I Ndi Eze 10:1-29

Lesson 259 - Junior

Memory Verse
“Le, egosighm nkera-ya” (I Ndi Eze 10:7).
Notes

Ezenwanyị Ahụ

Solomon nwere onye ọbịa. Ọ bụ ezenwanyị nke Sheba, onye Jisọs kwuru okwu banyere ya dịka “ezenwanyị nke ndịda.” O sitere “n’ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomon” (Matiu 12:42). Ihe na-eme mgbe onye-ọchịchị ọ bụla na-ejekuru onye-ọchịchị ọzọ, ọ na-abụ n’ihi ime mkwekọrịta maọbụ ka adị n’otù, idozi nsogbu ọ bụla dị n’ihi ókè ala ha, ime ka ohere dị banyere ịzụkọrịta ahịa, maọbụ ka ezi nghọta dị n’etiti ndị bi ná mba abụọ ahụ. Ezenwanyị Sheba ejekwurughị Solomon n’ihi nke ọ bụla n’ihe ndịa. Ọ bụghị kwa na ọ na-agabiga nnọọ n’obodo ahụ! O nwere ihe ọ bu n’obi wee bịa -- iji anya ya hụ ihe niile agwaworo ya banyere Solomon, ịnụ banyere aha Jehova, na ime ka afọ ju ya banyere àkụ na amamihe nke Solomon.

Ọbịbịa nke ezenwanyị a dị ka onye mmehie nke ná-abịakute Onyenwe anyị. Ọ dị nzọụkwụ ọ zọrọ nke yiri nzọụkwụ nke onye ná-achọ Chineke ga-azọ. Ọ dị ihe dị ná ndụ ya nke yiri nke dị ná ndụ ndịkom, ndịnyom, na ụmụntakịrị ndị na-anata Oziọma.

Ịnụ Akụkọ

Ezenwanyi a anụwo akụkọ banyere Solomon na amamihe ya. Agwaghị anyị otú o si nụ ya, maọbụ onye kọọrọ ya, maọbụ ebe ọ nọ mgbe ọ nụrụ akụkọ ahụ. Site n’otù ụzọ maọbụ n’ụzọ nke ọzọ akụkọ a ruru ya ntị. Nke a bụ nzọụkwụ mbụ nke onye mmehie ga-azọkwa. Ọ ghaghị ịnụ ihe banyere nzọpụta, na apụrụ ịzọpụta ya, na Jisọs nwụkwara n’ihi mmehie ya.

Ọ bụghị otù ụzọ ka mmadụ niile si anụ ihe banyere Oziọma. Ụfọdụ na-anụ banyere nzọpụta ná nzukọ okporoụzọ, ndị ọzọ ka ana-enye akwụkwọ Oziọma mgbe arụ ná-adịghị ha ike n’ụlọọgwụ. Ana-akpọ kwa ndị ọzọ òkù ịbịa ná nzukọ, maọbụ ha nụ ịgbaàmà nke onyeagbataobi ha maọbụ nke nwanne ha nke azọpụtaworo. Chineke na-alụ ọlụ n’ọtụtụ ụzọ pụrụ iche ime ka ụmụmmadụ nụ ihe banyere nzọpụta. Akọrọ akụkọ banyere otù onye nke hụrụ iberibe akwụkwọ nke Apostolic Faith n’ebe dị anya site n’ebe mmadụ bi; ọ gụrụ iberibe akwụkwọ ahụ wee nụ akụkọ nke nzọpụta. O kweere ya wee chọọ Chineke rue mgbe ọ matara na azọpụtawo ya. Náánị Chineke matara otú iberibe akwụkwọ ahụ nke Oziọma si rue ebe ahụ mmadụ ná-ebighị.

Ọtụtụ ndị ọzọ ná-efe Chineke anụworị akụkọ Oziọma n’ụzọ dị ịtụn’anya -- ma ha nụrụ ya! Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasịobi nye onye ọ bụla. Jisọs bụ “Ezi ìhè ahu diri, Nke nēnye madụ ọ bula nke nābia nime uwa ìhè” (Jọn 1:9).

Ịnwapụta n’Onwe-ya

Mgbe ezenwanyị nụsịrị akụkọ ahụ, o jughi ya afọ rue mgbe o jekwuuru Solomon ịnwapụta ya. Eleghịanya o nwere ọtụtụ ihe n’ụlọ ukwuu ya mara mma dịka ọtụtụ ndị-enyi na ndị-oru, egwuriegwú dị icheiche, ezi nri, na uwe dị óké ọnụahịa; ma o nweghị afọojuju. Ọ bụ onyeọchịchị, nwee kwa àkụ, ma o nwere mkpà siri ike.

Onye ná-amaghị Chineke adịghị enwe afọojuju. O nwereike bụrụ onye nwere ọnọdụ dị elu n’etiti mmadụ nwee kwa ọtụtụ àkụ nke ụwa, ma ọ ka nwere mkpà, afọ adịghị eju kwa ya.

Ebe ọ bụ eze na-achị, Ezenwanyị Sheba aghaghị-rị inwe ọtụtụ ndị kwesịrị ekwesị gbara ya gburugburu ọ ga-ezigaworị ịga hụ Solomon. O zigaghị onye ọ bụla ọzọ ijé nwapụta Solomon. Obi ezughị ezenwanyị a ike rue mgbe o ji anya ya abụọ hụ Solomon ukwuu ahụ.

Ịhụ onye ọzọ ka ọ na-ahụ ịma mma nke Onyenweanyị na ọbụná ịmata na ndị ọzọ na-anwapụta nzọpụta ezughi. Onye ọ bụla aghaghị ijekuru Chineke ka o wee nwapụta nzọpụta n’onwe-ya. Na azọpụtara nne na nna apụtaghị na azọpụtawo ụmụ ha. Ụmụ ntakịrị aghaghị kwa ikpe ekpere n’onwe-ha wee mata na azọpụtawo ha. Ọbụná ma asị na mmadụ nwere ụmụnne ndịkom, ụmụnne ndịnyom, nne na nna, ụmụnne ọzọ, na ndi-enyi azọpụtara, ọ pụghị inwe afọojuju rue mgbe o nwere mnwapụta ahụ n’onwe-ya.

•sụụ Camel Dị Ukwuu

Ezenwanyị a jere ijè dị anya rue Jerusalem. Ọtụtụ camel dị n’ụsụụ ahụ, ná-ebu onyinye dị icheiche dị óké ọnụahịa. Ná-arụghịụka o nwere ọtụtụ ndị so ya na ọtụtụ ihe ha bu. Eleghịanya ijé ahụ bụ nke siri ike ọbụná jupụta kwa n’ihe izendụ. Eleghịanya ezenwanyi na ụsụụ ya jere ijè ọtụtụ ụbọchị ịgabiga ọzara n’ebe mmadụ ná-ebighi, gabiga ugwu dị icheiche dị elu nke ukwuu ebe ndị-ori ga-apụworị izuru ihe ha bu. Ọ dịghị izendụ ọ bụla dị ukwuu karịa! O kpebiri ịhụ eze ahụ. Ọ ga-arapụworị onye ọzọ ilekọta alaeze ya mgbe ọ na-anọghị, ma o kpebiri ịhụ Solomon na ịjụ ya ajụjụ ya niile ahụ siri ike.

Mgbe onye mmehie ji obi ya niile ná-achọ Chineke, ọ na-ejikere ịgbalịsi-ike. Ọ na-abịakute Jisọs were obi ya niile chọọ imezu ihe niile Jisọs chọrọ jikere kwa inye Onyenweanyị ndụ na ịhụn’anya ya. Ọ dịghị mmekpa arụ maọbụ nsogbu nke karịrị ịgafe ka e wee nweta nzọpụta.

Ajụjụ Dị Icheiche

Anabatara ezenwanyị nkeọma. E nyere ya ohere ya na Solomon bụ eze ikwurita okwu. Ọ gaghị enweworị afọojuju ya na otù nime ndịkom Solomon ikwurita okwu. O chọrọ ịhụ Solomon. O wepụtara ajụjụ ya niile siriike n’iru ya. Ọ gwara Solomon ihe niile dị ya n’obi, ọ dịghị nke o zonarịrị ya.

Ezenwanyị ahụ lere Solomon na amamihe Chineke nyere ya ule, site n’ịjụ ya ajụjụ dị icheiche siriike. Solomon nyere ya ọzịzá ha niile. Ọ bụrụ na o jikereghị ịkọwapụta mkpà ya, ọ garaghị inweta ọzịzá ha.

Solomon bụ ụdị Kraist Onye nwere ọzịzá nye ajụjụ na nsogbu niile. Ọtụtụ mmadụ adịghị anwapụta Jisọs. Ha adịghị ejekwuru Ya maka ogbugbo nke mkpà ha. Ha ejikereghị ikwere na ha nwere mkpà. Ọ bụrụ na Ezenwanyị Sheba ji omume na ya mazuru ihe niile na ya enweghị kwa ajụjụ ọ bụla i jekwuru Solomon, ọ ga-alaworị ná-enwetaghị ogbugbo nke mkpà ya niile. Ezenwanyị ahụ rịọrọ, ya mere na ọ natara (Matiu 7:7).

Àkụ nke Solomon

Ọ tụrụ ezenwanyị ahụ n’anya nke ukwuu mgbe ọ nụrụ amamihe nke Solomon ma hụ kwa ụlọ ya maramma. Usoro na otú esi eme ihe, ìgwè ndịorù na ndị na-enye aka, àkụnaụba nke uwe na iheoriri ha na-egosịpụta, na nsọpụrụ nke Solomon ji abànye n’Ụlọukwuu Chineke ifé-òfùfè tụrụ ya n’anya nke ukwuu.

Ọtụtụ ihe dị nke mmadụ ga-ahụ mgbe ana-egosị ya gburugburu ebe ahụ Solomon wuworo obíeze ya. E nwere ihe-nrịgo isii, na ihe mgbakwasịụkwụ nke eji ọlaedo mee nke ná-eduru n’ocheeze nke ọdụ nke eji ọlaedo nke ana-agwaghị agwa machita (2 Ihe Emere 9:17). Ọdụm na-eguzo n’akụkụ abụọ nke ocheeze ahụ na n’akụkụ abụọ nke ihe-mgbakwasịụkwụ ahụ, ọ dịghị kwa alaeze ọzọ e nwere ocheeze dị otú ahụ.

N’ụlọ nke óké ọhịa nke Lebanon ahụ, eleghịanya aga-enyeworị mmadụ ohere ịñụ iheọñụñụ site n’ọkwa eji ọlaedo mee, n’ihi na ihe niile dị ebe ahụ bụ ihe eji ọlaedo ana-agwaghị agwa wee mee. Ogige na ebembata niile dị kwa nke eji nkume dị óké ọnụahịa tọọ ntọala ha (I Ndi Eze 7:9). Hairam, otù nwoke nke Taia, onye “juputara n’amam-ihe na nghọta na ihe-ọmuma ije ozi ọ bula n’ọla” mere ogidi dị ukwuu nke ebembata Ụlọukwuu ahụ (I Ndi Eze 7:14, 21). Ogidi niile ahụ nke eji ọla mee maramma nkeukwuu na urodi niile na pomegranate niile bụ ọlụ alụkwasịrị ya.

E nwere ụmụ nnụnụ maramma nke ukwuu na ènwè nke ụgbọ Tashish buteworo site n’ebe dị kwa anya. Ọtụtụ ụgbọala na ịnyịnyaibu na ịnyịnyamule dị kwa nke enyeworo Solomon dịka onyinye. Ọtụtụ onyinye ka ụmummadụ nke “uwa nile” nyere Solomon bụ ndị ná-achọ ịnụ amamihe nke Chineke tinyeworo n’obi ya. Ha na-eweta onyinye ka ịbụ-enyi ha wee dịgide -- ọ bụghị n’ihi na ha na-atụ Solomon egwù kama n’ihi na ha hụrụ ya n’anya ná-ájá kwa ya mma.

N’otù arọ ọlaedo Solomon natara karịrị nde dọla (dolar) iri na iteghete, ná-agụnyeghị ndị na-azụ ahịa ụdà isiụtọ na ndị niile ọzọ. “Eze, bú Solomon, we di uku kari eze nile nke uwa n’aku na n’amam-ihe.” Ọ dịghị kwa ịtụn’anya na ume adịghị kwa nime Ezenwanyị Sheba “mọ adigh kwa nime ya ọzọ.”

Akụkọ bụ Eziokwu

Okwu niile nke ezenwanyị ahụ kwuru dị ka ịgbaàmà. Ọ sịrị na ihe niile ya nụworo bụ eziokwu, ma ọbụná nkera nke ebube ahụ ka a ná-egosịghị ya. Amamihe na akụ nke Solomon dị ukwuu karịa ihe niile nke ọ nụworo. Ọtụtụ echewo mgbe mbụ ha nụrụ ihe banyere ebube nke nzọpụta, na ike nke Jisọs na-enye ibi-ndụ karịa mmehie, na ọ dị mma nke ukwuu karịa ihe ga-abụ eziokwu. Ma mgbe ha kpere ekpere wee nweta ọñụ nke nzọpụta n’onwe-ha, ha pụrụ ikwu dịka Ezenwanyị nke Sheba sị “Le, egosighm nkera-ya.”

Eleghịanya ezenwanyị ahụ nwere obi abụọ na Solomon pụrụ inwe amamihe na àkụ dịka ọ nụworo na o nwere, ma ugbu a ọ matawo na ọ bụ eziokwu -- n’ihi na ọ hụwo n’onwe-ya. Ná arụghịụka, o chere na ijè ya abụghị n’efu, n’ihi na eziokwu dị ukwuu karịa akụkọ banyere Solomon. Ịgbáàmà ya dị ka nke onye ọ bụla ọzọ nke chọtaworo Chineke bụ onye pụkwara ikwu ná mkwuwa okwu na mkwà niile nke Chineke bụ eziokwu. Onye ọ bụla nke azọpụtaworo matara na Chineke na-aza ekpere.

Ohere nke Ndịorù

Ezenwanyị Sheba gọziri Jehova n’ihi ịdịmma na obiọma Ya nye Solomon na ịhụn’anya Ya n’ebe ndị Ya nọ. O kwenyere na ọ bụ Jehova nyere Solomon amamihe ahụ. Mgbe emere Solomon eze na mbụ, ọ rịọrọ “obi nānu ihe ikpe” ndị ahụ ikpé (I Ndi Eze 3:9). N’ihi na Solomon arịọghị ihe banyere onwe-ya, bụrụ kwa ihe tọrọ Chineke ụtọ, Chineke wee sị na Ya ga-enye solomon ọ bụghị náánị amamihe kama na Ya ga-atụkwasịrị ya àkụ na ụba na nsọpụrụ na ogologo ndụ ọ bụrụ na o rubere Chineke isi (I Ndi Eze 3:10-14).

Ezenwanyị ahụ sịrị na ndịorù Solomon aghaghị ịbụ ndị nwere ọñụ ebe ha nwere ohere ná-anụ okwu eze mgbe niile. Eleghịanya ndịorù Solomon amataghị ohere ọma a ha nwere ibinyere Solomon ná-anụ okwu amamihe ya. Ka anyị onwe-anyị, dịka ndịorù nke Kraist, mata ma nwee kwa ọñụ n’ohere ọma nke anyị nwere. Anyị nwere Baịbụl, na okwu amamiihe ya niile nke ga-eweta ndụ ebighịebi ọ bụrụ na anyị erube isi. Anyị pụrụ ibinyere Kraist na ndị Ya mgbe niile. Ị pụrụ ikwupụta ụfọdụ nime ngọzi niile ọzọ nke ana-enye ndị ná-efè Onyenweanyị?

Onyinye enyere Solomon

Tutu Ezenwayị Sheba alaghachi n’ụlọ ya, o nyere Solomon onyinye dị icheiche. Ha bụ onyinye dị ókéọnụahịa -- ọlaedo na nkume dị ókéọnụahịa. O nyere ụdà nke ná-esi ísì ụtọ bara ụba karịa nke Solomon natawororị site n’aka onye ọ bụla ọzọ. Ọ chọrọ inye Solomon onyinye niile ahụ. Ọ bụghị amamihe nke Chineke tinyeworo n’obi Solomon ka ọ nụworo? Solomon ọ zaghị ajụjụ ya niile siriike? Ná nghọta nke a, na n’obiekele, ka o nyere onyinye niile ahụ. Solomon nwere akụ na ụba. Onyinye ya niile adịghị Ya mkpà, kama ọ nara ha. Ná mkwughachi, ọ natara “ihe nile nātọ ya utọ, ihe ọ bula ọ rịọrọ, nāgugh ihe o nyere ya dika aka eze, bú Solomon, si di.” O ji onyinye niile ahụ laghachi n’ala nke ya, na-agụghị na ọ hụwo Solomon nụ kwa amamihe ya! Ihe niile ndịa ná-agụghị na azara ajụjụ ya niile! Ihe niile ndịa ná-agụghị na afọ juru ya!

Onye ka Solomon Ukwuu

Lee otú o si dị ka onye azọpụtaworo! Ndị azọpụtara hà adịghị enye Chineke ndụ ha n’ijiobichụaàjà dịka ezenwanyị nyere ọlaedo? Ndị azọpụtara, hà adịghị enye Chineke talent ha dịka o nyere ọtụtụ ụdà na nkume dị ókéọnụahịa? Mmadụ na-eji ndụ ya chụara Chineke àjà ná-anata kwa site n’óké akụ nke Onyenweanyị. Ọ na-anata ọzịzá nye nsogbu ya niile siriike. Afọ na-eju ya. Ana-enye ya agụụ nke obi ya; ihe ọ bụla ọ rịọrọ n’aha Jisọs (Jọn 14:14) ná-ekwere n’okwukwe (Matiu 21:22; Mak 11:24) ọ ga-anata (Matiu 7:7).

Lee otú ọ ga-adịworị ebube ịhụ Solomon! Ma anyị pụrụ ịmata Onye ahụ “ka Solomon uku.” Solomon apụghị inye onye ọ bụla nzọpụta; ma Jisọs, Ọkpara Chineke, na-azọpụta anyị site ná mmehie niile nke anyị. Site n’ekpere anyị pụrụ ịgwá Ya ihe niile dị anyị n’obi, ná-ezoghị ihe ọ bụla. Anyị nwere ohere ọma dị ukwuu karịa nke Ezenwanyị Sheba -- anyị pụrụ ijekwuru Jisọs Kraist, Ọkpara nke Chineke n’onwe-Ya Onye ahụ ka solomon ukwuu.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye bịara ịhụ Solomon?
  2. Gịnị mere o ji bịakute Solomon?
  3. Gịnị ka o ji jee Jerusalem?
  4. Gịnị ka ọ jụrụ Solomon?
  5. Gịnị ka ọ na-ekwu mgbe ọ sịrị, “Egosighm nkere-ya”?
  6. Gịnị ka ezenwanyị ahụ natara n’aka Solomon?
  7. Gịnị ka o nyere Solomon?
  8. Gịnị mere ezenwanyị Sheba ji ná-agọzi Chineke?
  9. Òlee ndị nọ ugbu a dị ka Ezenwanyị Sheba?
  10. Ònye bụ onye ahụ ka Solomon ukwuu?