Ọpupu 20:11; 34:21; Levitikọs 26:2; Aisaia 58:13, 14; Nehemaia 10:31; Matiu 12:1-8; Mak 2:27

Lesson 268 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Emere ka m’nọ nime Mọ Nsọ n’ubọchi Onye-nwe-ayi” (Nkpughe 1:10).
Notes

Ụbọchị Onyenweanyị

Tupu mmadụ abụrụ onye pụrụ idebe Ụbọchị Onyenweanyị, ọ ghaghị ibu ụzọ mata nke bụ ụbọchị ahụ. Ná-agbghị agụgọ mgbe Jọn kwuru okwu banyere Ụbọchị Onyenweanyị na Nkpughe 1:10, ọ na-ekwu banyere Sọnde bụ ụbọchị mbụ n’ízù ụbọchị asaa. Jọn bụ onye achụpụrụ site n’obodo ya pụọ n’ebe Ndị Kraist niile fọdụrụ nọ, ma ọ nọ nime mmụọ nke òfùfè na nsọpụrụ mgbe Onyenweanyị zutere ya n’ebe ahụ.

Kraist biliri n’ọnwụ n’ụbọchị mbụ nke ízù. Ọtụtụ oge O zutere ndị na-eso ụzọ Ya n’ụbọchị mbụ nke ízù ụbọchị asaa. Ndị na-eso Ya na-ezukọ n’ụbọchị mbụ nke ízù ịnyawa achịcha n’otù (Ọlu Ndi-ozi 20:7) na iweta onyinye afọ ofufo ha nye Onyenweanyị (I Ndi Kọrint 16:2). Onyenweanyị gosipụtara nkwenye Ya banyere ụbọchị mbụ ahụ site n’igọzị ndị Ya na-efè òfùfè na Sọnde na izite kwa Mmụọ Ya n’ụbọchị mbụ nke ízù nye ndị ahụ na-ekpe ekpere n’ụlọ elu ahụ n’Ụbọchị Pentikọst, iri ụbọchị ise mgbe mbiliten’ọnwụ nke Kraist gasịrị. Ngwa ngwa Kraist bilisịrị n’ọnwụ ka eweere ya dịka ụbọchị òfùfè, ezi Ndị Kraist niile na-edebe kwa ya site n’oge ahụ rue taa.

Ndị Ju na-edebe Ụbọchị izu ike ha nke bụ ụbọchị nke asaa n’ízù. N’oge nke Iwu, ọ bụ ụbọchị ifè òfùfè na izu ike, nke ewepụtara ichè maka nsọpụrụ Chineke. Ụbọchị izu ike bụ ụbọchị ewepụtara iche nke ịsọpụrụ Onyenweanyị. N’oge nke Iwu, Ụbọchị izu ike nke Ndị Ju bụ Satọdee. Site na mgbe Kraist bilisịrị n’ọnwụ, ụbọchị ndị Kraist na-efè òfùfè bụ Sọnde. Chineke bụ Onye kwesịrị ka efè Ya ma sọpụkwara Ya kwa ụbọchị, ma otù ụbọchị a ka ewepụtara nnọọ ichè maka nsọpụrụ Chineke.

N’ihi Mmadụ

Jisọs kụziri na “emere ubọchi izu-ike n’ihi madu, emegh madu n’ihi ubọchi izu-ike” (Mak 2:27). Ekère mmadụ tupu ụbọchị Izu ike. Ọ bụ Chineke kère mmadụ n’ihi Onwe ya -- ifè na ịsọpụrụ Chineke (Ndi Kọlọsi 1:16). Onyenweanyị wepụtara Ụbọchị izu ike ichè doo kwa ya nsọ n’ihi ọdị mma nke mmadụ. Ụbọchị nke izu ike na ifè òfùfè bàra uru nye arụ na mkpụrụobi nke mmadụ.

Anyị na-alụ ọlụ ụbọchị isii -- ọtụtụ mmadụ n’ihi ọdịmma nke onwe ha -- otù ụbọchị ahụ nke fọdụrụ n’ízù ka anyị ji Chineke n’ụgwọ. Aghaghị iwepụta ụbọchị a ichè site n’ụbọchị niile ọzọ nke anyị na-aghaghị ichèfu mkpà na ọlụ anyị nke ụbọchị niile, nyebiga kwa onwe anyị óké n’ihe banyere Onyenweanyị na ikwu ihe banyere Ya n’ebe ọdị ukwu karịa.

Iwu Nke Anọ

Moses, onye ndú nke Ụmụ Israel, natara Iwu ahụ n’aka Chineke n’Ugwu Sainai. Nime ihe niile enyere n’Iwu ka Iwu Iri ahụ dị. Iwu nke anọ, nime Iwu Iri ahụ, bụ banyere Ụbọchị Izu ike. Ọ bụ “Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ” (Ọpupu 20:8). Onyenweanyị kọwaara Moses na Ụmụ Israel na ụbọchị isii dị nke ha ga-alụ ọlụ ha ma ụbọchị nke asaa nime ízù bụ ụbọchị izu ike. “N’ihi na n’ubọchi isi ka JEHOVA mere eluigwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n’ubọchi nke-asa: n’ihi nka ka JEHOVA gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ” (Ọpupu 20:11).

N’ụbọchị izuike, udo, na ịnọ jụụ nke a, ha ga-echeta na ha bụworo orù n’Ijipt ma Jehova “were aka di ike, were kwa ogwe-aka esetiri eseti, me ka isi n’ebe ahu puta” (Deuteronomi 5:15).

Ụbọchị Izu ike

Chineke kwuru banyere ụbọchị a sị, “I gagh-eje ozi ọ bula nime ya.” Nke a gaabụ ụbọchị izu ike nye mmadụ niile -- ọbụná ụmụntakịrị, ndị-orù, ndị-ọbịa, na anụ-ụlọ -- ka ha wee “zuruike” (Ọpupu 23:12). Mgbe efèsịrị òfùfè n’ụbọchị Sọnde, site n’ịgụ Akwụkwọnsọ, n’ikpe ekpere, na n’ikwu okwu banyere Onyenweanyị, ana-eme ka mmadụ nwee ike ọhụụ n’anụ-arụ na nime mmụọ. Mkpụrụobi ya na-eriju afọ nwee kwa ngọzi. Arụ ya na-ezuruike site ná ndọgbu n’ọlụ. Mgbe alụrụ ọlụ ekwesịrị ịlụ n’etiti ízù n’ụbọchị Sonde, maọbụ mgbe eji ụbọchị Sonde mere ụbọchị ịchụso iheụtọ nke ụwa, ana-eme ka mkpụrụobi mmadụ nọgide n’agụụ, ike na-agwụsị kwa mmadụ n’anụ-arụ ịmalite ọlụ nke ízù ụkọ ọhụụ.

Ikpé Nke Ọnwụ

Ido Ụbọchị izuike nsọ bụ iwu nke Chineke nyere, Ọ na-achọ kwa ka ndị Ya debe ya. N’oge nke Iwu, ana-enye mmadụ ahụhụ dị ukwu n’ihi ileda Ụbọchị Izuike anya. Anyị na-agụ na “onye nēme ya ka ọ ghara idi nsọ, aghagh ime ka ọ nwụa: n’ihi na onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēbipu onye ahu n’etiti umu-nna-ya” (Ọpupu 31:14). Taa, ndị niile na-anọgidesi ike n’ileda ụbọchị Sọnde anya ga-achọpụta na ọ bụghị náánị na ha na-anọ n’agụụ n’ihe nke mmụọ kama na ha anwụwo nime mmụọ.

N’ọtụtụ arọ niile gara aga, ndị obodo anyị niile na-edebe Ụbọchị Onyenweanyị nsọ. Ana-akpọchi ụlọ-ahịa niile, ana-akwụsị ịlụ ọlụ n’ubi niile, ọ na-afọdụ ntakịrị ka ọ bụrụ mmadụ niile ga aga chọọchị ifè Chineke òfùfè. Enyere iwu dị iche iche banyere ahụhụ aga-enye onye ọ bụla ga-emerụ Ụbọchị Onyenweanyị. Chineke sọpụrụ obodo anyị n’ihi omume ahụ dịka Ọ na-asọpurụ ndị na-asọpụrụ Ya. N’ụbọchị ndịa, ekwensu emewo ka obi ọtụtụ mmadụ sie ike, wezuga kwa onwe ha n’ebe Chineke nọ. Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihe ụtọ nke onwe ha na-achọ kwa ka ehichapụ iwu niile nke obodo banyere ụbọchị Sọnde.

N’ụbọchị ndịa ọ bụghị ihe ịtụn’anya ịhụ ụmụ mmadụ ka ha na-alụ ọlụ n’ubi na n’ụlọ ahịa dị iche iche, na-alụ ụdị ọlụ dị iche iche; ma ọ dịghị Chineke ụtọ. Ọ bụrụwo ihe anwapụtara na ụmụ mmadụ adịghị enwe ọgan’iru dịka o kwesịrị mgbe ha na-emerụ Ụbọchị Onyenweanyị site n’ịlụ ọlụ. Ọ bụ omume nke Ndị Kraist niile iwezuga onwe ha n’ịlụ ọlụ n’ụbọchị Sọnde n’ihi urù nke ihe ana-ahụ anya. Ha na-arọrọ ọlụ ha ga-enwere onwe ha n’ụbọchị Sọnde ifè na ịsọpụrụ Chineke. NdịKraist ụfọdụ ajụwo ịnabata mbuli elu n’ọlụ ha, ụfọdụ ajụwo kwa ọlụ ụfọdụ n’ihi na ọ ga-eme ka ha lụọ ọlụ n’Ụbọchị Onyenweanyị. Chineke na-asọpụrụ na-agọzi kwa ha n’ihi ime otú ahụ. Ndị na-edebe Ụbọchị Onyenweanyị na-egosi na ha hụrụ mmekọrịta nke ha na Chineke na ọlụ ha n’ebe Ọ nọ n’anya karịa ọlụ nke aka ha. Ọlụ ụfọdụ dị ana-aghaghị ịlụ n’ụbọchị Sọnde. Ma ọ bụ na ọlụ ọzọ adịghị Onye Kraist ga-alụ.

Nkwadebe

Ọ dị ebe edere ya n’Akwụkwọnsọ banyere otù nwoke ledara ụbọchị izuike anya site n’ịchịkọta nkụ n’ụbọchị ahụ (Ọnu-ọgugu 15:32). Nwoke a natara ụgwọ-ọlụ nke mmehie ya. Emere ka ọ nwụọ, dịka okwu nke Onyenwe anyị si dị. Ọ bụrụ na nwoke a mere njikere kwesịrị, ọ gaghị achịkọtaworị nkụ n’ụbọchị nsọ ahụ.

Mgbe Ụmụ Israel na-ejeije n’ọzara, Chineke zitere manna iji zụọ ha, Onyenwe anyị dọkwara ha aka ná ntị banyere nkwadebe n’ihi Ụbọchị Izuike ka ihe ọ bụla ga-eme ka ha lụọ ọlụ n’ụbọchị ahụ wee ghara ịdị. Ụmụ Israel na-achịkọta manna ahụ n’ụtụtụ ọ bụla n’ihi na “mgbe anyanwu di ọku ọ gbaze.” N’ụtụtụ niile rue ụbọchị isii nime ízù ana-achọta manna; ma ndị ahụ na-egeghị ntị n’olu Jehova wee pụa ịchịkọta n’ụbọchị nke asaa chọpụtara na ọ dịghị. Onyenwe anyị gwara ha ka ha chịkọta nke ga-ezuru ha ụbọchị abụọ n’ụtụtụ ụbọchị nke isii, ebe ụbọchị nke na-eso ya bụ ụbọchị dị nsọ. Jehova sịrị, “Ihe unu nēghe, ghenu ya, ihe unu nēsi kwa, sienu ya; ma ihe nile nke fọdụrụ, dọparanu onwe-unu ya, ka ọ buru ihe-ndebe rue ututu” (Ọpupu 16:23).

Ijikere maka ụbọchị nsọ ahụ tọrọ Jehova ụtọ. Manna ahụ na-adịgide na-emebighị ma ha chịkọta karịa nke ga-ezu otù ụbọchị n’ụbọchị nke isii, ma oge ọ bụla ọzọ ha chịkọtara karịa otú ha kwesịrị ịchịkọta n’otù ụbọchị, manna ahụ na-emebi gbaa kwa ikpuru.

Mgbe mmadụ mere njikere na àtụmàtụ kwesịrị maka idebe ụbọchị Onyenweanyị, ọ dịghị ihe ọ bụla ga-eme ka onye ahụ gosipụta enweghị nsọpụrụ. Ndị Kraist na-eme mkwadobe maka Sọnde site n’ime ka ụlọ, ihe-oriri, uwe, gburugburu ebe obibi ha na ụgbọ-ala ha dị otú ha kwesịrị tụpu ụbọchị ahụ erue. Sọnde abụghị ụbọchị aga-alụ ọlụ dị iche iche n’ekwesighị gburugburu èzínaụlọ anyị. Ụmụ ntakịrị gahụ na ha lụrụ ọlụ ha kwesịrị ịlụ n’èzínaụlọ ngwa ngwa tutu oge ahụ erue. Mgbe ọ nadịghị mfé, nke a agaghị abụ ihe ngọpụ nye ha ịrapụ ịlụ ọlụ ha, maọbụ inye-aka, maọbụ idebe onwe ha ọcha. Ido Ụbọchị Onyenweanyị nsọ adịghị eme ka mmadụ bụrụ onye ume-ngwụ, n’ihi na ọ na-alụ ọlụ Onyenweanyị.

Otù Ngọzi

Enwere ọtụtụ ngọzi -- udo, inwe ihe n’uju, nchebe, na nnonye nke Chineke -- ọ bụrụ na Ụmụ Israel erubeisi n’iwu niile nke Chineke nke otù nime ya bụ idebe Ụbọchị Izuike na ịsọpụrụ ebe nsọ nke Jehova (Levitikọs 26:2). Ewezuga ngọzi ndịa, ekwere mkwà na aga-ebuli ndị nke Chineke elu na ha ga-enweta kwa ihe nketa ma ọ bụrụ na ha akpọọ Ụbọchị izuike ihe nsọpụrụ. Ha ga-achọta ihe ụtọ n’irubeisi ọ bụrụ na ha asọpurụ Onyenweanyị n’ụzọ nke Ya kwuo kwa okwu nke Ya kama ikwu nke onwe ha (Aisaia 58:13, 14). Mgbe mmadụ na-ahụ Chineke n’anya n’ezie na-erube kwara Ya isii, ihe na-atọ Ya ụtọ karịsịa bụ ijere Chineke ozi. Sọnde bụ ụbọchị kachasị mma ịmalite ịgụ ihe ọmụmụ sitere na Baịbụl na amaokwu ibun’isi nke ízù ụkọ na-esoni.

Ọ dị ka ụfọdụ mmadụ na-echè na Sọnde bụ ụbọchị nke aka ha, ụbọchị nke ha nwere ime otú ọ dị ha mma. Ha ji Sọnde mee ụbọchị egwri egwù na ịkpa-aghara, na-echèghị échìchè banyere Chineke.

Ịzụ Na Iré-ahịa

Chineke kwusiri okwu ike banyere idebe Ụbọchị izuike n’òzùzù òkè. Ihe ọ bụla emere ga-abụ n’ihi otuto nke Chineke. Ekwuwo na ewezuga mmheie nke ikpere arụsị, ọ dịghị mmehie ọzọ eji abara ndị Ju mbá ọtụtụ mgbe karịa mmehie nke ime Ụbọchị izuike ka ọ ghara ịdị-nsọ. N’oge nke Nehemaia enwere ihe-atụ ebe abaara Ụmụ Israel mbá n’ihi asọpụrụghị Ụbọchị izuike.

Nehemaia laghachiri na Jerusalem inyere Ụmụ Israel aka wughachi mgbidi nke obodo ahụ mgbe ndị-iro bibisiworo ya. Nehemaia chọpụtara na Ụmụ Israel na-egosipụta enweghị nsọpụrụ n’ebe Ụbọchị Izuike dị. Ha kwenyere ka ana-achịkọta mkpụrụ na ebubata kwa ibu ahụ nime obodo n’Ụbọchị izuike. Eleghị anya ha chere na aghaghị ịchịkọta mkpụrụ nke ubi ha mgbe ha chara, ma o kwesịrị ka echetara ndị ahụ okwu nke Jehova kwuru: “Ubọchi isi ka I gālu ọlu gi, ma n’ubọchi nke-asa i gākwusi: n’ilu-ọlu-ubi na n’owuwe-ihe-ubi i gākwusi” (Ọpupu 34:21).

Ụfọdụ nime Ụmụ Israel bụ ndị na-azụ ahịa. Ha na-enwata ihe ha ji ebi ndụ site n’ịzụ na iré ahịa. Eleghị anya ha adịghị emeghe ụlọ-ahịa ha ma ndị Israel na-azụrụ ahịa n’aka ndịkom Taia na ebubata azụ nime obodo n’Ụbọchị izuike. Eleghị anya ndị Israel adịghị alụ ọlụ n’Ụbọchị izuike ma ha na-eme ka ndịọzọ na-alụ ọlụ, ha adịghị asọpụrụ ụbọchị ahụ site n’ịzụ ihe-oriri na “ihe ọ bụla anēre-ere” (Nehemaia 13:15, 16). Nehemaia baara Ụmụ Israel mba wee jụọ sị “Gini bu ihe ọjọ a nke unu onwe-unu nēme, nēme kwa ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ?” Nehemaia mere karịa náánị ịbambá, o mechiri ọnụ-ụzọ niile nke obodo ahụ wee debe ndị nché “ka aghara ibụbata ibu nime n’ubọchi-izu-ike.” Mgbe ndị ahịa ahụ na ndị na-ere ihe dị iche iche na-ejegharị n’azụ obodo o wee chụlaga ha basie kwara ha mba ike na ya “gēseti aka” imegide ha.

Dịka n’oge nke Nehemaia, Ndị Kraist taa adịghị alụ ọlụ ọ bụla nke aka ha n’Ụbọchị nke Onyenweanyị. Ha na kwadobe ihe niile tupu ụbọchị ahụ ka ha wee ghara ịzụ ihe, iré-ahịa, maọbụ ịkwụ ụgwọ n’ụbọchị Sọnde, n’ihi na ọ bụ ihe na-abaghị úrù na nke na-adịghị enye Chineke nsọpụrụ.

Ndị Òzìzí Nke Ndị Ju

Ọ dị ọbụbụ-ọnụ akpọkwasịrị ndị na-etinye ihe na ndị na-ewepụ ihe site n’okwu niile nke Chineke (Ilu 30:6; Nkpughe 22:18, 19). Ụfọdụ ndị-ozizí nke ndị Ju na-ejidesi idebe iwu nke anọ ike karị otú o kwesịrị. Ha na-etinye ihe n’okwu Chineke, mee kwa ya ka o buo ibu. Nke a mere mgbe Jisọs nọ n’ụwa. Otù ụbọchị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ Ya na-agabiga n’ubi ọka, agụ gụrụ ha; nke a mere na ha ghọọrọ ọka taá. Ndị Farisii hụrụ ha wee kwujọọ kwa ha, n’ihi na ha mere nke a n’Ụbọchị izuike. Ha ekwughị na ha mere ihe ọjọọ ịghọrọ ọka n’ubi onye ọzọ, n’ihi na enyere ha ike iri ihe n’ubi onye agbata-obi ha ebe ọ bụ na ha ejighị mmà iwè ihe ubi ná-aghọrọ ha maọbụ itinye mkpụrụ vine n’ihe were laa n’ụlọ (Deuteronomi 23:24, 25). Ndị Farisii chere na Jisọs na ndị na-eso ụzọ Ya na-egosipụta Ụbọchị izuike. Ọ bụ ezie na ha ghọọrọ ọka ahụ taá, kama ọ bụ n’ihi mkpà. Jisọs kuziri na mmadụ anọghị n’ikpe ọmụma nke imebi Ụbọchị izuike ma ọ bụrụ na ọ lụrụ ọlụ ebere na ọlụ dapụtara ná mkpà n’Ụbọchị izuike. Jisọs nyere ihe-atụ dị iche iche igosipụta na ịnọ ná mkpà na-eme ka mmadụ bụrụ onye ikpé nke asọpụrụghị Chineke na-amaghị. Devid ọ bụghị onye ikpé ná-amaghị mgbe o riri achịcha ana-eché n’iru Chineke nke ọ bụ náánị ndị-nchụ-àjà ka o ziri ezi n’iwu iri ( I Samuel 21:6; Mak 2:25, 26)? Ọ bụ na ndị nchụ-àjà ahụ lụrụ ọlụ n’Ụbọchị izuike abụghị ndị na-adịghị ịta-ụta n’ihi na ha lụrụ ọlụ ha nke igbu anụ eji achụ àjà n’ihi òfùfè nke Ụlọ-ikwu Chineke (Ọnu-ọgugu 28:9, 10)?

Jisọs gwara ndị Farisii na ha amaghị Okwu Chineke ma ọbụghị otú a ha agaghị amaworị ndị-ikpé n’amaghị ikpé. Ndị Farisii na-eleru anya idebe otù akụkụ iwu Chineke ma lefuru akụkụ nke ọzọ anya. Ndị Farisii na-echeta ememe na ịchụ àjà niile ma ha adịghị egosi obi ebere. Chineke gwara Ụmụ Israel site n’ọnụ Hosea bụ Onye-amụma na Ya chọrọ ebere, ọ bụghị àjà, na Ya chọkwara ka ha nwee ọmụma Chineke karị àjà-nsure-ọkụ niile (Hosea 6:6). Ihe Chineke chọrọ n’aka ndị Ya bụ “ime ihe ekpere n’ikpe, na ihu ebere n’anya, na iji obi-ume-ala” soro Chineke-gị na-eje ijè (Maika 6:8). Nke a pụtara na ọ bụghị náánị n’Ụbọchị izuike ka aga-eme ihe ndịa, kama n’ụbọchị niile n’izu, ma ndị Farisii adịghị eme ha.

Mgbe ndị Farisii jụrụ Jisọs ma o ziri ezi n’iwu ime ka arụ mmadụ dị ike n’Ụbọchị izuike, Ọ zara sị, “O ziri ezi n’iwu ime ihe ọma n’ubọchi izu ike” (Matiu 12:12). Jisọs chetaara ha na ha na-alụ ọlụ iwepụta atụrụ ha ma ọ bụrụ na ọ daba n’òlùlù n’Ụbọchị izuike. Ma lee otú mmadụ dị oké ọnụ-ahịa karịa atụrụ ka ewee meere ya ebere n’Ụbọchị izuike?

N’ụbọchị ndịa mgbe ọtụtụ mmadụ adịghị asọpụrụ Chineke na Ụbọchị Onyenweanyị ihe egwù dị n’ebe ọtụtụ mmadụ dị abụghị na ha na-ejisi ya ike karị dịka ndị Farisii, kama ọ bụ óké ejighị ya kpọrọ ihe. Ka anyị, dịka Ndị Kraist, bụrụ ihe-atụ nye ndịọzọ n’ido Ụbọchị Onyenweanyị nsọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ Ụbọchị Onyenweanyị?
  2. Òlee ụbọchị bụ ụbọchị izuike na ifè òfùfè nke Onye Kraist?
  3. Òlee otú anyị si edo Ụbọchị Onyenweanyị nsọ?
  4. Gịnị ka Onye Kraist na-eme n’ụbọchị Sọnde?
  5. Gịnị ka Onye Kraist na-adịghị eme n’ụbọchị Sọnde?
  6. Òlee ụbọchị ewepụtara ichè nye nsọpụrụ na otuto nke Chineke?
  7. Òlee otú mmadụ ga-esi jikere maka ụbọchị Sọnde?
  8. Gịnị bụ ihe-ụtọ mmadụ pụrụ inweta n’ụbọchị Sọnde?
  9. Gịnị ka nwata pụrụ ime n’ụbọchị Sọnde iji nye Chineke nsọpụrụ?
  10. Gịnị ka okwu Jisọs pụtara mgbe Ọ sịrị, “Emere ubọchi izuike n’ihi madu, emegh madu n’ihi ubọchi izuike”?