Ọpupu 20:8; 34:21; Levitikọs 26:1, 2; Aisaia 58:13, 14; Nehemaia 10:31; Matiu 12:1-8; Mak 2:27.

Lesson 268 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “N’ubọchi mbu n’izù ubọchi asa, mgbe ayi zukọrọ inyawa achicha, Pọl we gwa ha okwu, ebe ọ gaje ila echi-ya; ọ we kwugide okwu rue etiti abali” (Ọlu Ndi-ozi 20:7)
Cross References

I Idebe Ụbọchị Izu-ike

1. Chineke nyere Israel iwu maka idebe Ụbọchị izu-ike, Ọpupu 2:8; 16:23-30; 31:12-17; 34:21; Jenesis 2:3; Levitikọs 19:3; 26:1, 2; 23:3

2. Anabataghị ime ka Ụbọchị izu-ike ghara ịdị nsọ n’okpuru Iwu, Ọpupu 31:14; Ọnu-ọgugu 15:32-36; Deuteronomi 5:12-15; Nehemaia 9:14; 10:31; 13:15; Ezekiel 20:13; 22:8

3. Ekwere ndị-Ju niile bụ ndị debere Ụbọchị izu-ike mkwà ngọzi nke Chineke, Aisaia 56:2; 58:13, 14; Jeremaia 17:20-27; Ezekiel 20:12, 20

4. Emere Ụbọchị izu-ike n’ihi mmadụ, emeghị mmadụ n’ihi Ụbọchị izu-ike, Matiu 12:1-8; Mak 2:27; Luk 6:1-5

II Otú NdịKraist si edebe Ụbọchị nke Onyenweanyị

1. Chineke egosiwo na Ya kwagidere ka edebe ụbọchị mbụ n’izu ụbọchị asaa, dịka ihe dị nsọ nye Ya, site n’ikpughe Onweya ọtụtụ ugbò nye ndị nke Ya n’ụbọchị ahụ, Matiu 28:1, 2; Jọn 20:17-27; Luk 24:1-45; Ọlu Ndi-ozi 2:1-4; 20:6, 7; I Ndi Kọrint 16:2; Nkpughe 1:10.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Edebere Ụbọchị Izu-ike Nsọ

Site n’oge nke okìkè ụwa mmadụ amataworị eziokwu banyere Ụbọchị izu-ike. Na Jenesis anyị ná-agụ ihe banyere ụbọchị izu-ike mbụ ahụ. “Chineke we jesia ozi-Ya n’ubọchi nke asa, bú nke Ọ jere; Ọ we kwusi n’ubọchi nke-asa ahu n’ozi-Ya nile nke Ọ jere. Chine ke we gọzie ubọchi nke-asa ahụ, do kwa ya nsọ: n’ihi na ọ bu nime ya ka Ọ kwusiri n’ozi-Ya nile nke Chineke kereri ekè n’ijé ya” (Jenesis 2:2, 3).

Iwu nke Chineke nyere Israel banyere ijè ha n’iru Ya nwere ọtụtụ ihe ikwu banyere idebe Ụbọchị izu-ike, bụ ụbọchị nke asaa n’ízù, nsọ nye Ya. Achọrọ ka Israel debe Ụbọchị izi-ike, onye na edebeghị ya ahụhụ ya bụ ọnwụ. Otú ọ dị, emeghị ka Israel debe Ụbọchị izu-ike site na mmánye. N’ugwu Sainai Israel kwenyere na ha ga-eme ka ha ra bú ihe niile Chineke ga-enye ha n’iwu. (Gụọ Ọpupu 19:8). Enyere ha Ụbọchị izu-ike na mgbe ahụ dịka ọgbụgba-ndụ nke dị n’etiti ha na Chineke, dịka ihe àmà nke mkwà ha kwere iji feé Ya òfùfè. (Lee Ọpupu 31:17). Ekwuru ọtụtụ ihe n’Akwụkwọnsọ banyere ọgbụgba-ndụ a n’ihi na Israel edebeghị ihe ahụ ha kwere ná nkwà.

Ngọzi Nke Ụbọchịizu-ike

Mgbe ọ na-adịghị ihe ọzọ achọrọ n’aka Israel ma-ọbụghị náánị idebe Ụbọchị izu-ike, otú ọ dị ekwere ha mkwà nke ngọzi dị ukwuu n’ihi irubeisi. Dịka ihe ịmá-àtụ: “Ọ buru na i me ka ukwu-gi si n’ubọchi-izu-ike chighari, i we ghara ime ihe nātọ gi utọ n’ubọchi nsọm; ọ buru kwa na i kpọ ubọchi-izu-ike ihe-utọ, i kpọ kwa ihe nsọ nke JEHOVA ihe nsọpuru; i we sọpuru ya, ghara ime ihe bu uzọ-gi nile, ghara ichọputa ihe nātọ gi utọ ma-ọbu ikwu okwu nke aka gi: mgbe ahu ihe JEHOVA gatọ gi utọ; M’gēme kwa ka i nọkwasi ebe nile di elu nke uwa dika inyinya; M’gēme kwa ka i rie ihe-nketa nke Jekob, bú nna-gi: n’ihi na ọnu JEHOVA ekwuwo” (Aisaia58:13, 14).

Ụbọchị Mbụ n’Izu ụbọchị Asaa

Site n’ọnwụ na mbiliten’ọnwụ nke Jisọs Kraist, ewezugara usoro nke ifè Chineke òfùfè dịka esi eme ya n’okpuru Iwu. Site n’oge ahụ gaa n’iru ịkpọ isi-ala nye Chineke bụ nime mmụọ na eziokwu, ọbụná dịka Jisọs gwawororị nwanyị ahụ n’ólùlù mmiri Sameria na ọ ga-adị otú a (Lee Jọn 4:23, 24.) Mgbe ifè Chineke òfùfè site n’ịchụàjà dị iche iche nke Ụlọ ikwu kwụsịrị, otù aka ahụ kwa ka idebe ụbọchị nke asaa dịka Ụbọchị izu-ike kwụsịrị.

Mgbe arọ ole-na-ole gasịrị Ndị-ozi degaara Nzukọ Kraist niile akwụkwọ banyere idebe ememe ochie dị iche iche nke ndị Ju na Ụbọchị izu-ike. “Ebe ayi nuru na ufọdụ ndi siri n’etiti ayi pua were okwu me ka obi lọ unu miri, nēmebi nkpuru-obi-unu; (nasi, na aghaghi ibi unu ugwu, na unu gēdebezu iwu nile) bú ndi ayi nēnyeghi ihe ọ bula n’iwu: … N’ihi na ọ di Mọ Nsọ nma, di kwa ayi onwe-ayi nma, ka ayi ghara ibo unu ibu arọ kari ihe ndia di nkpà: ka unu rapu ihe nile achuru n’àjà nye arusi, na ọbara, na anu anyagburu anyagbu, na ikwa-iko; ọ buru na unu edebe onwe-unu ghara imetu ihe ndia aka, ọ gādiri unu nma” (Ọlu Ndi-ozi 15:24, 28, 29).

Site ná mmalite Nzukọ Kraist nke Testament Ọhụụ, ndị na-eso ụzọ Jisọs malitere idebe ụbọchị mbụ nke izu ụbọchị asaa dịka ihe dị nsọ nye Onyenweanyị. Ike ukwuu na eziokwu dị na idebe nke a karịa ịbụ náánị omenala efù: n’ihi na Chineke, sitere ná mbiliten’ọnwụ nke Kraist nye ihe nkwagide n’ụzọ dị iche iche ịgosi na ụbọchị nke a dị Ya ezimma n’ụzọ dị iche iche.

Mbiliten’ọnwụ nke Kraist nyere ihe mkwàgide dị ukwuu banyere mgbanwe nke enwere site n’idebe Ụbọchị izu-ike nke ndị Ju baa n’idebe Ụbọchị Onyenweanyị nke Ndị Kraist. Kraist biliri n’ụbọchị mbụ nke ízù ụbọchị asaa. Dịka ihe edere n’Akwụkwọnsọ si dị Jisọs kwagidere ifè Chineke òfùfè n’ụbọchị mbụ n’izu ụbọchị asaa site n’igosi Onweya ọtụtụ ugbò n’ụbọchị mbụ ahụ. Site n’ọtụtụ narị arọ ndị gabigaworo, Chineke agọziwo ndebe nke ụbọchị ahụ n’ụzọ pụrụ iche site n’izute ndị nke Ya mgbe ha zukọrọ ifè Ya òfùfè n’ụbọchị mbụ nke izu ụbọchị asaa. Chineke ná-agọzi ifè Ya òfùfè kwa ụbọchị, ma Ọ na-agọzi karịa n’ụbọchị nke mbụ ahụ. Chineke adịghị eji mmụọ Ya agọzi ndị nke Ya ma ọbụrụ na omume ha adịghị atọ Ya ụtọ. Ka onye ọ bụla ná ndị niile nke na-ekwu ihe dị iche na ọ dị ụdị òfùfè maọbụ oge ọzọ nke na-atọ Chineke ụtọ gọsipụta nke a site n’ibi ndụ nke agbanwere agbanwe. Ebe ngọzi nke Chineke dị, ana-azọpụta ndị mmehie, ana-agbanwe kwa ndụ ha.

Ime ka Ụbọchị izu-ike Ghara Ịdịnsọ.

Ọtụtụ mgbe n’akụkọ Israel ka ahụtaworo erughị eru ha nke bụ na ha asọpụrụghị Ụbọchị izu-ike. N’Oge nke Amara ọ bụrụwo ihe ana ahụ ọtụtụ mgbe na ụmụ mmadụ na elefuru ọlụ ha nye Onyenweanyị anya n’ụbọchị mbụ nke izu ụbọchị asaa. Ọ bụ ezie na ekwughị nnọọ ahụhụ ọ bụla pụtara ìhè megide ndị ná-adịghị edebe Ụbọchị nke Onyenweanyị, otú ọ dị idebe ya ziriezi; onye na-emebi kwa ya na-enwe amam-ikpé n’akọn’uche na nhuju-anya na ịta-arụ nke ime mmụọ

Ná-agbanyeghị ihe ndị ọzọ na eme maọbụ nke ha ná-adịghị eme, idebe ụbọchị mbụ nke ízù ụbọchị asaa dịka ihe dị nsọ nye Onyenweanyị bụ ihe dị mkpà nye Onye Karist. Mkwà dị iche iche nke ngọzi Chineke enyere ndị Israel ọ bụrụ na ha ga-edebe Ụbọchị izu-ike ka apụkwara inye Onye Karaist taa ọ bụrụ na ọ ga-erubere Chineke isi n’idebe Ụbọchị nke Onyenweanyị.

Gịnị dị n’idebe ụbọchị mbụ nke ízù ụbọchị asaa nsọ nye Chineke? Na mbụ ọ pụtara na anyị ga edebe ụbọchị ahụ nye ihe nke mmụọ site n’ike anyị niile. N’ezie ọ dịghị Onye Kraist na-alụ ọlụ nke ya n’Ụbọchị Onyenweanyị ọ bụrụ na ọ ga ekwe mee ka emee ihe ọzọ. Ọ na-abụ ihe siri ike nke ukwuu ịchọta ihe ngọpụ ga-enye ojuju afọ nke akọn’uche ziri ezi na ọ dị mkpà ịlụ ọlụ nke aka anyị n’Ụbọchị Onyenweanyị. Ma ọbụghị na ọ bụ ihe bịara ná mkpà banyere ihe oriri na ebe nchebe nke mmadụ na anụmanụ, ọtụtụ ọlụ dị iche iche ka apụrụ, ekwesị kwara ịrapụ n’ụbọchị mbụ nke ízù ụbọchị asaa.

Iwu kwuru sị: “N’ilu-ọlu-ubi na n’owuwe-ihe-ubi i gakwusi” (Ọpupu 34:21). Nke a bụ iwu nke Chineke nye Israel ịpụta iche site n’ọlụ nke ụbọchị ha na mgbe ọlụ dịkarịrị n’arọ, wee fèe Chineke òfùfè. Chineke ka dị otù aka ahụ, ọbụná ọ bụ ezie na anyị na-ebi n’oge mepere-anya karị, ọ dịghị ihe ọ bụla kpatara anyị ga-eji chee na Chineke agbanwewo. Ọ bụrụ na O nyere Israel iwu na n’oge ahụ, o kwesịrị ka o doo anyị anya na iwu ahụ ka na-eguzo nye ndị nke Ya, ekwesị kwara irubeisi ma na-eme kwa ya.

Ịdịnsọ Nye Onyenweanyị

Ná nleru-anya ntà, mmadụ niile pụrụ inweta ihe niile dị ha mkpà tupu Ụbọchị Onyenweanyị erue, apụkwara ịlụ ọtụtụ ọlụ dị mkpà rue mgbe ha ga-afọdụ náánị ntakịrị. Anyị adịghị edebe ụbọchị nke a dịka nchepụta nke onye agbata-obi anyị si dị banyere ya, kama anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime ịnọ nime mmụọ, na n’ụdị uche nke na-atọ Chineke utọ. Oge nke ka n’ụbọchị ahụ ka anyị na-anọ n’Ụlọ nke Chineke ifè Ya òfùfè, maọbụ n’ọlụ nke Chineke. Ọtụtụ mgbe, ụfọdụ ụmụ Chineke na-ezukọta n’isi ụtụtụ ikpe ekpere ná nzukọ ekpere ụtụtụ ka Chineke gọzie ụbọchị ahụ nye Onweya, na n’otuto Ya. Nke a bụ nnọọ ụzọ dị mma nke ukwuu iji malite áwà mbụ niile nke ụbọchị mbụ nke ízù ụbọchị asaa, ná-arịọ Onyenweanyị maka ngọzi Ya nye anyị na ndị ọzọ n’ụbọchị niile dị n’iru.

Ọtụtụ ụlọ ọlụ buru ibu na ụlọ-ahịa dị iche iche ka ana emeghe n’obodo niile ugbu a iré ahịa ụbọchị asaa niile nke ízù ka ha wee nweta urù dị ukwuu. Omume ana-ahụ kwa ugbu a bụ na ụlọ ahịa dị iche iche na emeghe n’Ụbọchị Sọnde ma rọpụta otù ụbọchị nime ízù nke ha na-emechi. Ọtụtụ ìgwè mmadụ na-eji ụbọchị ụkọ ugbu a mee ụbọchị igwuriegwú na ịchọ ihe ụtọ dị iche iche nke mere na ụbọchị ụkọ abụrụwo ụbọchị ịzụ-ahịa na irite urù karịsịa ụbọchị niile ọzọ n’ízù nye ọtụtụ ụlọ ahịa dị iche iche. Onye Kraist ekwesịghị ịgbasa maọbụ ịkwagide omume dị otú a site n’ịzụ-ahịa n’Ụbọchị Onyenweanyị. Ụlọ ahịa ndị na-ere ụmụ irighiri ihe ana-eri eri dị iche iche na-ada iwu a karịsịa; ndị na-azụ kwa ha ahịa n’Ụbọchị Onyenweanyị na-enyere ha aka imebi ụbọchị ahụ. Ihe ọ bụla èzínaụlọ ga-achọ n’ọgwụgwụ ízù ka enwere ike ịzụta ụbọchị Satọdee. Onye Kraist ga arapụ inwe ihe ụfọdụ nke ọ na-enweghị kama ịbụ otù onye nime ndị na-emebi Ụbọchị Onyenweanyị maọbụ otù onye nime ndị mkpebi ha bụ “ịchụ ntá ego bụ ihe mbụ -- karịsịa n’Ụbọchị ụkọ.”

Onye Kraist adịghị alụ ọlụ nke aka ya n’Ụbọchị Onyenweanyị, o dịghị eme kwa ha ka ọ bụrụ ụbọchị ịchọ ihe ụtọ nye onweya. Ọ na-achọ ime ihe ga-atọ Onyenwe ya ụtọ, ma ọ na-atọ ya onwe ya ụtọ mgbe niile maọbụ na ọ dịghị atọ ya. Ụfọdụ dị ndị na-eche na ha nwere ike ịga n’akụkụ óké osimiri, maọbụ ebe izu-ike, maọbụ ilegharị anya, maọbụ izu-ike ọzọ ha chepụtara n’Ụbọchị Onyenweanyị ná-ejighị ikpere Chineke kpọrọ ihe. Nke a bụ imebi Ụbọchị Onyenweanyị! Otù nime ihe Chineke nwere megide ọgbọ nke ụbọchị ikpe-azụ a bụ na ha bụ “ndi nāhu ihe-utọ n’anya kama ihu Chineke n’anya” (II Timọti 3:4). Onyenweanyị adịghị elefu ihe niile dị otú a anya. Ọchịchọ kwesịrị-ekwesị nke nwa Chineke ga-enwe bụ ịnọ n’Ụlọ Chineke n’Ụbọchị Onyenweanyị, inwe ọñụ na isoro kpeere Chineke. Ihe bụ ọñụ ya karịsịa, na ndụ ya niile bụ òfùfè nke Chineke. Ndị ahụ na-achọ ihe ha chere bụ ihe-ụtọ dị iche iche n’Ụbọchị Onyenweanyị, ná-enweghị nsọpụrụ nye òfùfè nke Chineke atụfuworị ọñụ nke nzọpụta site n’obi ha maọbụ na ọ dịghị oge ha nwere ya ma ọlị

Ịga njèm n’Ụbọchị Onyenweanyị ekwesịghị ekwesị ma ọbụghị náánị n’ezigbo ihe mberede. Ịkpachapụ anya rapụ òfùfè na Ụlọ Chineke ijé njèm bụ nnọọ ezigbo ịda iwu. Ihe dị otú ahụ apụghị ịtọ Chineke ụtọ. Mgbe ụfọdụ ihe mgbu nwere ike ịdapụtara mmadụ ma arapụ ịga njèm tupu agbasaa òfùfè nrò nke ụbọchị ụkọ; ma agaghị njèm ahụ n’oge maọbu ihe mgbu nke ọ na-eweta kwesịrị ka ejirị obi ụto nara ya dịka ọlụ afọ ofufo na nsọpụrụ nye Chineke. Anyị ga-agbalịsi ike ịnọ n’ebe anyị ga-eketa òkè n’òfùfè n’Ụbọchị ụkọ. Anyị kwesịrị ịnọgide n’ebe anyị nọ n’Ụbọchị Onyenweanyị ghara ijégharị njèm náánị iji mejupụta ọchịchọ anyị ịnọ n’ebe ọzọ n’oge abalị maọbụ n’ụtụtụ. Mkpuchi nke Chineke dị anyị mkpà n’okporo ụzọ jupụtara ná ndị na-achọ ihe-ụtọ n’Ụbọchị ụkọ. Ijé njèm náánị n’ihi na obi anyị chọrọ ya, ná-enweghị ihe ndapụta dị mkpà ga-abụ ihe dị ka inwe anya ike n’ebe ebere Chineke dị.

Onye Kraist anọghị n’agbụ aka ike idebe Ụbọchị Onyenweanyị, ụbọchị mbụ n’ízù ụbọchị asaa, nke edoworo nsọ nye Onyenweanyị; kama ọ na-eme nke a dịka ihe ngosi nke ịhụn’anya ya n’ebe Chineke nọ na ọlụ ya nke pụtara ìhè o kwesịrị ịlụrụ Chineke. Onye Kraist na-achọ ka ọ bịarue Onyenweanyị nso karịa site n’òfùfè nrò, idebe ụbọchị mbụ n’ízù ụbọchị asaa nsọ nye Chineke bụ ọñụ ya kachasị

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee ụbọchị bụ Ụbọchị izu-ike na mbụ? òlee ndị debere ya?
  2. Gịnị ka okwu a bụ ụbọchị izu-ike pụtara?
  3. Gịnị mere ndị Israel ji edebe Ụbọchị izu-ike?
  4. Gịnị mere idebe Ụbọchị izu-ike ná mmalite ji bụrụ ihe Ụmụ Israel ga-eme ná nrọrọ nke onwe ha?
  5. Òlee mgbe ewepụrụ Ụbọchị izu-ike Ndị Ju?
  6. Òlee otú anyị si mata na Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ doo ụbọchị mbụ n’ízù ụbọchị asaa nsọ nye Ya n’ụbọchị ndịa
  7. Òlee ụzọ kwesịrị iji debe Ụbọchị Onyenweanyị?