Deuteronomi 4:9, 10; 6:3-15; Joshua 24:15; Job 1:1-5; Abù Ọma 78:1-8; Matiu 14:19; 15:36; I Timọti 5:4

Lesson 270 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ndi nātu egwù JEHOVA nēkwurita okwu, otù onye na ibe-ya: JEHOVA we ña nti, nu, ewe dere ndi nātu egwù JEHOVA, ndi nēchè kwa échìchè aha-Ya, akwukwọ ncheta n’iru-Ya” (Malakai 3:16).
Cross References

I Ihe Ebu n’Uche

1. O kwesịrị iji òfùfè nke èzìnaụlọ kụọ n’obi ụmụntakịrị akụkọ nke Okwu Chineke na óké ọlụ Ya niile, Deuteronomi 4:9, 10; Abù Ọma 78:1-8

2. Aghaghị isite n’òfùfè èzìnaụlọ kuziere mmadụ ihe bụ ọlụ ya, n’ebe Chineke nọ, Deuteronom 6:3-5

3. Jehova bụ Chineke ekworo, Ọ gaghị enye kwa onye ọzọ otuto Ya, Deuteronomi 6:10-15

II Ebe Ọ ga-na-adị: N’ụlọ

1. Nwata ga-ebu ụzọ mụta nsọpụrụ Chineke site n’ụlọ, I Timọti 5:4; Ilu 31:1; Aisaia 38:19; Ndi Efesọs 6:4; Ndi Kọlọsi 3:21

2. Ezi nkụzi banyere Chineke n’ụlọ ga-abụ ihe mkwagide siri ike iji mee ka enwee nsọpụrụ Chineke, Ilu 22:6; Deuteronomi 31:13; I Ndi Eze 2:1-4

3. Ụlọ na-aghọ ebe obibi nke Chineke site n’ezi òfùfè nke èzìnaụlọ, Luk 10:38-42; Matiu 18:20

III Oge Ọ ga-abụ: Ụbọchị niile

1. Agwara ụmụ Israel ka ha were ohere ọ bụla ha nwere kuziere ụmụ ha niile, Deuteronomi 6:7

2. Enwere ike tọ ntọ-ala nsọpụrụ Chineke n’obi ụmụntakịrị, Aisaia 28:9, 10; Mak 10:14; Jọn 21:15; Ọlu Ndi-ozi 2:39

3. Ndị dike niile nke Chineke hụrụ na ifè Ya mgbe niile bụ ihe dị mkpà, Joshua 1:8; Job 1:15; Abù Ọma 55:17; Daniel 6:10; Ọlu Ndi-ozi 2:46, 47; 6:4; 12:12

IV Usoro

1. O kwesịrị ka Okwu Chineke bụrụ ihe dịkarịsịrị mkpà n’òfùfè nke èzìnaụlọ, Deuteronomi 6:8, 9

2. Ọ bụrụ na aga-enweta ihe ahụ ana-achọ nime òfùfè nke èzìnaụlọ, onye ahụ na-edebe ya aghaghị ịbụ onye na ebi ndụ dị ọcha bụrụ kwa onye na-ebi ndụ aga-na-eñomi, Joshua 24:15

3. Chineke na-enye Okwu ahụ; maọbụ ọlụ dịrị ndị Ya iji ikwesị ntụkwasị obi na-ekwusa ya, Matiu 14:19; 15:36.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Urù dị Iche Iche

“Ònye bụ Chineke?” “Òlee ebe O bi?” “Gịnị ka O yiri?” “Ò nwere mmasị n’ebe m’nọ?” Ọtụtụ ajụjụ dị icheiche ziri-ezi banyere Chineke, ịdị adị Ya, na mmekọrịta nke Ya na mmadụ na ejupụta n’obi nwatakịrị ọ bụla. Ọ dị ihe dị na ndụ nwatakịrị ọ bụla n’okìkè nke na-eme ka o nye onwe ya n’òfùfè nke Chineke, ma nwatakịrị nke nwere ihe nketa nke èzínaụlọ Ndị Kraist ebe ana ezi kwa ihe banyere Kraist ga-enwe obi ụtọ. Mgbe arapụrụ nwata ka ọ zaa ajụjụ niile na-abata n’obi ya n’onwe ya, Setan ga-anọ nso inye ya ọtụtụ ọzịzá na nkọwa gbagọrọ agbagọ nke ga-eme ka ọ ghara ịbịaru n’ezi mmazu nke eziokwu ahụ. N’ihi nke a òfùfè nke èzìnaụlọ abụworị nnukwu inye-aka n’agha ahụ nke ezi ihe na-alụ megide ajọ ihe n’ọgbọ niile, ọ ghaghị ịdịgide otú a rue mgbe Jisọs ga-abịaghachị ọzọ n’ụwa nke a.

Site ná mmalite akụkọ ụwa rue n’oge a, ọgbọ niile ndị na-esote anwapụtawo na amụbatara mmadụ niile n’ụwa n’ụdị nke mmehie. Ọchịchọ niile nke mmadụ bụ iwezuga onwe ya n’ebe Chineke nọ, ọ bụghị iso Ya. Náánị rue mgbe agbanwere ụdị ahụ, mmadụ apụghị ịmalite ịdị ndụ dịka ọchịchọ niile nke Chineke si dị. Chineke arọpụtawo ụzọ aga-esi gbapụta mkpụrụobi nke mmadụ bibie kwa ụdị mmehie nke ya. “Chineke huru uwa n’anya otú a, na O nyere ọbụná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ịla n’iyi, kama ka o nwe ndu ebigh-ebi (Jọn 3:16)l

Ụmụ mmadụ ekwesịghị ịnata onyinye a dị óké ebube nke Chineke, ha adịghị kwa enweta nzọpụta ma ọ bụrụ na ha achọsịghị ya ike. Mmadụ nwere ike nke ifè ezi Chineke dị ndụ òfùfè site n’ọmúmú, ma tupu o fèè Chineke aga-akụziri ya ụzọ ọ ga-esi chọta Chineke. Ngwa ngwa ọzịzá batasịrị na ndụ mmadụ, mgbe ahụ ka ọ ga-adịrị onye ahụ mfé inweta mgbapụta nke mkpụrụobi ya. Baịbụl na-ekwu: “Zulite nwata dika ụzọ-ya si di, ọbuná mgbe o mere okenye ọ gagh esi nime ya wezuga onwe-ya” (Ilu 22:6).

Ọlụ Nke Dịrị Nne na Nna

Iwu nke Moses mesiri ya ike nye nne na nna na ha aghaghị ikụziri ụmụ ha ọlụ ebube niile nke Chineke na Iwu Ya niile nke O nyere ịchị ndụ ha. Chineke egosighị Onweya n’Ugwu Sainai náánị maka ọdị mma nke ndị orù ahụ agbapụtara ọhuụ site n’Ijipt, kama ọ bụ kwa n’ihi ọgbọ niile nke Israel ndị na-abịa n’ọdịn’iru. Ọgbụgba-ndụ nke Sainai dịrị nwa Abraham ọ bụla, site n’oge nke Moses wee rue n’oge nke Kraist. Ụmụ Israel nwere óké ọñụ na akụnaụba, ma n’ihe ana-ahụ anya, mgbe ha na-edebe iwu niile nke Chineke. Mgbe ndị bụ nna na-eso Chineke n’ikwesị ntụkwasị obi ná-akụzi kwara ụmụ ha ihe niile Chineke chọrọ n’aka ha, ọ bụrụ kwa na ndị bụ ụmụ n’akụkụ nke ha akpachapụ anya n’iso ndụmọdụ nke ndị bụ nna ha wee fèè Chineke òfùfè n’ikwesị ntụkwasị obi, mgbe ahụ ka ngọzi Chineke na-eso ha site n’otù ọgbọ rue ọgbọ ọzọ. Ihe a abụworị àtụmàtụ Chineke site na mgbe ochie. Ọ bụ náánị mgbe ndị bụ nna ná-alụghị ọlụ ha n’izi ụmụ ha ụzọ nke Chineke maọbụ mgbe ndị bụ ụmụ na ejègharịghị nime ndụmọdụ ha natara banyere nsọpụrụ Chineke ka ana egbochi ngọzi ahụ.

Òfùfè nke èzìnaụlọ bụ otù nime ụzọ kachasị mma iji kuziere ụmụntakịrị amam-ihe nke Chineke, na ịzá ajụjụ niile dị mkpà nke na-abatakarị n’obi ụmụntakịrị. Chineke hụrụ mkpà ọlụ a nke ịkụziri ụmụntakịrị ihe dị nke mere na O nyere ụmụ Israel iwu ka ha na-ekwu ihe banyere ụzọ niile na Okwu niile nke Chineke “mgbe i nānọdu n’ulo-gi, na mgbe i nēje ijè n’ụzọ, na mgbe i nēdina ala, na mgbe i nēbili ọtọ” (Deuteronomi 6:7). N’ụzọ ọzọ, ha aghaghị ikuziri ụmụntakịrị ahụ ihe n’ohere ọ bụla ha nwere.

Mmasị nke Chineke Nwere

Ọ bụ akụkọ otuto nke dị kwa ebube banyere ebere na ịhụn’anya nke Chineke na ha kwesịrị ịkụzi, akụkọ banyere óké mgbapụta niile na nlekọta nke Ya. Chineke nke Israel bụ Onye na anọ nso mgbe niile, Onye ana-enwe mmetụta nke Mmụọ Ya na Onye apụrụ ịnụ kwa olu Ya. Gịnị mere ndị bụ nna na-agaghị akụziri ụmụ ha ihe banyere Onye dị otú a bụ Onye ihe banyere ọdị mma ha na-emetụ n’ọbi n’ụzọ ana-apụghị ịgọnarị? Chineke chètaara Israel eziokwu a site n’ikwu sị: “Òle mba uku di nke nwere Chi di ya nso dika JEHOVA, bú Chineke-ayi, si di n’ihe nile ayi kpọkuworo Ya? … Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa mkpuru-obi-gi nke ọma ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n’obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi: kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha” (Deuteronomi 4:7, 9).

Onye nke Kraist nwere ike iji okwu ndụmọdụ a niile nke sitere n’iwu ahụ mee ezi ihe. Ndị leziri anya inye ụmụ ha ezi òzìzí niile banyere ịtụ egwù na ịhụn’anya Chineke, site n’obi jupụtara n’àkụ amam-ihe nke anwapụtara anwapụta, ga-enweta ngọzi nke Chineke ná ndụ ha; ma nne na nna ọ bụla nke na-alụghị ọlụ a dị mkpà ga-eketa iwe na ikpé Chineke n’ọgwụgwụ nke ndụ. Chineke gwara Ezikiel sị, “Ma onye-nche ahu, mgbe ọ gāhu nma-agha ahu ka ọ nābia, ma ọ fugh opi-ike, ewe ghara idọ ndi-ya aka ná nti; mma-agha ahu abia, wepu madu ọ bula n’etiti ha; onye ahu, n’ihi ajọ-omume-ya ka ewepuworo ya, ma n’aka onye-nche ahu ka M’gājuta ọbara-ya” (Ezikiel 33:6). N’ezie Chineke enyewo ndị nne na nna ọlụ ndị nche na ndị nlekọta nke èzínaụlọ.

Ezigbo Ọzụzụ

Ụwa nke a ga-abụworị ebe na enye ọñụ karịa ịbụ ebe obibi ma ọ bụrụ na Chineke ga-enwe ntụkwasị-obi n’èzínaụlọ Onye Kraist ọ bụla dịka O nwere n’ebe èzínaụlọ Abraham dị! Gịnị ka Chineke kwuru banyere Abraham? “Amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ JEHOVA, ime ezi omume na ihe ekpere n’ikpe; ka JEHOVA we weta n’isi Abraham ihe O kwuru banyere ya” (Jenesis 18:19). Ezigbo ọzụzụ sitere n’ihe niile edere n’Akwụkwọnsọ na-atọ ntọ-ala nke ọlụ ịsọpụrụ Chineke ná ndụ ụmụntàkịrị, ụmụokọrọbịa, na ná ndụ ụmụ-agbọghọ; ma ọtụtụ mgbe ka ndị bụ nne na nna na-elefu ndụmọdụ a dị mkpà anya.

Tụgharịa uche n’urù nke òfùfè èzínaụlo wetaworo ìgwè mmadụ ndị jeworo ijè n’ụzọ ahụ dị warara na mkpagide nke na eduba n’Elu-igwe. Lee ka o si bụrụ ihe bara urù bụ ohere a nke inwe ebe òfùfè nime èzínaụlọ di. Ọtụtụ ndè mkpụrụobi nọ n’Elu-igwe ugbu a n’ihi na ha nwere mmalite dị mma site n’òfùfè nke èzínaụlọ ịbà n’Obodo Ọma ahụ. Otù nime ihe ndịozi na-echeta nke mere mgbe ha dị na nwata bụ ọtụtụ akụkọ Baịbụl nne na nna kọọrọ ha. Ọtụtụ ndị nkwusa njègharị na-ekwusa oziọma nke nzọpụta nye ndị nọ n’ọchịchịrị n’ala ndị na-amaghị Chineke, buru ụzọ nụ ma mụta kwa akụkọ nke Oziọma site n’èzínaụlọ nna ha. Ịgụkọ ọtụtụ urù nke òfùfè èzínaụlọ bara ga na-aga n’iru n’akwụsịghị akwụsị: Ndịọlụ nke Kraist, ndị òzìzí nke Ụbọchị ụkọ, ndị ná-agbasa Oziọma n’ụlọ n’ụlọ, ndị ji ndụ ha chụọ àjà n’ịbụ abụ. Ọgbụgba-àmà ha pụtara ìhè na-abụkarị: “Amụtaram ihe banyere Jisọs n’òfùfè nke èzínaụlọ mgbe m’ dị na nwata” maọbu, Azọpụtaram mgbe mụ na nne na nnam nọ na ekpe ekpere n’ebe òfùfè nke èzínaụlọ anyị. Ọ ga-adị nnọọ Chineke mma ma asị na ndị nne na nna ga-elezi anya ịluzu ọlụ a nke na-amịpụta mkpụrụ nye Kraist! Chineke na-agwa anyị sị: “Riba onwe-gi na ozizi-gi ama; Nānọgide n’ihe ndi a: n’ihi na nime nka i gazọputa onwe-gi zọputa kwa ndi nānu olu-gi”(I Timọti 4:16).

“N’ọnọdụ Kraist”

Agwara anyị n’Akwụkwọnsọ na “Ihe-nketa nke nēsi n’aka JEHOVA bia ka umu bu” (Abù Ọma 127:3). Chineke enyewo ndị bụ nne na nna mkpụrụobi ná-adịghị anwụanwụ n’aka ilekọta ya anya nime arọ ole-na-ole dị mkpụmkpụ. Ọ bụ ọlụ dịrị náánị ndị nne na nna ịkụziri mkpụrụobi ahụ ihe banyere Chineke, ha aghaghị kwa ịkụziri ya ihe dịka ike ha ra maka Chineke. Ụdị nke mmehie nke dị nime nwata ahụ ga-eme ka ọ kpafuo site n’ebe Chineke nọ ma ọ bụghị ma akụziri ya nkeọma urù dị iche iche nke dị ná nsọpụrụ Chineke, na ụgwọ ọlụ dị iche iche dị egwù nke ajọ omume nke mere ka ihe dị iche iche n’etiti ha abụọ pụta ìhè nkeọma.

Mmadụ ụfọdụ nwere ike ịna-atụle n’obi ha mgbe o kwesịrị ka amalite ịkụziri nwata banyere Chineke na ihe niile nke Elu-igwe. Aisaia Onye-amụma, site ná mkpali nke Mmụọ Chineke kwuwara nkeọma na o kwesịrị ka amalite ịkụziri nwata ihe banyere Chineke nke ntà nke ntà ngwa ngwa anapụrụ ya ara. Jisọs kwuru okwu banyere ụmụ ọhụụ ekutaara Ya sị: “Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu egbochi-kwa-la ha: n’ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a” (Luk 18:15, 16). Ngwa ngwa nwata ahụ malitere ikwu okwu, gịnị ga-eme ka ndị nne na nna ghara ikwuru ya okwu banyere ihe ndị ahụ kachasị mma -- ihe niile banyere Chineke? Mgbe nwatakịrị malitere ikwu okwu n’oge ná-adịghị anya ọ malite inwe uche, n’ihi nke a ìhè nke Eziokwu nke Chineke ga-amụkwasị n’obi ya tupu ọtụtụ mmadụ amalite iche na ọbụ ihe dị mfé. Ọ dịghị mgbe aga-asị na nwata ahụ dị nnọọ óké ntakịrị imalite ịgwa ya ọtụtụ ihe banyere Chineke, ma ihe óké egwù dị ma ọbụrụ na anọọ ọdụ n’ime nke a! N’ụlọ akwụkwọ kọleji dị iche iche taa ewerewo aghụghọ webata òzìzí nke nwogharị na nke ekweghị na Chineke dị nime ihe ọmụmụ ha ọbụná malite na klasị nke mbụ. Ya mere ma ọ bụghị na nwatakịrị gị nwere nchekwube na nghọta zuru òkè n’ihe edere n’Akwụkwọnsọ, okwukwe ya pụrụ ịbụ ihe ekpuru iru n’ala.

Ná agụrụ ụmụ gị Okwu Chineke mgbe niile, ná-akọwara ha ịhụn’anya ahụ niile mara mma nke dị na Baịbụl. Tọọ ezi ntọ-ala nke ịhụn’anya na nsọpụrụ nke ihe niile edere nime Akwụkwọnsọ nime obi ha. Mee ka èzínaụlọ gị mara óké urù dị iche iche nke ifè Chineke òfùfè mgbe niile bara, ma ná-agba kwa ndị èzínaụlọ gị niile ume n’otù n’otù ka ha ná ekpe ekpere. Chineke ekwewo mkwà na Okwu Ya aghaghị alaghachikute Ya n’efù.

Ụbọchị Niile

Ọ bụ ùgbò ole ka aga na-enwe òfùfè nrò nke èzínaụlọ? Site n’ezigbo mmụta nke Okwu Chineke, ọ pụtara ìhè nkeọma na aghaghị inwe òfùfè nke èzínaụlọ, ọ dịkarịa ntà, otù ugbò n’ụbọchị. Ndịagha dịkarisiri ike nke Chineke na-akpachapụ anya mgbe niile ịhụ na ha mere nke a. Ihe mbụ Abraham na elezi anya ime mgbe ọ bụla ọ bịaruru ebe obibi ọhụụ ya bụ iwuru Chineke ebe ịchụàjà, ka ya na èzínaụlọ ya wee nwee ebe ha gana ekpe ekpere oge niile ha na-ebi n’ebe ahụ. Job na-ebili n’isi ụtụtụ mgbe niile ịchụrụ ụmụ ya àjà nsụre-ọkụ. Devid dere sị, “Anyasi, n’ututu, na etiti-ehihie, ka m’gātughari uche, su kwa óké ude: Ọ gānu kwa olum” (Abù Ọma 55:17). Daniel kwa na-ekpe ekpere ugbò atọ kwa ụbọchị, Chineke zakwara ekpere ya n’ebe ọ dị ukwuu.

Ọtụtụ èzínaụlọ na-edo ekpere nke èzínaụlọ n’ụtụtụ tupu ha ejee ọlụ nke ụbọchị ha, na kwa n’anyasị mgbe mmadụ niile latasịrị ụlọ. Ụfọdụ èzínaụlọ na-enwe òfùfè ha náánị n’ụtụtụ, ebe ndịọzọ na-enwe nke ha náánị n’anyasị. Eziokwu nke Chineke pụtara ìhè. Dịka ụmụ Israel chịkọtara mana ha n’ụtụtụ nile mgbe ọ ka dị mma, ewezuga n’Ụbọchị izu-ike, otú a ka Onye Kraist na-aghaghị ịna-achịkọta ezi Achịcha ahụ nke si n’Elu-igwe kwa ụbọchị, ka o wee dị ike nime mmụọ ya n’ọdị-mma ya niile. Ezi onye nke Chineke ga-eme ihe niile o nwere ike ime ịrọpụtara èzínaụlọ ya na kwa ya onwe ya nri nke ime mmụọ. Nwanyị ahụ ana-alụ ọhụụ nke Kraist -- Nwanyị nke na ejide onwe ya nkeọma -- “Ọ nēbili kwa mgbe abali nādi kwa, we nye ụlọ-ya nri, nye kwa ụmụ-agbọghọ ya òkè-ha”(Ilu 31:15).

Site N’ihe Ilere-anya

Ihe niile ekèrè-èkè na-esite n’ihe ilere-anya akụziri ụmụ ya ihe, otú a kwa ka Onye Kraist ga-esi kuziere ụmụ ya. Ọ na-adịrị nwata mfé ịgbaso ihe ilere-anya nke ezi nne na nna ná-asọpụrụ Chineke. Joshua bụ otù onye nke gosiri onwe ya ihe nlere-anya nke nsọpụrụ Chineke nye ụmụ ya; O mekwara ihe niile o nwere ike ime ịhụ na ụmụ ya jere ijè n’ụzọ niile nke Chineke. Ọ gwara ụmụ Israel: “Rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfe òfùfè; … ma mu onwem na ulom, ayi gēfe JEHOVA òfùfè” (Joshua 24:15). Na mgbe ochie ndị bụ nna na-ewere ọnọdụ ndị ndú izi ụmụ ha ihe banyere Jehova. Gịnị ga-eme ka ndị bụ nna na-echè na apụrụ inye onye ọzọ ọlụ a dị mkpà n’ụbọchị taa? Mgbe ndị bụ nna ga-egosi mmasị dị ukwuu n’òfùfè nke èzínaụlọ, na-akụziri ụmụ ha ndịkom na ndịnyom ihe banyere Chineke na ụlọ ebube Ya niile, ndụ ọhụụ ga-abịa ná Nzụkọ Kraist – aga na-ede aha ọhụụ n’Elu-igwe kwa ụbọchị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere òfùfè nke èzínaụlọ ji dị mkpà n’òfùfè onye nke Kraist nye Chineke?
  2. Ùgbò ole ka aga-edo òfùfè nke èzínaụlọ?
  3. Òlee otú Job si dooro ụmụ ya ndịkom na ụmụ ya ndịnyom òfùfè nrò?
  4. Ònye nime ndị dike nke Chineke sịrị, “Ma mu onwem na ulom ayi gēfe JEHOVA òfùfè”
  5. Gịnị bụ mkwà Chineke kwere onye ahụ nke ga-eji ikwesị ntụkwasị obi kuziere ụmụ ya niile ụzọ nke Chineke?
  6. Kwue ọtụtụ ihe nke mere ka Abraham bụrụ onye nke Chineke amaara nkeọma
  7. Ùgbò ole ka Daniel kpere ekpere n’ụbọchị? Chọta amaokwu nime Baịbụl nke ga-akwagide ọzịzá gị
  8. Gịnị bụ iwu Chineke nyere ụmụ Israel banyere ikuziri ụmụ ha ihe?