Aisaia 3:16-24; 55:2; I Pita 3:3-5; I Ndi Kọrint 6:19, 20; 9:25; 10:31

Lesson 266 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI “Ewere ọnu-ahia gbara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n’aru-unu, na n’ime muọ unu, nke bu nke Chineke” (I Ndi Kọrint 6:20).
Cross References

I Ikpé Megide Mpako nke Ndịnyom

1. N’ihi na ụmụ ndịnyom Zaiọn dị mpakọ, Onyenweanyị sịrị na Ya ga-eti ha ọnyá, Aisaia 3:16, 17

2. Aga ewepụ ihe ịchọ-mma niile ha ma wezuga kwa ísì ọma na ịma-mma ha, Aisaia 3:18-24

3. Ekwesịrị imefu ego n’ihe ahụ nke na-edozi arụ na nke na-ewuli mkpụrụobi, Aisaia 55:2

II Ịchọ mma nke Onye Kraist

1. Ịchọ mma nke ime mmụọ, ọ bụghị nke anụ-arụ, dị óké ọnụ-ahịa n’anya Chineke, I Pita 3:3-5

2. Chineke kwesịrị ka enye Ya otuto n’arụ anyị na mmụọ anyị, I Ndi Kọrint 6:19, 20; 10:31

3. Anyị aghaghị imeru ihe n’òkè n’ihe niile, I Ndi kọrint 9:25

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Obi Dị Ọcha

Okwu mgbe ochie ahụ na “uwe anaghị egosi ihe mmadụ bụ” bụ nnọọ eziokwu n’ụbọchị taa ma bụrụ kwarị n’ọtụtụ arọ garaaga. Ná-agbanyeghị ihe mmadụ na-eme iji mee ka elu arụ dị ọcha, ọnọdụ ime mmụọ ya na-adị otú ọ dị. Jisọs gwara ndị Farisii nke ụbọchị Ya na ha mara mma n’ile anya ma nime ha, ha “juputara n’ọkpukpu nke ndi nwuru anwu.” Ọ sịrị, “Gi Farisi kpuru ìsì, buru uzọ me ka ime iko na afere di ọcha, ka àzú ha we ghọ kwa ọcha” (Matiu 23:26, 27).

Mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ ma Chineke na-ele anya n’obi. Ọ dịghị ịchọ mma nke anụ-arụ pụrụ ịchọ mkpụrụobi mma. N’ihi nke a, nzọụkwụ mbụ nke onye ná-achọ ka ya na Chineke dị n’udo na ime ihe ga-atọ Ya ụtọ aghaghị ịbụ nsacha nke obi site n’Ọbara nke Jisọs, nke bụ ịchọ mma nke ime mmụọ site n’ọlụ nke Mmụọ Nsọ. Ọbụná mgbe nzọụkwụ mbụ niile nke ọlụ a bụ ihe emezuru, aga agbanwe ndụ nke pụtara ìhè, n’ihi na ọ bụ ọnọdụ nke ime mmụọ na-achị ndụ na omume niile nke ana-ahụ anya. Mgbe emere mmadụ ka ọ bụrụ “onye ekèrè ọhụ” ihe “ochie nile agasiwo.” Ọ dịghị enwe kwa ịhụn’anya n’ebe ihe ndị ahụ na-ezighị ezi ọ na-ahụ n’anya na mbụ dị. Ọ bụghị kwa onye nganga ahụ nke ná-achị ndị ụwa na-ebi nime ya ọzọ. Ọchịchọ ya niile na-adị ichè, ọ na atụkwasị kwa uchè ya n’ihe dị n’Eluigwe.

N’ịkuzi ihe n’isiokwu a dị mkpà, onye ahụ nke tọrọ ntọ-ala nzukọ anyị na-eji ọtụtụ ihe nkọwa nke pụtara ìhè nkeọma. Ọ kọrọ banyere otù ọhụ nke ọ hụrụ otù ugwu ntà okoko osisi kpuchiri. Ka ọ na-ele ya anya site n’ebe dị anya ọ mara mma, ma ka ọ bịaruru nso ọ hụrụ na ọ bụ náánị mkputamkpu nke ihe mkpofu okpokoro na mpekele ihe ígwè dị iche iche na ntakịrị ájá n’akụkụ ya ụfọdụ bụ ebe okoko osisi niile ahụ na-eto. Ọ na-ejikarị mkputamkpu ihe mkpofu ahụ tụnyere okpukpé ụgha niile nke ụbọchị taa, bụ ndị ná-ama mma n’ile-anya n’elu arụ ma ha emeghị kwa ihe ọ bụla ịgbanwe obi.

Ndịkom nke Jeriko gwara Elaisha na ọnọdụ nke obodo ha mara mma, ma na mmiri nke ha nwere adịghị ọcha, n’ihi ya ala ha adịghị amị mkpụrụ. Elaisha weere arịa ọhụụ, tinye nnu nime ya, wee wunye nnu ahụ nime isi mmiri ahụ, ewee gwọọ ọrịa mmiri ahụ. Ọ gara n’isi-iyi ahụ, ebe nsogbu ahụ si pụta. N’otù aka ahụ, anyị ga-enyocha obi anyị ịhụ na isi-iyi nke omume niile anyị pụtara ìhè dị ọcha. Baịbụl na-enye iwu: “Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; n’ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di” (Ilu 4:23). Ọ bụrụ na asachara obi anyị, anyị ga-ahụ na ndụ anyị ga-abụ ihe ga-adakọrịta ngwangwa n’ebe mmụọ nke Okwu Chineke na Oziọma ahụ dị.

Ịgafe-òkè niile

Edeghị ihe dị ukwuu n’Akwụkwọnsọ banyere ụzọ kwesịrị iji jie ejiji, ma enyere anyị ihe zuru ime ka anyị nwee ike ịnọ n’etiti ụzọ wee ghara ijehie site n’ịgabiga ókè n’ụzọ ọ bụla. Ezi ndị ndụmọdụ anyị n’okwu banyere uwe oyiyi eguzowo mgbe niile n’ịdị ọcha na idebe ihe ọcha, na kwa ịchọ mma nke uwe oyiyi nke ná-abụghị n’ụzọ dị óké elu maọbu nke pụrụ iché n’ihi na ọ bụrụwo nke wusiworo èwù mgbe dị anya.

Ụfọdụ ndị-ọlụ nke Oziọma na-aga n’ama nime otù obodo mgbe ha gafere otù nwanyị nke jiri ejimeji n’ụdị ịchọ mma ná-ewùewù mgbe ahụ. Ndị mmadụ na-atụgharị isi ha ile ya anya nke ugbò abụọ. Ka ha gabigara ihe dị ka ụlọ abụọ ndị-ọlụ ahụ gafere nwanyị ọzọ nke yi sketi ya n’ụzọ gbadara agbada karịa ka o kwesịrị, na ihe iyi n’ụkwụ nke ná-adịghị kwa ewùewù, na onye gosipụtara omume mgbe ochie n’ile ya anya. Ndị mmadụ na-ele kwa ya anya nke ugbò abụọ, n’otù aka ahụ! Ebe a ka egosiworo ụdị ịgafe ókè abụọ apụrụ inwe. Apụrụ ikwu na nke ọ bụla n’ejimeji ndị ahụ jọrọ njọ dịka ibe ya. Ọ dịghị onye ọ bụla nime ndịnyom ndịa yiri ihe oyiyi ya n’ụzọ kwesirị ekwesị dịka Akwụkwọnsọ na-ekwu. N’ịchịkọta okwu ahụ ọnụ, anyị na-ahụ na ịchọ mma nke uwe oyiyi bụ nke kwesịrị Onye Kraist nwoke maọbụ nwanyị bụ ịchọ mma ahụ nke kwesịrị, dịkwa mma ile-anya; ụdị uwe nke adụrụ nkeọma, edoziri ma dịkwa ọcha. Nchịkọta nke ihe niile ndịa bụ na ụdị ịchọ mma nke uwe ahụ na ụzọ esi yie ya agafeghị ókè n’ihi na ọ dị ọhụụ nke ukwuu maọbụ na ọ dịwo ochie bụrụ kwa nke ná-adịghị kwa ewùèwù. Ekwuwo ya nkeọma: “Abụla onye mbụ agaeji nwapụta ihe ọhụ maọbụ onye ikpeazụ ga-arapụ ihe ochie.”

Ihe ọ bụla anyị ná-eme, anyị ga na-eme ya iji nye Chineke otuto na nsọpụrụ (I Ndi Kọrint 10:31). Oziọma kwesịrị ịbụ ihe ndị ụwa na-asọpụrụ na-ekwu kwa ezi ihe banyere ya n’ihi ụdị uwe anyị na-eyi nakwa site n’omume anyị ndị ọzọ pụtara ìhè. Anyị aghaghị iwepụ “aka n’aha ajọ ihe ọ bula” n’ihe niile (I Ndi Tesalọnaika 5:22). Uwe oyiyi anyị ekwesịghị ime anyị ka anyị bụrụ ndị eledara anya n’etiti ìgwè mmadụ ndị jiri ejimeji nkeọma, n’aka nke ọzọ, ọ gaghị adị n’obi anyị bụ ọchịchọ ahụ ime ka anyị bụrụ ndị ana-ekiri n’etiti ìgwè mmadụ.

Mpako

“N’iru ntipia ka npako na-aga, ọ bu kwa n’iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madụ nāga” (Ilu 16:18). Mpako bụ ọlụ nke anụ-arụ bụrụ kwa ihe-arụ n’ebe Chineke nọ. Ọ bụ ihe na-eweta ọtụtụ nime mmehie nke dị n’ụwa. Ọ bụ mpako mere Lusifa inwe ọchịchọ ebe dị elu “n’elu kpakpando nile nke Chineke” (Aisaia 14:13). Mpako bụ ihe na-emegide obi dị ume-ala n’ụzọ dị ukwuu. Obi dị ume-ala anaghị ele anya otuto nke ụwa ma ọlị. Mkpụrụobi ahụ na-achọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, otuto nke Chineke. Ọ bụ mgbe mmehie batara n’obi nwoke maọbụ nwanyị ka mpako na nzuzu na-abụ eze.

Ọ bụ mpakọ n’obi ụmụ ndịnyom Zaiọn daghachiri àzụ wetara mkpọkwasị nke ọnụma Chineke n’isi ha, site n’Onye amụma bụ Aisaia. Mmehie na-emebi mba ahụ, Aisaia wee tie mkpu megide ya. Mgbe mmehie na-achị, ajọ ọlụ niile ọ bụla na-eso ya. Ụmụ ndinyom Zaiọn dị mpako. Ha na egbokwasị onwe ha ihe niille ana-akwụba ná ntị, na ọla aka niile, ákwà mgbọchi iru niile, na iheọma niile nke ike n’isi; na mgba aka-akàrà niile, na mgba-aka imi niile, na ákwà ọma niile ịkụkụ n’isi na ákwà mgbochi niile na uwe ememe niile -- ihe ọ bụla dịka ụdị ejimeji nke na-ewùewù n’ụbọchị ha si dị. Ha na-azọ “ijè nganga” ka ha na-aga ijè. Uwe oyiyi na ọla niile ha bụ iji mee ngosi. Ha chọrọ ịbụ ndị mara mma n’iru ndịkom. Enwere otù okwu amamihe mgbe ochie nke ná-asị, “Ihe maramma bụ ihe ahụ ihe maramma na-alụpụta.” Ma nke a abụghị eziokwu n’ebe ụmụ ndịnyom Israel nọ. Ha nwere ịchọ mma ahụ nke anụ-arụ, ma ọ bụghị ezi ima-mma ahụ ha kwesịrị inwe -- ịchọ mma ahụ nke ime mmụọ bụ ịdị mma na nsọpụrụ Chineke.

Omume Ekwsịghị ekwesị

Uwe ekwesịghị ekwesị abụrụwo mgbe niile ihe na-esote mba daghachịrị àzụ. Mgbe ndị mmadụ na-echezọ Chineke, mpako na abata ha ewee ghọọ ndị na-enweghị ihere na ndị anya ike. Ndị mmadụ nke ụwa anyị nke ụbọchị taa mepere anya na-adị ka ndị na-enweghị mmasị n’otú esi eyi uwe, dịka ha si enwe n’otú esi eyipụ ya. Uwe ụkwụ ogologo nke na-arapara n’arụ, uwe ụkwụ mkpirisi, uwe na enweghị aka, uwe olu ya dị ala, uwe na-arapara n’arụ n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na uwe ndị ahụ ná-ahụ ụzọ bụ nke ụmụ nwanyị na-eyi na-ejègharị n’ámá niile bụ ihe ihere na ihe arụ n’anya Chineke.

Onyenweanyị gburu anụ wee were akpụkpọ ha gbokwasị Adam na Iv mgbe ha mehiere, Ọ dịghị kwa anagide mmehie ma ọlị n’ụbọchị ndịa. “Ihe diri nwoke agagh adikwasi n’arụ nwayi, nwoke agagh-eyiri kwa uwe-ngbokwasi nwayi: n’ihi na ihe-aru nke JEHOVA, bú Chineke-gi, ka onye ọ bula bu nke nēme ihe ndia” (Deuteronomi 22:5).

Mgbe egbokwasịrị mkpụrụobi anyị uwe nke eziomume anyị ga-ahụ na ụdị uwe anyị na-eyi n’arụ na-adakọta na nke mmadụ ime anyị. Ọ bụ ndị ahụ sitere “n’ìgwè ndi gwaraọgwa,” maọbụ ndị ahụ ọ na-agụ agụ ịga ijé n’akụkụ ókè-ala ụwa, bụ ndị na-achọ iyi uwe n’ụdị nke yiri nke ụwa. Mkpụrụobi ahụ agụụ Chineke na-agụ onye ahụ nke na-achọsị eziomume na ezi ịdị nsọ ahụ ike -- adịghị enwe óké mmetụta banyere ịchọ mma nke uwe elu arụ ya, ka o wee bụrụ nke na-ewùèwù, dịka o si emetu ya banyere uwe na ịchọ mma nke ime mmụọ. Onye agụụ ime mmụọ na-agụ anaghị achọ nganga na ịchọ mma nke ụwa. Ọ dịghị emetụ ha nke ukwuu banyere ime ihe ga-atọ ndị nọ ha gburugburu ụtọ; ha na-achọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.

Ịchọ mma Kwesịrị Nsọpụrụ

Mmụọ Nsọ, site n’ọnụ Pita, kwuru banyere ịchọ mma anyị wee sị: “Ka ọ ghara ibu ichọ-mma ahu nke arụ nke bu ikpà isi, na iyikwasi ihe ọla-edo, maọbụ iyikwasi ọtụtụ uwe; kama ka ọ buru madu zoro ezo nke nkpuru-obi, n’uwe anāpugh imebi nke bu mọ dị nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n’anya Chineke” (I Pita 3:3, 4). N’ebe a, na mpaghara nke Akwụkwọnsọ a, ka enwere ihe dịkarịsịrị mkpà banyere isiokwu a. Ọ bụ mmadụ ime nke na-enwupụta n’iru na-egosipụta ezi ịmamma. Uwe ahụ nke onye ahụ nwere obi ume-ala na mmụọ dị nwayọ nwere ike ịbụ nke dịkarịsịrị ọnụ-ala, ma ghara kwa inwe ihe pụrụ iche eji chọọ ya mma, ma mmụọ nke obi ume-ala na nsọpụrụ Chineke ga-enwupụ site n’ebube dị ukwu, bụ nke ga-akarị onwunwu nke ọlà dịkarịrị óké ọnụ-ahịa nke apụrụ itinye n’uwe ahụ.

Ịkpà agịrị-isi, dịka ekwuru ya nime Akwụkwọnsọ, na-atụ aka n’ụzọ ahụ gabigara ókè nke eji edozi agịrị-isi, nke ihe na-akpali ya bụ nganga nke obi na ọchịchọ nke ịbụ ihe na-ara anya ụrà n’ụdị nke megidere ezimmụọ nke Onye Kraist. Akwụkwọnsọ na-agwá anyị n’ụzọ pụtara ìhè na ọ bụ ihe ihere bụ nwanyị ịkọpụ agịrị-isi ya (I Ndi Kọrint 11:6). Chineke ekwuwo na Ya ga-ezite isi nkwọcha na ikpé ndị ọzọ megide ndị ahụ jụrụ irubeisi na ịsọpụrụ Okwụ Ya na ndị ahụ kpachara anya na-aga n’ụzọ nke mpako na omume ná-ezighịezi. Ịdị nsọ ahụ nke na-enwupụta n’iru onye ozi nke Obe ahụ dị nwayọ na ume-ala n’obi, nke na-eme ya ka ọ na edozi onwe ya n’ilezi anya na n’ụzọ ziriezi, dịka mmụọ nke Oziọma Kraist si dị na n’ụzọ nke na-aghaghị eweta ịta ụta nye aha nke Kraist, ga-egosipụta kwa onwe ya n’ụzọ o si dozie agịrị-isi ya.

Ebe mmadụ na-ele náánị n’ihe anya na-ahụ, ọbụná onye nwere ezi nleru-anya karịa n’etiti anyị niile pụrụ ikpeikpé n’ụzọ ná-ezighị ezi. N’Akwụkwọnsọ, anyị nwere ihe ndepụta nke erughịeru a nke mmadụ, mgbe Onyenweanyị, gwara Samuel ka o tee otù nime ụmụ ndịkom Jesi mmanụ ịbụ eze Israel. Mgbe onye ahụ nke bụ ọkpara guzoro n’iru Samuel, ụdị ya n’ile anya na ịmamma nke arụ ya metụtara Samuel nke ukwuu na ọ sịrị, “N’ezie, ọ nọ n’iru JEHOVA, bú onye nke Ya e tere manu” (I Samuel 16:6). Samuel nọ Onyenweanyị ezi nso nke mere Chineke ịgwà ya okwu. Onyenweanyị sịrị, “Elegidela iru ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n’ihi na ajuwom ya: n’ihi na JEHOVA adigh-ahu dika madu si ahu; n’ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma JEHOVA nēle obi.” Onyenweanyị arọpụtawo otù nwaokoro nke na-acha ọbara ọbara bụ onye akpọtaara Samuel site n’ebe ana-azụ atụrụ. Nime nwaokoro ahụ ka e nwere obi eziokwu nke na-anụ ọkụ nye Chineke.

Otù agịga dị ntà, otù ihe ịkpagide taị-olu, maọbụ otù taị-olu, nke eyikwasịrị náánị n’ihi urù ọ bara maọbụ iji dozie uwe mmadụ yi, na-enyekarị izu-òkè ahụ dị mkpà achọrọ n’ebe uwe ndịkom maọbụ ndịnyom dị; ma ihe ịchọ mma gabigara òkè maọbu nke na-egbuke egbuke ekwesịghị onye nsọ, ha adịghi kwa etinye ihe ọ bụla n’ịma mma maọbụ n’ịdịmma nke omume. Ihe ebu n’obi wee na-eyi ihe ọ bụla na-abụkarị ihe zuru iji chọpụta ma ihe ahụ o kwesịrị iyi maọbụ na o kwesịghị. Ọ bụ náánị iji chọ mma, maọbụ ọ dị mkpà ihe ahụ dị nke ana-apụghị imezu, n’ụzọ ọ bụla ọzọ, dịka ụkpụrụ nke ịsọpụrụ Chineke na ịdị nsọ si dị? Nke a metụtara ndịkom na ndịnyom, n’ihi na mpako dị nime obi nwoke na-eweta otù ikpé ọmụmà na ịlan’iyi nye mkpụrụobi ya dịka mpako nke dị nime obi nke nwanyị pụrụ ime. Óké nyikwasị nke ọlà bụ ihe ná-ezighị ezi nye ndịkom dịka ọ bụ kwa nye ndịyom. Baịbụl na-agwa anyị “Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n’uwa n’anya. Ọ buru na onye ọ bula ahú uwa n’anya, ihu-n’anya nke Nna-ayi adigh nime ya. N’ihi na ihe nile nke di n’uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esitegh na Nna-ayi, kama o sitere n’uwa. Uwa nāgabiga kwa, ya na agụ ihe ọjọ ya: ma onye nēme ihe Chineke nāchọ nānọgide rue mgbe ebigh-ebi” (I Jọn 2:15-17).

Ndị okpukpé ụfọdụ na-eyi uwe pụrụ iche iji gosi ndị ha bụ. Ndị Kraist nke mgbe ochie ka amaara site n’ihe ha kwusara, otú ha si bie ndụ, na onye ha jesoro -- ọ bụghị kwa site n’uwe pụrụ iche ha yikwasịrị. Anyị nwere ihe ọtụtụ, ihe ọtụtụ ahụ na-ezi kwa anyị ka anyị ghara iji ejimeji ka anyị wee yie ụwa, kama iji ejimeji dịka o kwesịrị nwa Chineke -- ọ bụghị n’ụzọ gabigara ókè, kama n’ụzọ dị n’etiti eleziri anya nkeọma.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee ịchọ mma kachasị nke nwa Chineke pụrụ inwe?
  2. Òlee ihe na-achị ịchọ mma elu arụ nke Onye Kraist?
  3. Òlee ọnọdụ nke ndịnyom Isreal n’oge ahụ nke amụma Aisaia?
  4. Gịnị bụ nguzo anyị n’ụbọchị taa banyere uwe oyiyi na iyikwasị ihe ọlà?
  5. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji na-emeru ihe n’ókè n’ihe niile?