Jenesis 14:18-20; 28:20-22; Leviticọs 27:30-32; Deuteronomi 16:16, 17; Malakai 3:8-10; Matiu 23:23; Luk 18:12; 21:1-4; I Ndi Kọrint 16:2

Lesson 264 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Chineke huru onye were obi-utọ nēnye n’anya” (II Ndi Kọrint 9:7).
Notes

Abraham Onye kwesịrị ntụkwasịobi

Otù ugbò ọzọ, ihe-ọmụmụ anyị jikọtara otù ihe mere na ndụ Abraham onye anakpọ Nna nke Okwukwe, enyi nke Chineke, na nna nke ìgwè mba. Amaara Abraham n’ihi okwukwe na nrubeisi ya nye Chineke.

N’oge ochie, ihe dịka mmalite nke oge, ọtụtụ agha dị, dịka anyị nwere ha taa. Otù ụbọchị Abram (bụ aha eji mara ya n’oge ahụ) nụrụ na nwa nwanne ya nwoke, Lot, ya na ézìnaụlọ ya na ihe niile o nwere, ka ndị-agha ndị-iro dọrọ n’agha. N’otù oge ahụ Abram nyere ndị orù ya dị narị atọ na iri na asatọ (318) azụrụ azụ ngwa agha ha wee chuso ndị-iro ahụ. O nwere oke mmeri, wee napụta nwa nwanne ya nwoke Lot na ézìnaụlọ ya, chịlata kwa ihe niile nke ha kwaraworo.

Mgbe Abram na-alata site n’agha ahụ Melkizedek, Eze Selem zutere ya wee kele ya. Onye a bụ ihe-omimi (anapụghị ịghọta) nime Akwụkwọnsọ bụ onye amatara dịka Eze nke Eziomume, eze nke udo; ekwukwara na onye a “enwegh nna, enwegh nne, enwegh akukọ osuso-ọmumu, enwegh nmalite ubọchi ma-ọbu ọgwugwu ndu, ma emewo ya ka o yie Ọkpara Chineke” (Ndi Hibru 7:2, 3). Melkizedek gọziri Abram, nke na-egosi na ọ dị ukwu ọbụná karị Abram (Ndi Hibru 7:6, 7). Ọ bụrụ na onye a pụtara ìhè na Testament Ochie abụghị Kraist n’Onwe Ya, ọ bụ onye yiri Kraist. Igosi obi ekele ya, Abraham nyere Melkizedek otù ụzọ n’ụzọ iri n’ihe niile. Nke a bụ mbụ ekwuru banyere otù ụzọ n’ụzọ iri nime Baịbụl.

Nwa nwa Nke Abraham

Mgbe ihe dịka narị arọ na iri ise (150) gasịrị, ka Jekob, nwanwa Abraham, na-agbanarị nwanne ya nwoke, dinara ala dọba nkume n’okpuru isi ya ná-ararụ ụra. Ka ọ na-arọ nrọ, ọ hụrụ ubube na-eguzo site n’ala rue eluigwe nke ndị Mmụọ ozi Chineke na-arigo na-arịda na ya. N’elu ubube ahụ ka Jehova bụ Chineke na-eguzo. Jekob tetara ọ sị, “N’ezie JEHOVA nọ n’ebe a; ma mu onwem amagh ya … nke a bu kwa ọnu-uzọ-ama elu-igwe” (Jenesis 28:16, 17). Emesịa ọ wụsa mmanụ n’elu nkume ahụ ọ rarụrụ ụra n’elu ya. “Jekob we kwe nkwà si, ọ buru na Chineke gānọyerem debem n’uzọ a nke mu onwem nēje, nyem nri ka m’we rie, na uwe ka n’we yie, m’we lata n’ulo nnam n’udo, JEHOVA gābu-kwa-ram Chineke … ihe nile I gēnyem, aghaghkwam inye Gi otù uzọ na n’uzọ iri” (Jenesis 28:20-22). Eleghị anya ọ nụworị ndumọdụ banyere otù ụzọ n’ụzọ iri site n’ọnụ nna ya, Aisak maọbụ nna ya ochie bú Abraham.

Mgbe oge na-aga, n’ime ọchịchị Jehoash, Jehoiada bụ onye nchụàjà, weere otù igbe rapuo oghere n’okwu ya, dọba ya n’akụkụ ebe ịchụàjà, n’aka nri nke ebe mbata n’ụlọ ụkọ (II Ndi Eze 12:9). Ego niile anatara bụ ihe ejiri mezie Ụlọ ukwu Chineke.

Àtụmàtụ Chineke Banyere Ego

Chineke tụrụ àtụmàtụ inye otù ụzọ n’ụzọ iri niile, ma ọ bụghị n’ihi na mkpà ihe ọ bụla mmadụ nwere na-akpà Ya, kama o doro ya ka ọ bụrụ ụzọ esi ná-akwagide ọlụ Ya. Chineke nwe anụ niile dị n’elu puku ugwu ntà niile, ọzọ ọla-ọcha bụ kwa nke Ya. Ndị Israel bụ ndị na-akọ ala ka achọrọ ka ha nyeghachị Chineke ihe ahụ nke bụ nke Ya. Ọ bụghị nke ha; ọ bụ nke Chineke n’ihi na Ọ bụ Ya nyere ha ihe niile ha nwere. Ọ bụ ala Chineke wepụtara mkpụrụ ahụ; ọ bụ kwa mmiri òzùzò nke Chineke na-eme ka ha na-eto; ọ bụ kwa Chineke mere ka ọ dịrị ha mfé inyeghchị Ya ókè nke nnweta ha nke O kenyere Onwe ya, nke ahụ bụ otù ụzọ n’ụzọ iri.

“Otù uzọ kwa n’uzọ iri nke igwè ewu

na aturu nile, ihe ọ bụla nke nāgabiga n’okpuru

nkpa-n’aka, otù uzọ n’uzọ iri gābu ihe nsọ diri

JEHOVA” (Levitikọs 27:32).

Nke a bụ usoro ha ji ná-ewepụ otù ụzọ n’ụzọ iri nke ìgwè ehi: anụ niile ka ana-eme ka ha gabiga otù otù site n’ụzọ dị warara ebe otù nwoke gana-aka nke iri akara n’azụ. Ànyị na-elezi anya taa iwezuga otù ụzọ n’ụzọ iri nke ihe-ụma niile nke ihe nnweta anyi nye Chineke, maọbụ nke ehi, ihe ìgwè, ihe nnweta maọbụ ego?

Mkpà Irube-isi Dị

Ụfọdụ mmadụ na-echè na inye otù ụzọ n’ụzọ iri bụ ihe emere náánị n’oge Agbà Oche, ma anyị hụkwara ihe banyere ya n’Agbà Ọhụụ. Okwu nke Jisọs nye ndị ode-akwụkwọ na ndị Farisii bụ na ha aghaghị inye otù ụzọ n’ụzọ iri, ya na ilezi anya idebe ihe ka arọ bụ ikpé, ebere, na okwukwe (Matiu 23:23). Iwu niile nke Jisọs dị mkpà; ma otú ọ dị ụfọdụ ka ukwu maọbụ árọ karịa ndị ọzọ. Banyere ụfọdụ iwu ka Ọ sịrị, “Ma ọ di nkpa ka unu me ihe ndia,” ma ka ha ghara kwa ịrapụ ndịọzọ.

Ntọ-ala nke otù ụzọ n’ụzọ iri dabere n’otù ụzọ n’ime ụzọ iri nke ihe nweta nke mmadụ maọbụ nke ụgwọ ọlụ, maọbụ nke urù niile enwetara n’iji ego achọ ego, maọbụ ihe ọ bụla. Aga-enye otù ụzọ n’ụzọ iri na ewepụghị ihe ejiri lekọta èzínaụlọ. Ọbụná ụmụntakịrị aghaghị ịmụta inye Chineke kobo iri n’ime otù naira ha nwere.

O nwebeghị onye ọ bụla nwere ihe ụsụ mgbe o ji obi ya niile jeere Chineke ozi maọbụ nwe uru mgbe o ji obi abụọ na-ejere Ya ozi. Ana-agọzi ndị nke Chineke mgbe niile ha na-akwụ otù ụzọ n’ụzọ iri. “Ọ bụ iwu ka ọ bụghị, na mụ ga-enye otù ụzọ n’ụzọ iri?” bụ otù ajụjụ pụrụ ịdapụta. Okwu Chineke nyere anyị ọzịzá:

“`Madu, ọ gāpunara Chineke ihe? ma unu nāpunaram ihe. Ma unu nāsi, Nime gini ka ayi punaraworo Gi ihe? N’otù uzọ n’uzọ iri nile àjà-nbuli nile.

“Ọbubu-ọnu ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe, bu mba nka nile.

“Webatanu otù uzọ n’uzọ iri nile n’ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n’ulom, biko, nwanum na nka, ka JEHOVA nke usu nile, nke ndi-agha siri, ma M’gaghemeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mgbe ọnọdụ agagh-ezu inagide ya” (Malakai 3:8-10).

Ya mere anyị na-ahụ onye ọ bụla nke ná-adịghị enye otù ụzọ n’ụzọ iri ya niile bụ onye ori maọbụ onye na-apụnara mmadụ ihe. Ọ bụ kwa ihe ọjọọ izu Chineke ori n’onyinye afọ òfùfò niile, ma bụrụ ihe ọjọọ karịsịa n’izu Ya ori n’otù ụzọ n’ụzọ iri niile. Ọ bụghị nke gị maọbụ nkem -- “ihe JEHOVA nwere ka ọ bu” (Levitikọs 27:30-32). Ọ bụrụ na ịchọrọ ụzọ ka mfé inweta ngọzi nke sitere n’Elu webata “otù ụzọ n’ụzọ iri niile n’ulo àkù nkem.” Eleghị anya ihe ị na-adịghị enye Chineke abụghị náánị otù ụzọ n’ụzọ iri nke ego, ma otù ụzọ n’ụzọ iri nke ịhụn’anya, ijéozi nke sitere gị n’obi, iji-obi-chụa-àjà maọbụ nke talent dị iche iche. Ugbu a gụkọọ ndụ gị; ọ bụrụ na ngọzi niile nke Chineke adịghị ezosa gị ọ pụrụ ịbụ na ị na-ezu Chineke ori n’otù ụzọ maọbụ nke ọzọ. Ọ bụrụ na anyị na-ele anya ka Chineke meghere anyị ụlọ àkù Ya, anyị aghaghị imeghepụ nke anyị.

N’ijéozi Nke Onyenweanyị

N’ihe-ọmụmụ niile gara aga anyị amụwo banyere ndị Livai ndị edebere iche maka ozi pụrụ iche nke Chineke, dịka inyere ndị nchụàjà aka, ibugharị Ụlọ-ikwu, na iso n’egwú na ịbụ abù (I Ihe Emere 25:1; 15:16-22; II Ihe Emere 5:13). Dịka ndịozi kwesịrị ntụkwasị-obi maọbụ dịka ndị ọzụzụ-atụrụ nke taa na-enye oge ha n’ijere ndị nsọ nke Chineke ozi. Ndịa na-enye oge ha niile n’ọlụ Chineke. Ọzọ, dịka ọ dị n’oge ahụ, taa, ndị ahụ kwesị kwara ka nzukọ lekọta ha anya. Pọl Onye-ozi sịrị, “Ùnu amatagh na ndi nālu ọlu n’ulo uku Chineke nēri ihe si n’ulo uku Chineke puta? … Ọbụná otú a ka Onyenwe anyị kara àkà ka ndi nēkwusa ozi ọma Ya si n’ozi ọma ahụ di ndu” (I Ndi Kọrint 9:13, 14). Ekele ra añaa ka anyi na-enwe maka ezi ndịozi gọnarịrị onwe ha ọtụtụ ihe n’ihi ka ha wee lekọta ụmụ Chineke! Agwara anyi ka anyị “were kwa ịhụn’anya sọpụrụ ha gabiga ókè nke uku ri nne n’ihi ọlu-ha” (I Ndi Tesalọnaika 5:12, 13).

Otù iwu nke mkwà dị ka ana ahụ n’Ilu 3:9, 10 “Sọpuru JEHOVA site n’aku-gi, site kwa na nkpuru mbu nke ihe-omume-gi nile: ọba-gi nile gējuputa kwa n’ihe nriju-afọ, ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu.” Ọ bụrụ na anyị erubeisi n’iwu nke inye otù ụzọ n’ụzọ iri a, ọ bụghị náánị na anyị ga-anata ngọzi dị iche iche n’ụba kama anyị nwekwara ike na-akpadoro onwe anyị akụ n’Eluigwe. Otù ụzọ n’ụzọ iri niile bụ ihe eji elekọta ụlọ Chineke na iji lụọ ọlụ nke Onyenweanyị nke anyị na-enye ga enye-aka izipụ akwụkwọ mgbasa ozi ma rue ebe niile ụwa sọtụrụ; ọ ga enyekwara ndị na ezisa Oziọma nọ n’ala dị anya aka, kwagide kwa ịgbasa Oziọma na radio na ime ihe ngosipụta nke Oziọma: eji kwa ya elekọta na imezi ụgbọ-ala niile nke Oziọma na ugbọ-mmiri niile eji ezisa Oziọma n’elu mmiri. Ọ bụrụ na anyị ejikọta okwukwe, ekpere na ijiobichụọàjà ọnụ ha na inye onyinye, anyị ga-enye aka ritere Kraist ọtụtụ mkpụrụobi dị óké ọnụ-ahịa, ọzọ ụgwọ ọlụ anyị ga-adị ukwu.

Ndị niile na-ebi ndụ nke ịnọ Chineke nsọ adịghị arụ eziokwu a ụka maọbụ ihe ọ bụla ọzọ ana-ezi site n’Akwụkwọnsọ. Ihe ịrụ-ụka banyere nke a na-esikarị n’etiti ndị ana-amụghị ọhụụ pụta. Chineke adịghị arapụ onye chọrọ ịma eziokwu n’ọchịchịrị.

Akọrọ akụkọ banyere ihe mere otù nwaokorọbịa nke ihe nnweta ya dị ntà. Onyenweanyị mere ka eziokwu nke otù ụzọ n’ụzọ iri doo ya anya, o wee sị, “Onyenwe anyị, M’ga-eme ya.” Otù onye sị ya: “Ị pụghị imezu ya. Ọ bụ omen’ala ochie nke ndị Ju, ọ dịkwaraghị Ndị Kraist taa.” Ma nwaokorọbịa ahụ zara ya sị, “Echèrèm na ọ bụ iwu nke Chineke, mụ onwem ga-erubere Ya isi.” O wee rubere Chineke isi, Chineke wee gọzie ya ma sọpụkwara ya n’ihi ya.

Ọlụ Nke Chineke

Chineke agọziwo ọlụ nke Apostolic Faith site n’usoro nke inye otù ụzọ n’ụzọ iri niile na onyinye afọ òfùfò niile, ná-enweghị mgbe ọ bụla anyị bugharịrị efere onyinye maọbụ envelope nke ịrịọ ego. N’arụ mgbidi dị na ndịda nke ụlọ ụkọ ka aga ahụ igbe ntà ebe ụmụ mmadụ pụrụ itinye otù ụzọ n’ụzọ iri na onyinye afọ òfùfò niile. Náánị Chineke na onye ahụ na-enye maara ego ole etinyere n’igbe ahụ. Ndị Kraist niile amụrụ ọhụụ n’ezie ndị nwere ìhè nke Oziọma eziokwu ahụ na-erubere àtụmàtụ ya niile isi na-anata kwa ngọzi nke ekwere na nkwà. “Ọ buru na unu matara ihe ndia, ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha” (Jọn 13:17).

Ị na-asị, “Apughịm inye otù ụzọ n’ụzọ iri nile? Eziokwu nke okwu ahụ bụ na ọ gaghị abara gị urù ịnupụ isi n’iwu nile Chineke. “Nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta nke n’ejubiga kwa ókè …” (Luk 6:38).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye bụ nwoke mbụ akpọtụrụ aha n’Akwụkwọnsọ banyere inye otù ụzọ n’ụzọ iri niile?
  2. Gịnị ka ekwuru banyere ndị na-ezu Chineke ori?
  3. Kọọ akụkọ banyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ onye tinyere ego ntà abụọ n’ebe ahụ ana-edebe ụtụ.
  4. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere ya?
  5. Gịnị bụ ihe mmụta anyị pụrụ ịmụta n’ebe a?
  6. Gịnị ka eji otù ụzọ n’ụzọ iri eme n’oge ndị Israel?
  7. Ì chere na ọ bụ iwu na anyi ga enye otù ụzọ n’ụzọ iri niile?
  8. Ò nwere iwu Chineke aga agụ na ọ dịghị mkpà?