Jenesis 1:1, 26; Aisais 6:1-5, 9, 10; 48:16; Abù Ọma 2:7, 12; Matiu 3:13-17; 28:19; Jọn 14:26; 15:26; Ndi-Hibru 1:1-14; I Pita 1:2; Nkpughe 4:8

Lesson 262 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUNISI: “Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n’anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere unu nile” (2 Ndi Kọrint 13:14).
Cross References

I “Chineke n’ụdi Ebube Atọ, Atọnimeotù Dị Ngọzi”

1. Chineke, Nna nke mgbe Ebighị-ebi.

(a) Chineke, Nna ahụ bụ otù Ebube -- otù Mmụọ -- Onye anwapụtara ụdị ebighị-ebi Ya site n’okwu Ya na ọlụ Ya niile, Ọpupu 3:13-15; Deuteronọmi 4:35-39; 2 Ihe Emere 6:14-18; Nehemaia 9:6; Abù Ọma 19:1, 7, 8; 90:1, 2; 97: 6; Malakai 3:6; Jọn 4:24; Ọlu Ndi-ozi 14:15-17; Ndi Rom 1:19, 20; 2 Pita 1:16-21; Nkpughe 4:8-11; 7:12

(b) Ihe niile dị iche iche nke ná-egosị ịdị-ukwu nke Chineke enweghị ọgwụgwụ, dịka Chineke Onwe Ya ná-enweghị ọgwụgwụ, Job 42:2; Abù Ọma 33:6-11; Aisaia 40:28; Matiu 19:26; Ọlu Ndi-ozi 17:27, 28; Ndi Rom 11:33-36; I Timọti 6:15, 16; Ndi Hibru 4:12, 13

2. Jisọs Kraist, Ọkpara Chineke site na Mgbe Ebighị-ebi

(a) Akwụkwọnsọ na egosi na Jisọs bụ Onye pụtara ìhè, Onye dị nsọ, Nke Ya na Chineke ra, ná-anọdụkwa n’ezi ịdị n’otù zuru òkè ná-enweghị nkewa, Abù Ọma 2:2, 7, 11, 12; 110:1; Ilu 30:4; Aisaia 6:1-5, 9, 10; Jọn 12:37-41; Aisaia 48:16; Matiu 3:13-17; 28:19; Luk 1:30-35; Jọn 1:1-3, 10; 6:32, 33, 38, 50, 51, 58, 62; 8:58; 14:26; 15:26; 16:28; Ndi Rom 1:1-4; Ndi Filipai 2:5-11; I Timọti 2:5; Ndi Hibru 1:1-4; 13:8; I Pita 1:2; Nkpghe 1:4, 5

(b) Enyere Karist aha nsọ dị iche iche, ana ahụ kwa ụdị nsọ dị iche iche na izu òkè niile nime Ya, Aisaia 9:6, 7; Matiu 7:29; 18:20; 28:18; Jọn 1:1; 5:26, 27; 6:64; 14:8-11; 16:15; 20:28; Ọlu Ndi-ozi 20:28; Ndi Efesọs 1:22; Ndi Kọlọsi 1:13-19; 2:9; I Timọti 3:16; Ndi Hibru 1:8; 2 Pita 1:1

(c) Kraist na alụ ọlu dị nsọ dị iche iche; Matiu 9:2-7; 25:31, 32; Mak 2:7-10; Luk 10:22; Jọn 1:3, 10; 5:22, 25-30; Ọlu Ndi-ozi 2:21; Ndi Rom 14:10; Ndi Efesọs 3:9; Ndi Kọlọsi 1:16; Ndi-Hibru 1:2, 10; Nkpughe 21:5

(d) Kraist nabatara ịkpọisi-ala nye Ya, Luk 24:51, 52; Ọlu Ndi-ozi 1:24; 7:59, 60; II Ndi Kọrint 12:8, 9; I Ndi Tesalọnaika 3:11-13; 2 Ndi Tesalọnaika 2:16, 17

(e) Emezuru amụma site na Kraist, Jenesis 3:15; Ndi Galetia 4:4; Maika 5:2; Matiu 2:1; Aisaia 7:14; Matiu 1:18 na Luk 1:26, 35; Aisaia 9:1, 2; Matiu 4:12-16; Deuteronọmi 18:15; Jọn 6:14 na Ọlu Ndi-ozi 3:19-26; Zekaraia 9:9; Jọn 12:13, 14; Abù Ọma 41:9 na Zekaraia 11:13; Mak 14:10 na Matiu 26:15; Aisaia 53:7; Matiu 26:62, 63; Abù Ọma 16:10 na 68:18; Matiu 28:9; Luk 24:50, 51

3. Mmụọ Nsọ, Onye nke Atọ nime Atọnimeotù Ahụ.

(a) Akwụkwọnsọ na-egosi na Mmụọ Nsọ ahụ bụ kwa Onye pụtara ìhè, nke Chineke Nna na Ọkpara zitere, Jọn 14:16, 17, 26; 15:26; 16:13-15; Ndi Rom 8:9; I Ndi Kọrint 2:10-12; Ndi Galetia 4:6

(b) Ọ dịghị ihe mgbagwoju anya dị n’ụdị Chineke (maọbụ ịbụ-Chineke) nke Mmụọ Nsọ ahụ n’ihi na enyere Ya aha nsọ dị iche iche, ụdị nsọ dị iche iche, Ọ na-alụ ọlụ nsọ dị iche iche, ọzọ ana-efè kwa Ya òfùfè, Jenesis 1:2; Abù Ọma 104:30; 139:7-10; Aisaia 6:3-9; Ọlu Ndi-ozi 5:3, 4; Ndi Rom 8:11, 26, 27; I Ndi Kọrint 2:10, 11; 3:16; 12:11; II Ndi Kọrint 13:14; Taitọs 3:5; Ndi Hibru 9:14; I Pita 3:18

(c) Mmụọ Nsọ bụ Onye pụtara ìhè nime ụwa Nke na eduru ụmụ mmadụ ná-abịakute Kraist, ná-eduru ndị kwere ekwe bamie rue nnwapụta dị omimi dị iche iche, ná-akpọ kwa ndị ozi ma na emeju kwa ha n’ike n’ihi ijéozi, Jenesis 6:3; Jọn 6:44, 65; 16:7, 8; Jọn 14:16, 17, 26; 16:13; Ọlu Ndi-ozi 1:8; 6:3; 13:2-4; I Ndi Kọrint 2:9-16; 6:11; 12:4-11

II Ịdịn’otù Nke Atọnimeotù Ahụ

1. Eziokwu ahụ nke ná-egosi na Chineke karịrị otù Ebube enweghị ihe mgbagwoju anya ọ bụla, Jenesis 1:1, 26; Ọnụ-ọgụgụ 6:24-27; Aisaia 6:1-5; 48:16; Matiu 3:13-17; 28:19; Jọn 14:26; 15:26; Ndi Efesọs 2:18; 4:4-6; I Jọn 5:7; Nkpughe 1:4, 5; 4:8

2. Eziokwu ahụ dị omimi nke a ná-apụghị ịghọtazu, banyere ịdị n’otù zuru òkè nke Atọnimeotù ahụ ka egosịpụta kwara ná-enweghị mgbagwoju-anya ọ bụla, Deuteronọmi 6:4; 2 Samuel 7:22; Aisaia 43:10-13; 44:6; Mak 12:29; Jọn 10:30-38; 14:8-11; 15:26; 16:15; 17:10, 11, 21-23

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Eziokwu banyere Atọnimeotù ahụ dị Nsọ, n’ebe ndị niile bụ ezi ndị nke Kraist nọ, bụ ihe dị nnọọ óké omimi bụrụ kwa àkụ dị óké ọnụ-ahịa -- eziokwu nke ná enweghị àtụ. Ọ bụ eziokwu nke aná-apụghị ịmazu n’òzùzù òkè ya, n’ihi nke a anyị aghaghi iji nsọpụrụ ná-amụ ihe banyere ya mgbe niile. Anyị aghaghị ilezi anya ịhụ na anyị adịghị amụta ihe banyere ya ná-enweghị nlezi anya maọbụ ná-ejighị nsọpụrụ, n’ihi na ọ bụ otù nime eziokwu nke okwu Chineke. Ọ bụ nnọọ eziokwu sitere na Chineke.

Okwu Chineke na Chineke Onwe Ya bụ otù, ndụmọdụ niile nke enyeworo anyị banyere idebe okwu ahụ n’ezie metụtara omume anyị n’ebe Chineke Onwe Ya nọ na okwukwe anyị kwere na Ya. Anyị matakwara na ọ bụrụ na anyị emebie otù nime iwu nke Chineke, anyị bụ ndị ikpé iwu ahụ niile mara; ya mere ọ bụ kwa eziokwu na ọ bụrụ na anyị ajụ otù Onye nime Ụdị Chineke ahụ, anyị na ajụ Atọnimeotù ahụ dị ebighị-ebi. Ọ bụrụ na anyị elelịa otù anya, anyị na eleli ha niile. Ọ bụrụ na anyị ekweghị n’otù, anyị ekwenyeghị na ha niile. Ọ bụrụ na anyị ajụ ịsọpụrụ otù, anyị na ajụ ịsọpụrụ ha niile.

Ụfọdụ na asị na ebe ọ bụ na ihe omimi Atọnimeotù ahụ dị nsọ dị ukwu rii nne na ọ gaghị abụ eziokwu. Ha na-agọnarị, maọbụ ná-elelị otù maọbụ karị otù nke Ebube niile ahụ dị n’Atọnimeotù ahụ, n’ihi na ha apụghị ịmata maọbụ ịghọta, ụdị ọdịdị ahụ ná-enweghị nsọtụ. Ma ihe niile ekpugheworo anyị ezuworo anyị. Ọzọ, n’ịtụgharị uche n’eziokwu ahụ nke dị ukwu sitere n’Akwụkwọnsọ banyere ihe ọmụmụ a, ọ dị mma ka anyị were obi anyị niile mara ha ná-esighị agụgọ, ná-arapụ ihe efù niile nke uche mmadụ nwere ike ichèpụta.

“JEHOVA Ya Onwe ya bụ Chineke”

Moses gwara ìgwè ụmụ Israel akpọkọtara na “JEHOVA, Ya Onwe ya bu Chineke” (Deuteronọmi 4:35). Anyị ga-ahụ na ọbụná na nwa mkpirikpi okwu a na enwere ihe ngosi pụtara ìhè banyere Atọnimeotù ahụ dị Nsọ. Anyị matara na mnwapụta a zuruòkè, n’ihi na okwu nke Mmụọ Nsọ ji wepụta iwu nke mkpughe dị nsọ zuruòkè, n’ihi na anyị matara na Chineke na ekwu ihe O zubere ime, ọzọ kwa Ọ na-eme kwa ihe ahụ Ọ na-ekwu.

Mgbe Mmụọ Nsọ, site na Moses, were aha a Jehova kwue okwu n’ebe a, Mmụọ Nsọ mere nke a n’ezi nleruanya. (Jehova bụ ezi aha Ya dịka ọ dị ná-asụsụ ndị Hibru, nke asụgharịrị ONYENWEANYỊ ná ntụgharị nke anyị ná Akwụkwọnsọ). Aha a Jehova bụ aha ahụ nke Chineke rọpụtara ka ewere mara Ya site ná mmeso Ya niile n’ebe ndị Ya nọ -- ndị nke ekekọtara Ya na ha site ná mmekọrịta dị icheiche nke Ọgbụgbandụ. Nke a ka akpọworo ezi aha nke Chineke, aha ahụ nke eji nnọọ mara Ya dịka aha nke aka Ya. Adịghị eji aha nke a mgbe ana ezi ndị ná anọghi ná mkwà nke Ọgbụgbandụ ozi. Mmụọ Nsọ na eji óké nleruanya kpáá ókè mgbe ọ bụla Ọ na eji aha a kwue okwu

Ọ bụ kwa ihe doro anya na Mmụọ Nsọ emeghị ndahie, maọbụ nlehieanya, mgbe ọ kpọrọ aha a n’asụsụ Ndị Hibru Elohim, n’ebe ọgụgụ nke a. (Elohim bụ aha Ndị Hibru nke ndị tụgharịri ya n’asụsụ Bekee kpọrọ Chineke). Ndịnsọ Chineke n’ọgbọ niile achọwo otú ha ga-esi kọwa aha ahụ, Elohim, ma dịka Chineke n’onwe Ya, o kweghị nkọwa. Ọ bụ otù nime aha nke Mmụọ Nsọ na-eji mgbe ọ na ezi ụwa niile ozi. Ọ na akọwa ihe niile Chineke bụ na ihe niile Ọ na eme, na nke O meworo, na nke Ọ gaje ime. Otù nime ụmụ akwụkwọ nke mara ihe nke ukwuu n’asụsụ mbụ nke eji dee akwụkwọ a n’ọgbọ gara aga kọwara Elohim n’ụzọ dị otú a.

“Chukwu ahụ Nke na adị ndụ site nime Onwe Ya, ná-enweghị mmetụta ọ bụla site n’ihe maọbụ onye ọ bụla ọzọ, Nke ná adị kwa ebighịebi: Chineke ahụ Onye ahụ nke nzube na omume Ya niile na asụpụta nime Ya, ná-enweghị mmetụta maọbu nzube si n’ebe ọzọ: Onye náánị Ya nwezu ike n’ọchịchị ihe niile; Nke kachasị ọcha, Nke kachasị n’ịbụgide náánị otù ihe, kachasị kwa n’ịbụ Mmụọ nime ihe niile ọ bụla dị adị; kachasị n’ime mma, ime ebere, eziokwu, na ịdị nsọ: isi na akpata ọdịdị ihe niile, Nke na ejide ihe niile na adị adị; jupụta n’ọñụ nke ná-enweghị àtù, n’ihi òzùzùókè ná-enweghị ókè; ná-enwe njupụta ebighịebi nime Onwe Ya; nọdụ na achọghị ihe ọ bụla nke O meworo; enweghị òkè n’ibuibu Ya, Ụdị Ya apụghị ịbatasị n’échìchè mmadụ, bụrụ kwa nke ana-apụghị ịkọwachasị otú Ọ dị: Onye nke náánị ya mazuru Onwe ya, n’ihi na uche nke na-adị ebighịebi pụrụ ịmazu ihe niile nke dị nime Ya Onwe Ya. Nime otù nkọwa okwu, otù Chukwu ahụ Onye, site ná amam-ihe ebighịebi Ya, nke ná-apụghị ime ndahie maọbu nke ana-apụghị iduhie; Onye kwa, site n’ịdịmma ebighịebi Ya, Ọ pụghị ime ihe ọ bụla ma ọbụghị ihe ahụ ziriezi, dị mma, na ebere.”

Ugbu a, nrọrọ nke aha abụọ ndịa nke Chineke maka itinye ha n’ihe ọgụgụ ntà a, “JEHOVA Ya onwe ya bụ Chineke,” pụtara ìhè nkeọma n’onwe ya. Ma ọ dị kwa ọtụtụ ụdị ihe dị iche ọzọ nke aha ahụ niile na-egosi nke ná-agwawa anyị okwu nkeọma n’ihe ọmụmụ nke a anyị na eleba anya.

N’ịmụ ihe n’asụsụ ndị Hibru anyị na achọpụta na aha a Jehova dịrị náánị otù onye ma Elohim na-egosi ịdịọtụtụ. Nke a na-egosi anyị na Chineke anyị, n’otù ụzọ, bụ otù ma karị kwa otù. Ibu échìchè a n’obi mgbe anyị na enyocha Akwụkwọnsọ na-ezi anyị na Ọ karịrị otù n’ebube ma dị kwa náánị otù n’ọdịdị Ya. Izuòkè nke nrọpụta aha ndịa bụ nke Mmụọ Nsọ rọpụtara ná-egosi na òzìzí nke Atọnimeotù ahụ dị Nsọ bụ eziokwu, n’ihi na ọ bụrụ na òzìzí ahụ bụ ụgha aha niile ahụ ga na-emegide onwe ha. Ya mere, ọbụná n’ihe ọgụgụ a dị nkénké anyị nwere ike ịhụ na Chineke anyị bụ otù n’ọdịdị Ya ma dị okpùkpù atọ n’ebube.

Ihe ngosi dị icheiche Ná-egosi Atọnimeotù Ahụ

Enwere ọtụtụ ihe mwapụta zuruòkè nke na-egosi eziokwu ukwu ahụ banyere Atọnimeotù dị Nsọ. Ná amaokwu mbụ nke Baịbụl anyị hụrụ na ejiri aha ahụ karịrị otù onye bụ Elohim, gosi na Jisọs Kraist na Mmụọ Nsọ, ha na Chineke Nna jikọtara ọnụ n’ọlụ nke òkìkè ụwa (Jọn 1:3; Ndi Kọlọsi 1:16; I Ndi Kọrint 8:6; Ndi Efesọs 3:9; Ndi Hibru 1:1, 2). Anyị gụkwara na ná mmalite, Elohim sịrị, “Ka ayi kpua madu n’onyinyo-ayi” (Jenesis 1:26). Mmụọ Nsọ enweghị ike ikwuhie ọnụ n’asụsụ okwu, ya mere anyị nwere ike ịhụ site na nke a ha karịrị otù n’ụdị Chineke.

N’ọhụ banyere Jehova Chineke nke Aisaia hụrụ, ọ nụrụ ka Ndị Seraph na-akpọ ibe ha, ná-asị “Nsọ, nsọ, nsọ, ka JEHOVA nke usu nile nke ndi agha di” (Aisaia 6:3). Ndị ná-amụ ihe banyere Akwụkwọnsọ na ndị-isi dị iche iche na-akpọ ya òkpùkpù atọ nke mbuli otuto enyere Ya.

Ọzọ, anyị na ahụ n’ebe a na eji aha ahụ bụ JEHOVA kwue okwu n’ihi na mgbe ọ bụla eji mmkpụrụ akwụkwọ ukwu depụta aha ahụ ONYENWEANYỊ, maọbụ CHINEKE n’akwụkwọ Baịbụl nke “King James” (“Eze Jemes” dere), ihe ọ pụtara n’asụsụ mbụ nke Hibru bụ Jehova. Ọ bụrụ na eji náánị otù mkpụrụ akwụkwọ ukwu malite aha ahụ Onyenweanyị dịka anyị ga ahụ na Aisaia 6:1; ihe ọ pụtara n’asụsụ Hibru bụ Adonai. Aha a Adonai, maọbu Onyenweanyị, mgbe eji ya tụnyere otù onye maọbụ otù nime ụdị Chineke ahụ na-egosi na onye ahụ eji ya tụnyere karịrị ndị ọzọ. Ihe ọzọ pụtara ìhè a ga-echèta bụ na ana-ejikarị aha a bụ Adonai ná-egosi ịdị ọtụtụ, na n’ụzọ ịbụ onye nwe ihe, nke ná-egosi na onye ahụ, mba ahụ maọbụ ihe ahụ enwe enwé bụ ihe Onye ahụ nwe ha karịrị otù.

Otù ụdị otuto òkpùkpù atọ ahụ nke Aisaia nụrụ n’ọnụ ndị bị n’eluigwe ka anụọhịa niile ahụ, maọbụ ihe niile ahụ dị ndụ, ndị nọ n’iru ocheeze Chineke gburugburu na-eti kwa (Nkpughe 4:6-11). Anyị na ahụ na anụọhịa ndịa niile na ndị-okenye iri abụọ na anọ ahụ ndị Jọn onye Ahụrụn’anya hụrụ, bụ ìgwè ndị-nsọ agbapụtara maọbụ ndịnsọ ndị ewelikọrọ (Nkpụghe 5:9). Ya mere, ná nchịkọta okwu a, anyị ga ahụ na ụsụ ndị mmụọ ozi na ndị nke Eluigwe na ndịnsọ ndị agbapụtara -- ndị nwere òkè ná mbiliten’ọnwụ nke mbụ ahụ -- na ejikọ ọnụ n’iji ụdị òkpùkpù atọ a ná-enye otuto na òfùfè. Aghaghị inwe ihe dị mkpà pụtara ìhè n’ịrọrọ ụdị otuto dị otú a, ma ọ bụrụ na ndị niile ga-eto Chineke n’Eluigwe na-eji ya!

Ugbu a, ọ bụrụ na Atọnimeotù dị Nsọ adịghị, Mmụọ Nsọ agaghị eleziworị anya n’ịrọpụta ụzọ inye otuto nke aga aghọta dịka mbuli otuto nye Atọnimeotù. Ọ bụrụ na atọnimeotù adịghị, otù mbuli elu otuto ezughị maka nke ahụ, mgbe ahụ, anyị ga ajụ sị, gịnị mere eji rọpụta atọ? Ọ bụrụ na otù ezughị, àyị ga-ewere ya, mgbe ahụ na atọ ezuwo? Ànyị ga asị: asaa, ọ gaghị aka mma, ebe nke a bụ ọnụ-ọgụgụ ana eji karị n’Akwụkwọnsọ mgbe a na-achọ iwepụta òzùzù òkè? Ọ bụrụ na eji òkpùkpù atọ nke mbuli otuto náánị n’ihi na otù ezughị, hà na asị, site na nke a, bụ ndị ahụ ná-enwe obi abụọ banyere òzìzí nke Atọnimeotù dị Nsọ, na Chineke ekwesịghị ịnara otuto anyị niile?.

Ma n’ịtụgharị uche banyere ọhụ nke Aisaia, ọ bụghị náánị okwu nke isi-agụgọ a ka anyị dabere banyere òzìzí nke a karịrị otù Ebube nime ụdị Chineke. Jọn Onye ahụrụn’anya kwuru ihe agwara Aisaia wee tụkwasị na “Ihe ndịa ka Esaisa (Aisaia) kwuru mgbe ọ hụrụ ebube Ya (Jisọs), we kwue banyere Ya (Jisọs)” (Jọn 12:37-41). Ma tụkwasị na nke a, n’Ọlu Ndi ozi anyị gụrụ na Mmụọ Nsọ kwuru okwu Aisaia nụrụ (Ọlu Ndi ozi 28:25-27). Ya mere anyị hụrụ na mgbe Aisaia “hụrụ Onyenweanyị” ọ hụrụ Atọnimeotù dị Nsọ; n’ihi na ọ hụrụ Chineke n’oche-eze Ya, hụ kwa Jisọs n’ebube a na-apụghị ịkọwa, wee nụ kwa olu nke Mmụọ Nsọ. Tụkwasị kwa nke a, Chineke kwuru okwu n’ọgwụgwụ ọhụ ahụ wee jụọ ajụjụ, “Ònye ka M’gēziga, ònye gēje-kwa-ra ayi?” Ọ bụrụ na ọ bụ otù onye dị nime Ebube atọ ahụ, óké ihe ndahie ga abụworị ihe akpachapụrụ anya mee n’ebe a site n’ịrọrọ okwu abụọ nọchịrị anya otù onye maọbụ karị nime otù ahịrị okwu ahụ. Ma anyị mara na ọ dịghị ndahie ọ bụla dị nime okwu a, n’ihi na ọ bụ Atọnimeotù ahụ ka Aisaia hụrụ ma nụkwa okù Ya.

Ihe Ngosi ọzọ Banyere Atọnimeotù na Testament Ochie

Enyere anyị ọtụtụ ebe ọzọ dị iche iche nke ná-egosi na nrọrọ nke mbuli otuto òkpùkpù atọ ahụ abụghị ihe ndapụta mberede, o gosighị kwa ihe ọzọ ma ọbụghị na Chineke dị Ebube atọ.

Okwu ngọzi nke Chineke nyere Moses, ka ọ gwa onye-isi nchụàjà ka o were ná agọzi ụmụ Isreal dị òkpùkpù atọ n’ụzọ esi mee ya na n’ụzọ esi nye ya. Nke a bụ ihe pụta kwara ìhè, n’ezie. Chineke sịrị, “Otú a ka unu gāgọzi umu Israel; unu gāsi ha, Jehova gọzie gi, debe gi: Jehova me iru Ya ka ọ mukwasi gi, Jehova me-kwa-ra gi amara: Jehova bulie iru-Ya n’aru gi, nye gi udo” (Ọnu ọgugu 6:23-26). N’ebe a akpọrọ aha Jehova ugbò atọ, eziokwu a, tinyekwara na aha ahụ bụ aha dịrị otù onye, ọ bụghị ọtụtụ mmadụ, na-egosịpụta na enwere Ebube atọ nime otù Chineke ahụ. N’ebe a, enyere ndị nke Chineke ngọzi pụtara ìhè site n’aka ebube Atọ ndịa, n’otù site n’iji otù aha-Ọgbụgba-ndụ ahụ.

Ihe Ná-egosi Atọnimeotù Ahụ na Testament Ọhụụ

Tụgharịkwa uche ọzọ banyere ihe ndịa, nke mere anyị ji nwee ike idepụta ya ná nkwuwa okwu na ná mkpụrụ akwụkwọ ukwu aha niile dịrị ụdị Ebube atọ ahụ nke dị nime Atọnimeotù dị Nsọ: Ngọzị nke Ndịozi na-egosi na ọ dị ụdị Ebube Atọ pụtara ìhè, n’ihi na ọ na asị, “Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n’anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere unu nile” (2 Ndi Kọrint 13:14). Ndị-nsọ nke Chineke nwere mkpọbata site na Kraist, “n’ebe Nna nọ nime otù Mọ Nsọ” (Ndi Efesọs 2:18); ma enyere anyị ngọzi nke amara na nke udo “nke si n’aka Onye ahu puta, bú Onye nādi adi, Onye di-kwa-ra, Onye nābia kwa; nke si kwa n’aka Mọ asa ahu puta, bú ndi nọ n’iru oche-eze-ya; nke si kwa n’aka Jisus Kraist puta, onye bu onye-àmà kwesiri ntukwesi-obi, onye eburu uzọ mu n’etiti ndi nwuru anwu” (Nkpughe 1:4, 5). Anyị agaghị elefuru okwu a anya nke dị mfé ná nghọta nke ná-asị, “Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu onye nāgba àmà, n’ihi na Mọ ahụ bu ezi-okwu” dịka edere ya na Baịbụl nke Eze Jemes tụgharịrị -- (n’ihi na ndị ahụ na-agbá àmà n’Eluigwe dị atọ, Nna ahụ, Okwu ahụ na Mmụọ Nsọ ahụ: ma ha atọ dịrị ime otù ihe ahụ) (I Jọn 5:7). Emere ka okwu ikpeazụ a pụta ìhè karịsịa n’ebe ọzọ nime Akwụkwọnsọ n’ihi na n’ebe ahụ nke na-egosi na Okwu ahụ bụ Jisọs Kraist Onwe Ya. (Gụọ Jọn 1:1-34).

Ihe ndịa bụ kwa ihe doro anya ma zukwa òkè: Jisọs sịrị, “Ọ buru na unu nāhum n’anya, unu gēdebe ihe nile M’nyere n’iwu. Mu onwem gēkpe-kwa-ra Nnam, Ọ gēnye kwa unu Onye-nkasi-obi ọzọ, ka Ọ nọyere unu rue mgbe ebigh-ebi”. “Onye-nkasi-obi ahu … bu Mọ Nsọ” (Jọn 14:15, 16, 26). Kraist kwuru, tutu Ọ bịa n’anụarụ, “Biakutenum nso, nurunu nka; site na mgbe mbu ọ bugh na nzuzo ka M’kwuworo okwu; site na mgbe ọdidi-ya, n’ebe ahu ka M’nọ: ma ugbu a Onye-nwe-ayi JEHOVA (Adonai Jehova) ezitewom, mu na Mọ-Ya” (Aisaia 48:16). Onye dere Abù Ọma dere: “Ọkparam ka gi onwe-gi bu; Mu onwem amuwo gi ta” (Abù ọma 2:7) ma “JEHOVA nāsi onye-nwem” (Abụ ọma 110:1). Agwara anyị, na Testament ọhụụ, na ihe ndịa edepụtara ná Abù Ọma dịrị náánị Chineke Nna na Jisọs Kraist bụ Ọkpara-Ya (Matiu 22:41-45; Ndi-Hibru 1:1-5).

Ihe Ngosi sitere n’Ihe odide dị Iche iche nke Ndịamụma

Onye amam-ihe ahụ matakwara ebube na omimi nke Ịbụ isi nke Chineke ahụ, n’ihi na ọ sịrị: “Ònye rịgoworo n’eluigwe, we rịda? Ònye chịkọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka Ya abụa? Ònye kegideworo miri n’uwe-Ya? Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike? Gini bu aha-ya, gini bu kwa aha nwa-ya, ma asi na i mara?” (Ilu 30:4). Devid dere, “Zim ime ihe di Gi utọ; n’ihi na Gi onwe-gi bụ Chinekem: Mọ Gị di nma” (Abù Ọma 143:10). Agwara anyị na mbụ, na Mmụọ Chineke na-erugharị kwa n’elu mmiri na Ya na ụmụ mmadụ na agbá-mgbá n’ihi mmehie ha niile n’oge mbụ ahụ (Jenesis 1:2; 6:3).

Ndị ọzọ ndị nwere mkpáli nke Mmụọ Nsọ edewo kwa banyere Ebube ndịa n’otù n’otù na ọlụ ha dị iche iche. “Mu onwen bu JEHOVA, bú Chineke-unu, na ọ digh onye ọzọ: … M’gāwusa Mọm n’aru anu-aru nile, bú madu” (Joel 2:27, 28). “Ọ bugh site n’usu-ndi-agha, ọ bugh kwa site n’ike, kama ọ bu site na Mọm, ka JEHOVA nke usu-ndi-agha siri” (Zekaraia 4:6).

Ihe Ngosi n’Ememe nke Ọwụwụ mmiri

Site n’ọtụtụ ebe anyị chịkọtara ọnụ, ná amụma dị iche iche eburu n’Akwụkwọnsọ nke ebuworo ụzọ depụta n’ebe a, na site kwa na nke anyị na agaghị enwe ohere ide n’ebe a, anyị ga atụgharị ebe ọzọ akọrọ akụkọ na Baịbụl ka anyị nwetakwuo ihe ngosi ndị ọzọ. Cheta na mgbe awụrụ Jisọs mmiri mgbe Mmụọ nke Chineke bekwasịrị Ya na olu nke Chineke Nna sitere n’Eluigwe, sị, “Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi mma” (Matiu 3:16, 17). Iwu ikpeazu Jisọs nyere ndị ná-eso ụzọ Ya bụ, “Ya mere, gānu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptizim bà n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ” (Matiu 28:19).

Ụfọdụ enyewo nkọwa ná-ezighịezi banyere usoro ọwụwụ mmiri nke Jisos site n’ikwu na ọ dịghị egosi Mmadụ atọ kama na ọ bụ náánị Otù onye nke jikọtara aha Atọ ndịa. Ha na akwagide òzízí ha site n’iwezuga ezi nkọwa nke ihe ụfọdụ edeworo n’Akwụkwọnsọ wee ná asị kwa na ekwesịrị ịwụ anyị mmiri náánị n’aha Jisọs. Ndịọzọ na asi na ha kwere ma nábata kwa òzízí nke Atọnimeotù ahụ dị Nsọ ma ha na-ejidesi ike na n’ihi ihe ndịa edepụtara na agwara anyị ka anyị ná-awụ mmiri náánị n’aha Onyenweanyị Jisọs Kraist. Isi-agụgọ ndịa bụ náánị iwezuga na imegide ihe edeworo n’Akwụkwọnsọ na òzízí ya niile pụtara ìhè.

N’itule ihe Jisọs kwuru banyere ụzọ aga-esi ná-awụ mmiri n’ebe dị iche iche na akwagide ya n’Akwụkwọnsọ, anyị na ahụ n’ezie na ọ na akuzi òzízí nke Ịdị atọ nke Ịbụ isi Chineke. Ebe ọzọ dị iche iche nime Akwụkwọnsọ, bụ ebe ná-eme ka anyị ghọta na aga awụ anyị mmiri n’aha Onyenweanyị Jisọs Kraist adịghị emegide onwe ha n’ụzọ ọ bụla ma-ọlị ma ọ bụrụ na anyị ghọta ezi nkọwa enyere ha n’ebe ahụ niile edepụtara ha. Ileba-anya n’ebe ọgụgụ ndịa (Ọlu Ndi-ozi 2:38; 10:48) na-egosi na ndịozi site ná mmeju nke Mmụọ Nsọ, na-ezi ma ná akwagide kwa ịbụ Chineke nke Kraist dịka ihe kachasị mkpà nke aga-etinye n’obi ndị ná-ege ha ntị n’oge ahụ.

Ọwụwụ mmiri nke Jọn Onye ọwụmmiri bụ owụwụ mmiri nke nchègharị. Ọwụwụ mmiri ahụ nke Jisọs tọrọ ntọ-ala ya dị kwa iche. Ọ bụ nke ịbànye n’okwukwe nke Ndị Kraist nke agba ọhụụ, na-egosi kwa ọnwụ anyị n’ebe mmehie dị na mbiliten’ọnwụ anyị, ka anyị onweanyị we jègharị kwa ná ndụ ọhụụ. Ọ bụ ụdị ọnwụ, òlìlì, na mbiliten’ọnwụ nke Jisọs. N’ihi nke a ka Ndịozi ahụ ji kwusie ya ike, bụ ụdị ọwụwụ mmiri Jisọs nyere n’iwu n’igosi ihe dị iche n’ebe ọwụwụ mmiri nke Jọn Onye ọwụ mmiri dị. N’òzízí nke Jọn Onye ọwụmmiri awụrụ ndị mmehie nwere nwute mmiri na mmiri nime ọwụwụmmiri nke nchègharị. Ma n’irubeisi n’iwu Jisọs; ana-awụ náánị ndị azọpụtaworo mmiri igosi ọlụ nke nzọpụta nke alụworo nime obi ha na igosi kwa ọnwụ na mbiliten’ọnwụ nke Onyenwe ha. Ya mere mgbe Ndịozi ahụ kwuru na aga-awụ ndịa mmiri n’aha Onyenweanyị Jisọs Kraist, ha ewezugaghị ụdị ọwụwụmmiri ahụ bụ nke Kraist nyere, n’ihi na ọwụwụmmiri ahụ na agwa ndị ahụ ná-ege ntị ka ha ga ka awụọ ha mmiri nke Jisọs kama ọwụwụmmiri nke nchègharị dịka Jọn Onye ọwụmmiri meworo ya.

Enwere ike ịchọ ọtụtụ ebe dị iche iche ebe Kraist kwuru okwu, mgbe Ọ nọ n’ụwa banyere Nna Ya Nke nọ n’Eluigwe, na mmekọrịta nke dị n’etiti ha, na kwa ịdị n’otù nke dị n’etiti ha, na Mmụọ Nsọ ahụ nke sitere n’ebe ha nọ.

Ịdị n’otù Nke Atọnimeotù Ahụ

Ebe anyị tụlesịworo site n’Akwụkwọnsọ ihe ahụ dum ná-enweghị mkwugide ọ bụla banyere Atọnimeotù dị Nsọ, ugbu a anyị ga atụgharị uche n’ịdịn’otù nke Atọnimeotù ahụ n’ihi na ọ bụ ihe ná ezighị ezi ichè na Ịbu isi Chineke ahụ bụ ụdị Chi atọ nwere onwe ha n’otù n’otù dịka ọ bụ kwa ihe ná-ezighị ezi mgbe ana-echè na Ọ bụ náánị otù Onye.

N’ebe a ka nnukwuu ihe omimi dị. Ọ bụ kwa n’ebe a ka mkpụrụobi mmadụ ná-enweghị ike ịghọta eziokwu ahụ edebere ya n’iru. Ọ bụ kwa n’ebe a ka okwukwe na ntụkwasị obi ná aghaghị ịnọchi ihe ahụ niile obi na atule, n’ihi na “ihe Ya anya nāhugh... ka anāhu nke-ọma ebe anāghọta ha site n’ihe nile ekère èkè, bú ike ebigh-ebi Ya na udi-Chineke-Ya” (Ndi Rom 1:20), enyebeghị kwa anyị ike nke ịghọta na ịmata ọtụtụ eziokwu ahụ nke ná-enweghị mgbagha, bụ nke anyị na ahụ anya nkeọma. Nke a bụ eziokwu anaara nkeọma n’eluụwa. Gịnị mere agaghị eme kwa otú a n’ihe nke Mmụọ?

Ọ bụ ihe ana-apụghị ime bụ ịkọwa ịdịn’otù nke Atonimeotù ahụ. Okwu niile nke asụsụ anyị bụ nke ya na ịdị n’otù pụtara otù ihe, ọbụná asị na anyị achịkọta ihe okwu ndịa nille pụtara, ha apụghị inye anyị nkọwa zuru òkè nke ịdị n’otù ahụ nke dị n’etiti Atọ ahụ dị Nsọ. Ihe niile nke ndị nwere ezi uche nke ọgbọ niile gara aga kọwara banyere ịdịn’otù a zuru òkè bụ náánị ime ka anyị mata na nke ntà omimi ya niile.

N’ihe niile ọzọ ana-echèpụta maọbụ ana atụle n’obi, anyị pụrụ ịhụ ọtụtụ ihe yiri ibe ha nke ná-enyere anyị aka ịghọta ihe ahụ ana-achọ ime ka anyị ghọta. Ma apụghị ịchọta ihe ya na Chineke yiri. Ọ bụghị kwa ihe dị mfé ịchọpụta ihe ngosi nwere ike izi anyị ihe ahụ anyị ná-apụghị ịghọta banyere ịdị n’otù nke Chineke, maọbụ Atọnimeotù Ya, n’ihi na náánị Ya, na nime Ya náánị, ka izuòkè nke ịdịn’otù dị. Ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’ụwa maọbụ n’okpuru anyanwụ nke nwere ịdị iche dị otú a, bụ ụdị a nke náánị Ya nwere, maọbụ ụdị oyiyi Ya. Nke ahụ, bụ kwa, otù eziokwu nke ịbụ Chineke Ya.

Ihe ngosi sitere n’Akwụkwọnsọ nke Ịdịn’otù nke Chineke

Mgbe Onyeozi Pọl na-ezi ndị Efesọs ihe banyere ụdị ịhụn’anya nke anyị dịka ụmụ mmadụ kwesịrị inwe n’ebe ibe anyị nọ, nkekanke ịhụn’anya na nsọpụrụ ahụ ná aghaghị ịdị n’etiti di na nwunye bụ ndị nke Kraist, o werewo kwa ịdịn’otù nke di na nwunye n’ụwa a tụnyere iheomimi ahụ nke Kraist na nzukọ Ya. Jọn Onyeozi nyekwara anyi ụdị iheomimi dị otú a bụ ịdịn’otù nke ná aghaghị ịdị n’etiti nzukọ Kraist; n’ihi na ọ gwawo anyị na Jisọs kpere ekpere “ka ayi nile buru otù” -- ka “ewe me ka ha buru ndi zuworo òkè ibu otù” -- dịka Ya onwe ya nọ nime Chineke, Chineke nọ kwa nime Ya. Ma anyị pụrụ ịhụ na ọbụná Mmụọ Nsọ enweghị ike site n’ihe ngosi maọbụ ihe pụtara ìhè iji zie ihe zuruòkè banyere ịdịn’otù nke ụdị Chineke; n’ihi na o nweghị ihe ngosi dị n’ụwa maọbụ ihe pụtara ìhè nke aga-eji kọwa okwu a -- iwepụta eziokwu ahụ n’òzùzù òkè ya nye mkpụrụobi anyị nime ụwa nke a.

Mmụọ Nsọ ewerewo ọlụlụ di na nwunye nke Ndị Kraist, maa àtụ iji gosi anyị nke ntà omimi ahụ ná-enweghị ọtụtụ site n’iji ịdịn’otù nke Chineke na Kraist tụnyere mmekọ na mnwekọ nke di na nwunye n’ụwa, nke n’ezie, n’onwe ya, ọ bụ ihe ana-apụghị ịkọwachasị na ịghọtachasị. Ugbu a, ọ bụrụ na anyị enweghị ike ịghọta ma mata kwa ihe ndị ahụ bụ ihe dị n’akụkụ arụ anyị na nke dị anyị gburugburu n’akụkụ niile, òlee otú anyị ga-esi ghọta nkeọma ihe omimi nke ná-enweghị ọgwụgwụ nke ná-enweghị ihe aga-eji tụnyere ya n’ụwa maọbụ nke ná-enweghị nkọwa nke ndị maara ihe? Anyị apụghị! Ma, ekele dịrị Chineke, na ọ dịghị mkpà ka anyị mee otú ahụ tutu anyi ewee bụrụ ndị nketa nke ngọzi niile nke enyere anyị site na ya, na n’ihi ya.

O zuworo anyị ịmata na otù ụbọchị, mgbe aga-ekpupu ihe mkpudo ahụ, na aga-eme ka anyi ghọta ihe omimi ndịa. Mgbe ahụ anyị ga amata dịka amaara anyị ma dị kwa ka Ya bụ Onye nyere anyị onwe Ya ka anyị wee nwee ndụ nwebiga kwa ya òkè.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Kpọọ aha ụfọdụ enyere Kraist nime Baịbụl.
  2. Kwue ebe ngosi ụfọdụ sitere n’Akwụkwọnsọ nke ná-egosi na Kraist bụ Ọkpara Chineke.
  3. Kwue ụfọdụ ebe n’Akwụkwọnsọ nke ná-egosi ịkarị otù Ịbụ isi Chineke.
  4. Gịnị kpatara ụmụ mmadụ ji anara òzízí nke ná-agọnarị Atọnimeotù ahụ dị Nsọ?
  5. Kwue ebe ị mara n’Akwụkwọnsọ ná-egosi na Mmụọ Nsọ bụ Otù onye nime Atọnimeotù ahụ
  6. Gịnị bụ usoro nke ọwụwụ mmiri Kraist nyere? Gịnị ka ọ na-egosi?
  7. Kwue n’okwu nke gị, ihe ọhụ ahụ Aisaia hụrụ pụtara na òzízí ukwuu dị iche iche nke Baịbụl kuziri. Maọbụ ná akwagide site na ya.
  8. Kọwaa ihe banyere ọwụwụmmiri nke Jisọs na otú esi kọwa òzízí nke Atọnimeotù dị Nsọ n’ebe ahụ.
  9. Gịnị bụ ọkwá dị ukwuu dị iche iche enyere Kraist ka O mejupụta (maọbụ nọchie) n’àtụmààtụ niile nke mgbapụta? Òlee nke O mezuworo? Òlee nke Ọ na-emezu ugbu a? Òlee nke fọdụrụ ka O mezue?
  10. Gịnị bụ ọlụ nke Mmụọ Nsọ? Òlee otú ọlụ Ya si daba na àtụmààtụ nke mgbapụta?