Matiu 25:31-40; I Ndi Kọrint 15:19-23; Ndi Efesọs 5:23-32; I Ndi Tesalọnaika 4:13-18; Nkpughe 11:15-18; 12:10, 11; 19:7-16; 20:4-6; 21:1-7

Lesson 274 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Onye nēmeri gēketa ihe ndia; M’gābu-kwa-ra ya Chineke, ya onwe-ya gābu-kwa-ra-ram nwa” (Nkpughe 21:7).
Cross References

I Olile-Anya dị Ebube nke Nzukọ Kraist ahụ Ná-emeri emeri

1. Olile-anya nke mbiliten’ọnwụ bụ isi bụrụ kwa olile-anya kachasị mkpà nke Nzukọ ahụ, I Ndi Kọrint 15:19-23; I Ndi Tesalọnaika 4:13-18; Jọn 6:39, 40; 11:24-26; Ọlu Ndi-ozi 24:14-16; I Pita 1:3-5

2. Egosịrị ịdị-ọcha na ebube nke Nzukọ ahụ nime Akwụkwọnsọ, Ndi Efesọs 5:23-32

3. Aga akwụghachị Nzukọ ahụ ụgwọ-ọlụ ya n’ụzọ dị ebube n’ihi ikwesi ntụkwasị-obi ya, Matiu 25:20-23, 31-40; Malakai 3:16, 17

4. Nzukọ ahụ, dịka Nwanyị ana-alụ ọhụụ nke Kraist, ga-eso ná Nri Anyasị nke Nwa-atụrụ ahụ, Nkpughe 19:7-9; Matiu 25:10; Luk 12:37

5. Nzukọ ahụ nke Ná-emeri emeri ga-anọ n’iru Oche-eze Chineke mgbe ụwa a ga-anọ n’óké mkpagbu, Nkpughe 4:10; 5:8-10; 7:9-17; 15:1-4; Aisaia 26:20; Jenesis 7:1, 16

6. Aga-ekpughe Nzukọ Kraist ahụ nke Ná-emeri emeri, n’ebube ya na Mkpughe nke Kraist, Nkpughe 19:11-16; I Ndi Tesalọnaika 4:14

7. Kraist ga-achị n’ụwa, Ya na Nzukọ ahụ nke Ná-emeri-emeri, Nkpughe 2:26; 3:21; 11:15-18; 12:10, 11; 20:4-6

8. Ụdị ebighị-ebi nke Nzukọ Kraist ahụ Ná-emeri emeri ga-abụ nke ana-apụghị ịkọwa ebube ya na ụtọ ya, Nkpughe 2:7, 11, 17; 21:1-7; 22:1-5

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Otù onye ukwu amaara nkeọma ná nzukọ nke ọgbọ gara aga n’ihe banyere ihe-ọmụmụ nke Baịbụl ka onye-isi ya nyere ahụhụ n’ihi na o kwere n’ụfọdụ eziokwu nke onye-isi ya ahụ gọnarịworo. N’ikwu okwu megide onye nsọ a, onye-isi nzukọ a kwusịrị ya ike wee si, “N’ihi nke a anam ekewapụ gị ná Nzukọ ahụ nke Ná-ebú agha.” N’ime omume dịka onye nke Kraist nwere amara, onye nsọ ahụ zaghachịrị sị: “Nke a ka i chere na ị pụrụ ime, ma otù ihe doro-anya, na ị pụghị ikewapụm site ná Nzukọ nke Kraist ahụ Ná-emeri emeri.”

Nzukọ Kraist ahụ nke Na-ebú agha bụ òtù dị ebube. Anyị na ahụ ya dịka òtù ndị mmadụ akpọpụtara ichè, ndị na-agbasi mgbá ọma nke okwukwe ike na ndị na-alụ ọlụ nke Ala-eze ahụ mgbe niile ná-ewepụghị aka. Ma anyị chọpụtara na Nzukọ ahụ nke Ná-emeri emeri dị ebube karịa, n’ihi na ọ bụ Nzukọ ahụ Ná-ebú agha nke meriri emeri -- òtù ahụ dị ebube nke ndị kwere ekwe bụ ndị saworo uwe ha n’Ọbara nke Nwa-atụrụ ahụ, ndị ga na-eso kwa Nwa-atụrụ ahụ ebe ọ bụla Ọ na-eje, rue mgbe ebighị-ebi. Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-achọ ịbụ otù onye nime Nzukọ Kraist ahụ nke Ná-emeri emeri onye ahụ aghaghị ibu ụzọ bụrụ onye òtù nke Nzukọ ahụ nke Ná-ebú agha. Ọ dịghị ihe ọ bụla dị ka

“… iburu mmadụ rue mbara igwe

N’elu àkwà bialịbialị ụtọ,

Ebe ndịọzọ buru agha inweta okpu mmeri,

Wee gafee ọtụtụ osimiri ọbara”

Enwere ọtụtụ ọgụ nke anyị niile ga-alụ ná ndụ a ma ọ bụrụ na anyị ga-eso n’òtù ndị ná-emeri emeri ná ndụ nke na-abịa.

Olile-anya nke Onye Kraist

Mmụo Nsọ gwara anyị site n’ọnụ Pita Onye-ozi, na amụrụ anyị “ọzọ dịka óké ebere Ya si di, ka ayi we nwe olile-anya dị ndụ, site ná ndi nwuru anwu bilite” (I Pita 1:3). Ọ gakwara n’iru ịkọwa ihe nketa anyị dị “nke anapugh imebi, nke anādigh-emeru kwa emeru, nke nādigh atalata kwa, nke edebeworo n’elu-igwe” nye anyị. Pọl Onye-ozi, n’otù aka ahụ, site ná mkpali nke Mmụọ Nsọ, gwara anyị banyere olile-anya nke Onye Kraist wee kwue kwa na mbiliten’ọnwụ nke Kraist na mbiliten’ọnwụ nke ndị-nsọ gaje ibilite bụ ntọ-ala na ndụ nke olile-anya ahụ.

Ọñụ agaghị adị ma ọ bụrụ na mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị. Òfùfè agaghị adị kwa, okwukwe agaghị adị, ihe ịrịba-àmà dị iche iche agaghị adị nke na-eso ijéozi nke Okwu Chineke, nzọpụta site ná mmehie agaghị adị, nsacha site ná mmehie ahụ nke amụrụ mmadụ na ya agaghị adị. Okwukwe anyị ga-abụworị ihe-efù anyị ga-anọwokwarị ná mmehie anyị niile. Ya mere, ka anyị tụgharịa uche banyere eziokwu ahụ na otuto nke mbiliten’ọnwụ na Nwelikọ na nzuzo nke Nzukọ Kraist, n’ihi na ọ bụ n’ọbịbịa nke ùgbò abụọ nke Kraist ka Nzukọ ahụ nke Ná-ebú agha ga-aghọ Nzukọ ahụ nke Ná-emeri emeri.

Mbiliten’Ọnwụ nke Mbụ ahụ

Edewo ọtụtụ akwụkwọ, ekwuwo kwa ọtụtụ okwu Chukwu ana-apụghị ịgụta ọnụ nye, maọbụ megide kwa mbiliten’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ. Ụfọdụ ndị na-eguzogide Kraist, n’ụbọchị ndụ Ya niile mgbe Ọ nọ n’ụwa, kwuru okwu dị ilu megide Ya banyere isiokwu a. Ha na-ekwu nnọọ okwu nleli banyere mbiliten’ọnwụ megide ọbụná Ya Onweya Onye bụ mbiliten’ọnwụ na ndụ! Onye ahụ nke nwere ike ịtọgbọ ndụ Ya na ịnara kwa ya ọzọ mere nke a ka anyị onwe anyị bụrụ kwa ndị ga-esi n’ọnwụ bilie na ịbụ kwa ndị ga-enwe ike iguzo n’iru Oche-eze nke Chineke n’ebube ana-apụghị ịkọwa na nime ọñụ nke karịrị échìchè mmadụ.

Ndị nkwutọ ndị gọnarịrị ike nke Chineke na nke eziokwu nke dị n’Okwu Chineke gọnarị kwara eziokwu a nke dị ebube. Ma eziokwu a nke na-eguzosi ike na-anọgidesi kwa ike -- Nkume ahụ nke olile-anya nke Onye Kraist na-adabere -- na ọ dị mbiliten’ọnwụ nke Onyenweanyị na Onye nzọpụta anyị siri n’ílì bilie wee rigoro n’Elu ịbụ Ọnụ na ekwuru anyị. Ma n’ihi na O meriri ike nke ọnwụ na ílì, anyị onwe anyị kwa n’otù aka ahụ, ga-ebili kwa otù ụbọchị izute Ya nime igwe-ojii niile nke Eluigwe. Ndị ahụ nke buru anyị ụzọ gaa, ndị arụ ha nọkwa nime ílì ha, ka aga-eme ka ha bilie. Ndị ahụ dị ndụ ka aga-ewelikọ site n’ụwa ibinyere ndị nsọ ahụ ndị si n’ọnwụ bilie. Ndịa niile, ha na ndị eziomume ahụ nwụrụ anwụ ndị aga-eme ka ha si n’ọnwụ bilie n’ọgwụgwụ nke Óké Mkpagbu ukwu ahụ, ndịa ga-eso n’òtù Mbiliten’ọnwụ nke Mbụ ahụ nke Kraist bụ mkpụrụ mbụ ya. Enwere ike ịkpọ anyị onweanyị ndị ga-ezute Ya na Nwelikọ ahụ owuwe-ihe-ubi ahụ n’ùjù ya, ma ndị ahụ nke si n’ọnwụ bilie n’ọgwụgwụ nke Mkpagbu ahụ ka aga-akpọ mkpụrụ nke fọdụrụ n’ọwuwe-ihe-ubi ahụ ( I Ndi Kọrint 15:20-23; I Ndi Tesalọnaika 4:13-18).

Chee échìchè ihe ọ gabụ ịbụ otù onye nime ndị ga-eketa òkè ná Mbiliten’ọnwụ nke Mbụ ahụ! Arụ ndịa nke maworo ụdị ọrịa dị iche iche na adịghị ike niile ga-abụ arụ eyịkwasịworo ebube. Ihe mgbu niile ga agwụsị. Erughị eru niile na atụagha niile nke ndụ anyị na-adị ugbu a ga agwụsị. Anyị ga-adị ka Kraist, n’ihi na anyị ga-ahụ Ya otú Ọ dị. Ihe banyere nnụcha a amaliteworị na-aga n’iru nime obi nke ndị nke Chineke. Ha na-ejikere onwe ha maka ụbọchị ahụ mgbe Ọ ga-akpọ ha. Ma n’ụbọchị ahụ nke dị ebube Ọ ga-eme ka ihe niile nke kọrọ nime ndụ anyị zuo òkè mee kwa ka anyị wee dị ka Ya Onweya dị.

Anyị ga-enwe nghọta zuru-òkè. Anyị agaghị enwe ezughị òkè n’ihe banyere oge maọbụ ịdị-anya nke ebe ọ bụla. Anyị agaghị ahụ kwa ọnwụ ọzọ ma-ọlị. Egwù agaghị adị kwa nime obi anyị maọbụ n’uche anyị. Ọnọdụ nke ndụ ebighị-ebi anyị ka aga-àkà àkàrà, ịlụ ọlụ megide mmehie na ọnwụnwa agaghị adị kwa ọzọ. Anyị na Jisọs, Onyenwe anyị, Onyenzọpụta anyị na Onye na-alụ anyị dịka Nwanyị ọhụụ, ga-anọ mgbe niile ebighị-ebi. Ngọzi ndịa niile -- na ọtụtụ ndịọzọ -- ka onye ọ bụla nke na-ejikere onwe ya iketa òkè ná Mbiliten’ọnwụ nke Mbụ ga-enwe.

Anyị nwere ike ịbụ ndị nọ n’ahụhụ n’ebe a. O nwere ike bụrụ na arụ anyị ezughị òkè maọbụ daa ngwụrọ n’ụzọ ọ bụla site n’ọdịda nke mmadụ. O nwere ike bụrụ na anyị nwere adịghị ike ná ndụ anyị nke ana-ahụ anya, ma n’ihi nke a anyị agaghị alụ ọlụ Onyenweanyị otú anyị chọrọ ka anyị lụọ ya. Ma n’ụbọchị Mbiliten’ọnwụ ahụ dị ebube ike ahụ nke mere ka Jisọs si ná ndị nwụrụ anwụ bilie ga-esite kwa n’aka Mmụọ Ya Nke na-ebi nime anyị mee ka arụ anyị nke pụrụ ịnwụ dị ndụ: anyị ga-enwere kwa onwe anyị site n’ihe mgbù niile na adịghị ike niile wee nwee kwa ike ifè Ya òfùfè mgbe niile ebighị-ebi.

Njikere Maka Mmeri Ahụ

Dịka anyị hụrụ n’ihe-ọmụmụ anyị gara aga, banyere Nzukọ Kraist ahụ nke Na-ebú agha, anyị nwere ọtụtụ agha ime mmụọ nke anyị ga-ebu n’ụwa, na kwa njikere dị ukwu dị óké mkpà ma ọ bụrụ na anyị gaje inwe njikere izute Onyenweanyị na Onyenzọpụta anyị. Onye ọ bụla nke nwere olile-anya dị otú a n’ebe Chineke nọ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha dịka Chineke onwe Ya dị kwa ọcha (I Jọn 3:3) Ụdị mmadụ dị otú a ga na-adị ndụ “nke uche zuru-okè, na nke ezi omume na nke isọpuru Chineke n’oge di ugbu a” (Taitọs 2:12). Ọ ga-adị “nsọ buru kwa ihe anāpugh ita uta” onye òtù nke “nzukọ ahu di ebube, nēnwegh ntupọ ma-ọbu iru-ndọli, ma-ọbu ihe ọ bula n’ihe di otù a” (Ndi Efesọs 5:27). Anyị aghaghị inwe njikere ndịa niile mgbe anyị dị ndụ, n’ihi na Nwepụ na nzuzo nke Nzukọ Kraist ga-abụ na mberede mgbe ịdọ aka ná nti na-agaghị adị kwa ọzọ maọbụ ohere nke inwe njikere na mgbe ahụ. (Gụọ Matiu 24:17; 25:1-13). Onye ahụ nke “mere Onwe-ya ihe efu, n’inara udi nke orù, ewe me Ya n’oyiyi nke madu,” na Onye ahụ nke “weda-kwa-ra Onwe-ya, we buru Onye naña nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe” (Ndi Filipai 2:7, 8), mere otú a ka anyị wee bụrụ ndị yiri Ya. Ọ bụrụ na ọ ga-adị mkpà na aga-eme Ya ka Ọ dị ka anyị onwe anyị ka anyị onwe anyị wee dị ka Ya, ọ bụ ihe dị mkpà n’ezie ka anyị wee dị ka Ya n’ebe a, ka anyị wee dị ka Ya mgbe anyị ga-ezute Ya n’elu n’ebe ahụ.

Ụgwọ-ọlụ dị Iche iche Ahụ

Ekwupụtara ya nnọọ n’ọtụtụ ebe dị iche iche n’Akwụkwọnsọ ihe banyere ụgwọ-ọlụ dị iche iche nke ga-adịrị Nzukọ Kraist ahụ nke Ná-emeri emeri mgbe ha ga-eguzo n’iru Oche-eze Chineke. Anyị “ganēnwu ọcha dika onwunwu-ọcha nke mbara-igwe” na “dịka kpakpando rue mgbe ebigh-ebi” (Daniel 12:3). Chineke ga-eme ka anyị nọdụ n’ebe dị elu (Abu Ọma 91:14), anyị na Ọkpara Chineke, n’oche-eze nke ebube na ike. Chineke ga-ewere anyị dịka ihe Ya dị óké ọnụ-ahịa mee kwa ka anyị keta òkè n’ebube ahụ nke ana-apụghị ịkọwa bú nke Eluigwe Ọhụụ na Ụwa Ọhụụ n’oge ahụ nke ana-apụghị ịgụta ọnụ nke mgbe ebighị-ebi. Oge nke ọchịchị nke Otù puku arọ ga-abụ oge nke ijere Onyenweanyị ozi, bụ onye anyị ji ụgwọ dị ukwu nke ịhụn’anya na ijéozi. Anyị ga-abụ ndị-ikpé na mgbe ahụ nwe kwa ike iketa òkè n’urù niile nke oge ahụ dị ebube.

Egwù nke ikpé agaghị atụ anyị. Náánị ndị na-emebi iwu ga-esi n’ọnwụ bilie iguzo n’iru Óké Oche-eze Ọcha nke ikpé ka ewee kpee ha ikpé n’ihi ọlụ ọjọọ ha niile nke ha lụrụ mgbe ha nọ n’ụwa. Ihe ndị ná-emebi iwu ga-ahụta n’ebe Chineke nọ bụ náánị iwe ahụ dị ọkụ, ma agaghị eme ka egwù ahụ nke ana-apụghị ịkọwa rute Nzukọ Kraist ahụ nke Ná-emeri emeri ọbụná n’otù ntabi-anya. N’ebe ha nọ Chineke ha ga-abụ náánị ịhụn’anya nke na-enweghị àtù, ịdị-mma, ebere, na obiọma. Ha ga-ahụ iru Ya hụ kwa nnwupu nke iru Ya. Chineke ahụ nke ịdị-ọcha Ya na ịdị-nsọ Ya ná-enweghị àtù agaghị ele Nzukọ ahụ nke Ná-emeri emeri anya ọjọọ ọ bụla ma-ọlị. Nzukọ Kraist ahụ ga-adịru mgbe ebighị-ebi nke iñurị-ọñụ na ngọzi nke ọ na-adịghị ihe aga-eji tụnyere ya.

Nzukọ ahụ ga-enye aka ikpé ndị mmehie ikpé ọbụná ha onwe ha ga-ekpe kwa ndị mmụọ ozi ikpé. Aga-enye ha ọlụ dịka otú ha si were ohere ha nwere mgbe ha nọ n’ụwa jeere Chineke ozi. Ịdị ndụ ha agaghị abụ nke ịnọ ná-enweghị ọlụ ha ga-alụ maọbụ nke ná-enweghị ebum-n’uche, kama ịdị ndụ ha ga-abụ nke iji ọñụ lụọ ọlụ na ilekọta ọlụ niile nkeọma rue mgbe ebighị-ebi. Ha ga-eri mkpụrụ nke sitere n’osisi nke ndụ ahụ ñụọ kwa mmiri nke ndụ ahụ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ha ga-anọ ná-enweghị mkpụrụ nke sitere n’osisi ahụ na mmiri ahụ dịkarịsịrị mmiri dum n’ọcha. Nsogbu ụfọdụ nke anyị na-enwe n’ihi ihe ndị Ọkachamara mepụtara maka ọdị-mma nke mmadụ agaghị adị. Ihe dị iche iche na-enye ìhè adịghị mkpà n’ebe ahụ n’ihi na Nwa-atụrụ nke Chineke ga-abụ ìhè. Ndị-ori niile, ndị-ugha niile, ndị niile emerụrụ emerụ, ihe niile na-emerụ mmadụ, ike niile na-eme ka egwù dị, maọbụ amaghị ihe niile nke ọdịn’iru ga-eweta agaghị adị kwa ọzọ. Ihe niile ga-enwe izu-ike na ebube rue mgbe niile ebighị-ebi.

Mkpughe Ahụ

N’oge nke óké mkpà nke dị ugbu a Nzukọ Kraist nọ n’oge nke mkpagbu ya. Ọ na-agafe ọnwụnwa na nnwapụta ya dị iche iche. Ọ nọ n’oge nke njikere ya. Ma oge na-abịa mgbe aga-ekpughe ya n’ebube ya niile

Onyenweanyị akpọwo ndị nke Ya ná ndụ nke ịdị nsọ a ka ha wee bụụrụ Ya ndị pụrụ ichè, ndị arọpụtara, na ndị dị óké ọnụ-ahịa. Ma ụwa amaghị ha dịka ndị dị otú a. Ekwensu adịghị akpọ ịdị-mma nke Chineke nke dị nime ndị Ya ihe ọ bụla. Kama nke a, ọ na-eguzogide onye nke Kraist wee na-agbalị ịla ya n’iyì. Dịka ndị-orù nke Kraist si yie Onyenwe ha na Onyenzọpụta ha, otù aka ahụ kwa ka ndị-orù ekwensu si na-eyi nna ha ukwu. Ụwa nke a na àmàrà dị n’iro ma ndị niile bụ enyi nke ụwa bụ nnukwu ndị-iro nke ndị-orù nke Obe ahụ.

Ụwa na-eleda ịdị-mma na àmàrà niile nke Onye Kraist anya. N’ụwa ebe mpako na ibuli onwe-onye elu, na nganga na ihe mmadụ mepụtara bụ ihe eji amara ya na ihe eji asọpụkwara ya, gịnị bụ ọnọdụ nke ana-enye ndị dị nwayọ na ndị dị ume-ala n’obi? Gịnị ka onye ahụ nke na-ahụ ndị-iro ya n’anya ga-atụ anya inweta site n’ụwa nke kpọrọ ezi ihe niile asị? Mmụọ nke oge a na-emegide ogologo ntachị-obi, ndidi, ịdị-mma, obiọma, ịdị-nwayọ, ịhụn’anya, imeru ihe n’ókè, na ịdị-mma nke Chineke. Ụwa adịghị asọpụrụ onye ọ bụla nwere ịdị mma ndịa nime onwe ya maọbụ onye na-ebi ndụ ya dịka iwu niile nke Chineke si dị.

Ma ụbọchị ebube na-abịa n’iru nye ndị niile na-eso ụzọ nke Chineke. Ụbọchị ọchịchịrị ndịa nke mmegbu na nke ibu agha megide mmehie na ajọ ihe niile ga-agabiga na mgbe ná-adịghị anya. Ụbọchị mgbapụta dị nso. Anyị onweanyị ndị dị ndụ n’ọgbọ a nke na-ahụ mmezu nke ihe ịrịbà-àmà bụ nke na-egosi na ọgwụgwụ nke ihe niile dị nso aghaghị iweli isi anyị elu n’ihi na mgbapụta anyị na-abịaru nso.

Onyenweanyị ga-abịa dịka onye-ori n’abalị. Aga-enwe ịkpọ òkù ma ọ bụghị ụwa niile ga-anụ ya. Ntị nke ndị mmehie agaghị anụ ụdà nke opi ike ahụ nke na-akpọ òkù site n’Eluigwe. Ndị mmehie na-anụ náánị ihe ahụ nke nna ha ukwu, bụ Setan, na-achọ ka ha mee, onye na-eme ka ha mee uche ya na isoro ọchịchọ ya niile dịka ọ na agbalị ịkwatu ala-eze nke Eluigwe na iwere Oche-eze nke Kraist nye onwe ya. Náánị Nzukọ Kraist ahụ Ná-ebú agha ga-anụ ịkpọ òkù ahụ. Onye ọ bụla n’otù n’otù nime ndị òtù a, ná-agbanyeghị ma ọ bụ onye ná-amaghị akwụkwọ, ná-agbanyeghị otú nweda n’ala maọbụ ịbụ ogbenye ya si dị, na otú ahụhụ ya sị dị maọbụ otú o si bụrụ onye ana-emegbu emegbu nke ukwuu -- maọbụ na ọ ga-abụworị onye tọgbọworo ihe agha ya site n’ọnwụ -- ọ ga-anụ olu nke Chineke, nwee kwa mmetụta nke ike ahụ karịrị ike niile nke ga ebupu ya site n’ụwa nke iru-ujù wee baa n’ala-eze ebighị-ebi nke ebube na nke óké ọñụ.

Ebube Niile nke Eluigwe

Agwaghị anyị ihe dị ukwu banyere ebube niile nke Eluigwe. Eweliri Pọl Onye-ozi elu baa n’ebube nke Eluigwe n’onwe ya ọ sịkwara na ya hụrụ ọtụtụ ihe nke ya na-enweghị ike ịkọwa maọbụ ikwu ihe ha yiri. Ma Jọn Onye ahụrụ-n’anya enyewo anyị ihe nsepụta nke ihe ụfọdụ ọ hụrụ nke anapụghị ịkọwa ima mma ha -- ebe ihe ụfọdụ ga-eme tutu maọbụ n’iru Oche-eze Chineke n’oge nke Óké Mkpagbu ukwu ahụ nime ụwa a. Ebe ọ bụ na Akwụkwọnsọ enyewo anyị ihe nkọwa zuru-òkè banyere Oche-eze ahụ nke Jọn hụrụ, ịma mma nke ihe niile dị ya gburugburu, na ihe dị iche iche nke ga-eme site na ya na kwa nke ga-eme na ya, anyị pụrụ itụgharị uche n’ihe ndị ahụ n’ebe ọ dị ntà ịma mma niile ebube nke kachasị ebube niile nke anyị ga-ahụ otù ụbọchị wee nọdụ kwa nime ya n’onwe anyị.

Aisaia agwawo anyị na Oche-eze Chineke “di elu nke ebuliwo-kwa-ra elu” (Aisaia 6:1), nke kwukwara n’akụkụ ọzọ nime Akwụkwọnsọ na ọ dị óké ọcha ma na-enwu kwa enwu n’ịma-mma ya. Ọ dị mma ka anyị tinye nkọwa ndịa n’obi anyị tinyekwara ihe nsepụta ahụ nke Jọn Onye ahụrụ-n’anya nyere anyị site ná mkpali nke Mmụọ Nsọ.

Jọn Onye ahụrụ-n’anya agwawo anyị na ya hụrụ Onye nke na-anọkwasị n’Oche-eze ahụ ma anyị matakwara na Onye ahụ abụghị Onye ọzọ ma ọbụghị Chineke ebighị-ebi nime Ebube Atọ Ya. Náánị okwu ole-na-ole nke Jọn nwere ike ịchọpụta iji kọwaa ihe Ịbụ-isi nke Chineke Ukwu a yiri ezughị èzù, ọbụná nime ezughị èzù ha egosiwo anyị ihe karịrị échìchè anyị ịghọta.

“Yiri nkume jasper na sardius” bụ ihe Jọn kwuru banyere ụdị nke Onye ahụ dị ukwu. Site na nke a anyị pụrụ ịhụ na enwere igbu-maramara nke na-esi n’Oche-eze ahụ enwupụta nke ihe aga-eji tụnyere ya bụ ịdị-ọcha nke nkume ndịa dị óké ọnụ-ahịa, nke anụchara nkeọma. Anyị pụrụ iji anya nke ime mmụọ hụ n’ebe ọ dị ntà ihe ahụ nke Jọn hụrụ: Oche-eze “di elu nke ebuliwo-kwa-ra elu,” nke dị ọcha, na-enwu ọcha na-egbu kwa àmụmà dịka Crystal, nke na-acha kwa ka purple, dịka ire-ọkụ, nke na-acha kwa ọbara ọbara, nke na-egbu maramara n’ịma-mma ya nke eke-na-ogwurugwu gbara gburugburu nke ewukwasịrị n’elu osimiri nke eji enyo mee nke dị kwa ka crystal.

Mgbe Moses na ndị-okenye Israel nọ n’elu ugwu ahụ, ha hụrụ “Chineke nke Israel: ma n’okpuru ukwu Ya abua ọ dị ka pavement eji nkume sapphire me, ọ dị kwa ka elu-igwe onwe ya n’idi-ọcha” (Ọpupu 24:10, 11). Ezikiel edewo n’akwụkwọ na ebe ahụ ewukwasịrị Oche-eze nke Chineke, n’ọhụ ahụ nke ọ hụrụ bụ “oyiyi nke mbara igwe … dika igbu maramara crystal di egwù si dị” (Ezikiel 1:22). Osimiri a nke eji enyo mee, nke dịka crystal, bụ nke Jọn hụrụ ná-enweghị obi abụọ yiri igbu maramara nke mbara eluigwe nke ná-enwupu enwupu n’igbu maramara nke ịdị-ọcha ya -- ndị-ozi nke anapụghị ịkọwa ka edoziri maka Oche-eze nke Ibụ-isi Chineke nke na-enweghị ntụpọ na ebube Ya, nke na-enweghị kwa ihe aga-eji tụnyere Ya.

Ebube Niile nke Nzukọ Kraist ahụ Ekpughere

Ma n’ebe a nke ahụrụ na ịdị-ọcha na ịma-mma ya nke zuru òkè karịrị nghọta na nkọwa nke uche maọbụ amam-ihe nke mmadụ -- ná-ekwughị ihe ọ bụla banyere otú o si bụrụ ihe siri ike nye uche anyị ịghọta ihe nkọwa ahụ nke na-ezughị òkè bụ nke enyere anyị -- ha so kwa n’ihe ndị ahụ nke ga-esi na ya pụta bụ nke ga-eme ka ụwa mee mkpọtụ.

N’iru Oche-eze ahụ na kwa gburugburu ya, Jọn hụrụ ihe anọ dị ndụ na ndị-okenye, ndị anyị matara na ha bụ ìgwè ndị agbapụtara site n’abụ nke ha na-abụ na otuto nke ha na-enye. Onye-ozi ahụ amataghị ọnụ-ọgụgụ ha, n’ihi na ọ sịrị na ha bụ puku iri ana-apụghị ịgụta ụzọ puku iri, na puku kwuru puku. Ha na ewelikọ olu ha n’otù n’ịbụ abụ nke otuto banyere mgbapụta na nnapụta nke ha site n’ikpé nke kwesịrị ha n’ihi mmehie ha. Ihe ndịa niile bụ náánị otù akụkụ nke ihe Jọn hụrụ, n’ihi na aga etinye kwara ha otù ndịọzọ nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị ga-esi n’óké mkpagbu ahụ pụta, ndị sakwara uwe ha n’Ọbara nke Nwa-atụrụ ahụ, ha ga-efè kwa Chineke òfùfè n’iru Oche-eze Ya rue mgbe niile ebighị-ebi (Nkpughe 7:9-17).

Chee échìchè, ọbụná otù ntabi-anya ma ọ bụrụ na i nwere ike banyere ebe a nke nwere ebube na ịma mma ebighị-ebi. Were anya ime mmụọ lee ya, ọbụná otù nkeji, ma ọ bụrụ na i nwere ike, ebube niile nke na-echere ezi onye kwere ekwe. Mgbe ahụ were ọnụ-ọgụgụ nkeji ole dị n’ebighị-ebi mụbaa ndị ahụ i chere n’échìchè na ndị ahụ i jiri anya nke ime mmụọ tụlee! Ọ bụ ihe ana-apụghị ịghọta? Ee! Ọ bụ ihe ana-apụghị ịkọwa? Ee!

Ọ bụ ihe ana-apụghị inweta? É-è! N’ikwusi ya ike, na ime ka ọ guzosie ike, É-è! Ọbara nke Jisọs na mgbaghara nke Chineke ezuwo iji jikere onye ọ bụla ka ndị niile ọ na-agụ agụụ ime otú a wee lee ebube ndịa niile anya. Ike nke dị n’Àjà ahụ zuru òkè nke achụrụ ezuwo iji mee ka onye ọ bụla bụrụ onye òtù nime ìgwè ndịa ana-apụghị ịgụta ọnụ nke ndị asachara bụ ndị gana-akpọ isi-ala n’iru Oche-eze ahụ na-atụda kwa okpu-eze ha n’ebe ahụ nke osimiri ahụ dị ọcha dịka crystal dị, ha gana-abụ kwa abụ sị:

“I kwesiri … n’ihi na egburu Gi egbu, I were kwa ọbara-Gi gbatara Chineke madu si n’ebo nile ọ bula na asusu nile ọ bula, na ndi nile ọ bula, na mba nile ọ bula puta” (Nkpughe 5:9)

Chee échìchè banyere ebube ndị ọzọ dị n’iru nke agaje ikpughe nye òtù ndịa nke agbapụtara. Dịka aga-asị na ihe a niile akọwara n’ebe a ezughị, Chineke ga-enye kwa òtù ndịa agbapụtaworo ohere nke ịnọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha dị ọtụtụ ndị egbokwasiworo ezí ákwà-ọcha nke na-enwu enwu, ha ga-eso kwa Onyenwe-ha na Onyenzọpụta nke na-emeri emeri wee bịaghachị n’ụwa n’ọgwụgwụ nke mkpagbu ahụ. (Gụọ Nkpughe 19:11-16; na Jud 14).

Chee kwa échìchè banyere ohere ahụ dị iche iche nke aga-enye onye ọ bụla n’oge Ọchịchị nke otù Puku arọ nke Kraist n’elu ụwa a (Nkpughe 20:4-6). Tinyekwara nke a ọgwụgwụ nke ihe niile ga-eru, mgbe aga-ebibi Eluigwe nke a dị ugbu a ya na ụwa, wee were kwa Eluigwe ọhụụ na ụwa ọhụụ nke mmehie na ihe mmerụ ọ bụla na adịghị ya dochie ya. Mgbe ị tụgharịsịrị uchè n’ihe ndịa, dere duu wee chee nnọọ échèchè nwa oge banyere ha na ihe dị n’etiti ebube niile ndịa, nke kpọbatara ha n’ebe a nwere otuto ebighị-ebi, bụ Nzukọ a dị ebube, nke na-enweghị ntụpọ maọbụ iru ndọlị -- ùsù ndị-agha meriri emeri -- Nzukọ ahụ nke Ná-emeri emeri!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ ihe dị mkpà nke mmadụ ga-eme ka o wee bụrụ otù onye nime Nzukọ ahụ nke Ná-emeri emeri?
  2. Òlee mgbe Nzukọ Kraist ga-agbanwe site na Nzukọ ahụ Ná-ebú agha wee ghọọ Nzukọ ahụ Ná-emeri emeri?
  3. Gịnị bụ “Agha mmeri zuru òkè?
  4. Kwue ụfọdụ nime ụgwọ ọlụ dị iche iche nke aga-enye Nzukọ ahụ
  5. Gịnị ka Jisọs ga-emere Nzukọ ahụ n’Oriri Ọlụlụ nwunye nke Nwa-atụrụ ahụ?
  6. Òlee ọnọdụ ọchịchị nke Nzukọ Kraist ahụ ga-enwe n’àtụmàtụ ikpé nke Otù puku arọ na n’ikpé nke ebighịe-bi ahụ
  7. Òlee mgbe ndị bi n’ụwa ga-ebu ụzọ hụ Nzukọ ahụ Ná-emeri emeri n’ebube ebighị-ebi ya? Kọwaa otú ọ ga-adị.
  8. Gịnị ga-abụ ọnọdụ Nzukọ Kraist ahụ ebighị-ebi?
  9. Mụọọ, buru kwa n’isi Ndi Efesọs 5:23-32.
  10. Mụọọ, buru kwa n’isi ọkpụrụkpụ ihe edere n’akwụkwọ Matiu 25:31-40