Jenesis 14:18-20; 28:20-22; Levitikọs 27:30-32; Deuteronomi 16:16, 17; Malakai 3:8-10; Matiu 23:23; Luk 18:12; 21:1-4; I Ndi Kọrint 16:2

Lesson 264 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Kwa ubọchi mbu n’izù ubọchi asa ka unu nile n’otù n’otù debe ihe n’ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma” (I Ndi Kọrint 16:2).
Cross References

I Otù ụzọ n’ụzọ iri Mbụ Niile Ahụ

1. Otù ụzọ n’ụzọ iri mbụ ahụ edere na Baịbụl ka akwụrụ site n’aka Abram nye Melkizedek, Jenesis 14:18-20

2. Jekọb kwere mkwà ịkwụ Onyenweanyị otù ụzọ n’ụzọ iri niile, Jenesis 28:20-22

II Otù ụzọ n’ụzọ iri Niile Nke NdịIsrael

1. Ahụtara otù ụzọ n’ụzọ iri niile dịka ihe dị ezi nsọ bụrụ kwa ihe a na-enye ndị Livaị na ndị nchụàjà, Levitikọs 27:30-32; Ọnu-ọgugu 18:21, 24, 26-32

2. Ewetara otù ụzọ n’ụzọ iri niile ahụ n’ebe Chineke rọpụtara, Deuteronomi 12:5, 6, 16, 17

3. Ngọzi nke Chineke na-eso ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri, II Ihe Emere 31:4-10; Nehemaia 12:43, 44; Ilu 3:9, 10; Malakai 3:10

4. Eboro Ụmụ Isreal ebubo nke mmehie nke ịpụnara ihe n’ihi na ha rapụrụ iwetara Chineke otù ụzọ n’ụzọ iri niile, Malakai 3:8, 9

III Iwu Niile Nke Ágbà Ọhụụ

1. Jisọs kwagidere inye otù ụzọ n’ụzọ iri, Matiu 23:23; Luk 18:12

2. Ego ntà nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ dị ukwuu n’anya Chineke karịa ihe enwebigara òkè nke ndị ọgaranya, Luk 21:14; Mak 12:41-44

3. Onye ozi ahụ, sitere na Mmụọ nke Chineke, nye ntụziaka banyere usoro ziriezi iji ná-enweta ego n’ụlọ ụkọ, I Ndi Kọrint 16:2; Ndi Hibru 7:2-8

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ọlụ Rá Nràtá

Ihe ahụ kachasị ukwuu nke nwere ike ime n’ebe mmadụ pụrụ ịnwụ anwụ nọ bụ ịnata onyinye nke Chineke bụ nzọpụta n’efu, nke bụ Jisọs Kraist, nime obi na ndụ ya. Ọ dịghị otù kobo nke akụn’ụba niile nke ụwa nke a pụrụ ịzụta nzọpụta a -- ọ na-abịa náánị site n’okwukwe nime Chineke na n’iwere obi na ndụ mmadụ chụọàjà nye Ya. Otú ọ dị, ka ewee jidesie onyinye a dị ókéọnụ ike, anyị na-achọpụta na onye ahụ natara ya aghaghị iwere ike ya niile soro n’ịgbasa Ala-eze Chineke n’otù ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ. Chineke na-ezipu onye ọ bụla azọpụtara ka “Ganu … me mba nile” (Matiu 28:19). Mmezu nke ijéozi a dị mkpà chọrọ mkwagide site ná ego, na kwa ndụ ejiri chụọàjà. N’ihi ihe dị mkpà dị iche iche pụtara ìhè ọ bụ ihe ana-apụghị ime bụ ka onye ọ bụla bụrụ onye mkwusa jee kwa n’obodo dị anya ikwusa Oziọma nke nzọpụta; otú ọ dị, Chineke arọpụtawo otù àtụmààtụ maka ịgbasa Oziọma rue ụwa niile, ma O kesawo kwa ihe niile ahụ dị mkpà ọ ga-ewe n’ụzọ ránràtá nye onye ọ bụla nime ụmụ Ya. Àtụmààtụ nke Chineke maka ịkwagide Nzụkọ Ya n’ego ka ana-akpọ ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri, n’ihi na ezi Onye Kraist ọ bụla na-enye otù ụzọ n’ụzọ iri nke ihe mnweta ya niile n’ọlụ nke Chineke, ka e wee zisa Oziọma ahụ n’ụwa niile.

Àtụmààtụ Ná-adịghị Ọhụụ

Ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri bụ ihe ụmụ Chineke na-emeburịị site n’ọtụtụ oge garaaga, n’ihi nke a àtụmààtụ a adịghị ọhụụ maọbụ dịrị náánị otù ọgbọ ọ bụla. Ebe mbụ egosịrị àtụmààtụ ahụ na Baịbụl bụ na Jenesis 14:18-20, ebe anyị gụrụ na Abram kwụrụ otù ụzọ n’ụzọ iri nye Melkizedek, bụ eze Selem na onye nchụàjà nke Chineke Nke kachasị ihe niile elu. Abram ji ihe mkwata n’agha ahụ ná alata ụlọ mgbe o merisịrị eze ise ahụ ndị dọkpụụrụ Lot n’agha site na Sọdọm. Melkizedek ji ngọzi nke Chineke zute Abram na ndagwurugwu Shave, ebe Abram nọ wee “nye ya otù ụzọ n’ụzọ iri nime ihe nille.” Ọ bụ ezie na ihe a mere bụ ihe àtụ mbụ edere banyere ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri, ọ bụ ihe pụtara ìhè na Abram mere ihe site n’ụkpụrụ eburu ụzọ kụziri ya, n’ihi na ọ matara n’ezie otú o kwesịrị ime ya. Onye Mmalite nke nzọpụta ebighị-ebi kpaliri omume ahụ

Tupu Iwu Ahụ

Ụfọdụ mmadụ na-ekwusi ike na iwu nke otù ụzọ n’ụzọ iri bụ ụkpụrụ dịrị náánị oge nke Iwu Moses. Ha na-arụrịta ụka na Ndị Kraist na-ebi n’okpuru Oge nke Amara; ma, n’ihi nke a, iwu nke otù ụzọ n’ụzọ iri agafesiwo, na ọ bụghị kwa ihe dịrị ha. Eleghị anya Onyeozi Pọl nụrụ okwu mbụ niile ahụ nke ịrụụkà a, n’ihi na n’akwụkwọ ozi ya nye Ndi Hibru ọ kọwapụtara eziokwu ahụ ná-egosi na amalitewo ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri ihe dị ka narị arọ anọ (400) tụpu ana-enye Iwu Moses. Onyeozi ahụ dere banyere ihe yiri ibe ya n’ụzọ pụtara ìhè nke dị n’etiti ịbụ onye nchụàjà nke Melkizedek na Ịbụ Onye nchụàjà nke Jisọs Kraist. Eleghịanya Melkizedek abụghị onye ọzọ ma ọ bụghị Onye Nke abụọ nime Atọnimeotù ahụ n’ụdị nke mmadụ na nwa oge ntà nke odide akụkọ Agba Ochie -- “enwegh nna, enwegh nne, enwegh akukọ osuso-ọmumu, enwegh nmalite ubọchi ma-ọbu ọgwugwu ndu, ma emewo ya ka o yie Ọkpara Chineke” (Ndi Hibru 7:3).

Amatara Abraham dịka enyi nke Chineke n’ihi okwukwe ya nime Chineke ma ọ kwụrụ otù ụzọ n’ụzọ iri nye onye emeworo “ka o yie Ọkpara Chineke.” Emere ezi Onye Kraist ọ bụla ka ọ bụrụ onye ná-eketa òkè nime ọgbụgbandụ nke Abraham site n’okwukwe nime Chineke na site n’amara, n’ihi nke a otù iwu ahụ nke dịrị Abraham idebe dịkwara Onye Kraist idebe, n’ụbọchị taa. Abraham soro Chineke gaa ijè, ma ọ natara ngọzi site n’aka Chineke mgbe ọ kwụrụ otù ụzọ n’ụzọ iri niile ya nye ezi onye nnọchite anya nke Chineke. Chineke agbanwebeghị, ụzọ Ya agbanweghị kwa. Ọbụná n’okpuru Ọgbọ nke Amara, onye ahụ nke ná-achọ ngọzi kachasị ukwu nke Chineke ga-achọta ngọzi ahụ dịka ọ na-aga ijè na nzọụkwụ niile nke Abraham onye okwukwe ahụ

Ogologo mgbe tupu enye Iwu ahụ Jekọb n’otù aka ahụ, kwere Chineke mkwà sị, “Ihe nile I gēnyem, aghagh kwam inye Gi otù uzọ n’uzọ iri” (Jenesis 28:22). Ọ ga-adị ka, ma ọ bụrụ na ele ya anya na mbụ ná mkwá ya, na Jekọb na-achọ otú ya na Chineke ga-esi nwee mkwekọrịta, ma ọ bụghị otú ahụ. Mgbe Jekọb na-ararụụra Chineke doro n’usoro ná nrọ ụdị ngọzi niile nke akwadobere nye Jekọb nke ga-abịa site n’ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi ya. Mgbe Jekọb tetara o jigidesịrị aka ike ná mkwà niile nke Chineke site n’ikwu sị na dịka Chineke na-emezu Okwu Ya, ya (bụ Jekọb) ga-alụọlụ ya mara na ọ bụ ihe kwesịrị. Ná-arụghịụkà Jekọb amụtawo ihe site n’aka nna ya ochie, Abraham, iziezi nke ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri. Emesịa, Chineke gbanwere aha Jekọb kpọọ ya Israel, ná-asị, “I jisiwo ike n’ebe Chineke nọ na n’ebe madu nọ, i we nwe ike” (Jenesis 32:28). Jekọb agaghị enweworị ike n’ebe Chineke nọ otú a ma ọ bụrụ na o debeghị mkwà ya.

N’ihi Ọgan’iru Nke Israel

Okwu ahụ na-egosi n’ụzọ pụtara ìhè, n’oge ahụ, na Iwu ahụ jikọtara ma ná-emesi kwa ike ụkpụrụ ahụ nke emewororị ka o guzosie ike. Chineke achọghị otù ụzọ n’ụzọ iri site n’aka Ụmụ Israel n’ihi ọchịchọ nke Onweya ana-apụghị ịmata ma ana-anata otù ụzọ n’ụzọ iri niile ahụ ma were ha lụọọlụ maka ọdịmma ndị Israel. Ọbuná n’oge mbụ ahụ ogige ebe ịchụàjà nke Chineke chọrọ ezi ndị nlekọta na ndị ná-ejé ozi, ma ndịa ka arọpụtara n’etiti ndị sitere n’agbụrụ Erọn na n’ebe nke ndị Livai. Ndị nchụàjà na ndị Livai nyere oge ha niile na uche ha niile n’ijéozi nke Ụlọ Jehova. Ha enweghị ihe nketa n’etiti Ụmụ Israel; n’ihi nke a, Chineke nyere ndịa ná-ejé ozi n’ogige nsọ ahụ otù ụzọ n’ụzọ iri niile nke Israel maka ibi ndụ ha.

Oge dum ka ana-echetara ụmu Israel eziokwu ahụ na Chineke enyewo ha ala ahụ nke ha bi nime ya. Tụkwasị nke a, ha ga-echeta na ọ bụ Onyenweanyị bụ onye na-enye ha ịbaụba nke ihe ubi, onye “nēnye gi ike imeta àkù” (Deuteronomi 8:18). N’eziokwu, mgbe Ụmụ Israel ná-akwụ otù ụzọ n’ụzọ iri niile ha, ha na-eweghachirị Onyenweanyị otù akụkụ dị ntà nke ihe niile O nyeworo ha na mbụ. Lenụ ka nke a ji bụrụ eziokwu n’ebe ndịkom na ndịnyom niile ná-akwụ otù ụzọ n’ụzọ iri niile nye Onyenweanyị nọ.

Ndị Ná-apụnara mmadụ ihe!

Otù nime ebubo jọgburu onwe ya eboro Ụmụ Israel bụ ikwu na ha na-apụnara Chineke ihe. Ndị ahụ dị ka ha nọ ná mgbagwojuanya na ịfuli onwe elu n’ọzịzá ha: “Nime gini ka ayi punaraworo Gi ihe?” Ná-arụghịụkà, ha edebewo otù ụkpụrụ ma were kwa ikwesị ntụkwasị obi ná-aga ijè n’omen’ala niile, ná-eche na ọlụ niile nke ha na nchèpụta niile ha ga-ezu, kama imezu Okwu niile nke Chineke. Ọzịzá nye ajụjụ ha bịara ngwángwá: “N’otù ụzọ n’ụzọ iri nile na àjà-nbuli nile. Ọbubu-ọnu ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe, bú mba nka nile” (Malakai 3:8, 9). Ebubo a sịrịike na-egosi ịdị ókéọnu nke Chineke na-atụkwasị n’akụkụ niile nke Okwu Ya. Ọ bụ ihe dị óké egwù bụ iji iwu niile nke Chineke gwuriegwù. Ananaias na Safaira tufuru ndụ ha na mkpụrụobi ha n’ihi na ha kwụrụ ụfọdụ nime ọnụahịa ahụ ma gwa kwa Chineke na mmadụ okwu ụgha banyere ya, “Unu ekwela ka eduhie unu; Chineke abugh onye anēleli: n’ihi na nkpuru ọ bula madụ nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n’ubi” (Ndi Galetia 6:7)

Òzízí Agba Ọhụụ

Mgbe Onyenweanyị na-ahụ ezi ihe ná ndụ mmadụ ọ bụla, Ọ na-etò ezi ihe ahụ; ma mgbe Ọ na-ahụ ihe ọjọọ ná ndụ mmadụ ọ bụla, Ọ na-eme kwa ngwá ngwá otù aka ahụ n’ịma ihe ọjọọ ahụ ikpé. Otú a ka ọ dị ná nkọwa Ya banyere ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri nke ndị Farisii. Ha kpachapụrụanya n’ihe banyere otù iwu a nke bụ na ha na-akwụ otù ụzọ n’ụzọ iri nke ọbụná mkpá akwụkwọ niile ná-esi isi ụtọ na anise na cummin. Jisọs kwuru na ha agaghị arapụ ime nke a; n’ụzọ ọzọ, Ọ kwadoro Iwu nke otù ụzọ n’ụzọ iri ma site n’Agba ochie webata ya nime Agba Ọhụụ -- baa nime Nzukọ Ya. Jisọs toro ezi ihe nke dị n’ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri, kama Ọ mara ndị Farisii ikpé maka na ha rapụrụ ihe niile ka árọ nime Iwu ahụ -- ikpé, ebere, na okwukwe. Ọ dịghị onye ga-eru Eluigwe maka náánị ịkwụ otù ụzọ n’ụzo iri, ma ọ pụghị kwa ịhụta ụzọ ịbà n’Obodo nke Chineke ọ bụrụ na ọ kpachara anya zobe Chineke òkè nke ihe mnweta nke dịrị Ya.

Dịka egosiworo, Onyeozi ahụ, n’akwụkwọ ozi ya nye ndị Hibru, kwadoro ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri niile. O kwuru okwu gaa n’iru nye Nzukọ dị na Kọrint banyere onyinye afọ ofufo dị iche iche. Òtù ndị Mbaọzọ a kwere ekwe nwere óké mmetụta banyere mkpà niile nke ụmụnna ndị ogbenye nọ na Jerusalem. Pọl gwara ha otú ha ga-esi tinye mmetụta ha n’ọlụ: “Kwa ubọchi mbu n’izu ubọchi asa ka unu nile n’otù n’otù debe ihe n’ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma, ka aghara inara urù mgbe ọ bula m’gābia”. (I Ndi Kọrint 16:2). •tụ a ka ana-aghọta na ọ bụ onyinye dị ịche n’ebe otù ụzọ n’ụzọ iri dị iche iche nke Nzụkọ nke ndị Kọrint, n’ihi na Pọl kpọrọ onyinye ahụ “afọ-ofufo,” maọbụ onyinye.

Onye ahụ nke na-enye onyinye afọ ofufo nwere onwe ya ọtụtụ mgbe ịrọpụta ihe aga-eji onyinye ahụ mee. N’ebe a ndịnsọ nọ na Kọrint gosịrị na ha chọrọ inyere ụmụnna ha aka. Eleghịanya n’ebe ndị ọzọ, Onyenweanyị na-etinye ibuarọ n’obi mmadụ izigara onye na agbasa Oziọma enyemaka nke ego, maọbụ inye aka kwụọ ụgwọ maka ụlọ nzụkọ, maọbu inye ego maka ibipụta akwụkwọ ọgụgụ nke eji agbasa Oziọma. Onyinye afọ ofufo bụ onyinye n’ezie.

Otù ụzọ n’ụzọ iri niile abụghị onyinye nye Chineke; ha bụ òkè na ọlụ anyị nye Ya -- ha bụ nke Chineke. Chineke nyere Ụmụ Israel ezi ihe niile nke ha nwere ma chọkwa otù ụzọ n’ụzọ iri ha ná mkwụghachị. Otù aka ahụ, Chineke enyewo Onye Kraist “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bula zuruòkè nke enyere enye,” n’ihi nke a, otù ụzọ nime ụzọ iri abụghị ọnụ-ahịa ná-ekwesịghị inyeghachị Ya. Ana-ewere otù ụzọ n’ụzọ iri niile site n’ihe mnweta ọ bụla, site n’ọlụaka maọbụ n’ụgwọọlụ dị iche iche. N’ọlụ-aka (maọbụ ịzụ-ahịa ana-esite n’urù niile mgbe ewepụsịrị isi-ahịa, wepụta ya. N’ụgwọ-ọlụ (maọbụ ụgwọ ọnwa), ana-esite n’isi ụgwọ ọnwa gụpụta ya tupu ana-ewepụ ihe ọ bụla ọzọ maka ụtụ isi dị iche iche, ihe iji nyere ọra mmadụ aka dị iche iche, ihe ana-emefu maka ibi ndụ, na ihe ọzọ.

Mmeso-ọma Chineke

Onye Kraist ọ bụla ekwesịghị ichè na ya bụkarịrị ogbenye n’ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri niile. N’ezie ọtụtụ mmadụ ndị gbalịworo inweta ego ka ejiriworo akụnaụba gọzie mgbe ha malitere inye Onyenweanyị otù ụzọ n’ụzọ iri nke dịrị Ya. Nke ahụ bụ mkwà Chineke; “Webatanu otù ụzọ n’ụzọ iri nile n’ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n’ulom, biko, nwanum na nka, ka JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M’gagh-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mgbe ọnọdu agagh-ezu inagide ya” (Malakai 3:10). Ọzọ kwa, “Sọpuru JEHOVA site n’àkù-gi, site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume gi nile: ọba-gi nile gejuputa kwa n’ihe nriju-afọ, Ebe nzọcha-nkpuru-vine-gi nile: gētiwa kwa na manya-vine ọhu” (Ilu 3:9, 10). Chineke na-enwe mmasị ịrapụ ụmu mmadụ ka ha guzoro n’Okwu Ya ma nwapụta Ya. Ọ ga-emezu okwu Ya mgbe dum. N’akụkụ nke ọzọ, ụfọdụ ndị Chineke wereworo akùnaụba gọzie mgbe ha kwụrụ ọtù ụzọ n’ụzọ iri ha, tufuru ihe mnweta nke ụwa ha mgbe ha weghachiri otù ụzọ n’ụzọ iri ha site n’ebe Chineke nọ “Ọbubu-ọnụ ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe.”

Chineke na-asọpụrụ ntụkwasị obi nke atụkwasịrị Ya. Jisọs toro nwanyị ahụ di ya nwụrụ onye tinyere ego ntà abụọ nime ebe idebe ego nke Chineke. Onyinye ya, ọ bụ ezie na ọ dị ntà, guzoro nnọọ n’anya Onyenweanyị karịa ụtụ niile buru ibu nke ndị ọgaranya, n’ihi na, tụkwasị onyinye ya, o nwere okwukwe na Chineke ga-egbo mkpà ya n’ọdịn’iru. Nwanyị ahụ di ya nwụrụ nyere ihe niile o nwere -- “bu ihe dum o ji biri.” Ọ bụ na otù Onyenweanyị ahụ adịghị ahụ otù ụzọ n’ụzọ iri niile nke ndị Ya nke ná-efukarị ha ihe inye? Ọ bụrụ na enyere ha náánị n’okwukwe, Onyenweanyị agaghị arapu ịrịba otú esi nye onyinye ahụ ámá wee gọzie kwa onye ahụ nyere ya.

Kedụ maka iji ụgwọ? Ụfọdụ nwere ike jụọ ma ọ bụ na ọ gaghị aka mma ịkwụcha ụgwọ mmadụ ji tupu akwụọ otù ụzọ n’ụzọ iri dị iche iche. Nke ahụ bụ ịjụ ma ọ ga akamma iji Chineke ụgwọ ka ọbụ iji mmadụ ụgwọ. Ọbụbụ ọnụ sitere na Chineke ka akpọkwasịrị ndị ahụ ná-ejide otù ụzọ n’ụzọ iri ha, ma ngọzi niile nke Chineke na-esoro ndị na-akwụ otù ụzọ n’ụzọ iri ha mgbe niile Ọ bụ na amamihe na nghọta agaghị egosi na aga-enwe ike ịkwụchapụ ụgwọ niile nke ụwa ngwá ngwá ma ọ bụrụ na ngọzi nke Chineke abata ná ndụ ahụ, kama ọbubụ ọnụ nke Chineke?

Nye Onye?

“Ùnu amatagh na ndi nālu ọlu n’ulo uku Chineke nēri ihe si n’ulo uku Chineke puta, na ndi nānọ kwa n’iru ebe-ichu-aja nēso ebe iche-aja ahu nēkekọ ihe? Ọbuná otú a ka Onye-nwe-ayi kara àkà ka ndi nēkwusa ozi ọma Ya si n’ozi ọma ahu di ndu” (I Ndi Kọrint 9:13, 14). Jisọs gwara mmadụ 70 ahụ arọpụtara, “Onye-ọlụ kwesiri ugwọ-ọlu-ya” (Luk 10:7). N’ihi nke a, ndị ahụ na-enye ego ha, talent ha na ọlụ ha n’ikwusa na ịgbasa Oziọma ahụ nke bụ ezie kwesịrị ịnara otù ụzọ n’ụzọ iri. Ana-eji kwa otù ụzọ n’ụzọ iri dị iche iche lụọ ma dozie kwa Ụlọ-ukwuu Chineke.

Onye Kraist aghaghị ilezi anya mara onye ọ na-akwụ otù ụzọ n’ụzọ iri niile ya. Jisọs dọrọ akanántị, “Nēzenu ndi-amuma ugha, ndi nābiakute unu n’ihe-oyiyi aturu, ma n’ime ha bu agu nāpunara aturu … unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha” (Matiu 7:15, 20). Nyochapụta nzụkọ ahụ na òzízí ya ma ka o wee kwa gị anya na ọ na anwá ike ya rue n’ezi ọtụtụ nke Okwu Chineke tupu gị akwụnye otù ụzọ n’ụzọ iri dị iche iche nime ọgbakọ ahụ. “Unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu ndi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n’ihi na ọtụtụ ndi-amuma ugha apuwo ba n’uwa” (I Jọn 4:1). Onye ahụ nke ná-enye aka agbasa òzízí ụgha site n’ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri dị iche iche maọbụ ego n’ebe ndị ahụ nọ abụrụwọ onye ná-eketa òkè n’ọlụ ọjọọ ha niile.

Ọgan’iru

Nzukọ, ọ pụrụ inweta ihe ọzọ iji dochie àtụmààtụ nke Chineke maka inweta ego? Ọtụtụ ọgbakọ anwawo isi n’ụzọ ọzọ chọọ ego ma rapụ àtụmààtụ nke Chineke, ma ha adawo nime mgbalị ha niile. Otú ọdị ndị ahụ jikéré irubere Okwu Chineke isi anwapụtawo eziokwu nke mkwà Ya niile.

Ná Nzukọ Apostolic Faith dum ana-edebe arịa ntà n’àzụ mgbidi nke ọnụ-ụzọ mbata nime ụlọ ahụ iji nákọta otù ụzọ n’ụzọ iri dum na onyinye ndị ọzọ. Ọ dịghị ebe ana-edebà aha onye ọ bụla tụnyere nke ya. Ọ dịghị onye ọ bụla ná amata ihe ibè ya na-etinye n’ihe-ego Chineke, ma ọbụghị onye ahụ ná-enye ha na Chineke; ma eziokwu nke mkwà Chineke ka ana-egosipụta site n’oge rue n’oge. Ewebatawo otù ụzọ n’ụzọ iri dị iche iche nime ulo-àkù, windo niile nke Eluigwe ka emeghewokwara, ma ngọzi niile nke Chineke ka awụpụwokwara rue mgbe Oziọma gazuru ụwa. “Ọ buru na unu matara ihe ndia, ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha” (Jọn 13:17)

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye bụ nwoke mbụ kwụrụ otù ụzọ n’ụzọ iri dị iche iche? Ònye ka ọ kwụrụ otù ụzọ n’ụzọ iri niile ahụ?
  2. Òlee otú Jekọb si nwee mmetụta n’ihe banyere ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri?
  3. Gịnị ka Iwu Moses kwuru banyere iwu nke ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri?
  4. Ụmụ Israel, hà na-elezianya mgbe dum ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri niile ha?
  5. Òlee ihe Chineke na-echè banyere ndị ahụ ná-ezunarị Ya otù ụzọ n’ụzọ iri niile ha?
  6. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri?
  7. Ọ dị ndị arapụrụ ka ha na-echè na ha ekwesịghị inye Onyenweanyị òkè dịrị Ya?
  8. Òlee otú Mmụọ Nsọ ji site n’ebe Pọl nọ wepụta àtụmààtụ Chineke banyere inweta ego ná Nzukọ?
  9. Òlee ihe aga-eji otù ụzọ n’ụzọ iri dị iche iche ná-eme?