Jọn 17:21-23; Ndi Galetia 5:22, 23; Ndi Efesọs 4:17-32; 5:25-27; Ndi Kọlọsi 3:1-15; Taitọs 2:11-14

Lesson 263 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Egosiri amara nke Chineke, nēwetara madu nile nzọpụta, nādọ ayị aka na nti ka ayi we ju asọpurugh-Chineke na agu ihe ọjọ di n’uwa, we di ndu uche zuru okè na nke ezi omumue na nke isọpuru-Chineke n’oge di ugbu a” (Taitọs 2:11, 12).
Cross References

I Odudonsọ Zuruòkè

1. Odudonsọ na-eweta ịdịn’otù n’etiti ndị kwere ekwe, Jọn 17:21-23; Ndi-Hibru 2:11

2. Kraist nwụrụ ka O wee do Nzukọ ahụ nsọ, Ndi Efesọs 5:25-27; Jọn 17:9, 16, 17, 20; Ndi-Hibru 13:12.

3. Odudonsọ dịrị ndị kwere ekwe ná ndụ dị ugbu a, Taitọs 2:11-14; Luk 1:75

II Ịdị ndụ Dị nsọ

1. Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ na-apụta ìhè nime ndụ nke e doro nsọ, Ndi Galetia 5:22, 23; Ndi Efesọs 5:9; 2 Pita 1:5-7

2. Yipunu “madu ochie” ahụ, Ndi Efesọs 4:17-22; Ndi Kọlọsi 3:5-9.

3. Yikwasịkwanụ “madu ọhụ” ahụ, Ndi Efesọs 4:23-32; Ndi Kọlọsi 3:1-4, 10-15

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Mmehie

Mgbe ekèrè Adam nime Ubi iden Agbara ogige, ekèrè ya n’oyiyi Chineke. O zuruòkè, ná-enweghị nzube maọbụ ọchịchọ ọjọọ ọ bụla ma ọlị. Échìchè obi ya niile na ntụpụta nke obi ya niile dị ọcha dị kwa nsọ. Ékèrè ya “nime ezi omume na idi ọcha nke ezi-okwu ahu” (Ndi Efesọs 4:24). Ọ bụghị kwa mmebi nke mmadụ ime ya, mere ka o were uche obi nke onwe ya nupu isi n’ebe ihe Chineke nyere ya n’iwu dị, kama ọ bụ ọnwụnwa nke sitere n’èzí.

Ọnwụ

Mgbe Adam mehiere, ọ nwụrụ nime mmụọ: ekewapụrụ ya n’ebe Chineke nọ; ọchịchọ ya niile wee mebie; ọnọdụ mbụ nke uche ya niile na ịhụn’anya ya wee ghọọ ihe ná-ezughị òkè. Site n’oge ahụ gaa n’iru ụmụ Adam niile eyiriwo onyinyo nke ndị mbụ mụrụ ha. Kama ịbụ ndị amụrụ n’ịdị nsọ na eziomume, amụrụ ha nime mmehie. “Le n’ajọ omume ka amuputaram; ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem” (Abù Ọma 51:5). “N’ihi nka, dika nmehie si n’aka otù madu (Adam) ba n’uwa, dika ọnwu si n’aka nmehie ba kwa; ọnwụ we si otú a gabiga rue madu nile, n’ihi na madu nile mehiere” (Ndi Rom 5:12).

Ọchịchọ Anụ-arụ na Odudonsọ

Ndụ mmehie nke a bụ nke anyị niile ketara site n’aka Adam, ná-eme ọsọsọ duru ụmụ mmadụ bà ná njehie maọbụ n’ajọ omume dị iche iche. N’ihi nke a ka eji nwee ụzọ mmehie abụọ: mkpụrụ nke mmehie nke amụnyere nime anyị na ọlụ ọjọọ niile nke anyị onweanyị ji aka anyị lụọ` mgbe anyị toruru ógó ịmata iheọma na iheọjọọ. Mgbe ụfọdụ, ana-akpọ mkpọrọgwụ mmehie a amụnyere nime anyị “ụdị nke Adam,” “mmehie amụrụ anyị nime ya,” “mmadụ ochie ahụ,” “arụ nke mmehie,” na “mmehie ebupụta ụwa.” Mgbe onye mmehie na abịakute Chineke n’ezi nchègharị, ewee zọpụta ya, agbagharawo ya mmehie niile ya; nke a pụtara, ihe ọjọọ niile nke o mere ka ana agbaghara ya site n’Ọbara Jisọs, ewee tie mmadụ ochie ahụ ọkpọ nke ọdịndụ ọnwụ ka mma. Ọ bụ ezie na edowo ya n’okpuru -- kpọgide kwa ya n’obe -- apụghị ibibi mmadụ ochie ahụ ma ọ bụghị site na mbịanye n’Ọbara Jisọs nke ùgbò abụọ. Ana akpọgide “madu ochie” ahụ n’obe n’oge nzọpụta, ma ọ ka na-adị kwa ndụ n’elu obe rue mgbe odudonsọ na-ewetara arụ nke mmehie ahụ ọnwụ na mbibi. “Akpọgidekọrọ Ya na madụ oche ayi n’obe, ka ewe me ka aru ayi nke nmehie nwezu ghara idi irè” (Ndi Rom 6:6).

Odudonsọ bụ nsacha nke obi na ụdị ekèrè mmadụ site n’Ọbara Jisọs. A na-ebibi mmehie amụworo anyị nime ya, ewee sachapụ kwa ezughị òkè nke mmadụ ochie ahụ wee nyeghachị ya ụdị nsọ mbụ ahụ ékèworo mmadụ nime ya. Otú ọ dị, arụ ahụ nwere ike inwe nrịanrịa, uche anyị nwekwara ike ịdahie ná amaghịama na ịdabà n’ọnwụnwa dị iche iche, ma emewo ka obi ahụ dị ọcha dị kwa nsọ nke ga-eme ka o nwee ike iguzogide ike nke njọ. Site na nke a anyị ga ahụ ihe dị iche n’etiti izuòkè nke Adam na izuòkè nke NdịKraist. Tupu ha adàpụ, ndị mbụ mụrụ anyị zuruòkè n’obi, mkpụrụobi, uche na anụ-arụ. Emerụghị ụdị ha n’ụzọ ọ bụla dịka emerụrụ nke anyị. Ma mgbe e doro anyị nsọ ana asachapụ ụdị anyị site n’ọmụmụ, ọzọ ana-eme kwa ka obi anyị dị ọcha dị kwa nsọ. Anyị ezughị òkè n’ụdị na n’ụzọ Adam si zue òkè na mbụ, mgbe ọ na-emehiebeghị. Kama, anyị nwere izuòkè nke akpọworo izuòkè nke NdịKraist.

Baịbụl na-eme ka anyi ghọta nkeọma na odudonsọ adịrịghị ndị mmehie. Odudonsọ dịrị ndị agbapụtaworo -- Nzukọ Kraist. “Ndị bụ di, hunu nwunye unu n’anya, dika Kraist anyị hu-kwa-ra nzuko-Ya n’anya, rara kwa Onwe Ya nye n’ihi ya; ka O we do ya nsọ mgbe O mesiri ka ọ di ọcha site n’ọsisa miri n’okwu Chineke, ka Ya onwe Ya we che nzukọ ahu n’iru Onwe Ya dika ihe di ebube, nēnwegh ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbụ ihe ọ bula n’ihe di otú a; kama ka o we di nsọ buru kwa ihe anapugh ita uta” (Ndi Efesọs 5:25-27). Jisọs kpere ekpere banyere ido ndị ná-eso ụzọ Ya nsọ, “Ọ bugh uwa ka M’nēkpe ekpere banyere ya, kama anamekpe ekpere banyere ndi I nyeworom; … Ha esitegh n’uwa, dika Mu onwem nēsitegh n’uwa. Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu” (Jọn 17:9, 16, 17). Ya mere, odudonsọ bụ onyinye amara ná-esote nzọpụta.

Iji-obi-chụaàjà

Mgbe anatara onyinye amara nke odudonsọ n’obi, nwe kwa ụdị dị nsọ nke ná-enweghị kwa mmehie, Onye Kraist ahụ nọ n’ọnọdụ nke iché arụ ya n’iru Chineke, dịka “aja di ndu, ndi nsọ, nke di Chineke ezi utọ,” nke bụ ikpe ekpere ya dịka uche si dị (Ndi Rom 12:1). Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị onye ọ bụla edoro nsọ ifè Onyenweanyị òfùfè, ma ebe o nwere adịghị ike nke anụ-arụ ma nọdụ kwa n’ụwa nke jụpụtara ná mmehie, ọ bụ ihe dị mkpà na ọ ga-eji ndụ ya ná achụàjà mgbe niile; ná enyefe kwa ndụ ya n’aka Chineke, ka o wee ná-adị ndụ “n’obi ọcha na ezi omume n’iru Ya” (Luk 1:75) ụbọchị niile nke ndụ ya. “N’ihi na egosiri amara nke Chineke, nēwetara madu nile nzọputa, nādọ ayi aka ná nti ka ayi we ju asọpugh-Chineke na agu ihe ọjọ di n’uwa, we di ndu uche zuru òkè na nke ezi omume na nke isọpuru-Chineke n’oge di ugbu a” (Taitọs 2:11).

Ọnwụnwa

Setan ka nwere ike ịnwa onye edoro nsọ site n’anya na n’échìchè ya. O gosịrị Jisọs ala-eze niile nke ụwa, na ebube ha ma Jisọs guzogidere ya. Anyị onweanyị, nwekwara ike iguzogide Setan, “N’ihi na ọ bu ezie na ayi nējeghari n’anu-aru, ma ayi adigh-ebu agha dika anu-aru si ebu: (n’ihi na ihe-agha nke ibu-agha-ayi abugh nke anu-aru, kama ha sitere na Chineke bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike); ebe ayi nēweda ihe anātule n’obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n’agha iña nti Kraist” (2 Ndi Kọrint 10:3-5).

Setan na-eji échìchè na ihe ana atule n’obi eduhie nwa Chineke. Ọtụtụ mgbe, Setan na-ewebata échìchè ndịa na ihe ntule n’obi dị iche iche ịkpasu obi ilu na ịkpá iche iche n’etiti ụmụnna. Ọdudonsọ na-eweta ịdịn’otù nke ekwensu kpọrọ asị ma ná-achọ kwa mgbe niile ka ọ kwada ya. Ihe agha anyi nke Mmụọ na-eme ka anyị pụ iweda ihe niile ana atule n’obi, ná adọta kwa ihe niile ana échèpụta n’agha, anyị wee site n’ụzọ dị otú a guzogide ekwensu.

Ịdịn’otù

“Ka ha we buru otù, dika ayi onwe-ayi bu.” “Ka ha nile we buru otù, dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime ayi.” “Ka ha we buru otù dika ayi onwe-ayi bu otù.” “Mu onwem nime ha, Gi onwe-gi kwa nimem, ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù.” Okwu ịdịn’otù ndịa niile sitere n’ekpere Jisọs kpere banyere ndị ná-eso ụzọ Ya (Jọn 17). Lee otú o si dị mkpà n’ụbọchị taa ka edo anyị nsọ ka anyị wee nwe ike iguzogide nzube niile nke ekwensu ikewa na imeri anyị!

Mgbaghara

“Nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara gbaghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara gbaghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a” (Ndi Kọlọsi 3:13). Ewó! asị na ndị ná-akpọ onwe ha ụmụ Chineke ga-eme ka ha nweta amara ahụ n’òzùzù ya niile nime obi ha, nkọcha na nsogbu n’etiti ụmụ Chineke ga-adị ntakịrị karị otú ọ dị ugbu a. Chee échìchè banyere mgbaghara nke Chineke na ihe o furu Ya n’ọtụtụ nke amara Ya iji gbaghara anyị mmehie niile anyị na iji hichapụ ụgwọ anyị ji Chineke! Ànyị ga-esi añaa ghara ịgbághara ibe anyị! “Ma n’elu ihe ndịa niile yikwasinu ihu-n’anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè. Ka udo nke Kraist nēkpezi kwa okwu n’obi-unu” (Ndi Kọlọsi 3:14, 15).

Pọl sịrị Ndi-Hibru, “Nāgbasonu udo n’ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agagh-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nwegh ya.” Ọ bụ ihe sịrịike n’ebe ụfọdụ nọ ịgbaso udo n’ebe mmadụ niile nọ. Ọ na-adịrị ha mfé ịgbaso udo n’ebe mmadụ ụfọdụ nọ, kama ọ na-esirị ha ike karị n’ebe ụfọdụ ndịọzọ nọ. Mgbe ụfọdụ, ịgbaso udo n’ebe mmadụ ụfọdụ nọ na-anwa ntachiobi anyị na amara nke Chineke nyere anyị nke ukwuu. O nwere ndị site n’ọmụmụ ha na-ejupụta n’iseokwu, ma ná-ekwu kwa okwu nke ukwuu. Ọtụtụ mgbe ụdị mmadụ ndịa na-ekwuokwu ná-ezighịezi. Ọzọ, ọ bụrụ na ọ dị okwu ọjọọ ọ bụla ha pụrụ ikwu banyere mmadụ maọbụ okwu nke pụrụ iwetara mmadụ ahụhụ, ha adịghị arapụ ikwu ya. Ha ga-eme ka ọ dị ukwu karị otú ọ dị, ọtụtụ mgbe ha ga echigharị ya, wee tụgharịa ya, wee nye okwu ahụ nkọwa ná-ezighịezi. Ụdị mmadụ ndịa na anwa onyinye gị na amara gị. Ma Okwu Chineke na-asị, “Nāgbasonu udo n’ebe madu nile nọ” -- ọ bụghị ụfọdụ mmadụ kama mmadụ niile.

Ọchịchọ nke Onwe-onye

Ọ bụrụ na anyị ná anụ-ọkụ n’obi idebe ịdịn’otù nke Mmụọ Nsọ, ná-ejé ijè n’obi dị ume-ala na n’ịdị nwayọ nke obi, na n’ogologo ntachị-obi, ná anagiderịta ibe anyị, anyị ga arapụ ụfọdụ nime ihe anyị na-echè, na n’ụzọ ụfọdụ nke onweanyị, ka anyị wee kwenyere ibe anyị, wee guzosi kwa ike n’okwu Chineke.

Anyị apụghị ịdị ndụ nke ịchọ náánị ihe nke aka anyị. Wee nwee kwa ike ijidesi otite mmanụ ahụ nke anyị natara site n’Eluigwe ike nime ndụ anyị. Anyị aghaghị ịbụ ndị ná-adịghị achọ náánị ihe nke aka anyị. Nsogbu nke ọtụtụ mmadụ bụ na ha bụ ndị ná-achị náánị onwe ha, onwe ochie ahụ ewe ná-achọ ka ihe niile ná-abịa n’ụzọ nke ya mgbe niile, ma ọ bụghi otú a nsogbu ewee dị. Nke a abụghị ndụ nke onye edoro nsọ, maọbu nke onye agụworo n’onye eziomume, kama ọ bụ nke obi ana amụghị ọzọ.

Ọchịchọ Enyefeworo N’aka Chineke

Onye azọpụtaworo na-adị ndụ mmehie ná-adịghị nime ya. Ana-ewepụ ihe ilu, ọnụma, iwe, okwu ọjọọ, ibu iro, anya ukwu, na ụgha na mgbe ahụ Kraist batara n’obi ya n’oge nzọpụta. Mmadụ adịghị ewe kwa iwe ọsọsọ mgbe azọpụtasịrị ya. Apụrụ inwe mkpásu nke mkpọrọgwụ mmehie nime ya, ma nke a agaghị ezipụta onwe ya n’iwe maọbụ ihe ilu mgbe agụsịrị ya n’onye eziomume. Odudonsọ ga-ewepụ mkpọrọgwụ nke mmehie ahụ, wee mee kwa ka obi ahụ dị ọcha. Ana ebibi ọchịchọ anụarụ wee sụchapụ kwa ireure na nzube nke onwe-onye, n’oge odudonsọ. Ihe ná-afọdụ bụ onweonye dịka esi mụ maọbụ nrọrọ nke onwe, bụ nke dị nsọ, ná-enweghi kwa mmehie, kama ọ bụ kwa nke ana aghaghi ịna-eche n’iru Chineke site n’ijiobichụaàjà kwa ụbọchị. Anyị onweanyị, dịka Jisọs, aghaghị ikpé ekpere sị, “Ka eme ihe Gi onwe-gi nāchọ, ọ bugh ihe Mu onwem nāchọ” (Luk 22:42). Anyị aghaghị ịnwụ n’anụarụ ka anyị wee dị ndụ nye Chineke. Pọl kwuru sị “Anametiputa arum ọnyá, me kwa ya ka ọ buru orùm: ka mu onwem ghara ighọ onye ajuru aju n’uzọ ọ bula mgbe m’kwusasiri okwu Chineke nye ndi ọzọ” (I Ndi Kọrint 9:27). “N’ihi na asi na unu nādi ndu dika anu-aru si chọ, unu gaje inwu; ma ọ buru na unu nēwere Mụọ Nsọ me ka omume aru nwua, unu gādi ndu” (Ndi Rom 8:13). Onye edoworo nsọ nke nyefeworo ọchịchọ ya niile na uche ya n’aka Chineke, ma jiri kwa ndụ ya chụọàjà, nwere ike ikwu si: “Akpọgidekọwo mu na Kraist n’obe; ọ bugh kwa mu onwem nādi ndu ọzọ, kama ọ bu Kraist nādi ndu nimem: ma ndu ahu m’nadi n’anu-aru ugbu a, anamadi ya n’okwukwe, bú nke m’kwere n’Ọkpara Chineke, Onye hurum n’anya, rara kwa Onwe ya nye n’ihim” (Ndi Galetia 2:20).

Ngụkọ

Ọ bụrụ na anyị na-enyocha onweanyi site n’oge rue n’oge, ná eleba kwa anya nime ndụ anyị, wee ná ahụ kwa erughị eru niile anyị, anyị ewee jisie ike site n’okwukwe nke Chineke na Okwu Chineke imeri erughị eru niile, adịghị ike niile na ezighị ezi niile nke anyị, Chineke ga-etinye nime anyị ihe nke ga-eme ka anyị dị ike nime Ya. Nsogbu ọtụtụ mmadụ na-enwe ọtụtụ mgbe bụ na ha na-agbà erughị eru niile ha ume ná-elekọta kwa ya anya nkeọma, ihe mbụ ha ga amata bụ na ha na-eme ka erughị eru ha na-etóetó. Chineke achọghị ka anyị na-eme otú a. Ọ na-achọ ka anyị ná-emeri ha. Anyị na-emeri site n’iguzogide adịghị ike niile anyị -- iyipụchasị ihe ahụ niile bụ ihe nke anụ-arụ na inyebiga onweanyị òkè n’ihe niile bụ ihe nke Mmụọ -- na eyikwasị obi ebere, obiọma, obi dị ume-ala, ịdị nwayọ, ma n’elu ihe ndịa niile ịhụn’anya, nke bụ ihe nkekọ nke izùòkè (Ndi Kọlọsi 3:14).

Ịdị nsọ nke Ime obi

Osisi mkwụ na-eto site nime: akwụkwọ niile nke dị na mpụta na anwụ, ma akwụkwọ niile nke dị nime na epute kwa ná ama mma. Mkpọrọgwụ ya na-abami n’ala, ná-emetụta mmiri nọ n’imeime ala. Nke a bụ nnọọ ezi ihe atụ nke ezi nwa Chineke. Ndụ nke mmụọ ya na-eto site n’ọlụ dị omimi nke alụworo nime obi ya, nke ná-egosi onwe ya na ndụ ọ na-ebi.

Ọtụtụ mmadụ na-anwà ime onwe ha ka ha dị nsọ karịa ka ha dị, na inwe obi dị umeala, ha na-anwa kwa ịgosi onwe ha dịka ndị dịkarịrị nsọ. Nke a abaghị urù. Ihe dịkasịrị mkpà ime nke dị kwa ọsọsọ bụ inweta ịdịnsọ nke ime obi, iwere obi chụọàjà, ikwe ka mkpọrọgwụ ahụ bamie nime Okwu Chineke. Mgbe ahụ ka ọ ga alụpụta ihe, mgbe ọ lụpụtachasịrị ihe, ọ ga amipụta mkpụrụ zuruòkè. Ọ bụrụ na ị na-achọ inweta ya n’elu arụ, ọ ga-abụ mkpụrụ rụrụarụ; kama ọ bụrụ na o site nime wee pụta n’elu, mgbe ahụ ka mkpụrụ ahụ na-ezu òkè, ijéozi gị nye Chineke ga-abụ kwa ijéozi zuruòkè.

“Ka udo nke Kraist nēkpezi kwa okwu n’obi-unu, nke akpọbata-kwa-ra unu nime ya n’otù aru; buru-kwa-nu ndi nēkele ekele” (Ndi Kọlọsi 3:15).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ ụfọdụ nime aha Baịbụl Nsọ kpọrọ mmehie nke amụrụ anyi nime ya?
  2. Nye mkwagide sitere n’Akwụkwọnsọ nke na-egosi na odudonsọ bụ ihe ná-eso nzọpụta n’àzụ
  3. Gịnị bụ ụfọdụ nime ihe ana-alụpụta site n’odudonsọ?
  4. Gịnị bụ ụfọdụ nime ihe enwetara site n’ọdịda mmadụ nke ana adịghị ewezuga n’oge odudonsọ?
  5. Ụdị nke Adam ahụ dị nime mmadụ, àna eké ya agbụ ka ana-ewepụ ya ewepụ n’odudonsọ?
  6. Nye ihe mkwagide sitere n’Akwụkwọnsọ nke ná-egosi na odudonsọ dịrị anyi bú ndị dị ugbu a.
  7. Kpọọ aha mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ.
  8. Gịnị bụ ụfọdụ nime ihe ana-eme ka ha nwụọ maọbu ana-eyipụ mgbe mmadụ ọ bụla ghọrọ Onye Kraist?
  9. Gịnị bụ ụfọdụ nime ihe enyere Onye Kraist iwu ka “o yikwasi”?