Jọn 15:11-13; Jemes 4:4; I Jọn 2:15-17; Matiu 5:8; I Ndi Kọrint 6:20; Ndi Rom 12:2

Lesson 265 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ngọzi nādiri ndi di ọcha n’obi: n’ihi na ndi ahu gāhu Chineke” (Matiu 5:8)
Notes

Ndị-enyi

Jisọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ Ya bụrụ ndị nwere ọñụ. Mgbe Ya na Ndịozi Ya nwesịrị mkparịta ụka ikpe-azụ tutu akpọgide Ya n’obe, Ọ sịrị: “Ihe ndia ka M’gwaworo unu, ka ọñum we di nime unu, ka ọñụ unu we zu kwa” (Jọn 15:11). Ọ na-enye ha ihe pụrụ ime ka ha nwee ọñụ.

Nzọpụta site ná mmehie, na nnwapụta niile ọzọ dị omimi nke ihe mmụọ, na-eweta ọñụ dị ukwu na ndụ anyị: ma anyị ka bụ mmadụ anyị chọkwara ndị anyị na ha gana-esokọrịta na ndị anyị na ha gana-egwúrị kwa egwú ime ka obi dị anyị ụtọ mgbe anyị na ebi ndụ n’ụwa nke a.

Jisọs ghọtara mkpà ọ dị inwe ndị enyi, Ọ chọkwara ka ndụ Ya ná-enwerịta ọñụ n’etiti onwe ha. Ya na ndị Ya na-anọ mgbe niile ewezuga mgbe O jere náánị Ya ikpe-ekpere. Ọ na-atọ Ya ụtọ ịga n’ụlọ Meri, Mata na Lazarọs ileta ha. Ụfọdụ n’ime ndịFarisii ndị na-achọ ihe ha ga-eji maa Ya ikpe, na-akpọ Ya n’ebubo ụgha “Onyeori nke ukwu, na onye oké ọñụ manya” (Luk 7:34), n’ihi na Ọ na-atọ Ya ụtọ isoro ndị enyi Ya rie nri anyasị na ndị O nwere olile anya na ha ga-abụ ndị enyi Ya mgbe ha matara Ya.

Onye Kraist aghaghị ileru anya n’ụdị ndị ọ na-arọrọ ịbụ ndị enyi ya. Ha aghaghị ịbụ ndị na-achọ ime ihe ziri ezi ọ bụghị ndị ga arara ya ịba n’ihe ụtọ nke mmehie. Onye dere Abù Ọma dere: “Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwu Gi n’otù ka m’bu” (Abù Ọma 119:63). Chineke sịrị: “Ùnu amatagh na ibu eyi nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu enyi nke uwa naeme onwe ya onye-iro nke Chineke” (Jemes 4:4). Ya mere anyị ahụwo mkpà ọ dị ịrọrọ ndị ga-abụ ndị enyi anyị site n’etiti ndị hụrụ Onyenweanyị n’anya.

Igwuri egwú N’èzí

Ugbu a anyị nwere ndị enyi, òlee ihe ụtọ dị iche iche nke na-adị anyị mma ime na nke na-eme ka anyị nwee ọñụ mgbe anyi chetara ha? Chineke enyewo anyị ihe ịgwuri egwú dị mma, dị kwa ukwu n’èzí nke na-eme ka obi dị anyi ụtọ. Ọ na-atọ ọtụtụ ụmụntakịrị ụto ijé ogologo ijè n’ụkwụ, irigo n’elu ugwu, ikegide osisi n’ụkwụ iji gaa ijé n’elu snow (skiing), isi n’ụlọ pụọ jee biri n’ebe ọzọ na nwa mgbe ntà, isi ihe n’ọkụ afụnwuru n’ebe ahụ ha wuru ụlọ, ịchụnta, igbu ázụ, igwu mmiri, na ịgbá igwè.

Ọ na-atọ ụfọdụ ụmụntakịrị ụtọ ijide orombubara na ụmụ árụrụ niile ọzọ kwa, maọbụ ịtụtụkọta nkume. N’oge oyi, bú mgbe ha kwesịrị ịnọ n’ime ụlọ, ha nwere ike ikewasị ihe niile ahụ ha chọpụtasịrị na mgbe okpomọkụ ma guzobe ha n’ebe ha chọrọ. N’akwụkwọ dị iche iche, ha pụrụ ịmụ ihe-omimi nke dị n’omume ụmụ anụmanụ na ụmụ arụrụ na amam-ihe nke Chineke nyere ha site n’òkìkè nke ibi ndụ, iwú ụlọ, na ịmụ ọmụmụ n’ụzọ dị iche iche nke dị ebube. N’ụlọ ebe ana-egosi ihe ọkpú dị iche iche (museum) kwa, ha pụrụ ịhụ ụmụ árụrụ dị iche iche nke ndị ọzọ chịkọtara nke na-egosi ogologo ndụ nke ụmụ ihe ntà ndịa bụ nke Chineke nyere amam-ihe dị ukwu nwere.

Ise foto nwere ike ịbụ ihe mmadụ hụrụ n’anya nke ọ na-achọ ime mgbe ọ bụla, ná-amalite site n’iji kamera dị ntà nke nwantakịrị nwere ike iji see foto dị mma n’èzí mgbe anyanwụ na-amụ. Dịka oge na-aga o nwekwara ike ịmụta ise foto nkeọma n’ime ụlọ na ndị tụrụ àgwà. O nwere ike iji anyasị ụfọdụ mgbe obi dị ya ụtọ na-egosi ndị enyi ya foto niile ahụ.

Otú ọ dị, anyi agaghị arapụ ịdọ aka ná ntị. Cheta, ọlụ anyi nye Chineke ga-abụ ihe mbụ; ihe-ụtọ anyị niile ga-enye anyị ọñụ nke ukwu ọ bụrụ na anyị buru ụzọ were nwayọ dị nsọ, ma bụrụkwa ndị ha na Onyenweanyị na-akparịta ụka mgbe niile Ọ ga-akụziri anyị ihe dị iche iche ọhụụ na ihe na-akpali mmụọ ka anyị na-aga n’iru ịmụ okwu Ya.

Abụ

Abụ emewo ka obi dị ọtụtụ ụmụntakịrị ụtọ na ndụ ha. Ụfọdụ na-amalite ịmụ ihe-ọmụmụ ha banyere abụ tutu ha abànye ụlọ-akwụkwọ. N’ụlọ-akwụkwọ ha na-amalite site n’isonye n’abụ nke ejikọtara ọnụ. Nke a na-enye ha ohere ịbụ ndị ha na ụmụntakịrị ibe ha gana-enwe ezi mmekọrịta ndị ihe ahụ nke ha na-eme na atọ ụtọ dịka o si na-atọ ha ụtọ. Otù aka ahụ kwa enwere ike iji talent ha jeere Chineke ozi, bụ nke na-atụkwasị ọñụ n’elu ọñụ ha. Ka amam-ihe nke mmadụ nwere n’ihe banyere abụ na-abàwanye, ọ ga-atọ ya ụtọ ịna-ege ntị n’ebe ana-eme ihe ngosi nke abụ, mgbe onye amaara nkeọma n’ịbụ abụ nke otù onye na-abụ, na mgbe ndị abụ-une ejikọtara ọnụ na-abụ abụ.

Ndị ntorọbịa nwere ike inyebiga onwe ha n’ịchịkọta rekọd nke ndị na-abụ abù nkeọma wepụtara. Site n’otù onye ịgbazinye ibe ya, ha ga-enwe ike inweta karịa otú ha nwere ike ịzụta n’onwe ha. Ụfọdụ ebe nchekwa akwụkwọ ọgụgụ nke dịrị ọra mmadụ n’otù aka ahụ, nwekwara ọtụtụ rekọd dị mma nke aga gbazinye mmadụ.

Ọ bụghị egwú niile dị mma. Ihe ebun’uche mgbe ana-eti egwú niile a maọbụ ná-emegharị arụ ahụ bụ náánị ịkpali omume anụ-arụ na-adịghị nsọ n’ime obi ndị ahụ zukọrọ ikiri ihe ana-eme. Égwú nke na-ada aghara aghara mgbe ana-akụ ya ná-aga n’iru, pụrụ ịkpali obi ụmụ mmadụ ịba n’omume jọgburu onwe ha na mmehie niile akpọrọ asị karịsịa. Mmechie ntị gị nye ihe ahụ nke ga-atụgharị échìchè gị niile pụọ n’ịdị-ọcha na ịdị-nsọ.

Enweghị Ọchịchọ Nke Onwe-onye

Ọ dị ihe ndịọzọ nke ga-eme ka obi dị anyi ụtọ ma ewezuga gwuri egwú. N’ezi-okwu tutu anyị enwee ọñụ n’ihe ọ bụla nke anyị na-eme anyị aghaghị ịbụ ndị ná-adịghị achọ náánị ihe nke aka anyị kama na-eleba anya n’ihe banyere obi ụtọ nke ndịọzọ n’ihe niile ọ bụla nke anyị na-eme. Mgbe Jisọs na-ekwu ihe banyere anyị dịka ndị enyị Ya, Ọ sịrị, “Ọ digh onye ọ bula nwere ihu-n’anya kari nka uku, ka madu tọgbọ ndu-ya n’ihi ndi eyi ya” (Jọn 15:13). O gosipụtara na Ọ hụrụ anyi n’anya nke ukwuu Ọ bịara iwu Ala-eze Ya n’ime obi nke ụmụ mmadụ, ma mesịa were Onweya chụọàjà ịgbapụta anyị. Ọ bụ ihe dị Ya ụtọ ime uche nke Nna Ya, otù aka ahụ kwa anyị onwe anyị na-achọta ọñụ site n’ime uche Chineke.

Mgbe ndịọzọ na-atụfu oge ha ịchọta ákụnaụba, ịmụ akwụkwọ maọbụ egwri egwú, Jisọs nọ na-etinye ike Ya niile ikuziri ụmụ mmadụ ihe banyere ịhụn’anya Ya n’ebe mmadụ nọ. Ọ nọ na-agwọ ndị ọrịa, na-ekwu okwu agbam-ume, na-ewelite ndị ogbenye elu ma na-eme ka ha mara na enwere ọnọdụ nsọpụrụ n’ime ụwa nye ha. Site n’ime nke a O mere ka obi dị ọtụtụ mmadụ anapụghị ịgụta ọnụ ụtọ, ma n’otù aka ahụ obi-ebere Ya ewetaworo ọgbọ niile ndị na-esochita ọñụ dị ukwuu.

Oge ụfọdụ ana-enwe ọmiko n’arụ ndị na-ezisa Oziọma n’ihi àjà nke ha na-achụ banyere ihe ike dị ukwu ha na-aghaghị ịgafe, n’iburu Oziọma jekuru ndị na-ekpere arụsị. Ma ọñụ ha na-enweta site n’ijéozi ha nke na-enweghị ọchịchọ onwe-onye na-eme ka ha na añụrị-ọñụ dị ukwu nke mere na mgbe ọ bụla mmadụ bụ onye na-ezisa oziọma nke Chineke zipụrụ ọ na-esiri ya ike isi n’ọlụ Onyenweanyị laghachi azụ. Akọwara ọñụ ya n’ahịrị nke otù abụ: “Náánị ịhụ otù nwoke azọpụtara ka ọ na-achiọchị na-eme ka ndọgbu n’ọlụ ahụ bụrụ ihe nke eritara úrù n’ime ya”

Egwurị egwú Ụmụ Mmadụ Hụrụ n’anya

Ezi Onye Kraist mụtaworo ịdị ụtọ nke mmekọrịta dị ezi nso nke ya na Kraist na-eche ụdị échìchè a: “Agajem ibi ndum nye Chineke na ndịọzọ, karịa ibi ndụ nke onwem. Achọrọm ka ndị ụwa hu Jisọs na ndụm.” Onye ọ bụla nke nwere ụdị mkpebi a agaghị enwe nsogbu ọ bụla ịmata ihe bụ uche Onyenweanyị banyere egwurị egwú nke ndị ụwa hụrụ n’anya. Ọ ga ahụ otú o si bụrụ ihe n’ezighị ezi, na ihe n’abàghị úrù bụ ihe ụtọ niile nke ụwa a ma eji ya tụnyere ihe ọ pụrụ imere Onyenweanyị.

Okwu Chineke na-akụzi: “Unu ahula uwa ma-ọbu ihe nke di n’uwa, n’anya. Ọ buru na onye ọ bula ahu uwa n’anya, ihu-n’anya nke Nna-ayi adigh nime ya. N’ihi na ihe nile nke di n’uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esitegh na Nna-ayi, kama o sitere n’uwa. Uwa nāgabiga kwa, rue mgbe ebigh-ebi” (I Jọn 2:15-17).

Ụlọ Ngosi Egwurị egwú

Ụfọdụ na-ajụ sị. “Òlee ihe ọjọọ dị n’ijé n’ụlọ ebe ana-eme ihe ngosi egwurị egwú?” Dere duu ma tulee échíchè, ụdị mkpali, egwurị egwú ndịa na-eweta n’obi mmadụ. Ị ga-ahụ ụdị obibi ndụ nke ụmụ mmadụ ji aka meere onwe ha nke ana-egosi n’ihe onyinyo nke sinima. Ndị na-ebi ndụ dị ka ndị ahụ ana ahụ na sinima adịghị enwe ọñụ dị ka ha na-egosipụta na ha nwere. Ha na-ebi ndụ dị ka ekwensu si chọọ ka ha na-ebi, iji mezue ọchịchọ nke anụ-arụ ha -- ma ụgwọ ọlụ nke mmehie bụ ọnwụ.

Inwe ọtụtụ ego, uwe mara mma, ebe obibi na ụgbọ-ala dị óké ọnụ-ahịa abụghị ebe ndụ kwụsịrị. N’ịgụ akụkọ dị iche iche nke ụmụ mmadụ depụtara, mmadụ ga-echè na ego bụ mgbọrọgwụ ihe-ụtọ niile. Ndịa na-eme ihe ngosi niile a jupụtara ná mmehie ka ana agbasa n’ime akwụkwọ akụkọ dị iche iche. Ịlụ ọtụtụ nwayị na nkewa èzínaụlọ ka ana-akwagide dịka ihe ziri ezi. Adịghị ekwu banyere obi mgbawa na óké iru-uju nke imebi iwu niile nke Chineke na-eweta, na ahụhụ nke enweghị ezi nchebe nke ụmụntakịrị na-enwe, ma ka o doo anyị anya na ndị na-ebi ndụ dị otú a na-enweta ihe niile ahụ Jisọs sịrị, “Lezienu anya ihe unu nānu” (Mak 4:24). Ọ matararị na ọ dị ọtụtụ ihe ndị jupụtara ná mmehie nke ga-agbalị ịdọrọ obi na àkọ-na-uche anyị pụọ n’Okwu Ya, ma ọ bụrụ na anyị adịghị enwe nleru anya anyị ga-adaba n’ọnya nke ekwensu ọsọsọ site n’ihe anyị na anụ na ihe anyị na ahụ

Ihe anyị na-agụ aghaghị ịbụ ihe ziri ezi. Ụfọdụ akwụkwọ na akwụkwọ ana-esepụta “ihe na-atọ ọchị” n’ime ha adịghị mma. Ha na-adọrọ ụmụntakịrị na ụmụokorobịa ichè échìchè na ime ihe ọjọọ. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ Ya otù oge sị: “Ngọzị nādiri anya unu, n’ihi na ha nāhu uzọ; na nti-unu n’ihi na ha nānu ihe” (Matiu 13:16). Ha na-anụ na-ahụ kwa ihe niile banyere Chineke bụ nke ga-enye ha ndụ ebighị-ebi. Anya anyị na ntị anyị ga-eghere oghe ma dị kwa ọcha ka anyi wee nwee ike na-anụ ihe ga-eme ka anyị jikere ịbà n’Eluigwe.

Ndị Dị Ọcha n’Obi

Jisọs sịrị, “Ngọzi nādiri ndi di ọcha n’obi: n’ihi na ndi ahu gāhu Chineke” (Matiu 5:8). Ndị dị ọcha n’obi adịghi enwe ọñụ n’egwurị egwú nke n’ekwesịghị ekwesị, maọbụ kwa iji ejiji n’ụzọ ga-adọrọ obi ụmụ mmadụ ikiri ha. Ụfọdụ ụmụ-agbọghọbịa nwere ike iji ejiji n’ụzọ dị nnọọ mma, ma site n’omume ha, ijè ụkwụ ha maọbụ ile-anya ha ana ahụta ọchịchọ anụ-arụ nke dị n’obi ha. Ụdị omume dị otú a adịghị esite n’obi dị ọcha. Pọl dọrọ aka-ná-ntị: “Nāgbanari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāgbaso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n’anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n’obi di ọcha” (II Timọti 2:22).

Ụfọdụ nime onyinyo Sinima nke ndị nne na nna na-egosi ụmụ ha n’ụlọ ga-adị ka ihe dị mma kama ha aghaghị ịtụgharị uche n’ihe onyinyo niile ahụ ga-akpali n’ime obi ụmụ ha. Ọ ga-etinye ọchịchọ dị ukwu ibi ndụ dị ọcha na ijere Onyenweanyị ozi n’obi ha, maọbụ ọ ga-akpali ha inwe agụụ nke ihe ndị ụwa na-eme? Televisiọn na ewebata ụdị onyinyo dị iche iche n’ime èzínaụlọ, ma ekwensu na-eji ngwa ọlụ a dị ìrè iji dọrọ obi ndị na-etolite etolite ịbà n’ihe ụtọ dị iche iche nke jupụtara na mmehie. Ụmụntakịrị na-enwe mmasị n’ihe ha hụrụ na Sinima; ma iheọma ntakịrị nke enwere ike inweta na ya n’ezie agaghị enwe ike ịkwụ ụgwọ nke ihe ọjọọ ahụ ha banyereworo n’ime ya.

Egwurị egwú Dị iche iche

Ọ na-adị onye ọ bụla ụtọ igwu egwú, anyị nwere ike ịmụta ilụkọ ọlụ n’ìgwè na ịbụ ndị amaara nkeọma n’ihe banyere egwurị egwú ma ọ bụrụ na anyi eme ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ma anyị aghaghị inwe nleru anya n’ụdị egwurị egwú anyị na-egwù. Ekwensu jikeere iduba anyị n’ihe ọjọọ ma duhie kwa anyị n’ihe nke anyị na-echè na ọ bụ ihe ụtọ nke ihe ọjọọ na-adịghị n’ime ya, ma ọ bụrụ na anyị echèghị nche.

Enwere ihe dị iche n’egwurị egwú nke amụrụ àmụ na nke ana amụghị àmụ. Ọ bụ nime egwurị egwú ndị ana amụghị amụ -- iti kad na egwurị egwú bingo (dịka iti draft na Lido) -- na nke yiri ihe ndịa ka ịgbá chacha si apụta maọbụ kwa ọkụ na-eri ego. Ma mgbe mmadụ ọ bụla bara nime ịgba chacha, ọ na-adị ka ọ dịghị ihe ga-adọpụta onye ahụ ma ọ bụghị náánị Onyenweanyị. Mgbe ụfọdụ ọ na-eduba mmadụ n’ọnọdụ ọjọọ nke mere na ọtụtụ mmadụ na-ahụju anya ma nọrọkwa n’ụkọ site na chacha nke onye ahụ gbara. Nwa ego ntà etinyere n’egwurị egwú kad na ịgbaòkwè nwere ike ịdị ka ihe dị ntakịrị na ihe na-adịghị emerụ arụ, ma enwere ike itufu ọtụtụ ego na ya mgbe egwurị egwú ahụ ghọrọ omume mmadụ. N’oge na-adịghị anya onye ahụ ewee hụ onwe ya ka ọ na-aga n’iru na-egwurị egwú ahụ n’ebe dị ukwu karịa.

Egwurị egwú amụtara nkeọma bụ ihe ọzọ dị iche na ụdị ya. Mmadụ aghaghi ịmụta otú esi eme ihe ahụ nkeọma, ọ bụghị ihe ndaba. Ma mgbe ahaziri ụdị egwurị egwú a nkeọma, wee kọwaa egwurị egwú ahụ rue ebe ọ na-ekwesịghị, anyị na-ahụ kwa mmegbu, nghọgbu, aghụghọ, ịkpọ-asị, nke mebiri egwuri egwú ahụ nye ndị hụrụ eziokwu na ịdị ọcha n’obi n’anya.

Ịchọ Oziọma Mma

Ọ bụrụ na anyị nwere ike ịghọta ịdị óké ọnụ-ahịa nke otù mkpụrụobi, na ọlụ anyi ịgwa mkpụrụobi ahụ ihe banyere Jisọs, ihe ụtọ niile nke ụwa a apụghị ịdọrọ anyị n’ụzọ ọ bụla. Ọbụná ihe niile nke dị ka ha adịghị emerụ arụ ga-abụrụ anyị ịtụfu oge. Anyị ga-ewere oge dịka anyị nwere ike igwurị egwú ga-eme ka arụ anyị dị ike -- ọ gaghị akarị nke a. Cheta na anyi aghaghị iguzo n’iru Chineke ịkọwa otú anyị si were oge anyị mee ihe. Onyenweanyị na-ahụ ihe niile anyị na-eme. Anyị dị óké ọnụ-ahịa n’anya Ya. “N’ihi na ewere ọnu-ahia gbara unu ya mere nyenu Chineke otuto n’aru-unu, na ná mkpụrụ-obi unu nke bu nke Chineke” (I Ndi Kọrint 6:20).

Ọtụtụ mmadụ n’ime ụwa adịghị agụ Baịbụl. Ha na-ele anya ná ndụ nwoke maọbụ nwanyị, nwaokorọbịa maọbụ nwa-agbọghọbịa onye sịrị na ya bụ Onye Kraist. Ị bụ ihe ịchọ mma nye Oziọma Jisọs Kraist? Ịdị-nsọ na ịdị-ọcha gị ọ ga-adọrọ onye na-ele gị anya? Ma ọ bụ ị na-achọ ịgwakọta onwe gị na ndị ụwa ma na-eme kwa otú ha na-eme, ka ị ghara ịbụ onye dị iche? “Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n’ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke na-achọ bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè” (Ndi Rom 12:2).

Ọ bụrụ na obi anyị dị n’ime Eluigwe ebe obibi anyị, anyị agaghị agbaso ihe ụtọ nke ụwa. Anyị ga-anọgidesi nnọọ ike n’ọlụ ime onwe anyị ka anyị dị ọcha ka anyị wee nwee ike ịbụ Nwanyị ana-alụ ọhụụ nke Kraist.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee ụdị enyi nke Onye Kraist ga-arọrọ?
  2. Òlee ụdị egwurị egwú nke ị hụrụ n’anya? N’ihi gịnị?
  3. Òlee otú ịhụn’anya Jisọs n’ebe anyị nọ ra?
  4. Òlee ogo ịhụn’anya anyị ga ara n’ebe ibe anyị nọ?
  5. Gịnị bụ óké ọñụ nke onye na-ezisa Oziọma?
  6. Ònye gaje ịhụ Chineke?
  7. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ịhụ ego n’anya?
  8. Ndị mmehie ha pụrụ ịhụ na ị bụ Onye Kraist site n’ụzọ i si ebi ndụ?