Lesson 257 - Junior
Memory Verse
AMAOKWU IBU N’ISI: “Ọ buru na JEHOVA ewugh ulo, n’efu ka ha dọgbuworo onwe-ha n’ọlu nime ya, bú ndi nēwu ya: Ọ buru na JEHOVA echegh obodo, n’efu ka onye nche muruworo anya” (Abù Ọma 127:1)Notes
Àtụmààtụ Chineke
Mgbe Chineke nyere iwu ijé ozi, Ọ na-enye kwa amamihe aga-eji mezue ihe ahụ O nyere n’iwu. Mgbe Chineke gwara Noa ka o wue ụgbọ ahụ, O nyekwara àtụmààtụ otú óké ụgbọ ahụ ga-adị. Mgbe Onyenweanyị nyere Moses iwu iwú ụlọikwu n’ọzara, O nyere ya ndumọdụ zuruókè otú ọ ga-adị. Ugbu a agaje iwu Ụlọukwuu na Jerusalem, otù Chineke ahụ nyere Devid àtụmààtụ otú ọ ga-adị, onye sịrị, “Ihe a nile ka JEHOVA were odide-akwukwọ me ka m’mata site n’aka-Ya n’arum, ka Devid kwuru, bú ije-ozi nile nke ihe-atù a” (I Ihe Emere 28:19).
Ụbọchị Ikpeazụ Devid
Otù ụbọchị, Devid gwara nwa-ya nwoke bụ Solomon, “Ọ di n’obim iwuru aha JEHOVA, bú Chinekem, ulo” (I Ihe Emere 22:7). O wee kọọ banyere ọlaedo, ọlaọcha, ọlaigwe, osisi, na nkume nke o doziworo. O wee sị “I gātukwasi kwa ha nile.” Dịka nna na-atụ Chineke egwù ọ bụ, ọ sị, “Bilie, lua ọlu, ka JEHOVA nọyere kwa gi” (I Ihe Emere 22:14-16).
Devid maara nkeọma na ọlụ ahụ abụghị ọlụ ntakịrị maọlị. Ọ jụrụ ndị-ya, “Ònye kwa nēwere afọ-òfùfò nye onwe-ya imejuru JEHOVA aka-ya ta?” (ijere Jehova ozi ta). N’ezie ụbọchị ikpe-azụ niile Devid bụ nke kachasị mma. Lee otú ọñụ ga-esi jupụtaworị obi ya ugbu a n’ihi na “n’obi zuru okè ka ha were afọ-òfùfò nye JEHOVA onwe-ha: ọzọ kwa, Devid, bú eze, ñuriri ọñu uku.” (I Ihe Emere 29:5, 9). Ka anyị gee ntị n’okwu olenaole sitere n’ekpere nke Devid tutu ọ nwụa: “JEHOVA, Gi nwe idi-uku, na idi-ike, na ima-nma, na nmeri, na ebube … JEHOVA, Gi nwe ala-eze, … ọtutu ihe nile a nke ayi doziworo iwuru Gi ulo n’ihi aha nsọ Gi, n’aka-Gi ka o siri bia, ọ bu kwa Gi nwe ha nile” (I Ihe Emere 29:11, 16). Nke a ọ dịghị echetara unu ekpere Onyenzọpụta anyị ziri anyị ka anyi na-ekpe?
N’ịzá ekpere Devid kpere ka Onyenweanyị nye Solomon obi zuruòkè, “idebe ihe nile I nyere n’iwu, … na iwu ulo uku ahu, nke m’doziworo ihe banyere ya” (I Ihe Emere 29:19) n’ịza kwa arịrịọ Solomon rịọrọ Onyenweanyị, Chineke nyere Solomon amamihe, iheọmụma, àkụ na ụba na nsọpụrụ.
Oge na Ebe
Mgbe Devid nwụsịrị, n’arọ nke anọ nke ọbụbụ-eze Solomon, n’ọnwa nke abụọ, ọ malite iwu Ụlọ Jehova na Jerusalem n’Ugwu Moraia.
Ọ bụrụ na anyị dị ndụ n’oge ahụ dị anya garaaga wee nọkwasị n’elu otù nime ugwu anọ ahụ ewukwasịrị Jerusalem wee lee anya n’ebe ọwụwaanyanwụ, anyị ga-ahụworị Osimmiri Jọdan gbagọrọ-agbagọ n’ebe dị anya na osimmiri Nwụrụanwụ (Dead Sea). N’ileanya n’ebe ndịda, anyị ga-ahụworị obodo ugwu nke Judia na Betlehem; n’ile kwa anya n’ebe ọdịdaanyanwụ anyị ga-ahụworị ihe dị n’ebe dị anya nke na-egosi ọnọdụ Osimmiri Ukwuu ahụ. N’ebe dị ala ka ndagwurugwu ahụ dị nke Mmiri Kidron tiwara, ebe Onyenzọpụta-anyị gabigara n’abalị ahụ araara Ya nye n’Ubi ahụ agbaraogige.
Ndị Ọlụnkà Nwere Obi Ịlụ Ọlụ
Ànyị ga-atụgharịuche n’akụkọ ochie wee hụ otú Solomon si wue Ụlọukwuu ahụ? Ọ dịghị nsogbu enwere n’ịlụ ọlụ ahụ -- ọlụ dịrị onye ọ bụla, onye ọ bụla nwekwara ọlụ ọ ga-alụ.
Dịka Devid kwuworo, “Onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo n’amam-ihe gādi kwa n’aka-gi n’ije-ozi ọ bula, … (I Ihe Emere 28:21). Esi n’ebe óké nkume dị ná-egwupụta nkume dị ukwuu wee dozie ya, kwazie kwa ya otú o kwesịrị ịdị tutu eburu ya jee n’ebe ana-ewu Ụlọukwuu ahụ. Ahụwo nkume ụfọdụ n’ebe ewuworo Ụlọukwuu ahụ nke dị ọtụtụ rula iri anọ n’ogologo na ọtụtụ ise na isi n’igbidi, ịdị-arọ ya karịrị otù narị tọn. Emere ka elu ugwu dị obosara karị nke-ukwuu ka o wee nwee ike ịba Ụlọukwuu ahụ na ogige niile gbara ya gburugburu, site n’idebe nkume ndịa gburugburu akụkụ niile nke ugwu ahụ, wee ji ọtụtụ ogidi dị ukwuu kwagide ha. Nke a mere na edoziri nzọụkwụ n’otù nzọụkwụ n’elu ibe-ya na ohere buru ibu n’okpuru ala. Anyị na-agụ na Solomon nwere puku ịnyịnya irianọ (40,000). Ndị ná-achọpụta ihe dị nime ala egwuwawo ebe ana-edebe ịnyịnya na ebe ana-edebe ụgbọala. Ọnụụzọ abụọ na-esi n’okporoụzọ baa n’ụlọ ịnyịnya eji nkume wee doo iji mee ka ịnyịnya ghara ịdapụ. Oghere ebe ana-ejigide ịnyịnya, ube, na ebe anụmanụ na-ata nri ka ahụwokwara.
Osisi Cedar nke Lebanon
Ndị ná-egbu osisi wee jee n’óké ọhịa nke Lebanon. Ebe ahụ ka ha gbuturu óké cedar dị icheiche, ụdị dị icheiche dị óké ọnụahịa nke apụrụ idozi ka ọ maa mma dị ukwuu. Ọ dịghị ígwè eji alụ ọlụ dị ya mere na ọ bụ aka ka eji egbu ya, nke mere o ji dị mkpà na ọtụtụ ndịkom ga-eje ozi ahụ. Obi ga-atọworị ndị ahụ ná-egbu osisi ụtọ mgbe puku anyụike iri (10,000) na-efe iru na azụ; puku ndịkom iri (10,000) obi ha na-adakọta dịka otù onye, ndị nwere otù ihe dị ha n’obi -- iwú Ụlọ Onyenweanyị. Mgbe ahụ ha na-eti “Osisi!” mgbe cedar ahụ dị ukwuu na-adaru ala -- osisi ọzọ iji wue ụlọ Jehova. Mgbe ha lụsiworo ọlụ ike otù ọnwa, ha na-alaghachị ụlọ nọdụ ihe ra ka ọnwa abụọ, ka puku ndịkom iri (10,000) ọzọ wee nọchie ha. Otú a ka ọ bụ na puku ndịkom iri asatọ (80,000) na-alụ ọlụ na ndịnkekọta dị puku atọ na narị ndịkom atọ (3,300) bụ ndị ná-alụ ọlụ nkà. Emesịa ndị na-ebuibu dị puku ndịkom iri asaa (70,000) buuru osisi cedar niile ahụ jerue n’ótú Osimmiri Mediterranean. Óké osisi na-ese n’elu mmiri rịdaa osimmiri Jopa, ebe aga-esi buru osisi cedar ahụ gabiga rue Jerusalem. N’ebe ahụ ná-ejighị anyụike, otùtù, maọbụ ihe ọlụ ọ bụla eji ígwè mee, ana-etinye nke ọ bụla n’ọnọdụ ya (I Ndi Eze 6:7). Ọtụtụ fir dị kwa mkpà, n’ihi na ọ bụ fir ka eji kụọ ala-ya.
Ndịagha na-eji ụgbọmmiri Solomon nwere si kwa n’ebe dị anya nke Ophir ná-eweta ọlaedo, nke pụtara iso ụgbọ jee ijè arọ atọ n’iji ụgbọ nke oge ahụ dị anya garaaga n’ihi na Suez Canal adịghị n’oge ahụ.
Ebe Nsọ Ahụ
Ụlọukwuu ahụ n’onwe-ya dị iri rula iteghete (90) n’ogologo na iri rula atọ (30) n’obosara na iri rula atọ (30) n’ịdị-elu, ha niile ka eji osisi cedar wue were kwa ọlaedo machịta ya. Imeimeụlọ, maọbụ Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Niile ka ekewapụrụ site n’Ebe Nsọ site n’iji ákwà mgbochi ahụ nke dị ogho anụnụ, na ogho ododo na ogho uhie (2 Ihe Emere 3:14). Imeimeụlọ ahụ ra nnọọ nrata n’ogologo, obosara na ịdị-elu, ọ dị iri rula atọ (30) n’akụkụ niile. Cherubim abụọ eji osisi olive mee dị nime ụlọ a, eji-kwa ọlaedo machita ya, nke ọ bụla dị ọtụtụ rula iri na ise (15) n’ịdị elu, site kwa na nkù nke a rue na nke ọzọ ọ dị kwa ọtụtụ rula iri na ise (15). Ị pụrụ ịtụgharị uche nime obi-gị otú ebe ahụ ga-amaworị mma, nkù nke otù na-emetụ nkù nke ibe-ya, nkù nke ọzọ chere onwe-ha iru ná-emetụ mgbidi, iru-ha na-elekwasị anya n’ebe ahụ aga-edebe Igbe Chineke? N’arụ ụlọ ahụ enwere ihe apịrịapị nke cherubim, osisi mkwụ na okokoosisi wara awa, nke eji ọla-edo wee kpuchie. Eji kwa ezi ọlaedo kpuchie ọbụná ala-ya, dịka emekwara ebe ịchụàjà nke eji cedar mee dị n’Ebe Nsọ. Devid edoziworị ezi ọlaedo maka Ụlọukwuu ahụ; ma ọ bụghị ihe obi-ụtọ ịhụ na o doziri ọlaedo anụchara anụcha n’ihi ebe ịchụàjà ana-esure ihensureọkụ ná-esi ìsìụtọ, nke bụ ụdị nke odudonsọ? (I Ihe Emere 28:18).
Dịka Àtụmààtụ si Dị
Solomon wukwara ogige ahụ nke ebeịchụàjà eji ọla mee nke bụ ụdị nke nzọpụta. Emere ihe niile dịka àtụmààtụ Chineke si dị, dị kwa nnọọ ka Ụlọikwu nke ewuru n’ọzara. Otú ọ dị, Ụlọukwuu ahụ dị ọnụahịa dị ukwuu karị, ọtụtụ ya dị kwa okpukpu abụọ nke ụlọikwu. Ana-eche na ọnụahịa-ya ga-adị ihe dị ka ijeri dọla abụọ maọbụ ise.
Ogidi ukwuu abụọ guzoro n’iru Ụlọukwuu Chineke ahụ, nke etinyere ịyagba n’elu-ya nke narị (100) pomegranate eji ọla mee kokwasịrị. Ka anyị tụgharịa uche n’ụzọmbata nke dị n’iru Ụlọukwuu Chineke. Ọ dị iri rula atọ (30) n’ogologo na otù narị rula na iri asatọ (180) n’ịdị elu, nke eji ezi ọlaedo machita ime-ya. Tụgharịa uche banyere ụlọ ụkọ nke nwere ụlọ-elu nke ịdị elu-ya ra ka ụlọ-elu dị okpukpu iri na ise (15) -- eji ọlaedo tee ime-ya!
Ụlọukwuu Chineke ahụ abụghị ụdị ụlọ ana-alụ dịka ụlọ-ụkọ anyị nke dị ugbu a nke ná-aba ọtụtụ mmadụ, kama ọ bụ n’ihi ifè òfùfè; ụmụmmadụ na-anọ kwa n’ezi. (Lee Iheọmụmụ nke 70, akwụkwọ nke Isii, banyere ifè òfùfè). Alụsịrị Ụlọukwuu Chineke n’onwe-ya nime arọ asaa na ọkara, o wekwara arọ iri na atọ ọzọ iji wuchaa ụlọ Solomon, ụlọ njègharị mara óké mma, ogige niile, ụzọ mbata niile na obi niile. Náánị asị na anyị biri n’oge Solomon, wee hụ Ụlọ Jehova dịka Ezenwanyị nke Sheba, ka apụrụ ịghọta nkeọma ịmamma nke Ụlọukwuu Chineke ahụ, otú nkume niile ahụ ra, ihe apịzirị apịzi dị icheiche ahụ na ihe niile eji ọlaedo dozie.
Jerusalem Ochie na nke Ọhụụ
Ọ bụghị náánị na Palestine, kama ọ bụ kwa obodo niile nke ụwa amaara n’oge ahụ matara na Ụlọukwuu Chineke ahụ dị na Jerusalem bụ ebe dịkarịrị ndị-Ju mkpà izukọta ifè òfùfè; ụlọ nzukọ ha niile chere iru n’ebe ụlọukwuu Chineke dị. Daniel, mgbe adọọrọ ya n’agha, ka ọtụtụ arọ gasịrị, meghere window-ya chee Jerusalem iru wee kpee ekpere, ọ bụ ezie n’oge ahụ na etikpọwo Ụlọukwuu Chineke.
Taa, window niile nke obi-gị o meghere chee Jerusalem iru? Ọ bụghị chee obodo ahụ iru bụ nke ebibiworo wugharị kwa ugbò atọ, kama ọ bụ chee Jerusalem nke Eluigwe ahụ iru? Ị na-ele anya, dịka Abraham mgbe ochie lere anya, “obodo ahu nke nwere ntọ-ala ahụ, nke Chineke bú onye-ọkà-ya na onye luru ya” (Ndi Hibru 11:10)? Ọ na-agụ gị agụụ ịhụ Obodo ahụ nke eji ezi ọlaedo wuo nke Jọn hụrụ, “obodo nsọ ahụ, bú Jerusalem ọhu, ka ọ nēsi n’elu-igwe ridata, site n’ebe Chineke nọ” (Nkpughe 21:2)? Ọ bụrụ otú a ị ghaghị ijikere ịga ebe ahụ. Ma ọ bụrụ na ị na-ele anya ịbànye n’akụkụ kwesịrị n’ụlọukwuu Chineke ahụ mara mma nke ukwuu nke dị n’elu, aghaghị iwere ngwaọlụ dozie gị n’ebe a ka e wee tinye gị n’otù akụkụ nke ụlọ ahụ ana-anụghị ụda otùtù. Òlee otú anyị ga-esi nata ndozi, na mgbubi na nnụcha a? “Ọ bugh otú a ka ọ dị? na okwum di ka ọku, (ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta); na dika otùtù nke nētipia nkume di elu?” (Jeremaia 23:29). Okwu Chineke pụrụ isi n’obi rechapụ ihe niile ná-ekwesịghị ekwesị, otùtù ya pụkwara ịkụchapụ ntakịrị ebe a ntakịrị ebe ọzọ, ma ọ bụrụ na mmadụ ga-enwe ike inye onwe-ya.
Ụlọ Anyị
Okwu ihe-àtụ ọzọ anyị hụrụ na Baịbụl na-egosi na anyị niile n’otù n’otù na-ewu ụlọ. Ọ dịghị mkpà na anyị ga-eje n’óké ọhịa nke Lebanon ijé gbuta osisi cedar, maọbụ ijé n’ebe óké nkume ịwata nkume, maọbụ n’ala dị larị nke Jọdan iweta ọla, maọbụ n’ophir iweta ọlaedo. Kama, anyị na-egwumi nime Okwu Chineke. Ebe ahụ ka anyị na-ahụ ihe niile anyị ji ewu ụlọ n’ebe ịchụàjà nke ekpere, Chineke na-enyezu anyị ihe dị mkpà.
Ihe mbụ dị mkpà n’iwu Ụlọukwuu Chineke nke-anyị bụ ijekuru Jisọs Kraist, Onye bụ Ntọala. “Ma ka onye ọ bula lezi anya otú o nēwu ulo n’elu-ya. N’ihi na ọ dịgh onye ọ bula purụ itọ ntọ-ala ọzọ ma-ọbugh nke atọworo, nke bu Jisus Kraist” (I Ndi Kọrint 3:10, 11). Site n’Okwu-Ya ka anyị mụtara na akụkụ dịkasịrị mkpà n’ụlọ ahụ nke bụ Ịgụ mmadụ n’onyeeziomume, Odudonsọ, na Ọwuwummiri nke Mmụọ Nsọ. Ihe-mnwapụta ndịa ka egosịrị n’Ụlọukwuu Chineke nke Solomon wuru site n’ebe ịchụàjà eji ọla mee nke dị n’ogige mpụta, ebeịchụàjà eji ọlaedo mee nke dị n’Ebe Nsọ, na Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ niile nke dị n’azụ akwamgbochi.
Mgbe anyị natasịrị mnwapụta nke ime mmụọ ndịa ka anyị lezie anya ịrọpụta náánị ihe kachasị mma iji dozie ime ụlọ ahụ. Dịka Solomon wetara ezi ọlaedo n’ụlọukwuu ahụ dị na Jerusalem, anyị aghaghị idebe ihe kachasị mma n’ụlọ nke anyị. Ikpé ekpere dị ukwuu na iji ndụ anyị chụọ àjà dị mkpà n’ụlọ-anyị ahụ, irubeisi na ịhụn’anya kwa nke eji okwukwe tụgwaa. Anyị mụtara na mnwapụta nke okwukwe anyị dị óké ọnụahịa karị ọlaedo (I Pita 1:7), anyị na-eji kwa “mọ di nwayọ di kwa udo” ná-achọ ụlọ anyị mma. Ihe ọzọ ga-eme ka ọ maa mma karị bụ amamihe, nke ana-akpọ “okpu-eze amara” (Ilu 4:9).
Ka anyị na-amamma karị, ná-ehichapụ ná-eji kwa ihe niile ana-apụghị ibibi chọọ obi anyị mma karị. Ka ọ ga-abụ, mgbe ọkụ ahụ bịara nke ga-anwa ọlụ onye ọ bụla, ụdị ọ bụ, “ulo” anyị agaghị-adị ka ụlọ ukwuu Chineke dị na Jerusalem nke ebibiworo ugbò atọ, kama ọ ga-anọgide, anyị ga-anata kwa ụgwọọlụ dị ukwuu (I Ndi Kọrint 3:13, 14).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Gịnị mere Devid apụghị iwu Ụlọ Jehova?
- Eze Hairam ò nyeere Solomon aka?
- Òlee otú Solomon bụ Eze si kwụọ ndịkom Hairam ụgwọ?
- Ndị ná-egwupụta nkume òle n’elu ugwu ka eze nwere?
- Arọ òle ka Solomon bụrụ eze mgbe ọ malitere iwu Ụlọukwuu Chineke?
- Òlee otú Ụlọukwuu ahụ ra?
- Kọwaa otú imeimeụlọ ahụ dị, ebe aga-edebe Igbe Chineke.
- Ì chere na Solomon jiri ihe ọ bụla ná-adịghị óké ọnụahịa wue?
- Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta site na nke a?
- Ò weere Solomon arọ òle n’iwu Ụlọukwuu Chineke ahụ?