrị: “Otù onye si n’etiti unu puta gāraram nye.” Jisọs maara nzube niile nke Judas wee gwa ya sị: “Ihe i nēme, me ya ọsọsọ.” Judas rapụrụ ọgbakọ ahụ, ma “ọ bu abali.” Ọ bụ ọchịchịrị nke imemụọ dịka ọ bụ nke anụarụ nye Judas, n’ihi na setan abawo nime Judas Iskariọt. Lee okwu mwuta nke Jisọs kwuru mgbe Ọ sịrị na ọ ga-adịrị Judas mma karị ọ bụrụ na amụghị ya amụ! (Matiu 26:24).

N’ubi Agbaraogige

Jisọs na ndị náesoụzọ Ya jere n’otù ubi agbaraogige ikpé ekpere. Ọ bụ ebe Jisọs kpọworo ndị na-esoụzọ Ya jee ọtụtụ oge, Judas matakwara ebe ahụ (Jọn 18:1, 2). Mmadụ gaara echè na ebe dị otú ahụ ọ ga-abụ ebe dị nsọ nye ndị náesoụzọ Ya. Ná arụghịụkà, ha na Jisọs ekpekọrịtawo ekpere, kwukọrịta kwa okwu ná mmekọrịta dị ụtọ. Nime ubi a agbaraogige ebe mmadụ ga-ele anya na udo na ịdị jụụ ga-adị, ka Judas duuru ìgwè mmadụ ji ọwa na mmaagha baa. Judas bụ onyendú nke ndị ahụ jidere Jisọs. Ha bịara dịka ha na-abịa ijide onyeori -- ha na ọtụtụ ndịkom ji ngwaagha. Ha bịara dịka ha lere anya nguzogide na ibuagha -- jikere ịtụkwasị Jisọs aka na ijide Ya. Judas sitere n’etiti ìgwè mmadụ ahụ pụta gaa n’iru na-ebu nsutuọnụ na okwu aghụghọ nke mmebiiwu n’obi ya. Ọ sịrị: “Ekele, Rabai.” Judas jiri nsutuọnụ kelee Jisọs nke o ji rara Ya nye n’aka ndị naemebiiwu, ha wee duru kwa Jisọs pụa. O guzogideghị ha, kama O jiri afọofufo nye Onwe-ya ịbụ Àjà achụrụ n’ihi mmehie anyị. Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya ka ha mịghachị mmaagha ha n’ọnọdụ ha. O chetaara ha na Ya pụrụ inwetaworị legion ndị mmụọozi iri na abụọ site n’Eluigwe, ma O nyere Onwe-ya ka ihe edere n’Akwụkwọnsọ wee mezue.

Nwa nke Ịlan’iyi

Mgbe Judas natara ego ọlaọcha iri atọ ahụ, o nwetaghị obiụtọ ọ bụla na ya. Mgbe oge ganarịsịworo ya nke-ukwuu ka ọ chọpụtara ihe dị óké egwù nke o meworo! Judas “huru na amara ya ikpe.” Ọbụná ichègharị na iweghachị ego ahụ, na ikwenye na ya raara “ọbara Onye ikpe nāmagh” nye ehichapụghị akọnauche ahụ nke nwere amamikpé. N’ịkwaụta, ọ pụrụ wee kwụgbue onwe-ya. Aha ahụ nke Judas ritaara onwe-ya n’urù bụ “nwa nke ila-n’iyi” (Jọn 17:12) nke pụtara “nwa ọku-ala-mọ.” Site na njehie nke Judas, ọ gara “n’ebe nke aka ya” (Ọlu Ndi-ozi 1:25) mbibi zuruòkè, nhụjuanya na ọnwụ ebighịebi.

Ikwenyere Ọnwụnwa

Ọ bụ kwa otù Judas a onye zawororị òkù Kraist kpọrọ, onye ya na Jisọs nọwokwara, onye mewokwara nkeọma na nwamgbe (Ọlu Ndi-ozi 1:17). Ọ malitere nkeọma ma ọ dabara n’ọnwụnwa wee kwee ka setan bata ná ndụ-ya. Inwe nzọpụta na ịbụ onye náesoụzọ Kraist bụ mnwapụta dị ebube, ma lee ka o si dị ukwuu karịa bụ ikwesị ntụkwasịobi rue ọgwụgwụ ndụ anyị!

Na azọpụtara mmadụ otù mgbe apụtaghị na onye ahụ ga-anọgide ná nzọpụta ahụ. Náánị ma ọ na-ebi ndụ ya nye Jisọs wee ghara ikwe ka mmehie bata ná ndụ ya, ọ ga-etufu òkè ya nke ndụ ebighịebi (Ezikiel 18:26). Ike dị n’ọbara Jisọs ịzọpụta na idebe, ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka edebe ya nime Onyenwe anyị.

Iguzogide Ọnwụnwa

Ọ bụghị náánị Judas bụ onye anwaworo ọnwụnwa. Mmehie Judas bụ na o kwere ka ọnwụnwa merie ya. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime ka o wee guzogide ọnwụnwa mgbe ọ bịakwasịrị ya? Jisọs nyere anyị ihe ilere anya. Ekwensu gbalịrị ịnwa ọbụná Jisọs, Ọkpara Chineke. Okwu Chineke ka Jisọs jiri guzogide setan. Jisọs sịrị, “Edewo ya n’akwukwọ nsọ,” O wee kwue ihe edere na Baịbụl (Matiu 4:4, 7, 10). Anyị onwe-anyị pụkwara imeri setan site n’Okwu Chineke. Ọ bụrụ na anyị rubere Jisọs isi, debe kwa Okwu Ya, anyị pụrụ ile anya na Jisọs ga-edebe anyị n’oge ọnwụnwa. Anyị na-agụ: “N’ihi na i debere okwu nke ntachi-obim, Mu onwem gēdebe kwa gi ka i ghara iba n’oge hour nke ọnwunwa ahu, bú oge hour nke gaje ibiakwasi elu-uwa dum madu bi, inwa ndi bi n’elu uwa” (Nkpughe 3:10)

Onyenwe anyị ekweghị mkwà na agaghị anwa anyị ọnwụnwa, ma O kwewo mkwà nke ụzọ mgbapụ site n’ọnwụnwa ahụ. “Ọ digh ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbugh nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgagh-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n’oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ ngbapu, ka unu we nwe ike inagide ya” (I Ndi Kọrint 10:13).

Mgbe Ekwensu bịara ịnwa gị ọnwụnwa, were Okwu Chineke guzogide ya: rịọ Onyenwe anyị ka O nyere gị aka: rara kwa onwe-gị nye n’aka “Onye ahu nke puru iche unu nche ka unu ghara isu ngọngọ” (Jud 24). Site n’ịnọgide n’ekpere na ijiobichụaàjà, site n’iche nche na irube isi nye ịdọakanántị niile, anyị pụrụ ibindụ kwesịrị ntụkwasịobi nye Kraist. Anyị pụrụ ibindụ site n’amara Chineke, ka anyị wee nwee ike isoro Pọl kwue sị: “Agbasiwom ngba ọma ahu, agbasiwom ọsọ ahụ, edebesiwom okwukwe ahu” (2 Timọti 4:7).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye bụ Judas Iskariọt?
  2. Ndịozi ole ka Jisọs rọpụtara?
  3. Ònye na-ebu akpaego Ndịozi ahụ?
  4. Gịnị mere Judas jiri chọọ ire mmanụotite ezi nard ahụ?
  5. Gịnị mere mgbe Ekwensu banyere nime Judas?
  6. Gịnị mere Judas ji jekuru ndịisi nchụàjà?
  7. Gịnị mere ha ejideghị Jisọs mgbe Ọ na-ezi ndị ahụ ihe?
  8. Ègo ole ka Judas ga-anata?
  9. Òlee otú esi rara Jisọs nye?
  10. Òlee otú mmadụ pụrụ isí guzogide ọnwụnwa?