Jenesis 18:23-32; 32:9-12, 24-28; Aisaia 58:1-11; Daniel 9:3-23; Matiu 6:16-18; 17:21

Lesson 267 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ma otú ọ di mọ di otú a apugh iputa ma-ọbugh site n’ekpere na ibu-ọnu” (Matiu 17:21).
Notes

Mkparịta-ụka Dị Ụtọ

Ekpere bụ mmadụ na Chineke ikwurịta okwu. Ọbụná ụmu ntakịrị pụrụ ikpe ekpere; Chineke na-anụ, ná-aza kwa ha. “Ekpere ndi ziri ezi bù ihe nātọ Ya utọ” (Ilu 15:8).

Ụmụ ntakịrị azụpụtara nkeọma na-ekpe ekpere mgbe ha biliri n’ụtụtụ, na-ekele Chineke n’ihi izu-ike nke abalị, na-arịọ kwa Ya ka O debe ha ogologo ụbọchị ahụ. Tupu ha ararụ ụra abalị, ha na-ekpe kwa ekpere ọzọ, na-arịọ Chineke ka O lekọta ha anya ogologo abalị ahụ gọzie kwa nne na nna ha, ụmụnne ha ndịnyom na ndịkom, na ndị enyi ha niile. Ha na-enye kwa Jisọs ekele n’ihi nri ha na eri.

Ekpere niile ahụ na-adị ụtọ dịka mkparịta-ụka dị ụtọ nke dị n’etiti enyi na enyi, na ndị ahụrụ n’anya. Jisọs na-achọ ịbụ enyi anyị mgbe anyị na Ya nekwurịta okwu karị, Ọ na ahụ anyi n’anya karị, anya si otú a dịkwa ka Ya

Ka ụmụntakịrị na-etolite, mgbe ụfọdụ ha na-amalite ịhụta nsogbu. Eleghị anya ha adaba n’ọrịa, maọbụ merụọ onweha arụ. Mgbe ahụ ha akpọkuo Onyenweanyị ka O nyere ha aka gwọọ kwa ọrịa ha. Ha na-enwe obi ụtọ na ha mere Ya Enyi mgbe arụ dị ha ike, ka ọ ga-abụ na Ọ gana-anọ nso inyere ha aka mgbe ha chọrọ ọgwụgwọ.

Oge Nke Ịma Ezi ihe na Ihe Ọjọọ

Mgbe ụmụntakịrị toruru ịma ezi ihe na ihe ọjọọ -- bụ mgbe ha na-enwe amam-ikpé n’ihi mmehie -- ọ dị mkpà ikpé ekpere. Ọ bụrụ na ha chọrọ ịnọ na njikere izute Jisọs, ha aghaghị ikpere Ya karịa rịọ kwa Ya ka Ọ gbaghara ha mmehie niile ha. Mgbe ha chègharịrị, kwee kwa mkwà ifè Ya òfùfè rue ebighị-ebi, Ọ na-agbaghara ha ewee mụbata ha n’èzínaụlọ nke Chineke. Ịbụ nwa Chineke bụ mmekọrịta dị nsọ karịa ịbụ enyi.

Mgbe oge na-agabiga mmadụ amalite ịbụ okenye, nsogbu karịrị ukwu na-apụta. Chineke na-akpọ ụmụ Ya ka ha were obi chụbiga àjà ókè. Eleghị anya anyị agawo n’iru ịtụ àtụmàtụ otú anyi ga-esi bie ndụ anyị na ihe anyi chọrọ ime, ma n’otù ntabi anya ahụ Chineke wee sị ka anyị rapụ ihe niile ahụ anyị chọrọ ime wee mee ihe Ya onwe ya chọrọ. Ọ ga-ewe anyị ikpesị ekpere ike tutu anyị enwe ike imeri uche anyi wee kwere isoro uche nke Onyenweanyị

Ekpere Mmeri Nke Jekob

Anyị na-agụ banyere ekpere ahụ nke Jekọb kpere. O nyewo Chineke obi ya, ná-achọ kwa ifè Ya òfùfè. Chineke agbagharawo ya aghụghọ ahu ọ ghọrọ nwanne ya mgbe ọ bụ nwata; ma Jekob ka bi kwa n’ebe dị anya site n’ụlọ, site kwa n’ebe nwanne ya nọ.

Jekob ejiwo aghụghọ nara Isọ ọnọdụ ọkpara, ghọgbuo nna ya kpuru-ìsì mee ka o gọzie ya, ọ bụrụwo kwa ọgaranya site n’ọlu aghụghọ nke ọ lụụrụ ọgọ ya nwoke. Ma mgbe Chineke gwara ya ka ọ laa, izute nwanne ya nwoke bụ onye o mejọworo, Jekob enweghị inye-aka ọ bụla. O wee kpere Chineke maka inye-aka, o kpesi kwara ekpere ike.

Ka anyị lezie anya nkeọma otú Jekob si kpee ekpere. Chineke ekwewo Jekob mkwà na Ya ga esoro ya jee ma ọ bụrụ na ọ ga-alaghachị ụlọ. Otú ọ dị, Jekob aghaghị ikpe ekpere ka o wee nata mkwà ahụ.

Nke mbụ, Jekob sọpụụrụ Chineke dịka Chineke nke nna ya ha. Ha na Chineke agbàwo ndụ dị iche iche, Chineke azawo kwa ekpere ha. Nke ahụ mere ka Jekob nwee okwukwe na Chineke ga-anụ kwa nke ya. Anyị na-enwe okwukwe na agbam-ume iji tụkwasị Chineke obi na Ọ ga-aza ekpere anyị mgbe anyị na-echeta ekpere niile ọzọ nke Ọ zaworo anyị na ndị anyị hụrụ n’anya. Maọbụ ọ bụrụ na mmadụ matara Jisọs ọhụụ, ọ mataghị kwa ekpere ọ bụla nke azaworo, ọ pụrụ ịgụ banyere ekpere niile dị otú ahụ na Baịbụl, wee nweta kwa okwukwe site na ha.

Mgbe ahụ Jekob wedara onweya ala: “Ekwesighm ebere nile, na ezi okwu nile, nke I meworo orù-Gi.” Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịnata ihe ọ bụla n’aka Chineke. Anyị niile emehiewo, ọ bụ kwa náánị site na Mmụọ Chineke ka ana-akpọ anyị rue nchègharị. Ana azọpụta anyị n’ihi na Jisọs hụrụ anyị n’anya nke ukwuu rue ịnwụ ọnwụ na Kalvari; ọ bụ kwa site n’Ọbara ahụ nke Ọ wụsịrị ka anyị pụrụ imeri onye iro nke mkpụrụobi anyị, nweta kwa ngọzi niile nke Chineke kwere anyị ná mkwà.

Ọzọ Jekob chetaara Chineke mkwà Ya: “Gi onwe-gi siri, Aghaghm ime gi nma, M’gēme kwa nkpuru-gi ka ọ di ka ájà nke oké osimiri, nke anāpugh iguta ọnu n’ihi ọtutu ọ di.” Ọ bụrụ na anyị na-achọ ihe ọ bụla n’aka Chineke, anyị aghaghị ibu ụzọ leba anya nime Baịbụl ịhụ ma ọ dị dịka Okwu Ya si dị. Mgbe o doro anyị anya na ọchịchọ anyị ziri ezi, mgbe ahụ anyị pụrụ ikpé ná ntụkwasịobi na Ọ ga-aza anyị.

Ọzọ, Jekob malitere iwere obi ya chụọàjà. O mere ka ìgwè ewu na atụrụ na ìgwè ehi ha niile gafee ofé ọzọ nke mmiri-íyì ahụ. Ha bụ ihe onwunwe ya niile nke ụwa, bụ nke o nwetaworo. O weere ha niile n’otù nyefee n’aka Chineke. Emesịa o zipụ èzínaụlọ ya -- ndị ọ hụrụ n’anya bụ ndị dị ya n’obi karịsịa -- gafee n’ofé ọzọ. Ọ dịghị ihe ọzọ fọdụrụ ma ọbụghị náánị ya. Ọ ghaghị kwa inyefe Onyenweanyị onwe ya.

Ọ dịghị ụra dịịrị Jekob n’abalị ahụ ka ya na mmụọ ozi na agbá mgbà. Ngọzi Chineke kweworo ná mkwà dị Jekob mkpà karịa izu ike o chere na ya chọrọ. Ọ bụrụ na ọ dị mkpà ikpe ekpere abalị niile ka o wee nata ngọzi ọ na-achọ, o jikeere ime ya. Mmụọ ozi ahụ wee mee ka isi-ọsụ Jekob pụọ n’ọnọdụ ya, ma Jekob nọgidere n’ekpere ahụ. O kpe kwara rue mmeri!

Jekob nwere mmeri n’ekpere ya rue na mmụọ ozi ahụ gbanwere aha ya. Agaghị akpọ kwa ya Jekob ọzọ, onye aghụghọ ahụ naraworo ọnọdụ di-ọkpara nwanne ya, kama aga na-akpọ ya Israel, “N’ihi na iji jisiwo ike n’ebe Chineke nọ na n’ebe madu nọ, i we nwe ike.” O weere Jekob ogologo abalị nke ịnọgidesi ike n’ekpere. O weere ya iji-obi-chụọ-àjà zuru òkè nke ihe niile o nwere. Ọ bụ na o kwesịghị otú a? Chee échìchè banyere ngọzi niile ọ nataworo! Ọ bụghị náánị na ọ pụrụ izute nwanne ya nwoke n’udo n’ụbọchị na esoni -- nke ahụ bụ ihe ọ rịọworo -- kama akpọrọ ya nwa Chineke; site na mgbe ahụ ka amalitere ịkpọ ndị nke Chineke rọpụtara Ndị Israel n’aha ya ahụ. Ụmụ Jekob iri na abụọ ghọrọ ndị-isi nke ebo iri na abụọ nke Israel -- ihe niile ahụ bụ n’ihi na Jekob kpere ekpere rue mgbe ọ natara ọzịzá.

Nrọchịta Arịrịọ Ekpere Nke Abraham Rịọrọ

Nnanna Jekob bụ Abraham, bụ onye ọzọ kpere ekpere. O ruebeere Chineke isi n’ihe niile, na-ekpe kwa ekpere mgbe niile. Chineke pụrụ ikwu banyere ya sị: “Amawom ya, ka ọ we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ JEHOVA, ime ezi omume na ihe ekpere n’ikpe; ka JEHOVA we weta n’isi Abraham ihe O kwuru banyere ya.”

Ọ dị ezi mmekọrịta dị n’etiti Chineke na Abraham, na Chineke gwara Abraham banyere mbibi ahụ dị nwuta tupu Ya ezidata ikpé megide Sọdọm na Gọmọra. Abraham matara na Chineke bụ onye eziomume, na Ọ gaghị eme kwa ihe ọ bụla ma ọbughị ihe ziri ezi. Chineke ekwewo mkwà na Ya agaghị ebibiko ndị eziomume na ndị na-emebi iwu. Ma óké ibu-arọ batara n’obi ya ikpe ekpere ka Chineke napụta ndị eziomume nọ n’obodo Sọdọm.

Abraham jụrụ Chineke ma Ọ ga-arapụ obodo ahu n’ihi ndị eziomume iri ise (50). Chineke zaghachiri na Ya ga-arapụ ha. Ọ ga-arapụ ha ọ burụ na ahụta iri mmadụ anọ na ise (45)? E, Chineke agaghị ekpochapụ obodo ahụ n’ihi iri mmadụ anọ na ise ndị eziomume. Ma gịnị gaeme ọ bụrụ na achọta náánị iri mmadụ anọ? Chineke agaghị ekpochapụ obodo ahụ n’ihi iri mmadụ anọ (40), ọbụná iri mmadụ atọ (30) maọbụ iri abụọ (20). Ma Abraham ka nwe kwara ibu-arọ. Ndị ahụ bi ebe ahụ hà ga-etufu ihe niile ha nwere ná mbibi nke obodo ahụ?

Ogologo oge ra añaa ka Chineke ga-anọ ná ntachi-obi ịnā ntị na-arịrịọ Abraham banyere mkpụrụobi ndị ahụ. Anyị gaara abụ ndị n’enweghị ntachị-obi ịnagide ogologo arịrịọ ya? Ike agwụghị Chineke banyere ekpere niile nke Abraham.

Abraham matara na Chineke añawo ya ntị rii nne, o wee kwue n’ikpe-azụ sị: “Biko, ka Onyenwe anyị ghara iwe iwe di ọku, ka nkwu kwa okwu nání otù ugbò a: eleghanya agāchọta n’ebe ahu iri.” Chineke zara sị: “M’gagh-ebibi ya n’ihi iri ahụ.” Nke ahụ bụ ọgwụgwụ nke ekpere ahụ. Abraham arụgidesiwo Chineke ike n’ekpere, ebupụwo kwa ibu-arọ ahụ, ọbu ezie na ikpé bịara. Ebibiri Sọdọm na Gọmọra n’ihi na achọtaghị ọbụná ndị eziomume iri n’obodo ahụ niile. Ewepụrụ ndị eziomume site n’obodo ahụ, ewee mee ka ọku na brimstone si n’eluigwe zoo iripịa mmehie na ndị mmehie niile fọdụrụ n’ime ya.

Ndụ Enyere Chineke

Jekob na Abraham pụrụ ịnata ọzịzá nye ekpere ha n’ihi na ha biri ndụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ na n’ihi na ha kpesiri ekpere ike rue mgbe ha natara ọzịzá. Ọ dị ụfọdụ mmadụ kpesi kwara ekpere ike ọbụná buo ọnụ, n’akụkọ ochie nke Israel, ma ha anataghị ọzịzá. Nsogbu dị na ya bụ na ha ebighị ndụ ịsọpụrụ Chineke. Ndịa bụ ihe ha kwesịrị ime karịa ịdị na egosi onwe ha n’ebu ọnu na iru-uju n’ihi mmehie ha n’ụzọ aghụghọ: “Ọ bugh nka bu obubu-ọnu M’nārọputa? itọpu agbu nile nke nmebi-iwu, itọsa ihe-okike nile nke yoke, na izilaga ndi anēmegbu emegbu ka ha nwere onwe ha, ka unu tiji kwa yoke ọ bula? Ọ bugh ikèsara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n’ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n’ulo-gi? Mgbe i huru onye gba ọtọ, ka i kpuchie ya: ka i ghara kwa izonari onye-aru-gi onwe-gi?” (Aisaia 58:6, 7).

Òlee urù ogologo ekpere na ibu-ọnụ ha bara ọ bụrụ na mmadụ adịghị emeso ndị agbataobi ya omume ọma? Jemes Onye-ozi dere: “Ọ buru na nwa-nna-nwoke ma-ọbu nwa-nna-nwayi gba ọtọ, nēnwegh kwa ihe-oriri gēzuru ya kwa-ubọchi, ma otù onye n’etiti unu si ha, Labanu n’udo, nyanu ọku, riju-kwa-nu afọ; ma unu enyegh ha ihe nākpa aru-ha; ùrù gini ka ọ bara?” (Jemes 2:15, 16).

Ibụ-ọnụ

Ibụ-ọnụ (nke pụtara erighị ihe ọ bụla) abụghị ihe ana-eme iji gosi ụmụ mmadụ omume ọma. Jisọs sịrị: “Mgbe ọ bula unu nēbu ọnu, unu aghọla ndi nāgbaru iru, dika ndi-iru-abua: n’ihi na ha nēmebi iru-ha, ka ha were onwe-ha gosi madu na ha nēbu ọnu. N’ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha. Ma gi onwe-gi, mgbe i nēbu ọnu, were manu te n’isi-gi, sa kwa iru-gi; ka i ghara igosi madu onwe-gi na i nēbu ọnu, kama gosi Nna-gi Nke di na nzuzo: Nna-gi, Nke nāhu ihe na nzuzo, gēnyeghachi kwa gi” (Matiu 6:16-18).

Anyị nwere ihe-atụ nke ibu-ọnụ nime Baịbụl mgbe Chineke tinyere ibu-arọ n’obi ndị Ya. Moses rịgooro n’elu ugwu kpee ekpere bue kwa ọnụ iri ụbọchị anọ (40) n’oge Chineke nyere ya iwu ahụ, Ọ matara ibu-arọ nke ịbụ onye-ndú nde mmadụ atọ (3,000,000) baa n’Ala Nkwà ahụ, ọ chọkwara inye-aka nke Chineke. O kpesiri ekpere ike ná-erighị ihe ọ bụla.

Mgbe ọtụtụ arọ gasirị, mgbe Daniel bụ Onye-amụma n’Israel, o nwekwara ibu-arọ n’obi ya banyere ụmụ Israel ná-eme mmehie. O wee chee iru ya ịchọ Jehova “n’ekpere na aririọ amara di iche iche, n’obubu-ọnu na ákwá-nkpe na ntu” (Daniel 9:3). O bu ụzọ chetara Chineke mkwà Ya niile. Emesia o kwupụta mmehie nke ya onwe ya na mmehie niile nke ndị ahụ. Óké nnọgidesi ike n’ekpere ya dị omimi na ibu-ọnụ wetaara ya ọtụtụ ngọzi dị ebube. Mmụọ ọzi bụ Gebriel wetaara ya okwu nke amụma dị óké ebube na edere ha na Baịbụl.

Mgbe ekwensu nwara Jisọs n’ọzara, O buru ọnụ iri ụbọchị anọ (40). Jisọs na Chineke na-akparịta ụka ụbọchị niile site n’ekpere, ma n’oge óké ọnwụnwa a, O righị ihe. Otù mgbe ndị na-eso ụzọ Ya bịakutere Ya, na-achọ ịmata ihe mere na ha apụghị ịchụpụ mmụọ ọjọọ ụfọdụ, Ọ zara sị, “Mọ di otú apugh iputa ma-ọbugh site n’ekpere na ibu-ọnu” (Matiu 17:21). Mgbe ụfọdụ ọ na-ewe mmadụ karịa ikpesi ekpere ike tupu ya anata Chineke ike iji lụọ ọlụ ụfọdụ. Anyị nwere ike nwee ibu-arọ n’obi rue na agụụ iri ihe ga-apụ n’ime anyị; maọbụ anyị nwere ike jụ iri ihe wee si otú a gosi Chineke otú o si dị anyị mkpà wee site kwa na ya nata ngọzi dị iche iche Ọ ga-atụkwasịrị anyị.

Ụfọdụ emewo ibu-ọnụ dịka usoro okpukpé, na-etigwaghị ya Mmụọ Chineke, na-eme kwa ya tutu rue mgbe ọ na-emebi arụ ịdị ike ha. Ụdị ahụ esiteghị n’Onyenweanyị. Ibu-ọnụ ụbọchị atọ na-ewepụghị aka ezuwo. Mgbe Onyenweanyị kpaliri mmadụ ọ bụla ịrapụ nri ihe n’otù oge iwere obi ya niile chee arịrịọ ya n’iru Onyenweanyị, Onyenweanyị ga-aza kwụghachị kwa ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị ka ụmụntakịrị na-arịọ Onyenweanyị mgbe ha na-ekpe ekpere?
  2. Gịnị ka nwata ọ bụla kwesịrị ikpé n’ekpere mgbe o nwere nwuta n’ihi mmehie ya?
  3. Gịnị ka Jekob mere tupu ọ malite ikpe ekpere ya na Jabok?
  4. Gịnị ka Jekob rịọrọ na-ekpere? Ihe ra añaa ka ọ natara karị nke ọ rịọworo?
  5. Gịnị ka Abraham mere mgbe Chineke gwara ya na agaje ibibi Sọdọm?
  6. N’ihi mmadụ òle ka Chineke jikeere ịrapụ obodo Sọdọm?
  7. Gịnị mere Jekob na Abraham ji pụ inwe olile anya ka Chineke zaa ekpere ya?
  8. Gịnị ka “ibu-ọnụ” pụtara?
  9. Òlee mgbe mmadụ kwesịrị ibu-ọnụ?
  10. Òlee otú mmadụ kwesịrị ido onwe ya mgbe ọ na-ebu ọnụ?