Lesson 251 - Junior
Memory Verse
“Burukwa Onye ahu nādi ndu; aghọ-kwa-ram onye nwuru anwu, ma le, anamadi ndu rue mgbe nile ebigh-ebi” (Nkpughe 1:18).Notes
Ịlaghachị N’Igbuazụ
Ndịozi ahụ ahụwo Jisọs na Ọ dị ndụ, ha kwekwara n’ezie na O siwo n’ílì bilie ná anụarụ. Ma Ya na ha anọghị, ya mere gịnị ka ha ga-eme ugbu a?
Otù ụbọchị, asaa nime Ndịozi (Pita, Jemes, Jọn, Tọmas, Nataniel na abụọ ndị ọzọ) zukọrọ n’akụkụ osimmiri, Pita wee wepụta àtụmààtụ na ha ga-alaghachị n’ọlụ mbụ-ha bụ igbuazụ. Ndịọzọ soro ya jee, ha wee nọrọ n’igbuazụ abalị niile. Ndịa bụ ndịkom ahụ gaje ikpu “elu-uwa dum madu bi iru” site n’ikwusa banyere Kraist ahụ siworo n’ọnwụ bilie; ha ga-abụworị ndị ná-enweghị ohere banyere ọlụ ọ bụla ọzọ. Ọlụ-ha bụ ịgwá ụmụmmadụ na Jisọs ga-azọpụta ha site ná mmehie-ha. Ha ga-abụworị “ndi-ọkù nākuta madu.”
Ma ejibeghị ike Mmụọ Nsọ wụọ ndịkom ahụ mmiri, ma ha enweghị ike ịpụ ijé zisaa Oziọma. Ha ezisaworị Oziọma ụfọdụ mgbe Jisọs nọ n’etiti ha, ma ugbu a Ọ nọghị kwa, ha wee dị ka ndị ná-enweghị ike. Ọ dịghị onye ha nwere ga-eduzi ha.
Jisọs ekwewo ha-rị mkwà na mgbe Ya rapụsịworo na Ya ga-ezite Onyenkasiobi, bụ Mmụọ Nsọ, iduba ha n’eziokwu niile; ma Onyenkasiobi a abịabeghi.
Nwoke Ahụ Náeguzo N’ótú
Mgbe chi na-abọ, Ndịozi hụrụ otù nwoke n’ótú onye ná-ajụ ha banyere iheoriri. Ha wee gwa ya na ha enwetaghị ihe ọ bụla. Ha adọtaghị ọbụná otù azụ nime ihe ha ji egbuazụ n’abalị ahụ niile. Nwoke ahụ wee gwa ha ka ha tụba ụgbụ ha n’akụkụ akanri nke ụgbọ ahụ; mgbe ha mere nke a ha dọtara otù narị azụ na iri-ise na atọ (153) -- site kwa n’otù mmiri ahụ ebe ha nọ ná-egbuazụ abalị niile ma ha egbughị ihe ọ bụla!
Amatara Ya
Jọn Onye ahụrụ n’anya bụ onye mbụ matara Nwoke ahụ na ọ bụ Jisọs. Ọ dịghị onye ọzọ pụworo ịlụ ụdị ọlụ ebube a. Pita, onye ọ bụ ya bụ onye mbụ chọrọ ijé gbue azụ, ugbu a chọrọ ịbụ onye mbụ ga-ekele Onyenzọpụta; ya mere na ọ dabara nime mmiri wee chọrọ ụzọ ya rue ótú. Ndịozi fọdụrụ dọpụtara ọtụtụ azụ ahụ egbutere.
Jisọs matara na agụụ ga-agụ ha mgbe ha lụsiworo ọlụ ike abalị niile, ya mere o mere ka ọkụ ná-enwu wee debe azụ ụfọdụ ndị esiworo esi ka ha wee rie nri, ya na achịcha kwa. Nke a bụ ihe ngosi ọzọ na Jisọs esiwo n’ọnwụ bilie na ọ dị kwa ndụ ná anụarụ-Ya.
Ịhụn’anya Pita n’Ebe Jisọs Nọ
Tutu Ụbọchị Pentikọst erue, Pita mere ngwa ikwu óké okwu banyere ihe ọ gaje ime, ma oge ụfọdụ ọ dịghị enwe ike imezu ha. Jisọs kpọpụtara ya iche, wee jụọ ya sị, “Ị hurum n’anya kari ndia?” Pita ọ hụrụ Jisọs n’anya karị azụ ahụ? Ọ ga-aka ya mma ikwusa Jisọs karị ịlaghachị n’ọlụ ya nke bụ igbuazụ? Pita zara ngwangwa sị, “E, Onye-nwe-ayi’ Gi onwe-gi matara na I bu eyim.” Jisọs sịrị “Nēnye umu-aturum nri.” Ma nke a akwụsịghị mkparịta uka ahụ. Jisọs jụkwara Pita, otù ajụjụ ahụ ọzọ “Ì hurum n’anya?” Pita zara dịka na mbụ sị “E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyim.” Jisọs sịrị, “Nāzu aturum.”
Ọzọ kwa, Jisọs jụrụ otù ajụjụ ahụ. Pita amaghị ihe ọ ga-eche. Ọ bụ na ya onwe-ya emebeghị ka o doo anya nkeọma na ya hụrụ Jisọs n’anya? Ma Jisọs chọrọ ka ọ mata nkeọma na ọ maara ihe ọ na-ekwu n’oge a. Ọ chọrọ ka ọ ghara ichefu ihe o kwuru n’oge a. Pita na-ekwe mkwà ịghọ onyemkwusa Oziọma nke ga-eji anyaike kwusaa okwu na Jisọs bụ Ọkpara Chineke na O siwo kwa n’ọnwụ bilie.
Jisọs wee mee ka Pita mata ntakịrị ihe ga-eme na mgbe dị n’iru. Ọ gwara ya na ugbu a ọ dị na okorọbịa, ọ pụkwara ịrọpụtara onwe-ya ihe ọ chọrọ ime; ma mgbe ọ ga-eme agadi, ndịọzọ ga-eme ka o mee ihe ọ na-achọghị ime. N’ụzọ a Jisọs na-agwa Pita na ọ ga-abụ onye aga-egbu n’ihi Kraist, na ọ ga-anwụ ọnwụ n’ihi okwukwe-ya kama ịkwụsị ikwusa na Jisọs bụ Kraist ahụ.
Pita chọkwara ịmata ihe ga-eme Ndịozi ndị ọzọ fọdụrụ, ma Jisọs gwara ya na ọ gana-alụsị ọlụ ike n’ijé ozi n’ọkpụkpọ nke akpọrọ ya ná-esogbughị onwe-ya banyere ha.
Nke a bụ ugbò atọ Jisọs mere Onwe-ya ka Ọ pụtaihè nye ụfọdụ nime Ndịozi.
Akụkọ Pọl Banyere Mpụtaìhè Niile nke Jisọs
Pọl na-agwa anyị na Jisọs pụtakwara ìhè nye ihe karịrị narị mmadụ ise. Ọ bụ mgbe ọtụtụ arọ gabigasịrị mgbe Jisọs rigosiworo n’Eluigwe ka Pọl na-ekwu nke a, ma ọ sị na ụfọdụ ndị hụworo Jisọs nọ kwa ndụ rue oge ahụ. Ha bụ ndị ná-agba àmà eziokwu na Jisọs esiwo n‘ílì pụta.
Jemes (eleghịanya nke bụ nwanne Jisọs, onye ná-ekweghị na mbụ na Ọ bụ Nwa Chineke) bụ onye ọzọ hụrụ Jisọs; emesịa mmadụ irin’otù ahụ.
N’ikpeazụ Pọl n’onwe-ya hụkwara Jisọs. Nke a abụrụworị mgbe Jisọs rigosịrị n’Eluigwe. Pọl ekwebeghị ná mkwusa Ndịozi na Jisọs bụ Ọkpara Chineke na O siwo kwa na ndị nwụrụanwụ bilie. N’ịdị nsọ-ya na n’ịnụọkụ n’obi nke okpukpé-ya, Pọl chere na ya onwe-ya na-eme ihe Chineke chọrọ mgbe ọ na-akpagbu nzukọ ọhụụ ahụ nke kweere ná mbiliten’ọnwụ. O tinyere ụmụmmadụ n’ụlọmkpọrọ na-eme kwa ka ha nwụọ n’ihi na ha kwere na Jisọs esiwo n’ílì bilie ná anụarụ.
O rue otù ụbọchị mgbe Pọl na-ejé otù nime ozi nke ịkpagbu ndị Kraist, Jisọs n’Onwe-ya pụtaraìhè nye Pọl. Pọl hụrụ Ya. Site na mgbe ahụ Pọl matara na Jisọs dị ndụ; ya onwe-ya wee jikere ka akpagbue ya ọbụná igbu ya n’ihi okwukwe ahụ. Pọl guzosịrị ike n’okwukwe-ya na Jisọs siworo n’ọnwụ bilie.
Olileanya Anyị Site Ná Mbiliten’ọnwụ ahụ
Gịnị mere o ji dị mkpà na anyị ga-ekwere na Jisọs esiwo n’ọnwụ bilie? N’ihi na ọ bụrụ na anyị ekwereghị, anyị agaghị enwe nzọpụta. Jisọs bụ náánị Onye pụrụ ịgbaghara mmehie; Ọ pụkwara ịgbaghara mmehie náánị n’ihi na Ọ bụ Ọkpara Chineke. Ọ bụrụ na O sighị n’ọnwụ bilie, Ọ bụghị Ọkpara Chineke.
Ọ tụrụ Pọl n’anya na ụmụmmadụ ekweghị na Jisọs esiwo n’ọnwụ bilie. Ọ bụrụ na Kraist esighị n’ọnwụ bilie ọ pụtara na mkwusa Oziọma ha niile bụ ihe efu, na ha ka bụ kwa ndị mmehie, ná-enweghị olileanya. Ma ọ bụrụ na O siworị n’ọnwụ bilie wee dị ndụ, ọ pụtara na O nwere ike ịgbaghara mmehie; n’ihi na Ọ na-adị ndụ, anyị bụ ndị amụrụ ọzọ ga-esoro Ya dị kwa ndụ.
Pọl sịrị na ọ bụrụ na anyị enweghị olileanya ibi n’ụwa ọzọ ka mma, anyị ga-abụ ndị ekwesịrị imere ebere karịsịa mmadụ niile. Gịnị mere ọ ga-eji hụ ahụhụ nke ịpịa ụtarị, ugbọ ikpu, agụụ, oyi, na ịnwụ n’ihi okwukwe ya, ọ bụrụ na ọ maghị na ya gaje inwe ọñụ na ndụ ebighịebi ya na Kraist ma emesia? Pita dere sị, “Ebe unu nwekọrọ ahuhu nke Kraist, nāñurinu ọñu; ka unu we were kwa obi nātọ utọ nke-uku ñuria nime nkpughe nke ebube-Ya” (I Pita 4:13).
Okwukwe Ndị Nna Ukwuu Anyị-Ha
Abraham kwere na mbiliten’ọnwụ. O nwere akụnaụba nke ukwuu, ọ pụkwararị ịrọpụtara onwe-ya ala kachasị mma ebe ọ ga-ebi; kama o biri n’ụlọikwu. Obi-ya dị n’obodo ọzọ, “nke nwere ntọ-ala ahu, nke Chineke bu onye-ọkà-ya na onye luru ya” (Ndi Hibru 11:10). N’ihi na ya na ndị ọzọ dịka ya nwere olileanya ha n’obodo ka nke a mma, “ihere ha adigh-eme Chineke, ka akpọ Ya Chineke-ha: n’ihi na O doziworo ha otù obodo” (Ndi Hibru 11:16).
Job nwekwara ụdị okwukwe a. Ọ maara na ya ga-anwụ, ma ọ makwaara na ya ga-adị ndụ ọzọ, na n’arụ-ya ka ya ga-ahụ Jisọs. O dere sị; “Mgbe emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka, Ọ bu na m’gēsi n’anu-arum hu Chineke” (Job 19:26, margin). Ọ maara ọbụná, na Jisọs gaje ịbịa nke ugbò abụọ ná anụarụ-Ya, n’ihi na o dere sị: “Mu onwem amawo na Onye-ngbaputam di ndu, na O gēbili kwa ọtọ n’elu ájá n’ikpe-azu” (Job 19:25).
Devid bụ eze ukwuu, onye nweworo ihe niile na ndụ a nke gaara-eme ka mmadụ nwee ojujuafọ, dere sị: “Mu onwem, n’ezi omume ka m’gāhu iru-Gi: Ka afọ jum n’udi-Gi, mgbe m’tetara” (Abù Ọma 17:15).
Aisaia buru amụma sị: “Ndi-Gi ndi nwuru anwu gādi ndu; ozum nile gēbili. Tetanu, tie nkpu ọñù, unu ndi bi n’ájá: n’ihi na igirigi nke ìhè nile ka igirigi-Gi bu, ala gāmuputa kwa ndi nādigh ndu” (Aisaia 26:19).
Ọ bụrụ na ndịamụma ukwuu ndịa pụrụ ile anya n’ọdịn’iru wee hụ mbiliten’ọnwụ tutu Jisọs anwụ a, ma bilite kwa ọzọ, òle otú anyị bụ ndị matara na O si n’ọnwụ bilie, na-agaghị ekwere karị na aga-agbanwe anyị, na anyị ga-adị kwa ka Ya ná anụarụ enyere ebube rue mgbe ebighịebi.
Ndụ Site N’Ọnwụ
Ụfọdụ mmadụ kwere na onyeKraist ga-ebi n’Eluigwe dịka mmụọ, ma Pọl na-eme ka anyị ghọta nkeọma na anyị ga-enwe anụarụ. Mbiliten’ọnwụ pụtara isi n’ọnwụ dị ndụ ọzọ, ịbịaghachị ná ndụ mgbe anwụsịrị. Mgbe mmadụ nwụrụ, mmụọ-ya na-alaghachikuru Chineke, Onye nyere ya (Eklisiastis 12:7). Ọ dịghị anwụanwụ. Ị pụghị íli mmụọ. Nke a pụtara na, ọ bụrụ na mbiliten’ọnwụ ga-adị, ọ ga-abụ nke anụarụ.
O nwere ihe dị iche ná anụarụ nke anyị nwere ugbu a na nke ahụ anyi ga-eji bilie: “Aru nke elu-igwe na aru nke uwa di kwa.” Arụ nke eluigwe bụ arụ enyere ebube nke anyị ga-anọ nime ya wee soro Kraist chịa ọchịchị rue mgbe ebighịebi. Anyị ga-enwe ike mee ka ahụ anyị anya, nwee kwa ike funarị n’anya mmadụ dịka Jisọs si mee mgbe O siri n’ọnwụ bilie. Ihe niile nke anụarụ ga-achọ, na nke ga-agụ ya agụụ ga-abụ ihe nke eluigwe. Arụ nke ụwa bụ nke ụwa a nke jupụtara n’ịchọ ihe nke ọ ga-eji bie ndụ kwa ụbọchị. Ma n’ụzọ abụọ ndịa, ha bụ arụ.
Agụụ Maka Mgbapụta
Ana-azọpụta anyị site ná mmehie, ana-agbapụta anyị site n’Ọbara Jisọs. Anyị na-adị ndụ ọhụụ nime Kraist. Ma agụụ ụbọchị ahụ na-agụ anyị mgbe aga-eme ka anụarụ anyị dị ọhụụ. “N’ihi na ayi matara na ihe ekere èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ugbu a. Ma ọ bugh náni nka, kama ayi onwe-ayi, ndi nwere nkpuru mbu nke Mọ Nsọ, ọbuná ayi onwe-ayi nāsu kwa udè nime onwe-ayi, mgbe ayi nēchesi ido-ka-nwa-nwoke ahu ike, bú ngbaputa nke aru-ayi” (Ndi Rom 8:22, 23).
NdịKraist nwụrụanwụ ka aga-eme ka ha ji arụ enyere ebube bilie mgbe Jisọs ga-abịa, aga-enwo-kwa NdịKraist dị ndụ, “n’oge dikarisiri ntà, n’otù ntabi-anya, mgbe agāfù opi ikpe-azu: n’ihi na agāfù opi, agēme kwa ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie nāpugh ire uré, agēnwo kwa ayi onwe-ayi” (I Ndi Kọrint 15:52).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Mgbe mmadụ irinaotù ahụ hụsịrị Kraist nke ugbò abụọ na ọ dị ndụ òle ebe ka ha jere?
- Gịnị gaje ịbụ ọlụ ha na ndụ ha site n’ugbu a gaa n’iru?
- Gịnị ka Ndịozi ndịa ná-enweghị maka iji lụọ ọlụ ọhụụ ha?
- Mgbe ha si n’ọlụ abalị ha laghachi, gịnị ka ha hụrụ n’ótú?
- Òlee otú ọlụ ha si gaa n’iru n’abalị ahụ?
- Gịnị ka Onye bịara ileta ha gwara ha ka ha mee?
- Òlee otú ha si mata na Onye bịara ileta ha bụ Jisọs?
- Kọọ akụkọ mkparịta ụka dị n’etiti Jisọs na Pita.
- Òlee otú Pọl si kwere na Jisọs?
- Òlee otú anyị si mata na ọ ga-abụ arụ-anyị, na ọ bụghị mmụọ-anyị, ka aga-eme ka o si n’ọnwụ bilie?