Ọlu Ndi-ozi 1:1-26

Lesson 253 - Junior

Memory Verse
“Mgbe ha nēle anya, ewe welie Ya elu; igwe-oji we nara Ya, Ọ pua n’anya-ha” (Ọlu Ndi-ozi 1:9).
Notes

Ọlu Ndịozi

Akwụkwọ anọ bu ụzọ na Testament Ọhụụ ka ana-akpọ Oziọma. Ha na-akọ akụkọ ụtọ nke nzọpụta. Ha na-akọ banyere Jisọs na ndụ-Ya. Nime oge Jisọs biri ndụ n’eluụwa nke a, Ọ rọpụtara ndị náesoụzọ Ya wee kuziere ha àtụmààtụ Ya banyere ibindụ nke onyeKraist. Jisọs kuziiri ha site n’iji ndụ nke Ya mee ihenlereanya. Jisọs akụzighị otù ihe, wee mee ihe ọzọ. Ọ kuziri ihe, mee kwa ihe ahụ O ziri, iji gosipụta na Okwu Ya bụ eziokwu. Ọ kuziiri ndị ná-esoụzọ-Ya site n’ịnọnyeere ha, na igosi ha otú esi abụ NdịKraist.

Jisọs kuziri ihe site n’ilu dị icheiche, n’ụzọ dị mfé na mmadụ niile na ụmụntakịrị pụrụ ịghọta. “Jisus we nējeghari na Galili dum nēzí ihe n’ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche n’etiti ndi ahu” (Matiu 4:23). Jisọs lụrụ ọtụtụ ọlụ ebube dị ukwuu, ná-egosipụta ike O nwere n’ebe ihe niile dị. “Ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi-ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n’ọnwu bilie, anēzì ndi-ogbeye ozi ọma” (Matiu 11:5).

Akwụkwọ nke ise nke Testament Ọhụụ ka ana-akpọ “Ọlu Ndi-ozi.” Ọ na-akọrọ anyị banyere ọlụ ndị náesoụzọ-Jisọs lụrụ ná nrubeisi ha ikuzí ihe niile Jisọs nyere n’iwu. Jisọs ziri ihe, Ya na ndị náesoụzọ-Ya lụkọkwara ọlụ, “rue ubọchi anara Ya n’elu.” N’ụbọchị ahụ ka Ọ rịgooro eluigwe. Nrigo n’Eluigwe Ya bụ ịrapụ ndị náeso ụzọ Ya wee baa n’Eluigwe, dịka Ọ gwara ha na Ya ga-eme. Jisọs sịrị, “Anamaga idoziri unu ebe … ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ” (Jọn 14:2, 3).

Mbiliten’ọnwụ

Mgbe Jisọs si n’ílì bilie n’ụtụtụ Ista mbụ, O mere Onwe-ya ka Ọ pụtaìhè nye ndị náesoụzọ Ya n’oge dị icheiche n’ihe ruru iri ụbọchị anọ. N’oge niile ahụ O gosipụtara na Ya biliri site n’ọnwụ. Ihe niile Jisọs mere mgbe O siri n’ọnwụ bilie gosịrị na Ọ dị ndụ. Ihe doroanya dị banyere mbiliten’ọnwụ Ya, Jisọs enyeghị kwa ndị náesoụzọ Ya ohere ime ndahie ọ bụla banyere ịdịndụ Ya.

Ndị ná-esoụzọ Ya matara na Jisọs dị ndụ n’ihi na Ọ pụtaraìhè gosi kwa ha Onwe-ya. Ọ bụghị otù ugbò, kama ọtụtụ ugbò! Ọ bụghị nye náánị otù onye, kama ọ bụ nye òtù dị icheiche nke ndị náesoụzọ Ya! (I Ndi Kọrint 15:5-7). Ha na Jisọs jekọrọ ijè, kwukọrịta kwa okwu (Luk 24:13-27). Ya na ha rikọrọ ihe (Luk 24:41-43). O gosịrị ha apá ntú dị Ya n’aka, na akụkụ Ya ebe amara Ya ube (Jọn 20:20). Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya banyere ọlụ ha ga-alụ n’ihi Alaeze Chineke (Luk 24:44-49; Matiu 28:16-20; Mak 16:14-18). Ihe ndịa niile na-egosi na Jisọs dị ndụ.

Onyenkasịobi Ahụ

Tutu akpọgbue Jisọs, Ọ gwawo ndị náesoụzọ Ya okwu banyere irapụ ha. Ọ kasiri ha obi site n’ịgwa ha na Ya ga-abịa ọzọ ịkpọrọ ha (Jọn 14:2-4). Jisọs sịrị na aga-ezitere ndị náesoụzọ Ya Onyenkasiobi, nke bụ Mmụọ Nsọ. Mgbe Jisọs rapụsịrị, ha agaghị-anọ náánị ha, n’ihi na Onyenkasiobi ahụ ga-anọnyere ha biri kwa nime ha (Jọn 14:16, 17, 26). Jisọs kwupụtara ụfọdụ nime ihe Onyenkasịobi ahụ ga-eme: kuziere ndị náesoụzọ Ya ihe (Jọn 14:26). Ọ ga-eduzi ha (Jọn 16:13), Ọ ga-agba àmà banyere Kraist (Jọn 15:26), Ọ ga-atụ kwa ụwa mmehie, na eziomume, na ikpé, n’anya (Jọn 16:8).

N’oge ọzọ, Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya ihe ọlụ-ha ga-abụ. Ha ga-ezi Oziọma n’ụwa niile. N’iheọmụmụ anyị nke gara-aga, anyị gụrụ banyere ijéozi a nke Jisọs nyere ndị náesoụzọ Ya. Ma tutu ha apụọ n’ụwa ikwusa, enyere ha iwu ịnara Onyenkasịobi ahụ, nke bụ mkwà nke Nna (Luk 24:49). Oge abịawo ugbu a na Jisọs ga-arapụ ha. O nyewo ndị náesoụzọ Ya ndụmọdụm na mkwà na Ya ga-anọnyere ha (Matiu 28:20).

Ugwu Olive

Ebe ikpeazụ Jisọs na ndị náesoụzọ Ya kwukọrịtara okwu bụ na Betani, n’ugwu Olive (Mak 11:1; Luk 19:29; 24:50). Ndị náesoụzọ Ya jụrụ Jisọs ma Ọ ga-enyeghachi Israel alaeze n’oge a. Chineke ekwewo ya ná mkwà na aga-eweghachi alaeze Ndi-Ju. “M’gēme kwa ka ndi-ikpe-gi laghachi dika na mbu, M’gēme kwa ka ndi nādu gi ọdu laghachi dika na nmalite” (Aisaia 1:26). “Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta), mgbe M’gēme ka Ihe-opupú nke nēme ezi omume biliere Devid, otù Eze gābu kwa eze, ọ gēnwe kwa uche, me ihe ekpere n’ikpe na ezi omume n’ala nka” (Jeremaia 23:5).

N’oge a, ha nọ n’okpuru ọchịchị ndị Rom. Agụụ ụbọchị ahụ mgbe aga-emezu mkwà a na-agụsi ha ike. Ndị náesoụzọ Ya lere anya ka Jisọs malite alaeze n’ụwa mgbe ahụ Ọ nọ n’eluụwa. Ha chere na Ọ ga-eweghachi alaeze ndị-Ju mgbe ahụ (Luk 24:21). Jisọs asịghị na Ya agaghị-abụ onye ná-achị mmadụ niile. Rue taa emezubeghị mkwà ahụ; ma, anyị onwe-anyị kwa, na-ele anya oge ahụ mgbe ọ ga-abụ na “ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya; Ọ gābu kwa eze rue mgbe nile ebigh-ebi (Nkpughe 11:15).

Ọ dịghị onye maara mgbe Jisọs ga-ewere ọnọdụ-Ya dịka “EZE kachasi NDI-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile” (Nkpughe 19:16). Náánị Chineke Nna maara mgbe oge ahụ ga-abụ. Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya, nke anyị onweanyị bụ kwa, na ọ bụghị ihe dịrị ha “ima oge ma-ọbu ubọchi.” Ha nwere ọlụ ha gaje ịlụ. Ọ bụ ihe dịrị ha ijikere maka nlaghachi nke Jisọs na ịgbasa Oziọma. Jisọs nyere ndị náesoụzọ Ya iwu ka ha chere “nkwa nke Nna-Ya” nke Ọ gwaworo ha okwu banyere Ya. Enyere ndị náesoụzọ Ya iwu ka ha ghara ịrapụ Jerusalem, n’ihi na ọ dị ngọzi dị ebube enwere inye ha. Jisọs gwara ha na ha ga-anata ọwụwụmmiri ọzọ na-abụghị nke Jọn Onyeọwụmmiri. N’ụbọchị olenaole ná-abịa aga-eji Mmụọ Nsọ wụọ ha mmiri.

Ọwụwụmmiri Nke Mmiri

Jọn Onyeọwụmmiri wụrụ ụmụmmadụ mmiri nke mmiri kwusaa kwa “baptism nchèghari inwe ngbaghara nmehie” (Mak 1:4). Mgbe ndị ahụ jekwuuru Jọn ka awụọ ha mmiri, ọ gwara ha na ha aghaghị-ibu ụzọ chègharịa, mgbe ahụ apụrụ ịwụ ha mmiri. Jọn sịrị, “Ya mere, mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu” (Matiu 3:8).

Ụfọdụ mmadụ na-echè ma Jọn Onyeọwụmmiri ọ bụ Kraist, Onye ahụ e tere mmanụ nke ekwere ná mkwà. Jọn abụghị Kraist. Jọn bụ onye ná-aga n’iru, onye na-edoziri Kraist ụzọ. Jọn gbara àmà banyere Kraist sị: “Mu onwem nēji miri me unu baptism n’ezie; ma Onye kam ike nābia, Onye m’nērugh itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism” (Luk 3:16).

Ndị Àmà

Ka e wee bụrụ onye ná-esoụzọ Kraist, mmadụ aghaghị iji obi-ya niile chègharịa dịka Jọn na Jisọs kuziri ya (Luk 13:3). Mgbe mmadụ chègharịrị, wee mara na agbagharawo mmehie ya, azọpụtawo ya. Mgbe ahụ o kwesịrị iji ndụ-ya chụara Onyenwe anyị àjà kpee kwa ekpere ka Chineke wepụ mkpọrọgwụ mmehie ná ndụ-ya ka e wee doo ya nsọ “N’ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ” (I Ndi Tesalọnaika 4:3). Jisọs hụrụ ahụhụ, wụsị kwa Ọbara-Ya ka e wee doo ndị-Ya nsọ -- sachapụ ha mmehie nke ekètara n’ekè (Ndi Hibru 13:12). Jisọs kpere ekpere ka edoo ndị náesoụzọ Ya nsọ. Ọ sịrị, “Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu” (Jọn 17:17).

Ka ndị ná-esoụzọ Jisọs wee nwee ike ịgbara Ya àmà nkeọma, enyere ha iwu ka ha nata ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Ha ga-anata ike nke ga-eme ha ndị-àmà, nwee kwa ike “kwusara ihe nile ekère èkè ozi ọma” dịka enyere ha n’iwu.

Mgbe ejiworo Mmụọ Nsọ nke ga-enye ha ike wụọ ha mmiri, ha ga-agbara Jisọs àmà. Ha ga-amalite na Jerusalem, ebe ha ga-anata mkwà nke Chineke. Site n’ebe ahụ ha ga-agba àmà n’ala niile dị gburugburu na Judia, na nime Sameria. Ọ bụghị náánị n’ala na n’obodo nke ha ka ha ga-agba àmà, kama ndị nke Chineke aghaghị ịgbasa Oziọma gbaa kwa àmà rue ebe niile ụwa sọtụrụ.

Irigo N’Eluigwe

Ka Jisọs na-agwa ndị ná-esoụzọ Ya okwu, O welie aka-Ya abụọ gọzie ha (Luk 24:50, 51). Ka Ọ na-eme nke a, Ọ malite ibili, ná-aga n’elu elu, baa n’igweojii. Ka ndị náesoụzọ Ya na-ele anya igweojii kpuchiri Jisọs -- ha ahụghị kwa Ya ọzọ. Jisọs arịgowo n’Eluigwe. Ọ bụghị ndị mmụọozi maọbụ ụgbọala wepụrụ Ya n’anya ha. O funarịghị ha mgbe ndị náesoụzọ Ya tụgharịrị azụ ha. Ha hụrụ Ya ka Ọ rịgoro n’eluigwe. Ebe ahụ ka Ọ na-anọdụ n’akanri nke Chineke Nna (Mak 16:19; I Pita 3:22) ebe ahụ kwa ka Jisọs nọ ná-arịọrọ mmadụ arịrịọ (Ndi Rom 8:34; Ndi Hibru 7:25).

Ka ndị ná-esoụzọ Ya na-elegide anya n’Eluigwe, ndịkom abụọ yiri uwe ọcha wee guzo ha nso. Ha jụrụ ndị ahụ náesoụzọ Ya: “Ndikom nke Galili, gini mere unu nēguzo nēle anya n’elu-igwe? Jisus nka, Onye anapuru n’ebe unu nọ rigo n’elu-igwe, gābia n’otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n’elu-igwe.” Ndị náesoụzọ Ya ghọtara na Jisọs alawo. Ugbu a ha nwere ọlụ ha gaje ịlụ n’ịgbasa Oziọma, ma ha chètara isoro ndụmọdụ niile nke Jisọs. Ha jere n’ụlọelu na Jerusalem. Ha nọgidere ebe ahụ n’otù olu na otù obi na n’ekpere. Ihe ra ka otù narị na iri mmadụ abụọ bụ ndị náeso Jisọs, tinyekwara nne-Ya na ụmụnne-Ya, zukọrọ ikpé ekpere.

Mataias

Pita mere ka ha ghọta na aghaghị ịrọpụta otù onye ga-anọchi ọnọdụ ahụ Judas rapụrụ, bụ onye raraworo Kraist nye. Judas abụworị otù onye nime ndị naesoụzọ Jisọs (Matiu 10:4; Luk 6:16). Ọ rapụrụ Kraist na ndị náesoụzọ Ya fọdụrụ. O mehiere site n’iré Kraist iri ọlaọcha atọ. Ma ọ tụpụrụ ego ahụ n’Ụlọukwuu, ná-asị, “emehierem n’irara ọbara Onye ikpe nāmagh nye” (Matiu 27:4). Ebe ọ bụ ihe megidere iwu nye ndịisinchụàjà itinye ego ọbara nime ebe ana-edebe ego onyinye, ha kwekọtara iji ya zụta ala. Akpọrọ ya “ubi ọkpu-ite,” ọ bụ kwa ebe ana-eli ndị-ọbịa. I weghachị ego ahụ ehichapụghị mmehie Judas, o weghachịghị kwa ya n’ọnọdụ ịbụ otù onye n’etiti ndị náesoụzọ Jisọs.

Mgbe ná-adịghị anya e mere ka onye ọzọ nọchie óké ọnọdụ nke ijéozi na ohere ahụ nke Judas rapụrụ mgbe ọ rapụrụ Kraist. Agụnyere Mataias n’etiti mmadụ irinaotù ahụ. Mataias na ndị ọzọ nọ mgbe niile ahụ Jisọs nọ n’etiti ha, site na mgbe ịwụ mmiri Jọn rue na mgbe Jisọs rigooro n’Eluigwe. Ndị ahụ náesoụzọ Ya kpere ekpere rịọ Onyenwe anyị ka Ọ rọpụta, nza ahụ wee ma Mataias. Mgbe emesịrị akpọrọ Pọl ịbụ Onye-ozi ahụ (Ndi Rom 1:1; Ndi Galetia 1:1).

Iche Nche Maka Nlaghachị Jisọs

Jisọs arapụwo ndị ná-esoụzọ Ya dịka O kwururị. Ha nọdụrụ n’ebe ahụ akàra àkà chere Onyenkasịobi. Ná arụghịụka, óké ọñụ ga-adịworị nime obi ha n’ihi na ha ga-ahụ Jisọs ọzọ. Jisọs sịrị: “Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M’gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ” (Jọn 14:3).

Agwaworị ndị ná-esoụzọ Ya ka ha ná-eche nche, ná-ekpe kwa ekpere n’ihi na ọ dịghị onye maara ụbọchị maọbụ oge hour ahụ mgbe Jisọs ga-abịa ọzọ (Matiu 25:13; Mak 13:32,33). Agwara ha ka ha lezie onwe ha anya ka ụbọchị ahụ Jisọs ga-abịa ghara ịbịakwasị ha na mberede (Luk 21:34-36). Jisọs sịrị, “Okwu M’nāgwa unu ka M’nāgwa madu nile, Nēchenu nche” (Mak 13:37). Gịnị ka “nēchenu nche” Pụtara? Otù onye ekwuwo sị “Iche nche pụtara ikwere na Ọ ga-abịa, ịhụ ọbịbịa Ya n’anya, iche échìchè mgbe niile banyere ọbịbịa-Ya, ịmata kwa na oge ahụ abịawo nso.” Ị na-eche nche? Ị jikerewo, ná-eche kwa nche maka ọbịbịa Jisọs? Nlaghachị Jisọs ga-abụ óké ọñụ nye ndị ná-eche nche, ọ ga-abụ kwa ụbọchị ọjọọ nye ndị niile ná-ejikereghị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ọlụ Jọn Onyeọwụmmiri?
  2. Gịnị ọzọ ka Jisọs mere ewezuga izí ihe?
  3. Òlee ihe-ngosi Jisọs nyere igosi na Ya dị ndụ mgbe O bilisịrị site n’ílì?
  4. Gịnị mere Jisọs eguzobereghị onwe-Ya alaeze nke ụwa n’oge a?
  5. Gịnị bụ ihe dị iche na ọwụwụmmiri nke mmiri na ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ?
  6. Gịnị bụ mkwà nke Nna?
  7. Òlee ebe na otú ndị náesoụzọ Jisọs si chere mkwà nke Nna?
  8. Kọọ banyere nrịgo n’Eluigwe nke Jisọs.
  9. Gịnị bụ okwu ndịkom abụọ ahụ yi uwe ọcha kwuru?
  10. Ònye ka arọpụtara iwere ọnọdụ Judas?