Levitikọs 6:2-5; Ọnu-ọgugu 5:6-8; Ezikiel 33:14-16; Matiu 5:23, 24; Luk 19:8, 9

Lesson 269 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gagh-agara ya: ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n’aru ya” (Ilu 28:13).
Notes

N’okpuru Osisi Sycomore

Okporo-ụzọ nke Jeriko jupụtara ná ndịkom, ndịnyom na ụmụntakịrị ndị nwere ịnụ-ọkụ n’obi. Ilepụ anya n’ogologo ụzọ ahụ anyị ga-ahụ otù osisi sycomore nke nwere ahịhịa ndụ dịka osisi mulberry. Anyị hụrụ Jisọs ka Ọ na eduru ìgwè mmadụ gaa n’okpuru osisi ahụ. Na mberede, otù onye ọna-ụtụ amaara nkeọma, bụ Zakiọs wee gafere ìgwè mmadụ ahụ ngwa ngwa. Ọ kwụsịrị n’okpuru osisi ahụ, setịpụ aka ya wee jide otù alaka osisi ahụ, wee malite ịrịgoro n’elu ya. Ọ bụ nwoke nke na-achọghị ịma ihe ụmụ mmadụ na-eche banyere ya -- ihe kachasị ya mkpà bụ àkụn’ụba.

Ma ụbọchị taa pụrụ ichè: eleghị anya emechiri ụlọ ọlụ ya emechi -- ụtụ niile aga anata ga-echere. Ọ ghaghị ihụ ihe na-adọrọ igwè mmadụ niile na-agafe n’ebe ọ na-alụ ọlụ. Ugbu a, ka o ledara anya site n’elu osisi ahụ, anya ya zutere anya nke Onye ahụ na-ahụ gafee anụ-arụ nke “nwoke nkpukpu a.” Anya nke Ọkpara Chineke hụrụ bamie ime ime ala nke échìchè ya zoro ezo, ọchịchọ ya nile, nzube ya niile, àtụmàtụ ya niile na olile anya ya niile. Dịka onye amam-ikpé nyịgidere n’obi na mberede -- emesịa nchègharị, agụụ, ọchịchọ, ojuju-anya, n’ikpe-azụ, ọñụ ana-apụghị ịkọwa -- Zakiọs wee rịdata ngwa ngwa na-ekwu okwu ndịa, “Onye-nwe-ayi, nkera ihe m’nwere ka m’gēnye ndi ogbenye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n’ebubo ugha, m’gēnyeghachi anọ anọ” (Luk 19:8).

O jiri ọñụ nabata Jisọs nime obi ya dịka Onye nzọpụta na Onye mgbapụta ya; o ji kwara ọñụ nabata Jisọs dịka Ọbịa n’ụlọ ya. Lee otú ndị ahụ si dahiee bụ ndị sịrị na Jisọs gara ịbụ ọbịa n’ụlọ nwoke bụ onye mmehie! Zakiọs abụghị kwa nwa Abraham náánị site n’ọmụmụ, n’ihi na ugbu a ọ bụrụwo kwa nwa Abraham site n’okwukwe.

Ọ dịghị kwa abalị nke ararụghị ụra dịrị Zakiọs, na akọn’uche nke ná-ámá ya ikpé n’ihi úrù n’ezighi ezi. Ná-agbaghị agụgọ akpọrọ ya asị dịka akpọrọ ndị ọna-ụtụ niile nke ọchịchị Rom n’ihi urù dị ukwu n’ezighi ezi ha na-enweta n’ijé ozi a. Ugbu a Jisos agbagharaworo ya ọ chọkwara ka ụmụ mmadụ gbaghara ya. Ọ maara iwu ndị Rom, bụ nke na-ekwu na mmadụ ga-akwụghachị onye mejọrọ ya okpukpu anọ; iwu ndị Ju bụ na ị ga-akwụghachị ihe ahụ tukwasị kwa ise ọzọ n’elu ya. O gosịrị njikere ya “ime ihe ọ bula asị ya mee” site n’okwu o kwuru ngwa ngwa ahụ, “Ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n’ebubo ugha, m’gēnyeghachi anọ anọ.” Mgbanwe dị ukwu batara ná ndụ nwoke ọna-ụtụ a nwere aka ntagide nke mere na ọ ga-enye nkera nke ihe o nwetara n’ụzọ ziri ezi iji nyere ndị ogbenye aka, na ịkwụghachị ihe o nwetara n’ụzọ ná ezighi ezi okpukpu anọ anọ.

Idozi Ihe Niile Emebiri emebi

Ihe a mere na ndụ nke onye a doziri ihe niile o mebiri n’oge gara aga na-egosi na Chineke chọrọ ka mmadụ dozie ụzọ ya mgbe azọpụtasịrị ya. Mgbe Jisọs batara n’obi mmadụ, ngwa ngwa O na etinye ọchịchọ n’obi ahụ iweghachị ihe niile onye ahụ zuru n’ori, rịọ arịrịọ maka okwu ụgha niile o kwuworo, dozie kwa ihe niile o mebiri. Ọtụtụ mgbe ka ọ na-abụ na mgbe onye mmehie bịara n’oche-eze amara ịchọ nzọpụta, ihe ọjọọ niile o mere n’oge gara aga na-apụta n’iru ya n’otù n’otù. Ọ bụrụ na o kwe Chineke mkwà na ya ga-edozi ihe niile, Ọbara Jisọs n’ekpuchi obi ya o wee nwee mgbaghara mmehie site n’Eluigwe. Mgbe ahụ, n’etufughị oge, ọ ga “enyeghachi ihe-ibe, kwughachi ihe ọ punara madu n’ike, jègharia n’ukpuru nile nke ndu, ghara ime ajọ omume” (Ezikiel 33:15). Jisọs ga-agbaghara kwa ihe niile ọzọ nke mmadụ n’apụghi idozi.

N’oge Agba Ochie, n’okpuru Iwu, ọ bụrụ na mmadụ mee ajọ omume – kwuo okwu ụgha, ghọgbue onye ọzọ, ñụọ iyi ụgha, were ihe na-abụghị nke ya, chọta ihe furu efu wee kwuo okwu ụgha banyere ya -- ọ ga-edozi ihe o mebiri site n’iweghachị ihe ahụ ma tụkwasị kwa otù ụzọ n’ụzọ ise ọzọ n’elu ya. Mgbe ahụ ọ ga-ewere ebulu na enweghị ntụpọ site n’ìgwè anụ ya, jekwuru onye nchụ-àjà onye ga achụrụ ya àjà mkpuchi mmehie n’iru Jehova. “Agāgbaghara kwa ya; banyere ihe ọ bula nime ihe nile nke o nēme, nke ikpe mara ya nime ya” (Levitikọs 6:7). Ya mere, anyị hụrụ na ọ dị mkpà ka ya na nwanna ya mee udo tupu o were àjà ya bịakute Chineke.

Ịbụ Onye Chineke Na Mmadụ Gbaghara

Ka anyị were anya ime mmụọ leba n’ihe mere n’Ụlọ-ukwu Chineke na mgbe ochie. Anyị ga-ahụ otù onye Israel na nwa anụ ya n’akụkụ ya. O wee ba n’ogige nke ndị Israel ebe ọ na-eche onye nchụ-àjà ka ọ nara àjà ya. Aga-ewere ya gbue, emesịa eweta ya n’elu ebe ịchụàjà. Ọ na-achọ mgbaghara mmehie, ọ na-eguzo n’ebe ahụ n’eziokwu niile eleghị anya ọ na-echere n’ahịrị. N’oge a dị nsọ, na mberede, o cheta na otù nwanna ya nwere ihe ịta-ụta megide ya. Ọ na-asị, “Ngwa ngwa m’chụsịrị àjà a m’ga ejekwuru nwannam ná-etufughị oge ka mụ na ya kpezie”? É-è! Ọ na-arapụ ihe ịchụ-àjà ya n’iru ebe ịchụ-àjà ahụ, jekwuru nwanna ya dozie nghọtahie ọ bụla dị n’etiti ha.

Nke ahụ bụ náánị ụzọ esi anabata onyinye ha n’iru Chineke n’oge ochie; taa kwa anyi agaghị atụ-anya na Jisọs ga-agbaghara anyị ọ bụrụ na anyi ejikereghị idozi ihe ọjọọ niile anyị mere megide ndịọzọ dịka anyị nwere ike. Ọ bụrụ na anyi apụghị ịhụ nwanna anyi n’anya bụ onye anyị na-ahụ anya, anyị ga-esi añaa hụ Chineke bụ Onye anyị na-adịghị ahụ anya n’anya? Jisọs sịrị, “Ọ buru na i nēche onyinye-gi n’iru Chineke n’ebe-ichu-àjà, i we cheta n’ebe ahu na nwa-nne-gi nwere ihe megide gi, rapu onyinye-gi n’ebe ahu n’iru ebe-ichu-àjà, laba, buru uzọ me ka gi na nwa-nne-gi di n’udo, mgbe ahu bia kwa che onyinye-gi” (Matiu 5:23, 24).

Lee otú anyị na-enyochasị onwe anyị nkeọma tupu anyị esoro ná Nri-anyasi nke Onyenweanyị! Ndị nke Chineke na-enwe nleru anya ịhụ na ọ dịghị nghọtahie dị n’etiti ha na nwanne ha, na ọ dịghị kwa ihe dị n’etiti mkpụrụobi ha na Onye nzọpụta ha. Mgbe niile anyị aghaghị ịbụ ndị nwere “akọ-na-uche nādigh-asu ngọngọ n’ebe Chineke na madu nọ” (Ọlu Ndi-ozi 24:16), nke pụtara na amam-ikpé ọ bụla agaghị adị n’obi anyị.

Ka asị nnọọ na Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla banyere idozi ụzọ. Ọ bụ na akọn’uche gị ọ gaghị agwa gị na ị ghaghị iweghachị ihe i zuru n’ori, maọbụ kwụọ ụgwọ ihe ahụ ị zụrụ, ọ bụrụ na ị chọrọ inwe ịgba-àmà dị ọcha nke ga-eduba gị n’ebe obibi ahụ dị n’elu? Obi nke gị onwe gị ọ gaghị akpanyere gị n’olu ntà na ị ghaghị ikwupụta okwu ụgha niile ka i wee nwere onwe gị pụọ n’amam-ikpé.

Idozi ụzọ ejikọtaghị náánị idozi ihe banyere ego, dịka izu ori, urù na-ezighị ezi, na ụgwọ ana-akwụghị akwụ; kama o jikọtakwara ikwupụta okwu ụgha niile ekwuworo, okwu-azụ niile, nkwujọ niile ekwuworo mmadụ n’ụzọ na-ezighị ezi, ịkpọ-asị, na obi-ọjọọ -- ihe niile ahụ nke mmadụ ga-esiteworị na ha mejọọ ndịọzọ site n’okwu maọbu omume. I nwere ike ịsị, “nwannam amaghị na m’kwuru okwu ọjọọ banyere ya.” Ma òlee ihe banyere onye ị gwaworo okwu ahụ? Ná-arụghị ụka i mekpara ya arụ, eleghị anya ọ gwara ya ndịọzọ. Ị ga-ejekwuru onye ahụ ị gwara ya kwupụta ya. Aghaghị idozi ihe nille nke emebiri n’ụwa ebe a ma ọbụghị otú a aga-ezute ha n’ụwa nke na abịa. Ọ ga-adị mma ọ bụrụ na anyị ezute ha n’ebe a ebe “Onye-ndụm-ọdụ” ukwu ahụ, onye na-edozi okwu niile, pụrụ ibu anyị ụzọ gaa ime ka obi ndị anyị mejọrọ dị nrò. “Nmehie madu ufọdu nāputa ìhè, n’ihi na ha buru uzọ nāga ikpé; ma nmehie madu ufọdu nēso kwa ha n’azu” (I Timoti 5:24).

Ịzá Òkù Ahụ

Anya Onyenweanyị na ahụ onye na-achọ eziokwu na ihe ziri ezi, mkpụrụobi Ya na-achọsi ike, mmụọ Ya na-akpọ òkù na-akụ kwa n’ọnụ-ụzọ obi nke onye ọ na-agụsi agụ ike nke na-agbalị kwa ịhụ Jisọs. Zakiọs mere ngwa ngwa ịbịakute Jisọs. Nke ahụ bụ ụzọ esi anata ihe n’aka Jisọs -- mee ihe O kwuru mme kwa ya ọsọsọ. Nwaokoro ahụ bụ Samuel zara ngwa ngwa sị, “Lem” Otù aka ahụ, Abraham zakwara ngwa ngwa, “Lem.” Ọzịzá nke Aisaia bụ, “Lem; zigam.” Enwere ụfọdụ ndị na-aza ọkpụkpọ òkù nke Mmụọ Nsọ n’ụbọchị ikpe-azụ ndịa. Òlee ihe banyere gị onwe gị? Àkpọwo aha gị? Ị nụwo olu nke Mmụọ Nsọ wee sị “Agam esi na mmehiem chigharịa, mee ihe ekpere n’ikpe n’eziomume; m’ga-enyeghachi ihe-ibem, kwụghachị ihe m’pụnaworo mmadụ n’ike; m’ga-ejègharị n’ụkpụrụ niile nke ndụ ghara ime ajọomume”? Ndị niile na-eme nke a nwere mkwà ahụ na “ọ ghagh idi ndu, ọ gagh-anwu” (Ezikiel 33:14, 15). Ndụ ebighị-ebi ná-echere ndị niile mezuru ihe niile Chineke chọrọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị ka Baịbụl n’ekwu banyere ịchọta ihe dị iche iche furu efu?
  2. Aga-eweghachị ihe niile ezuru n’ori nye onye nwe ya?
  3. Ọ bụrụ na nwanna gị nwere ihe megide gị, i kwesịrị ichèrè rue mgbe ọ ga-abịakute gị idozi ya?
  4. Kọwaa otú Zakiọs si dozie ụzọ ya?
  5. Ọ dị mkpà na aga-ekwupụta okwu ụgha niile ekwuworo?
  6. Gịnị ka ịbụ “nwa Abraham” pụtara?
  7. Ànyị bụ ụmụ Abraham?
  8. Ànyị pụrụ ịtụ-anya ịga Eluigwe ma ọ bụrụ na anyị edozighị ụzọ anyị?