Levitikọs 6:2-5; Ọnu-ọgugu 5:6-8; Ezikiel 33:14-16; Matiu 5:23, 24; Luk 19:8, 9

Lesson 269 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Nmehie madu ufọdu nāputa ìhè, n’ihi na ha buru ha uzọ nāga ikpé; ma nmehie madu ufọdu nēso kwa ha n’azu”(I Timọti 5:24).
Cross References

I N’oge nke Iwu

1. Onye ahụ nke mehiere onyea gbataobi ya, mehie kwara megide Chineke, Levitikọs 6:2, 3; Ọnu-ọgugu 5:6.

2. Nchègharị n’ebe Chineke nọ jikọtara inyeghachị mmadụ ihe niile enwetara n’ụzọ na-ezighị-ezi tinye n’otù n’ụzọ n’ụzọ iri ise n’elu ya, Levitikọs 6:4, 5; Ọnu-ọgugu 5:7.

3. Ọ bụrụ na enweghị ike ịkwụghachị onye ahụ nke anapụrụ ihe n’ike maọbụ onye ézìnaụlọ ya, aga-akwụghachị ya Chineke, Ọnu-ọgugu 5:8.

II N’oge Ndị Amụma

1. Mmehie na ajọomume naeweta ọnwụ nye mkpụrụobi; ma ichigharị site ná mmehie, na idoziụzọ na ijé ijè nánleruanya naenweghị mmehie, na ewetara mkpụrụobi ndụ ebighịebi, Ezikiel 33:14-16

III N’oge nke Àmàrà

1. Jisọs gosịrị nkeọma na ndị niile na-achọ ka ha na Chineke dị n’udo, aghaghị ime ka ha na ụmụnne ha dị n’udo otù aka ahụ, Matiu 5:23, 24.

2. Nchègharị nke Zakiọs ná-egosipụta na ọ bụ ihe apụrụ ime bú ịgụ mmadụ n’onye eziomume n’ebe Chineke nọ tupu o dozie ụzọ ya, ma ọ bụrụ na o kwe Chineke mkwà n’ikwesị ntụkwasịobi na ya ga-edozi ụzọ ya niile, Luk 19:8, 9.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ezi nkọwa nke okwu a bụ idoziụzọ bụ inyeghachị ihe; inyeghachị onye nwe ihe ahụ ihe ya kpọmkwem; omume nke inyeghachị ihe ra ka ihe ahụ furu-efu maọbụ nke emebiri. N’akụkụ niile Baịbụl anyị na ahụ na eziokwu ahụ nke idozi ụzọ ka ejikọtara ya na omume nke onye mmehie nke ná-arapụ ụzọ ọjọọ ya niile ifè ezi Chineke nke dị ndụ òfùfè. Ọtụtụ mgbe, mgbe otù mmadụ mehiere megide Chineke ndị ọzọ na-ahụ ahụhụ n’ihi mmehie ahụ. Okwu a bụ eziokwu ma atụgharịa ya. Mgbe mmadụ mehiere megide onye agbata-obi ya o mehie kwara megide Chineke n’otù omume ahụ n’ihi na emebiwo otù nime iwu nke Chineke. Chineke na-esite n’obi Ya gbaghara mmehie niile emere megide Ya mgbe echègharịrị site na ha; ma Ọ chọrọ ka mmadụ dozie ụzọ ya n’ebe onye o mejọrọ nọ maọbụ onye o mehiere site ná mmehie ya.

•kpụrụ nke Chineke

Otù nime ụkpụrụ nke dị n’Iwu ahụ enyere na Sainai bụ iwu nke nnyeghachị maọbụ idozi ụzọ. Idozi ụzọ nke ihe ewere n'ụzọ n’ezighị-ezi maọbụ nke ezuru n’ori ka aga eweghachị n’ụbọchị ana-eweta àjà nke ikpe ọmụma n’iru Chineke. Iwu ahụ mere ka o doo anya na-aga enyeghachị ihe ọ bụla nke enwetara site n’aghụghọ, ikwu okwu ụgha, maọbụ site n’omume aghụghọ n’ụzọ ọ bụla na-atụkwasị ya otù ụzọ n’ụzọ iri ise nke ọnụ-ahịa ya.

N’ebe mmadụ mejọrọ onye agbataobi ya site n’ịnara ya ihe, eleghị anya onye agbataobi ya ahụ nwere ike ghara ịma na ezuru ihe ahụ, maọbụ, asị na ọ matara, eleghị anya ọ dịghi onye aka ebe o nwere nke ga-anọnyere ya iweta onye ahụ mere ihe ọjọọ n’ikpé N’ọnọdụ dị otú a ebubo nke onye ahụ ezuru ihe ya n’ori agaghị kwa adị ìrè site n’agụgọ nke onye ahụ ikpé mara ebe ọ bụ na achọrọ ndị àmà abụọ maọbụ karịa tupu ámá mmadụ ikpé n’ụlọ ikpé nke ndị Israel. Ma nke a abụghị eziokwu n’ụlọ ikpé ziri-ezi nke Chineke. Chineke maara obi mmadụ niile, marakwa mmehie niile emehiere; ya mere, mmadụ ahụ nke naeweta àjà ikpé ọmụma ya, nke na-arịọ mgbaghara zuruòkè maka mmehie ya, Onyenweanyị agaghị anabata onye ahụ rue mgbe o doziri ụzọ ya maka ihe ọjọọ niile o mere megide onye agbataobi ya.

Iwu niile nke ibi ndụ nke eziomume ka dị kwa elu otú ahụ -- maọbụ karịa -- n’okpuru Oge Amara dịka ha dị n’okpuru Iwu. Idozi ụzọ dị kwa mkpà n’Oziọma dịka nchègharị. Mgbe azọpụtara mmadụ, ọ ga-ekwupụta wee nyeghachị kwa ma ọ bụrụ na o zuru ihe ọ bụla n’ori; ọ gachọ mgbaghara maka okwu ugha, akụkọ ụgha niile, nkwutọ niile ná-ezighi-ezi, maọbụ ihe ọ bụla emere mejọọ ndịọzọ n’okwu ọnụ maọbụ n’omume. Chineke ga-achọ ka mmadụ ọ bụla mee ihe ndịa niile, ma ọ ga-enye ike n’amara achọrọ iji mee ihe ndịa niile. Mmadụ ọ bụla nke nwere ezi nwute maka mmehie ya ga-achọ nnapụta n’ọnụ ahịa ọ bụla, ọ gaghị echè na idozi ụzọ bụ ihe siriike. Ọ ga-eji obiụto mee ihe ọ bụla dị mkpà iji nwere onwe ya site n’ibu-arọ nke mmehie. Ọ bụ ihe ná-abaghị úrù ikwu banyere ịhụ Onyenweanyị n’anya site n’obi ya niile, mkpụrụobi ya niile, n’uche niile na ike ya niile, ma ọ bụghị ma ịhụn’anya ahụ emewo ka ndụ ochie ahụ gabiga wee mee kwa ka edozi ụzọ banyere iheọjọọ niile emere n’oge gara aga.

Ụzọ nke Ra Nrata

Okwu Chineke ákà-agbanweghị rue ugbụ a ná-agbanyeghị ibu-agha niile nke mmadụ na nke ndị mmụọ ọjọọ. Ụmụ Israel nwara ịgbánwe nkọwa nke okwu ahụ n’ụzọ ọ ga-adị ndụ mmehie ha na ọchịchọ niile nke obi ha mma, ma ezi ndị amụma Chineke guzoro dịka ndị nché ịdọ ha akanántị na Chineke ka dị kwa ka Ọ dịrịị. Ọ na eguzosi kwa ike n’ihe ahụ O kwuru. Ụmụ Israel, ndị adọọrọ n’agha jee Babilon n’ihi mmehie ha na ikpere arụsị, ji nwute gwa Ezikiel Onye-amụma na ụzọ niile nke Chineke araghị nrata, ma iji ezi nleru-anya mụọọ ihe edere n’Akwụkwọ Nke Chineke ga-egosi mmeso niile ra nrata nke Chineke, bụ nke ná-enweghị ịta ụta, n’ebe ụmụ mmadụ nke ọgbọ niile nọ.

Chineke gosipụtara àtùmàtù Ya nke ra nrata nye Ezikiel otú a: “Mu onwem nādi ndù, (ọ bu ihe si n’ọnụ Onye-nwe-ayi JEHOVA puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adigh-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātom utọ mgbe onye nēmebi iwu si n’uzọ-ya chigharia, we di ndu (Ezikiel 33:11). Chineke kwuru sị na eziomume nke onye eziomume agaghị anapụta ya n’ụbọchị njehie ya, na ọ pụghị kwa ịdị ndụ n’ihi eziomume ya n’ụbọchị o mehiere. Ọtụtụ mmadụ na-echè na eziomume nke aka ha ka aga-etinye n’otù akụkụ nke ihe ọtụtụ nke Chineke, ka ewee tụọ ha n’ọlụ ajọomume ha nke aga-edebe n’akụkụ ọzọ nke ihe ọtụtụ ahụ. Nke ọ bụla karịrị ibe ya -- ọlụ eziomume maọbụ nke ajọomume -- ka ha na-echè na ọ bụ ya ga-ekpebi ebe mkpụrụobi ha ga-anọ ebighị-ebi; ma ọ dịghị ebe ọ bụla Akwụkwọnsọ kwagidere échìchè dị otú a. Okwu ahụ ná-ekwu sị, “Onye ọ bula nke gēdebe iwu ahu dum, ma ọ su ngọngọ n’otù ihe, emewo ya ka ọ buru onye ikpé iwu ahu nile mara” (Jemes 2:10).

N’aka nke ọzọ, Chineke ebighị-ebi ahụ, Onye ụzọ Ya niile ra nrata, enyewo iwu na onye ajọomume agaghị anwụ n’ihi ajọomume ya n’ụbọchị o si n’ajọomume ya chigharịa mee ihe ekpere n’ikpe na eziomume n’iru Chineke. Otú ọ dị, iji gosipụta ikwesị ekwesị nke nchègharị ya, onye ajọomume ahụ na mbụ ka achọrọ na ọ ga-enyeghachị ihe ibe, “nyeghachị kwa ihe ọ pụnara mmadụ n’ike, jegharịa n’ụkpụrụ niile nke ndu, ghara ime ajọ omume” (Ezikiel 33:15). Ọ dị atụmàtụ ọ bụla pụrụ ịra nrata karị nke a. Obi nke na-ekwu eziokwu na-aza sị na ụzọ niile nke Chineke ra nrata -- nrata nke ná-enweghị ịta ụta!

Ezi Nchègharị

N’ụbọchị ndị ahụ mgbe Jọn Onye ọwụmmiri na etimkpu n’ọzara, ná ekwusa ozi banyere njikere maka ọbịbịa nke Mesaia ahụ, eziokwu nke Chineke na-anụ ọkụ n’obi ụmụ mmadụ. Ozi ahụ dị mfé, ma mmetụta ya dị arọ: “chègharianu; n’ihi na ala-eze elu-igwe di nso” (Matiu 3:2). Ìgwè mmadụ jere ịnụ ozi ahụ dị ebube nke Jọn na ezisa, ka ha wee mee ùkpụrụ niile nke eziomume bụ nke ọ na ekwusa. Ndị Farisii ahụ bụ ndị nwere eziomume nke onweha, ndị na-ekwupụta kwa okpukpé nke onwe ha n’oge ahụ bịakwara ịnụ ozi ahụ; ma Jọn matara mmehie nke dị n’obi ha o wee kpọọ òkù nke iché ákámgbá sị: “Mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu” (Matiu 3:8). Ezi nchègharị na enwe mkpụrụ eji mara ya mgbe niile, ma emezuru ya nime ndụ onye nwere omume ọma maọbụ ná ndụ nke onye mmehie jọgburu onwe ya.

Nzọpụta nke Zakiọs, ọgaranya ahụ nke bụ kwa onye ọna ụtụ, bụ ihe ịma atụ nke ezi nchègharị. Na mbụ ọ bụ onye mmehie amaara nkeọma, nke egosopụtara mgbe ndị gbara Jisọs gburugburu támuru ntamù na Ọ gara ịnọ ọnọdụ abalị n’ụlọ onye mmehie; ma Zakiọs abụghị kwa onye mmehie ọzọ. Zakiọs chọrọ ịhụ Jisọs, ma ọ chọghị kwa n’efu. Ndị niile ná-achọ Jisọs n’eziokwu aghaghị ịchọta Ya. Zakiọs ezobewo onwe ya n’elu osisi sycomore, ma n’otù ebe n’etiti elu osisi ahụ na ala ka ọ natara nzọpụta nke Chineke. Jisọs gwara ìgwè mmadụ ahụ na “Nwa nke madụ biara ichọ na izọpụta ihe nke furu efu” (Luk 19:10).

Gịnị bụ ihe àmà nime mkpụrụ nke nzọpụta Zakiọs? O jiri ọñụ nabata Onyenweanyị nime mkpụrụobi ya na kwa n’ụlọ ya -- bụ náánị otù ụzọ ziri ezi apụrụ iji nabata Onyenweanyị. Ọ chọghị ihe ọ bụla iguzo n’etiti ya onwe ya na nzọpụta ya -- ọbụná àkụ ya. “Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m’nwere ka m’gēnye ndi-ogbenye; ọ bụrụ kwa na anaram onye ọ bula ihe site n’ebubo ugha, m’gēnyeghachi anọ anọ” (Luk 19:8). Onye ọna ụtụ Ju ahụ nke dị mkpụmkpụ, nke di kwa aghụghọ, jiri obi ya niile nyeghachị ihe niile o ji aghụghọ nara okpukpu anọ. Nzọpụta Chineke na-eme ka mmadụ nwee ọchịchọ iweghachị ihe onwunwe niile bụ nke ndị ọzọ.

Ime Udo

Ịkpọ-asị na obi ọjọọ bụ mmehie nke ná ekwesighị ịdị n’obi onye nke Kraist. Ịhụn’anya bụ ihe ná-egosi okwukwe nke ezi Onye Kraist, ma okwukwe dị otú a apụghị inwe ọnọdụ ya n’obi nke ná-enweghị ịhụn’anya maọbụ nke na-abọ ọbọ. Jisọs kwuru okwu doro anya maka nke a: “Ọ bụrụ na i nēché onyinye-gi n’iru Chineke n’ebe ichu-àjà, i we cheta n’ebe ahu na nwa-nne-gi nwere ihe megide gi, rapu onyinye-gi n’iru ebe-ichu-àjà, Laba, buru uzọ me ka gi na nwa-nne-gi di n’udo, mgbe ahu bia kwa che onyinye gi” (Matiu 5:23, 24). Ọ dị mkpà ịkwụsị òfùfè anyị nye Chineke wee buru ụzọ mee ka anyị na nwanna anyị dị n’udo karị ịnwa ifè Ya òfùfè mgbe amam-ikpé dị n’obi.

Ịgbá-àmà Ana-apụghị Ịgọnarị

Urù ọzọ nke dị ukwuu n’àtụmàtụ nke Chineke banyere idozi ụzọ bụ na ana-arapụ ihe ịgbá-àmà nke ana-apụghị ịgọnarị nye onye ahụ nke ewèghachiri ihe ya, ọtụtụ mgbe ndị ịgbá-àmà a na-erutekarị na-abụ ndị, ma eleghị anya, ha agaghị enweworị ike ịnụ akụkọ nke Oziọma ahụ. Ọtụtụ mgbe ndị nọ n’ọnọdụ dị elu nke ụwa amaghị ihe niile nke ịbụ Onye Kraist pụtara; ma mgbe ekwupụtara ma weghachị kwa ihe niile enwetara n’ụzọ ná-ezighị-ezi, ha na-amata na Chineke agbanwewo obi na ndụ mmadụ dị otú a. Okpukpé ọ bụla nke ná-akpali mmadụ ịkwụ ụgwọ niile ziri ezi nke o ji, iweghachị ihe niile ezuru n’ori, ikwupụta okwu ụgha niile, gbaa kwa iheọjọọ niile ya ọtọ kwesịrị ka ndị ụwa nwee ntụkwasị obi na ya.

Ụlọ Ikpé Ziri ezi nke Elu-igwe

Idozi ụzọ jikọtara ime eziomume ọ bụla nke anyi jiworo mejọọ ndịọzọ. Nke a jikọtakwara ihe ọjọọ emere megide ụlọ ọlụ dị iche iche, maọbụ òtù ọlụ dị iche iche, maọbụ imebi iwu dị iche iche nke obodo. Eleghị-anya onye ahụ emejọrọ amataghị na emejọrọ ya, ma nke a egbochighị onye ahụ mere ihe ọjọọ ahụ idozi ụzọ ya. Adịghị agbaso iwu obodo n’ihe banyere idozi ụzọ. N’ihe ịmà àtụ, iwu dị iche iche nke obodo na-enye oge maka ịkwụ ụgwọ ụfọdụ na ọlụ dị iche iche nke mmadụ kwesịrị ịlụ, nke bụ na ọ bụrụ na oge ahụ agafee iwu emegideghị kwa ha; ma n’ebe Chineke nọ ọ dịghị iji ụgwọ ọ bụla nke iwu ná-emegideghị. Oge apụghị ihichapụ ihe ziri-ezi mmadụ kwesịrị ime. Iwu nke ọtụtụ mba nyere ohere ihichapụ ụgwọ niile nke mmadụ ji nke ọ na-enweghị ike ịkwụ; ma n’Ụlọ ikpé ziri-ezi nke Elu-igwe adịghị anabata arịrịọ ọ bụla banyere ihichapụ ụgwọ nke mmadụ ná-enweghị ike ịkwụ. Ọ ka mma imezu ihe ndị a dị mkpà ná ndụ a ebe apụrụ inata ebere maka ikpé ziri-ezi, karịa ichere rue mgbe aga-eweta okwu ahụ n’iru Onye ikpé nke ụwa niile Onye gaje ikpe ikpé ziri-ezi ná-enweghị obi ebere.

Idozi ụzọ nke pụrụ itinye ndị ọzọ ná nsogbu, maọbụ nke ga-ewetara ndị ọzọ ihe ihere maọbụ imerụ ha arụ, bụ nsobgu dị ukwuu. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọjọọ metụtara iwu nke obodo, ihe dịrị onye ahụ nke chègharịrị bụ náánị ikwupụta akụkụ ihe ọjọọ ahụ emere nke metụtara onwe ya. Nke ahụ bụ ihe Chineke chọrọ n’aka ya. Ma n’ihe ụfọdụ ọ ga-abụ ihe siriike nye ya onwe ya idozi náánị akụkụ ahụ nke metụtara ya. Ọ ga-ewe ikpesi ekpere ike na ichere Chineke ka o wee mata ihe Chineke ga-achọ ka o mee n’ihe ndịa. Ọ bara urù ka ya na ụkọ Chukwu tozuru òkè n’Oziọma kparịta ụkà n’okwu ndị a maka ndụmọdụ na ikpere ya ekpere. Ọtụtụ mgbe onyeozi nke Chineke, site ná nnwapụta ya n’ụdị okwu a nke mere n’oge gara aga, pụrụ inye ndụmọdụ ná-enweghị àtụ nye onye ahụ nke na edozi ụzọ ya.

Ihe Achọrọ n’Aka Mmadụ Tupu Azọpụta Ya

Idozi ụzọ bụ ihe ana-achọ n’aka mmadụ n’oge nzọpụta, n’ihi na Chineke agaghị agbaghara mmehie onye ọ bụla rue mgbe mmadụ ahụ jikeere, dịka ọ dị n’ike aka ya, imezi iheọjọọ niile o meworo megide ndịọzọ. Chineke na-emeghe obi nke onye mmehie ahụ, wee gosi ya mmehie niile o meworo nime ndụ ya n’oge gara-aga. N’oge ụfọdụ ọ na-ewe ọtụtụ arọ idozi ụzọ niile nke Chineke gosiri mmadụ na nwa oge ntà, ma Chineke agaghị arapụ inye onye ahụ nzọpụta nime arọ ndị ahụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe Chineke mkwà n’ikwesị ntụkwasịobi na ọ ga edozi ụzọ ya niile. Zakiọs natara nzọpụta tupu o dozie otù nime ihe niile o mebiri, ma ọ matara na aghaghị idozi ha o kwe kwara mkwà idozi ha. Dịka o debere okwu ọnụ ya, n’otù aka ahụ o debe kwara nzọpụta ya. Zakiọs kpebiri n’onwe ya ịkwụghachị òkpùkpù anọ, ma ọ dịghị ebe ọ bụla ekwuru n’Akwụkwọnsọ na Jisọs chọrọ ka ọ kwụghachị òkpùkpù anọ, maọbụ ichépụtara ya ọnụ ego ra otú ahụ. Chineke agọziwo ọtụtụ mmadụ n’ụba n’oge Oziọma a bụ ndị nyeghachiri ihe nke ha nwetara n’ụzọ ná-ezịghị-ezi dịka ọnụ-ọgụgụ nke ihe ahụ sị dị -- otù Naịra n’ọnọdụ ihe emebiri nke ọnụ-ahịa ya bụ otù Naịra.

Ọñụ ná-adị mgbe mmadụ doziri ụzọ ya. Udo nke Chineke na asụgharị n’obi mgbe ọ bụla mmadụ meziri ihe niile o mebiri. Ọtụtụ ndị nke Kraist agbawo àmà na ha nwere ọñụ dị ukwuu mgbe ha doziri ihe ikpe-azụ nke ha mebiri na ọ dị kwa ha ka aga-asị na ọ dị ihe ọzọ fọdụrụ nke ha ga-edozi ka ha wee nwee ọñụ ahụ kachasị ukwuu ọzọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Àjà ikpé ọmuma, ò si añaa bata n’ihe banyere idozi ụzọ n’oge iwu?
  2. Gịnị bụ ọnụ-ahịa onye mejọrọ na-anata n’oge iwu?
  3. Ònye na-anara ihe nweghachị ahụ ma ọ bụrụ na onye nke emejọrọ maọbụ ndị ézìnaụlọ ya anwụwo?
  4. Kwue ihe Chineke kpugheere Ezikiel banyere idozi ụzọ?
  5. Òlee otú Jisọs si were mkwupụta nke mmehie na idozi ụzọ?
  6. Gịnị bụ échìchè Zakiọs maka idozi ụzọ mgbe azọpụtasịrị ya?
  7. Chineke, Ọ naazọpụta mmadụ ọ bụla nke na ekwenyeghị idoziụzọ ya?
  8. Òlee ezi ihe dị ukwuu nke idozi ụzọ nke Onye Kraist na-alụpụta nye ndị ụwa?
  9. Gịnị bụ ezi ihe dị ukwuu nke Onye Kraist na-enweta site na ya?