Aisaia 3:16-24; 55:2; I Pita 3:3-5; I Ndi Kọrint 6:19, 20; 9:25; 10:31

Lesson 266 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “N’ihi na ihe nile nke di n’uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esitegh na Nna-ayi, kama o sitere n’uwa” (I Jọn 2:16).
Notes

“Site Ná Mkpụrụ Ha”

“Ezi osisi ọ bula nāmi nkpuru ọma; ma osisi nābagh n’ihe nāmi ajọ nkpuru” (Matiu 7:17). Ndị ụwa na-atụ anya ịhụ Jisọs na ndụ ndị na-eso ụzọ Ya. N’ọtụtụ oge, mmadụ na-achọta Jisọs site na ndụ nke onye azọpụtara; ebe nke a bụ eziokwu, ọ bụ ihe bara úrù nke ukwuu na Onye Kraist ọ bụla ga-eleru anya ịhụ na ya na amịpụta mkpụrụ dị mma.

N’ụbọchị ndịa ana ekwusi okwu ike banyere ịgụ akwụkwọ, idozi arụ, uche na inwe ntụkwasị-obi n’onwe-onye. Ndị ntọrọbịa na-agbaso ịchọ mma na enwe ọnọdụ pụrụ ichè n’ihe dị iche iche nke ana-eme n’ụlọ-akwụkwọ na n’ime ụwa. Ma ihe na atọ Onye Kraist ụtọ bụ onye tọworo ezi ntọ ala maka owuwu ụlọ nke ime mmụọ ya ma na-azụ kwa mkpụrụobi ya kwa ụbọchị site na Nri ahụ nke sitere n’Eluigwe. N’ezie Onyenweanyị, n’otù aka ahụ, na-ahụ onye ahụ n’anya bụ onye asachawo n’Ọbara Nwa-atụrụ ahụ na onye ịchọ mma ya ná-abụghị nke arụ, kama “madu zoro ezo nke nkpuru-obi.” Náánị ndị ahụ na-ewezuga ihe niile pụrụ ịnọchị n’etiti ha na Kraist bụ ndị ndụ ha na-atọ Ya ụtọ.

Ọnwụnwa

Ekwensu na-anwa anyị site n’échìchè na anya anyị. Anyị apụghị igbochị ọnwụnwa ịbịakwasị anyị dịka anyị na-apụghị igbochị nnụnụ iféfè n’elu isi anyị; kama dịka otù onye kwuworo “apụrụm igbochi ha ịkpa àkwụ n’agịrị isim.” Ọnwụnwa ga-abịa n’ụzọ gị ịgbalị ichigharị gị pụọ n’ihe ahụ ị maara na ọ bụ ihe ziri ezi. Ụfọdụ mmadụ na-adị ka arapụrụ ha ka ha na-eme ihe niile ahụ ị mụtaworo na ha bụ ihe Onye Kraist náekwesịghị ime. Ekwensu ga-asị, “Ọ bụrụ na onye a na onye nke ọzọ nwere ike iyi uwa nwere aka mkpiriisi gịnị ga-eme ka ị ghara iyi ya?” Ma cheta, na ọ bụrụ na ị malite ịgbaso ụdị ejiji dị iche iche nwantịị n’ebe a nwantịị n’ebe ọzọ, n’oge na adịghị anya ị ga-adị ka ndị ụwa n’ile gị anya. Site n’iguzogide ntụpụta niile nke ekwensu ị ga-enwe ike imeri. Dịka i si nọdụ n’ebe dị anya site n’ihe ụwa, otú ahụ ka ị ga-enwere onwe gị karịa. Agaghị anwa gị karịa ka ị pụrụ ịnagide.

Ajụrụ otù nwantakịrị ihe ọ ga-eme ọ bụrụ na ọnwụnwa akụọ aka n’ọnụ-ụzọ ụlọ ya. Ọ zara sị “Ọ dị mma, náánị ihe m’ga-eme bụ ikwe ka Jisọs zaa òkù ahụ”

Ekwensu maara otú esi anwa ndị ntorọbịa n’ihe banyere nganga. Ọ na-egosi ha ihe ịchọ mma ntà wee sị: “M’ga-enye gị ihe a ma ọ bụrụ na ị ga-akpọ isi-ala nyem. M’ga-eme ka ị dị otú a ma ọ bụrụ na ị ga-eme ihe m’gwara gị mee.” Ụfọdụ ụmụagbọghọ na adaba n’ọnwụnwa nke ité pankeeki na uhie ọnụ. Óké ahụhụ, ihe-arụ nke nganga abụrụwo ihe kpatara ọdịda nke ọtụtụ ụmụ-agbọghọbịa n’ụbọchị taa. Ụfọdụ ụmụ-agbọghọbịa ndị gbuworo ikpere n’oche-eze amara abụrụwo ndị pụrụ n’ụlọ Chineke na-enwetaghị àkụ Ya ahụ dị óké ọnụ-ahịa, n’ihi na ha apụghị ịrapụ ịchọ mma dị iche iche maọbụ ihe ịchọ mma niile -- isi bọbọ, uwe mkpirisi, uwe na-enweghị aka, pankeeki, maọbụ uhie ọnụ. Lee ụdị ọnụ-ahịa dị ala nke ha resịrị onye iro nke mkpụrụobi ha onwe ha. Òlee maka gị? Échìchè nke ịbụ nwa-agbọghọbịa nke “na-eji ihe ịchọ mma arara ndịkọm” maọbụ “nwaokorọbịa na-eme ihe ike” ọ bụ ihe na-eneye gị ọñụ nke ukwuu karị olile anya nke ịbụ onye na emeri emeri?

Ekele dịrị Chineke, na enwere ọbụná n’etiti ụmụ-agbọghọbịa ndị jiworo ihe eji mara ha n’ebe ndị mmehie nọ chụọ àjà (ọ bụrụ na mmadụ pụrụ ịkpọ ya ihe eji chụàjà) iji obi ume-ala nọdụ n’ụkwụ Obe, nabata kwa Oziọma nke Kraist n’ime obi ha.

Ihe ịma-atụ nke otù nwanyị tejiri iru ya ka ahụrụ na Baịbụl. (Gụọ II Ndi Eze 9:30). Ọ bụghị onye ọzọ ma ọbụghị Jezebel, nwanyị ahụ jọgburu onwe ya onye nwụrụ ọnwụ dị egwù. N’ikwu eziokwu, ọ dịghị onye liri ya n’ihi na nkịta riri arụ ya. N’eziokwu, akụkọ banyere ndụ ya ga-eme ka onye ọ bụla jụ ichè échìchè banyere ụdị ihe ilere anya dị otú a nke mmadụ iteji iru ya. Ọ bụrụ nnọọ na ị ghaghị ịgbaso ihe nlere anya, gbasoo nke dị mma, ha dị kwa ọtụtụ n’ime Okwu Chineke; ọtụtụ ndị na-ebi kwa ndụ nke mmeri nọ n’etiti Nzukọ nke Ndị Eburu ụzọ mụ ndị na-ajụ mmehie n’ụdị ọ bụla.

Iyi Ụwa

Ọ bụrụ na ụmụntakịrị na ndịntorọbịa -- ma ha nọ n’ụlọ, n’ebe ha na-alụ ọlụ, maọbụ n’ebe ana egwuri egwú -- ga-eme ka iji ejiji n’ụzọ kwesịrị ekwesị bụrụ ihe na-achị achị na ndụ ha, ha ga-anọ n’ọnọdụ nke ijidesi òzìzí niile nke Oziọma ike bụrụ kwa ndị ga-ahụta iruọma nke Chineke ná ndụ ha. Ezi Onye Kraist ọ bụla ga-abụ onye na-enye Chineke otuto n’arụ na nime mmụọ ya bụ nke Chineke (I Ndi Kọrint 6:20).

Lee otú ilu ahụ si bụrụ eziokwu: “Otù okwu ezuworo onye maara ihe”! Ndị na-achọsị ezi ihe nke Chineke kwadobere ha ike -- ọ bụrụ na achọpụta na ha nọ n’ụzọ nke iji ụdị ejiji a maọbụ otú ha si dozie agịrịisi ha adịghị mma – na-ekwukarị sị “Obi dịm ụtọ na ị gwaram.” Ndịọzọ bụ ndị nọ n’Oziọma na-achọ iyi ụwa nke mere na ọ dịwo anya mgbe olu ntà ahụ nke Chineke na-adịkwaghị agwá ha okwu banyere ịhụ ihe nke ụwa n’anya. N’ụlọ egwurị egwú nke ụmụ akwụkwọ maọbụ n’ebe igwurị egwú na mbara-èzí anyị, ana-ekwenye ka ụmụntakịrị na-eji ejiji ga-eme ka eleda iji ejiji nwere nsọpụrụ anya n’ihi ịhụn’anya nke arụ-ike ana-enweta site n’ịnyá anyanwụ. Uwe eji egwu mmiri nke na-ekwesịghị oyiyi dịka nke ahụ na-ekpuchị náánị afọ na obi mmadụ na uwe ọzọ dị iche iche nke eji egwù mmiri nke na-adịghị ekpuchi arụ mmadụ nkeọma ekwesịghị ka nwa-agbọghọbịa maọbụ ndị nne na-efè Chineke yiri ha. Uwe dị iche iche ndị bekee na-egbokwasị n’arụ maka okpomọkụ ekwesịghị kwa ekwesị, n’ikwu náánị ole-na-ole. Uwe na-arapara mmadụ n’arụ na ndị olu ha dị obosara nke ukwu adịghị egosi nsọpụrụ Chineke.

Uwe Ndịkom nke Ndịnyom Ná-eyi

“Ihe diri nwoke agagh adikwasi n’arụ nwayi, nwoke agagh-eyiri kwa uwe-ngbokwasi nwayi: n’ihi na ihe-árú nke JEHOVA, bú Chineke-gi, ka onye ọ bula bu nke nēme ihe ndia” (Deuteronomi 22:5).

Ya mere, n’ihi nsọpụrụ, ndịnyom ekwesịghị iyi uwe ụkwụ mkpirisi, uwe ndị na-agba ịnyịnya igwe, jean; uwe ahụ adụkọtara ya na nke úkwù, bongo na uwe ọ bụla ọzọ emere maka ndịkom. Ọ bụghị náánị na ụdị ejiji a megidere Okwu Chineke kama ha na-eme ka nwanyị ghara iyi nwanyị. Ụmụntakịrị ndịnyom ana-ekwenye ka ha ná eyi uwe niile dịrị náánị ndịkom ga-enwe mmasị n’ebe ha nọ, ná-agbaghị agụgọ, ha ga-achọ ka ha ná-eyi ha ọbụná mgbe ha mere okenye. N’ụbọchị taa ọtụtụ ndịnyom alụbatara ọhụụ n’èzínaụlọ na ndị nne adịghị eyi uwe ọzọ ma ọ bụghị ụdị uwe ndịa mgbe ha na-alụ ọlụ dị n’ụlọ ha.

Eleghị anya ha ga-agwa ụmụ-agbọghọbịa nọ n’ụlọ-akwụkwọ ka ha yiri uwe dịrị ndịkom mgbe ha na akụ band n’ụlọ-akwụkwọ. Otú ọ dị, ọ dịghị úrù ọ baara Onye Kraist ikwenye ihe ndịa. Ọ bụrụ na ya na onye-isi òtù egwù ahụ maọbụ onye-isi ụlọ akwụkwọ ga-akparịta ụka banyere nke a, ná-agbaghị agụgọ ọ ga-enye ya ike iyi uwe ndịnyom kama iyi uwe ndịkom. Ọ bụrụ na ọ bụghị otú a, ọ ga-aka mma isepụ aka n’òtù ahụ. Chineke ga-akwụghachị ndị ahụ ụgwọ-ọlụ bụ ndị nwere mmụọ n’ime ha nke ga-ekwu sị, “Chineke ahu Onye ayi onwe-ayi nēfe puru inaputa ayi … Ma asi na Ọ pugh inaputa ayi,” ayi agagh-efè chi nke uwa a” (Daniel 3:17, 18).

Ụfọdụ ụmụ-agbọghọbịa na ndị nne na-agba agụgọ na iyi uwe ụfọdụ, ọ bụ ezie na akwara ha dịka nke ndịkom, abụghị ihe oyiyi ndịkom. Otù ọ dị, ebe ọ bụ na akwara ha dịka uwe ndịkom ezuwo ime ka arapụ ha kpamkpam.

Iyi Ọla dị iche iche Na Idozi Agịrị-isi

Ajụwo ọtụtụ ajụjụ banyere iyikwasị ọla dị iche iche, na idozi agịrị-isi nke ụmụ agbọghọbịa na ndị nne. Anyị ga-eleba anya n’Okwu Chineke maka iwu ndịa dị mkpà banyere ihe ndịa?

“Ọbuná uzọ ekère madu, yà onwe-ya adigh-ezí unu, na, asi na nwoke nwere ogologo agiri-isi, na ọ buru ya ihe-ihere?

“Ma ọ buru na nwayi nwere ogologo agiri-isi, ọ buru ya ihe otuto” (I Ndi Kọrint 11:14, 15).

“Ndi ichọ-nma-ha ka ọ ghara ibu ichọ-nma ahu nke aru nke bu ikpa isi, na iyikwasi ihe ọla-edo, ma-ọbu iyikwasi ọtutu uwe;

“Kama ka ọ buru madu zoro ezo nke mkpuru-obi na uwe anāpugh imebi nke bu mọ di nwayo di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n’anya Chineke” (I Pita 3:3, 4).

“Ka ndinyom were ihe-ichọ-nma kwesiri ekwesi chọ onwe-ha nma, ya na nsọpuru na uche zuru okè; ọ bugh isi akpara akpa, na ọla-edo ma-ọbu pearl ma-ọbu uwe di oké ọnu-ahia” (I Timọti 2:9).

Ya mere anyị hụrụ nnọọ na o doro anya na ụmụ-agbọghọbịa na ndị nne ime isi bọbọ adịghị n’usoro zuru òkè nke Okwu Chineke. Were oge ntakịrị lee onwe gị n’enyò ma were oge dị ukwu gụọ Baịbụl kpee kwa ekpere, na-eyikwasị “uwe anāpugh imebi nke bu mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnụ-ahịa n’anya Chineke” nke a bụ ihe ana-anara nkeọma n’iru Chineke. Oge eruwo mgbe ndị-ntorọbịa nke Kraist ga-eti mkpu megide ọchịchọ ọ bụla nke ịgbaso ịchọ mma nke ụbọchị ndịa.

Ị sịrị, “Apụghịm ịkwụ ụgwọ ahụ.” Gịnị ka i bu n’obi? Ihe ị na ekwu ọ bụ na uhie-ọnụ dị ntà na iteji mbọ-aka gị maọbụ ọla-ntị ntakịrị dị gị mkpà karịa ndụ ebighị-ebi? Maọbụ na ọla-edo ntakịrị nke ịgba na mkpịsị-aka dị gị mkpà karịa olile anya nke iru n’Obodo nke Ọla-edo ahụ na ijégharị n’ama ọla-edo ya niile?

Eleghị anya enwere ike ịjụ gị ajụjụ a banyere ịgbá mgba-aka nke agbam-akwụkwọ. Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe ịrịba-àmà na ọlụlụ di na nwunye, akagụnye kwara ya n’iyikwasị ọla di iche iche. Ọ bụrụ na ekwenyere ịgba mgba-aka agbam-akwụkwọ, mgbe ahụ agagba kwa mgba-aka nkwekọrịta nke ọlụlụ di na nwunye. Nke a na-abụkarị ihe ịchọ mma dị óké ọnụ-ahịa, ma iyikwasị ihe “ọla-edo, maọbụ pearl dị iche iche, maọbụ uwe dị óké ọnụ-ahịa” bụ ihe ná-ekwesịghị ekwesị, (Gụọ I Timọti 2:9).Ọ bụrụ na Onye Kraist nwere ike iyikwasị otù udị mgba-aka, iyikwasị ụdị ọzọ agaghị adị njọ karị, mgbe ahụ ndị pụrụ ịzụta mgba-aka dị óké ọnụ-ahịa nwere ike ịdaba n’ọnwụnwa nke idozi onwe ha n’ụzọ ná-ekwesịghị ụmụ Chineke.

Otú ọ dị, anyị adịghị ekwu na ọ dịghị mma iji ọla-edo dozie ezé maọbụ iji lụọ ọlụ niile ọzọ dị iche iche nke anapụghị iji ihe ọzọ lụọ, na mgbe ọ na-abụghị maka ịchọ mma.

Imebi Ụlọ-nsọ Nke Chineke

Ụfọdụ ụmụokorọbịa na-ewere onwe ha dịka ndị maara ihe ma ọ bụrụ na ha nwere egbugbu n’arụ ha. Ọtụtụ mgbe ndịkom na alụ ọlụ n’ụgbọ-mmiri ndị obi ha siri ike n’ime mmehie na-enwe ụdị ákárà ndịa n’aka ha, n’ogwe-aka ha, na n’obi ha; ụmụokorọbịa ndị na-achọ ka agụọ ha na ndị “dị ike” na-enwe ụdị egbugbu niile ahụ na-emebi arụ mmadụ. Ma Okwu Chineke megidere ụdị ihe a, n’ihi na anyị na-agụ nime ya: “ Unu egbula egbugbu n’anu-aru unu … unu etinye kwa-la ihe-odide, bú egbugbu ọku n’aru unu” (Levitikọs 19:28). Ndị na-eme ihe dị otú a na-emebi arụ ahụ nke bụ Ụlọ-nsọ Chineke dị ndụ; Okwu ahụ na-eme kwa ka anyị mara na, “Ọ buru na onye ọ bula emebi ulo nsọ Chineke, onye ahu ka Chineke gēmebi.” Nke a nwere ike ịbụ otù nime “agu ihe ọjọ nāgu nwaokorọbia” nke ekwuru okwu banyere ya na Baịbụl, ma agwara anyi ka anyị “gbanarị” ihe ndịa, maọbụ gbapụ n’ebe ha nọ, rapụ náánị ha, “nāgbaso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n’anya, udo” (Gụọ II Timọti 2:22).

N’obodo ụfọdụ kwa, ndị bi nime ha na-emeru onwe ha arụ n’ebe ọ dị ukwu. Ụfọdụ na akwụnye mgba-aka buru ibu n’imi ha na ná ntị ha; ndịọzọ na-emebi ụkwụ ha; ụfọdụ na-aga n’iru ịkpụgharị isi ụmụntakịrị amụrụ ọhụụ ime ka ha dị n’ụdị dị egwù. Lee otú ụdị ihe ndịa ga-esi na-eme ka obi ghara ịdị Chineke mma!

Mpako

Nime Baịbụl edepụtara ihe asaa nke Chineke kpọrọ asị, ị maara ihe butere ụzọ n’ihe ndị ahụ edepụtara? “Anya di elu”. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe Chineke na-echè banyere nganga karị, gụọ akụkụ ebe ọzọ dị iche iche na Baịbụl. (Gụọ Ilu 6:16-19; 8:13; 16:18; na 29:23). Gụọ kwa ihe banyere eze ukwu ahụ bụ Nebukadneza, onye Chineke mere ka ọ dị ala ọbụná rue n’iji aka ya na ụkwụ ya na-aga ijè ma ná-ata kwa ahịhịa dịka ehi. Mgbe Chineke sitere n’obi ebere Ya weghachịrị eze ukwu a ezi uche ya, ọ sịrị, “Ndi nējeghari na mpako, Ọ puru ime ka ha di ala” (Daniel 4:37). Mmehie iri na atọ jọgburu onwe ha ka agụpụtara n’Oziọma nke Mak dere, nke otù nime ha bụ igbu mmadụ, nke ọzọ bụrụ mpako (Mak 7:21, 22). “Ajọ ihe ndia nile nēsi nime madu aputa ha nēmeru madu.”

Aisaia Onye-amụma dere ihe banyere ikpé ahụ niile nke ekwupụtara megide ụmụ ndịnyom mpako nke Juda. O kwusiri ya ike sị, na nkwọcha isi ga-adị n’ọnọdụ agịrị-isi akpara nkeọma, na ọnyá ga-adị n’isi ha. Ọ sịrị na Ya ga-ewezuga kpamkpam ihe ịchọ mma nke ọla-ụkwụ ha niile na uwe ememe ha niile, na ọnọdụ ìsìsì-ọma ire-ure ga-adị (Aisaia 3:16-24).

Ụzọ dị iche iche esi achọ mma, na ụdị niile esi eji ejiji n’ụwa na agbanwe ọsọsọ, nke ahụ apụtaghị na Onye Kraist ga-enye onwe ya n’ọlụ niile nke ekwensu ma ná agbaso ihe ndịa. Ụmụ-agbọghọ na ndị nne ndị na-akọpụ agịrị-isi, ná eyi uwe nwere aka mkpirisi na nke nwere olu obosara, egbubiwo mmekọ ha na Eluigwe.

Mgbe Jisọs Ga-abịa

Iwu dị mma iso bụ: “Emela ihe ị na-agaghị achọ ka ahụ na i na-eme mgbe Jisọs ga-abịa.” Ọ na-ele anyị anya otú anyị si ejégharị n’iru Ya; ma ndị na-agbaso ụwa, anụ-arụ, na ekwensu gaje ịchọta onwe ha n’ọnyà ekwensu mgbe Jisọs ga-abịa ịkpọrọ Nwunye ọhụụ Ya nke na-echéré. Ka Chineke kpalie obi anyi niile ma mee ka anyị mụrụ anya, “unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama … ka enwogha unu” (Ndi Rom 12:2) ka ọ ga-abụ mgbe Jisọs ga-abịa ka anyị wee soro na ndị aga-enwogha, wee rigo izute Ya na Mbara eluigwe. “Uwa nāgabiga kwa, ya na agu ihe ọjọ ya: ma onye nēme ihe Chineke nāchọ nānọgide rue mgbe ebigh-ebi” (I Jọn 2:17).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Kwue ihe banyere ikpé dị iche iche nke ekwupụtara megide “ụmụ ndịnyom nke Zaion”
  2. Òlee ụdị ịchọ mma nke kwesịrị ekwesị n’iru Chineke?
  3. Òlee otù ụdị ihe ịchọ mma nke agwara anyi ka anya na-eyi?
  4. Gịnị ga-eme ndị ahụ mebiri arụ ha?
  5. Òlee otú anyị ga-esi merie ọnwụnwa?
  6. Gịnị ka Chineke na-echè banyere mpako?
  7. Gịnị bụ ụkpụrụ atọrọ nye ndịnyom banyere iyi ihe oyiyi ndịkom?
  8. Baịbụl ò megidere iyi ihe ịchọ mma nke ọla dị iche iche?
  9. Gịni ka Baịbụl kwuru banyere isi bọbọ?
  10. Òlee ndị ga-abụ Nwunye ọhụụ nke Kraist?