Jọn 20:19-31; Luk 24:36-49

Lesson 250 - Junior

Memory Verse
“Aghọ-kwa-la onye nēkwegh, kama ghọ onye nēkwere” (Jọn 20:27).
Notes

Onyenwe anyị Sitere N’Eluigwe

Onyenwe anyị Jisọs Kraist bịara n’ụwa a ibinyere mmadụ na ikuziri ha ihe banyere Eluigwe. Ọ dịbeghị mmadụ ọ bụla ji anya ya abụọ nke anụarụ hụ ocheeze Chineke; ọ dịghị kwa onye ọ bụla pụrụ isí ná ndị nwụrụanwụ laghachị ịgwá anyị ihe ofé ọzọ yiri. N’ihi nke a Jisọs yikwasịri ụdị nke mmadụ, anụarụ na ọbara, wee si n’Eluigwe bịa ibi n’etiti anyị, ịkọwara anyị otú anyị ná-aghaghị isí jikere maka ebe Obibi ahụ dị n’elu.

Mgbe Jisọs nọ n’ụwa, Ọ gwara ụmụmmadụ na Ya bụ Ọkpara Chineke. Mmadụ olenaole kweere nke a. Ma ndị ahụ kweere ka Jisọs zọpụtara. Mgbe Pita jiri ahịrị okwu nke a zaa ajụjụ nke Onyenwe anyị, “Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke di ndu” (Matiu 16:16), Jisọs gwara ya na anụarụ na ọbara (maọbụ mmadụ ékèrèekè) ekpugheghị eziokwu ahụ nye ya, kama Nna ahụ nke bi n’Eluigwe.

Jisọs bịara n’otù aka ahụ, inye Onwe-ya dịka Àjà achụrụ n’ihi mmehie. Nke ahụ pụtara na Ọ ga-anwụ n’ihi mmehie anyị -- ọ bụghị n’ihi mmehie nke Ya, n’ihi na O nweghị mmehie -- bilie kwa ọzọ ime ka nzọpụta anyị bụrụ ihe guzosiri ike.

Anwapụtara Na Ọ Bụ Ọkpara Ahụ

Òlee otú Jisọs pụrụ isí gosi na Ya bụ Ọkpara Chineke? Ọ bụ Onyenkuzi ukwu ma enweworị ndịnkuzi ukwu ọzọ na ndịmkwusa, ndị kuziwooro ụmụmmadụ ụzọ esi ebi ndụ: Òlee otú Jisọs si dị iche? Oge ụfọdụ dịrị mgbe Chineke sitere n’Eluigwe kwue sị: “Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma”; ma mmadụ olenaole nụrụ Olu ahụ, ụfọdụ nime ndị ahụ nụrụ ya wee chee na ọ bụ olu egbéeluigwe.

Pọl na-akọwara anyị otú Jisọs si gosi na Ya bụ Ọkpara Chineke: Ọ bụ Onye “akaworo ibu Ọkpara Chineke n’ike, … site na mbiliten’ọnwu nke ndi nwuru anwu” (Ndi Rom 1:4). Jisọs ekwuworị sị: “Enwerem ike itọgbọ ya (ndụ Ya), enwe-kwa-ram ike inara ya ozọ” (Jọn 10:18). O gosịrị site na mbiliten’ọnwụ Ya n’anụarụ -- isi n’ílì pụta n’anụarụ -- na Ya bụ Ọkpara Chineke.

Adịghị Ekwere Ihe Ọsọsọ

Jisọs siri ná ndị nwụrụanwụ bilie, ma ụmụmmadụ, hà kweere ya? Ọ bụ ihe siri ike nye ndị náesoụzọ Ya nọ Ya nso karịsịa, ikwere na Jisọs dị ndụ ná anụarụ. Jisọs agwawo ha-rị ọtụtụ oge na Ya aghaghị ịhụ ahụhụ, agaesi kwa n’aka ndị ọjọọ mee ka Ya nwụọ. Ndị naesoụzọ Ya pụrụ ịghọta nke ahụ n’ihi na egbuwo ndịamụma amaara aha ha na mgbe gara-aga n’ihi okwukwe ha. Mgbe ndị náeso ụzọYa nụrụ na ezi enyi ha na Onyendú ha ga-anwụ ọnwụ site n’ụzọ dị otú ahụ, “O we wuta ha ri nne.”

Mgbe Jisọs gwara ha banyere ọnwụ-Ya, Ọ tụkwasịrị okwu a: “Agēme kwa ka O si n’ọnwu bilie n’ubọchi nke-atọ.” Okwu niile ahụ ka Ndịozi ná-apụghị ịghọta. O juru Pita, Jemes na Jọn anya otù mgbe, ha wee ná-atụgharị uche n’etiti onwe-ha ihe na Ya ga-esi na ndị nwụrụ anwụ laghachị pụtara. Na Jisọs ga-alaghachikute ha n’ọnọdụ Ya mbụ n’anụarụ mgbe Ọ nwụsịrị ọnwụ abataghị n’uche ha.

Ọ Dị Ndụ Ọzọ

Oge ruru mgbe emere ka Jisọs nwụọ ọnwụ. Lee ihe ana-atụghịanya ya nke a bụụrụ ndị náesoụzọ Ya! Enyi ha anwụwo, n’otù aka ahụ olileanya ha nwere banyere alaeze eziomume n’ụwa a adịghị kwa.

Mgbe ụtụtụ Ụbọchị Mbiliten’ọnwụ ruru emere ka mkpọrọ nke ọnwụ gbajisịa, Kraist rapụkwara ílì ná anụarụ. O biliri n’arụ nke ebube gafee nkume eji mechie ílì Ya, wee merie ike niile jideworo Ya. Mmụọozi bịara kpọrepụ nkume, igosi ndịnyom ahụ na ílì ahụ tọgbọrọ n’efu. Ákwàozu nke ọtụtụ ya riri nne nke dị kwa ókéọnụahịa ejiri fụchie arụ Ya niile nọ n’ebe ahụ; ezi ákwà ná enwuenwu nke atụkwasịworo n’isi Ya nọgidere n’ebe ahụ isi Ya tọgbọwororị. Ma arụ Jisọs anọghị n’ebe ahụ!

Ndịnchụàjà nyere ndịagha ahụ iheiringo ka ha kwue na otù onye ezuruwo Ya n’ori mgbe ha na-ararụ ụra. (Ha ga-abụworị ndịnché ná-adịghị ike n’ezie ọ bụrụ na otú ahụ ka o si mee). Ọ bụrụ na otù onye zuuru arụ Jisọs n’ori, ọ gaghị ewerewo kwa ákwà ozu niile ahụ? Arụ ahụ apụwo, nke ahụ doro anya. Òlee ebe ọ nọ?

Meri Magdalini buru ụzọ chọpụta. Jisọs mere ka ọ hụ Ya anya, ha kwuritakwara okwu. Ndịnyom niile ọzọ hụkwara Ya; na Pita kwa, na ndị náesoụzọ Ya ná-eje n’ụzọ Emeus. Ọ dị kwa ka mmadụ ọ bụla ọzọ. O siri ike, arụ dị kwa Ya mma, ndụ ọhụụ dị kwa nime Ya -- ọ bụghị onye ike gwụrụ ná-apụghị ime ihe ọ bụla n’ihi ihe-ụfụ na ahụhụ nke obe mgbe ọbara sitere n’arụ Ya rusaa. Ọ gara ọtụtụ maịlị n’okporoụzọ esi eje Emeus mgbe Ọ na-akọwara ndị náesoụzọ Ya ihe Akwụkwọnsọ kwuru na Testament Ochie banyere Ya Onwe-ya. Ha rịọrọ Ya ka Ọ bata n’ụlọ soro kwa ha rie ihe; ma mgbe O weere achịcha, gọzie kwa ya, anya ha meghere, ha matakwara na ọ bụ Jisọs -- Jisọs dị ndụ n’anụarụ, ma O yikwasịrị arụ ebube nke funarịrị ha.

N’etiti Mmadụ Irinaotù Ahụ

Ha laghachirị Jerusalem ngwangwa, ebe Ndịozi na-ezukọ izí ha oziọma ahụ. Mgbe ha ji ọñụ ná-ekwu banyere ihe ịtụn’anya a mere, Jisọs guzooro n’etiti ha, gwa kwa ha sị: “Udo diri unu.” Ndị ahụ so n’okwu ikpeazụ nke Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya tupu akpọgide Ya n’obe: “Udo ka M’rapuru unu; udo nkem ka M’nēnye unu” (Jọn 14:27). Ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ nwere ike ikwu okwu niile a. Jisọs chọrọ ka ndị Ya nwee obiụtọ, Ọ matakwara na náánị Ya bụ onye ná-enye udo. Mmadụ apụghị ịchọta udo nime ọtụtụ akụnaụba, maọbụ site n’arụike, maọbụ site n’ịbụ onye amaara aha ya, maọbụ iheụtọ nke ụwa. Ndị mmụọozi ekwusaworị n’ọmụmụ Ya na ọ bụ Ya bụ Onye ga-eweta udo. Ma mmadụ olenaole na-arịọ Ya banyere nke a!

Egwù tụrụ Ndịozi mgbe ha hụrụ Jisọs -- ọbụná mgbe agwasịrị ha na Ọ dị ndụ, na ụfọdụ ahụwo, mata kwa na ọ bụ Ya. Ha wee chee na ọ bụ mmụọ ka ha na-ahụ

O wutere Jisọs na ha nwere náánị okwukwe ntà, ọ bụ ezie na Ọ baara ha mba n’ihi ekweghịekwe ha, O mere ihe niile Ọ pụrụ ime iji gosi ha na ọ bụ Ya n’ezie bụ Onye ná-eguzo n’iru ha ná anụarụ. Ọ gwara ha ka ha metụ anụarụ Ya aka, “Mọ enwegh anu-aru na ọkpukpu, otú unu huru na Mu onwem nwere.” O wee gosi ha apa ntú dị n’aka na n’ụkwụ-Ya. Ewo, lee otú ọ dị ịtụn’anya na Jisọs ha dị ndụ ọzọ! Ma ihe a ọ pụrụ ime n’ezie! Ọñụ jupụtara obi ha -- ma ọ gbagwojuru ha anya. Ihe dị ka nke a emebeghị mbụ. Jisọs chorọ ka o doo ha anya na Ya dị ndụ, n’ihi na nke ahụ gosiri na Ọ bụ Ọkpara Chineke. Nke ahụ bụ na ntọala Ọ na-ewukwasị Nzukọ Ya.

Olileanya Anyị

Anyị chọrọ ime ka o doo anyị anya na Jisọs siri na ndị nwụru anwụ bilie. Ọtụtụ ndị-okpukpé dị n’ụbọchị taa ndị ná-ekweghị na Jisọs bụ Ọkpara Chineke dị nsọ. Ha na-asị na O sighị n’ọnwụ bilie ná anụarụ, na Ọ dị ndụ náánị nime mmụọ dịka mmadụ niile ọzọ nwụrụanwụ -- maọbụ na Ọ dị ndụ náánị dịka okwukwe ndị náeso ụzọ Ya si dị. Ma nke ahụ abụghị ihe Baịbụl na-akụzi. Anyị chọrọ ịmata eziokwu ahụ, n’ihi na ọ bụ eziokwu na-eme ka anyị pụọ n’orù. “Ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus, na Ọ bu Onye-nwe-ayị, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gi” (Ndi Rom 10:9).

Iruuju Ghọrọ Ọñụ

Jisọs mere otù ihe ọzọ iji gosi na Ya nọ ná anụarụ: Ọ sịrị ka enye Ya iheoriri; n’iru ha kwa O riri azụ arụrụarụ na mmanụañụ. Lee otú ọ dị ịtụn’anya! Ọ dịghị mkpụrụobi nwụrụanwụ maọbụ mmụọ ọ bụla ga-enwe ike rie iheoriri. Ugbu a, ha wee malite ịghọta ihe ụfọdụ Jisọs gwara ha-rị tupu akpọgide Ya n’obe. “Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ugbu a: ma M’gāhu unu ọzọ, obi-unu gāñuri kwa ọñu, ọ digh kwa onye ọ bula gānara unu ọñu-unu” (Jọn 16:22). Nsogbu dị n’iru nye Ndịozi. Aga-akpagbu ha n’ihi Jisọs, ha ga-ahụ kwa ahụhụ nke ịnwụ n’ihi okwukwe ha: ma ọñụ na udo ahụ nke Jisọs nyere ha ga-anọ n’obi ha mgbe niile.

Emebiri Ekweghịekwe Tomas

Mgbe Jisọs mere ka mmadụ irinaotù ahụ hụ Ya anya nke mbụ, Tomas anọghị n’etiti ha. Mgbe agwara ya ihe mere, o kwenyeghị. Anyị na-akpọ ya Tomas onye Ná-adịghị ekwere ihe; ma ekweghịekwe ya ọ karịrị nke ndị ọzọ? Ọ dịghị onye ọ bụla nime ha kwenyeworo rue mgbe ha jiri anya ha hụ Jisọs.

N’abalị ụbọchị Mbụ nke ízù ná-esoni, Ndịozi ahụ zukọtakwara nime ụlọ wee mechibido onwe-ha ụzọ. N’oge a ha na Tomas nọ mgbe Jisọs bịara n’etiti ha. Jisọs wee kele ha dịka O kelekwara ha n’ízù garaaga: “Udo diri unu.” O legidekwara Tomas anya wee sị: “Setipu nkpisi-aka-gi n’ebe a, le akam abua; setipu kwa aka-gi, tiye nime akukum.” Ọ matara okwu ahụ Tomas kwururị, dịka Ọ maara ihe niile anyị na-ekwu. O jiri okwu nke Ya zaghachị ekweghịekwe nke Tomas. Náánị ihe Tomas pụrụ ikwu bụ, “Onye-nwem na Chineke.” Jisọs gwara Tomas sị, “N’ihi na i huwom, ì kwerewo? ngọzi nādiri ndi akahugh, ma ha kwere.”

Anyị ndị kweere n’ụbọchị taa na Jisọs siri na ndị nwụrụanwụ bilie bụ ndị agọziri agọzi. Anyị ejibeghị anya anyị hụ Ya, ma anyị maara Ya n’ihi na Ọ gbagharawo mmehie anyị, ndụ ebighịebi amalitewo kwa nime anyị.

Ndịàmà Eziokwu

Ndịkom ndịa ha na Jisọs zukọrọ rikọọ kwa iheoriri bụ Pita, Jemes, Jọn, Tomas na ndị ọzọ ga-abụ ndị ná-ezisa Oziọma n’ala niile ịkọ akụkọ banyere Jisọs. Ha kwesịrị ike na Jisọs ebiliwo ná anụarụ, na ọ bụ kwa na nke a ka ọlụ nke Oziọma ha niile na-eguzo.

Nime okwu Chineke mbụ nke Pita kwuru, ọ gwara ndị Ju ahụ nwere ụdị okpukpé, ndị makwaara ihe edere nime Akwụkwọnsọ, na Chineke ekwewo Devid mkwà nke onyenketa “si ya n’afọ puta” ka ọ nọkwasị n’ocheeze ya. Pita sịrị na Devid na-ekwu banyere mbiliten’ọnwụ nke Kraist. Ọ tụkwasịrị, “Jisus nka ka Chineke mere ka O si n’ọnwu bilie, nke ayi onwe-ayi nile bu ndi-àmà-ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:32).

Arọ asatọ n’iru, Pita kwusara banyere Jisọs nye Kọniliọs na ndị ọzọ sị, “Onye ahu ka Chineke mere ka o si n’ọnwu bilie n’ubọchi nke-atọ, Ọ were kwa Ya nye ka egosi Ya n’ìhè; ọ bugh ndi-Ju nile ka egosiri Ya, kama ọ bu ndi-àmà Chineke buru uzọ rọputa, bú ayi onwe-ayi, ndi soro Ya nēri nāñu kwa mgbe O siri na ndi nwuru anwu bilie” (Ọlu Ndi-ozi 10:40).

Pita na Jọn jikeere ka etinye ha n’ụlọmkpọrọ n’ihi na ha kwusara banyere mbiliten’ọnwụ. Mgbe abaara ha mba n’ihi isiokwu nke okwuChineke ha kwuru, ha zara sị, “Ayi onwe-ayi apugh ighara ikwu ihe nile ayi huru nu kwa” (Ọlu Ndi-ozi 4:20).

Mkpụrụ Mbụ Niile

Jisọs gosịrị site ná mbiliten’ọnwụ Ya na Ya bu Ọkpara Chineke. Ọ bụ kwa n’otù aka ahụ, “nkpuru mbu nke ndi daworo n’ura ọnwu,” maọbụ ndị arụ-ha nwụworoanwụ.

Mkpụrụ nke ekwuru ihe banyere ya nime Akwụkwọ Levitikọs bụ mkpụrụ bu ụzọ chaa na mkpụrụ dị icheiche. Ana-eme ememe ná mmalite nke owuweiheubi, iji kelee Chineke maka onyinye Ya; ana-ewere kwa mkpụrụmbụ niile ahụ chee n’iru Onyenwe anyị. Mkpụrụ niile fọdụrụ bụ otù ihe, ma ana-edebe ha maka ọdịmma nke mmadụ.

Jisọs bụ onye mbụ sitere n’ọnwụ bilie n’arụ ebube. Ná mbiliten’ọnwụ nke mbụ, ndị nsọ Ya niile ga-esi n’ílì bilie. “Mgbe ahu ayi onwe-ayi, bú ndi nọ ná ndu, ndi anārapu, ayi na ha ka agēwelikọ n’igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe: otú a ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mgbe nile” (I Ndi Tesalọnaika 4:17).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya banyere ọnwụ Ya?
  2. Gịnị bụ ihe O kwuru ga-eme mgbe Ọ nwụsịrị ọnwụ?
  3. Gịnị mere arụ Jisọs mgbe etinyesịrị Ya nime ílì?
  4. Òlee mgbe Jisọs mere ka mmadụ irinaotù ahụ hụ Ya anya?
  5. Gịnị bụ ihe mbụ Ọ gwara ha?
  6. Òlee otú o si gosi ha na Ya abụghị mmụọ?
  7. Gịnị ka Jisọs gosipụtara site n’isí ná ndị nwụrụanwụ bilie?
  8. Gịnị bụ isiokwu nke okwuChineke nke Ndịozi mgbe ụbọchị Pentikọst gasịrị?
  9. Òlee ihe ọ pụtara nye anyị na Kraist bụ “nkpuru mbu nke ndi daworo n’ura ọnwu”?