Jenesis 18:23-32; 32:9-12, 24-28; Aisaia 58:1-11; Daniel 9:3; 10:1-3, 10-12; Joel 1:13-15; 2:1-17; Matiu 6:16-18; Luk 18:1-14

Lesson 267 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ma onye nēweda onwe-ya agēweli ya elu” (Luk 18:14)
Cross References

I Ekpere Nrịọchita Nke Abraham

1. Abraham rịọchitere Sọdọm na Gọmọra n’ekpere, ná-arịọ Onyenweanyị ka Ọ rapụ ibibi ha, ma ọ bụrụ na aga-ahụta mmadụ iriise (50) bú ndị eziomume nime ha, Jenesis 18:13-26; Jemes 5:16-18

2. Abraham gara n’iru ịrịọ arịrịọ n’ekpere rue mgbe ewedatara ọnụọgụgụ ahụ rue iri, Jenesis 18:27-33

II Ekpere Mmeri Nke Jekọb

1. Jekọb wedara onweya ala n’iru Chineke wee kpee ekpere maka nnapụta, Jenesis 32:9-12

2. Jekọb gbara mgbá abalị ahụ niile ya na mmụọ ozi nime ekpere mmeri, Jenesis 32:24-28; Ndi Efesọs 6:12

III Ekpere Daniel Maka Israel

1. Ọchịchọ Daniel bụ ka eweghachị Israel n’ọnọdụ mbụ ha, Daniel 9:1-3; Jeremaia 29:10; II Ihe Emere 36:21

2. Daniel kpere ekpere bue kwa ọnụ o wee nata okwu owuwe-anya na anụwo ekpere ya, Daniel 10:13, 10-12; Ndi Rom 8:16; I Jọn 3:24; 5:6

IV Obubu-ọnụ

1. Onyenweanyị na-egosi ihe dị iche n’etiti ibu ọnụ iru-abụọ na obubu-ọnụ nke Ya Onweya rọpụtaworo, Aisaia 58:1-11; Matiu 6:16-18

2. Anyị ga-abụ ndị na-achọ nzọpụta nke Chineke ọ bụghị anyi ịgụ onweanyị ná ndị eziomume, Joel 1:13-15; 2:1-17; Luk 18:9-14

3. Onyenweanyị ga-ekpepụta ndị nke Ya arọpụtara ọsọsọ, Luk 18:1-8

4. Nzukọ Kraist nke oge gboo buru ọnụ n’oge ụfọdụ pụrụ ichè mgbe ha na-arịọ Chineke maka nduzi na inye ike pụrụ ichè, Ọlụ Ndiozi 13:2, 3; 14:23

5. Pọl buru ọnụ ọtụtụ oge, II Ndi Kọrint 6:5; 11:27.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Obubu-ọnụ

Obubu-ọnụ abụrụworị, nime ọtụtụ ọgbọ na n’etiti mba niile, ihe a na-eme n’oge ịkwa-ákwá, iru-ujụ, na óké mkpagbu. Ezi nzube nke eji eme ya na-abụkarị ma mmadụ nye onwe ya ahụhụ nke iweda mkpụrụobi ya n’ala inyere onye ahụ aka ịbịaru nso Chineke ka o wee nata ihe arịrịọ ahụ maọbụ iru-ọma ahụ pụrụ ichè site n’aka Chineke (Abù Ọma 35:13; 69:10). Ọ dịghị obubu-ọnụ edebere nime Iwu Moses, site kwa n’ihe edere n’Akwụkwọnsọ anyị pụrụ ịhụ na ibu ọnụ niile bụ ihe aga-eme site ná mmetụta nke mmụọ nke onwe-onye, dịka onye ahụ nwere mmetụ n’obi otú Chineke kpọrọ ya ka o debe maọbụ mee.

Ọtụtụ ndị nke Chineke ebuwo ọnụ mgbe ha nwere ibu-arọ nke nsogbu ụfọdụ nyigidere ha. N’ihi nke a, anyị pụrụ ịhụta na obubu-ọnụ na-adabànye karị n’oge iru-uju (ákwá), mkpagbu, maọbụ mgbe ibu-arọ nke ime mmụọ na-anyịgide anyị. Otù nime mgbe ụdị ihe a mere bụ mgbe obodo ntà nke Ai meriri Ụmụ Israel n’agha. Ebe ọ matara na obi adịghị Chineke mma n’ebe ha nọ na O kwenyewo kwa ka obodo ntà Ai merie ndị agha ka ike nke Israel, Joshua wee dọwa uwe ya, ya na ndị-okenye nke ndị Israel daa kpue iru ha n’ala n’iru Igbe Ọgbụgba-ndụ Chineke site n’ụtụtụ rue anyasị ná-erighị nri.

Eziokwu a na ọbụná ndị n’ekweghị ekwe na ebu ọnụ mgbe ụfọdụ na-egosi n’ezie na obi nke mmadụ dịka òkìkè si dị na-ekwenye n’ụzọ a nke eji abịaru Chineke nso karị. Eze ndị Nineve, ebe ọ tụrụ óké egwù site ná nkwusa nke Jona, kpọsara obubu-ọnụ wee yikwasị ákwá mkpè nọdụ kwa ala ná ntụ. Ọ kpọsa kwara obubu-ọnụ ya niile ka mmadụ maọbụ igwè ewu maọbụ ìgwè anụmanụ ọ bụla ghara idetụ nri ọ bụla ọnụ. O nyere iwu sị: “Ka madụ na anumanu, ma ìgwè ehi ma ìgwè ewu na aturu ghara idetu ihe ọ bula n’ọnụ, ka ha ghara izu onwe ha, ghara kwa iñu miri: ma ka ha kpuchie onwe ha n’ákwá nkpe, ma madụ, ma anumanu, ka ha kpọkusi kwa Chineke ike ka ha chigharia kwa, onye ọ bula ya pua n’uzọ ọjọ ya, na n’ihe-ike, nke di n’ọbu-aka ha. Ònye mara? Elegh anya Chineke gēchịgharị, chègharia uche, si n’iwe Ya dị ọku chigharia, ka ayị we ghara ila n’íyì” (Jona 3:5-9).

Onyenweanyị chègharịrị uchè wee ghara ịla obodo ukwuu ahụ bụ Nineve n’íyì na ndị niile bi nime ya, n’ihi na eze ahụ nke na-anọdụ n’oche-eze, ya na ndị ya niile buru ọnụ kpee kwa ekpere. Ndịa mịpụtara “nkpuru kwesiri nchègharị” (Matiu 3:7-12). Ha kpere ekpere n’eziokwu. Ha ebughị ọnụ ka mmadụ hụ ha. Ha chọrọ ka Chineke hụ ha ka ha nata kwa iruọma (àmàrà) Ya. Chineke nụrụ ekpere ha wee za kwa ha, n’ihi na “ọnwu nke onye nēmebi iwu adigh atọ Ya utọ” (Ezikiel 33:11). N’oge ijéozi nke Jisọs n’elu ụwa nke a, otù nna kuteere ndị na-eso ụzọ Ya nwa ya maka ọgwụgwọ. Nwa ya ahụ bụ onye anya ná-adịghị mma, ma ndị na-eso ụzọ Ya apụghị ịgwọ ya ọ bụ ezie na ha kpesiri ekpere ike ka emee ya. Ma mgbe nna ya kpọtaara ya Jisọs, achụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ ewee napụta nwantà nwoke ahụ. Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ Jisọs jụrụ Ya ajụjụ ihe kpatara na ha onweha enweghị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ n’aru nwaokoro ahụ. Jisọs sị na ọ bụ n’ihi ekweghị ekwe ha; ma ọ tụkwasịrị nke a, maka ịgbà ha ume na ikuziri ha ihe: “Ma otú ọ di mọ di otú a apugh iputa ma-ọbugh site n’ekpere na ibu-ọnu.” Nke a na-eme ka anyị nwapụta úrù nke dị n’obubu-ọnụ, mgbe emere ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị na n’omume nke ná-atọ Chineke ezi ụtọ.

Obubu-ọnụ Nke Iru abụọ

Ndị Farisii na-ebu ọnụ dịka ime ihe ngosi ana-ahụ anya nke ịdị nsọ. Ha chọrọ ka mmadụ ná-ahụ ha anya. Ha adịghị échè échìchè banyere enweghị ezi obi nke nchègharị. Ndụ ha na-adị kwa ụbọchị adịghị adakọta n’òfùfè nke okpukpé ha. Ha elebaghi anya n’ọnọdụ nke ime mmụọ ha, n’ikwu ya n’ụzọ nke ihe mmụọ, n’ihi na ha jupụtara n’ụdị mmehie na ajọ omume dị iche iche. Ma ha buru ọnụ kpee kwa ogologo ekpere n’ama na ọmà-ahịa dị iche iche náánị ka ndị na ekiri ha wee chee sị na ha dị nsọ nke ukwuu bụrụ kwa ndị na-agbasosị okpukpé ha ike.

Jisọs lelịrị ibu ọnụ iru-abụọ ndịa anya wee baara ndị ahụ na ebu ọnụ n’ụzọ dị otú ahụ mbá na-asị: “Unu aghọla ndi na-agbaru iru, dika ndi iru-abua: n’ihi na ha nēmebi iru-ha, ka ha were onwe ha gosi madu na ha nēbu ọnụ.” Obubu-ọnụ nke emere n’ụzọ dị otú a adịghị aba urù n’ihe nke mmụọ. Jisọs kwuwapụtara na ndị dị otú a enwezuworị ugwọ ọlụ ha. Ha chọrọ nsọpụrụ na otuto nke mmadụ ha achọghị kwa inweta nsọpụrụ ahụ nke na-esite náánị na Chineke (Jọn 5:44). Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ Ya ka ha mee onwe ha dịka ndị na-adịghị ebu ọnụ mgbe ha na ebu ọnụ, na ha ga-eme otú ahụ nye náánị Chineke. Mgbe ahụ ụgwọ ọlụ ha ga-adị ukwuu n’Elu-igwe.

Aisaia mekwara ka anụ olu ịbá mbá nke ya megide ụmụ Israel ịdabere náánị n’ụdị okpukpé ahụ ana-ahụ anya. O gosịri ha na ha na-anụọkụ n’obi nke ukwuu banyere ọlụ na omume ana-ahụ anya karị ịdị nsọ nke ime mmụọ nke omume ahụ niile aka-alụpụtaworị nime ndụ ha. Ha buru ọnụ wee mee ememe yiri ikpe ikpere ma ha gakwara n’iru n’otù ụzọ mmehie ha ahụ niile. Ma mgbe ha ná-anataghị ọzịzá, ha wee si “N’ihi gini ka ayi buworo ọnụ … ma I hugh?” Chineke kọwara ibu ọnụ nime ọzịzá Ya mgbe Ọ sịrị: “Ọ bu dika nke a ka obubu-ọnu nke M’narọputaworo bu? bú ubọchi madu gēweda nkpuru-obi-ya n’ala? Ọ bụ iruda isi-ya n’ala dika amì, na igbasa ákwá-nkpe na ntu n’okpuru ya? Ọ bu nka bu obubu-ọnu M’narọputa? itọpu agbu nile nke nmebi-iwu, itọsa ihe-okìkè nile nke yoke, na izilaga ndi anēmegbu emegbu ka ha nwere onwe-ha. Ka unu tiji kwa yoke ọ bula? Ọ bugh ikesara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n’ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n’ulo gi? Mgbe i huru onye gba ọtọ, ka I kpuchie ya?” (Aisaia 58:5-7). Onyenweanyị mere ka o doo Israel anya nkeọma, na kwa anyị onwe anyị, ụdị ibu ọnụ nke Ọ rọpụtara; O kwekwara nkwà na ọ bụrụ na ha, na anyị ga ebu ọnụ n’ụzọ dị otú ahụ na Ya ga-anụ za kwa ekpere.

Mgbe kwesịrị Ibu-ọnụ

Ekwensu na-anọ ná njikere mgbe niile inwe ohere ịkwada okwukwe nke mkpụrụobi niile ziriezi. Mgbe ụfọdụ o dubawo ọtụtụ mmadụ n’ịwịárá na ibu-ọnụ ogologo oge náánị ibibi arụ-ike Chukwu nyeworo ha. Ụdị ibu-ọnụ dị otú ahụ abụghị uche Chineke.

Ụfọdụ mmadụ na-ágbá mbọ ibu-ọnụ mgbe arụ ha ghọworo ihe dị n’ọnọdụ esighịike n’ihi ọrịa ha rịaworo maọbụ nke ha na-arịa mgbe ahụ na kwa mgbe ha na-apụghị ịnagide mgbu nke erighị-nri ga-enye ha n’arụ. Nke a adịghị atọ Chineke ụtọ ma ọlị. Baịbụl ná-agwa anyị na ihe ọ bụla anyị na-eme, anyi kwesịrị ime ha ka enye Chineke Nna otuto na nsọpụrụ. Ime ihe ka ndị na-awịara adịghị enye Chineke otuto ma ọlị. Akparama-ágwá nke na-eweta nkọcha n’ọlụ na n’aha Chineke adịghị enye Ya otuto. Ilelị arụ-ike ahụ Chineke nyeworo mmadụ, mgbe ana-eme nke a site na nganga maọbụ iweli onwe-onye elu, adịghị enye Chineke otuto.

Ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs mara ọkwà maọbụ nye ndị na-eso ụzọ Ya iwu ibu ọnụ kama Ọ sịrị, mgbe Ọ na ekwu okwu amụma, na mgbe Ya rapụsiworo ha na ha ga na-eme otú ahụ (Matiu 9:15). Ibu-ọnụ ga-alụpụta ihe ahụ ana-achọ otú Chineke si hụ na ha kachasịrị anyị mma; ma emee ya n’udị na-agaghị ebibi arụ-ike anyị ọ bụrụ na emere ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị -- ná nsọpụrụ na otuto Chineke; n’oge kwesịrị -- dịka Mmụọ Nsọ duziwo kwara; nime eziokwu na ọchịchọ ime mmụọ dị omimi na ekpere (Ndi Rom 8:26, 27). Otú ọ dị, ụfọdụ na-enwe mmetụta n’obi na okwu niile nke Jisọs na-egosi na O chere na obubu ọnụ abalị atọ na-erighị-nri bụ ogologo oge zuruezu nye onye ọ bụla iwere bue ọnụ (Matiu 15:32).

Ekpere Nrọchita Nke Abraham

Mgbe Chineke na-aga ibibi Sọdọm na Gọmọra, O wee sị na Ya agaghị ezonarị orù Ya nke kwesịrị ntụkwasị obi, bụ Abraham, ihe ahụ Ọ na-aga ime. Abraham wee guzo n’iru Jehova, na-enwe ntụkwasị obi na Chineke agaghị eme ihe ọ bụla n’ụzọ nke ikpé na-ezighị-ezi. Abraham bịaruru nso Chineke n’okwukwe, na n’ụzọ kachasị nsọpụrụ na ume-ala ọ rịọrọ arịrịọ maka ndị eziomume nime obodo ndị ahụ.

Abraham jụrụ Chineke sị, ọ bụrụ na ahụta ndị eziomume iri ise (50) n’obodo ahụ, Ọ ga-ebibi ya? Jehova wee sị na Ya ga-arapụ ya n’ihi iri ise (50) ahụ, ma ọ bụrụ na enwere ike inweta ha n’ebe ahụ. N’ihi egwù ma eleghị-anya agaghị enweta ọnụ-ọgụgụ ruru otú ahụ, Abraham gbanwere ọnụ-ọgụgụ ahụ mee ya iri anọ na-ise (45), Onyenweanyị wee sị na Ya ga ewezuga ikpé Ya n’ihi iri anọ na-ise ahụ. Mmetụ n’obi Abraham nwere n’ebe nwa nwa nne ya bụ Lọt nọ, kpatara o jiri gaa n’iru ịrịọsi Chineke ike. Ọ rịọrọ Chineke ka ewedata ọnụ-ọgụgụ ahụ rue iri anọ (40), ọzọ kwa rue iri atọ (30), emesịa kwa n’ikpe-azụ rue iri. Onyenweanyị wee sị, n’ọzịzá nye arịrịọ ikpe-azụ nke Abraham, na Ya ga-arapụ obodo abụọ ahụ n’ihi mmadụ iri. Rịba-ama na ka ogologo oge ra Abraham nọgidere ná-arịọ arịrịọ ya niile ka Chineke gakwara n’iru ná-aza ekpere nke onye nsọ nke okwukwe ahụ. Mmụọ Nsọ ekwuwo, site n’ọnụ Jemes, sị, “Aririọ nke onye ezi-omume di ike nke uku n’ilusi-ọlu-ike ya” (Jemes 5:16).

Arịrịọ Niile Nke Daniel

Daniel bụrị onye ná-asọpụrụ Chineke -- otù nwoke onye ná-ekpesi kwa ekpere ike -- onye, mgbe ọ na-agụ, otù akwụkwọ mpịakọta nke amụma Jeremaia buru nke rutara ya aka ọ hụtara na oge mmezù nke nkwà ịnapụta (maọbụ iweghachị) ụmụ Israel adịwo ezigbo nso. Ma ọ hụghị ihe nke na egosi na nkwà ahụ bụ ihe aga emezu n’oge na-adịghị anya. Ọ dịghị ihe-àmà nke ana ahụ anya na ọ dị mgbe ọ bụla aga eme ka ndị ya nwere onweha. Ma Daniel malitere ịchọsi iru Jehova ike maka nnapụta ọsọsọ nke ndị Israel, “ịchọ ya n’ekpere na aririọ amara di iche iche, n’obubu-ọnụ na ákwà nkpe na ntu.” Agwara anyị na site n’ubọchị mbụ ahụ mgbe Daniel malitere ikpe ekpere, Onyenweanyị zigara ya ọzịzá (Daniel 10:1-3, 12).

Mgbe ana-edo Ụlọ-ukwuu Chineke nsọ, Solomom ekpeworị ekpere na ọ bụrụ na aga-adọta ụmụ Israel n’agha mgbe ọ bụla ịbụ orù n’ala ọzọ, ha e wee kpee ekpere kwupụta kwa mmehie ha chigharịa kwa site n’ụzọ ọjọọ ha niile wee chọọ iru Chineke, Chineke ga-anụ ekpere ha maka iweghachi ha n’ala nke ha wee gbaghara mmehie niile ha ( I Ndi Eze 8:33, 34; II Ihe Emere 6:34-39). Daniel mere ihe bụla o nwere ike ime iweda onweya n’ala, site n’igbokwasị onweya ákwà mkpè, ikpokwasị ntu n’isi ya, ibu ọnụ, na iwere njisiike niile nke mkpụrụobi ya kpee ekpere. O kpere ekpere n’eziokwu na kwa náánị n’ihi otuto Chineke, Chineke nụkwara wee ziga nnapụta nke ekwere ná nkwà.

Òzízí Dị Iche iche Nke Jisọs

Jisọs sịrị, “Na ha (mmadụ) aghaghị ikpe ekpere mgbe niile, na ighara ikwe ka ike gwu ha.” Ọ bụ ezie na Ọ bụ Ọkpara Chineke, o metụrụ Jisọs n’obi mkpà ọ dị Ya na Nna Ya inwe mmekọ, O wee jiri kwa ọtụtụ abalị kpe ekpere. Ọ kụziri ịnọgidesiike n’ekpere site n’inye anyị ilu ahụ banyere nwanyị ogbenye ahụ di ya nwụrụ anwụ na onye ikpé ajọ omume ahụ. O nyekwara anyị ihe àtù otù aka ahụ banyere ịrịọ arịrịọ esepụghị-aka mgbe O kpere ekpere nime ọchịchịrị abalị ahụ nke gafere tutu Ya nye Ọbara ndụ Ya maka nzọpụta nke ụwa furu-efu. Jisọs kuuru ndị na-eso ụzọ Ya wee gaa n’Ogige Getsemane; ma mgbe Ọ rapụrụ ha nwa oge ka náánị Ya wee nọdụ, Ọ gara n’iru ntakịrị wee kpee ekpere. Ọ nọdụrụ n’óké ihe mnwute nke obi nke na “ọsusọ-Ya we ghọ ihe di ka óké ọkpurukpu ọbara nāda n’ala” (Luk 22:39-46). Ùgbò atọ ka Jisọs jere kpee ekpere ma nke ọ bụla ọ bịaghachịrị, Ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ Ya ka ha na-ararụ ụra, ma O kpebiwo ya nime obi Ya na aga-eme náánị uche nke Nna.

Ọ dịghị ihe ekwensu kpọrọ ásị dịka ekpere. Ekwuwo ya sị na “ekwensu na-ama jijiji mgbe ọ na ahụ otù onye nsọ kachasị nrò ka ọ nọ n’ikpèrè ya na ekpe ekpere.” Ekpere bụ ndụ Onye Kraist. Mgbe ewepụrụ ndụ ahụ mkpụrụobi ahụ na-anwụ. Okwu Chuku na-agwá anyị na ekpere nke ndị nsọ na-akwụgo n’elu dịka “ihe na-esi ìsì ụtọ” maọbụ àjà ụtọ n’iru Chineke.

Ike dị n’ekpere. Ana-akụziri anyị nke ahụ site n’ihe àtù na n’ụkpụrụ nime Àgbá Ochie na nime Àgbà Ọhụụ. Jekọb gbara mgbá abalị niile nime ekpere ya na mmụọ ozi o kweghị kwa ịrapụ ya ka ọ laa rue mgbe agọziri ya.

“Chuku kwee ka mmadụ dum nēkpe,

N’ihi ekpere nēbup’ugwu dum;

Ugwu nk’ obi abụọ, n’ezie gāgbapu,

Ma ị dagh mba, nwannem, n’ekpere.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere ejijikọta ekpere na obubu-ọnụ?
  2. Gịnị na-akpali mmadụ ikpé ekpere na ibu ọnụ?
  3. Ndị na-eso ụzọ Jisọs, hà na ebu ọnụ mgbe niile? Òlee otú Jisọs sịrị na ha ga-adị n’iru mmadụ mgbe ha na ebu ọnụ?
  4. Gịnị mere Daniel jiri bue ọnụ?
  5. Kọwaa ihe ịrịọchita arịrịọ n’ekpere pụtara.
  6. Jisọs, Ọ kụziri na anyị kwesiri ikpe ekpere n’ụzọ arịrịọ ekpere? Kwue n’okwu nke aka gị ihe Jisọs kụziri banyere ekpere.
  7. Ndị òle kpere ekpere ka ụmụ mmadụ hụ ha? Gịnị ka ụgwọ ọlụ ha ga-abụ kwa? Òlee kwa mgbe ndịa natara ụgwọ ọlụ ha?