Lesson 261 - Junior
Memory Verse
“Emela ka iwe-gi di ọku n’ihi ndi nēme ihe ọjọ, ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo” (Abù Ọma 37:1).Notes
Mbipụ Ngwangwa Nke Ndị Náeme Iheọjọọ
Devid dere sị: “Emela ka iwe-gi di ọku n’ihi ndi nēme ihe ọjọ, ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo. N’ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa, dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu.” Aga-ebipụ ha n’oge n’adịghị anya!
Ọgan’iru nke ndị ná-eme iheọjọọ nwere ike bụrụ ihe ịtụn’anya nye ụfọdụ mmadụ. Gịnị mere ha na-erita urù ra otú a ná-agbanyeghi ndụ ọjọọ ha? Otù nime ndịamụma dere otù mgbe sị: “Ekwosorom ndi nānya isi ekworo, (mgbe) ọ bu udo nke ndi nēmebi iwu ka m’nāhu. … rue mgbe m’nābà n’ebe nsọ nile nke Chineke, ghọta ikpe-azu-ha. N’ezie ọ bu n’ebe nile nālọ alọ ka I nēdo ha: I mewo ka ha darue ntikpọ” (Abù Ọma 73:3, 17, 18).
Baịbụl na-agwa anyị sị, “Nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n’ubi” (Ndi Galetia 6:7); ya mere, ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịhụ ndị náemebiiwu ka ha na-enwe àkù na ụba ná-enwe kwa iheọma niile nke ndụ, mgbe ọ bụ náánị site n’ịgbalịsịike ka OnyeKraist kwesịrị ntụkwasịobi ga-enwe ntakịrị, anyị aghaghị icheta na oge mpịazi na-abịa. Aga-enye onye ajọomume ọ bụla ahụhụ -- ma ọ bụghị na ndụ a, ya abụrụ n’ụwa nke ná-abịa.
Devid kwukwara sị: “Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji, ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n’ala mara ya.” Ọ pụrụ igosipụta site n’akụkụ niile na ya na-eme nkeọma, dị kwa mma ile anya, “o we gabiga, ma, le ọ nọgh.”
Ọtụtụ ndị ná-emebiịwu na-aghọ ndị dị ike nke ukwuu ọbụná mgbe ụfọdụ ha na-ekwujọ Chineke. Chineke n’ebere Ya, nwere ike ghara ibipụ ha na mberede, ma oge na-abịa mgbe aga-ebibikọ ndị njehie niile n’otù.
Ndịnketa Nke Chineke
Gịnị bụ ọgwụgwụ nke OnyeKraist? Ọ bụ onyenketa nke Chineke, ya na Chineke ga-ebikọ kwa ebighịebi. Pọl Onyeozi hụrụ ọtụtụ ahụhụ mgbe o nyesịrị Jisọs obi-ya, ma ọ dịghị mgbe ọ dara mba. Ọ na-ele anya n’iru ịhụ ihe ahụ ana-agbata n’ọsọ nke ọ maara na ya ga-anata n’aka Onyenweanyị. Ọ na-añụrị ọñụ mgbe o chetara na NdịKraist bụ ụmụ Chineke, “Ma ọ buru na ayi bu umu, ayi bu kwa ndi-nketa; ndi-nketa nke Chineke, na ndi ha na Kraist nēkekọ; ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi na Ya nāhukọ ahuhu, ka ewe nyekọ kwa ayi na Ya otuto” (Ndi Rom 8:17).
Onyenwe anyi kwere mkwà sị, “Ka ihe JEHOVA tọ kwa gi utọ; Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.” Mgbe ụzọ-anyị niile na-atọ Jehova ụtọ, Ọ na-enwe ọñụ inyeghachi anyị ụgwọọlụ. Ekpere anyị na-adị Ya mma. “Ọ gagh-egbochi ezi ihe n’ebe ndi nējeghari n’izu-okè nọ” (Abù Ọma 84:11).
Ndị egburu n’ihi okwukwe-ha
Ndịa bụ mkwà dị ebube nke Chineke kweworo; ma ọ dị mgbe ọ na-adị ka Chineke adịghịaza ekpere NdịKraist nye kwa ha ihe obi-ha na-arịọ. Òlee ihe banyere ọtụtụ nde mmadụ ndị egbuworo n’ihi okwukwe-ha, ndị hụkwara ọtụtụ ahụhụ jọgburu onwe-ha nke ndị ọjọọ pụrụ ichepụta. Ihe Jehova tọrọ ha ụtọ, ma otú ọ dị, ha hụrụ ka anapụrụ ha ihe niile ha nwere, tinyekwara ndụ-ha. Hà chọrọ ahụhụ na obimgbu niile ahụ?
N’ile ya anya na mbụ mmadụ pụrụ ichè na Chineke arapụwo ha. Ma lee ha anya mgbe ha na-eje ebe aga-egbu ha. Gịnị bụ ìhè ahụ dị n’anya ha? Hà hụrụ Jisọs? Pọl Onyeozi dere banyere Moses, na ọ nagidere “dika ọ nāhu Onye ahu Nke anāpugh ihu Ya anya” (Ndi Hibru 11:27). Gee ntị n’abụ nke ndị ahụ ana-egbu n’ihi okwukwe-ha na-abụ ka ana-atụbara ha ọdụm ịdọgbu ha. Obi dị ha ụtọ na agụrụ ha ná ndị kwesịrị ịhụ ahụhụ n’ihi Onyenzọpụta-ha.
Okpueze nke Ndụ
Ọchịchọ obi ha bụ isoro Onyemgbapụta ha kpuru okpueze, emezuwo kwa ọchịchọ obi ha ahụ. Taa ha na-abụ abụ mmeri gburugburu ocheeze Chineke. “Ngọzi nādiri nwoke onye nātachi obi n’ọnwunwa: n’ihi na mgbe anwaputaworo ya, ọ gānata okpu-eze ahụ, bú ndu, nke Onye-nwe-ayi kwere mkwà inye ndi huru Ya n’anya” (Jemes 1:12). Ụgwọọlụ-ha bụ okpueze nke ndụ. Olileanya ịnata okpueze ahụ nyeere ha aka ịnagide oge niile nke ihemgbu ahụ akpọrọ ha ịnagide.
Mgbe apịara Ndịozi ihe n’ihi ikwusa Jisọs, “ha siri n’iru nnọkọ-ikpé ahu la, nāñuri na aguru ha na ndi kwesiri ka eme ha ihe-ihere n’ihi Aha ahu” (Ọlu Ndi-ozi 5:41).
Ike sitere n’Eluigwe
Satan na-ejikọta ike ọjọọ-ya imegide NdịKraist. Anyị amataghị mgbe aga-akpọ anyị ịhụ ahụhụ n’ihi Kraist. Ma anyị onweanyị bụ ndị hụrụ Ya n’anya site n’obi-anyị niile ga-enwe ike ahụ sitere n’Eluigwe nke ga-enyere anyị aka ịnagide ihe ọ bụla n’ihi Ya. Ọ bụrụ na anyị nwere mkpagbu siri ike n’ụwa a, anyị maara na ọ ga-agabiga mgbe ná-adịghị anya. Mgbe anyị kukwara ume ikpeazụ, anyị na Jisọs ga-anọ n’Ebube. N’otùntabianya, anyị ga-esi ná ndụ nke a baa ná ndụ ebighịebi, ebe ọñụ anyị na-agaghịakwụsị.
Ndị dị Umeala n’obi
N’Okwu Chineke Kraist kwuru n’elu Ugwu, Ọ sịrị, “Ngọzi nādiri ndi di nwayọ n’obi: n’ihi na ndi ahu gēketa uwa” (Matiu 5:5). Chineke gosịrị Devid eziokwu a n’oge nke ya. O dere sị, “Ma ndi di ume-ala n’obi gēnweta ala; iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.” Devid kwukwara sị, “Ndi di ume-ala n’obi gēri ihe, riju kwa afọ” (Abù Ọma 22:26).
“Ka afọ ju gị” Lee ka okwu ndị ahụ si dị mkpà! Anyị na-ahụ ọtụtụ mmadụ n’ụwa ndị nwere karị ka mkpà-ha ra, ma afọ ejughi ha. Mgbe niile ha na-achọ inwe karị. Ọ dịghị onye pụrụ inwe afọajuju ná-enweghi Jisọs nime obi-ya. Ma mgbe o nwere ịhụn’anya Chineke, afọ na-eju ya, ma o nwere ihe ọ bụla ọzọ maọbụ na o nweghị. “Ọ di nma inwe ihe ntà na egwu Jehova, kari inwe ọtutu àkù ma ọgbugba-aghara adi ya” (Ilu 15:16). Pọl sịrị, “Mu onwem mutara, n’ọnọdu ọ bula m’nọ inwezu (afọ ojuju) nime ya ihe nile nākpam nkpà” (Ndi Filipai 4:11).
Pọl amụtawo inwe afọojuju. Anyị na-amụta inwe afọojuju n’ihe niile mgbe anyị na-atụle ịhụn’anya Chineke n’ebe anyị nọ. OnyeKraist bụ ihe dị ókéọnụahịa nke Chineke. Jisọs ejiwo Ọbara-Ya zụta anyị, O mewo kwa ka o doo anyị anya na “ọbuná agiri-isi” nke isi anyị ka agụworo ọnụ. “Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n’ihu-n’anya ego; ka afọ ju unu n’ihe unu nwere ugbu a: n’ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M’gagh-ara gi aka ma-ọli, M’gagh-arapu kwa gi ma-ọli” (Ndi Hibru 13:5).
Ana-enweta ọgan’iru nke ụwa a site n’óké mgbalị, ịchọsiike ịnọ n’iru onye ọzọ, na site n’ime onwe-ya dịka ọ na eme nkeọma karị ndị na-ámá-ya aka. Ma iwu nke Onyenwe anyị dị nnọọ iche site na nke a. Ka anyị na-enwe obiumeala n’iru Ya karị, ná-etinye kwa uche-anyị n’aka-Ya, anyị gana-enwe ọgan’iru karị n’ijè-anyị dịka NdịKraist. Ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị-enwe ihe-onwunwe nke ụwa a dịka ndị-enyi anyị ndị jupụtara n’ịchọsi ihe nke ụwa ike, ma ụbọchị na-abịa mgbe anyị ga-eketa ụwa wee soro Kraist chịa ọchịchị. N’ezie, Onyenweanyị gwara Jọn n’agweetiti nke Patmos na onye na-emeri “gēketa ihe ndia.”
Obi tọrọ Pọl Onyeozi ụtọ nke ukwuu n’ihi ihenketa ahụ ọ maara na ya nwere ná ndụ nke ná-abịa na o dere sị “Anamagu na ahuhu nile nke oge di ugbu a ekwesigh ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n’ebe ayi nọ” (Ndi Rom 8:18).
Ike nke ndị dị Umeala n’obi
Na ndị ajọ mmadụ na-aga n’iru n’ụwa a apụtaghị na ha dị ike karị ike ahụ nke ná-achịachị maka iheọma. Ike niile dị n’Eluigwe dịnyeere Jisọs, ma O nyere Onwe-ya ka aka ndị ọjọọ kpọgide Ya n’obe. Ọ sịrị na Ya pụrụ ịkpọ legion ndị-mmụọozi iri na abụọ, nke ga-apụworị ibibi ndị Rom na ndị Ju niile ejikọtara ọnụ imegide Ya -- ma O meghị ya. Oge ikpé erubeghị. N’ihi na ọ dịghị onye gbochiri ndị-nchụàjà na ndị-agha na mgbalị ha ibibi Jisọs, ha wee chee na ha dị ike na ọ dịghị onye pụrụ igbochi ihe ọ bụla ha chọrọ ime n’anyaukwu ha inweta ike.
Onyenwe anyị ga-achị ọchị mgbe mbibi nke ndị ajọomume bịara. Na mgbe ochie ka Inok buru amụma banyere ụbọchị ahụ mgbe Onyenwe anyị na ndị nsọ Ya ga-abịa, ime ihe ekpere n’ikpé n’ụwa, “na itu ndi nile ndi nāsọpugh Chineke ihe n’anya, bú ọlu nile nke asọpugh-Chineke ha nke ha luru n’asọpugh-Chineke,” ọbuná n’ihi “okwu di ìke nile nke ndi-nmehie ndi nāsọpugh Chineke kwugidere Ya” (Jud 15). Chineke sị na n’ihi na ndịmmehie jụrụ ịña Ya ntị, Ya ga-achị nhụjuanya ha ọchị, kwaa kwa emò mgbe egwù-ha na-abịakwasi ha (Ilu 1:26). Ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị na inwe mgbaghara nke mmehie anyị. Oge ga-agabigaworị mgbe ikpé maliteworo.
“Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi: n’ihi na ọdi-n’iru (nke onye ahụ bu udo) diri onye udo.” Ndụ anyị a dị mkpụmkpụ ga-agabiga mgbe na-adịghị anya. Ihe Chineke ga-ahụ nime anyị mgbe ndụ anyị gwụsịrị bụ ihe ga-adị mkpà. Ọgwụgwụ a ga-abụ nnọọ náánị mmalite nye ezi nwa Chineke. Ọ nọ ná-ejikere ugbu a n’ihi ndụ ahụ nke gaje ịbịa, ebe ihe niile ga-abụ ọñụ na udo; na ebe ya na Kraist ga-achị dịka eze na onyenchụàjà nye Chineke. Ọ ga-ahụ ọgwụgwụ onye ná-emebi iwu; ọ ga-eto kwa Onyenzọpụta-ya onye zọpụtara mkpụrụ-obi-ya site n’ụzọ niile nke ndị náemebiiwu, wee mee ka ọ bụrụ onyemmeri ịnọnyere Jisọs rue mgbe niile ebighịebi.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Gịnị gaje ime ndị náemebiiwu?
- Gịnị bụ ụgwọọlụ nke OnyeKraist?
- Kọwaa otú obi ndị egburu n’ihi okwukwe-ha naadị mgbe ha na-eje ịnwụ.
- Ònye ga-eketa ụwa?
- Gịnị na-eweta afọojuju ná ndụ mmadụ?
- Òlee otú anyị ga-esi nwee afọojuju?
- Gịnị bụ ọgwụgwụ nke “onye zuru òkè?”