I Ndi-Eze 1:5-53; 2:1-12

Lesson 254 - Junior

Memory Verse
“Ma unu onwe-unu, dinu ike, ekwela ka aka-unu kuda: n’ihi na ugwọ-ọlu diri ọlu-unu” (2 Ihe Emere 15:7).
Notes

Nnupụisi

Devid achịwo Israel iri arọ anọ, ma ugbu a o mewo agadi arụ adịkwaghị ya ike. Esogbuwo ndụ-ya site n’aka ndịiro ná-emegide obodo-ya, ekworo Sọl, na site ná nnupụisi nke nwa-ya nwoke. Ọbụná ugbu a, na mgbe awa ikpeazụ ya, agaghịekwe kwa ka obi ya zuruike.

Adonaija, nwa-ya ọzọ chọrọ ịbụ eze; ọ gaghị-echere kwa ka Devid nwụọ tutu ọ gbalịa iwere ocheeze Israel. Ọ maara nkeọma na Chineke arọpụtawo Solomon ịbụ eze nke náeso; kama o doro anya na ọ bụ onye na-eme uche-ya mgbe ọ bụla mgbe ọ na-etolite, o wee chee na ọ ga-eme kwa otú ọ chọrọ ọbụná n’ihe nke a.

Ihe mere nwanne ya nwoke bụ Absalom mgbe ọ ghọrọ onye óké ọchịchọ isi n’ocheeze chụpụ nna-ya, ga-abụworị ihe kwesịrị ịdọ Adonaija akanántị. Egburu Absalom tutu edozie mkpali ahụ; ọ dịghị mgbe ọ bụla o nwere ọñụ na nsọpụrụ na ebube nke ịbụ eze nke ọ gbalịsiriike inweta. Mmadụ apụghị ịkpacharaanya wezuga ihe niile Chineke nyere n’iwu na ihe bụ uche Chineke ná-enwetaghị ahụhụ n’ihi ya. Chineke n’Onwe-ya bụ Onye nyere Devid ocheeze ahụ, Chineke agaghị kwa ekwe ka Absalom onye ná-enupụisi napụ ya n’aka-ya. Otú a kwa ka Adonaija na-agaghị enwe ọgan’iru n’ịgbalịsiike ịbụ onye amaara aha-ya na onye dị ike.

Adonaija bụ nwa eze ahụ dị n’okorọbịa, makwara mma nwere ntụkwasịobi na ya pụrụ inweta obi ndị ahụ nye onwe-ya eleghịanya ọ dịghị onye ọ bụla sịworo ya É-è, eleghị kwa anya ọ dịghị mgbe ọ batara nime obi-ya na ọ gaghị enweta ihe ọ chọrọ n’oge a. Ọ tụrụ àtụmààtụ-ya nkeọma -- ọ bụ gịnị ga-eme ka ọ ghara inweta ọgan’iru?

Udéaha Nke Adonaija

Adonaija mere dịka Absalom meworo: O ji ụgbọala jègharịa n’okporoụzọ niile nke obodo, ya na iri ndịkom ise (50) ndị náagba ọsọ n’iru-ya ná-eme ka mmadụ niile hụta nwaokorọbịa ahụ nke gaje ịbụ eze na mgbe ná-adịghị anya. Lee otú nwaeze a si maa mma, o yi uwe niile nke ndị bụ eze, ná-eguzo ezi ọtọ n’ụgbọala-ya mgbe ọ na-eme ka ịnyịnya ya niile dị ike ná-agabiga ìgwè mmadụ ahụ, bụ ndị zukọworo iji iti mkpu ná-eto ya!

Adonaija edoziworị óké oriri nke ọ gwara ụmụeze ndị ọzọ, ndịnchụàjà, ọbụná onyeisi ọchịagha nke ndịagha Devid ka ha bịa. Ọ na-achọ inweta iruọma nke onye ọ bụla pụrụ inyere ya aka ịrịgo n’ocheeze. Ma Solomon, nwaeze nke ga-abụ eze n’ezie, na Netan onyeamụma na Zedok onyeisinchuàjà, ka ana-akpọghị. Adonaija maara na ha ga-anọ n’ikwesị ntụkwasịobi nye Devid.

N’ebe ahụ, n’etiti oriri na ọñụñụ kwa emere Adonaija eze Israel. Ndị ahụ na-eti mkpu sị, “Ka eze, bú Adonaija, di ndu.” Otú a ka Adonaija si mesoo nna-ya meworo agadị nke arụ ná-adịghị ike -- izunarị ya ocheeze.

Ọ bụ ezie na Adonaija maara ihe Chineke nyere n’iwu, “Sọpuru nna-gi na nne-gi” (Ọpupu 20:12). Karịa nke ahụ, Iwu ndị Livai kwuru na aga-eji nkume tụgbue nwa na-enupuisi (Deuteronomi 21:18), na ụmụ ndị ná-akọcha ndị mụrụ ha ka aga-eme ka ha nwụọ (Levitikọs 20:9). Lee ụdị ahụhụ Adonaija maara na ya pụrụ ịhụ site n’isi n’ocheeze chụpụ nna-ya.

Ewetaara Eze Akụkọ

N’oge a niile mgbe Adonaija na-eme onwe-ya eze, arụ adịghị Devid ike n’ihe ndina-ya. Ọ nụghị ihe ọ bụla banyere nnupụisi ahụ. Solomon na nne-ya bụ Bat-sheba maara na ọ bụrụ na Adonaija pụrụ ịnọsi ike dịka eze, na ọ ga-ebibi ha. Ọ bụghị Devid kweworo mkwà na ọ bụ Solomon ga-abụ eze?

Netan nyere Bat-sheba ndụmọdụ ka o jee kọọrọ Devid ajọ akụkọ a. Netan sị na ya ga-abịa kwa, wee mee ka okwu-ya guzosieike ka Devid wee hụ otú ọnọdụ ahụ si bụrụ ihe dị njọ nke ukwuu. Bat-sheba bara n’imeụlọ eze, wee kpọọ isi ala nye ya. Devid hụrụ na obi adịghị ya mma, wee jụọ ihe ọ chọrọ ka ya meere ya. O wee zaa sị “Onye-nwem, gị onwe-gi were JEHOVA, bú Chineke-gi, ñuara orù-gi nwayi iyi, si, N’ezie Solomon nwa-gi gābu eze mgbe m’nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n’oche-ezem. Ma ugbu a, le, Adonaija aghọwo eze.” Lee otú ọ ga-atụworị Devid n’anya! Na otú ọ ga-ewutewo kwa ya-rị na nwa-ya nwoke ọ hụrụ n’anya nke-ukwuu ga-eme ya ihe dị otú a! Ọbụná ndị nne na nna ná-asọpụrụ Chineke ga-ahụ ahụhụ n’ihi na ha emeghị ka ụmụ-ha rubere ha isi.

Bat-sheba wee gaa n’iru ịkọrọ Devid na Adonaija achịkọtawo ndịkom bụ dike na ndị nwere ike n’ebe ndị ọzọ nọ nye onwe-ya, bụ ndị ga-enyere ya aka, ma ọ kpọghị nwa-ya nwoke bụ Solomon ka ọ bịa n’óké oriri ahụ. Ma ugbu a Israel niile na-ele anya ịhụ ihe Devid ga-eme. Ọ ga-adị ya mma ịrapụ nwa-ya nwoke ana-azụghị nkeọma ịnọgide n’ocheeze? Ka ọ ga-edebe ihe o kweworo ná mkwà ma mezue kwa uche Chineke?

Netan na-anọ eze nso mgbe ọ bụla, ná-ewetakwara ya ozi site n’ebe Chineke nọ. Ọ jụrụ ajụjụ ugbu a sị: “Ọ gābu na ihe a sitere n’aka onye-nwem, bú eze, ma i megh ka ndi-orù-gi mara onye gānọkwasi n’oche-eze onye-nwem bú eze, mgbe ọ nwusiri?”

É-è, nke a abụghị ihe Devid meworo. Ọ kpọrọ Bat-sheba wee kwee kwa mkwà o kweworo na mbụ, na ọ bụ Solomon ga-abụ eze n’ezie.

Ebuliri Solomon

Devid hụtara na ya aghaghị ime ihe ngwangwa idebe Solomon n’ọnọdụ ya. O wee sị ka Zedok bụ onyenchụájá, na Netan, mmadụ abụọ ndị Chineke nyere nsọpụrụ na ndị Israel niile na-asọpụrụ mee ka Solomon nọkwasị n’elu ịnyịnya mule Devid wee duru ya jègharịa n’okporoụzọ niile ka mmadụ niile hụ onye Devid rọpụtara ịbụ eze. Ndịeze mgbe ochie na-anọkwasị n’ịnyịnya mule, nke adịghị eleda anya na ọ bụ anụmanụ ná-enweghị ùgwù dịka anyị si eche na ọ bụ ugbu a. Ịbụ ọgaranya ndịeze ka ana-amata site n’ịnyịnya mule ole ha nwere.

Ebube Solomon amalitewo. Ndịnche Devid -- Ndị Pelet na ndị Keret -- na Zedok onye nchụàjà na Netan onyeamụma, na Solomon n’iru ha, n’usoro dị mma ileanya na-eje n’okporo ụzọ niile. Ndịkom Israel niile bụ ndị hụrụ Chineke na eze-ha n’anya, ndị nụrụ ihe a emeworo, soro n’azụ usoro ahụ.

Mgbe usoro ahụ ruru Gaihon, Zedok weere mpi mmanụ eji eté mmanụ wee wụkwasị Solomon mmanụ ahụ, wee mee ya eze. E wee ná-afụ opi-ike nke eji ekwusa eze ọhụụ: “Ka eze, bú Solomon, di ndu.”

Ìgwè mmadụ ahụ wee ná-adị ukwuu karị. Ebe niile ndị ahụ nụrụ ezi akụkọ ọchịchị eze ahụ, ha na-eji ọñụ ná-abịaru. Ala n’onwe-ya na-ama jijiji n’ihi óké iti mkpu ọñụ.

Emezuru Uche Chineke

Ọzọ kwa emewo ihe bụ uche Chineke. Étewo Solomon mmanụ ịbụeze dịka Chineke nyeworo n’iwu. Ikwesị ntụkwasịobi Devid n’ebe Jehova nọ emewo ka emezue uche Chineke nye Solomon.

Ekpere ekpere ka ọchịchị Solomon dị ukwuu ọbụná karị nke nna-ya. Otú a ka ọ ga-esi dị, n’ihi na ọ ga-abụ oge udo na óké àkụ na ụba.

Ọ bụworị ọlụ dịrị Devid imeri mba niile gbara Jerusalem gburugburu ka Israel wee nwee ike ibi n’ala ahụ niile E kwere ná Mkwà. N’ihi nke a agha na-adị mgbe ọ bụla n’ọchịchị iriarọanọ Devid chịrị. Ugbu a alụsịwo ọlụ ahụ, Solomon pụrụ ịchị n’udo nwee kwa ọñụ na ngọzi niile nke obodo ukwuu ahụ.

Akụkọ banyere ikpube Solomon okpueze ka ebugaara Devid n’imeụlọ ọrịa ya. Lee otú obi Devid ga-ejupụtaworị n’ọñụ na edoziwo ihe niile n’udo, na ọ dịghị onye ọ bụla nwụrụ n’ụbọchị ezi akụkọ a!

Egwù Adonaija Tụrụ

Adonaija na ndị niile ya na ha nọ anụwo na emewo Solomon eze ha wee tụọ egwù banyere ndụ ha. Ha maara na ikpé nke nnụpụisi mara ha, na ọ burụ na Solomon chọrọ na ọ pụrụ ime ka Adonaija nwụọ.

Adonaija gbagara n’ebe ịchụàjà ikpé ekpere ka ya ghara ịnwụ. Ọ dị ka ọtụtụ ndị mmehie ọ na-ewute na mmehie-ha ewetaworo ha nsogbu, ma ha adịghị echègharị. Ha chọrọ ịgbanarị ahụhụ, ya mere na ha na-ekpe ekpere; ma ha adịghị edebe mkwà ha kwere Chineke.

Adọnaija kwesịrị ịhụ ahụhụ n’ihi ịnụpụrụ Chineke isi na ime nna-ya ihe ihere, ma Chineke nwere obi ebere. Solomon zigaara ya ozi na ọ dịghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya ma ọ bụrụ na ọ ga-edo onwe-ya n’okpuru eze ọhụụ ahụ. Adonaija bịara ịhụ Solomon wee kpọọ isi ala n’iru ya wee kwee mkwà irubere ya isi. Solomon gbaghaara ya wee zilaga ya.

Okwu Ikpeazụ Niile nke Devid

Emewo ka alaeze Israel guzosie ike n’aka Solomon ugbu a, Devid wee chee na ya nwere ike ịnwụ n’udo. Emewo uche Chineke, nke a juru Devid afọ. Lee ụdị ojujuafọ ọ na-ewetara nwa Chineke imata na ụzọ-ya niile dị mma n’anya Chineke!

Ọ ga-adị Solomon ka ọ bụ náánị ya nọ mgbe nna-ya nwụsịrị, ọ ga-egosi na ya onwe-ya bụ nwoke. Devid gwara Solomon otú ọ ga-esi bụrụ onye dị ike: “Debe kwa ihe-ndebe nke JEHOVA, bú Chineke-gi, ije n’uzọ-Ya nile, idebe ukpuru-Ya nile, na ihe nile Ọ nyere n’iwu, na ikpe-ya nile, na ihe-àmà-Ya nile, dika ihe edere n’iwu Moses si di, ka i we nwe uche n’ihe ọ bula nke i nēme, na n’ebe ọ bula i nēche iru-gi.”

Anyị nwere ike ịmụta ihe site n’iheọmụmụ ahụ. Ọ bụrụ na anyị edebe ihe niile Chineke nyere n’iwu, anyị onwe-anyị ga-adị kwa ike nime Onyenwe anyị. Anyị chọrọ Mmụọ-Ya n’ọlụ anyị ka e wee ritara Alaeze Chineke mkpụrụobi n’urù. Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ọgan’iru dịka onye ná-atụkwasị Chineke obi. Ọ pụrụ ịbụ na o nweghị àkù na uba na óké aha n’ụwa nke a, ma o nwere ndụ ebighịebi nke dị ukwuu karị ihe ọ bụla nke anyị pụrụ irita n’urù n’ebe a. Ijummiri maọbụ enweghị mmiri òzùzò pụrụ ibibi ihe mmadụ kụrụ n’ubi, ọkụ pụrụ ire ụlọ-ya, ndịori pụrụ izuru ego-ya; ma onye ahụ nke ná-atụkwasịobi na Chineke nwere àkù n’Eluigwe nke onye ọ bụla ná-apụghị ịnapụ ya. Àkù kachasị ihe niile ga-abụ ùkwùọka niile anyị wetara idebe n’ụkwụ Onyenzọpụta.

Devid chetaara Solomon mkwà Chineke kweworo ya: “Ọ buru na umu-gi elezie uzọ-ha anya, ijeghari n’irum n’ezi-okwu n’obi-ha nile na na nkpuru-obi-ha nile, agagh-ebipu n’ulo-gi onye nwe ọnọdụ n’oche-eze Israel, ka O kwuru” (I Ndi-Eze 2:4). Lee ụdị mkwà dị ebube nke a bụ! na apụrụ imezu ya ná ndụ Solomon ma ọ bụrụ na ọ ñaa ntị n’olu Jehova.

Ụgwọ Dịrị Ọlụ

Devid kwukwara banyere ihe niile ọzọ nke Solomon ga-eme dịka eze. Aga-eji obiọma mesoo ụmụ Bazilai n’ihi na ha meere Devid ezi ihe n’oge nnupuisi Absalom. Aga-akwụ ha ụgwọọlụ n’ihi inyeaka ha nyeere eze. Ihe ọjọọ niile ndị ọzọ mere ka aga-echeta kwa, nye kwa ha ahụhụ.

Ka anyị cheta na ihe ọ bụla anyị mere ka aga-eweta n’ikpé, nye kwa ya ụgwọ dịrị ya -- ma ọ dị mma ma ọ dị njọ. Ndị eziomume ga-aba ná ndụ ebighịebi, ma ndị ná-emebiiwu ga-ahụ óké ahụhụ rue mgbe niile ebighịebi.

Ọchịchị Solomon ahụ dị ebube amalitewo, ọ ga-adịgide kwa rue ihe dịka iriarọanọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ọchịchọ Adonaija?
  2. Gini mere o ji dị njọ?
  3. Òlee ndị Adonaija kpọrọ n’oriri ya? Òlee ndị ọ na-akpọghị?
  4. Gịnị mere n’oriri ahụ?
  5. Gịnị ka Devid mere mgbe ọ nụrụ banyere ya?
  6. Gịnị mere o ji dị Devid mkpà na Solomon ga-abụ eze ná-esote?
  7. Gịnị ka Adonaija mere mgbe ọ nụrụ na emewo Solomon eze?
  8. Gịnị bụwororị ọlụ Devid dịka eze?
  9. Ọchịchị dị añaa ka nke Solomon ga-abụ?
  10. Òlee otú Solomon ga-esi dị ike gosi kwa na ya bụ nwoke?