I Ndi-Eze 3:5-15; 4:21-34

Lesson 255 - Junior

Memory Verse
“Me ka obi-gi ba n’idọ-aka-na-nti, me kwa ka nti-gi abua ba n’okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma” (Ilu 23:12).
Notes

Nwetazu nke Palestain Niile

Óké ibu-arọ dịkwasị Solomon mgbe ọ ghọrọ eze. Ala ọ ga-achị dị ukwuu karị ka Israel chịworo na mbụ. Nna ya bụ Devid emeriwo ọtụtụ mba ndị gbara ha gburugburu, o wee bụrụ mbụ Israel na-achị ala niile nke Chineke kweworo Abraham na ụmụ-ya ná mkwà narị arọ iteghete gara-aga.

Gịnị ka Solomon pụrụ ime n’óké obodo dị ukwuu otú a? Ọ gbara náánị arọ irinaiteghete maọbụ iriarọabụọ, amamihe dị kwa ya mkpà iji wee kpee óké ìgwè mmadụ dị otú a ikpé. Solomon esiwo n’ọchịchị nna-ya mụta na mgbe Israel gbasoro iwu Chineke, ha ga-aga n’iru; Solomon chọkwara ka obodo ya nwee ọgan’iru mgbe ọ na-achị. O wee kpebie n’obi-ya na ya ga-agbaso ihe niile Chineke nyere n’iwu, iji wetara ala ahụ iruọma Chineke. Chineke nyere ya úgwú, mgbe emesịrị Solomon pụrụ ide sị: “Ezi omume nēbuli mba: ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu” (Ilu 14:34).

Òfùfè N’Ebe Dị Elu

Na mgbe ahụ Solomon ghọrọ eze, Igbé Ọgbugbandụ dị na Jerusalem, ma Ụlọikwu ka dị na Gibeon. Ọ dịghị ụlọ ukwuu Chineke alụworo, ọ dịghị kwa ebe ana-ezukọta ifè òfùfè. Ewuwo ebeịchụàjà dị icheiche na ebe dị elu dị icheiche iji fee Chineke òfùfè, kama ha yiri ebeịchụàjà nke ndị na-amaghị Chineke, egwù dị bụ na obi ndị Israel pụrụ ichigharịkwuru arụsị. Ọlụ ukwuu dịrị Solomon bụ iwu Ụlọukwuu Chineke na Jerusalem, ka ndị Israel niile wee nwee ike ifè òfùfè n’otù ebe, n’ịdịn’otù nke okwukwe. Ọlụ a ga-ewere ọtụtụ nime arọ niile nke ọchịchị-ya.

Ịdịmkpà nke Inyeaka Chineke

Solomon matara mkpà inyeaka Chineke dị ya iji chịa mba ukwuu ahụ, o wee jee n’Ụlọikwu dị na Gibeon ikpe ekpere. Obi ya ziri ezi n’iru Chineke, nke mere na Chineke pụrụ ịkpanyere ya ụkà.

N’abalị ahụ Chineke mere ka ọ hụ Ya anya ná nrọ, wee jụọ ihe Solomon chọrọ ka enye ya site n’eluigwe. Solomon matara na Chineke ga-aza ekpere ya niile, n’ihi na Onye dere Abù Ọma ò deghị sị, “Ọ gagh-egbochi ezi ihe n’ebe ndi nējéghari n’izu-okè nọ” (Abù Ọma 84:11)? Nna-ya n’onwe-ya ekwuwo sị, “Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi: N’ihi na ọdi-n’iru diri onye-udo” (Abù Ọma 37:37). Solomon chọrọ udo, ọ matakwara na Chineke ga-enye ya udo ahụ.

Solomon gwara Chineke okwu banyere óké ngọzi niile nke bịakwasịworo Devid, nke kachasị bụ na Solomon bụ eze ugbu a. Chineke ekwewo mkwà na ocheeze Devid ka aga-eme ka o guzosie ike rue ebighịebi, Solomon amalitewo mmezu mkwà ahụ. Chineke agwawo kwa Devid ọtụtụ ihe banyere Solomon: “onye ahụ gēwuru aham ulo, M’gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mgbe ebigh-ebi Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa … ma eberem agagh-esi n’ebe ọ nọ wezuga onwe-ya, dika M’wezugara ya n’ebe Sọl nọ, onye M’wezugara n’iru gi. Ma ulo-gi na ala-eze-gi gēkwesi ntukwasi-obi n’iru gi rue mgbe ebigh-ebi” (2 Samuel 7:13-16). N’abalị a Solomon ji obi-ya ná-achụàjà, ịgan’iru na ikwe ka Chineke site na ya lụọ ọlụ iji mee ka alaeze Ya gaa n’iru.

A na-agọzi ndị nne na nna mgbe ha jiri ụmụ-ha chụara Chineke àjà. Ma chee ụdị ngọzi nke ná-abịakute ụmụntakịrị ndị ga-aga n’iru dịka ịchụàjà ahụ si dị wee were ndụ-ha niile tinye n’ime uche Onyenwe anyị! Ngọzi ana-apụghị ịgụta ọnụ dịrị ụmụntakịrị ga-ewere ihe niile ha nwere tinye n’ijere Jisọs ozi. Chineke gaje ịsọpụrụ iji ndụ chụaàjà nke Solomon site n’inye ya ngọzi dị ukwuu karị ọbụná dịka Devid nweworo.

Dịka Kpakpando nke Eluigwe

Chineke ekwewo Abraham mkwà na mkpụrụ-ya ga-adị ka kpakpando nke Eluigwe n’ọnụọgụgụ. Ọ dị Solomon ka oge ahụ abịawo ugbu a. Ebo niile nke Israel abawo ụba rue na ìgwè mmadụ bi n’akụkụ niile nke ala Nsọ ahụ; dịka o si dị Solomon, nime adịghịike-ya, ọ dị ka ọ bụ na apụghị ịgụta ha ọnụ. Òlee otú ọ ga-esi due ìgwè mmadụ ndịa? Ọ chọrọ ka ha hụ Jehova n’anya; ọ chọkwara ka ha nwee ọñụ, nwee kwa ọgan’iru n’ala ahụ. Ihe banyere ọdịmma nke ndị-ya bụrụ ya óké ibuarọ karị ihe ọ bụla banyere ọdịmma nke onwe-ya.

Ọ maara na nsogbu ga-adị n’etiti ndị ahụ, nke ya onwe-ya ga-edozi. O lere onwe-ya anya dịka náánị nwantakịrị; òlee otú ọ ga-esi gwa ndịokenye okwu wee gwa ha ihe dị mma na ihe ná-adịghị mma. Náánị Chineke pụrụ inyere ya aka ime mkpebi niile. Jemes Onyeozi dere sị: “Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n’aka Chineke, Onye nēnye madu nile n’afọ-ofufọ, nātagh kwa uta; agēwere kwa ya nye ya” (Jemes 1:5).

Nke a bụ ihe Solomon kweere, o wee rịọ sị: “Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n’ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ ikpe?”

Ekpere ahụ dị Chineke ezi mma. Obi dị ya mma na Solomon amaghị náánị onwe-ya. N’ihi arịrịọ a nke amaghị náánị onwe-ya, Chineke gaje kwa inye ya àkụ na ụba na óké aha, nke bụ ihe ọ na-arịọghị.

Otù Ọchịchọ

Ọ bụrụ na aga-asị gị kwue ihe ị chọrọ, gịnị ka ị ga-arịọ? Ị ga-achọ inwe àkụnaụba? Ọ bụrụ na i nweta ya, ego agaghị eme ka i nwee ọñụ. Ọ pụrụ ịdị gị mma iji ya na-azụta ihe nwa oge, kama ọ bụrụ na i jighị ya meere Onyenwe anyị ihe, ọ ga-eweta iruuju mgbe ná-adịghị anya. Maọbụ ọ bụrụ na ị chọrọ óké aha o wee bụrụ na onye ọ bụla gụrụ aha-gị n’akwụkwọ maara ụdị ọlụ dị mkpà ị lụworo, òlee ihe dị mma nke a gaje ime gị ma ọ bụrụ na i guzo n’iru Chineke wee nụ ka Ọ sịrị, “Amataghm unu?” Ịbụ nwa Chineke bụ ihe kachasị mkpà n’ụwa. “Onye-nwe-ayi mara ndi bu nke Ya” (2 Timọti 2:19).

Eze Nwekarịsịrị Amamihe

Solomon rịọrọ amamihe, Chineke wee nye ya. Ọgan’iru nke alaeze ya ga-adị ukwuu rue na “ọ digh nwoke ọ bụla n’etiti ndi-eze gādi ka gi ubọchi-gi nile.” Tulee ihe nke a bụ! Ọ ga-enwekarịsị na amamihe, n’àkụnaụba, bụrụ kwa eze nwekarịsịrị ike n’ụwa niile. Ọ bụrụ kwa na ọ nọgide n’ezi ụzọ nke ọ rọpụtaworo, ọ ga-adị ndụ rue ọtụtụ arọ n’eluụwa.

Nke a bụ nrọ, kama ọ karịrị nrọ efu. Ọtụtụ ugbò ka Chineke siteworo ná nrọ zie ụmụmmadụ ozi-Ya n’oge ochie. Ihe niile Solomon gwara Chineke ná nrọ ahụ bụ ihe si ya n’obi pụta. Ihe mbụ o mere mgbe nke a gasịrị bụ ijé na Jerusalem ịkpọ isiala n’iru Igbé Ọgbụgbandụ, na ịchụrụ Chineke àjà otuto n’ihi ngọzi niile ọ na-anata.

Chineke gwara ndịamụma okwu n’oge ochie site ná nrọ na site n’ọhụ, ma anyị onwe-anyị ka O nyeworo Baịbụl. Anyị pụrụ ịmata uche Chineke site n’ịgụ Okwu Ya. Ọ gaghị agbanwe Okwu-Ya. Chineke pụrụ ịgwa mmadụ okwu site ná nrọ; ma ya na ihe Baịbụl kwuru ga-ekwekọrịta. Chineke agaghị enye onye ọ bụla nrọ ná-adịghị dịka ihe O deworo si dị. Nime Baịbụl anyị ga-achọta ndụmọdụ niile dị mkpà iji bie ndụ anyị kwa ụbọchị, na otú anyị ga-esi jikere ijeru eluigwe.

Udé

Solomon wee bụrụ onye amaara aha-ya nkeọma n’obodo niile nke ụwa amatara mgbe ahụ. Ndị ukwu na ndịeze wetaara Solomon onyinye. •dà na ihe niile ọzọ dị óké ọnụahịa nke ná-adịghị na Palestain ka esi n’obodo niile ọzọ weta; ewetakwaara Solomon ọlaedo na nkume dị icheiche dị óké ọnụahịa n’uju, rue mgbe alaeze-ya ghọrọ nke nwekarịsịrị akụ n’ụwa. Otú a ka Chineke si mee ka Solomon baa ụbà.

Mmadụ niile ketara òkè n’ịba ụbà ahụ kwa. Ọ dịghị agha enwere n’ihi nke a ụmụokorọbịa niile pụrụ ịnọ n’ụlọ na n’èzínaụlọ-ha. Ha nwere ubi ná-emeta nri nkeọma nke mere na ọ dịghị onye agụụ gụrụ.

Solomon n’onwe-ya nwebigakwara ihe òkè. O nwere iri puku ịnyịnya anọ na ụlọ ewuuru ha niile. Ndịorù na ndịagha bi n’ụlọ ukwuu eze dị ukwuu rue na ana-eji iri ehi atọ mara abụba, narị atụrụ, na ọtụtụ anụmanụ niile ọzọ na ọkụkụ dị icheiche iji rie nri ụbọchị ọ bụla.

Amamihe

Ọ dịghị onye ọ bụla maara ihe dịka Solomon n’oge nke ya. O dere ọtụtụ akwụkwọ ka ndị ọzọ rite urù site n’amamihe ya. O dere puku ilu atọ, ọtụtụ nime ha dị na Baibụl n’Akwụkwọ Ilu; o dekwara otù puku abụ na abù ise. O dekwara akwụkwọ banyere ihe ekère èkè -- banyere azụ dị na mmiri, ụmụarụrụ, na anụmanụ dị n’óké ọhịa na n’ubi; na osisi dị icheiche na osisi vine dị icheiche. Ihe ndịa niile bụ ọlụaka Chineke, ọ na-atọ kwa Solomon ụtọ ịtụgharị uche n’ihe niile Chineke kère.

Ndị ọchịchị niile nke ụwa zigaara Solomon mmadụ ijé mụta ihe site n’amamihe-ya -- amamihe Chineke nyere. Daniel dere: “Ndi ahu ndi nwere uche ganēnwu ọcha dika onwunwu-ọcha nke mbara-ígwé” (Daniel 12:3). Amamihe Chineke nyere solomon nwupụrụ rue ụwa niile. Mgbe Solomon na-esogide Chineke rube kwa isi n’ihe niile O nyere n’iwu, ebube na ịdị ukwuu-ya na-adịgide.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú ịdịukwuu Israel ra mgbe Solomon chịrị?
  2. Ònye ka Chineke kweworo ala ahụ ná mkwà na mbụ?
  3. Ihe dịka arọ òle ka Solomon dị mgbe ọ malitere ịchị ọchịchị?
  4. Mmadụ òle ka o chere nọ n’ala Israel?
  5. Òlee otú o si nweta amamihe iji chịa ha?
  6. Òlee ebe Solomon nọ rọọ nrọ-ya ahụ dị ebube?
  7. Gịnị ka Solomon rịọrọ mgbe Chineke sị ka o kwue ihe Ya ga-emere ya?
  8. Gịnị ka Chineke nyere Solomon?
  9. Kọwaa amamihe Solomon site n’ihe ụfọdụ o mere.
  10. Òlee ụdị amamihe kachasị mma?