Jenesis 2:18, 21-24; Malakai 2:14; Matiu 5:32; 19:3-9; Mak 10:11, 12; Luk 16:18; Ndi Rom 7:2, 3; I Ndi Kọrint 7:10-13; Ndi Efesọs 5:22-32

Lesson 271 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Unu onwe-unu n’otù n’otù hu kwa nwunye-unu n’anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n’anya, dika ọ nāhu onwe-ya n’anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwù di-ya” (Ndi Efesọs 5:33).
Cross References

I Ntụpụta nke Chineke Banyere Ọlụlụ di na nwunye

1. Àtụmàtụ Chineke banyere ọlụlụ di na nwunye malitere site na mbụ, Jenesis 2:18-24; Matiu 19:4-6; Mak 10:6-9

2. Mkwà nke ọlụlụ di na nwunye na-akwụsị náánị mgbe otù nime mmadụ abụọ ahụ nwụrụ, Jenesis 2:24; Malakai 2:14; Matiu 19:6-8; Mak 10:7-9; I Ndi Kọrint 7:10-13, 27, 39; Ndi Rom 7:2, 3

3. Onye nke Kraist agaghị alụ onye na-adịghị asọpụrụ Chineke ma ọlị, Ndi Kọrint 7:39; II Ndi Kọrint 6:14; Jenesis 24:3, 4; 28:1; Deuteronomi 7:2-4; Joshua 23:11-13; Ezra 9:11, 12; Nehemaia 13:23-27

4. Onye lụworo di na nwunye tupu ọ bụrụ onye nke Kraist agaghị ekewapụ onwe ya site n’ebe ibe ya nke na-ekweghị ekwe nọ náánị n’ihi na ọ bụ onye na-ekweghị ekwe, Jenesis 2:24; Matiu 19:5, 6; Mak 16:6-9; I Ndi Kọrint 7:10, 12-16

5. Ihe Chineke chọrọ n’aka di na nwunye bụ ihe dị óké mkpà, Ndi Efesọs 5:22-33; I Ndi Kọrint 7:3

II Ọjụjụ Chineke jụrụ Nkewà na Nlụgharị nke Di na Nwunye

1. Chineke kwenyere nchụpụ maọbụ nkewapụ site n’arụ otù onye na ibe ya n’ihi náánị otù ihe; na àtụmàtụ Ya na mbụ nke zukwara òkè enyeghị ohere ọ bụla maka nkewa nke di na nwunye, Matiu 5:32; 19:3-9; Mak 10:11, 12; Deuteronomi 24:1-3; I Ndi Kọrint 7:10, 11, 27

2. Mmadụ ịlụ di maọbụ nwunye ọzọ mgbe nke bụ ezi di ya maọbụ nwunye ya ka dị ndụ, bụ ịkwà-iko, Matiu 1:31, 32; 19:9; Mak 10:11, 12; Luk 16:18; Ndi Rom 7:3

3. Chineke ga-ekpe ndị ahụ na-emebi iwu Ya n’ụzọ dị otú a ikpé dị egwù, Matiu 15:19, 20; Mak 7:20, 23; Ndi Galetia 5:19, 21; I Ndi Kọrint 5:11-13; 6:9, 10, 18; 10:8; Ndi Efesọs 5:3, 5; Malakai 3:5; Ndi Hibru 13:4; Jemes 4:4; II Pita 2:14-17; Nkpughe 2:22

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Àtụmàtụ nke Chineke, na Omume Mmadụ Banyere ya

Ọlụlụ di na nwunye na ejikọta di na nwunye n’ụbọchị niile nke ndụ ha. Akwụkwọnsọ na-akụziri anyị na mgbe ana-eme ka mkwà nke ọlụlụ di na nwunye ghara ịdị irè bụ mgbe otù nime mmadụ abụọ ahụ bụ ndị kweworo mkwà nwụrụ. Ọ na-akwọwa nkeọma sị: “Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madụ atọsala” (Mak 10:9; Malakai 2:14), (Gụọ kwa I Ndi Kọrint 7:39). Nke a bụrị àtụmàtụ Chineke dịka ekpugheworo site ná mmalite, mgbe Chineke nyere nwoke ahụ otù onye inye-aka kwesịrị ya; anyị nwekwara ike ịhụ site n’òzìzí dị iche iche nke Kraist na ọ bụ àtụmàtụ Chineke nye anyị taa. N’ezie, nke a bụrị àtụmàtụ nke Chineke nye ọgbọ niile.

Site n’omume, mmadụ bụ onye na-eleli iwu Chineke na àtụmàtụ Ya niile n’otù ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ. N’ihi nleli ahụ, ọnọdụ wee jọọ njọ nke ukwuu otù mgbe n’akụkọ nke ụwa nke mere ka Chineke bibie óké ìgwè ndị mmadụ. Mgbe ijummiri ahụ tasịrị Ya na ndị nke Ọ rapụrụ ndụ wee gbaa ndụ, na-ekwu na Ya agaghị ebibi kwa ụwa ọzọ n’ụzọ dị otú a. O kwere mkwà urù na ngọzi ukwuu dị iche iche nye ndị niile ga-edebe ọgbụgba-ndụ Ya niile ma nara kwa mkwà Ya niile. Ma mgbe ná-adịghị anya, mmadụ malitere ileda ọgbụgba-ndụ ahụ ya na Chineke gbara anya, site n’oge ahụ ka enwere ndaghachị azụ site n’omume ọma wee mee kwa ka mmebi iwu ba ụba.

Chineke emezuwo àtụmàtụ Ya -- akụkụ nke Ya n’Ọgbụgba-ndụ ahụ -- ọ bụ ezie na mmadụ emebiwo ọgbụgba-ndụ ya na Chineke, na ọgbụgba-ndụ ọzọ dị iche iche nke Ya na ọtụtụ mba ọzọ dị iche iche gbara, ma Chineke emezuwo àtụmàtụ Ya -- nke bụ akụkụ nke Ya nime ọgbụgba-ndụ ahụ. Chineke jiri ikwesi ntụkwasị obi na obi ebere meso ndị Mba ahụ Arọpụtara, ma ha nupuruisi ọtụtụ mgbe ma n’ikpe-azụ ha wee mee omume jọgburu onwe ya nke bụ ịjụ náánị olile anya nke nzọpụta ha nwere wee kpọgide Ọkpara Chineke n’obe.

Ndị Mbaọzọ enwewo kwa ohere ịnara maọbụ ịjụ Eze nke Ịhụn’anya ahụ; ma ha onwe ha ajụwo kwa nnọọ Onye ahụ nke kwụrụ ụgwọ nke mere ka nzọpụta ha dị irè. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ Ya na ọnọdụ mmehie ndịa aghaghị ịdị, O wee bu kwa amụma na ha aghaghị ịdị nke ka nke n’ụbọchị ga-ebu mbịaghachị Ya n’ụwa ụzọ. Ọ sịrị “Ma dika emere n’ubọchi Noa, otú a ka ọ gādi kwa n’ubọchi Nwa nke madu. Ha nēri ihe, ha nāñu iheọñuñu, ha nāzu, ha nēre, ha nāku ihe n’ubi, ha nēwu ulo; ma n’ubọchi Lot siri na Sodom puta ọku na brimstone si n’eluigwe zò, we la ha nile n’iyi: n’otù aka ahu ka ọ gādi n’ubọchi agēkpughe Nwa nke madu” (Luk 17:26-30).

N’ụbọchị taa anyị na ahụ mmezu nke okwu amụma ndịa. Ndaghachị azụ dị egwù adịwo kwa n’omume ọma nke ụmụ mmadụ n’elu ụwa, nke ka nke nime arọ ole-na-ole gara-aga, anyị pụkwara ịhụ n’ezie na nke a bụ ihe-àmà nke na-egosi na ọbịbịa nke Ọkpara Chineke dị nso.

Oge nwere ike ịgbanwe, enwe kwara ike megharịa ome-na-ala dị iche iche nke mmadụ ka oge na agabiga. Mmadụ nwere ike ileli ma wezuga kwa ihe ahụ amaara ma nwapụta kwa na ọ bụ ụzọ nke Chineke -- ụzọ ahụ nke ziri-ezi na ụzọ nke kachasị mma -- n’ihi ihe ụtọ na ihe na atọ anụ-arụ ya ụtọ. Ma Okwu Chineke, àtụmàtụ Ya, na Iwu Ya nke na adịgide na-enweghị mgbanwe mgbe niile. Chineke kwuru site na mbụ sị na nwoke ga-arapụ nna ya na nne ya wee rapara n’arụ nwunye-ya (ọ bụghị n’arụ ndịnyom), na ha abụọ ga-aghọ kwa otù anụ-arụ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla agbanweworo okwu a nke si na Chineke pụta. Ọ na-egzosi ike rue taa.

Nleli nke Àtụmàtụ na Ikpé niile nke Chineke

Jọn Onye ọwụmmiri kwuwara okwu megide mmehie nke ịkwa-iko, n’okwu banyere otù onye ọchịchị bụ onye wereworo nwunye nwoke ọzọ dịka nwunye nke aka ya (Matiu 14:3, 4). Akụzi kwara ihe megide mmehie nke ịkwa-iko a, egosipụta kwara uche Chineke nkeọma site n’ihe àtụ dị iche iche nke Chineke ji tụnyere ekwesịghị ntụkwasị obi nke Israel dịka onye nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi nke ịkwa-iko maọbụ ime mmehie ahụ (Malakai 2:11-15). Mgbe Devid mehiere n’ụzọ dị otú a o mere ka ekwuluo aha Chineke n’etiti ndị ná-amaghị Chineke, ma wetakwara onweya ikpé Chineke n’ihi mmehie ya (II Samuel 12:13, 14).

Mgbe Jisọs na otù nwanyị Sameria ná-akparịta ukà O wee mee ka o kwenye na onye nke ise ya na ya bi abụghị di ya (Jọn 4:16-18). Mmụọ Nsọ, site kwara n’ọnụ Pọl Onyeozi na-eme ka anyị mara na ndị niile na-eme mmehie nke a jọgburu onwe ya, bụ mmehie ịkwà-iko enweghị òkè n’Ala-eze Eluigwe karịa ma ha chègharịrị wee si n’ụzọ mmehie ha wezuga onweha (I Ndi Kọrint 6:9; Ndi Galetia 5:19-21; II Pita 2:14-17). Ọtụtụ ebe nime Akwụkwọnsọ na emegide nleda anya nke ntọ-ala ahụ nke Chineke mere maka ọdị mma nke mmadụ niile. Ọtụtụ ga-ewezuga ma lefuru kwa òzìzí niile nke Baịbụl pụtaworo ìhè anya ka ha wee kpuchie, gọpụ, maọbụ nye mmehie ha ọnọdụ. Ma Okwu Chineke ná-adịgide, ikpé nke Chineke ga-adakwasị ndị niile na-eme mmehie a, ọ bụ ezie na iwu na omen’ala nke obodo nwere ike kwenye ịkwa-iko.

Ọlụlụ Di na Nwunye Nke Ziri-ezi

Okwu Chineke banyere ọlụlụ di na nwunye pụtara ìhè. Chineke agwawo anyị na ọbụghị dịka àtụmàtụ Ya si dị ka ndị nke Ya na ndị na ekweghị ekwe kekọta onweha (II Ndi Kọrint 6:14). Gụọ kwa (I Ndi Kọrint 7:10-16). O kwuru sị ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe ana-asọpụrụ (Ndi Hibru 13:4), ma O nye kwara ndụmọdụ dị nrò banyere ọlụ ahụ niile nwunye ji ụgwọ ịlụ n’ebe di ya nọ, na ọlụ ahụ niile kwa nke di ji ụgwọ ịlụ n’ebe nwunye ya nọ (Ndi Efesọs 5:22-33; Ndi Rom 7:1-3; I Ndi Kọrint 7:2-6, 10-16, 27-33).

Dịka anyị kwuworo na mbụ, ọ dịghị usoro nke enyere maka nkewa di na nwunye nime àtụmàtụ nke Chineke, ma O kwenyere nkewa ha n’ihi ihe ole-na-ole. Ọ bụ náánị ọnwụ pụrụ ikewapụcha ndị ahụ Chineke jikọtaworo n’otù. Ọ bụrụ na atụgharịa uche nkeọma n’ụkpụrụ a dị nsọ aga egbochi ihe isi ike niile wee wepụ kwa nsogbu niile. Chineke na-asọpụrụ ọlụlụ di na nwunye niile. Ọ dịghị kwa mkpà na ọ ga-abụ náánị ụkọ Chukwu ga-ejikọta ha maọbụ na aga-eme ya n’ụlọ Chọchị ebe ha na Okwu Chineke dakọtaworo n’otù ma bụrụ kwa idebezù omen’ala niile nke edoziworo na iwu nke obodo maọbụ dịka usoro niile nke akụkụ obodo ahụ ebe ejikọtaworo ha si dị.

Ebe ọ dị otú a, náánị ọlụlụ di na nwunye nke Chineke ná-adịghị akwagide dịka ọlụlụ di na nwunye ziriezi bụ ndị ahụ alụworo n’etiti ndị ahụ, nke otù onye maọbụ ha abụọ bụ ndị lụworo di maọbụ nwunye nke di maọbụ nwunye mbụ ha ka dị ndụ. Ya mere, mgbe onye ejikọro ya na mmadụ ibe ya n’ụzọ ziriezi dị ndụ wee na-achọ kwa ịlụ di maọbụ nwunye ọzọ, mkwà nke ọlụlụ di na nwunye nke mbụ ahụ ka dị kwa irè ebe ọlụlụ di na nwunye nke emere n’ikpe-azụ bụ ihe na-ezighị ezi bụrụ kwa imebi iwu nke Chineke. Ọlụlụ dị otú a bụ ọnọdụ nke ịkwa-iko. Njikọ ọlụlụ di na nwunye nke mbụ ahụ, nke náánị ọnwụ pụrụ iwezuga, bụ nke ana-emebighị emebi; ma ọlụlụ di na nwunye ọzọ bụ nnọọ enweghị nsọpụrụ n’ebe nkekọta ahụ dị.

Ọtụtụ nsogbu dị nke na-eche onye ozi ahụ nke Oziọma iru bụ onye nwe ọlụ nke ịdụ ndị dabaworo n’ọnyà nke onyeiro nke mkpụrụobi mmadụ ọdụ maka mmehie a ana-ahụ n’ebe niile dị ukwu. Onye nke Chineke kwesịrị ntụkwasịobi ga-ekpe ekpere rii nne ma nyocha kwa ihe ọ bụla banyere ọlụlụ di na nwunye nkeọma bụ nke ọ na-eleba anya, ịhụ otú o si daba ná àtụmàtụ dị nsọ Chineke. Iwu mbụ dị iche iche nke Chineke nyere n’okwu Ya banyere àtụmàtụ nsọ ahụ nke Ọ tụworo site ná mmalite zuruòkè iji nwapụta ezi ọnọdụ mmekọrịta ọ bụla. Mkpughe nke a nke uche Chineke bụ ihe ndú na ihe ọtụtụ nke anyị, bụ mmadụ, n’otù n’otù, aghaghị itinye ná nnwapụta nke anyị onweanyị na mmekọrịta niile iji mee ka ndụ anyị bụrụ ihe ziri ezi n’anya Chineke na omume anyị kwa ịbụ ihe enweghị ịta-ụta n’iru ndị mmadụ. Ya mere, “Ayi diri iwu, di-kwa-ra ihe àmà! ọ buru na ha adigh-ekwu dika okwu a si di, n’ezie ọ digh chi-ọbubọ diri ha” (Aisaia 8:20).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Kọwa àtụmàtụ mbụ nke Chineke banyere ọlụlụ di na nwunye na otú ana aghaghi idebezu ihe niile achọrọ nime ya.
  2. Kpọ aha ụfọdụ ndịagha nke Chineke n’Akwụkwọnsọ bụ ndị ziri òzìzí megide mmehie nke ịkwa-iko; kwuo kwa n’okwu nke aka gị ihe ha kwuru banyere ya.
  3. Òlee mgbe, ọ bụ kwa náánị òle mgbe, ka apụrụ ịtọsa mkwà nke ọlụlụ di na nwunye?
  4. Ọ dị mkpà na aga-alụ di na nwunye n’ụlọ chọchị maọbụ n’iru ụkọ Chukwu tutu Chineke ekwenye na ọlụlụ di na nwunye ahụ bụ ihe ziri ezi? Kwue ihe na akọwa ọzịzá gị.
  5. Gịnị ka Chineke naachọ n’aka nwunye ịbụ omume na ọlụ ya n’ebe di ya nọ?
  6. Gịnị ka Chineke na-achọ n’aka di ịbụ omume na ọlụ ya n’ebe nwunye ya nọ?
  7. Òlee mgbe ọlụlụ di na nwunye na abụ ihe na-ezighị ezi n’anya Chineke?
  8. Mgbe ana-ele anya ịlụ di na nwunye gịnị ka Chineke kwuru na aghaghị ịtule? Kpọọ amaokwu ibun’isi ahụ na II Ndi Kọrint bụ nke nyere anyị ike nke ọzịzá kwesịrị ajụjụ a.
  9. Èkwenyere mkwà di na nwunye nime àtụmàtụ mbụ nke Chineke?
  10. Gịnị bụ ọzịzá nke nwanyị Sameria ahụ nyere Jisọs mgbe ọ sịrị ya jee kpọ di ya? Gịnị mere Jisọs ji kwuo na ọ zara nkeọma?