Matiu 5:23, 24, 43-48; 18:15, 21, 22; Mak 11:23-26; Ndi Rom 12:9, 10, 14, 17, 19-21

Lesson 272 - Senior

Memory Verse
AMAOKWUIBUN’ISI: “N’ihi na ọ buru na unu agbaghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāgbaghara kwa unu: ma ọ buru na unu agbagharagh madu ndahie nile ha, Nna-unu agagh-agbaghara unu ndahie-unu” (Matiu 6:14, 15).
Cross References

I Mgbaghara Zuru Òkè

1. Ịgbaghara nwanne anyị na-ebute ụzọ tupu anyị na Chineke emee udo, Matiu 5:23, 24; 18:15; Mak 11:25, 26

2. Mgbaghara ná-enweghị ókè (ọgwụgwụ) dị mkpà, Matiu 18:21, 22

3. Aghaghị iwezuga ihe mgbachi n’ọnụ-ụzọ niile nke okwukwe ka anyị wee nwee ike ịnata ọzịzá n’aka Chineke, Mak 11:23-26

II Ịhụn’anya Dị Ọcha

1. Ná-enwenụ ezi ịhụn’anya n’ebe ụmụnna nọ, Ndi Rom 12:9, 10; I Jọn 3:11-19; 4:7-11, 20, 21

2. Ná-ahụnụ ndị iro unu n’anya, Matiu 5:43; Ndi Rom 12:14

3. Ná-enyeghachị ezi ihe n’ọnọdụ ihe ọjọọ, Matiu 5:44; Ndi Rom 12:17, 19-21

4. Chineke hụrụ ndị mmehie n’anya, Matiu 5:45-48; Ndi Rom 5:8

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ibu Ụzọ Mee Udo

“Ọ buru na i nēche onyinye-gi n’iru Chineke n’ebe-ichu-àjà, i we cheta n’ebe ahu na nwa-nne-gi nwere ihe megide gi, rapu onyinye-gi n’ebe ahu n’iru ebe-ichu-àjà, laba, buru uzọ me ka gi na nwa-nne-gi di n’udo, mgbe ahu bia kwa che onyinye-gi” (Matiu 5:23, 24)

N’ebe a Jisọs na ezí ihe banyere onye Israel, nke wetara àjà ya n’ụlọ Ukwu Chineke onye na echere oge onye nchuàjà ahụ ga-abịa ịnara ya n’aka ya. Ọ bụ n’oge mkpà dị otú a, mgbe ọ na-achọ ịnata site n’onyinye ya akàrà nke mgbaghara dị nsọ, ka onye ahụ na enye onyinye na-echeta na mberede na ọ dị nwanna nwere ihe megide ya. Gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-ekwu sị, “Ngwa ngwa m’nyesiri onyinye a m’ga-ejekuru nwannam, wee mee udo”? É-è, kama tutu emee ihe ọ bụla ọzọ -- tupurị enye onyinye ahụ -- ọ dị mkpà na emere udo a, ọ bụ ezie na arapụrụ onyinye ahụ n’ebe ịchụàjà na enyebeghị ya enye.

Ịrapụ onyinye gị n’ebe ịchụàjà nwere ike ịbụ onyinye nke ijéozi maọbụ talent nke enyeworo Onyenweanyị. Ọlụ ị na alụrụ Chineke agaghị amị mkpụrụ ma ọ bụrụ na i nwere ihe n’obi megide onye ọ bụla, maọbụ na ị na-ebu iro maọbụ nwee obi ilu n’ebe onye ọzọ nọ. Ọ bụrụ na ị na abụ abụ maọbụ ná ekpe ekpere, na alụrụ Nzukọ gị ọlụ n’ụlọ ọlụ nke Nzukọ, maọbụ na ị bụ onye nkwusa ma i nwere ihe n’obi megide nwanne gị, gụọ onwe gị n’onye na adịghị alụrụ Chineke ọlụ. Ị ga-eme udo wee dozie ụzọ gị tupu onyinye gị abụrụ ihe Chineke ga anara nkeọma.

Ọ bụ ihe ntàkịrị ahụ ndị mmadụ na-ebu n’obi ha na-anapụ ha mmeri. Ọ bụ ihe ahụ na-anapụ ha amara, ike, na mmeri ná ndụ ha, ha apụghị kwa inwe ọgan’iru nime Oziọma ma ọ bụrụ na ha ewetaghị ihe ahụ n’oche-eze amara wee rapụ kwa ya n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ abịa n’ebe ịchụàjà wee cheta na nwanne ya nwere ihe megide ya, ọ ghaghị ịrapụ onyinye ya n’iru ebe ịchụàjà, wee laa ka ya na nwanne ya wee mee udo, mgbe ahụ ka ọ ga-abịa kwa wee nye onyinye ahụ, Chineke ga-anara kwa ya.

Iji Obi Ume-ala Mee Udo

N’okwu metutara mgbaghara, Baịbụl ekwughị ihe banyere onye mejọrọ ibe ya. Okwu Chineke ná-achọ ka edozie ụzọ mee kwa udo ná-agbanyeghị ihe ọ ga-efu. Mgbe ụfọdụ ọ na-abụrụ mmadụ ihe siri ike iweda onwe ya n’iru nwanna maọbụ nwanne, onye-agbata-obi, maọbụ ikwu, wee nwee ike ịbịaru n’ebe ọ ga-asị: “N’ezie, echerem na ihe m’mere ziri ezi, ma eleghị anya ikpé maram. Achọrọm mgbaghara.” O nwere ike ịbụ eziokwu na ọ ghọtaghị ebumn’obi gị ọzọ kwa na i zubeghị ajọ ihe, kama ọ bụrụ onye ọ bụla nkume ịsụ-ngọngọ n’ụzọ, ọ dị mkpà na aga-eme udo.

Mgbaghara

Mmụọ na-enweghị mgbaghara bụ ihe jọrọ njọ nke ukwuu. Ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike bụrụ onye emejọrọ ebe ọ dị ukwuu nke ga-eme na ọ pụrụ ikwu na ya mere nkeọma inwe ihe n’obi na inwe obi ilu megide mmadụ, enweghị ọnọdụ nye enweghị mgbaghara n’obi Onye nke Kraist. Jisọs sịrị: “N’ihi na ọ buru na unu agbaghara madụ ndahie nile ha, Nna-unu gāgbaghara kwa unu. Ma ọ buru na unu agbagharagh madu ndahie nile ha, Nna-unu agagh-agbaghara unu ndahie-unu” (Matiu 6:14, 15).

Ihe Mgbochi Nye Ekpere

Ndị ụfọdụ nwere ihe mgbochi nye ikwu okwu ha, maọbụ ọnụnụ ihe ha, maọbụ ịhụ ụzọ ha, maọbụ n’ijéijè ha. Mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-enwe ihe dị iche iche na-egbochi ekpere ha. “Ma ọ buru na unu onwe-unu agbagharagh, Nna-unu Nke bi n’elu-igwe agagh-agbaghara unu ndahie nile unu” (Mak 11:26). Ị pụrụ inwe okwukwe ibubiga ugwu niile, ma ekpere gị agaghị anata ọzịzá, ma ọ bụrụ na i nweghị obi mgbaghara. “Mgbe ọ bụla unu guzoro nēkpe ekpere, gbagharanu.” Mgbe ahụ okwukwe gị ga-enwe ụzọ ghereoghe ị ga-esite nata ọzịzá n’aka Chineke. Ugwu ndị ahụ agaghị agabiga rue mgbe i wepụrụ mkpụrụ nke adịghị n’otù ahụ. Dịka ụbọ-akwara ga-ewepụta ụdà dị ụtọ mgbe akwara ya niile jikọtara ọnụ, otú a ka ịdị n’otù n’etiti ụmụnna ga-eme ka Mmụọ nke Chineke lụọ ọlụ. Gị na Chineke apụghị ịdị ná mma mgbe gị na nwanna gị dị n’iro.

Idebe Iwe

Mgbe ụfọdụ ndị mmadụ ná-ekwu maọbụ ná-echè na ha agbagharawo nwanna ha, ma nime obi ha, ha ka ná-enwe ọnyá ochie. Ka akpọọ aha onye ahụ mejọworo ha, ngwa ngwa obi ilu ochie ahụ na-egosi onwe ya. Ọ dịghị enwe ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ, ọ ga-asi, “N’ezie, o merem ihe ihere n’oge gara-aga.” ’gagbaghara “rùe ùgbò asa?” ka Pita jụrụ. Kraist kwusiri ya ike sị “Asighm i, rue ùgbò asa; kama, rue ọgụ ùgbò atọ na iri uzọ asa” (Matiu 18:21, 22).

Amàrà Maka Mgbaghara

“Ọ buru na nwa-nna-gi emehie, bara ya nba; ọ buru kwa na ọ chègharia, gbaghara ya. Ọ buru kwa na ọ mehiere megide gi ùgbò asa n’otù ubọchi, we chigharia ọzọ n’ebe i nọ ùgbò asa, si, Echègharim: i gāgbaghara ya” (Luk 17:3, 4). Jisọs adịghị akuzi ịnagide maọbụ ịnabata mmehie ná ndụ onye ọzọ. Ọ bụrụ na nwanna gị emehie, bara ya mbà. Ọ bụrụ na ọ chègharịa, gbaghara ya. Ọzọ mgbe ị gbaghara ya, chèfue mmehie ya. Nke a na-ewe àmàrà. Ma eleghị anya ị ga-ekpe ekpere ka inwe àmàrà ga-ezuru gị ime nke a. Ị pụrụ ịgbaghara ya otù ùgbò; ị pụkwara ịgbaghara nke ùgbò abụọ site n’àmàrà nke mgbaghara i nwere. Ọzọ ọ bụrụ na o mee nke ùgbò atọ, ị gaghị etufu àmàrà gị kpamkpam, ị ga-etufu ya? Ị ga aza arịrịọ nke ùgbò atọ ahụ maka mgbaghara site n’ikwu, sị “Agaghim agbaghara?” Ọ bụrụ na ọ siri gị ike ịgbaghara, ị pụrụ ikpe ekpere ka Chineke nye gị àmàrà ga-ezuru gị. Ọ bụ nke a dị mkpà n’irubeisi n’iwu nke Jisọs.

Àsịrị

Oge ọzọ nwanna gi mehiere megide gi, ị gamata ihe ị ga-eme: “bara ya mbá” -- ọ bụghị n’obi ọjọọ kama site n’ịhụn’anya nke nwanna. Ọzọ ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakute gị wee mehie megide nwanna ọzọ site n’ikwugide ya, cheta na nke ahụ jọrọ njọ dịka ọ bụ gị ka ọ na-ekwugide. Bara ya mbá! Ntị nke na-anụ ihe jọrọ njọ dị ka ire ana-akwaghị ngá. Ịkpá-asịrị bụ ịgha mkpụrụ nke esemokwu, ndị niile na-anụ ya ga-aba mbá megide ya. Jehova kpọrọ ya asị bụ onye “nēzisa ise-okwu n’etiti umu-nne” (Ilu 6:19).

Ịhụn’anya Nke Zuru Òkè

Ọ na-adị mfé ịhụ ụfọdụ mmadụ n’anya. Ndị ọna-ụtụ na-ahụ náánị ndị ahụ hụrụ ha n’anya. Ọ na-adị kwa mfé ịgbaghara ndị ụfọdụ -- ma ọ bụrụ na ha bụ ndị enyi anyị. Ma Jisọs nyere iwu sị: “Nāhunu ndi-iro-unu n’anya nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsogbu unu” (Matiu 5:44). Ị pụrụ ịhụ nwoke ahụ bụ onye ghaaraụgha megide gị n’anya, onye metọworo aha gị? Òlee maka nwoke ahụ ghọgburu gị wee lelie gị? Ị pụrụ ịgbaghara ya? Ị na-emere ya iheọma mgbe ohere dapụtara? Ka ị na-ejègharị na-ekwu ihe banyere ya?

Mgbe ọzọ ị hụrụ onye iro gị ka ọ nọ ná mkpà, nyere ya aka. Ma eleghị anya ị ga-echè na ọ gaghị achọ inye-aka gị, ma ị nwawo? Ị na-ekwu na ọ bụ onye mmehie -- Jisọs na ndị ọna-ụtụ na ndị mmehie riri nri. Chineke na-eme ka mmiri Ya zokwasị ndị ajọ omume. Anyanwu na-awara ma ndị mmehie ma ndị nsọ. Ọ bụrụ na ị na-eme mma nye náánị ndị enyi gị, òlee ihe dị iche n’ebe gị na ndị ọna-ụtụ nọ? “Ya mere unu onwe-unu gēzu okè, dika Nna-unu nke elu-igwe zuru okè” (Matiu 5:48).

Otù Onye Nke Gbaghara

Ike nke dị n’Oziọma ịgbanwe obi mmadụ na ịkunye nime ya mmụọ nke mgbaghara bụ ihe egosiri n’ụzọ dịkarisịrị ebube dịka ihe nlere anya n’akụkọ nke otù nwoke atụworo mkpọrọ n’oge gara-aga, onye amakwara dịka “Irianọ na ise.” Mmadụ ole-na-ole, ma eleghị anya, bụ ndị gbaghaworo mmegbu jọgburu onwe ya dịka nwoke a mere.

Mgbe ọ gbara iri arọ na isii, ọ rapụrụ obodo ya nke dị na Providence, Rhode Island, wee chee iru n’ọdịda-anyanwu. Otù abalị ọ batara n’obodo nke Tacoma, rute ebe ahụ mgbe akagbupụrụ nnọọ mmadụ. Ejidere ya, kpee ya ikpé, tụọ ya mkpọrọ iri arọ abụọ na ise nke ịlụ-ọlụ siriike.

Ọtụtụ arọ ka atara ya ahụhụ siri ike nke kwesịrị inye onye ọjọọ gburu mmadụ. N’ọgwụgwụ nke iri arọ abụọ na otù arapụrụ ya ka ọ pụta site n’ụlọ mkpọrọ “fọdụ ntakịrị ka ọ bụrụ onye etipiaworo n’arụ na mkpụrụobi, ná-enweghị ebe obibi, ná enweghị enyi, na ná-enweghị aha.” Enyere ya tiket ịbà n’ụgbọ-ala nke na-aga Portland. Ogologo abalị anọ ka ọ nọ na-awagharị n’obodo Portland na-achọ ọlụ, na-enweghị ihe-oriri maọbụ ebe ndina. N’ikpe-azụ ọ malitere ịgbada n’ụzọ ijéru Àkwà ochie Buruside ịtụbà onwe ya n’osimiri. Onye nche àkwà ahụ wee dọpụ aka ya n’eriri njide-aka nke àkwà ahụ wee sị ya, “Ị pụghị ime ihe ahụ.” Ka “ Iri anọ na ise” na-apụ site n’ebe ahụ o wee hụ ọkọlọtọ nke Ndị Apostolic Faith. Nime ụlọ-ụka o metụrụ ya n’obi na ọ nọ n’etiti ndị enyi.

Onye nkwusa na ekwu okwu Chukwu n’anyasi ahụ banyere nwa mmefu ahụ. Ná mmechi, Iri anọ na ise weliri aka ya elu maka ekpere wee gaa n’oche-eze amara, ebe o kpere ekpere; Chineke wee “sachaa obi ya mee ka o nwupu.” Otù abalị mgbe ọ na-akọ akụkọ banyere ndụ ya na nchègharị ya otù nwoke wee nọdụ na ndịda ụlọ-ụkọ ná-egentị. O wee bilie ọtọ were ọsọ rịda ihe nrịgoro ụlọ ahụ. Onye ya na onye ọbịa ahụ kwurịtara okwu wee gwa Iri anọ na ise na nwoke ahụ mara ihe banyere ya.

Iri anọ na ise wee chọrọ nwoke ahụ gawa San Francisco ebe ọ hụrụ ya n’ụlọ ọgwụ ndị obodo ahụ. O jekwuru onye nlekọta ụlọ-ọgwụ ahụ rịọ ka enye ya ọlụ. Mgbe ajụrụ ya ebe ọ lụworo ọlụ na mbụ, o wee suaa ude ekpere nye Chineke wee kọọ akụkọ ya. Onye nlekọta ahụ wee kwá ákwà ka ọ na-egentị. O setịpụrụ Iri anọ na ise aka ya gwa kwa ya ka ọ bịa were ọlụ.

Mgbe ohere bịara izute onye ọbịa ahụ, o wee hụ ya ka ọ na-ahuju anya n’ọrịa ụkwara-ntà. Ebe ọ rịọrọ ka ọ guara ya Baịbụl, Iri anọ na ise wee gụara ya banyere Nwa Mmefu. Mgbe ha na-ekwurịta okwu, nwoke ahụ were aka ya makụa n’olu onye ahụ jeworo mkpọrọ wee jụa ya sị, “Ị pụrụ ịgbagharam ihe ọjọọ ahụ m’meworo gị?” Onye ahụ nke jeworo mkpọrọ wee za sị: “I meghịm iheọjọọ ọ bụla. Ị pụrụ ịgwam banyere nnem?” Ọ sị, “Amaghịm ihe ọ bụla banyere ndị gị, kama ọ bụ mụ bụ nwoke ahụ onye gburu mmadụ ahụ e jiri n’ihi ya ziga gị n’ụlọ mkpọrọ.” Ọ sị kwa, “M’chọrọ ka gị gbagharam n’ihi ọtụtụ arọ ndịa nke ị nọworo n’àzú mgbidi nke ụlọ mkpọrọ.”

N’ebe a ka ọ nọ bú ezigbo onye ahụ gburụ mmadụ onye njọ ya zigara Iri anọ na ise n’ụlọ mkpọrọ ebe ọ hụrụ ahụhụ iri arọ abụọ na otù! Ọ na-arịọ kwa Iri anọ na ise ka ọ gbaghara ya. Échìchè niile nke onye ahụ jeworo mkpọrọ gaghachiri n’ọtụtụ arọ ahụ niile ọ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ. O chee banyere bọl na cheen ígwè akwụnyeworo ya ka o buru n’arụ ogologo arọ abụọ. O cheta kwa ọpịpịa-ụtarị iriatọ nke ọ natara n’ebe ịpịa-ụtarị, na oge agbara ya égbè n’ụkwụ, na ọtụtụ izù ọ nọworo n’olùlù ochie n’ebe ahụ. O wee metụta ya n’obi na ya ejikereghị ịgbaghara ya site n’ala-ala obi ya. Ọ rapụrụ nwoke ahụ bànye n’otù ụlọ ntakịrị náánị ya. Ọ kpọchie ụzọ, wee gbue ikpere n’ala ụlọ simentị (concrete) kpee ekpere. N’ihe dị ka áwà atọ o chefuru ihe niile ọzọ wee kwue okwu kpee kwa ekpere gbaa nnukwu mgbá n’ekpere ya na Chineke ka O nye ya mmụọ nke mgbaghara. N’ikpe-azu otù olu wee daa si, “Gbaghara ya, n’ihi Mụ.”

O jèghachiri wee were aka ya abụọ jide nwoke ahụ wee sị, “M’na-agbaghara gị mmejọ niile nke i mejọworom, ma ị ga-arịọ Chineke ka Ọ gbaghara kwa gị.”

Iri anọ na ise nụrụ ka ọ na-ekwu ọtụtụ ùgbò sị, “Chineke, ka obi gị jụrụ n’ebe mụ bụ onye mmehie nọ.” Chineke nwekwara obi ebere n’arụ ya wee zọpụta ya. Mgbe abalị ole-na-ole gasịrị, onye ogbu mmadụ ahụ wee nwụọ n’elu aka nwoke ahụ onye gbaghaworo ya nke ukwu

Site na mgbe ahụ, Iri anọ na ise agawo ịnara ụgwọ-ọlụ ya na ịnọdụ Igwe ya na Onyenweanyị; nime ebighị-ebi kwa, n’ọzịzá “aha ọhụụ,” na-abụghị náánị ọnụ-ọgụgụ, ọ ga-ezute onye ahụ nke mere ka ọ hụọ ahụhụ n’ụwa n’ama ọla-edo. Ha abụọ anatawo mgbaghara nke Chineke dị ebere.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ùgbò ole ka mmadụ ga-agbaghara nwanne ya?
  2. Òlee otú anyị ga-esi na-emeso ndịiro anyị
  3. Gịnị bụ mmeso Chineke n’ebe ndị mmehie nọ ná ndụ nke a?
  4. Òlee ihe edere n’Akwụkwọnsọ nke na-egosi na enweghị mgbaghara n’ebe mmadụ ibe anyị nọ na-egbochi ekpere?
  5. Gịnị ka ị ga-eme mgbe mmadụ na-ewesa gị iwe?
  6. Òlee otú aga-esi zipụta omume ịhụn’anya nke ụmụnna?
  7. Òlee otú kwesịrị ka ịhụn’anya Onye Kraist dị ichè site na nke ndị mmehie?
  8. Ònye nwe ọbọ?
  9. Gịnị ka ọ pụtara mgbe asịrị, “ka ihun’anya buru ihe nke iru abụa nādigh nime ya”?