Deuteronomi 4:9, 10; 6:3-15; Joshua 24:15; Job 1:1-5; Abù Ọma 78:1-8; Matiu 14:19; 15:36; Ọlu Ndi-ozi 27:33-37; I Timọti 4:4, 5; 5:4

Lesson 270 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n’omume-ya nile, ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi” (Ilu 20:11).
Notes

Ezinaụlọ

Anyị na-ahụ ka nna, nne, na ụmụ anọ na-anọdụ ala na nchèrịta iru ọkụ nke dị nime otù ụlọ nime obodo. Ebe niile dara nnọọ jụụ ka anya ha niile tụgharịrị na-ele nna ahụ. Mgbe ahụ anyị wee nụ ka nna ahụ ji olu dị nwayọ na-agụpụtara ụmụntakịrị ahụ akụkọ ha ga-anụ tupu ha edina rarụ ụra.

Ma chere! Nke a karịrị akụkọ aga-anụ tupu ararụ ụra! Ihe o ji n’aka bụ Baịbụl. Mgbe ọ gụsịrị isiokwu ahụ, mmadụ isii ndịa bụ otù ezinaụlọ wee gbunye ikpere n’ala, ma welie kwa olu ha kpọkue Chineke n’ekpere, ka ọkụ ahụ na-adanyụ. Ha keleritara onweha ekele ịsị ka chi bọọ nkeọma, emesia ndị ezinaụlọ a ndị nwekwara obi-ụtọ wee baa ịrarụ ụra. Anyị wee kpebie na ụdị ihe a bụ ihe na-adịghị eme mgbe niile n’ụbọchị ndịa, ọ bụ ihe na-eme mgbe ochie, ọbụná enwere ike ichè na akpọghachiri échìchè anyi azụ ihe dịka iri arọ abụọ na ise maọbụ karịa, n’ihi na o siri ike ịchịkọta ụdị ezinaụlọ dị otú a taa.

Ka anyị lee kwa anya nime ezinaụlọ ọzọ nke Nijirịa, dịka ihe ịma-atụ, otù ezinaụlọ mepere anya dị n’otù obodo ukwu. Ebe ahụ anyị ga-ahụ otù nna ọzọ, nne, na ụmụ ha. Ha ji nnọọ óké mmasị na ele ma na-anụ kwa otù akụkọ ha na-anụ tupu ha ararụ ụra, dịka ha si eme. Ma otú ọ dị esiteghị n’Okwu Nsọ Chineke ná-agụpụta akụkọ nke a kama o sitere na radio. Sinima ntakịrị dị n’ebe ahụ; anyị na-anụ kwa olu dị iche iche nke ọchị, na nke itimkpu. Chi na ejimi ma ezinaụlọ ahụ nọkwa na-ege ntị ma ji kwa mmasị na-ekiri kwa televishịọn ahụ. Anya ụmụntakịrị achawo ọbara ọbara, ụra na-ero kwa ha, ma ihe ngosi ahụ agwụbeghị kwa, ihe nkiri ahụ ka na-aga kwa n’iru n’iru.

Mgbe mmadụ na-atule ndụ ụmụntakịrị azụlitere n’ụdị ezinaụlọ abụọ ndịa, ọ gaghị esi ike ịhụ urù nke òfùfè ezinaụlọ bara. N’ezie ana-enwe ọtụtụ ngọzi na-eso ụmụ azụlitere n’èzínaụlọ ebe ana-ekpe ekpere. Ma ọ bụ ihe nwuta ikwu, na ọ fọdụrụ ntakịrị ụlọ ebe ana-atụ egwú Chineke dịka na mgbe ochie bụrụ ihe nke gabigaworo agabiga. Anyị na-ebi n’ọgbọ nke na-aga ọsọsọ, site n’otù ebe mafere ebe ọzọ. Ihe ana-ahụ bụ nnọọ ime ihe ọkụ ọkụ, nchekasị, isi n’otù ebe gbafere ebe ọzọ, site n’ụtụtụ rue abalị. Náánị nwa oge ntà ka ana-enye Chineke.

Ihe ọmụmụ Baịbụl n’Ézìnaụlọ

Ka anyị leba anya n’Okwu Chineke wee hụ ụdị ézìnaụlọ ana-anara nkeọma n’iru Ya. Chineke gwara ụmụ Israel okwu site n’orù Ya bụ Moses sị, “Okwu ndia, nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta, gādikwasi kwa n’obi-gi: i gējisi kwa ike izí ha umu-gi, i gēkwu kwa okwu banyere ha mgbe i nānọdu n’ulo-gi, na mgbe i nēje ijè n’uzọ, na mgbe i nēdina ala, na mgbe i nēbili ọtọ” (Deuteronomi 6:6, 7). Ọ diwo mgbe ọ bụla ịgbalịsịrị ike ịmụ otù akụkụ nke Akwụkwọnsọ buru ya n’isi? Site n’igụgharị ya mgbe niile -- mgbe ịna-anọdụ ala nime ụlọ, mgbe ịna-ejègharị, mgbe ịna-achọ idina ala, na ihe mbụ mgbe ịna-ebili n’isi ụtụtụ -- ọ gaghị adị anya i wee mụta ya nkeọma. Nke ahụ bụ ụzọ ndị mgbe ochie ga-eji kuziere ụmụ ha okwu niile nke Jehova, ebe ọ bụ na akwụkwọ Iwu edereede dị ole-na-ole n’oge ahụ. Agwa kwara ha ka ha dee ụfọdụ ahịrị nke Iwu ahụ n’elu akpụkpọ anụ ma kedo kwa ha n’egedege iru ha maọbụ n’aka ha. Anyị amataghị ma ha na-eyikwasị ya oge niile maọbụ ha adịghị eyikwasị ya, ihe nke a pụtara bụ na ha ga-elezi anya idebe Iwu nke Chineke ma debe kwa ya mgbe niile n’iru ha ma ghara kwa ichefu ya. Agwa kwara ha ka ha dee okwu niile nke Iwu ahụ n’awara ụzọ niile nke ụlọ ha na n’ọnụ-ụzọ ámà ha niile.

Otù Nna Kwesịrị Ntụkwasị-obi

Mgbe Joshua, bụ orù Chineke, onye kwesịrị ntụkwasị-obi na-agaje ịnwụ, ọ kpọkọtara ndị Israel wee gwa ha okwu banyere ịdị mma nke Chineke. Dịka ụmụ na-eguzo gburugburu akụkụ àkwà ndị mụrụ ha (maọbụ) nne na nna ha ịnụta okwu ikpe-azụ ha niile, otú a ka ndị Israel gere ntị ịnụ okwu ikpe-azụ niile nke onye ndú ha. Ma mgbe ọ gụkọtasịrị ngọzi niile nke Jehova ọ sịrị: “Ọ buru na ọ jọ njọ n’anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfe òfùfè.” N’ụzọ ọzọ: “I gaghị atụfu oge ọzọ; kpebie taa; emela otú igwe mmadụ na-eme, kama mee otú ndị ziri ezi si eme.” Ọ dịghị mkpebi ọzọ dịrị Joshua n’akụkụ nke ya: ụlọ ya, ézìnaụlọ ya, ụmụ ya, ndị orù ya -- “gèfe JEHOVA òfùfè.” Joshua bụ onye ikpé na onye ọchịchị ma Chineke bụ ihe mbụ ná ndụ ya.

Nke a bụ oge dị óké mkpà nye Israel, ọ bụ kwa oge dị óké mkpà mgbe Mmụọ Chineke na-akpọ onye ọ bụla inwe mkpebi. Ị zawo òkù Kraist ma sị kwa, “Ma mu onwem na ulọm, ayi gēfe JEHOVA òfùfè”? Eleghị anya ike gị erughị iritara Kraist ndị ụlọ-akwụkwọ gị niile maọbụ ndị Klasị unu niile n’urù. Ma ọ bụrụ na ị nweghị ike ịkpọtara Kraist ọtụtụ dịka o si agụ gị n’obi, kpọta otú nwere ike. Ọ bụrụ na ibie ndụ Onye Kraist, na-agụ Baịbụl gị, na-ekpe ekpere, i nwere ike ịkpọta ndị niile bụ ndị ézìnaụlọ gị, ọ bụrụ na azọpụtabeghị ha.

Ihe Nketa Nke Ịsọpụrụ Chineke

Ọ bụrụ na i bụ nwanta nwoke maọbụ nwanta nwanyị ndị nne na nna ha kuziworo ịhụ Chineke n’anya ma feè kwa òfùfè; ọ bụrụ na ha akụziworo gị iwu Chineke niile, n’ezie i nwere iruọma. Ọ na-amasị Chineke ịhụ ndị nne na nna, nne na nna ochie, nnenne na nnanna ochie ndị kụziworo ụmụ ha okwu Chineke, “ka ọgbọ nke gādi n’iru we mara, bú umu agāmu; ha gēbili we kọrọ umu-ha akukọ ahụ: ka ha we tukwasi obi-ha na Chineke, ghara ichezọ omume nile nke Chineke, ma debe ihe nile O nyere n’iwu” (Abù Ọma 78:6, 7). Ọ dịghị nne na nna pụrụ ikpuchi mmehie nke ụmụ ha. Ha nwere ike ikpere ụmụ ha ndịkom na ndịnyom ekpere, náánị ma ụmụ ndịa ha chigharikutere Chineke chègharịa kwa ná mmehie ha, ha ga-ala n’iyi.

Òfùfè Kwa Ụbọchị

Mgbe ana-agụ Baịbụl n’oge òfùfè nke ézìnaụlọ, meghee “ntị” nke obi gị. Ọ bụrụ na i mee otú a, ị ga-ama ihe bụ ezi ihe na ihe ọjọọ nke a ga-enye gị ike ịsị É-è mgbe ana-asị gị mee ihe niile nke akọn’uche gị na-agwa gị na o kwesịghị ekwesị n’ebe Onye Kraist nọ.

Ọ bụrụ na ọ dị nwanta nwoke maọbụ nwanta nwanyị n’etiti ndị na-agụ ihe ọmụmụ a, nke na-enweghị ohere a pụrụ ichè inwe nna maọbụ nne bụ Onye Kraist, anyị na-arịọsi gị ike iwepụta oge n’ụtụtụ tupu oge ụlọ-akwụkwọ eruo, na n’oge abalị iji kpee ekpere. N’oge ahụ gụọ Baịbụl gị ma zute kwa Onyenweanyị n’ekpere. Ụtụtụ bụ oge kasị mma. Nye Chineke oge ná mmalite ụbọchị; ewezugala ya rue mgbe anyanwụ dara. Ị pụrụ isite n’ebe Ọ nọ nweta ịdị ụtọ nke pụrụ inye gị ike ka i ghara inwe mgbarụ iru site ná nchègbu niile pụrụ izute gị n’ụbọchị.

Amara N’oge Nri

Ọ dị ka oge agafewo mgbe ọtụtụ ézìnaụlọ na Nijiria na agbakọ gburugburu na tebụl nri, mgbe akpọrọòkù nri anyasị ha wee rulata isi mgbe nna ha ga-ekpe ekpere ná nri ahụ. Okwu Chineke nwere ọtụtụ ihe nleru anya ná-akụziri anyị na mmadụ ọ bụla kwesịrị ịrịọ ngọzi Chineke ná nri ya tupu o rie ya. Ná nri-anyasị ikpe-azụ nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ Ya riri n’abali ahụ arara Ya nye, O weere achịcha, mgbe O kelesịrị ekele, Ọ nyawara ya (Ndi Kọrint 11:23, 24). Anyị niile matara akụkọ abụọ ahụ banyere ìgwè mmadụ ahụ eji ihe-oriri zụọ. Tupu ha erie nri ahụ n’oge ọ bụla, Jisọs weliri anya n’Eluigwe wee gọzie nri ahụ, kele kwa ekele, wee nye ndị na-eso ụzọ Ya ka ha nye igwè mmadụ ahụ. Pọl nyekwara Chineke ekele tupu o rie nri ya (Ọlu Ndi-ozi 27:33-37). Ọ bụ na o kwesịghị ka anyị nye Chineke ekele n’ihi nri nke ụbọchị niile nke Ọ na-enye anyị n’ụba, nke kachasị anyi bụ ndị Nijiria.

Nye Ndị Nne na Nna na Ụmụ

Ụmụ azulitere n’ụlọ dị iche iche ebe ewezugaworo òfùfè nke ézìnaụlọ na ebe adịghị asọpụrụ Chineke ga na-enwe ọnwụnwa nime ụwa nke ga-eme ka ha tụfuo mkpụrụobi ha n’ebighị-ebi ma ọ bụrụ na enyeghị ha ohere ịchọ ma chọta kwa Chineke. Ụfọdụ nime ihe ọjọọ na-abụ ọnyà nye mkpụrụobi ụmụ-okorọbịa na ụmụ-agbọntà bụ ndịa: sinima, televishịon, ihe-arụ, na ihe ike dị iche iche ana-amụ na redio, ejiji ụwa, ịñụ anwụrụ, egwuri egwú dị iche iche, ite egwú n’ụlọ-akwụkwọ dị iche iche, mgbakọ ememe oriri n’ọñụñụ dị iche iche nke ụwa, na akwụkwọ ihe ngosi dị iche iche na-akọ maka ihe-arụ na akpali ọchị. Ò kwesịghị ka nne na nna ọ bụla na Onye nkuzi ụbọchị-ụkọ ọ bụla jisie ike ná-akụziri ụmụntakịrị Okwu Chineke ka ewee kwadobe ha ịlụso ike niile nke ajọ ihe ọgụ? Ndị ọzụzụ-atụrụ na-agwa anyị na anụ-ọhịa wolf agaghị anwụde nne atụrụ ma ọ bụrụ na o nwere ike ijide nwa-atụrụ ntà. Ụmụntakịrị dị ka ụmụ-atụrụ ntà ná-enweghị ike inyere onwe ha aka.

Ọziọma dịrị ndị nne na nna dị kwara ụmụ. Ọ bụrụ nnọọ na i nweghị ohere iji kpee ekpere, i nweghị ohere n’ezie. Ọ bụrụ na nwantakịrị adịghi enweta ọzụzụ Onye Kraist n’ụlọ ma bụrụ kwa onye ana-adịghị eziga ụlọ-akwụkwọ ụbọchị ụkọ, òlee ebe ọ ga-anụ banyere Chineke? N’ezie ọ bụghị n’ụlọ-akwụkwọ ọra mmadụ ndịa niile ebe egbochiworo ihe ọmụmụ Baịbụl!

Okwu Chineke nyere iwu sị, “Zulite nwata dika uzọ-ya si di, ọbuná mgbe o mere okenye ọ gagh-esi nime ya wezuga onwe-ya” (Ilu 22:6). Ndị na-adịghị ewepụta oge mee nke a na anapụ ụmụ ha ihe nketa nke ebighị-ebi ga-ekpughe dịka óké ihe ịlá n’iyi. Ì nwere ebe ana-ekpe ekpere n’ụlọ gị?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye ka anyi ga-atụ egwú?
  2. Òlee otú ogo ịhụ Chineke n’anya ga-ara.
  3. Kwuo otú ndị Israel ga-esi ná-akụziri ụmụ ha Iwu Chineke?
  4. Òlee ụdị nna Joshua bụ?
  5. Akụkụ ole dị iche iche n’Akwụkwọnsọ ka ị ga-achọta ihe gbasara ikele ekele tupu anyị erie nri anyị?
  6. Òlee ngọzi dị iche iche na-eso ndị azụlitere n’ụlọ ndị Kraist?
  7. Ị na-agụ Baịbụl n’ekpe kwa ekpere ụbọchị niile?