Matiu 5:23, 24; 43-48; 18:15, 21, 22; Mak 11:23-26; Ndi Rom 12:9, 10, 14, 17, 19-21

Lesson 272 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ọ buru na unu onwe-unu agbagharagh, Nna-unu Nke bi n’elu-igwe agagh-agbaghara unu ndahie nile unu” (Mak 11:26).
Notes

Ịhụ Ndị-iro N’anya

Ewepụtara ihe ọmụmụ nke a site n’Okwu Chineke Jisọs kwuru n’elu Ugwu. Ịhụn’anya na mgbaghara Onye Kraist so n’ihe Jisọs kwuru okwu banyere ha. Jisọs kuziri na Onye Kraist nwere mgbaghara nime obi ya. Site na nke a ka anyị matara na ọ bụrụ na mmadụ enweghị mgbaghara nime obi ya, onye ahụ abụghị Onye Kraist.

Ndị-òzìzí nke Ndị Ju gwara ndị ahụ ka ha hụ ndị agbata-obi ha n’anya ma kpọọ ndị-iro ha asị. Nke a bụ ụzọ mmadụ si eme ihe, ma ọ bụghị ụzọ nke Chineke. Na Testament Ochie anyị na agụ: “Abọla ọbọ, edebe kwala iwu megide umu ndi-gi, ma hu madu-ibe-gi n’anya dika onwe-gi; Mu onwem bu JEHOVA” (Levitikọs 19:18). Ọ dị ụfọdụ ndị Kenean gbochiri Ụmụ Israel ịbata, ndị nwakwara iwezuga ha site n’ebe Chineke nọ, banyere ndị ahụ, Chineke kwuru ka Ụmụ Israel ghara “ichọ udo-ha na ọdi-nma-ha” (Deuteronomi 23:6). Eleghị anya ọ bụ site n’okwu ndịa ka ndị Ju si nwee nchepụta nke ịkpọ ndị-iro ha niile asị.

Jisọs kuziri na ndị bụ ụmụ Chineke -- ezi Onye Kraist – na-enwe ịhụn’anya n’ebe ndị-iro ha nọ. Onye Kraist enweghị ịhụn’anya n’ebe mmehie na ụzọ ọjọọ niile dị (Abù Ọma 97:10), ma ọ na-enwe ịhụn’anya n’ebe mkpụrụobi nke ụmụ mmadụ dị, ọbụná ndị-iro ya. Jisọs sịrị, “Nāhunu ndi-iro-unu n’anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsogbu unu; ka unu we buru umu nke Nna-unu Nke bi n’elu-igwe” (Matiu 5:44, 45).

Egbochiri anyi ime ndị anyị chọpụtara dịka ndị-iro anyị ihe ọjọọ. Anyị na-agụ site n’ihe odide Pọl degaara ndị Rom, “Unu enye-ghachila onye ọ bula ihe ọjọ n’ọnọdu ihe ọjọ” (Ndi Rom 12:17). Pọl degaara ndị Tesalọnaika, “Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n’ọnọdu ihe ọjọ; kama nāgbasonu ezi ihe mgbe nile, n’ebe ibi-unu nọ, na n’ebe madu nile nọ” (I Ndi Tesalọnaika 5:15). Ọ bụghị ihe dịrị anyị inye ụmụ mmadụ ahụhụ n’ihi omume ọjọọ ha. Chineke ga-ekpe mmadụ niile ikpé ma nye kwa ha ahụhụ kwesịrị ha. “Mu nwe ọbọ; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru” (Ndi Rom 12:19). Jehova kwuru n’ebe ọzọ, “Mu nwe ọbọ na nkwughachi, na mgbe ukwu ha gāgbuchapu: n’ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso, ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa” (Deuteronomi 32:35).

Ihe-ọma N’ọnọdụ Ihe-ọjọọ

Jisọs kuziri ka Ndị Kraist ná-akwụghachị iheọma n’ọnọdụ iheọjọọ (Luk 6:27). Ha enweghị mmụọ nke ga-akwụghachị iheọjọọ n’ọnọdụ iheọjọọ. Ndị mmehie kachasị njọ nwere ike nwee ịhụn’anya n’ebe ndị hụrụ ha n’anya nọ. Ọ dịghị ihe pụrụ ichè maọbụ ihe ịtụ-n’anya dị na nke a. N’ịgbaso ihe nlere anya nke Onyenweanyị nyeworo, Onye Kraist ga-eme karịa ka ndịọzọ na-eme -- ọ ga-ahụ ndị kpọrọ ya asị n’anya kwughachị kwa iheọma n’ọnọdụ iheọjọọ. Onyenweanyị na-achọ nke a n’aka ụmụntà na ndịokenye bụ Ndị Kraist.

Eleghị anya n’ụlọ-akwụkwọ gị maọbụ n’etiti ụmụntakịrị ndị bi gị nso, enwere otù nwantakịrị na-emejọ gị na-ekwu kwa okwu ụgha megide gị. Òlee otú ị pụrụ isi meere ya iheọma n’ọnọdụ iheọjọọ o meworo gị? Ị pụrụ ikpere ya ekpere -- Jisọs kpere ka Chineke gbaghara ọbụná ndị kpọgidere Ya n’obe (Luk 23:34). Ị pụrụ inwe obiọma n’ebe onye ná-enweghị obiọma n’ebe ị nọ; nye ya ihe, maọbụ binye ya ihe dị ya mkpà. Ị pụrụ igosi ya ịhụn’anya gị site n’ikwu banyere ụfọdụ ezi ihe ọ na-eme, na site n’ịrọrọ ya ka gị na ya gwuo egwú.

Inyeghachị iheọma n’ọnọdụ iheọjọọ ụfọdụ nke emeworo gị nwere ike ịdị ka ihe siri ike ime, ma ọ bụrụ na i nwere ịhụn’anya Chineke nime obi gị, ị ga-achọ ka i mee ya. Ọ bụrụ na ị chọpụta na ọ dịghịrị gị mfé ịhụ onye iro gị n’anya, kpee ekpere ka Chineke nye gị amara inyeghachị iheọma n’ọnọdụ iheọjọọ.

Site n’inwe obiọma n’arụ ndị ná-enweghị obiọma n’ebe ị nọ, ha ga-enwe amam-ikpé n’obi ha ihere onwe ha ga-eme kwa ha. I nwere ike rita ha n’urù ịbụ ndị enyị gị na ndị kweere n’Onyenweanyị. Akụziri anyị “Ọ buru na agu nāgu onye-iro gi, nāzu ya; ọ buru na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ñua miri: n’ihi na n’ime nka i gāgukwasi icheku ọku nēre ọku n’isi-ya” (Ndi Rom 12:20).

Ịhụn’anya Onye Kraist

Jisọs kwusiri okwu ike banyere ịhụn’anya n’etiti ndị na-eso ụzọ Ya. N’otù oge Jisọs sịrị, “Nka bu ihe M’nyere n’iwu, ka unu hurita ibe-unu n’anya dika M’huru unu n’anya” (Jọn 15:12). Ịhụn’anya nke Ndị Kraist ahụ bụ ihe dị ebube. Ọ na-ekekọta ụmụ nke Onyenweanyị n’otù. Mmadụ ga-akpachapu anya ịhụ na ịhụn’anya dị n’obi ya nye ụmụ Chineke niile. Mmadụ aghaghị igbochi ihe ọ bụla nke ga-eweta ise-okwu n’etiti ya na onye ọzọ. Mgbe ụfọdụ mmadụ aghaghị inwe obi ume-ala weda kwa onwe ya ala ebe ọ dị ukwu ka o wee nwee ike idebe ezi ịhụn’anya ahụ.

Ọ bụrụ na ekwensu nwee ike itinye gị ihe n’obi megide otù nime ndị nke Chineke, mgbe ahụ o nwewo óké mmeri. Ọ dị mkpà na i mere ngwa ngwa jekwuru nwanna nwoke maọbụ nwanyị ahụ nime Oziọma mee ka udo dị n’etiti unu ka ekwensu wee gbapụ ngwa ngwa, ka ịhụn’anya nke Ndị Kraist ahụ wee dọrọ gị bịarue ndị nke Chineke nso karịa.

Emere Udo

Jisọs matara na ekwensu ga-agbalị ikewa ndị nke Onyenweanyị site na nghọtahie na ihe ịmá n’ọnyà. Jisọs nyere anyi ndụmọdụ banyere ihe anyị ga-eme ka anyị wee merie ihe niile ahụ. “Ya mere ọ buru na i nēche onyinye-gi n’iru Chineke n’ebe-ichu-àjà i we cheta n’ebe ahu na nwa-nne-gi nwere ihe megide gi, laba, buru uzọ me ka gi na nwa-nne-gi di n’udo, mgbe ahu bia kwa che onyinye-gi”(Matiu 5:23, 24).

Ọ bụrụ na, mgbe ị na-ekpe ekpere, o wee metụ gị n’obi na nwanne gị nwere ihe megide gị, jekwuru onye ahụ, kwuzie okwu ahụ, gị na ya mee kwa udo tupu gị abịaghachị n’ebe ịchụàjà iché onyinye nke otuto na nke iji obi chụọ àjà n’iru Chineke. Onyenweanyị enweghị obi-ụtọ n’ụdị nke okpukpé ma ọ bụrụ na mmadụ enweghị ịhụn’anya n’ebe mmadụ ibe ya nọ. Ihe karịrị otù onye nime Ndị Kraist arapụwo ebe ana ekpe ekpere, jekwuru otù nime ụmụnna ikwuzi ihe na-ezighị ezi, wee mee udo, laghachị kwa ná ekpe ekpere ịnata ngọzị n’aka Onyenweanyị.

Mata kwa na n’òzìzí nke Jisọs ekwughị banyere onye ikpé mara maọbụ otú nsogbu ahụ ra. Ọ bụrụ na gị onwe gị maọbụ onye nke ọzọ mejọrọ, ma nsogbu ahụ ọ dị ukwu maọbụ ihe aga-ele anya na ọ dị ntà, ma nghọtahie ọ dị maọbụ na ọdịghị nnọọ onye ikpé mara, Onyenweanyị enyewo otù iwu ahụ nke anyi ná-aghaghị ịgbaso.

Akọn’uche dị Ọcha

Ọtụtụ ihe dị nke nwere ike iweta mmetụta ọjọọ n’etiti ụmụ nke Onyenweanyị. Ọtụtụ mgbe o nwere ike bụrụ nghọtahie -- mgbe otù onye ghọtahiere ibe ya ma onye nke ọzọ ebughị ihe ọjọọ n’obi -- ma ọ hụtara ihe ọjọọ nke mebiri ya obi mee kwa ka iwe wee ya. Ọ dịwo ọtụtụ mgbe ọzọ o nwere ike bụrụ náánị nkera nke okwu ahụ ka onye nke ọzọ maara, ma mgbe akọwaara ya ezi ọnọdụ nke ihe niile okwu ahụ wee dị ichè, ọ dịghị kwa ihe ọ bụla ga-eweta ihe mgbu.

Oge ụfọdụ ọghọm na-esite n’iru ọjọọ maọbụ akpachapụghị anya. Ọ dịwo mgbe i tiwara enyo? Ná-arụghị ụkà ekwensu gbalịrị ịgwa gị ka ị gbaa ọsọ maọbụ ka ị kwue na onye ọzọ mere ya. Ọ bụrụ na i jekwuru onyenwe ya, ná-ekwere ihe ọghọm ahụ mere gị wee kwụọ ụgwọ ihe i mebiworo, ị matara na i nwere obi ụtọ n’ihi na obi gị dị ọcha n’iru ndịọzọ ọ bụ ezie na o wutara gị. Ọ bụrụ na ị nwara izo ezo, ị ga-amata amam-ikpé ga-adị n’obi gị, otú ị ná-enweghị izuike n’obi, na otú ị tụrụ egwù na aga-ejide gị, ọ bụ na o zighị ezi ime ezi ihe nwee kwa akọn’uche dị ọcha n’iru Chineke na mmadụ ibe gị?

Ọ dịrị ekwensu mfé, isite n’aghụghọ, ụgha, maọbụ site n’ọnwụnwa, mee ka ị mee ihe jọrọ njọ, nke ka nke ọ bụrụ na ị dịghi ekpesi ekpere ike. N’oge dị otú ahụ i nwere ike imejọ otù nime ụmụnna site n’ịña ekwensu ntị. Eleghị anya ná-amataghị ihe kpatara ya, maọbụ ná-aghọtaghị otú o si dị mkpà, maọbu ná echeghị uche, maọbụ na akpachapụrụ anya mee iheọjọ, ewee mejọọ otù onye nke ukwuu site na ya. Ihe ndịa na-eme eme. Ọ bụ ezie na ihe banyere ha na-ewute anyị, ka anyị dozie ha otù mgbe ahụ ghara ikwe ka ha nọgide n’ibibi ịhụn’anya na ndụ anyị dịka Ndị Kraist.

Ka anyị cheta ihe banyere òzìzí nke dị na Baịbụl banyere idozi ụzọ nke anyị mụrụ n’Ihe ọmụmụ 269. Ka anyị wee mee ka ịhụn’anya nke Ndị Kraist dịgide nime obi anyị na inwe òkè nime èzínaụlọ nke ndị Chineke, mgbe mmadụ mejọrọ. ọ ghaghị iweda onwe ya ala kwupụta kwa ajọ omume ya, rịọ onye o mejọrọ ka ọ gbaghara ya, dozie ụzọ ya, mee kwa ihe niile ga-eme ka isiokwu ahụ gwụsịa.

Ụfọdụ mmadụ jikeere ịnabata ajọ omume ha n’iru Chineke, rịọ kwa Ya mgbaghara; ma Baịbụl na-akuziri anyi na mmadụ aghaghị kwa ime ka ya na mmadụ ibe ya dị n’udo. Mmadụ apụghị ịbụ onye ziri ezi n’anya Chineke mgbe ọ na-achọghị ọbụná ịgbalị ijé ka ya na mmadụ ibe ya dị n’udo. Mmadụ ekwesịghị iwezuga idozi ihe emebiri emebi, n’ihi na mmadụ apụghi inwetazu òzùzù òkè nke iruọma Chineke ma o meghị otú ahụ. Jisọs nwere ike bịa ka ọ na-atụfu oge ime udo ahụ. Ị chere na onye dị otú ahụ ga-ejikere izute Onyenwaanyị?

Mmụo Nke Mgbaghara

Gịnị ka mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ bụ ya bụ onye emejọrọ merụọ kwa arụ? Ọ na-agbasa okwu-azụ site n’ịkọrọ ndịọzọ na emejọrọ ya, na-akọ kwa otú iheọjọọ emere ya ra? Baịbụl na-akụziri anyị ka anyi jekwuru onye ahụ mehiere anyị, gwa ya banyere njehie ya, gbalịa kwa ime udo. Ọ bụrụ kwa na edozighị okwu ahụ otú o kwesịrị, otù onye-àmà pụrụ isoro anyi jee nye kwa aka n’idozi okwu ahụ. (Gụọ Matiu 18:15-17). Lee ka o si bụrụ ihe ziri ezi irubere òzìzí niile nke Onyenweanyị isi karịa ịrapu ka esem-okwu tolite n’etiti ụmụnna!

Ọnụ-ọgụgụ Ná-enweghị Ọgwụgwụ

Otù mgbe Pita jụrụ Onyenweanyị ugbò ole ya ga-agbaghara nwanna onye mejọworo ya. Pita chere na eleghị anya ya gbaghara ugbò asaa dị iche iche ga-adịworị ukwu ịgbaghara mmadụ, ma ugbò asaa n’oge niile nke ndụ mmadụ maọbụ ugbò asaa n’ụbọchị ezughị. Jisọs zara sị, “Rue ọgu ugbò atọ na iri uzọ asa” (Matiu 18:21, 22). Gịnị bụ iri asaa ụzọ asaa? Ọ bụ ugbò narị anọ na iri iteghete (490). N’ezie ọ ga-adị mmadụ mkpà inwe ịhụn’anya Chineke na ntachi-obi dị ukwu n’obi ya iji gbaghara mgbe otù onye ahụ mejọrọ ya ọtụtụ ugbò. Onyenweanyị na-ele anya mgbaghara; Ọ na-achọ ya; Ọ na-enye kwa Onye Kraist ike na amara inwe ịhụn’anya na mgbaghara dị otú ahu nime obi ya. Ihe okwu Jisọs pụtara bụ na ọ dịghi ọgwụgwụ dịrị mgbaghara nke Onye Kraist.

Otú Anyị si Agbaghara Ndịọzọ

Mgbaghara bụ ihe dị ebube, ma ọ bụ kwa ihe dị mkpà. Ndị na asị na ha apụghị ịgbaghara onye ọzọ nọ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya. Ndị na-ekpe ekpere nke Onyenweanyị (Matiu 6:9-13) na-asị, “Gbaghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi gbagharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ.” Ha na-ekpe ka agbaghara ha otú ha si agbaghara ndịọzọ. Mgbe ha na-adịghị agbaghara ndịọzọ, ha apụghị inwe olile anya na Chineke ga-agbaghara ha. “Ọ buru na unu onwe-unu agbagharagh, Nna-unu Nke bi n’eluigwe agagh-agbaghara unu ndahie nile unu” (Mak 11:26).

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka Onyenweanyị nụ, zaa kwa ekpere gị, gbaghara kwa gị, gị onwe gị kwa aghaghị ịgbaghara ma ọ bụrụ na i nwere ihe megide onye ọ bụla (Mak 11:25). Anyị ga-ahụ na Jisọs ekwughị na anyị ga-agbaghara ndịọzọ náánị mgbe ha rịọrọ ka agbaghara ha. Mgbaghara na-adị n’obi ezi Onye Kraist ọ bula ma arịọrọ ya mgbaghara maọbụ na arịọghị ya. Nzọpụta anyị nwere ike ịdabere n’otú anyị si agbaghara ndịọzọ.

Ọbụná asị na iheọjọọ ahụ riri nne nke ukwuu ruo n’ịtụfu ndụ, maọbụ aka, ruo n’itụfu èzínaụlọ maọbụ na emebiri ezi aha nke mmadụ nwere maọbụ arụ-ike -- ná-agbanyeghị ihe o furu -- ọ ghaghị ịgbaghara ọ bụrụ na ọ na-ele anya ịnata ebere n’aka Chineke. Otù ezi mpempe akwụkwọ (track) nke mmadụ kwesịrị ịgụ nke metụtara ihe ọmụmụ a bụ nke Nzukọ Apostolic Faith bipụtara nke isiokwu ya bụ, “N’ihi Ajọomume Onye ọzọ.”

Ịgbaghara Na Ichefu

Gịnị ka okwu a bụ ịgbaghara pụtara? Ọ pụtara ịkapụ na ịgbaghara. Ihe ya na mgbaghara na-eso bụ ichefu. Ịgbaghara bụ ichefu. Ọ dịghị ọtụtụ dịrị mgbaghara. Apụghị ịgbaghara mmadụ n’ọkara maọbụ n’ọtụtụ dị ntà. Aga agbaghara mmadụ kpamkpam maọbụ ná agbagharaghị ya ma-ọli -- otù maọbụ ibe ya.

Mgbe Onyenweanyi gbaghaara, Ọ dịghị echeta kwa mmehie ahụ ọzọ (Ndi Hibru 8:12; 10:17; Jeremaia 31:34). Ọ na-ewezuga njehie anyị niile ka ha dị anya n’ebe anyị nọ “dika iru-anyanwu si di anya n’ọdida-anyanwu” (Abù Ọma 103:12). Otú ebere Ya ra ukwu mere na Ọ “gātuba kwa nmehie nile ha n’ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri” (Maika 7:19). Hezekaia kwuru banyere Onyenweanyị sị, “I tufuru nmehiem nile n’azu Gi” (Aisaia 38:17). Baịbụl na-agwa anyị na “ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara gbaghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a” (Ndi Kọlọsi 3:13). Mgbe mmadụ gbaghaara n’ezie, ọ na-eme nke ahụ nime mmụọ na n’omume na n’egbugbere-ọnụ kwa. Ọ na-eji obi ya niile na ezi ịhụn’anya nke Onye Kraist gbaghara.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee otú Onye Kraist si emeso onye iro ya?
  2. Ònye bụ onye iro gị?
  3. Ònye bụ onye agbata-obi gị?
  4. Gịnị ka Onye Kraist na-enyeghachi n’ọnọdụ iheọjọọ emere ya?
  5. Gịnị ka ọ pụtara ma asị na “I gāgukwasi icheku nēre ọku n’isi-ya?
  6. Òlee iwu Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ Ya na Jọn 15:12?
  7. Ọ bụrụ na mmadụ nwere ihe megide gị, gịnị ka Jisọs kwuru na ị ga-eme?
  8. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ị gagh agbaghara onye ọzọ?
  9. Gịnị na-eme mmehie anyị niile mgbe Jisọs gbagharaworo anyị?
  10. Òlee otú ị si amata mgbe agbagharaworo gị n’ezie?