Luk 24:49-53; Matiu 28:16-20; Mak 16:15-20

Lesson 252 - Junior

Memory Verse
“Ya mere, gānu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ” (Matiu 28:19).
Notes

Nime Galili

N’iri ụbọchị anọ ahụ Jisọs nọ n’ụwa mgbe O bilite siworo site n’ílì, O mere ka ndị ná-esoụzọ Ya hụ Ya anya ọtụtụ ugbò. Anyị agụwo banyere ụfọdụ oge dị otú a. Iheọmụmụ anyị taa bụ banyere mkparịtaụka Jisọs na ndị ná-esoụzọ Ya kparịtara mgbe ha zutere na Galili dịka Jisọs si kwue.

Jisọs agwawo mmadụ irinaotù ahụ bụ ndị náesoụzọ Ya na Ya onwe-ya “gēburu unu uzọ” gaa na Galili mgbe O siworo ná ndị nwụrụanwụ bilie (Matiu 26:32). Mmụọozi ahụ nọ n’ílì ahụ ihe na-adịghị gwara ndịnyom ahụ ka ha chetara ndị náesoụzọYa na ha ga-ahụ Jisọs na Galili (Matiu 28:7). Tutu ndịnyom ahụ erue ebe ndị ná-esoụzọ Ya nọ, Jisọs ezutewo ha wee sị: “Unu atula egwu: jenu kọrọ umu-nnam ka ha je Galili, n’ebe ahu ka ha gāhukwam” (Matiu 28:10).

Mgbe ndị ná-esoụzọ Ya hụrụ Jisọs, ha kpọrọ isi ala nye Ya, ma ụfọdụ nwere obiabụọ. Ha enweghị okwukwe nke ga-eme ka ha kwere na nke a bụ otù Jisọs ahụ nke ha hụworo ebe akpọgidere Ya n’obe. Ọ bụghị Jisọs kwuru sị “Ọ gwuwo,” mgbe O rubere isi wee nwụọ? Ọ bụ na otù nime ndịagha amaghị Jisọs ube n’akụkụ ebe ọbara na mmiri si kwa gbapụta? Èlighi onyendú ha n’ílì nke Josef, n’ubiagbaraogige? Ụfọdụ nime ndị náesoụzọ Ya nwere obiabụọ na otù Jisọs ahụ guzoro n’etiti ha ugbu a.

Emere ka O si N’Ọnwụ Bilie

Ndị ná-esoụzọ Jisọs ahụwo Ya ebe O mere ka ndị ọzọ si n’ọnwụ bilie. Ha ahụwo Lazarọs (Jọn 11:43, 44) na nwa nwanyi ahụ onye Nain di-ya nwụrụanwụ (Luk 7:12-15) ebe Jisọs mere ka ha si n’ọnwụ bilie. Ha matara na nwa nwanyi Jeairọs nwụworo anwụ ma Jisọs mere ka o si n’ọnwụ bilie (Mak 5:35-42). Ọ bụ ezie na ha onwe-ha hụrụ ọlụebube niile ahụ, ụfọdụ jụrụ ikwenye na Jisọs n’Onwe-ya esiwo n’ílì bilie. Mbiliten’ọnwụ Jisọs dị ebube. Tutu oge ahụ maọbụ mgbe oge ahụ gasịrị ọ dịghị mgbe ihe dị otú ahụ mere; ma Jisọs, Ọkpara Chineke, si n’ílì pụta site n’ike nke-Ya na n’oge akàworo àkà.

Obiabụọ

Chineke emewo ka edepụtara anyị banyere obiabụọ Tomas. Mgbe ndị ọzọ náesoụzọ Jisọs gwara ya na ha ahụwo Jisọs, Tomas sịrị: “Ọ buru na ahughm n’aka-Ya abua apa ntú ahu, tiye kwa akam n’akuku-Ya, m’gagh-ekwe ma-ọli” (Jọn 20:25). Mgbe ọ hụrụ Jisọs, Jisọs gwara ya okwu, ọ dịghị kwa Tomas mkpà itinye aka-ya n’akụkụ Jisọs maọbụ itinye mkpịsịaka ya n’apà ntú dị n’aka Jisọs. Tomas kweere. Jisọs sịrị: “N’ihi na i huwom, i kwerewo? ngọzi nādiri ndi akāhugh, ma ha kwere.”

Ọ dị kwa ndị ọzọ nweworo obiabụọ, (Mak 16:11; Luk 24:11). Eleghịanya ha ekwughị okwu dịka Tomas si kwu, kama nime obi-ha o siiri ha ike ikwere akụkọ ahụ na Jisọs esiwo ná ndị nwụrụanwụ bilie.

Ịbámbá

Jisọs baara ndị ná-esoụzọ Ya mbá n’ihi ekweghịekwe na obietili ha. Ọ dịghị otù nime ihe ndịa nwere ọnọdụ n’obi na na ndụ ndị ná-esoụzọ Jisọs. Ọ dị mkpà na okwukwe ga-ewere ọnọdụ obiabụọ. Mmadụ aghaghị inwe okwukwe ka ewee zọpụta ya (Mak 16:16). Mmadụ aghaghị inwe okwukwe nke ga-eme ka ọ nọgide ná nzọpụta ahụ, n’ihi na onye eziomume ga-esite n’okwukwe dị ndụ (Habakuk 2:4; Ndi Hibru 10:38). Ma asị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe ana-apụghị ime, bụ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ (Ndi Hibru 11:6). Mmadụ aghaghị inwe okwukwe iji nata ọzịzá ekpere-ya (Mak 11:24; Matiu 21:22). Ndị kwere na Jisọs ga-enwe ndụ ebighịebi (Jọn 3:36; 6:47) ma ndị ná-ekweghị ekwe ga-enwe ahụhụ ebighịebi (Mak 16:16; Nkpughe 21:8).

Jisọs hụrụ ndị ná-esoụzọ Ya n’anya ma Ọ dọrọ ha akanántị na ekweghịekwe na obietili ga-eme ka ha ghara ịbụ ndị náesoụzọ Ya, ha agaghị enwe ike ịgbasa Oziọma, ha agaghị kwa enwe ike ịlụ ọlụebube n’aha Jisọs.

Ike nke Jisọs

Iji gbaa ndị ná-esoụzọ Ya ume na iji nyere okwukwe ha aka, Jisọs sịrị, “Ewerewo ike nile di n’elu-igwe na n’elu uwa nyem” (Matiu 28:18). Lee otú Kraist anyị na-efè si dị ike! Apụghị inwe ike ọzọ dị ukwuu karị ike nke dị n’Eluigwe na nke dị n’eluụwa. Jisọs nwere ike n’ebe ihe niile nke ụwa na ihe niile ana-ahụ anya dị, O nwekwara ike n’ebe ihe nke Eluigwe na ihe nke imemmụọ dị. Jisọs enyeghị Onwe-ya ike a; ike niile dị n’Eluigwe na n’eluụwa ka enyere Jisọs, Ọkpara Chineke.

Jisọs nwekwara ike, Ọ nọ n’ọnọdụ izipụ ndị náesoụzọ Ya. Jisọs bụ Onye-ndú-ha. Ọ bụ kwa Ọkpara Chineke. O nyere ndị náesoụzọ- Ya iwu ka ha gaa gbasaa Oziọma. Nke a bụ ọlụ ahụ enyere ha. Ọ bụ àtụmààtụ-Ya banyere ọlụ ha ga-alụ n’ọdịn’iru.

Ndụmọdụ

N’okwu olenaole Jisọs gwara ndị ná-esoụzọ Ya ihe ọlụ-ha gaje ịbụ. Jisọs sịrị, “Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm.” Mgbe ezipụworo ndị náesoụzọ Ya irinaabụọ n’oge ọzọ, agwara ha ka ha jee náánị n’etiti ndị Israel (Matiu 10:5, 6). Ma n’oge a, Jisọs nyere iwu ijé n’ụwa niile, na ijé kuziere mba niile. Ụwa niile bụ ebe ndị náesoụzọ Ya ga-alụ ọlụ -- ọ bụghị akụkụ ụwa ụfọdụ.

Ọ ga-abụworị ndị niile náeso Ya ka Jisọs nyere óké ijéozi a. Ọ ga-abụworị ihe ná-ekweghị omume nye ndị náesoụzọ Ya irinaotù ahụ náánị ịgbasa Oziọma n’ụwa niile, kama ndị náeso Kraist na-agbalị ime ya. Atụgharịwo Baịbụl na ụfọdụ n’ihe edere na Baịbụl n’asụsụ karịrị otù puku na otù narị (1,100). Apostolic Faith ebiwo akwụkwọ dị icheiche na mpempe akwụkwọ n’iri asụsụ ise wee zipụ ha n’ihe ra ka narị obodo abụọ (200) ná agweetiti.

Ikuzí Na Ikwusa

Ijé n’akụkụ ụwa niile ezughi. Jisọs sịrị ka ha zie ihe kwusaa kwa. Jisọs arapụrụghị ndị naesoụzọ Ya ịrọrọ ihe ha ga-akụzi. Ọ sịrị, “Nēzi ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M’nyere unu n’iwu.” Ha ga-ezí Oziọma -- ọbụghị ụfọdụ nime ya, kama ọbu ka ha ra bụ ihe Jisọs zíworo, Okwu Chineke niile.

Ndị Kwereekwe

Ọ bụghị mmadụ niile na-ekwere Oziọma Jisọs. Ndị ná-ekweghị ka “agāma … ikpe” ma ndị kweere ná-eme kwa -- ndị na-eme ná-anụ kwa Okwu ahụ -- ga-enwe nzụpụta.

Ọ bụ ọlụ na ohere dịrị ndị kwere ekwe ka awụọ ha mmiri nke mmiri. Aga-awụ ha mmiri “n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ.” Jisọs gosịrị ihenlereanya, nye kwa iwu banyere ịwụ mmiri nke mmiri. Jọn onyeọwụmmiri wụrụ Jisọs mmiri na mmiri Jọdan (Mak 1:9). Mgbe awụrụ Jisọs mmiri, “Mọ Nsọ dika nduru” fedakwasịrị Ya (Mak 1:10). Chineke si kwa n’Eluigwe kwue okwu: “Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma” (Matiu 3:17).

Ịwụ mmiri nke mmiri pụtara imikpu mmadụ nime mmiri. Akụkọ Baịbụl na-ekwu otú ụmụmmadụ si baa nime mmiri, pụta kwa (Mak 1:9, 10; Ọlu Ndi-ozi 8:38). N’akwụkwọ niile Pọl dere, eji ọwụwụmmiri nke mmiri tụnyere ilikọ mmadụ na Kraist na iso kwa Ya bilie n’ọnwụ (Ndi Kọlọsi 2:12).

Ọwụwụmmiri nke mmiri adịghị asachapụ mmadụ mmehie-ya. Ọ bụ iheiribaama pụtara ìhè nke ná-egosipụta ihe meworo nime obi. Ọwụwụmmiri nke mmiri dịrị náánị ndị azọpụtaworo. Ọ dịrị náánị ndị kwereekwe.(Gụọ Ọlu Ndi-ozi 2:41; 8:12; 18:8; 19:5). Ndị niile Ndịozi wụrụ mmiri bụ ndị kwereekwe. Filip chọrọ ịmata nkeọma na onozi ahụ bụ onye kwereekwe tutu Filip a wụọ ya mmiri. Mgbe ha na-aga nime ụgbọala ahụ, Filip ziri onozi ahụ Oziọma Jisọs. Onozi ahụ sịrị, “Le, miri; gini nānapu imem baptisim?” Filip wee sị ya “Ọ buru na i ji obi-gi dum we kwere, agēme gi” (Ọlu Ndi-ozi 8:36, 37). Mgbe onozi ahụ kwupụtara okwukwe ya na Jisọs bụ Ọkpara Chineke, Filip wụrụ ya mmiri. Ịwụ mmiri nime mmiri dịka o si dị na Baịbụl na-eweta ngọzi dị ukwuu. Site n’ịwụ mmiri dịka Jisọs nyere n’iwu, onye ahụ na-egosi na ya chọrọ ịbụ otù onye nime ndị náeso Jisọs.

Ike

Óké Ijéozi ahụ nke Jisọs nyere ndị náesoụzọ Ya bụ iwu, ihe ntụkwasịobi, na ọlụ ha ga-alụ. N’ijéozi a, O nyere ha iwu na ike ime ya. Jisọs gwara ha na Ya ga-ezite mkwà nke Nna, ka ha nọgide kwa na Jerusalem rue mgbe “agēwere ike nke si n’elu yikwasi unu” (Luk 24:49). Ike a ga-eme ka ha lụọọlụ ebube n’aha Jisọs.

Ọ dị iheịrịbaàmà ga-eso ndị ahụ kwereekwe. Iheịrịbaama ndịa nke Jisọs kwuru sokwara ndị náesoụzọ Ya. “N’aham ka ha gāchupu ndi-mọ ọjọ.” Pọl mere ka nwaagbọghọ ahụ nwere onwe-ya site n’aka mmụọ ọjọọ (Ọlu Ndi-ozi 16:18), Pita gwọkwara ndị ahụ mmụọ ná-adịghị ọcha na-emekpa arụ (Ọlu Ndi-ozi 5:16).

“Ha gēkwu okwu n’asusu ọhu di iche iche.” Emejuru ha na Mmụọ Nsọ, ha wee kwue okwu n’asụsụ ọzọ dị icheiche dịka Mmụọ ahụ na-enye ha ike ikwuwa okwu n’Ụbọchị Pentikọst (Ọlu Ndi-ozi 2:4), ndị kwereekwe n’oge ọzọ dị icheiche natakwara ụdị ịgbaàmà dị otú a mgbe eji Mmụọ Nsọ wụọ ha mmiri (Ọlu Ndi-ozi 10:46; 19:6).

“Ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike.” Onye ngwụrọ ahụ nọ n’ọnụụzọ ọma nke Ụlọukwuu Chineke ka agwọrọ mgbe Pita na Jọn jere ikpé ekpere, ka Pita sịrị: “N’aha Jisus Kraist Onye Nazaret, je ijè” (Ọlu Ndi-ozi 3:1-8). Agwọwo kwa ọtụtụ ndị ná-arịaọrịa mgbe ndị kwere ekwe kpere ekpere n’aha Jisọs.

“Ha gāchilite agwọ.” Ọ dịghị ihe ọjọọ mere Pọl mgbe ajụala kokwasịrị n’aka-ya ebe ọ na-achịkọta nkụ aga-atụba n’ọkụ (Ọlu Ndi-ozi 28:3-6). Pọl akpachapụghị anya kokwasị agwọ ahụ n’aka-ya wee na-atụkwasịobi na Chineke ga-emere ya ebere. Ọ bụ ihe mberede, ya mere Chineke napụtara Pọl.

“Ọ buru kwa na ha añua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gagh-emeru ha aru ma-ọli.” Ọ dịghị ebe edere na Baịbụl ebe onye kwereekwe ñụrụ “ihe ọ bula nēbute ọnwụ.” Anyị na-aghọta na ihe nke a pụtara bụ ma ọ bụrụ na añụrụ ya ná-amaghịama. N’arọ olenaole gara aga, akọwo ya n’akụkọ na Chineke napụtara ndị-Ya mgbe ha ñụrụ iheọñụñụ na-ebute ọnwụ ná-amaghịama.

Iheịrịbaàmà ndịa esowo ndị niile kwereekwe, ọbụná taa ana-ahụ ike Chineke n’etiti ndị kwere ka ha ra bụ Okwu Chineke niile. Ụbọchị ịlụ ọlụebube agabigabeghị. Ana-anapụta ụmụmmadụ pụọ n’ike ekwensu. Ana-eme ka mmehie si ná ndụ-ha pụọ, ana-agwọ kwa arụ ndị ná-arịaọrịa mgbe ekpere ekpere nke okwukwe n’aha Jisọs. Ị hụwo mgbe ọ bụla otù nime iheịrịbaàmà ndị ahụ Jisọs kwuru na ọ ga-eso ndị kwereekwe? Ọ dị onye ọ bụla ị maara agwọworo ọrịa site n’ike nke Chineke mgbe e tere ya mmanụ kpeekwara ya ekpere? (Gụọ Jemes 5:14, 15).

Inwe ike nke Chineke na iheịrịbaàmà niile ahụ iso ha bụ iwu na ọlụ enyere ha n’aka dịka ijé gbasaa Oziọma ahụ bụ kwa. Anyị niile apụghịịbụ ndị ná-agbasa Oziọma n’obodo dị anya, ma anyị pụrụ inye aka ịgbasa Ozioma. Aga-enwe kwa onye ga-agwa ndị obodo anyị.

Ịgbasa Oziọma

Ọ dị ihe nwatakịrị pụrụ ime? Nwatakịrị pụrụ imezu Iwu Ukwuu ahụ site n’ịgwa ndịagbataobi ya na ndị-enyi ya ka ha bịa ụkọ maọbụ n’Ụlọakwụkwọ Ụbọchịụkọ. Nwatakịrị azọpụtaworo pụrụ ịkọrọ ndị-enyi ya otú esi enweta nzọpụta. Nwatakịrị pụrụ ịbụ ihenlereanya nke onye kwereekwe, mee kwa ka ìhè-ya ná-enwu. Nwatakịrị pụrụ ikpere ndị ná-agbasa Oziọma n’obodo ya ekpere, na ndị nọ n’obodo ọzọ dị icheiche. Nwatakịrị pụrụ ikpé ekpere banyere akwụkwọ Oziọma ana-eziga n’akụkụ ụwa niile. Nwatakịrị pụrụ ime ihe karịrị ekpere; ọ pụkwara inye onyinye.

“N’ije n’ịnọ m’ga-ak’ịhụ-n’anya

Werem, Nna, lua ọlu”

Ànyị na-eme ihe niile anyị pụrụ ime iji jezue ozi Jisọs sịrị anyị jee? Ànyị na-erubeisi n’ihe Jisọs nyere n’iwu? Iji mee nke a, anyị aghaghị ịkpánso Jisọs mgbe niile. Ọ sịrị, “Unu apugh ime ihe ọ bula ma Mu anọgh ya” (Jọn 15:5). Jisọs ekwewo mkwà ịnọnyere ndị náeso Ya, ọbụná anyị onwe-anyị taa. Ndị náesoụzọ Ya irinaotù ahụ anọgideghị ndụ rue ọgwụgwụ ụwa. Ihe Jisọs kwuru pụtara na Ya ga-anọnyere ndị-Ya niile, n’obodo niile na n’ọgbọ niile, ọ bụrụ na ha ga-aña ntị n’Okwu-ya. Jisọs sịrị: “Le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere ndị náesoụzọ Jisọs ji jee Galili?
  2. Òlee otú ha si mara na Jisọs ga-ezute ha n’ebe ahụ?
  3. Gịnị mere Jisọs ji baara ndị náesoụzọ Ya mbá?
  4. Ihe ọjọọ dị añaa ka obiabụọ ga-eweta?
  5. Òlee otú ike Jisọs ra?
  6. Òlee ebe ndị náeso Jisọs ga-ekwusa Oziọma?
  7. Gịnị ka ha ga-ekwusa?
  8. Kọọ akụkọ banyere ọwụwụmmiri nke mmiri.
  9. Gịnị bụ iheịrịbaàmà ga-eso ndị kwereekwe?
  10. Ònye kweworo mkwà ịnọnyere ndị kwereekwe?