Jọn 1:1-14, 29-51; Matiu 3:13-17; Jenesis 1:1, 26

Lesson 262 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ya mere, gānu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ” (Matiu 28:19).
Notes

Jisọs n’Ụdị Mmadụ

Jọn Onye-ozi, onye amatakwara dịka onye na-eso ụzọ ahụ Jisọs hụrụ n’anya, nọ nso Onye nzọpụta ahụ nime arọ atọ na ọkara nke ijéozi Ya. Ha yịkọrọ jee ijè n’okporo ụzọ na-ekpo ọkụ jupụtakwara n’uzuzu; ha nọdụkọrọ ala rie otù nri dị mfé, afọ jukwara ha iri otù ụdị nri ahụ. Ọ ga-abụ na Jọn na Jisọs anọkọwo oge ụfọdụ, dịka Pita na Andru mekwara.

Jisọs biri n’etiti ụmụ maadụ dịka mmadụ. Eleghị anya Ọ lukwara ọlụ ọtụtụ arọ n’ụlọ ịkwá nkà nke Josef, wee mata kwa ihe ọbụ mmadụ inwe ike ọgwụgwụ. O gosịrị ụmụ mmadụ obi-ọmiko, Ọ hụrụ nhuju anya ha, soro kwa ná nhuju anya na ịkwa ákwá ha; Ọ matakwara ọñụ ha wee soro kwa ha ñurịa.

Site N’Eluigwe

Otú ọ dị, Jọn matara na Jisọs dị iche n’ebe ụmụ mmadụ niile ọzọ nọ. Oge ụfọdụ n’omimi nke mkparịta ụka Ya na Pita na Jemes, Jisọs gwara ha maka ndụ nke O biworo tupu Ya abịa n’ụwa. Otù mgbe O kuuru ha rigo n’otù ugwu mee ka ha nwee nleba anya n’ebube nke O nwererị n’Eluigwe. “Iru Ya we nēnwupụ dịka anyanwụ, uwe Ya niile we nācha ucha dika ìhè.” Moses na Elaija, ndị laworo n’Eluigwe ọtụtụ narị arọ gara aga, bịara soro Ya kparịta ụka. Ha matara Jisọs. Ha amatawo Ya rịị n’Eluigwe tupu Ọ bịa ka amụọ Ya na Bethlehem dịka nwa ọhụụ. N’oge ná-adịghị anya Moses na Elaija wee pụọ n’anya; mgbe ahụ ndị-ozi ahụ wee nụ olu Chineke ka Ọ na-agwa ha okwu site n’igwe-oji: “Onye a bu Ọkpara M’huru n’anya, Onye ihe Ya dim ezi nma nurunu okwu-Ya” (Matiu 17:5)

kpara Chineke

Nke ahụ bụ eziokwu nke Jọn ná-apụghị ichefu. Jisọs bụ Ọkpara Chineke; ọ bụ kwa otù isiokwu a ka Jọn kwuwara nkeọma n’ọtụtụ akwụkwọ nke o dere, nke anyị nwere nime Baịbụl.

Jọn dere ọtụtụ ihe iji gosi na Jisọs karịrị mmadụ efu; nwa nwoke nke Meri na Josef. Jọn meghere Oziọma ya n’ikwu sị “Ná mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke di-kwa-ra, Okwu ahu buru kwa Chineke.” “Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, o we biri n’etiti ayi (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa nwoke amuru nanị ya nānata n’aka nna-ya). O juputara n’amara na ezi-okwu” (Jọn 1:1, 14). Okwu ahụ nke ghọrọ “anu-aru bú madu” bụ Jisọs. Ya na Chineke nọ sitere ná mmalite nke oge, n’oge nke òkìkè. “Ekère ihe nile site n’aka-Ya, ekègh kwa otù ihe ọ bụla nke ekèworo ma Ọ nọgh ya” (Jọn 1:3).

N’amaokwu mbụ nke Baịbụl anyị naagụ: “Na mbu Chineke kere eluigwe na uwa.” Jọn na-agwa anyị na Jisọs na Chineke nọ n’oge ahụ, bụrụ kwa Chineke n’Onwe Ya. Pọl Onye-ozi kwusi kwara otù ihe ahụ ike: “Chineke, … gwara ayị okwu n’ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n’aka Ya me uwa nile” (Ndi Hibru 1:1, 2). Mgbe ekère mmadụ, Chineke sịrị “Ka ayi kpua madu n’onyinyo ayi, dika oyiyi-ayi si di” (Jenesis 1:26). Mgbe anyị na-ekwu banyere ihe karịrị otù onye anyi na-eji mkpụrụ okwu anyị na nke anyị.

Mmadụ Atọ Nwere Òkè n’Òkìkè

Mmụọ Nsọ nọ kwa n’oge òkìkè: “Mọ Chineke nērughari kwa n’elu miri” (Jenesis 1:2). Job dekwara: “Mọ nke Chineke emewom, iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka m’di ndu” (Job 33:4); “Esitere n’aka Mọ Ya chọ elu-igwe mma; aka-Ya akpụwo agwọ nāgba ọsọ” (Job 26:13). Mmadụ atọ ndịa nime Ibu-isi nke Chineke nwere òkè ha ketara n’òkìkè.

Anyị apụghị ịghọta ihe ọ pụtara bụ “Atọ nime Otù,” ma ekwuru ihe banyere ha si n’oge rue n’oge nime Akwụkwọnsọ nke na akọwa ọlụ ha, na-ekwu na ha niile n’otù dị ebighị-ebi, nwere ike niile, nwee amam-ihe niile, na-anọ nso mgbe niile. Anyị na-akpọ Atọ ndịa Atọnimeotù dị Nsọ: Chineke Nna, Chineke Ọkpara na Chineke Mmụọ Nsọ.

Mkpà Onye Nke Abụọ Ahụ Dị

Gịnị mere o ji dị mkpà na anyị ga-ekwere n’Atọnimeotù ahụ? Gịnị mere o ji dịbiga mkpà òkè na anyị ga-ekwere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke dị nsọ. Gịnị mere Ọkpara ahụ jiri bịa n’ụwa biri n’etiti mmadụ?

Otù ihe e jiri mara Chineke nkeọma bụ ịdị-nsọ. Chineke dị nsọ agaghị elekwasị mmehie nke mmadụ anya. Iwu Chineke bụ, “Nkpuru-obi ahu nke nēmehie ya onwe-ya gānwu.” Chineke nọ nime Eluigwe Ya, na-achị ụwa niile, nwezue ike niile, mazu kwa ihe niile.

Nime ụwa nke abụrụ ọnụ n’ihi mmehie ka mmadụ tọgbọrọ. Ekère ya maka otuto nke Chineke. Obi tọrọ Chineke ụtọ na mmekọrịta nke Ya na mmadụ n’Ogige Iden tupu mmehie abata wee mebie mmadụ ahụ. Mmehie ahụ nke Adam wetara nkewa n’etiti Chineke na mmadụ. Ọ dịghị ihe ọ bụla mmadụ pụrụ ime iweghachị onwe ya n’iruọma nke Chineke ọzọ. Ihe kwesịrị ya bụ ịnwụ ọnwụ n’ihi mmehie ya, n’ihi na o mebiwo iwu Chineke.

Anyị na amụ nime oge a dị óké mkpà ihe kpatara Kraist jiri bịa n’ụwa. “Otù Chineke di, otù Onye-ogbugbo di kwa n’agbata Chineke na madu, Onye Ya onwe-ya bu madu, bú Kraist Jisus” (I Timọti 2:5). Onye ogbugbo bụ onye na anọ n’agbata, otù onye na ibe ya ná-achọ iweta nkwekọrịta n’etiti mmadụ abụọ ná-adịghị ekwekọrịta.

Mmadụ anọghị n’ọnọdụ ọ bụla nke iguzo n’iru Chineke dị nsọ na nke eziomume. Mmadụ emehiewo ọ ghaghị kwa ịnwụ. Mgbe ahụ Jisọs wee bịa ịnapụta ya. Ọ na-eguzo n’agbata mmadụ nke ikpé mara na Chineke nke eziomume. Ewee mezue ọchịchọ nke Iwu Chineke.

Jisọs, Onye nke abụọ nime Ebube atọ ahụ buuru n’Onwe Ya ikpé ọmụma nke ụwa wee nwụọ n’ọnọdụ onye mmehie. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla ruru ịbụ Onye ogbugbo ahụ, n’ihi na mmadụ nile emehiewo, ha adịghị eru kwa otuto Chineke (Ndi Rom 3:23). Onye ogbugbo dị mmadụ ọ bụla mkpà. Ya mere Ọkpara Chineke, dị nsọ ná-enweghị kwa mmehie, bịara ịbụ Onye ogbugbo n’etiti mmadụ na Chineke.

Apụrụ ịzọpụta anyị náánị site na Jisọs. Jisọs sịrị “Ọ digh onye ọ bula nābiakute Nnam, Ma-ọbugh site na Mu” (Jọn 14:6). Ọ bụrụ na anyị arịọ Jisọs mgbaghara, Ọ ga azọpụta anyị ná mmehie niile anyị.

Ekweghị Ekwe

Ndị Ju nke oge Jisọs nọ kwa n’otù ekweghi ekwe ahụ dịka ọtụtụ ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị nke Kraist n’ụbọchị taa. Ha na-ekwu na ha kweere na Chineke bụ Nna, na ha na-efè kwa Ya òfùfè; ma Jisọs ka ha ná-apụghị ịnabata.

Ndị Ju matara site n’ịgụ Akwụkwọnsọ na otù ụbọchị Chineke gaje izite Mesaia ahụ, na ọ bụ kwa nwa agbọghọ ná-amaghị nwoke ga-amụ Ya. Aisaia Onye amụma, onye ha na-asọpụrụ, edewo “Onye-nwe-ayi onwe-Ya gēnye unu ihe-iriba-ama; Le, nwa-agbọghọ ahụ di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, O gākpọ kwa aha-ya Emmanuel (Aisaia 7:14). Ma otú ọ dị, mgbe nke ahụ mezuru n’ọmụmụ nke Jisọs, ha ekwenyeghị. Ha apụghị ịtụgharị uche na apụrụ ịmụ nwatakịrị ná-enweghị nna nke ụwa, ha wee jụ ikwenye n’obi ha na Ọ bụ Ọkpara Chineke ahụrụ n’anya.

Ndị-Ama Kwere Ekwe

Andru bụ otù onye nime Ndị-ozi mbụ akpọrọ. Mgbe Ọ na-agwa Pita banyere Jisọs, Ọ sịrị, “Ayi ahuwo Mesaia ayi,” nke pụtara Kraist maọbụ Onye ahụ e tere mmanụ, Onye ga-ewetara ụwa nzọpụta. N’ụbọchị ọzọ Filip soro Jisọs, o wee gwa Nataniel, “Ayi ahuwo Onye Moses dere ihe banyere Ya n’akwukwọ Iwu, Onye ndi amuma de-kwa-ra ihe banyere Ya.” Nataniel kweere, wee sị, “Rabai, Gi onwe-gi bu Eze Israel.” Ndịozi ahụ kwererị site ná mmalite na Jisọs bụ Ọkpara Chineke dị nsọ. Jisọs gwara ha mgbe emesịrị, “Nnam onwe-ya nāhu unu n’anya, n’ihi na unu onwe-unu huworom n’anya, kwere kwa na mu onwem siri n’ebe Nnam nọ puta” (Jọn 16:27).

Ngosipụta Nke Ịbụ Chineke Ya

Jisọs gosịrị ịbụ Chineke Ya site n’ihe ịrịba-àmà dị iche iche O mere. Ihe ịrịba-àmà mbụ Ya bụ n’ọlụlụ nwunye nke emere na Kena nke Galili ebe O mere ka mmiri ghọọ mmanya. Site n’ime nke a, O wee “me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ Ya we kwere na Ya” (Jọn 2:11), kwere na Ọ bụ Ọkpara Chineke. O ji ogbe achịcha ise na azụ ntà abụọ zụọ puku mmadụ ise (5,000). O mere ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ.

Jisọs jere ijè n’elu mmiri, nke mmadụ efu ọ bụla ná-apụghị ime. Mgbe ndị na-eso ụzọ Ya nọ nime ụgbọ hụrụ Ya ka Ọ ná-abịakute ha, ha tụrụ egwù, na-echè na ọ bụ mmụọ ka ha hụrụ. Ma Jisọs gwara ha, “Ọ bu Mu; unu atula egwu.” Ngwa ngwa ahụ Jisọs batasịrị n’ụgbọ ha, ha hụta onwe ha n’akụkụ ọzọ nke ọnụ mmiri ahụ. Nke ahụ bụ kwa ihe ịrịba-àmà ọzọ.

Ma ihe ngosi kachasị ukwu nke ịbụ Chineke Ya bụ na O nwere ike ịtọgbọ ndụ Ya welie kwa ya ọzọ; ọ pụrụ ịnwụ dị kwa ndụ ọzọ n’arụ ebube Ya. O kwuru ya otú a: “Kwatunu ulo nsọ a, n’ubọchi atọ M’gēwuli kwa ya elu.” O juru ndị Ju anya wéé kwa ha iwe ịnụ okwu dị otú a, ma ọ bụghị Ụlọ nsọ ha nke ejiri marble wuee, nke bụ kwa ụlọ chọọchị ha ka Ọ na-ekwu okwu ya. “Ọ nēkwu banyere ulo nsọ nke aru Ya” (Jọn 2:21) Mbiliten’ọnwụ Ya agaghị abụ na mmụọ, kama anụ-arụ Ya ga-apụta site n’ílì. Ndị na-eso ụzọ Ya chetara okwu ndịa mgbe emesịrị ka Jisọs si na ndị nwụrụ anwụ bilie.

Ọbụná mmụọ ọjọọ niile gbara ama na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Ha tiri mkpu otù mgbe: “Gịnị ka ayi na Gi nwekọrọ, Gị Ọkpara Chineke? Ì biara ebe a imekpa ayi aru mgbe oge ayi akèrugh?” (Matiu 8:29).

N’ọnụ Ndịàmà Abụọ

Jisọs nwekwara ihe àmà ọzọ ná-egosi na ọ dị nsọ “Edewo kwa n’akwukwọ iwu-unu,” Ọ gwara ndị Farisii, “Na àmà nke madu abua bu ezie” (Jọn 8:17). Ọ bụ kwa otù ihe àmà nye Onwe ya site n’ihe ịrịba-àmà nke O meworo. Onye àmà ọzọ bụ Nna Ya nke zitere Ya. Ugbò atọ ka olu Chineke kwuru okwu site n’Eluigwe, ná-akwagide Nwa Ya. “Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe Ya dim ezi nma.”

N’ọgwụgwụ nke Oziọma Jọn, o dere “Edewo ihe ndia n’akwukwọ, ka unu we kwere na Jisus bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke; ka unu we nwe kwa ndu n’aha-Ya n’ihi na unu kwere” (Jọn 20:31).

Ịlụkọ Ọlụ N’otù

Jisọs soro Nna Ya lụkọọ ọlụ, Ọ sịrị “Mu onwem na Nnam bụ otù (Jọn 10:30); “Mu onwem apugh ime ihe ọ bula n’Onwem”; “Nnam nālu ọlu rue ugbu a, Mu onwem nālu kwa,” Ma O nyere Nna nsọpụrụ. “Nnam ka Mu onwem uku” (Jọn 14:28). Jọn dere ihe karịrị otù narị ihe ngosi dị iche iche ebe Jisọs na-akpọ Chineke Nna Ya.

N’abalị ahụ arara Jisọs nye Ya na Ndị-ozi nwere mkparịta ụka dị ogologo. Ọ gwara ha ọtụtụ ihe banyere mmekọrịta Ya na Nna Ya. Ọ matara na àtụmàtụ niile banyere Mkpuchi mmehie dị n’aka Ya, na “O sikwara n’ebe Chineke nọ puta, na alakuru kwa Chineke.” Ndụ Ya n’ụwa nke dị mkpụmkpụ na abịaru n’ọgwụgwụ, ọbụná oge áwà nke ọgba-aghara nke O jiri n’ihi ya bịa dị nso. Ọ matara na oge ná-adịghị anya ndị-ozi Ya niile ga-agbanarị Ya, ma Ọ sịrị: “Otú ọ di, nání Mu anọgh, n’ihi na Mu na Nnam nọ” (Jọn 16:32).

Ọwụwụmmiri Nke Jisọs

Anyị ekwusiwo ya ike bụ mmekọrịta dị n’etiti Chineke Nna, na Chineke Ọkpara, na-eme ka ọ pụta ìhè na ha dị mmadụ abụọ ndị alụkọ ọlụ ọnụ. Ma siterị na mmalite nke ihe niile ana ahụ ihe ngosi nke Onye nke Atọ nime Atọnimeotù. Mgbe Jọn Onye ọwụmmiri wụsịrị Jisọs mmiri na Jọdan Ọ bara nime mmiri ahụ Jọn wee kwupụta, “Nwa atụrụ Chineke nke n’ebupu mmehie nke uwa.” Mgbe ijéozi nke a gwụsịrị, Mmụọ nke Chineke (Mmụọ Nsọ) n’ebekwasị Ya n’ụdị nduru; anụ kwara olu Chineke site n’Eluigwe ka Ọ na-ekwu “Gi onwe-gi bu Ọkparam M’huru n’anya; ihe-Gi dim ezi nma: (Luk 3:22). Jọn sirị: “Mu onwem ahuwo kwa, gba kwa àmà na Onye a bu Ọkpara Chineke.”

Onye Nkasịobi Ahụ

N’abalị ikpe-azụ nke Jisọs na ndị-ozi Ya nọkọrọ ọnụ n’ụwa, Ọ kọwaara ha ihe bụ ọlụ nke Mmụọ Nsọ, Onye nke Ọ kpọrọ Onye nkasịobi. O kwuru na Ya ga-ala ka Onye nkasịobi ahụ wee bịa duzie ha. Na Jọn 14:26, anyị na-agụ banyere Mmadụ atọ bụ otù isi Chineke: “Onye ahu gēzi unu ihe nile.” Chineke Nna, n’aha Chineke Ọkpara, gaje izite Onye nkasịobi ahụ, Chineke Mmụọ Nsọ, nime ụwa ka Ọ nọnyere ndị nke Ya. Ọ ga agwá ha ihe banyere Jisọs karịa, ma Ọ gaghị ekwu ihe banyere Onweya Ọ ga-enye kwa ha ike ịbụ ndị-àmà nke Jisọs.

N’okwu ikpe-azụ nke Jisọs nime iwu ukwu ahụ O mere ka amata Mmadụ atọ ahụ nime Atọnimeotù, wee zipụ ndị na-eso ụzọ Ya n’ụwa niile ikwusa Oziọma nye mba niile, “nēme ha baptism bà n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ” (Matiu 28:19). Nke a bụ iwu nke Jisọs, anyị ga-emezu kwa dịka iwu Ya si dị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ nzube nke Onye ozi Jọn n’idepụta akwụkwọ ya dị iche iche?
  2. Òlee nnọọ otú Jọn si mata Jisọs?
  3. Gịnị bụ okwu mbụ nke Akwụkwọ Nkpughe?
  4. Mmadụ òle dị n’Ịbụ-isi Chineke? Ha bụ kwa òle ndị?
  5. Gịnị mere Jisọs jiri bịa n’ụwa?
  6. Ọ bụ n’aha onye ka anyị na-ekpere Chineke Nna?
  7. Gwam aha ụfọdụ ndị kwere ekwe agbara àmà na Jisọs dị nsọ?
  8. Gwam ụzọ ụfọdụ Jisọs jiri gosi na Ya bụ Ọkpara Chineke?
  9. Kọwaa ihe mere mgbe awụsịrị Jisọs mmiri
  10. Kwue okwu dị iche iche Jisọs sịrị na agana ewebata n’oge ana-eme ọwụwụmmiri (Matiu 28:19).