I Jọn 2:15, 16; Jọn 15:19; Ndi Rom 12:2; I Ndi Kọrint 10:23, 24, 31-33; 14:26; Taitọs 2:6-10

Lesson 265 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāñu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto” (I Ndi Kọrint 10:31).
Cross References

I Omume Nke NdịỤwa

1. Okwu Chineke nyere mmadụ dum iwu ka ha ghara ịhụ ụwa n’anya, maọbu ihe nke dị n’ụwa, I Jọn 2:25; Ndi Rom 12:2; Ndi Kọlọsi 3:1, 2

2. Enyere ụmụ mmadụ iwu ịhụ Chineke n’anya, na ịjụ àkụ nke ụwa na urù ya niile, I Timọti 6:6-12; Hagai 1:6; Ilu 23:5; 27:24; Eklisiastis 2:18, 26; Matiu 6:19; Luk 12:20, 21

3. Agụụ iheọjọọ nke anụ-arụ bụ nke ụwa, I Jọn 2:16; Ọnu-ọgụgụ 11:4, 34; Abù Ọma 78:18, 30; Matiu 5:27-30; Ndi Rom 13:14; I Ndi Kọrint 10:6-10; Ndi Galetia 5:16; Ndi Efesọs 2:3; Taitọs 2:12, 13; I Pita 1:14; 2:11; 4:2, 3; 2 Pita 2:10; Jud 16-18

4. Agụụ iheọjọọ nke anya bụ nke ụwa, Jenesis 3:6; 13:10; Joshua 7:21; Abù Ọma 119:37; Eklisiastis 5:10, 11; Luk 4:5

5. Nganga nke ibi ndụ (óké okwu nke ibiobi) bụ nke ụwa, Esta 1:3-7; Abù Ọma 73:6-9; Daniel 4:30; Ezikiel 28:12-17; Ọlu Ndi-ozi 12:20-23; Nkpughe 3:17; 18:11-16

II Ihe Ụtọ Niile Nke Ụwa

1. Ekewapụrụ Onye Kraist mee ka o guzo ichè n’ebe ndị ahụ ịhụn’anya na ọchịchọ ha niile bụ nke ụwa nọ, Ndi Rom 12:2; Taitọs 2:6-12; Jọn 15:19

2. Ndị Kraist ga na-eme ihe ná-atọ Chineke ụtọ ọ bụghị mmadụ; na ibi ndụ ga-enyere ụmụnna ha aka, ọ bụghị nke ga-egbochi ha, I Ndi Kọrint 10:23, 24, 31-33; 14:26

3. Óké oriri nke ná-atọkarị anụ-arụ ụtọ bụ ihe arụ n’ebe Chineke nọ, Ọpupu 32:6, 7; I Pita 4:3, 4; Ndi Galetia 5:21; Aisaia 1:14; Daniel 5:1-5; Luk 15:13

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ịhụ Ụwa N’anya

Okwu niile ahụ nke Mmụọ Nsọ, site n’Onyeozi Jọn, ka “Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n’uwa, n’anya” abụghị nnọọ okwu efu. Ha bụ iwu nke Chineke akpaliri nye mmadụ niile, n’ebe dum, ndị ná-enwe olileanya maọbụ agụụ isoro Ya bie ndụ ebighị-ebi nke udo. Ịhụ ụwa n’anya bụ ịkpọ Chineke asị! N’akwụkwọozi nke Jemes anyị na-agụ, “ùnu amatagh na ibu eyi nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyi nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke” (Jemes 4:4). Nwoke maọbụ nwanyị ahụ nke ga-anwá ilefuru ndụmọdụ dị otú a anya na-eme nke ahụ itinye onwe ya n’óké ihe egwù. Ọ dị ọtụtụ okpukpé n’ụbọchị ndịa ndị òzízí ha, ụkpụrụ na mkwenye niile ha na-enye ikike nke ná-akwagide mmekọrịta na njikọ ọnụ nke ha na ndị ụwa. Okpukpé ndị ahụ bụ nke ụwa. Ndụ, ọchịchọ, ịhụn’anya na ndị ahụ, bụ ndị ná-ekwere ha bụ otù akụkụ ma bụrụ kwa ndị ekekọrọ ha na ụwa, apụghị kwa ikewapụ ha site n’ụwa. Oziọma nke Jisọs Kraist adịghị enye ikike ọ bụla nke mmekọrịta na njikọrịta nke (OnyeKraist) na ndị ụwa. Onye ahụ ná-eso Jisọs Kraist na-edebe iwu nke Onyenwe ya, ma ná-ekewapụ kwa onwe ya site n’ụwa.

Mgbe mkpụrụobi ná-edebe ịhụn’anya nke ụwa, na ihe ahụ niile ana-esi nime ya enweta na mkwà ya niile, ọ pụghị ịbụ onye ná-eso ụzọ Jisọs Kraist. Baịbụl ná-esepụta onyinyo nke ụwa n’ezi àgwà ya; ma ná-ekwu n’ụzọ dị iche iche, na n’ebe dị iche iche, na o nwere ụdị inwuenwu nke agwakọrọ ihe dị iche iche iji chọọ ya mma, ịtụkwasị uche n’anụ arụ, ụdị ekwensu, ma bụrụ kwa ihe ná-aghaghị iduba ngwángwá n’ịlan’iyi nke amaara nkeọma. (Gụọ Jemes 3:15; I Jọn 2:17; Luk 21:34; Matiu 24:38).

Ọtụtụ mmadụ ná-echè na ọ bụrụ na ndị ka n’ọnụọgụgụ ná ndịagbataobi ha na-enwe óké mmasị ime mmehie maọbu ibi ndụ ọjọọ, na iwu ejighị ha isoro ha mee otú ahụ. Asịkwarị na ụwa niile na-ejehie megide uche Chineke, ọ dịghị otù onye nke pụrụ ikwu na ya mere nkeọma n’isoro mee otú ahụ. Chineke nwere ike ịkpọrọ agbụrụ niile nke mmadụ rue n’iru oche ikpé ịzá ajụju banyere mmehie, O kwewo kwa mmadụ mkwà na Ya ga-eme ya n’oge kwesịrị. Itinye aka ná mmehie na ịbụ onye ná-esoro ketakọ agụụ ya niile ga-eme ka mmadụ hụọ ahụhụ nke iwe Chineke n’ihi ajọ omume ya.

Ụwa na ndị ka n’ọnụ-ọgụgụ ha ajụwo Kraist wee nọdụ ná-enweghị mmasị (mmetụta) banyere mmeso Ya. Ndịa bụ ndị jikọrọ ọnụ bụrụ ụwa. Omume niile ha, uche ha, akparama-àgwà ha bụ ihe ná-aga n’iru ná-anọgide kwa n’ijehie site n’ebe Chineke nọ, ọgwụgwụ ndụ ha bụ ọnọdu megidere ịdịnsọ na ime eziomume. Ime enyi ha, òtù niile ha, ịchụ ego niile ha, mmegharị niile ná ndụ ha bụ n’ime ka afọ ju ha site n’agụụ niile nke mmehie na n’ihe ụtọ ya niile. Mmadụ aghaghị ibi ndụ ga-enye Chineke otuto, maọbụ inwe mkpebi ịbụ onye nke ụwa, nke ọgwụgwụ ya bụ ịga n’ahụhụ ebighị-ebi

Abụghị nke Ụwa

Onye Kraist nọ n’ụwa, ma ọ bụghị nke ụwa. Ọ dịghị ezo onwe ya na monastrị (ebe ana-edebe ndị kpebiri ikewapụ onwe ha pụọ n’ụwa na ijéozi nke okpukpé dịka iwu ya si dị), wezuga onwe ya site ná ndụ ọjọọ dị iche iche na ajọ omume niile nke dị n’ụwa; n’ihi na ọ dị ụmụ mmadụ mkpà ka agwá ha Oziọma na ike nke Chineke ịzọpụta site ná mmehie. Onye Kraist pụrụ ịlụọlụ ma bie kwa ndụ ga-atọ Chineke ụtọ n’etiti ọgbọ a gbagọrọ-agbagọ nke jọgburu onwe ya ná njọ, ma bụrụ kwa ezi àmà nye Chineke. Ọ dịghị ngọpụ nke mmadụ nwere n’ikwu na ha apụghị ibi ndụ nke OnyeKraist n’ebe ọlụ ha maọbụ n’ịdị ndụ kwa ụbọchị, n’ihi na ọ bụ ịgba-àmà ndị nke Chineke n’ebe dum na ha nwere ike ma ná-ebi ndụ nke mmeri. N’etiti ndịagha, n’ịzụkọrịta ahịa, n’èzínaụlọ, n’ebe ọ bụla na n’ebe dum, ndị Chineke na-adịrị Ya ndụ (Lee Daniel 1:8; Ndi Hibru 11:24-26).

“Ya mere, ọ buru na unu soro Kraist-ayi bilikọ, nāchọnu ihe di n’elu, ebe Kraist-ayi nọ, nānọdu n’aka nri Chineke. Tukwasinu uche n’ihe di n’elu, ọ bugh ihe di n’elu uwa” (Ndi Kọlọsi 3:1, 2). Ọ bụrụ na ịhụn’anya anyị dị n’ihe nke Chineke, n’Ala-eze Chineke, ọ ga-edò anyi anya nkeọma na anyị abụghị nke ụwa. Ndị ahụ nọ n’ụwa nwere akụ ha n’ime ụwa, ma Jisọs kwuru na ebe akụ mmadụ dị, n’ebe ahụ ka obi ya dị kwa (Matiu 6:21).

Ndị Ná-ahụ Ihe ụtọ N’anya

Otù nime ihe ịrịba-àmà nke ụbọchị ikpe-azụ bụ na ndị mmadụ ga-abụ “ndi nāhu ihe-utọ n’anya kama ihu Chineke n’anya” (2 Timọti 3:4). Ịchọ ihe ụtọ ahụ nke jụpụtara n’ebe dum bụ nke anabatakwara nkeọma, aghọwo otù nime ụdị ịhụ ụwa n’anya na mmebi-iwu kachasị njọ. Ná-arụghị ụkà, Chineke chọrọ ka ndị Ya ná-enwe ọñụ ma ná-enwe kwa ezi ihe ụtọ. Ma n’etiti iberibe akwụkwọ niile nke Okwu Chineke bụ ebe kwesịrị ịchọta mmalite ya. “I gēme ka m’mara uzọ ndu: Ojuju-afọ ọñu di n’iru Gi; E! utọ di iche iche di n’aka-nri-Gi ebigh-ebi” (Abù Ọma 16:11).

Mgbe otù mba nke ndị mmadụ ga-apụ, n’igwè, n’ụbọchị nke Onyenweanyị ịghọ mba nke ná-achọ ihe ụtọ, ná-echèghị uche banyere Chineke, ma ọbụghị náánị itinye aka n’ihe ọ bụla nke ha na-echè na ọ ga-eme ka obi tọọ ha ụtọ, mba ahụ na-aga n’iru ná abami n’uche ajụrụ-ajụ na n’ịhụ ụwa n’anya n’ebe ọ dịkarị njọ. Ọ dịghị obodo mepere anya n’ụbọchị taa nke ná-etinyebeghị aka n’óké oriri, na ọñụñụ, na ime ka obi tọọ ya ụtọ rue mgbe ọ ghọrọ mmehie. Jisọs kwuru banyere ndị dị otú ahụ, “N’ihi na dika ha nọ na mgbe ahu nke bú oké iju-miri ahu uzọ nēri ihe nāñu kwa ihe-ọñuñu, nālu nwunye, nēnye kwa n’ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n’ugbọ-ya ha amagh kwa rue mgbe oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile; otú a ka ọbibia nke Nwa nke madu gādi” (Matiu 24:38, 39).

Baịbụl gakwara n’iru ikwu banyere ndị ahụ ná-eri, ná-añụ, ná-eme kwa ka obi tọọ ha ụtọ iji mee ka afọ ju náánị ọchịchọ ụfọdụ nke anụ-arụ. “N’ihi na ọtutu nējeghari, ndi m’nāgwari unu okwu banyere ha ọtutu oge ma ugbu a ọ bu kwa n’ákwá ka m’nāgwa unu, na ha bu ndi-iro obe nke Kraist: ndi ọgwugwu-ha bu ila-n’iyi, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n’ihere-ha, ndi nātukwasi uche n’ihe uwa” (Ndi Filipai 3:18, 19). Iri óké ihe oriri ka Chineke ji tụnyere ịñụbiga manya óké, ọ bụ kwa mmehie. (Gụọ Ilu 23:21 Aisaia 56:12; Luk 12:19; I Timoti 5:6).

Ịnwa Irú Nsọpụrụ Chineke

Onye Kraist adịghị akwagide site n’isonye maọbu ịdọnye ukwù nye egwuregwú dị icheiche ahaziri-ahazi, ite egwú dum, na ihe nkiri dị iche iche, n’ihi na ọnọdụ na mmụọ ná-achị ihe ndị ahụ na emegide Mmụọ nke Kraist. Ndị ahụ so maọbụ ná-eje ihe ndị ahụ bụ ndị mmehie, ihe ebu kwa n’uche wee ná-eme ihe ndị ahụ bụ ime ka obi anụ-arụ na obi mmehie nweta ọñụ. Ezi ihe ntà ọ bụla apụrụ inweta nime ha ka ana-ewere óké ihe ọjọọ ana-apụghị ịkọwazu dị nime ha gwagbue. Ihe onyinyo dị iche iche nke oge a aghọwo ihe ná-akpali agụụ nke ime ihe mmekpu dị iche iche nime ụmụ ntakịrị nke ahụbeghị mgbe ọ bụla n’ụwa. Ndị ụlọ ọlụ ná-emepụta ihe onyinyo ewerewo agụụ dị n’obi mmadụ ime ihe ọjọọ gwakọọ ná mmụta na nrubiga ókè nke ajọ omume na ihe ọjọọ. Ihe nkiri nke ihe onyinyo akụziworo ndị mmadụ ime ihe ọjọọ, o buliwo ajọ omume rue ebe dị elu weda kwa ihe ahụ zuruòkè nke dị kwa mma n’ala.

Ebuliwo nchọpụta onyonyo elu dịka otù nime nzọụkwụ dị ukwuu n’ọgan’iru nke mmụta n’arọ ndịa. Eleghị anya ọ ga abụ otú ahụ ma asị na edebere ya maka ọdịmma nke ndị bi n’ụwa na otuto nke Chineke. O gosipụtaworị onwe ya dịka ịkàchá n’izisa ihe ọjọọ dịka sinima, ọbụná otú a karị redio, n’ihi na ọ na-ejikọta anya na ntị bụ ụzọ abụọ kachasị nke esi enwe mmụta. Onye Kraist ilegide anya na ige ntị ná nwepụta nke ana-ewepụta ajọ-omume na mmehie n’ụdị ọ bụla nke apụrụ icheta ya, bụ ihe ka n’ọnụọgụgụ nke ihe ana-ewepụta na onyonyo (television), bụ ịnabata ihe ndị ahụ ha na-ahụ ná-anụ kwa, ya na ịbụ otù akụkụ ya. Ọlụ abụọ na-akwagidekarị onyonyo bụ òtù ụlọ na emepụta mmanya ogbugbu na anwụrụ osìsè (sịga) nke nyeworo aka inuba mmadụ ndị ana-apụghị ịgụta ọnụ nime ịlan’iyi ebighị-ebi; ọbụná ige ntị n’okwu ire ahịa ha ezuwo ime ka mmadụ baa n’ikpé ọmụma dị otú ahụ.

Ndị nne na nna kwesịrị ịdọ ụmụ ha akanántị n’ihe metụtara akwụkwọ mgbasa ozi na akwụkwọ dị iche iche “ná-akpá ụkà ọchị,” nke ụfọdụ nime ha bụ ihe nwere ike ime ka ha chee échìchè na kwa ime ihe ọjọọ.

Òlee ihe ọjọọ dị na Ndị Kraist iso mee egwuri egwù n’òtù ahaziri-ahazi? bụ otù ajụjụ ana-ajụ oge ọ bụla. Pọl gwara Timọti, nwa okorọbịa nke bụ onye mkwusa: “Ọnwunwa nke aru bara urù nye ihe ntà; ma nsọpuru Chineke bara urù nye ihe nile, ebe ọ nwere nkwà nke ndu ma nke ndu ugbu a, ma nke gaje ibia” (I Timọti 4:8). Egwuregwú ahaziri-ahazi nke ụbọchị taa bụ, nke òtù egwuri egwú ndị Rom nke mgbe ochie azụrụ-àzù maka iji ngwà-agha lụọ ọgụ sọọ mpi rue ọnwụ. Ebumn’uche nke egwuregwú nke oge a bụ maka ịsọmpi. Inwe mmeri bụ ihe niile achọrọ, ana-azụ kwa ndị mmadụ n’ọtụtụ dị elu maka inwe ike n’ụzọ pụrụ ichè ka ha wee merie mmadụ niile. Ọ dịghị ihe megidere Oziọma Kraist karịa mmụọ nke na-achọ ike na ume iji merie mmadụ niile. (Gụa Zekaraia 4:6; I Samuel 2:9). Onye Kraist na-achọ ime nkeọma n’ezi omume niile nke Chineke, ma ọ nachọ ka ya mee nkeọma ka o wee nye Chineke otuto, ma ọ dịghị achọ ka o nye onwe ya otuto.

Okwu Chineke na-agwá Ndị Kraist, “N’akuku ihun’anya-unu n’ebe umu-nna-unu nọ, ka ihe madu-ibe-unu nātọrita unu utọ nke-uku; n’akuku nsọpuru unu, nācharanu ibe-unu uzọ” (Ndi Rom 12:10). Adịghị ahụ omume dị otú a n’òtù egwuri egwú ejikọrọ ọnụ. Ana ebuli onye meriri elu n’ihi inwe ume ya na ike ya dum. Ọ dịghị échìchè maọbụ nsọpụrụ ana-enye Chineke onye mere arụ ahụ, nke anyị bi nime ya, ná-ejeghari, ma nwee ọnọdụ. Nfuli onwe onye elu ka Chineke kpọrọ asị dịka ihe ná-esite ná mkpali nke ekwensu. (Lee Ilu 25:27; Matiu 23:12. Jenesis 3:5; Aisaia 14:14) Kraist nwụrụ ịgbapụta ndị mmadụ site n’ụgwọ-ọlụ nke mmehie, ma nye kwa ndị mmadụ ike imeri ike nke ihe ọjọọ na onweonye.

N’oge ná-adịghị anya, agwara ndị mmadụ banyere mgbasa nke mmehie iringo na ajọ omume dị nime egwuri egwú ndị kọlejị. Ụmụ okorọbịa ndị dị ọtụtụ n’ọnụ-ọgụgụ ewerewo ajọ omume bibie ndụ ha, ọtụtụ bụ ndị amara ikpé ijé mkpọrọ n’ihi ịkpachara anya tufue mmeri nke egwuri egwú ha ka ha wee nweta mmeri nke iti-akamgbà nime egwuri egwú ewere nkà erie-ego. Egwuri egwú ndị kọleji emebiwo nke na kọleji na mahadum dị iche iche na-atụgharị uche maka iwepụ ịsọmpi nke egwuri egwú kpamkpam n’ihe ọmụmụ ha. Onye Kraist, ọ na-eso n’ihe dị otú ahụ?

Òlee otù ezi ihe apụrụ ikwu banyere iti-ọkpọ na ịgba-mgbá? Ndụ nke ndị mmadụ ka ana-etufu mgbe dum, bụ ndị ná-ada n’ịtụ mgbere egwuri egwú ọbara nke oge a. Náánị Chineke matara otú ha ra bụ mbibi nke mkpụrụobi na omume, nke o wetaworo bụ ịkpọ ndị mmadụ maka iti-ọkpọ, ịgbá-mgbà, ịgbá ọsọ n’elu ịnyịnya na egwuregwú ndịọzọ ahụ akpọrọ “egwuregwú dị ọcha.”

Ọ dị ihe ụfọdụ ná-enweghị mmerụ nke pụrụ inye obi ụtọ bụ nke Onye Kraist pụrụ iso ná-eme nke ná-enyere échìchè na arụ-ike aka, dịka ịkwọ ụgbọ-mmiri, ịkụ azụ, ịchụ ntà, na igwu-mmiri. Oziọma kwesịrị, n’ihi na ọ na-enye ha ezi udo na afọ ojuju. Onye Kraist adịghị achọ itinye onwe ya n’omume ndị ụwa na egwuri egwú arụ-ụfụ ka o we nwee obi ụtọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị ka ọ pụtara bụ ịdị ndụ dịka ụwa si chọọ?
  2. Òlee otú radio, onyonyo (sinima) siworo mebie ihe site n’ihe ha na-ewepụta?
  3. Gịnị mere na Ndị Kraist adịghị eso n’egwuregwú ahaziri-ahazi?
  4. Tụpụta ụdị ihe dị iche iche nke Onye Kraist nwere ike iso mee maka mmegharị arụ na arụ ike na inwe obiụtọ.
  5. Òlee ihe mere na Onye Kraist agaghị ahụ ụwa n’anya, ma ọbụ ihe nke dị n’ụwa?