2 Ihe Emere 5:1-14; 7:1-3; I Ndi Eze 8:54-61; 9:1-9

Lesson 258 - Junior

Memory Verse
“M’gākpọ isi ala n’ebe ulo uku nsọ Gi di, m’gēkele kwa aha-Gi n’ihi ebere-Gi na n’ihi ezi-okwu-Gi: n’ihi na I mewo ka okwu-ọnu-Gi di uku n’elu aha-Gi nile” (Abù Ọma 138:2).
Notes

Ugwu Moraia

Taa ọ bụrụ na anyị pụrụ ijé njèm rue ala Palestan jee hụ obodo Jerusalem, otù nime ebe anyị ga-achọ ịhụ bụ Ebe Nsọ Kachasị kwesịrị nsọpụrụ (Noble Sanctuary), n’etiti ebe “Dome” Óké Nkume guzoro. Otú ọ dị, nye Onye-Kraist ala ebe ụlọ a guzoro dị nsọ karịa ihe alụrụ na ya, n’ihi na n’ebe ahụ dị nsọ ka ihe atọ dị ukwuu mere.

Ugwu Moraia bụ aha ebe a. Ka anyị na-eche banyere ugwu a échìchè anyị na-echigharịkuru Abraham kwesịrị ntụkwasịobi. Ọ dị onye ná-ejibeghị anya nke imemmụọ-ya hụ Abraham, ka, n’ụbọchị nke atọ nke ijé-ya ijeru ugwu a, o “weliri anya-ya abua, hu ebe ahu n’ebe di anya.” N’iru-ya ka ọ na-ahụ ugwu ahụ ebe ọ ga-eji nwa-ya chụaàjà. Onye gụworo akụkọ a na Jenesis 22: ná-ejighị anya nke imemmụọ-ya soro onye nke Chineke a, na Aisak nwa-ya nwoke, ka ha si n’ugwu ahụ laghachị rue ebe ha rapụworo ndị ná-ejere ya ozi. Abraham gafere ule ahụ n’ụgwu nke Jehova. Site n’ihe a mere anyị nwere onyinyo maramma nke nzọpụta (Gụọ Iheọmụmụ nke 11 n’Akwụkwọ 1 ọzọ). Ebe eji Ọkpara Chineke, Jisọs Kraist chụaàjà iwepụ mmehie niile nke ụwa adịghị anya site n’ebe a.

Ihe nke abụọ mere n’Ugwu Moraia mere n’oge ndụ Devid. Mgbe Devid gụsịworo ndị-ya ọnụ, n’inye ya ahụhụ, ajọ ọrịa ná-efe efe ebibiwo kwa puku mmadụ iri asaa (70,000), Chineke gwara Devid ka o wue ebeịchụàjà n’ebe nzọchaọka Ọnan n’elu Ugwu Moraia. Mgbe Devid jụrụ Ọnan (onye akpọkwara Arọna, 2 Samuel 24:21) ase ma ya nwere ike ịzụrụ ebenzọchaọka ahụ, Ọnan sịrị na ya ga-enye ya Devid, nye kwa ya ehi na nkụ. Ọ sịrị, “Ihe nile ka m’nyeworo” (I Ihe Emere 21:23). Ma Devid sịrị na ya ga-azụ ya n’ego zuruezu oruru n’ihi na ya agaghị-esurere Jehova àjà nsureọkụ ya ná-etinyeghị ego ọ bụla. Àjà nke abụọ a n’elu Ugwu Moraia bụ ụdị odudonsọ (Lee Iheọmụmụ 247).

Ihe nke atọ dị mkpà mere n’elu ugwu Jehova bụ ịrara Ụlọukwuu nke Solomon wuru nye Chineke.

Njikere Maka Òfùfè

Ka anyị site n’échìchè obi-anyị, leba anya n’ihe a na-eme. Ihe niile adịwo ná njikere. Ihe-ịdọbaoriọna iri, nke eji ọlaedo mee nke ọ bụla nwere ọkụ asaa, tebụl ebe edebere achịcha iru Chineke, ihe niile eji ọla mee, ọkwa-mwụsa eji ọlaedo mee, mkpà niile, na ngaji niile, ha niile dị ebe ha kwesịrị ịdị. Ihe nsọ niile dị n’Ụlọikwu ka ndị-nchụàjà na ndị-Livai bugotaworo. Solomon achịbatawo ihe niile eji ọlaọcha na ọlaedo mee nke nna-ya bụ Devid doworo nsọ, debe ha n’etiti ihe niile dị óké ọnụahịa dị.

Eze akpọkọtawo ndịokenye, ndịisi nke ebo niile na ndịisi nke ndị bụ nna nke Ụmụ Israel, ka ewee bugota Igbe Ọgbụgbandụ rue Ụlọukwuu. Ndị Livai ebutewo Igbe ahụ bubata ya n’ụlọnzukọ ọhụụ ahụ ebe ndịnchụàjà buuru ya bubaa ya n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Niile wee debe ya n’okpuru nkù nke cherubim. N’oge a ọ dịghị ihe ọzọ dị nime Igbe ahụ maọbụghị mbadamba nkume abụọ ahụ.

Òfùfè ahụ Na-amalite

Eze Solomon na ndị ahụ niile ji atụrụ na ehi karịrị nke mmadụ pụrụ ịgụta ọnụ ná-achụrụ Chineke àjà -- ná-enye Chineke anyị dị ukwuu n’afọofufo. Ọ bụrụ na anyị guzoro n’èzí n’akụkụ Ụlọukwuu, anyị pụrụ ịhụ ndịnchụàjà ka ha na-apụta site n’Ebe Nsọ. Edozuwo ndịkom ndịa nsọ, ha na-eyikwasị kwa ezi akwa ọcha. Mgbe anyị na-ele anya n’akụkụ ọwụwaanyanwụ nke ebeịchụàjà ahụ, anyị na-ahụ ndịọbụabụ na ndị ná-afụ opi, ha niile na-eyi kwa ezi akwa ọcha. N’otù olu narị ndịnchụàjà na iri abụọ ahụ fụrụ opi ha n’otù oge ahụ nke ụbọakwara, ájà, na une dara. Óké mkpọkọta ndị-abụ ahụ ji olu-ha bụọ abụ, “N’ihi na Ọ di nma: n’ihi na rue mgbe ebigh-ebi ka ebere-Ya di.” Otù ihe mere! Ebube Jehova jupụtara Ụlọukwuu ahụ dịka igweojii, nke mere na ndị-nchụàjà apụghị ijé ozi ha.

Mgbe ụda opi na ụbọakwara niile na-adakọta ọnụ ná nzukọ anyị n’ụbọchị ndịa, anyị na-enwe obiụtọ, dịka anyị na-enwe mgbe olu ndị ọbụabụ na-ada dịka olu otù onye. Kama ọ bụ náánị mgbe obi na uche niile dị n’otù, náánị mgbe nzukọ nọ n’ịdịn’otù nke na-abịa site n’odudonsọ, ka ebube Jehova na-enwe ike ijupụta ụlọ ahụ. Náánị mgbe ahụ ka “igwe-oji” ga-enwe ike jupụta ụlọ ahụ. Lee otú ụdị ifè òfùfè a si bụrụ nke na-ewuli obi elu!

Ekpere nke Eze

Ugbu a anyị na-ahụ Solomon bụ Eze ka ọ na-eguzo n’ebe dị elu nke ịdịelu ya ruru ọtụtụ rula anọ na nkera. Ọ na-agwa ndị ahụ okwu. O wee gbue ikpere n’ala, gbasaa ọbụaka-ya abụọ n’ebe Eluigwe dị, kpee ekpere. Ụlọukwuu ahụ dị ukwuu n’ezie, ogige ya niile dị kwa obosara, ma Solomon matara na apụghị idebe Chineke nime ụlọ. Anyị nụrụ okwu niile ahụ ná-akpali obi sitere n’egbugbereọnụ nke nwoke a nwere amamihe karịa mmadụ niile: “Le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agagh-anagide Gi; ulo a nke m’wuworo, ọ gēsi kwa aña rue inagide Gi?” (2 Ihe Emere 6:18). Otú ọ dị, ọ rịọrọ ka anya abụọ nke Chineke ná-asaghe n’ebe Ụlọ a dị ehihie na abalị.

Ọkụ Sitere N’Eluigwe

Lee ụdị ihe dị ebube mere, mgbe ekpebiri ekpere ahụ, ọkụ si n’Eluigwe daa wee repịa iheonyinye niile na ihe niile eji chụọàjà, ebube Jehova wee jupụta ụlọ ahụ! Mmadụ niile dara n’ala kpube iru-ha na pavement, wee ruru ala n’akpọ isiala wee ná-etò kwa Jehova. Otù ugbò ọzọ abụ dakwara n’opi na n’ụbọakwara niile nke Devid doziworo n’ihi ihe a; ndị-nchụàjà fụkwara opiike ka ndị ahụ na-eguzo n’ụkwụ-ha.

Ọbịbịa Ọzọ Jehova Bịara

Otù abalị mgbe òfùfè nke ido ụlọ ahụ nsọ gasịworo, Solomon ezilagawo kwa ndị ahụ n’ụlọikwu ha, Onyenwe anyị mere ka ọ hụ Ya anya ọzọ wee sị na azawo ekpere-ya. Ọñụ nke Solomon ga-ezuworị ókè mgbe ọ nụrụ olu Chineke ka Ọ na-ekwu sị: “Ma ugbu a arọputawom ulo a, do kwa ya nsọ, ka aham we di n’ebe ahu rue mgbe ebigh-ebi: anyam abụa na obim gādi kwa n’ebe ahu ubọchi nile” (2 Ihe Emere 7:16).

Àtụmààtụ nke Chineke

Ido Ụlọukwuu ahụ nsọ yiri Ụbọchị Pentikọst; otú ọ dị, ndị biri n’oge Solomon anataghị ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ, n’ihi na enyebeghị Mmụọ Nsọ. Ihe a mere na Testament Ochie na-akụziri anyị na edebeere anyị ndị ná-ebi n’Oge a nke Mmụọ Nsọ óké ihe. Chineke doro àtụmààtụ ahụ n’oge Testament Ochie wee mezue ya na nke Ọhụụ.

Mmiriòzùzò nke Mbụ

Ihe karịrị otù puku arọ site na mgbe edosịrị Ụlọukwuu ahụ nsọ, n’otù ụbọchị dị ebube otù narị na iri mmadụ abụọ zukọtara na Jerusalem. Gburugburu ebe ahụ adịghị ukwuu maọbụ maa mma dịka Ụlọukwuu ahụ. Eleghịanya ndị ahụ eyighị uwe dị ọcha dịka ndị-nchụàjà ahụ nọ n’Ụlọukwuu, kama ha yikwasịrị uwe nke eziomume na ịdịnsọ, n’ihi na edoro ha niile nsọ, ha nọ kwa n’ịdị n’otù. Ndi-ozi iri na otù ahụ na nne na ụmụnne Jisọs nọ n’ebe ahụ. Mgbe ná-adịghị anya site n’oge ahụ, Jisọs arịgowo n’Eluigwe nime igweojii; ma Ọ gwaworo ndịa sị “Agēji Mọ Nsọ me unu baptism mgbe ọtutu ubọchi nāgagh-agabiga site n’ugbu a.” N’ebe ahụ, n’ụlọ elu ahụ, n’irubeisi n’ihe Jisọs nyere n’iwu, narị na iri mmadụ abụọ ndịa cheere mkwà nke Nna ahụ. Hà nọrọ na nche n’efu? É-è, n’ezie! “Na mberede ùzù dika nke oké ifufe nke nēfesi ike, we site n’elu-igwe, o we juputa ulo ahu dum ebe ha nānọdu ala. Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n’asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu” (Ọlu Ndi-ozi 2:2-4). Mwụpụ nke Mmụọ Nsọ a ka amaara dịka “Miri-ozuzo nke Mbụ.”

Mmiriòzùzò nke Ikpéazụ

Ọzọ kwa, mgbe ihe ra ka puku arọ abụọ gasịrị ihe nke a mesịrị n’ụlọ elu ahụ, nime obodo Los Angeles, California, ka ahụkwara òtù ntà ọzọ nke ndị kwere ekwe. Obi ha niile dị kwa ọcha n’ihi na edoro ha nsọ. Ọ dịghị òtù ndị na-akpọ ụbọ na-afu kwa opi, ọ dịghị kwa ihe-ndozi ọ bụla nke eji ọlaedo mee dị n’ebe ahụ dị ala.

N’April 6, 1906, dịka Okwu Chineke si dị, awụpụkwara Mmụọ Nsọ ahụ dị ngọzi dịka n’Ụbọchị Pentikọst. Nke a bụ mwụpụ nke Mmụọ Nsọ nke “Miri-ozuzo Ikpe-azụ” site kwa na mgbe ahụ óké ìgwè mmadụ anatawo otù Onyinye ahụ.

Iji Ndụ Chụbiga Àjà Ókè

Ị natawo mnwapụta a nime obi-gị? Ị chọwo, ma rue ugbu a ị natabeghị ọzịzá nke ekpere gị? Nyochaa “ulo-ikwu” gị. Lezie anya na iwukwa-siwo n’elu Ntọala dị ike bụ Jisọs Kraist. Ì jewo ijè mbụ ahụ rue Ugwu Moraia e wee tinye Ọbara ahụ n’obi-gị? Mgbe nke a gasịrị, ì jewo n’Ugwu Jehova ọzọ wee were ihe furu gị ihe chụọàjà? Ọkụ ahụ ọ dakwasịwo àjà gị? Ènyewo gị uwe ọcha ahụ, uwe nke eziomume na ịdịnsọ -- odudonsọ? Mgbe nke a gasịrị, ị wetawo ihe niile nke ọlaedo na ọlaọcha debe ha n’ụlọàkụ nke Jehova? Ọ na-ewe anyị ijiobichụaàjà dị omimi tupu anyị anata mnwapụta a. Ì nyewo onyinye, chụọ kwa àjà nke ana-apụghị ịgụta ọnụ dịka Solomon bụ Eze mere?

Ọ dị njikere dị n’obi-gị inye Chineke n’afọofufo mgbe ohere pụtara imere Ya ihe ọ bụla? Ọ pụrụ ịbụ ihe dị ntà dịka ihicha oche n’ụlọchọọchị maọbụ ihe ahụ na-enye mmekpàarụ ntà dịka ikwe ka onyensọ nke Chineke nke na-agabiga n’obodo-gị soro gị dinaa n’ụlọ-gị. Eleghịanya Chineke ná-achọ ka ị nọgide n’ekpere karị tupu ị gbapụ ijé n’ụlọakwụkwọ n’ụtụtụ. Maọbụ, òlee ihe banyere onyeọhụụ ahụ bịara biri unu nso -- ị kpọwo ya òkù ịbịa n’ụlọakwụkwọ Ụbọchịụkọ? Gịnị mere i kwughị sị: “Agaghịm enye Chineke ihe ahụ m’na-ejighi ego zụta. Enyem ihe dum n’efu. Agam-eme ihe niile Chineke sịrịm mee.” Ọ bụru na ijiobichụaàjà gị zuruòkè, chere ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ, bụọ otuto Ya, “N’ihi na Ọ di nma: n’ihi na rue mgbe ebigh-ebi ka ebere-Ya di,” rue mgbe ebube Jehova ga-ejupụta ụlọ-gị Onyenkasịobi e wee bịa nọgide nime ụlọikwu-gị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Kọwaa njèm atọ ahụ e jere n’Ugwu Moraia.
  2. Gịnị ka njèm niile ahụ n’otù n’otù na-egosipụta?
  3. Òlee ndị buuru Igbe Chineke ahụ?
  4. Òlee ebe edebere Igbe Chineke ahụ nime Ụlọukwuu ahụ?
  5. Òlee ihe eji etò Chineke ejiri kpọọ abụ mgbe edoro ụlọ ahụ nsọ?
  6. Chineke Ọ zara ekpere Solomon?
  7. Gịnị mere mgbe abụ dara ndị ahụ wee bụọ kwa abụ?
  8. Kọọ banyere ngosi nke ugbò abụọ Jehova gosiri Solomon Onwe-ya n’abalị.
  9. Depụta ihe ụfọdụ ụmụntakịrị na ndị ntorọbịa nwere ike imere Jisọs.
  10. Òlee ahụhụ Chineke sịrị na Ya ga-ezidakwasị Israel ọ bụrụ na ha échigharịa pụọ n’ebe Ya nọ?