Deuteronomi 6:6-9; Ndi Efesọs 6:1-4; Mak 10:7-12 Matiu 5:32; Ndi Efesọs 5:22-32

Lesson 271 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala” (Mak 10:9).
Notes

Mmalite nke Nwanta

Ọgbakọ mbụ nke Chineke mere ka ọ dị n’elu ụwa bụ èzínaụlọ. Siterị n’ogige Iden tupu enwee ụlọ-akwụkwọ na ụlọ chọọchị dị iche iche enweworị èzínaụlọ.

Ebe mbụ nwanta na-echeta bụ èzínaụlọ nke o si pụta. Ndị nkụzi mbụ ọ na-enwe bụ nne na nna ya. Nwanta amụrụ ọhụụ amaghị ihe ọzọ karịa iri ihe na ịrarụ ụra, ngwa ngwa mgbe ọ malitere ikwu okwu ọ na-ajụ ajụjụ dị iche iche. Ọ maghị ihe bụ ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi nke a nne na nna ya aghaghị ịzụpụta ya ma bụrụ kwa ihe nlere anya nye ya. Nwanta na-amụta ihe ọsọsọ karịsịa site n’iñomi ndịọzọ.

Akwụkwọnsọ na-agwa anyị na amụrụ mmadụ niile nime mmehie, na kwa échìchè niile nke mmadụ site n’ọmụmụ bụ náánị ihe ọjọọ. N’ihi nke a ọ bụrụ na agwaghị nwanta ihe ọ ga-eme, ọ ga-eme iheọjọọ. Ọ na-egosi óké iwe na isi ike mgbe ọ ka dị ntà; ma ọ bụrụ na enyeghị ya ahụhụ, omume ndịa ga-eto.

Irube-isi

Otù nime ihe ọmụmụ kachasị ukwu nke nne na nna na aghaghị ikụziri ụmụ ha bụ nrube-isi, ma ha aghaghị ịmalite nke a n’oge. Adịghị enwe ịhụn’anya dị ukwu n’èzínaụlọ nke ana-arapụ ụmụntakịrị ka ha mee otú ọ masịrị ha. N’oge na-adịghị anya ha na-abụ ndị na-achọ náánị ihe nke onwe ha. Iwu ahụ bụ: “Umu, nañanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n’ihi na nka bu ihe ziri ezi. Sọpuru nna gi na nne (nke bu ihe mbu enyere n’iwu nke nkwà diri ya” (Ndi Efesọs 6:1, 2).

Iduzi nwanta apụtaghị iti ya aka mgbe niile. Ndị nne na nna pụrụ ịkpali ụmụ ha ọtụtụ mgbe ime omume ọma n’ebe ọ dị ukwu site n’ịkparịta ụka, na-egosi ha na Baịbụl ebe ha jehiere, ma kọwa kwara ha ndahie ha. Mgbe Chineke na-akpọ ndị mmehie ikpé mara ka ha bịakute Ya. Ọ na-asị: “Biko bianu, ka ayi rurita uka” (Aisaia 1:18). Okwu Chineke kwukwara, “Ndi bú nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe” (Ndi Efesọs 6:4).

Ma mgbe nwanta ahụ jụrụ okwu niile nke eji obiọma kwuo na mgbalị niile maka igbochi ya ime ihe ọjọọ, aghaghị ime ya n’ike ka o rube-isi site na “mkpà-n’aka nke nduzi,” maọbụ iti ya ihe. “Onye JEHOVA nāhu n’anya ka ọ nābara nba; ọbụná dika nna si abara nwa ya nke ihe-ya nātọ Ya utọ mba” (Ilu 3:12).

Otù nwaokorọbịa nke tolitere wee bụrụ ụkọ Chụkwu sịrị: “Anam ekele Chineke n’ihi inye ahụhụ niile, n’ihi oge niile nke nnam sorom kpee ekpere. Nnam, site n’ekpere na ụtarị, dubatara nwa ya nwoke n’ijéozi Chineke.”

Nlefuru anya nke Nne na nna

Chineke ga-ekpe ndị nne na nna ndị na-adịghị enye ụmụ ha ahụhụ mgbe ha mehiere ikpé. Ilai bụ onye-isi nchụ-àjà nke kwesịrị ịbụrị onye nsọ nke Chineke. Ma mgbe ọ hụrụ ụmụ ya ndịkom ka ha na-eme ihe ọjọọ, ọ gwara ha náánị otù mgbe na ha ekwesighị ime otú ahụ ma mgbe ahụ ọ rapụrụ ha ka ha na-eme otú masịrị ha. Chineke sịrị, “Egosiwokwam ya na Mu onwen nēkpe ulo-ya ikpé rue mgbe ebigh-ebi, n’ihi ajọ-omume nke ọ mara, n’ihi na umu-ya ndikom nēwetara onwe ha nkọcha, ma o gbochigh ha” (I Samuel 3:13). Anapụrụ Ilai ọkwa nke ịbụ onye-isi nchụàjà, ma ahụhụ enyere ya bụ na agadị ọ bụla agaghị adị n’èzínaụlọ ya -- ụmụ ya ndịkom ga-anwụ n’okorọbịa.

Ọbụná eze Devid hụrụ ahụhụ n’ihi na o gbochghị nwa ya n’ime ihe ọjọọ. Baịbụl gwara anyị na ọ dịghị mgbe ọ bụla Devid sịrị Absalọm é-è, ma mgbe Absalọm tolitere o wee leda nna ya anya site n’ịchọ ịnapụ ya ala-eze ya. O were anya Absalọm nwụrụ n’enweghị nchègharị.

Ụmụntakịrị ndị na-erubere nne na nna ha isi ndị ana-akụziri ịlụ ọlụ na inyere ndịọzọ aka bụ ụmụntakịrị nwere ọñụ. Ị nwere ike ichè na ana-eleda gị anya mgbe ana-adịghị ekwe gị ime ihe ị chọrọ, maọbụ kwa na i nwere ike ichè na nne na nna gị bụ ndị nwere obi ọjọọ mgbe ha na-enye gị ahụhụ; ma ị ga-achọpụta na ị ga-enwe ọtụtụ ndị enyi karịa, ụmụ mmadụ ga-ahụ kwa gị n’anya karịa mgbe ha hụrụ na ị bụ onye na erube-isi, na-ahụ mmadụ n’anya ma nwee kwa obiọma.

Ihe nsepụta dị iche iche

Ọ dị ihe ọ bụla aga-ahụ n’ụlọ gị nke ga-egosi ndịọzọ na ọ bụ èzínaụlọ nke Onye Kraist? Ị nwere ihe nsepụta Jisọs n’ụlọ gị? Gịnị bụ ihe nsepụta mbụ ndị i nwere ike icheta? I nweghị ike ichefu ihe ụfọdụ nke ị na-ahụ kwa ụbọchị mgbe ị dị na nwanta. Chineke matararị na ụmụntakịrị na-echetakarị ihe ha hụrụ karịa ihe ha nụrụ, n’ihi nke a Ọ gwara Moses ka ọ gwa ndị ahụ ka ha dee iwu ahụ “nāwara-ụzọ abua nke ulọ-gi na n’ọnu uzọ-ama-gi nile” (Deuteronomi 6:9). Ihe nsepụta na ihe odide dị iche iche mara mma na-akọwa ihe anyị kweere nke dị n’ụlọ anyị na-enyere anyị aka icheta ihe banyere Jisọs. Otù ihe odide dị mma nke na-akọwa ihe anyị kwere bụ:

“Kraist bụ Onye-isi nke èzínaụlọ a

Onye Ọbịa nke ana-adịghị ahụ anya mgbe ọ

bụla ana-eri ihe,

Onye Na-ege nti ná Mkparita ụkà niile

Na-ekwughịokwu

Èzínaụlọ nke Gị

N’arọ ole-na-ole dị n’iru, ọ bụrụ na Onyenweanyị anọọ ọdụ i ga-etolite wee chọọ kwa èzínaụlọ nke aka gị. Ọlụlụ di na nwunye mbụ malitere n’ogige Iden, ma Chineke bụ onye mere ememe nke agbam-akwụkwọ ahụ. Ọ sịrị: “N’ihi nka ka nwoke ga-arapu nna-ya na nne-ya, rapara n’aru nwunye ya: ha ewe ghọ otù anu-aru” (Jenesis 2:24). Nke ahụ bụ otù nime iwu mbụ nke Chineke nyere banyere mmadụ. Jisọs kwukwara ya ọzọ, ma tụkwasị kwa n’elu ya: “Ya mere ha abugh kwa madu abua ọzọ kama ọ bu otù anu-aru. Ya mere ihe Chineke kekọtara, madu atọsala” (Mak 10:8, 9).

Cheta ụkpụrụ ahụ mgbe itolitere ịlụ di na nwunye. Cheta na Chineke sịrị na nke a na-adịgide oge niile ị na-adị ndụ. Chineke na-edekọta ihe banyere ọlụlụ di na nwunye gị, Ọ na-anụ kwa mgbe ị na-asị, “rue mgbe ọnwụ na-ekewa.” N’enweghị obi abụọ, ọrịa na nsogbu ga-abịa n’èzínaụlọ gị. (Ha na-abịara mmadụ niile). Ọtụtụ mgbe i gaghị enwe ego ga-ezuru gị. igbó mkpà gị niile. Ma ị kwere mkwà n’iru Chineke, n’oge agbam-akwụkwọ gị, na ị ga-ekwesị ntụkwasị-obi “n’ọrịa na n’aru isi ike, n’iru uju na n’ọñụ, n’ahuhu na n’ihe onwunwe.” Lezie anya mgbe ị na-ekwe mkwà ndị ahụ na i kpebirị idebe ha, n’ihi na Chineke ga-ajụ ase ha n’aka gị.

Ejikọtara n’Otù

Pọl Onye-ozi dere: “Iwu kekọrọ nwayi nke nwere di n’arụ di-ya mgbe di-ya nọ ná ndụ: ma ọ bụrụ na di-ya nwuru, atọpuwo ya n’iwu nke di-ya. Ya mere otú a, agākpọ ya nwayi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke dị ichè mgbe di-ya nọ ná ndu: ma ọ buru na di-ya nwuru, ọ puwo n’iwu nwere onwe-ya, nke nēme ya ka ọ ghara ibu nwayi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche” (Ndi Rom 7:2, 3). Ma Chineke sịrị na ọ dịghị nwanyị maọbụ nwoke ná-ákwá iko nke ga-aba n’Ala-eze nke Chineke. Edekọtara ha na ndị na-ekpere arụsị, ndị n’añụbiga manya ókè na ndị ogbu mmadụ (Ndi Galetia 5:19-21).

Jisọs kwukwara otù aka ahụ, na onye ọ bụla nke ga-alụ nwanyị nke onye ọzọ luwororị ma chupu kwa ya, ná-ákwá iko (Matiu 5:32). Ebipuru Jọn onye ọwụmmiri isi n’ihi na ọ gwara Herod na ọ bụ mmehie ịlụ nwunye nwanne ya nwoke. Nke a bụ òzìzí dị mkpà ma ọ bụghị otú a, Jọn agaghị enwenworị mkpebi ịga n’ụlọ mkpọrọ ma nye kwa ndụ ya n’ihi ikwusa ya.

Lepụ anya n’iru ntakịrị mgbe ị na-echè na ị chọrọ ịlụ di. Nwa okorọbịa ahụ na-egbu mara mara onye gị onwe gị na-achọsi ike, ọ bụ ụdị nna nke ị na-achọ ka ụmụ gị nwee? Ị ga-achọ ịrapụ aha gị, nsọpụrụ gị, ma jikere kwa iweda onwe gị n’okpuru ya? Nwa-agbọghọ ntà ahụ onye ị na-egwusị egwú mgbe niile, ọ ga-abụ ezigbo nne nye ụmụ gị? Ọ ga-esi nri gị ma lekọta kwa èzínaụlọ gị nkeọma? Ọ bụrụ na ụmụ okorọbịa ga-eche uche banyere ajụjụ ndịa niile, èzínaụlọ nke ga-ekewa ga-adị ole-na-ole n’otù arọ maọbụ abụọ mgbe agbam-akwụkwọ gasịrị.

Ihe kpatara eji nwee ọtụtụ èzínaụlọ kewara ekewa bụ na ana-arapụ ụmụntakịrị ka ha tolite n’enweghị ezigbo ọzụzụ. Ana-enye ha ihe ọ bụla ha chọrọ na-alụghị ọlụ ọ bụla banyere ya, ha na-atụ kwa anya inweta ihe ọ bụla ha chọrọ mgbe ha tolitere. Ha na-achọkarị ịga n’ụzọ nke onwe ha karịa iche échìchè banyere ọdị mma ndịọzọ.

Cheta, na ọlụlụ di na nwunye bụ ihe dị n’etiti mmadụ abụọ nke onye ọ bụla nime ha na-aghaghị ịlụ ọlụ nke dịrị ya wee mezu kwa ozi nke ya. Onye ọ bụla nime ha aghaghị ịmụta otú ọ ga-esi na-ekwupụta mkpà ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ma kwekọrịta n’otù ihe.

Ịdịn’otù Nime Mmụọ

Ọ bụrụ na ị bụ onye nke Kraist, lezi anya ka ị hụ na onye nke ị na-arọrọ bụ Onye Kraist. Okwu Chineke sịrị: “Unu na ndi nēkwegh ekwe ekekọtala onwe-unu, n’ihi na unu na ha di iche: n’ihi na òle nkekọ ezi omume na imebi-iwu nēkekọ ma-ọbu òle nnwekọ ìhè na ọchichiri nēnwekọ? (II Ndi Kọrint 6:14). Ma lezie anya na onye nke ị na-alụ alụbeghị di na nwunye na mbụ.

Ihe ọzọ aga-ebu n’uche bụ na Chineke sịrị, “N’ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n’aru nwunye ya” (Jenesis 2:24). Site na mgbe ahụ gaa n’iru ha bụ otù, bụrụ kwa ndị ekewapụrụ n’ebe nne na nna ha nọ. Ndị lurụ di na nwunye ọhụụ ga-enwe ọñụ karịa ma ọ bụrụ na ha ebiri náánị ha ma na-edozi nsogbu dịrị ha n’onwe ha ná-agbakurughị nne na nna maka imere ha ebere n’oge niile ọ bụla nke ha nwere nghọtahie n’etiti onwe ha. Mgbe ụfọdụ ọ na-ewe mmadụ abụọ ahụ ọtụtụ arọ ịmụta ịghọta onwe ha nkeọma, ma ọ na-ewe kwa ntachi-obi na nnagiderịta n’akụkụ ha abụọ ime ka ndụ ha bụrụ ihe nwere obi ụtọ

Ọlụ Dị Iche iche dịrị Di

Ka anyị lebe anya n’ọlụ dị iche iche nke Chineke nyere ndị bụ di. “Ndi bu di, hunu nwunye unu n’anya, dika Kraist ayi hu kwa ra nzukọ Ya n’anya, rara kwa Onwe-Ya nye n’ihi ya; … Otú a ndi bu di ji kwa ugwọ ihu nwunye nke aka ha n’anya dika ha huru aru nke onwe ha n’anya. Onye nāhu nwunye nke aka-ya n’anya nāhu onwe-ya n’anya” (Ndi Efesọs 5:25, 28).

Mgbe nwoke kwesịrị mkwà nke ọlụlụ di na nwunye, ọ pụtara na ọ ghọwo onye-isi nke èzínaụlọ bụrụ kwa onye nwe ọlụ nke ilekọta ya nkeọma. Baịbụl kwuru na onye ọ bụla nke na-adịghị elekọta èzínaụlọ nke aka ya jọrọ njọ karịa onye ná-ekweghị ekwe (I Timọti 5:8). Lezie anya hụ na i nwere njikere maka ịlụ ọlụ a tutu gị alụọ nwunye.

Ọlụ kachasị mkpà nke dịrị nwoke n’ebe èzínaụlọ ya dị ga-abụ ikụziri ụmụ ya iwu niile nke Chineke. Mgbe Chineke kpọrọ Abraham ịbụ nna nke ndị Ya nke Ọ rọpụtara Ọ sịrị: “N’ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi ga-anọchi ya, iwu ka ha we debe uzọ JEHOVA, ime ezi omume na ihe ekpere n’ikpe” (Jenesis 18:19).

Chee uche ihe nwuta ọ ga-abụ nye nne maọbụ nna ma asị kwarị na ụmụ ha tolitere ma dị kwa ike n’anụ-arụ, bụrụ ndị mara ihe nkeọma, ma di kwa mma n’ile ha anya ma mesịa tufue mkpụrụobi ha n’ọkụ-ala-mmụọ.

Chineke ná-agwa anyị na nwoke ahụ nke na-elekọta nzukọ Kraist aghaghị ịbụ onye ga-ebu ụzọ lekọta èzínaụlọ nke aka ya nkeọma, “nēnwe kwa umu-ya n’okpuru ya n’ikwesi nsọpuru nile ( I Timọti 3:4).

Pita Onye-ozi na-enye ndị bụ di ndụmọdụ dị ntà banyere ịsọpụrụ nwunye ha: “Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye unu bikọ n’uzọ ihe-ọmuma, nēkeye ihe bu nwayi nsọpuru, dika onye nādigh ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara igbochi ekpere-unu” (II Pita 3:7). Ọ bụrụ na nwoke ahụghị nwunye ya n’anya maọbụ inye ya nsọpụrụ ọlụ ruru ya, Onyenweanyị ekweghị mkwà ịnụ ekpere ya. Agaghị asọpụrụ ọlụ ya nke ọ na-alụrụ Onyenweanyị ma ọ bụrụ na ọ na-emeso èzínaụlọ ya omume obi ọjọọ na nke enweghị ịhụn’anya.

Nwoke ọ bụla aghaghị ịbụ ihe nlere anya nye ụmụ ya. Ị ga-achọ ka ụmụ gị mee otú ị na-eme mgbe ihe wutara gị? Nna ọ bụla ga-elezi anya idebe mkwà niile o kwere ọbụná n’ihi ndị dị ntà; ma ọ bụrụ na ọ pụghị ime ya, ọ ga-elezi anya ịhụ na ọ kọwara ihe kpatara ya. Ọ ghaghị ịbụ onye na-ekwu eziokwu ma ọ bụrụ na ọ na-atụ anya ka ụmụ ya ná-asọpụrụ ya.

Ọlụ dị Iche iche diri Nwunye

Ugbu a ka anyị leba anya n’ọlụ nke dịrị nwunye. “Ndi bú nwunye nēdonu onwe-unu n’okpuru di nke aka unu, dika n’okpuru Onye-nwe-ayi. N’ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye nzọputa nke aru” (Ndi Efesọs 5:22, 23).

N’akwụkwọ ilu anyị hụrụ onyinyo mara mma nke ezi nwanyị, ma o kwuru ihe banyere ya: “Obi di-ya atukwasiwo ya obi, … nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bugh kwa ihe ọjọ ubọchi nile nke ndu-ya … ọnu-ya ka ọ sagheworo na amam-ihe; iwu nke ebere dikwasi kwa n’ire-ya. Ọ nēchè ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke ọma, ọ bugh kwa nri ume-ngwu ka ọ nēri” (Ilu 31:11, 12, 26, 27). Ị mara ihe ụgwọ-ọlụ ya bụ? “Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma; di-ya kwa, o nēto kwa ya” (Ilu 31:28).

Ọ bú ọlụ dịrị ndị nne nwanyị ịgwa ụmụ-agbọghọ lụrụ di ọhụụ otú ha ga-esi biri n’èzínaụlọ ha nke ga-eme ka ha onwe ha na ndị èzínaụlọ ha nwee ọñụ. Ọ bụ ọlụ dịrị ha ikụziri ha ka ha nwee anya udo, “ibu ndi nāhu di-ha n’anya, ndi nāhu umu-ha n’anya, ndi uche ha zuru-okè, ndi di ọcha, ndi nālu ọlu n’ulo, ezi madu, ndi nēdo onwe-ha n’okpuru di nke aka ha, ka ewe ghara ikwulu okwu Chineke” (Taitọs 2:4, 5). Ọ bụ ọlụ dịrị nwanyị ahụ idebe ụlọ ya ọcha, ilezi ụmụ ya anya nkeọma, idoziri di ya nri n’oge mgbe ọ lọtara ọlụ. Èzínaụlọ ya kwesịrị ịbụ ebe mara mma, ebe ana-enwe obi-ụtọ na ebe ndị èzínaụlọ ya ga-enwekọ ọñụ. Chineke sịrị na nke a dị mkpà, ma ọ bụrụ na ọ dịghị eme ya, ọ bụ ihe ihere nye Oziọma ma bụrụ kwa onye na-ekwulu Baịbụl. Nkwulu bụ mmehie jọrọ njọ nke ukwuu.

Ọ bụrụ na nne anọgide ná ịdọgbubiga onwe ya ókè n’ọlụ ndịọzọ dị iche iche ma rapụ ịzụpụta ụmụ ya otú o kwesịrị, ònye ka aga ata-ụta ma ọ bụrụ na ha aghọọ ndị na-eme ihe ọjọọ wee laa n’iyi n’ọkụ-ala mmụọ?

Mgbe amụrụ nwantakịrị ọ bụla Chineke ewerewo ọlụ ahụ nke ịlekọta mkpụrụobi ná-adịghị anwụ anwụ nye nne na nna ya, Ọ ga-ajụta n’aka ha ihe banyere ịkụziri nwanta ahụ otú ọ ga-esi nwee nzọpụta. Ọ bụ ihe dị mkpà ka nne na nna wepụta oge nke ịgụrụ ụmụ ha Baịbụl na isoro ha kpee ekpere. Otù onye amara nkeọma n’ihe banyere iwu ekwuwo ya ọtụtụ mgbe sị: Èzínaụlọ nke na-ekpekọta ekpere n’otù na-adị n’otù.”

Ọ bụrụ na ewukwasị èzínaụlọ dịka Okwu Chineke si dị ọ ga-abụ èzínaụlọ nwere ọñụ, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha kewaa. Ụmụ ntakịrị ndị amụrụ n’èzínaụlọ ahụ ndị akụzi kwara ihe banyere irubere nne na nna ha na Okwu Chineke isi, ga-enwe ezigbo ohere nke itolite wee bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị-obi, ndịkom na ndịnyom nwere nsọpụrụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye bụ ndị nkụzi kachasị mkpà nke ụmụnta na-enwe na mbụ?
  2. Gịnị bụ iwu Chineke nyere banyere ụmụntakịrị?
  3. Gịnị bụ ihe ụfọdụ nke i ga-eleba anya banyere onye ahụ nke gị na ya na-achọ ịlụ di na nwunye tutu unu alụọ?
  4. Òge ra añaa ka mkwà niile nke ọlụlụ di na nwunye ga-adịru?
  5. Kwue ihe ole-na-ole bụ ọlụ nke dịrị ndị bụ di.
  6. Kwue ihe ole-na-ole bụ ọlụ dịrị ndị bụ nwunye.