Abù Ọma 100:1-5; 150:1-6; Ndi Hibru 10:23-25

Lesson 256 - Junior

Memory Verse
“JEHOVA bu eze; ka uwa tegharia egwu ọñu; Ka ala bara uba nke di oké osimiri gburugburu ñuria” (Abù Ọma 97:1).
Notes

Nzọpụta Jupụtara n’ọñụ

Obi jupụtara n’ọñụ so n’óké nzọpụta Chineke. Mgbe mmadụ matara na agbagharawo mmehie-ya, ọ dị udo na-adị nime ime ala obi-ya; ọñụ na-enwupụta kwa n’iru-ya n’ụdị onwunwu nke ihe ọ bụla n’ụwa a ná-apụghị inye ya. Abụ na-esi n’obi a jupụtara n’ọñụ ná-apụta.

Nzọpụta Chineke abụghị náánị nke ụfọdụ ndị maọbụ ụfọdụ mba. Onye dere Abù Ọma bụrụ abụ sị, “Tikusienu JEHOVA nkpu ọñù ike, uwa nile.” Ụwa niile ka ọ dịịrị ịñụrị ọñụ ná nzọpụta nke Jisọs na-enye ndị niile chọrọ ka azọpụta ha n’efu.

Pita Onyeozi dere sị: “N’ezie anamaghọta na Chineke abugh onye nēle madu anya n’iru: kama nime mba ọ bula onye nātu egwu Ya, onye nālu kwa ọlu ezi omume, bu onye Ọ nānara nke-ọma” (Ọlu Ndi-ozi 10:34, 35).

“Tikusienu JEHOVA nkpu ọñù ike.” Bụọ abụ otuto nye Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ. Bulie aha Kraist elu bụ Onye ga-azọpụta ndị-Ya. Too Ya bụ Onye ahụ ga-ekwere ịnwụ ọnwụ n’ihi onye mmehie. Jisọs abịabeghị ibi n’ụwa n’oge ahụ, kama site n’okwukwe ndịamụma pụrụ ịhụ Ya dịka aga-asị na Ọ bịaworị.

“Werenu ọñù fè JEHOVA òfùfè.” Nzọpụta Onyenwe anyị Jisọs Kraist na-eweta ọñù ahụ. Ọ na-atụkwasị Onwe-Ya mmehie anyị niile na nsogbu-anyị niile na iruuju niile, wee mee ka anyị bụrụ ndị nweere onwe-anyị. Ọ na-eburu ibuarọ niile rapụrụ anyị abụ.

Nime Ụlọ Òfùfè

“Werenu iti-nkpu ọñù bia n’iru Ya.” Mgbe anyị bịara n’ụlọ Chineke ifè òfùfè, anyị na-abịa n’iru-Ya. Ọ na-ahụ iyi uwe anyị dịka o kwesịrị, otú anyị si mee omume, ma karị nke a, ihe anyị na-eche. Ọ bụrụ na anyị ejiri otuto nime obi anyị bịa n’iru ya, ọ ga-adị mfé isoro ndị ọzọ gbakọtara ịbụ abụ niile na-enye Jehova otuto. Mgbe anyị na-abụ abụ na-aga n’iru, otú a ka ọñụ-anyị na-adị ukwuu karị.

Ị pụrụ iche ma inwere ike ịbụ abụ mgbe ị na-eruuju. N’ezie ị pụrụ ma ọ bụrụ na ị bụ onyeKraist. Jisọs ga-enye gị abụ na mgbe óké ọchịchịrị. Ọ ga-abụ abụ nime obi-gị mgbe ị na-eche na onye ọ bụla arapụwo gị.

Bụọ abụ mgbe egwù na-atụ gị, egwù ahụ niile ga-agbapụ. Bụọ abụ mgbe i nwere ibuarọ, aga-ebupụ kwa ibu ahụ. Bụọ abụ banyere Jisọs na ịhụn’anya Ya. Bụọ abụ ijiobichụaàjà, were obi-gị na ndụ-gị ná-etinye n’aka-Ya. Bụọ abụ banyere mbịaghachị-Ya. Ụdị abụ dị otú a esi n’obi bụọ bụ ekpere Onyenwe anyị ga-anụ, zaa kwa, Ọ ga-adị gị ka gị na Ya akparịtawo ụka i wee mara kwa na Ọ nọ n’akụkụ-gị inyere gị aka n’ihe niile banyere ndụ-gị n’ụwa a.

Otù Chineke bụ kwa Onyeòkìkè

“Maranu na JEHOVA, Ya Onwe-ya bu Chineke.” Ọ dịghị onye ọzọ. Náánị otù Chineke dị, Ọ bụ Ya kekwara Eluigwe niile, na ụwa na ihe niile dị nime ya. Ọ bụghị anyị mere onweanyị -- anyị apụghị kwa. Ọ bụ Ya kèrè anyị niile. Anyị bụ ọlụ aka Ya, ume niile anyị na-eku sitere n’ebe Ọ nọ. Chineke Onye mere, ná-achị kwa ihe niile ekèrè èkè bụ Onyeọzụzụatụrụ anyị. Anyị bụ ìgwè atụrụ nke ọzụzụanụ-ya, nke Ya onwe-ya ji obi ịhụn’anya ná-elekọta. Ọ na-eduba anyị n’ebe ịtanri nke ahịhịa ndụ. Anyị dị Ya mkpà. Ọ hụrụ onye ọ bụla nime anyị n’anya, wee kwee mkwà na ọ dịghị mgbe Ya ga-arapụ anyị maọbụ ra anyị aka.

Ị maara ọnọdụ enweghị inye aka nke nwaatụrụ mgbe anụọhịa wolf buuru ya site n’ìgwè atụrụ. Ị maara otú o si dịrị nwaatụrụ mfé ifú, wee ghara inwe ike ịmata ụzọ laghachị n’ogige atụrụ. Otú a ka anyị si dị ná-adịghị ike ma ewezuga Onyenweanyị. Ma anyị bụ ìgwè atụrụ nke ezi Onyeọzụzụatụrụ nke ná-elekọta ìgwè atụrụ-Ya nkeọma. O jikeere ịgabiga n’ebe ụzọ dịkarịsịrị njọ na mgbe óké ọchịchịri ijé chọta atụrụ kpafuruakpafu. Nke a ọ bụghị ihe kwesịrị ka anyị jiri too Onyenweanyị, ma feè Ya òfùfè, bụ onye anyị bụ nke-Ya? Karị nke a, Ezi Onyeọzụzụatụrụ enyewo ndụ-Ya n’ihi atụrụ-Ya. Lee ụdị ekele nke a kwesịrị itinye nime obi-anyị! Anyị bụ ìgwè-atụrụ Ya! Ọ nwụrụ ka anyị wee dị ndụ! O bupụrụ mmehie-anyị ka anyị wee nwere onweanyị!

Ihe anyị pụrụ ime nke dịkarịsiri ntà iji gosi obi ekele-anyị bụ iji ezi obi òfùfè bịa n’ụlọ Chineke. Mgbe anyị na-eche banyere óké ịhụn’anya Jisọs nwere n’ebe anyị nọ, anyị na-enwe ike iwere “ekele ba n’ọnu-uzọ-ama-Ya nile, were (nu) otuto ba n’ogige-ya niile.”

Ịchụàjà Otuto

Ndị Israel na-eji onyinye dị icheiche dịka ụmụ-atụrụ, ewu na ehi ná-abịa ịkpọisiala nye Chineke n’Ụlọikwu. Ọ dịghị anyị mkpà iji anụmanụ ná achụàjà. Ịchụàjà anyị bụ otuto sitere nime obi. Pọl Onyeozi dere sị “Ka ayi site n’aka-Ya nāchu aja, bú otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahu bu, nkpuru egbugbere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya” (Ndi Hibru 13:15).

Ọ bụghị náánị n’ụlọụkọ ka anyị gana-abụ abụ, kama otuto kwesịrị ịdị n’obi-anyị mgbe niile. Eleghịanya anyị enweghị olu ịbụ abụ -- ọ pụrụ ịbụ na anyị enweghị kwa olu eji ekwu okwu nkeọma. Ma anyị pụkwara iti mkpụ ọñụ nye Jehova. (Maọbụ na) mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị asaghe ọnụ, ma otuto ga-adị nime obi. Anyị pụrụ ikuru ume ekpere nke ekele nye Jisọs.

Ifekọ Òfùfè’

Pọl Onyeozi maara otú ezi ihe anyị pụrụ imere onweanyị ra site n’ikwu banyere ịhụn’anya Chineke. Ọ dịrị anyị mma ịbụkọ abụ; ọ na-enyekwara okwukwe-anyị aka ịnụ ihe Chineke meere ndị ọzọ. Pọl dere na anyị gana-akpasu ịhụn’anya n’arụ ibeanyị “Ka ayi ghara kwa irapu nzukọ nke onwe-ayi, dika ufọdu nēme, kama ka ayi nādusi ndi ọzọ ọdu ike.” Anyị na-enweta ike site n’izukọ ọnụ ná-ekwu okwu banyere ihe nke Chineke. Onyenweanyị na-aña kwa ntị, ọ na-adị Ya mma ịnụ ụdị ịkparịtaụka dị otú a.

Malakai Onye-amụma dere sị: “Ndi nātu egwu JEHOVA nēkwurita okwu, otù onye na ibe-ya: JEHOVA we ña nti, nu, ewe dere ndi nātu egwu JEHOVA, ndi nēche kwa échèchè aha-Ya, akwukwọ ncheta n’iru Ya” (Malakai 3:16). Ọbụná iche échìchè aha Jehova na-ewetara obi anyị ngọzi! Jehova kwuru banyere ndị ahụ ná-eche na-ekwu kwa banyere eziomume na ebere-Ya: “Ha gābu kwa nkem, ka JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha siri, n’ubọchi ahu mgbe Mu onwem ganēme ihe, bú ihe nke akam” (Malakai 3:17). Ihe dị óké ọnụahịa nye Jehova! Anyị niile bụ ndị ná-añụrị ọñụ ná-abụkwara Ya abụ otuto site n’obi ga-abụ nke Ya mgbe Ọ ga-abịa ịnara ndị nke-Ya.

Rue Ebighịebi

Ịdịmma na ebere Chineke na-adịgide rue mgbe ebighịebi. Ọ gaghị arapụ ndị nke-Ya. Ọ bụ ezie na anyị na-enwe obi abụọ mgbe ụfọdụ maọbụ chee na ọ bụ náánị anyị nọ ná-atụ kwa egwù ịdịmma na ebere ga-adị kwa n’ebe ahụ; mgbe atụtere okwukwe anyị ịmata nke a, anyị na-añụrị kwa ọñụ ọzọ. “Rue ọgbọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Ya di kwa.” Onye ọ bụla, n’ọgbọ niile nwere ohere ifè Ya ma ọ bụrụ na onye ahụ chọọ.

Iji Abụ náenye Otuto

Ọ dị kwa ụbọchị ọzọ mgbe Onye dere Abù Ọma na-eche banyere itò Jehova. Ọ malitere otú a, “Tonu Ja. Tonu Chineke n’ebe nsọ Ya.” Nke ahụ pụtara n’ụlọụkọ-Ya. Ma ụlọụkọ ọ pụrụ ịnagide ebube Chineke? N’otù ahịrị okwu ahụ, Onye dere Abù Ọma kwukwara sị, “Tonu Ya na mbara-igwe nke ike-Ya.” Ụwa niile apụghị ịnagide otuto niile nke Chineke. Eluigwe niile aghaghị ijupụta n’otuto-Ya. Ọtụtụ mmadụ taa adịghị-eto Jehova, ma ụbọchị ná-abịa mgbe otuto-Ya ga-ejupụta ụwa niile. N’ụbọchị ahụ Ọ ga-achị mba niile. Anyị ga-anụ ụdị abụ ahụ dị ka nke Onye dere Abù Ọma: “Unu ndi nile di iche iche, kuanu aka; werenu olu nke iti-nkpu-ọñù tikue Chineke … Bùkuenu Chineke abù Ọma, bùkuenu Ya abù ọma: Bùkuenu Eze-ayi abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma. N’ihi na Eze nke uwa dum ka Chineke bu: Bùkuenu Ya abù ọma, bú maschil” (werenu nghọta bukue Ya abù ọma) (Abù Ọma 47:1, 6, 7).

N’Ụlọukwuu Chineke Solomon wuru ọ dị ndị ná-abụ abụ dị ukwuu na ndị ji ụbọ dị icheiche ná-enye aka ịbụku Chineke abụ otuto. Ndị dere abụ nsọ chọrọ iji ihe niile ha pụrụ iji wee bulie aha Jehova elu, ya mere na otù dere sị: “Werenu ọfụfụ opì-ike to Ya: Chirinu une na ubọ-akwara to Ya. Werenu egwú-otiti na ite-egwú (ọjà) too Ya: Chirinu ubọ eji akwara kwe na ọjà to Ya: Chirinu ájà nke anānu nke-ọma to Ya.”

Anyị amaghị ọtụtụ ihe-eji-eti-egwu ọ kpọrọ aha nkeọma, ma ka anyị tụgharịa uche n’ihe ndị abụ-une anyị ji na-eto Chineke dịka anyị maara ya. Eleghịanya ndị Violin mbụ ga-amalite site n’inye Chineke otuto, ndị violin nke abụọ etinye olu nke ha. Ndị Viola na Cello ga-anụ ụda ahụ dị ụtọ, ha ga-achọ kwa itinye olu ha dị ala n’ito Chineke; ha e wee malite na-abụ abụ òfùfè. N’ụda dị ala ndị ụbọ akwara bass ga-ewepụta Amen ha niile. Ndakọta mara mma nke ụbọ-akwara dị icheiche niile a ga-akpali opi dị icheiche na opi-ike iweta òkè nke ha nime otuto a. Olu-ha ga-ada ụda ukwuu karị rue kwa ebe dị anya. Ọzọ ndị trombone na ndị bass ga-achọ kwa ịbata n’inye otuto a. N’etiti ha niile ka ụda nke ụbọ-akwara na-abata, mgbe ụfọdụ n’ịdịelu mgbe ọzọ kwa ọ dị ala ná-nkọwa nke mkpụrụokwu nke abụ ahụ. Mgbe otuto ahụ ruru ebe dị elu anyị pụrụ ịnụ ụda nke ájà. Nchịkọta nke ihe niile ahụ eji akpọ-abụ ga-ewuli elu rue ịmamma nke òfùfè nye Chineke ahụ nke meworo anyị, nke bụ Eze-anyị, nke ebere-Ya na-adịru kwa ebighịebi.

Ma ewezuga ihe ụda niile dị icheiche nke abụ, na ndị niile ji ọnụ-ha na-abụ abụ, ka ihe niile ná-eku ume too Jehova. Tonu Jehova!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị na-eme ka mmadụ nwee ọñụ n’ezie?
  2. Ònye kwesịrị ịbụrụ Chineke abụ otuto?
  3. Òlee ebe anyị kwesịrị ịnọ too Ya?
  4. Òlee otú anyị ga-esi too Ya?
  5. N’ìhi gịnị ka anyị ga-eji too Ya?
  6. Gịnị bụ àjà anyị na-achụrụ Chineke.
  7. Òlee mgbe anyị kwesịrị itò Ya?