Matiu 28:18-20; Ndi Filipai 3:1-21; Ndi Efesọs 6:10-18; I Timọti 4:1-3; II Timọti 3:1-5; II Timọti 4:1-8; II Ndi Kọrint 4:16-18; 5:1-4

Lesson 273 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa” (Ndi Efesọs 6:11).
Cross References

I Izipụ maka Ozi Ukwu Ahụ

1. Site n’ike ahụ nke Chineke nyere, Jisọs zipụrụ Nzukọ Kraist ahụ ijé kuziere mba niile ihe, Matiu 28:18-20; Mak 16:15 Ọlu Ndi-ozi 5:20; 8:1-4

2. Ndị kwere ekwe nke ọgbọ niile aghaghị ịgbasi mgbá ike maka okwukwe mbụ ahụ nke enyere ndịnsọ n’aka náánị otù mgbe idebe, Ndi Filipai 3:1-3; Jud 3

3. Nzukọ Kraist Ahụ Nke Ná-ebú agha agaghị anagide ụgha ọ bụla iji ya gbanwee eziokwu nke Okwu Chineke, I Timọti 4:1-3, 13; II Timọti 3:1-5; 4:1-8; Ndi Galetia 1:6-9; I Ndi Kọrint 16:22; Deuteronomi 12:32; Nkpughe 22:19

4. Nzukọ Kraist ahụ Ná-ebúagha aghaghị ịna-agbasi mgbá ọma nke okwukwe ahụ ike, Ndi Efesọs 6:10-18; I Timọti 6:11-14; II Timọti 1 6-8, 13, 14; 2:1-15; I Pita 5:8, 9

5. Olile anya nke mbiliten’ọnwu bụ ihe ịgba-ume nye Nzukọ Kraist ahụ Ná-ebú agha n’oge niile nke ọnwụnwa na ibú agha, Ndi Filipai 3:4-21; II Ndi Kọrint 4:16-18; 5:1-4; I Ndi Tesalọnaika 4:15-17; II Pita 1:10, 11

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Nzukọ Kraist ahụ Nke Ná-ebú agha

Nzukọ Kraist ahụ nke ná-ebú agha bụ nnọọ ihe dị n’arụ Kraist, bụ Nzukọ Kraist nke nọ n’obubu agha megide mmehie n’ụwa nke dị ugbu a. Ọ bụ ezie na Nzukọ Kraist ahụ adịghị ebú agha dịka nghọta n’ihe banyere agha si dị -- nke bụ ịwụsi ọbara site n’ihe ike nke anya ná ahụ -- ma otú ọ dị ibu agha ha bụ nke ime mmụọ nke dị óké egwù jupụta kwa n’ihe ike dị iche iche. Ọkwá ha dị ukwu bụ ezi ndị agha nke Obe Kraist ahụ ndị kwesị kwara ntụkwasị-obi bụ ndị wụsiwo kwara ọbara ha n’ihi àmà ha ndị nyewokwara ndụ ha iji gbochie ndị niile nke ná-achọ imebi maọbụ ime ka eziokwu nke Chineke laa n’íyì.

Tupu rue mgbe Jisọs ga-abịa ọzọ, ibú agha nke ndị Kraist ga na-adị óké egwù dịka ibú agha nke ndị-agha nke nọ n’ibú agha nke ụwa a. Ihe agha nke ndị Kraist abụghị nke anụ-arụ, kama ọ bụ nke mmụọ; otú ọ dị ha bụ ezie, bụrụ kwa ihe pụrụ ikwada ebe niile ewusiri ike. Ibú agha nke Nzukọ Kraist bụ ihe ná-adị mgbe niile, ná-enweghị nkwụsị maọbụ izu ike ntà ke mgbe mmehie malitere; ọ gaghị akwụsị rue mgbe Jisọs Kraist ga-alaworị onyeiro ikpe-azụ ahụ dị ukwu n’iyì, nke bụ ọnwụ. (Gụọ I Ndi Kọrint 15:24-28).

Eziokwu na Okwu Ụgha

Ibú agha nke kachasị ibú agha nke ọgbọ niile na-abịa ọsọsọ. O nwebeghị mgbe ọ bụla Nzukọ Kraist ahụ ná-ebú agha nwere óké nnọchigide site n’ebe ụwa, anụ-arụ, na ekwensu nọ karịa otú ọ dị n’ọgbọ a. Ezi okwukwe na ịdị nsọ amalitewo ịdị ụkọ nime obi ụmụ mmadụ. N’akụkụ ọ bụla, na nime obodo ntà ọ bụla nke ụwa ndịiro nke eziokwu Chineke emewo ngwà ngwà n’ịgbasa ụgha ha niile nke ná-eweta ịlan’iyì. Enwewo okpukpé dị iche iche n’ebe niile, ma okwukwe ahụ nke enyere ndị nsọ n’aka náánị otù mgbe idebe bụ ihe dị ụkọ bụrụ kwa ihe dị óké ọnụ-ahịa maka ibú agha nke Onye Kraist bụrụ kwa ihe ana-adịghị ahụ mgbe dum.

Okwu nke Emos emezuwo: “Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe ayi JEHOVA puta), mgbe M’gēzite oké unwu n’ala ọ bugh oké unwu nke nri, ọ bugh kwa akpiri-ikpọ-nku nke miri, kama ọ bu nke inu okwu nile nke JEHOVA: Ha gañāghari kwa site n’otù oké osimiri rue n’oké osimiri ọzọ, site kwa n’Ugwu we rue n’ọwuwa-anyanwu; ha gāgbaghari iru na azu ichọ okwu JEHOVA, ma ha agagh achọta ya” (Emos 8:11, 12).

N’ihi na okpukpé nduhie agbasawo n’ebe ọ dị ukwu, ya na òtù ụgha dị iche iche, ịrọ òtù dị iche iche, nkewa dị iche iche na ụgha, ọlụ karịrị ukwu dịrị Nzukọ Kraist ahụ Ná-ebú agha ịgbara eziokwu nke Okwu Chineke àmà. Ekwupụtara ọlụ ahụ na Baịbụl: “Menu ihe nile nējigh ntamu na iru-ukà ọ bula; ka unu we ghọ ndi nādigh ita uta ndi nāghọgh kwa aghugho, umu Chineke ndi anāpugh ita uta n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ nke nēnwe kwa anya-uhie, ndi anāhu unu n’etiti ha dika ndi nēnye ìhè n’uwa, nēche okwu nke ndu n’iru madu” (Ndi Filipai 2:14-16).

Àmà nke Nzukọ Kraist ahụ Ná-ebú agha bụ náánị ebe nchebe nke dịrị eziokwu Chineke nime ụwa a nke gbara ọchịchịrị nime mmehie; ma nzọpụta nke mkpụrụobi nke ụmụ mmadụ na-adabere n’izu-òkè nke Nzukọ Kraist na otú o si ná-enyebiga onwe ya ókè n’ijéozi nke Kraist. N’ụbọchị ikpe-azụ ndịa, mgbe ọ fọdụrụ nwa oge tupu nlaghachị nke Jisọs nime ụwa, ikpe ekpere n’ebe ọ dị ukwu na ịnọgidesi ike nke mkpụrụobi ga-abụ ihe dị mkpà nye Nzukọ Kraist Ná-ebú agha ka o wee bụrụ ihe àmà dị ndụ nye Kraist, ma aga-enweta ọtụtụ mkpụrụobi nye Ala-eze nke Chineke site ná mgbali niile dị otú a.

Òzìzí Ụgha

Baịbụl ná-ekwusi ya ike mkpà ọ dị bụ iguzogide ndị ahụ nke ná-emebi Oziọma nke Kraist. Nnabata ụgha ọ bụla n’ụdị ọ bụla apụghị ịdị; Baịbụl na-akọwa kwa omume Chineke n’ebe onye ahụ nke na-ekwenyere ụgha nọ: “O nējum anya na unu nēsi n’aka Onye kpọrọ unu n’amara Kraist gbabiga ọsọsọ otú a n’ozi ọma di iche: nke nābughi ozi ọma ọzọ; ọ bụ nání na ufọdụ ndi nēme ka obi lọ unu miri, ndi nāchọ kwa itughari ozi ọma Kraist. Ma asi kwa na ayi onwe-ayi ma-ọbụ mọ-ozi nke sitere n’elu-igwe, gēzi unu ozi ọma ọzọ tukwasi ozi ọma nke ayi ziri unu, ya buru anathema. Dika ayi kwuworo n’oge gara aga, anāmekwu kwa ya ugbu a ọzọ, Ọ buru na onye ọ bula nēzi unu ozi ọma tukwasi nke unu natara, ya buru anathema” (Ndi Galetia 1:6-9).

Omume nke ịtụkwasị, maọbụ iwepụ ihe site n’Okwu Chineke ma ná-eché n’iru ndị mmadụ eziokwu nke ewepụsichara ihe úrù nke dị nime ya ná-asị kwa na ọ bụ Oziọma nke Kraist, bụ otù nime ihe ọjọọ dị iche nke jupụtara n’ụwa taa. Omume nke ịlan’iyì a sitere n’ekwensu; ma óké ìgwè mmadụ ka ana-eduhie n’ihi na ha adịghị eji okwu nke Chineke tụnyere okpukpé ha. Ọ bụrụ na Nzukọ Kraist ahụ nke Ná-ebú agha emee ihe dị iche ná-abụghị ikwupụta ndụmọdụ niile nke Chineke ọ ga-alụpụtara ya ịbụ anathema n’iru Chineke.

Pọl matara ọlụ nke ndị nduhie wee kwue kwa sị, “Ayi adigh ka ọra madu, ndi were ihe nādigh nma nētigwa n’okwu Chineke: kama dika ndi sitere n’idi ọcha, kama dika ndi sitere na Chineke, ọ bụ n’iru Chineke, nime Kraist ka ayi nēkwu” (II Ndi Kọrint 2:17). Okwu Grik ochie nke eji depụta amaokwu a nke Akwụkwọnsọ pụtara “huckster” n’asụsụ bekee nke pụtara onye na-ebugharị ngwá-ahịa n’ụlọ n’ụlọ. Nke a na-egosi na ụfọdụ mmadụ na-ebugharị Oziọma dịka ngwà ahịa iji nweta urù. (Gụọ Jọn 2:16; Ọlu-Ndi-ozi 8:18-21; I Pita 5:2; II Pita 2:1-3).

Otù uche a ka Aisaia gosịrị na Testament Ochie n’okwu ọ gwara ndị Israel banyere ndaghachị-àzú ha: “Ọla-ọcha-gi aghọwo afuru-uzu; ihe-ọñụñụ ọma gi, agwawo ya miri nke-uku: (Aisaia 1:22). Ihe a ga-ebu n’uche n’ebe a bu: “Ndi unu nke na-ebugharị ngwá ahịa agwawo ihe ọñụñụ-unu miri nke uku.” N’ụzọ ọzọ, enwere ndị ná-ebụgharị ngwá ahịa nke ihe ọñụñụ wee gwakọta ya mmiri iji mee ka ọ dị ukwu, wee ree kwa ya n’ọnọdụ ọnụ-ahịa nke ana-agwaghị agwa. N’ụzọ iji ihe kọwaa okwu, eji Oziọma tunyere ọla-ọcha na ihe ọñụñụ dị ụkọ. (Gụọ Abù Ọma 12:6; Aisaia 55:1). Ndị amuma ụgha ewerewo ọla-ọcha nke eziokwu Chineke gwakọta ya ọla nke na-adịghị óké ọnụ-ahịa dịka ọla-edo wee site n’ụzọ dị otú a laa ha dum n’iyì. N’ihi nke a mmanya nke nzọpụta abụrụwo ihe ejiworo mmiri ụfọdụ nke ụgha gwakọta, ha niile wee bụrụ ihe ná-adịghị ụtọ na ihe mebiri emebi. Apụghị iji ntụpụta nke mmadụ maọbụ amam ihe ha gwakọta n’Oziọma nke Jisọs Kraist. Iji ihe ọ bụla gwakọta n’eziokwu nke Oziọma ga-eme ya ka ọ bụrụ ihe ná-abaghị urù. Oziọma nke Jisọs Kraist ná-eguzo site n’ihe ngosi pụtara ìhè nke Mmụọ Nsọ na náánị nime ike nke Chineke, ná-enweghị inye-aka nke mmadụ. (Gụọ Matiu 9:16, 17; I Ndi Tesalọnaika 2:13; I Ndi Kọrint 2:4).

Onye Kraist adịghị achọ itụkwasị maọbụ iwepụ ihe site n’okwu Chineke, n’ihi na ọ na-asọpụrụ Onye kere ya na Onye Nzọpụta ya, ma ọ na-anabata Okwu ahụ dịka o si dị. Chineke ekwuwo ihe Ọ kwagidere wee kwagide kwa ihe ahụ nke O kwuworo. Ihe ịrịba-àmà nke pụtara ìhè nke eji amata onye amụma ụgha bụ ọjụjụ ọ jụrụ ịnabata Baịbụl na ọ bụ ihe na-adịghị agbanwe dịka ùkpụrụ atọrọ maka ịdị ndụ nke Onye Kraist. Nwa nke Chineke chọrọ Baịbụl n’òzùzù-òkè ya niile, n’ihi na o kwuru banyere onwe ya sị, “Ihe ọ bụla edeworo n’Akwụkwọnsọ bụ ihe si n’obi Chineke puta, ọ ba-kwara úrù iji zí ihe, na iji tu madụ mmehie-ha n’anya, na iji me ka uche madu guzozie na iji zùpụta nzùpụta nke di n’ezi omume: ka onye nke Chineke we zue òkè, onye emeworo ka o zue òkè ilu ezi ọlụ nile ọ bula” (II Timọti 3:16, 17). Ya mere, Nzukọ Kraist ahụ nke Na-ebú agha ná-eguzo ná-ekwenyeghị n’ụgha maọbụ mgbanwe ọ bụla megide Okwu Chineke ahụ nke anagwaghị ihe ọ bụla, iguzogide ndị niile na-emebi ya n’ụzọ ọ bụla -- Okwu Chineke niile; ọ karịghị kwa otú ahụ enyere ya, ewepụghị kwa ya ihe! Ịgbaso omume ọzọ ga-abụ ime ihe nzuzu, bụrụ kwa ido ihe niile n’okpuru ndị iro nke Oziọma (Gụọ II Jọn 9, 10).

Ndị Amụma Ụgha na Ndị-Ọzụzụ Atụrụ Ụgha

Oge a kwesịrị iji dọọ ndị Kraist akanántị, n’ihi na ọ bụghị ndị niile ná-akpọ aha nke Kraist bụ ezi ndị nke Kraist. Akwụkwọozi nke Pọl degaara Nzukọ Kraist nke dị na Kọrint dọrọ ndịnsọ niile akanántị ka ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndịozi nke Kraist ma ha abụghị, ghara iduhie ha kama ka anwapụta ha n’okwukwe. “N’ihi na madụ ndi di otú a bụ ndi ozi ugha, ndi-ọlu nātu ntu, ndi nēme onwe ha ka ha yie ndi ozi Kraist. Ọ bugh kwa ihe iju anya; n’ihi na Setan onwe ya nēme onwe ya ka o yie mọ-ozi nke ìhè. Ya mere ọ yie ndi nēje ozi ezi omume; ndi ọgwugwu-ha gādi ka ọlu-ha si di” (II Ndi Kọrint 11:13-15).

Ọtụtụ ụzọ ndịa nke dị na Baịbụl ka apụrụ iji chọpụta ndịozi nke Setan. Jeremaia jiri Okwu Chineke kwue okwu megide ndị-ọzụzụ atụrụ ụgha n’oge nke ya, “Ọ buru na ha guzori n’ìzù nzuzo nkem, ha gēmewori ka ndim nuru okwum nile, ha gēmewori kwa ka ha si n’uzọ ọjọ ha na n’ihe ọjọ nke omume nile ha, lata” (Jeremaia 23:22). Ọ bụrụ na onye ọ bụla nke na-akpọ onwe ya onyeozi nke Kraist etighịmkpu megide mmehie, asọpụrụghị Chineke, na ajọomume niile; ọ bụrụ kwa na o nyeghị ndị ahụ ndụmọdụ wee dọọ kwa ndị ahụ akanántị ka ha chègharịa site ná mmehie niile ha, chọọ kwa Chineke maka mgbaghara na ebere Ya, ọ bụghị Chineke zitere onye ahụ, apụkwara ịkpọ ya onye amụma ụgha. Ozi ya dị kwa ka ozi ndị ahụ nke Ezikiel kwuru okwu megide, bụ ndị buru amụma “si n’obi-ha puta” nējeso kwa “mọ nke ha” ya na “ihe nke ha nāhugh” (Ezikiel 13:2, 3). Ọzọ, ọ bụrụ na ozi ahụ nke ewetaara ụmụ mmadụ na Okwu Chineke adakọtaghị ọ bụghị Chineke zitara ya: “Ayi diri iwu, di-kwa-ra ihe-àmà! ọ buru na ha adigh ekwu dika okwu a si di, n’ezie ọ digh chi-ọbubọ diri ha” (Aisaia 8:20).

Ụzọ nke atọ nke eji achọpụta ndị amụma ụgha ka enwere ike ịgụpụta site n’okwu nke Kraist: “Nēzenu ndi-amuma ụgha, ndi nābiakute unu n’ihe-oyiyi aturu, ma nime ha bu agu nāpunara aturu. Unu gēsite ná nkpuru-ha mazue ha. Màdu nēkpokọputa nkpuru-vine n’ogwu, ma-ọbu fig n’uké? Otú a ezi osisi ọ bula nāmi nkpuru ọma; ma osisi nābagh n’ihe nāmi ajọ nkpuru, osisi abagh n’ihe apugh kwa imi nkpuru ọma. Ya mere unu gēsite na nkpuru ha mazue ha” (Matiu 7:15-20). Ya mere ndịnsọ nke Chineke, nwapụtanụ osisi ọ bụla site ná mkpụrụ ya niile, ma matakwanụ osisi ọma ọ bụla site ná mkpụrụ niile nke eziomume ha.

Iguzo N’ajọ Ụbọchị

Ana-enye ndị-agha gaje ibu agha iwu niile nke ná-achị ndị agha ka ha mata ihe achọrọ n’aka ha maka agha ahụ nke gaje ịbịa. Chineke arapụghị Nzukọ Kraist ahụ nke Ná-ebú agha ná-enyeghị ya iwu niile nke ibú-agha, ha pụtakwara ìhè nkeọma ka onye agha nke Chineke wee mara ihe Onyeisi agha ya chọrọ n’aka ya. “N’ihi nke a chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n’ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile” (Ndi Efesọs 6:13). N’ịtụkwasị ihe n’iwu ahụ nke ịchịli ihe agha niile nke Chineke, nke ọ bụrụ na enweghị ya ọ dịghị ndịiro nke Oziọma apụrụ iguzogide, enyekwara iwu ọzọ banyere omume nke onye agha Kraist. Omume ahụ ga-abụ inwe mkpebi ịnọ n’ezi nlezi-anya ya na ịlụsi ọgụ ike megide ndịiro nke eziokwu nke Chineke. “Onye anābu ọnu ka onye nke ji aghughọ eje ozi Chineke bu, onye anābu ọnu ka onye nke nēgbopu mma-agha-ya n’ọbara bu kwa” (Jeremaia 48:10). Anyị na-agụ ihe banyere ndụmọdụ ahụ nke Pọl nyere Timọti bụ ụkọ Chukwu nke bụkwa nwokorọbịa. Pọl dere sị: “Riba onwe-gi na ozizi-gi ama. Nānọgide n’ihe ndi a: n’ihi na n’ime nka i gāzọputa onwe-gi zọputa kwa ndi nānu olu-gi” (I Timọti 4:16). Mgbe ahụ, enwere ike ịsị na amaokwu ndịa nke sitere n’Akwụkwọnsọ bụ iwu niile nke ná-achị ndịagha nke enyere Nzukọ Kraist ahụ Na-ebú agha; ọ bụrụ kwa na erubeisi na ha, ha ga-ewetara ndịagha nke Obe Jisọs Kraist mmeri.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee ụfọdụ ndịiro nke Nzukọ Kraist ahụ Na-ebú Agha nwere?
  2. Gịnị mere agaghị anabata ndị ahụ na-agbanwe Okwu Chineke?
  3. Kwue ụzọ dị iche iche nke apụrụ iji chọpụta ndị amụma ụgha.
  4. Gịnị mere onye nke Kraist agaghị ewepu, maọbụ tụkwasị, ihe n’Okwu nke Chineke?
  5. Gịnị bụ ịdọ aka ná nti ahụ enyere na Baịbụl megide ikwusa “ozi ọma ọzọ”?
  6. Gịnị ka okwu a pụtara, “unu gēsite na nkpuru ha mazue ha”?