Luk 1:1-38; Matiu 1:18-25

Lesson 260 - Junior

Memory Verse
“Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bú, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi” (Matiu 1:23).
Notes

Anyanwụ nke Eziomume Ahụ

Ndịamụma nke Testament Ochie abụwo abụ ọtụtụ mgbe banyere ụbọchị ahụ mgbe Onyemgbapụta Israel, Mesaia ukwuu ahụ É térè mmanụ, ga-abịa wee gbajie ike nke ndịiro ha niile. Malakai, onye ikpeazụ n’etiti ndịamụma edewo site ná mkpali nke Chineke: “Unu ndi nātu egwu aham ka anyanwu nke ezi omume gāwara, ọgwugwọ di kwa na nkù-Ya” (Malakai 4:2). Ụbọchị ọhụụ gaje ịbọ mgbe óké ìhè na-enwuenwu ga-agbawa n’ọchịchịrị nke mmehie, Onyenweanyị site n’Ebube ga-abịa iwetara ndị-Ya Israel nzọpụta.

Ugbu a olu ndịamụma adịghị-ekwu kwa okwu. N’ihe ruru narị arọ anọ anụghị okwu ọ bụla site n’Eluigwe. Ọchịchịrị nke imemmụọ gbara n’ala ahụ, nke ná-agbachisi kwa ike ụbọchị niile. Náánị ncheta nke ihe ndịamụma bu ụzọ deworo na-eme ka olileanya dị. N’ezie Mesaia ahụ ka ga-abịa!

Olenaole Kwesịrị Ntụkwasịobi

N’akụkụ niile nime oge ọchịchịrị ahụ ndịkom na ndịnyom ka bi kwa bụ ndị kweere na Chineke agaghị-arapụ ndị-Ya. Ha fekwara Chineke nke Israel òfùfè -- ná-ekpé ekpere ná-enwe kwa olileanya.

Ọtụtụ NdịKraist taa, ndị ana-esogbu n’obodo ndị ná-ekweghị na Chineke, na-etinye okwukwe-ha n’ọbịbịa Jisọs, ná-agbanyeghị ọchịchịrị nke imemmụọ gbara ha gburugburu. Chineke na-eme ka olileanya dị ndụ nime obi ndị ahụ kpebiworo ijikere mgbe Jisọs ga-abịa.

Ụdị okwukwe a ka Zakaraias na Elizabet nwere. Ha bụ ndị sitere n’agbụrụ Eron, onyeisinchụàjà mbụ; ugbu a Zakaraias nwere ohere ọma ijéozi nime Ụlọukwuu, ná-ele kwa anya ọbịbịa Jisọs.

Ndị mụrụ Zakaraias debeworo okwukwe-ha nime mkwà niile nke Chineke, aha nke ha rọpụtawokwaara nwa ha pụtara, “Chineke naecheta.” Ha nwere nchekwube na Chineke echezọghị nkwà-Ya, nke O buru ụzọ kwe Iv n’Ubi ahụ agbaraogige, na Ya ga-ezite Onyemgbapụta. Òlee otú ọ ga-esi ghara imezu? Chineke kwekwara Abraham mkwà ahụ ọzọ, wee jiri ịñụiyi mee ka o guzosieike. Apụghị imezu ya. Agaje ịgọzi agbụrụ niile nke ụwa site na Mkpụrụ nke Abraham, nke a apụghị-ịbụ onye ọzọ ma ọ bụghị Kraist, Onyenzọpụta. Ọ ghaghị ịbịa!

Ma ọtụtụ arọ ike ọgwụgwụ gabigara ma ìhè ntà ọ bụla adịghị. Kama nke a, ọ dị ka ụwa na-agba ọchịchịrị karị. Ụfọdụ ndị Israel esiwo na ndọrọ adọọrọ ha n’agha jee Babilon wee lata na Jerusalem ná-enwe olileanya na ụbọchị ọhụụ ahụ adịwo nso, ma ha ahụghị ihe dị iche n’ihi na ndụ na-aga n’iru dịka ọ dị na mbụ.

Herod onye Ukwu ewughachịwo Ụlọukwu Chineke ahụ na Jerusalem. N’ezie nkume ọcha (marble) ka eji wue obíeze ahụ maramma. Ebembata nke ọwụwaanyanwụ ka eji ọlaedo techie, nke ná-egosipụta ìhè nke anyanwụ ụtụtụ. Ma ọ bụ okpokoro ụlọ maramma nke mmadụ wuru. Igbe Ọgbụgbandụ efunarịwo ha n’oge ndọrọn’agha, ọ bụ náánị otù nkume dị n’ọnọdụ ya dị nsọ n’Ebe Nsọ kachasị Ebe Nsọ Niile -- nke na-egosi na ebube Chineke arapụwo ha.

Arapụrụ ndị Israel ka ha na-eme kwa ememe òfùfè ha, ndịnchụàjà na-eje kwa ozi ha mgbe o ruuru ha dịka Solomon kenyeworo ha ọtụtụ narị arọ garaaga. Ụmụmmadụ na-agbakọ n’azụ mgbidi nke Ụlọukwu ahụ ikpé ekpere, ebe ndịnchụàjà nọ nime, ná-esurere Jehova ihe nsureọkụ náesiísìụtọ. Ha na-eru uju n’ihi ebube ahụ nke ná-adịkwaghị, ná-ekpe kwa ekpere maka ọbịbịa nke Mesaia ha. Jehova, rùe ole mgbe?

Ịbụ Onyenchụàjà nke Zakaraias

Oge eruwo na èzínaụlọ nke Abia nwe ijéozi n’Ụlọukwu, ọ bụ kwa Zakaraias bụ onyenchụàjà ha. Ya na nwunye-ya bụ ndị na-asọpụrụ Chineke, ndị hụrụ ihe niile enyere n’iwu n’anya na-eme kwa ha. Obi dị ya ụtọ n’ijere Chineke ozi.

Ka Zakaraias na-eyikwasị uwe niile nke ndịnchụàjà wee bulie ihe ná-esìísìụtọ baa n’Ebe Nsọ isure ya n’elu ebeịchụàjà eji ọlaedo mee, dịka ndịnchụàjà Eron meworo otù puku na narị arọ ise gara-aga, obi-ya na-awụli n’ọñụ n’ijéozi-ya. Òlee ebe ọzọ ọ pụrụ ịnọ nso Chineke karị maọbụghị n’Ebe Nsọ Ya? N’ezie Chineke ga-anụ kwa ekpere ya. Aha-ya ọ bụghị Zakaraias -- “Chineke na-echeta”?

Achọrọ Otù Nwa-nwoke

Zakaraias na nwunye-ya aghọwo agadi. Mgbe ha ná-aghọbeghị agadi, tinyere ekpere ha na-ekpe maka udo nke Israel, ha na-ekpe kwa ka enye ha nwa; ma Chineke azabeghị arịrịọ ha.

Mgbe Zakaraias jebiri ozi-ya niile n’Ebe Nsọ ahụ, onyeọbịa sitere n’Eluigwe mere ka obi lọọ ya mmiri. Na mberede mmụọozi nke Jehova mere ka ahụ ya anya n’etiti ebe iheịdọbaoriọna ọlaedo na ebeịchụàjà ihe náesìísìụtọ. Mkpughe sitere n’Eluigwe! Ọ ga-abụ na ọgwụgwụ nke narị arọ anọ nke ịgbá nkịti (400) ahụ agwụsiwo? Chineke, Ọ na-achọ ịgwá ndị-Ya okwu ọzọ site n’ọnụ onyeamụma? ọ bụ kwa Zakaraias bụ onyeamụma ahụ? Ka-ọbụ mmụọozi ahụ ọ chọrọ ikwusa ọbịbịa nke Mesaia ahụ? Nke a ọ bụ ihe ahụ nke Zakaraias na-echere ná-ele kwa anya ná-ekpe kwa ekpere n’ihi ya? Ma Zakaraias tụkwara egwù.

Atụla egwù, Zakaraias. Jehova anụwo arịrịọ-gị. Ọ bụ iheịtụn’anya n’ezie, ịhụ mmụọozi ka o ji ozi site n’Eluigwe guzo n’iru ya! Chineke anụwo ekpere-ya, Ọ gaje kwa inye ya nwa nwoke.

Ọ dịwo anya Zakaraias kwụsịrị ikpé ekpere banyere nwa. O chere na oge agawo -- kama ọ dịghị mgbe oge na-aganarị Chineke. Chineke na-akwụghachi ikwesị ntụkwasịobi Zakaraias na Elizabet. Ugbu a ọñụ-ha ga-ezu òkè. Zakaraias, ị ga-amụ nwa-nwoke! Lee ụdị nwa ọ ga-abụ! Aha-ya aghaghị ịbụ Jọn, nke pụtara “Onyinye sitere n’amara Chineke.”

Ụbọchị aga-amụ nwa ahụ nye Zakaraias na Elizabet ga-abụ ụbọchị ọñụ; kama nwa ahụ agaghị-abụ nke náánị ha. Mmụọozi ahụ sịrị: “Ọtutu madu gāñuri kwa ọñu n’ọmumu-ya. … Ọtutu madu nime umu Israel ka ọ gēme kwa ka ha chigharikute Onye-nwe-ayị Chineke.”

Okwu nke Ndịamụma

Ndị-Juu niile bụ ndị eziomume agụwo amụma nke Aisaia, ná-ekwu banyere onyeozi ga-ebutere Mesaia ahụ ụzọ. Ọ ga-aga n’iru idozi obi ụmụmmadụ ịnabata Jisọs mgbe Ọ bịara. Onyeozi a ga-abụ náánị olu, nke ná-eti mkpu n’ọhịa; ma ozi ọ ga-ekwusa ga-amalite agba ọhụụ. “Ya onwe-ya abugh Ìhè ahu, kama ọ biara ka o we gbara Ìhè ahu àmà” (Jọn 1:8). Jọn bụ onyenkwusa ahụ kwusara ọbịbịa nke ụbọchị ọhụụ.

Ozi nke Jọn Onyeọwụmmiri ga-ezi ga-abụ: “Chègharianu; n’ihi na ala-eze elu-igwe di nso” (Matiu 3:2). Ihe niile ndịamụma kwuworo banyere ọbịbịa mbụ nke Mesaia ka aga-emezu ugbu a. Ha na-ekwurị mgbe niile banyere ụbọchị ahụ nke ná-abịa. Ma ọ bịawo ugbu a. N’ikpeazụ ọ bịawo! Ọ ga-abụ ohereọma nke obiụtọ nye Jọn Onyeọwụmmiri iji aka-ya tụọ Jisọs, Nwaatụrụ nke Chineke.

Ekweghịekwe nke Zakaraias

Ozi a nke mmụọozi wetara dị ukwu na Zakaraias apụghị ịnagide ya. Òlee otú nke a ga-esi mee? Emezughị agụụ obi ya banyere nwa mgbe ọ ka dị n’okoroọbịa. O wee chee na apụghị ime ya ugbu a n’ezie. Ma nke a ọ bụghị mmụọozi Gebriel, onye sitere nnọọ n’iru Chineke bụ onye ná-agwa ya okwu? Chineke n’Onwe-ya ezigawo mmụọozi ahụ izí Zakaraias ozi ọma ahụ. Gịnị mere ọ ga-eji nwee obiabụọ?

Gịnị mere anyị na-enwe obiabụọ ná mkwà niile nke Chineke? Okwu-Ya na-eguzosiike dịka ehihie na abalị. Anyị na-asị na anyị kweere Chineke, ma lee otú okwukwe anyị na-ama jijiji ọtụtụ mgbe! Ka anyị kpee ekpere ka Chineke nyere anyị aka ịtụkwasị Ya obi, kwere kwa mkwà Ya niile.

Zakaraias sịrị ka enye ya iheiribaàmà, e wee nye ya. Ọ gaghị-apụ ikwu okwu rue mgbe emezuru mkwà ahụ. Rue ọnwa iteghete na-abịa ọ gaghị-enwe ike ikwu okwu ọ bụla, n’ihi na o kwereghị ozi nke mmụọozi ahụ. Mgbe ọ ga-enwe ike iji anya ya abụọ hụ na ya enwewo nwa, aga-emeghepụ ọnụ-ya.

Ozi nke Mmụọozi Nye Meri

Ọ bụghị náánị nke ahụ bụ ozi Gebriel nwere izí. Mgbe ọnwa ise gasịrị ọ bịaghachịrị n’ụwa ọzọ. N’oge a, o mere ka otù nwaagbọghọ onye-Ju sitere n’ebo Juda hụ ya anya. Ma lee ụdị ozi ọ na-ewetara Ya! Ọ gaje ịbụ nne nke Mesaia ahụ! Nime ogologo arọ niile ahụ ana-echere ka emezue mkwà Chineke, nwaagbọghọ Ju ọ bụla enwewo olileanya na ya pụrụ ịbụ onye ga-abụ nne nke Eze Israel onye ga-anọkwasị n’ocheeze Devid. Meri ka enyere nsọpụrụ ahụ ugbu a. O sitere n’agbụrụ eze Devid; ma ebube nke usoro ịbụeze nke Israel emebiwo nime ọtụtụ narị arọ nke ịbụorù nke ndị Babilon na mkpagbu nke ndị Rom. Nne nke Onyenweanyị enweghị àkụ maọbụ óké aha nime ụwa nke a, kama ọ bụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ. O biwo ndụ ime ihe ga-atọ Ya ụtọ; ugbu a mmụọozi wee sị ya: “Ekele, gi onye Chineke meworo ka i nara amara, Onye-nwe-ayi nọyere gi. Chineke mere gi amara.”

Chee échìchè ụdị ọñụ Meri ga-enweworị ịnụ okwu dị otú a site n’ọnụ mmụọozi nke Chineke! Chineke ahụwo ọtụtụ arọ o ji ikwesị ntụkwasịobi ná-efè Ya òfùfè, ịdịọcha na ịdịnsọ ya. Ọ hụwo ya mgbe eleghịanya ọ na-échèghi na O nwere ike ná-ele ya. Ọ hụwo ihe niile o meworo -- ọ hụtawo kwa amara n’iru Ya.

Ka ọlụ anyị niile bụrụ ụdị ga-atọ Onyenweanyị ụtọ! Ka anyị ná-echeta mgbe niile na Jisọs na-ahụ ihe niile anyi na-eme. Mgbe O nwere ọlụ pụrụ iche aga-alụ, Ọ maara onye Ọ ga-arọpụta, onye ga-ejikere n’ihi ọlụ ahụ.

N’ihi na ndụ Meri na-atọ Chineke ụtọ, Ọ rọpụtara ya ịbụ nne nke Mesaia ahụ. Eluigwe na-eruru ala, Ọkpara Meri bụ kwa Ọkpara Chineke. Chineke na-ezite Ọkpara Ya nime ụwa n’anụarụ.

Onyeọbịa Nke Josef Nwere

Otù ọbịbịa ọzọ mmụọozi ahụ bịara. O mere ka Josef hụ ya anya, wee gwa ya na aghaghị ịkpọ Ọkpara Meri Jisọs, “n’ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya ná nmehie nile ha.” Aga-akpọ kwa ya Immanuel, nke pụtara “Chineke nọyere ayị.” Chineke gaje ileta ndị-Ya n’ụzọ dị ukwuu karị ka O meworo na mbụ. N’ụdị mmadụ Ọ gaje ibinyere mmadụ.

Chi ahụ na-abọ. Ụbọchị ọhụụ dị nso. Jisọs, Onye bụ Ìhè nke ụwa ga-emeri ọchịchịrị nke mmehie. Mgbe ná-adịghị anya aga-amụ Anyanwụ nke Eziomume, nke Malakai Onyeamụma ochie deworo banyere ya. Ọ ga-ekechi ọnyá ndị obi-ha tiwaraetiwa, gwọọ ndịọrịa, mee ka ndị kpuruisì hụ ụzọ, kwusaa kwa nye mmadụ niile n’ebe niile (ma ha bụ ndị-Ju maọbụ ndị Mbaọzọ) na ohere dịrị ha ịbịa ka azọpụta ha site ná mmehie niile ha.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye bụ onyeamụma ikpeazụ nke Testament Ochie?
  2. Arọ òle gabigara site na mgbe o kwuru okwu rue mgbe amụrụ Jisọs?
  3. Gịnị ka aha ahụ bụ Zakaraias pụtara?
  4. Òlee èzínaụlọ amụrụ Zakaraias? gịnị bụ kwa ọlụ-ya?
  5. Ònye mere ka ọ hụ ya anya nime Ụlọukwu? Gịnị bụ kwa ozi o zìri?
  6. Gịnị bụ iheiribaàmà na ozi ahụ aghaghị imezu?
  7. Gịnị ga-abụ ọlụ Jọn Onyeọwummiri ná ndụ-ya?
  8. Gịnị bụ ozi Gebriel ziri Meri?
  9. Òlee otú ịdịmkpà nke ozi ahụ ra?