Jọn 17:21-23; Ndi Galetia 5:22, 23; Ndi Efesọs 4:17-32; 5:25-27; Ndi Kọlọsi 3:1-15; Taitọs 2:11-14

Lesson 263 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Nāgbasonu udo n’ebe madu nile nọ, ya na idi-nsọ ahụ, nke onye ọ bula agagh-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nwegh ya” (Ndi Hibru 12:14).
Notes

Ndụ Ọhụụ

Nime ihe-ọmụmụ a anyị ná-amụ ihe banyere ndụ nke Onye Kraist. Mgbe azọpụtara mmadụ, ọ na-ebi ndụ ọhụụ. Agbanwewo ndụ ya, ọ dịghị ebi kwa dịka o biworo tupu azọpụta ya. Ọ dịghị ebi dịka ndị ahụ ná-amaghị Chineke. Ọ dịghị eme ihe dịka ndị mmehie na-eme. Onyenweanyị gwara ụmụ Israel “unu gābu-kwa-ram ihe nke akam kari ndi nile” ọ bụrụ na ha erubere Ya isi (Ọpupu 19:5). Jisọs chọrọ ka ndị Ya bụrụ “ndi nke aka Ya, ndi obi ha nānuru ọlu ọma ọku” (Taitọs 2:14).

Onye Kraist anọghị kwa nime mmehie, kama ọ nọ “nime Kraist, … onye ekèrè ọhụ: ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu” (II Ndi Kọrint 5:17). Mgbe azọpụtara mmadụ, agbagharawo mmehie ya si kwa nime ndụ ya wezuga ha. Ka ọ na-ekpe ekpere ji kwa ndụ ya ná-achụ àjà, Onyenweanyị ga-edo ya nsọ. Anyị amụwo ihe banyere odudo nsọ n’Ihe ọmụmụ 232 na 238. Jisọs kpere ekpere banyere ndị na-eso ụzọ Ya, sị: “Were eziokwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu” (Jọn 17:17). Jisọs kpere-ekpere ka ịdị-n’otù dị n’etiti ndị na-eso ụzọ Ya (Jọn 17:21). Odudo nsọ na-eweta ịdị-n’otù na ịbụ otù ahụ zuru òkè. Ndị edoro nsọ na-anọ n’otù obi. Enyewo ihe nkọwa, na nzọpụta dị ka igbutu osisi, ma odudo-nsọ dị ka iropụ ukwu mkpọrọgwụ ya. Ihe nkọwa ọzọ kwa na-egosi na ana akpọgide ndụ nke mmehie -- “madu ochie ahu” n’obe mgbe azọpụtara mmadụ, ma ana-eme ka “madụ ochie ahu” nwụọ mgbe edoro onye ahụ nsọ. N’idegara Ndị Efesọs akwụkwọ, Pọl dụrụ ha ọdụ ka ha tụpụ “madụ ochie ahụ” dịka ibiobi ha na mbụ si dị kama ka ha “yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu” (Ndi Efesọs 4:22-24).

Pọl degaara Ndị Kọlọsi akwụkwọ na site n’iyikwasị “madu ọhu ahu” onye na-eso ụzọ Kraist na-enwe onyinyo nke Chineke Onye kere ya (Ndi Kọlọsi 3:10). Ọ na-atụkwasị uche ya n’ihe dị n’elu karị n’ihe onwunwe nke ụwa (Ndi Kọlọsi 3:2). Ihe nke ime mmụọ n’ebute ụzọ ná ndụ ya tupu ihe nke anụ-arụ na ndụ ya. Udo nke Chineke na-achị achị n’obi ya, ịhụn’anya dị kwa n’obi ya “nke bu ihe nkekọ nke izuòkè” (Ndi Kọlọsi 3:14, 15). Otù ihe ná-egosi na mmadụ bụ onye na-eso ụzọ Jisọs bụ inwe ịhụn’anya n’ebe Ndị Kraist ibe ya nọ, n’ihi na Baịbụl na agwa anyị sị: “Madu nile gēji nka mara na unu bu ndi nēso uzọm, ọ buru na unu enwerita ihu-n’anya n’ebe ibe-unu nọ” (Jọn 13:35).

Ewezuga inwe ịhụn’anya nime obi, aga-enwe kwa amara niile ọzọ dị iche iche nke Ndị Kraist. Ma “nkpuru nke Mọ Nsọ” bụ kwa “ọñụ, udo, ogologo-ntachi-obi, obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi, idi nwayọ, imeru-ihe-n’ókè,” ha na ịhụn’anya (Ndi Galetia 5:22, 23). Apụrụ ịmata Onye Kraist site ná ndụ ọ na-ebi. “Unu gēsite na nkpuru ha mazu ha” (Gụa Matiu 7:15-20). Ọ bụrụ na onye ọ bụla, ma ọ bụ nwata maọbụ okenye adịghị ekwu eziokwu, mata na azọpụtaghị onye ahụ n’eziokwu, n’ihi na Baịbụl na-akụzi: “Unu ekwula okwu-ugha gwarita ibe-unu; ebe unu yipuchasiworo madu ochie ahu, ya na omume ya nile” (Ndi Kọlọsi 3:9). Ọ bụrụ na otù onye nime ndị gị na ha na-egwuriegwú sị na azọpụtawo ya, ma iwe na-éwé ya ọsọsọ mgbe ihe ná-aghaghị dịka o si chọọ, maọbụ na ọ na-ekwu okwu ọjọọ nke rukwara unyi, mara na ọ dịghị kwa nzọpụta o nwere, n’ihi na Okwu Chineke na-ekwupụta sị: “Ma ugbu a, unu onwe-unu, tupu-kwa-nu ihe ndia nile; bú iwe, ọnuma, obi ọjọ, nkwulu, ikwu okwu ihere nēsi n’ọnu unu puta” (Ndi Kọlọsi 3:8).

Jisọs, Ihe nlere anya Anyị

Mgbe Onyenweanyị ná-akpọ ụmụ mmadụ òkù ka ha soro Ya, Ọ na-akpọ ha ka ha “so ije-ukwu Ya nile.” Ọ na-akpọ ha ka ha bie ndụ yiri nke Kraist (Ndị Kraist) na-ebi. Kraist na-enye anyị ihe nlere anya nke ibi ndụ ziri ezi. Anyị na-agụ nime Baịbụl, “N’ihi na akpọrọ unu ime nke a. n’ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n’ihi unu, nārapuru unu ihe ilereanya, ka unu we so ijé-ukwu-Ya nile” (I Pita 2:21).

Mgbe Kraist biri n’ụwa a, anwara Ya n’ihe niile n’otù ụzọ ahụ ana-anwa anyị, ma O “mehiegh” (Ndi Hibru 4:15). Ihe ilere anya O nyere banyere ibi ndụ Onye Kraist bụ ndụ na-enweghị mmehie. Ọ bụrụ na anyi soro ijé ụkwụ Ya niile, anyi ga-ebi ndụ dịka Jisọs chọrọ ka anyi bie.

Ike Nchébe

N’ihi na Jisọs meriri ọnwụnwa, Ọ pụrụ inyere anyị aka mgbe ana-anwa anyị ka anyị merie (Ndi Hibru 2:18). Onyenweanyị ekwewo nkwà ime “ụzọ mgbapụ” site n’ọnwụnwa ka anyị wee nwee ike iguzogide mmehie (I Ndi Kọrint 10:13). Anyị pụrụ isoro ihe ilere anya Ya nke ndụ ná-enweghị mmehie site n’ikpe ekpere na ilegide Onyenweanyị anya bụ Onye pụrụ idebe anyị ka anyị ghara ịsụ ngọngọ (Jud 20-24). Pita sịrị na ndị ahụ azọpụtara bụ ndị “ewere ike nke Chineke nēche nche site n’okwukwe rue nzọpụta” (I Pita 1:5).

Ana-echebe Onye Kraist site n’ike na amara nke Chineke, n’ihi na mmadụ apụghị ichebe onwe ya. Mgbe ekwensu tiri Pọl ihe-otiti, Pọl kpere ekpere. Onyenweanyị zaghachiri ya sị “Amaram ezuworo gi” (II Ndi Kọrint 12:8, 9). Mgbe ekwensu na-ekwu nwayọ nwayọ ná ntị gị, na-agbalị iduba gị ná mmehie, maọbụ mgbe mmadụ na-achọ ka ị mee ihe ọjọọ, kpee ekpere rịo kwa Chineke ka O nyere gị aka ime ihe dị utọ n’iru Ya. Ana-agba anyi ume “were nkwuwa okwu biarue oche eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n’oge nkpà” (Ndi Hibru 4:16). Nke ahụ pụtara na anyị pụrụ ikpe ekpere rịọ inye-aka Chineke, Ọ ga-edebe kwa anyị ka anyị ghara imehie mgbe anyị na erubeisi na-enwe kwa okwukwe na Ya.

Ihe Achọrọ

Náánị ma anyị soro ihe ilere anya nke ndụ Jisọs ibi ndụ nke ịsọpụrụ Chineke, ma ọbụghị otú ahụ anyị abụghị Ndị Kraist. Jisọs sịrị: “Onye ọ bula nke nēbugh obe nke aka ya, sokwam n’azu, ọ pugh ibu onye nēso uzọm” (Luk 14:27). Ụfọdụ mmadụ nwere ike sị na ọbụ ihe anapụghị ime bụ ibi ndụ nke ịsọpụrụ Chineke. Ndịọzọ nwere ike sị na ọ dị mma ka mmadụ ole-na-ole bie ndụ nke mmehie na-adịghị -- kama na ọ dịghị mkpà ka Ndị Kraist niile bie ndụ dị nsọ. Ma dịka anyị na-amụ Okwu Chineke, anyị na-achọpụta na ndị niile kwupụtara na ha hụrụ Kraist n’anya biri ndụ dị ọcha, nke ziri ezi na nke ịsọpụrụ Chineke, ma ọbụghị otú ahụ ha abụghị Ndị Kraist. Amara na ume nke dị Ndị Kraist mkpà ime ka ha bie ụdị ndụ ahụ ka ana-enye, Chineke chọkwara ka ha bie ndụ ahụ. Anyị apụghị ịbụ ndị na-eso ụzọ Jisọs ọ bụrụ na anyị esoghị Jisọs. Ọ bụghị ihe diri Onye Kraist ịrọrọ ma ọ ga ebi ndụ eziomume ma ọ gaghị ebi. Mmadụ na-arọrọ ma ọ ga-abụ Onye Kraist maọbụ onye mmehie. Ma Onyenweanyị edebewo ụkpụrụ nke ibi ndụ Onye Kraist, Ọ na-enye kwa anyị ike ịnọgide nime ha. Anyị aghaghị irubeisi n’ụkpụrụ niile a ma ọ bụrụ na anyị ga-abụ Ndị Kraist.

Mmhie Kpatara Nkewapụ

Ọ bụrụ na mmadụ emebie iwu Chineke, ọ na-ahụ ahụhụ. Mgbe Adam, nwoke mbụ nupụrụisi n’otù iwu ahụ Chineke nyere, Adam mehiere wee nwụa nime mmụọ. Adam nwere egwù nke amam-ikpé wee zoo onwe ya mgbe ọ nụrụ “olu JEHOVA. bú Chineke, ka Ọ nējeghari n’ubi ahu agbara ogige mgbe ifufe nēfe n’ubọchi” (Jenesis 3:8). Mmehie ya ekewapụwo ya n’ebe Chineke nọ. Adam apụghị kwa ịnọgide n’Ubi iden ahụ Agbara ogige “ilụ ọlụ ya na idebe ya”, na iso Onyenweanyị ná-ejegharị ná-ekwukọrịta kwa okwu.

Nrubeisi Na Ngọzi Dị Iche iche

Mgbe emesịrị, Chineke nyere Ụmụ Israel Iwu site n’aka onye-ndu ha bụ Moses. Agwara ha ihe ha ga-eme na ihe ha na agaghị eme. Ọ bụrụ na ụmụ Israel chọrọ inwe nchebe, inye-aka na nkwà dị iche iche nke Chineke, ihe ha ga-eme bụ irubere Ya isi. Mgbe ha rubere isi, Chineke na-anọnyere ha, ha na-enwe kwa ọgan’iru. Mgbe ha nupụrụisi, Chineke na-arapụ ha, ha na-ahụjụ kwa anya n’ihi mmehie ha. Nime Testament Oche anyi na-agụ banyere ngọzi dị iche iche nke Ụmụ Israel nwetara mgbe ha rubeere Chineke isi, anyị na-agụ kwa banyere ahụhụ na iru-uju na-abịakwasị ha mgbe Chineke rapụrụ ha n’ihi nnupụ-isi ha.

Na Testament Ọhụụ Jisọs nyere anyị ụkpụrụ nke ibi obi Onye Kraist site n’ihe nlere anya nke Ya, site n’òzìzí Ya, na site n’òzìzí dị iche iche sitere na mkpali nke Mmụọ Nsọ nke ndị na-eso ụzọ Ya ziri. Anyị nwekwara ihe nlere anya nke ibi ndụ eziomume na ndụ nke ezi Ndị Kraist taa. Ndị nwapụtaworo Okwu Chineke achọputawo na ha pụrụ, na-ebi kwa ndụ site n’ike Chineke dịka àtụmàtụ Ya si dị. Anyị pụrụ ibi ndụ dịka Kraist site n’amara Chineke. Anyị aghaghị ibi ndụ otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ Ndị Kraist. Náánị Ndị Kraist ga-abà n’Elugwe ịhụ Onyenweanyị na ibinyere Ya.

Ịdịn’otù

Jisọs kpere ekpere ka ndị na-eso ụzọ Ya. dị n’otù nime nkekọ nke ịhụn’anya. Ekekọtara Ndị Kraist n’otù, jikọta kwa ha na Chineke na Ọkpara Ya dịka otù arụ. Jisọs sịrị: “Mu onwem na Nnam bu otù” (Jọn 10:30). Ọ bụ àtụmàtụ Onyenweanyị na uche Ya ka ndị na-eso ụzọ Ya -- Ndị Kraist -- na Chineke na Ọkpara Ya bụrụ otù (Jọn 17:21). Ha aghaghị inwe otù nzube na nchekwube, otù ọchịchọ na ekpere, otù mmetụta n’ebe mmehie dị, na otù ịhụn’anya nye ezi ihe.

Ịdịn’otù a bụ ihe àmà -- “Ka uwa we kwere” na “ka uwa wee mara.” Ọ bụrụ na ibi ndụ nke Onye Kraist adịghị iche site na nke onye ọ bụla ọzọ, òlee otú ụwa ga-esi nwee ike kwupụta na Jisọs bi nime ya, na Kraist nwekwara ike ịnapụta site ná mmehie?

Onye na-adịghị ebi ndụ ziri ezi ya na Chineke na Ọkpara Ya apụghị ịbụ otù. “Ihe-árú nke JEHOVA, bú Chineke gi, ka ọ bu, bu … onye ọ bula nēme ajọ omume” (Deuteronomi 25:16). “Ihe ọjọ agagh-anọ dika ọbia n’ebe I nọ (Abù Ọma 5:4). Ọ bụrụ na mmehie na nnupụisi abànye na ndụ Onye Kraist, ọ gaghị enwe kwa ọñụ nke ịdịn’otù ahụ nke kekọtara ya na Chineke na Ọkpara Ya, bụ Jisọs. Onyenweanyị enweghị obiụtọ n’ebe mmehie dị, mmehie na-ekewapụ kwa mmadụ n’ebe Chineke nọ (Aisaia 59:2). Mgbe mmadụ ọ bụla na-eme mmehie ọ pụghị ịnọgide na mmekọrịta nke ya na Onyenweanyị, n’ihi na “onye nēme mmehie si n’ekwensu puta” ( I Jọn 3:8).

Ná Ndụ Dị Ugbu a

Jisọs “rara Onwe-ya nye” wụsị kwa Ọbara Ya n’ihi ndị Ya -- Nzukọ Ya (Ndi Efesọs 5:25). Jisọs nwere “nzukọ dị ebube, nēnwegh ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n’ihe di otú a; … di nsọ buru kwa ihe anāpugh ita uta” (Ndi Efesọs 5:27). Nzukọ pụrụ ịdị nsọ náánị mgbe ndị nọ nime ya dị nsọ. Ike dị n’Ọbara Jisọs ime ka mmadụ dị ọcha dịkwa nsọ, na idebe onye ahụ nime ịdị ọcha na ịdị nsọ ahụ. Job, onye nke Chineke, sịrị: “Ma onye ezi omume gējisi ike n’iso uzọ ya, onye nke aka ya abua di ọcha ganāga n’iru n’iru n’inwe ume” (Job 17:9).

Baịbụl na-akuzi na anyị aghaghị ibi ndụ dị nsọ n’ebe a ọ bụrụ na anyị na-ele anya ịbụ otù akụkụ nke Nzukọ Kraist ma ọ bụrụ kwa na anyị na-ele anya ịga n’Eluigwe. “Amara nke Chineke, nēwetara madụ nile nzọputa” ná-akuzi kwa ra anyị ka “ayi we ju asọpugh Chineke na agu ihe ọjọ di n’uwa, we di ndu uche zuru okè na nke ezi omume na nke isọpuru-Chineke n’oge di ugbu a” (Taitọs 2:11, 12).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị na-eme ka mmadụ bie ndụ ọhụụ nke pụkwara iche mgbe azọpụtara ya?
  2. Gịnị bụ “mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ?
  3. Ònye bụ ihe ilere anya nke ndụ Onye Kraist nye anyị?
  4. Òlee otú “Onye Kraist” ga-esi gbaa àmà banyere Kraist nye ụwa?
  5. Òlee ihe okwu ahụ bụ “Onye Kraist” pụtara?
  6. Òlee onye amara Ya zuru òkè inyere anyị aka n’oge mkpà?
  7. Gịnị ka ịbụ “otù” anyị na Chineke Nna na Jisọs, bụ Ọkpara Ya pụtara?
  8. Kwusịa amaokwu nke a: “Onye nēme mmehie si …”
  9. Òlee ụdị ndị Jisọs nwere na nzukọ Ya?
  10. Òlee mgbe na ebe Ndị Kraist na-ebi ndụ dị ọcha dị kwa nsọ?